Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Ime Baptizim “n’Aha nke Nna na nke Ọkpara na nke Mmụọ Nsọ” Pụtara?

Gịnị Ka Ime Baptizim “n’Aha nke Nna na nke Ọkpara na nke Mmụọ Nsọ” Pụtara?

Gịnị Ka Ime Baptizim “n’Aha nke Nna na nke Ọkpara na nke Mmụọ Nsọ” Pụtara?

“Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.”—MAT. 28:19.

1, 2. (a) Gịnị mere na Jeruselem n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 O.A.? (b) Gịnị mere ọtụtụ n’ime ndị bịara ebe ahụ ji pụta ka e mee ha baptizim?

ÌGWÈ mmadụ ndị si ọtụtụ mba jupụtara na Jeruselem n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 O.A. Ọtụtụ n’ime ha bịara Jeruselem maka otu ememme dị mkpa nke nọkwa na-aga n’ihu. Ma, ụdị ihe na-emetụbeghị mere, mgbe nke ahụ gachara, Pita onyeozi kwuru okwu nke ruru nnọọ ọtụtụ ndị n’obi. Ihe o kwuru metụrụ ndị Juu na ndị ọzọ na-eso ụzọ ha dị ihe dị ka puku mmadụ atọ n’obi nke mere ka ha chegharịa, e wee mee ha baptizim. Nke a mere ka ha bata n’ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ nke ka malitere ọhụrụ. (Ọrụ 2:41) Ọ ghaghị ịbụ na baptizim a nọ na mmiri dị iche iche dị na Jeruselem na-eme ọtụtụ ndị mmadụ mere ka obodo ahụ na-akpọtụ akpọtụ!

2 Gịnị mere ọtụtụ ndị ji bịa ka e mee ha baptizim? N’ụbọchị ahụ, “a nụrụ ụzụ si n’eluigwe dị nnọọ ka oké ifufe nke na-efesi ike.” Mmụọ nsọ dakwasịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị nọ n’otu ọnụ ụlọ dị n’elu, ndị dị ihe dị ka otu narị mmadụ na iri abụọ. Mgbe nke a gachara, ndị na-asọpụrụ Chineke ndị nọ ebe ahụ nwere obi ụtọ ịnụ ka ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs ‘malitere ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche.’ Mgbe ha nụrụ ihe Pita kwuru, gụnyere ihe o kwuru banyere ọnwụ Jizọs, ‘ọ dụrụ ọtụtụ n’ime ha adụ n’obi.’ Gịnị ka ha kwesiri ime? Pita zara, sị: “Chegharịanụ, ka e meekwa onye ọ bụla n’ime unu baptizim n’aha Jizọs Kraịst . . . , unu ga-anatakwa mmụọ nsọ ahụ a na-enye n’efu.”—Ọrụ 2:1-4, 36-38.

3. N’ụbọchị Pentikọst, gịnị ka a gwara ndị Juu chegharịrị echegharị na ndị na-eso ụzọ ha ka ha mee?

3 Chee echiche banyere ụdị okpukpe ndị Juu ndị ahụ na ndị na-eso ụzọ ha, bụ́ ndị gere ntị n’ihe Pita kwuru, na-ekpe. Ha kwere na Jehova bụ Chineke ha. Akwụkwọ Nsọ Hibru nyeere ha aka ịma ihe bụ́ mmụọ nsọ, ya bụ, ike Chineke nke nọ n’ọrụ, bụ́ nke o ji kee ihe niile, jirikwa ya na-arụ ọrụ ruo taa. (Jen. 1:2; Ikpe 14:5, 6; 1 Sam. 10:6; Ọma 33:6) Ma, ọ bụghị naanị nke ahụ ka ha kwesịrị ịma. Ha kwesịrị ịmara Mesaya bụ́ Jizọs, kwerekwa na ya, bụ́ onye Chineke ga-eji zọpụta ụmụ mmadụ. Ọ bụ ya mere Pita ji gwasie ha ike ka e mee ha “baptizim n’aha Jizọs Kraịst.” Mgbe Jizọs bilitere n’ọnwụ ụbọchị ole na ole tupu ụbọchị Pentikọst, ọ gwara Pita na ndị ọzọ ka ha na-eme ndị mmadụ baptizim “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” (Mat. 28:19, 20) Nke ahụ dị oké mkpa na narị afọ mbụ, dịrịkwa ugbu a. Gịnị ka ọ pụtara?

N’Aha nke Nna

4. Ka ndị mmadụ na Jehova wee nọgide na-adị ná mma, gịnị gbanwere?

4 Dị ka anyị kwuru na mbụ, ndị ahụ gere ntị n’ihe Pita kwuru na-efe Jehova, ha na ya dịkwa ná mma tupu ụbọchị ahụ. Ha na-agbakwa mbọ ime ihe Iwu ya kwuru, bụ́kwanụ ihe mere ndị si mba ọzọ ji bịa Jeruselem. (Ọrụ 2:5-11) Ma, Chineke gbanwere ihe dị ukwuu n’otú ya na ndị mmadụ si emekọrịta ihe. Ndị Juu agakwaghị abụ mba ya pụrụ iche; idebe Iwu Mozis abụkwaghị ihe ga-eme ka ha na ya dịrị ná mma. (Mat. 21:43; Kọl. 2:14) Ọ bụrụ na ndị ahụ nọ na-ege Pita ntị chọrọ ka ha na Jehova nọgide na-adị ná mma, ha kwesịrị ime ihe na-abụghị idebe Iwu Mozis.

5, 6. Gịnị ka ọtụtụ ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ha mere na narị afọ mbụ ka ha na Chineke wee dị ná mma?

5 Nke a apụtaghị na ha amalitela inupụrụ Jehova isi, bụ́ Onye nyere ha ndụ. (Ọrụ 4:24) Kama nke ahụ, ndị ahụ bụ́ ndị gere ntị n’ihe Pita kwuru ghọtara na Jehova bụ Nna dị obiọma, karịa ka ha ghọtara na mbụ. O zitere Mesaya ahụ ka ọ gbapụta ha, ọ dịkwa njikere ịgbaghara ndị ahụ Pita kwuru banyere ha, sị: “Ka ụlọ Izrel dum mara n’ezie na Chineke mere ya Onyenwe anyị na Kraịst, bụ́ Jizọs a, onye unu kpọgidere n’osisi.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị malitere ime ihe ahụ Pita kwuru bidoro ịhụkwu ihe mere ha ga-eji na-ekelekwu Nna anyị maka ihe o meere ndị niile chọrọ ka ha na ya dị ná mma!—Gụọ Ọrụ 2:30-36.

6 Ndị Juu ahụ na ndị na-eso ụzọ ha malitere ịghọta na ọ bụrụ na ha chọrọ ka ha na Jehova dịrị ná mma na ha ga-ekwere na ọ bụ n’aka Jizọs ka Chineke ga-esi azọpụta ha. Ọ bụ ya mere ha ji chegharịa wee hapụ mmehie ha, nke gụnyere ogbugbu ha gburu Jizọs, bụ́ nke ụfọdụ n’ime ha mere n’amaghị ama ebe ndị nke ọzọ kpachaara anya mee ya. Ọ bụkwa nke a mere ha ji “na-ege ntị n’ozizi ndịozi” mgbe abalị ole na ole gafere ụbọchị Pentikọst ahụ. (Ọrụ 2:42) Nke a mere ha ji nwee ike iji ‘nkwuwa okwu na-abịaru ocheeze nke obiọma na-erughịrị mmadụ nso.’—Hib. 4:16.

7. Olee otú ọtụtụ ndị sirila gbanwee otú ha si elebu Chineke anya nke mere ka e mee ha baptizim n’aha Nna?

7 Taa, Baịbụl akụzierela ọtụtụ nde mmadụ si ebe dị iche iche nke bụ́ eziokwu banyere Jehova. (Aịza. 2:2, 3) Ụfọdụ n’ime ha ekwebughị na Chineke dị, ebe ndị nke ọzọ kwere na Chineke dị, ma, na o leghaara otú ihe si na-aga n’ụwa anya. Ha ekwetala ugbu a na Chineke dị, hụkwa na ha na ya nwere ike ịdị n’ezigbo mma. Ndị nke ọzọkwa na-efebu chi atọ n’ime otu ma ọ bụkwanụ arụsị dị iche iche. Ha mechara mata na ọ bụ naanị Jehova bụ Chineke pụrụ ime ihe niile, ugbu a ha na-akpọkwa ya aha ya. Nke a kwekọrọ n’ihe ahụ Jizọs kwuru, nke bụ́ na e kwesịrị ime ndị na-eso ụzọ ya baptizim n’aha Nna.

8. Olee ihe ndị na-amaghị na anyị ketara mmehie n’aka Adam kwesịrị ịma banyere Nna anyị?

8 Ha amụtakwala na ha ketara mmehie n’aka Adam. (Rom 5:12) Nke a bụ ihe ọhụrụ ha nabatara wee hụ na ọ bụ eziokwu. E nwere ike iji ụdị ndị a tụnyere nwoke ahụ́ na-adịghị nke na-amaghị na ọ dị ihe na-arịa ya. Ahụ́ nwere ike igbu ya mgbu mgbe ụfọdụ, bụ́ ihe na-egosi na o nwere ihe na-arịa ya. Ma, ebe ọ bụ na e leghị ya ahụ́ ọ bụla iji chọpụta ma ò nwere ihe na-arịa ya, o nwere ike ịna-eche na ahụ́ dị ya. Ma, nke a apụtaghị na ọ dịghị ihe na-eme ya. (Tụlee 1 Ndị Kọrịnt 4:4.) Gịnị ka ọ ga-eme ma e lee ya ahụ́ wee chọpụta na o nwere ihe na-arịa ya? Ọ̀ bụ na ọ gaghị egosi na ya ma ihe site n’ịchọwa ebe dị mma a ga-agwọ ya, bụ́ ebe a chọpụtarala na a na-agwọ ọrịa ahụ? N’otu aka ahụ, mgbe ọtụtụ ndị matara nke bụ́ eziokwu banyere mmehie anyị ketara n’aka Adam, ha na-anabata ihe Baịbụl kwuru na ọ bụ ya na-arịa ha, matakwa na Chineke kwere nkwa ịgwọ ha. N’ezie, ndị niile e kewapụrụ n’ebe Nna anyị nọ kwesịrị ịbịakwute Onye ahụ nke ga-agwọ ha.—Efe. 4:17-19.

9. Gịnị ka Jehova mere ka ya na ụmụ mmadụ wee dịrị ná mma?

9 Ọ bụrụ na ị rarala ndụ gị nye Jehova Chineke, gị abụrụkwa Onye Kraịst e mere baptizim, ị ga-achọpụta na mmadụ na Chineke ịdị ná mma bụ ihe magburu onwe ya. Nke a ga-enyere gị aka ịghọta ụdị onye Jehova, bụ́ Nna hụrụ ụmụ ya n’anya, bụ. (Gụọ Ndị Rom 5:8.) N’agbanyeghị na Adam na Iv mehiere Chineke, o mere ihe ga-eme ka ya na ụmụ ha, nke gụnyere anyị, dị ná mma. Nke a mere ka a taa Ọkpara Chineke ahụhụ ma mechaa gbuo ya, bụ́ nke wutere Nna ya nke ukwuu. Ọ̀ bụ na ịmata nke a emebeghị ka ị hụkwuo Chineke n’anya wee na-erubere ya isi ma na-edebe iwu ya? I nwere ezigbo ihe mere ị ga-eji rara onwe gị nye Chineke, ka e meekwa gị baptizim, ma ọ bụrụ na i mebeghị otú ahụ.

N’Aha nke Ọkpara

10, 11. (a) Olee otú ụgwọ i ji Jizọs hà? (b) Olee otú obi dị gị maka na Jizọs nwụrụ iji gbapụta anyị?

10 Chegodị echiche ọzọ banyere ihe Pita gwara ìgwè mmadụ ahụ. O kwusiri okwu ike banyere ịnabata Jizọs, bụ́ ihe ya na ime mmadụ baptizim “n’aha . . . nke Ọkpara” na-agakọ. Gịnị mere nke a ji dị mkpa n’oge ahụ nakwa n’oge a? Ịnabata Jizọs na ịbụ ndị e mere baptizim n’aha ya pụtara na ihe o mere ka anyị na Onye kere anyị wee dị ná mma dị anyị mma. A kpọgidere Jizọs n’osisi ịta ahụhụ ka e wee wepụ ọnụ Iwu Mozis bụrụ ndị Juu; ma, ọnwụ ya mere ihe karịrị nke ahụ. (Gal. 3:13) Ọ chụrụ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ ná mmehie, bụ́kwanụ ihe dị mmadụ niile mkpa. (Efe. 2:15, 16; Kọl. 1:20; 1 Jọn 2:1, 2) Iji mee nke a, Jizọs diri ikpe na-ezighị ezi, nkwujọ, ahụhụ, mechaakwa nwụọ. Ì nwere obi ụtọ dị ukwuu maka àjà a Jizọs chụrụ? Ka e were ya na ị bụ otu nwatakịrị nwoke dị afọ iri na abụọ nke nọ n’ụgbọ mmiri bụ́ Taịtanik, bụ́ ụgbọ mmiri ahụ kụrụ mmiri kpụkọrọ akpụkọ n’afọ 1912 wee kpuo. Gị achọọ ịmaba n’ụgbọ ụmara e ji agụpụta ndị ahụ mmiri chọrọ iri, ma ya abụrụ na o jula. Ma, otu nwoke nke nọ n’ụgbọ ụmara ahụ esusuo nwunye ya ọnụ iji sị ya nọdụ nke ọma wee pụtara gị n’ụgbọ ụmara ahụ banyeghachi n’ụgbọ mmiri ahụ chọrọ ikpu ekpu. Olee otú obi ga-adị gị? O nweghị ihe ga-eme ka obi ghara ịdị gị mma. Nke a ga-enyere gị aka ịghọta otú obi dị otu nwatakịrị nwoke ihe a mere. * Ma, Jizọs meere gị ihe karịrị nke a. Ọ nwụrụ ka i wee keta ndụ ebighị ebi.

11 Olee otú obi dị gị mgbe ị matara ihe Ọkpara Chineke meere gị? (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15.) O nwere ike ịbụ na i nwere obi ụtọ dị ukwuu. Nke a mere ka ị rara onwe gị nye Chineke ka i wee ‘ghara ịdịrị onwe gị ndụ ọzọ, kama ka ị dịrị onye ahụ ndụ, bụ́ onye nwụrụ n’ihi gị.’ Ọ bụrụ na e mere gị baptizim n’aha Ọkpara ahụ, ọ pụtara na obi dị gị ụtọ maka ihe Jizọs meere gị nakwa na ị nabatara ọrụ ọ na-arụ iji gosi na ọ bụ “Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Nzọpụta.” (Ọrụ 3:15; 5:31) Ná mbụ, gị na Onye kere anyị adịghị ná mma, o nweghịkwa ezigbo olileanya i nwere n’oge ahụ. Ma, gị na Nna anyị dị ná mma ugbu a n’ihi na i nwere okwukwe n’ọbara Jizọs Kraịst nke a wụfuru n’ihi anyị, e meekwa gị baptizim. (Efe. 2:12, 13) Pọl onyeozi dere, sị: “Unu ndị e kewapụrụ ekewapụ n’oge gara aga, ndị bụkwa ndị iro n’ihi na uche unu dị n’ọrụ ọjọọ, ọ bụ unu ka [Chineke] mere ugbu a ka unu na ya dị ná mma site n’anụ ahụ́ nke onye ahụ, site n’ọnwụ ya, ka o wee chee unu n’ihu ya dị ka ndị dị nsọ na ndị na-enweghị mmerụ.”—Kọl. 1:21, 22.

12, 13. (a) Ọ bụrụ na e mere gị baptizim n’aha Ọkpara ahụ, gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na mmadụ emejọọ gị? (b) Gịnị ka i kwesịrị ịna-eme iji gosi na ị bụ Onye Kraịst e mere baptizim n’aha Jizọs?

12 N’agbanyeghị na e mere gị baptizim n’aha Ọkpara ahụ, ị ma nke ọma na ị bụ onye mmehie. Ọmụma ị ma nke a ga na-enyere gị aka kwa ụbọchị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ emejọọ gị, ị̀ na-echeta na unu abụọ bụ ndị mmehie? Unu abụọ ga-achọ ka Chineke na-agbaghara unu mmehie, ununwa kwesịkwara ịna-agbaghara ndị ọzọ. (Mak 11:25) Jizọs mere otu ihe atụ iji gosi na nke a dị mkpa: Otu nwoke kagburu puku mkpụrụ ego talent iri ohu ya ji ya n’ụgwọ, ya bụ, nde dinarịọs iri isii. Ma, ohu ahụ emereghị ohu ibe ya nke ji ya otu narị mkpụrụ ego dinarịọs ebere. Jizọs kwuru na nke a pụtara na Jehova agaghị agbaghara onye na-anaghị agbaghara nwanna ya. (Mat. 18:23-35) N’ezie, ịbụ ndị e mere baptizim n’aha Ọkpara ahụ pụtara na anyị kwesịrị irubere Jizọs isi ma gbaa mbọ na-eṅomi ihe nlereanya o setịpụrụ, na-emekwa ihe ndị ọ kụziiri anyị, nke gụnyere iji obi anyị na-agbaghara ndị mejọrọ anyị.—1 Pita 2:21; 1 Jọn 2:6.

13 O nweghị ka ị ga-esi emetecha ihe niile ka Jizọs n’ihi na i zughị okè. N’agbanyeghị nke ahụ, i kwesịrị ịna-eme ike gị niile iji ṅomie Jizọs ka i wee na-eme ihe kwekọrọ ná nrara ị raara ndụ gị nye Chineke. Nke a pụtara na ị ga-agbalịsi ike yipụ mmadụ ochie ahụ ma yiri nke ọhụrụ. (Gụọ Efesọs 4:20-24.) Ọ bụrụ na ị na-akwanyere enyi gị ùgwù, i nwere ike mewe ka ya ma ọ bụkwanụ malite ịkpa àgwà ọma ọ na-akpa. I kwesịkwara ịmụta ihe n’aka Kraịst ma ṅomie ya.

14. Olee otú ị ga-esi gosi na ị na-akwado ọchịchị nke Jizọs nọ n’eluigwe na-achị?

14 E nwekwara ihe ọzọ ị ga-eme iji gosi na ị ghọtara ihe mmadụ ịbụ onye e mere baptizim n’aha Ọkpara ahụ pụtara. Chineke ‘doro ihe niile n’okpuru ụkwụ Jizọs, meekwa ya onyeisi nke ihe niile n’ihi ọgbakọ ya.’ (Efe. 1:22) Ya mere, otú Jizọs si eduzi ndị raara onwe ha nye Jehova kwesịrị ịdị gị mma. Kraịst ji ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ya bụ, ndị okenye, eduzi ọgbakọ ya. Ihe mere e ji ahọpụta ha bụ “iji na-agbazi ndị nsọ, maka ọrụ ije ozi, maka iwuli ahụ́ nke Kraịst elu.” (Efe. 4:11, 12) Ọ bụrụgodị na mmadụ nke na-ezughị okè emejọọ ihe, Jizọs bụ́ Eze nọ n’eluigwe na-achị Alaeze Chineke, ma oge ọ ga-eji dozie ihe ahụ, marakwa otú ọ ga-esi dozie ya. Ì kwere na nke a bụ eziokwu?

15. Ọ bụrụ na e mebeghị gị baptizim, olee ngọzi ndị i nwere ike ịna-enweta ma e mee gị baptizim?

15 Ụfọdụ n’ime anyị ararabeghị onwe ha nye Jehova, e mebeghịkwa ha baptizim. Ọ bụrụ na ị rarabeghị onwe gị nye Jehova, ihe anyị kwurula n’isiokwu a ò meela ka ị mara na irubere Ọkpara Chineke isi bụ ihe na-egosi na ị ma ihe nakwa na obi dị gị ụtọ maka ihe o meere anyị? I nwere ike inweta ezigbo ngọzi ma ọ bụrụ na e mee gị baptizim n’aha Ọkpara Chineke.—Gụọ Jọn 10:9-11.

N’Aha nke Mmụọ Nsọ

16, 17. Gịnị ka ime gị baptizim n’aha nke mmụọ nsọ pụtara?

16 Gịnị ka ime mmadụ baptizim n’aha nke mmụọ nsọ pụtara? Dị ka anyị kwuru ná mbụ, ndị gere ntị n’ihe ahụ Pita kwuru n’ụbọchị Pentikọst ma ihe bụ mmụọ nsọ. Ha ji anya ha hụ ihe mere n’ụbọchị ahụ, nke na-egosi na Chineke ka ji mmụọ nsọ arụ ọrụ. Pita bụ otu n’ime ndị ‘jupụtara na mmụọ nsọ wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche.’ (Ọrụ 2:4, 8) Ọ bụghị mgbe niile ka okwu bụ́ “n’aha nke” pụtara ime ihe n’aha onye dị adị. Taa, e nwere ọtụtụ ihe a na-eme “n’aha gọọmenti,” bụ́ nke na-abụghị onye dị adị. Ọ bụ n’ikike gọọmenti ka a na-eme ha. N’otu aka ahụ, onye e mere baptizim n’aha nke mmụọ nsọ kwesịrị ịmata na mmụọ nsọ abụghị onye dị adị, kama, ọ bụ ike Jehova nke nọ n’ọrụ. Onye e mere baptizim n’aha nke mmụọ nsọ kwesịkwara ịmata ọrụ mmụọ nsọ na-arụ iji mezuo nzube Chineke.

17 Ọ̀ bụ na ịmụ Baịbụl emebeghị ka ị mata ihe mmụọ nsọ bụ? Dị ka ihe atụ, ị matala na e dere Akwụkwọ Nsọ site n’ike mmụọ nsọ. (2 Tim. 3:16) Ka ị na-amụkwu Baịbụl, ọ ga-abụ na ị ghọtakwuola na ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe na-ewere mmụọ nsọ ya enye ndị na-arịọ’ ka o nye ha ya. (Luk 11:13) Ọ ga-abụ na o nwere mgbe i chere na mmụọ nsọ rụụrụ gị ọrụ. Ma, ọ bụrụ na e mebeghị gị baptizim n’aha nke mmụọ nsọ, ihe ahụ Jizọs kwuru iji mesie anyị obi ike, ya bụ na Nna ya na-enye anyị mmụọ nsọ, pụtara na ị ga-enweta ezigbo ngọzi n’ọdịnihu mgbe Chineke ga-enye gị mmụọ nsọ.

18. Olee ngọzi ndị e mere baptizim n’aha nke mmụọ nsọ na-enweta?

18 O doro anya na Jehova jikwa mmụọ nsọ ya edu ọgbakọ Ndị Kraịst taa. Mmụọ nsọ na-enyekwara onye ọ bụla n’ime anyị aka ime ihe ndị ọ na-eme kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na e mee anyị baptizim n’aha nke mmụọ nsọ, anyị ga-amata ọrụ mmụọ nsọ na-arụ ná ndụ anyị, anyị ga-ejikwa obi ụtọ na-erubere ya isi. Ma, ndị ụfọdụ nwere ike chọọ ka ha mata otú anyị nwere ike isi na-eme ihe kwekọrọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova nakwa otú mmụọ nsọ ga-esi nyere anyị aka ime otú ahụ. Anyị ga-amụ nke a n’isiokwu na-eso nke a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Gụọ Teta! (Bekee) nke October 22, 1981, peeji nke 3-8.

Ì Chetara?

• Gịnị ka ime gị baptizim n’aha nke Nna pụtara?

• Gịnị ka ime mmadụ baptizim n’aha nke Ọkpara pụtara?

• Olee otú i nwere ike isi gosi na ị ghọtara ihe ime mmadụ baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara pụtara?

• Olee ihe ime mmadụ baptizim n’aha mmụọ nsọ pụtara?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Mgbe ememme Pentikọst nke afọ 33 O.A. gachara, olee ụdị mmekọrịta malitere ịdị n’etiti Nna anyị nke eluigwe na ndị bidoro iso ụzọ Kraịst ọhụrụ?

[Ebe E Si Nweta Foto]

A natara ikike n’aka Ụlọ Ndebe Ihe Ochie nke Izrel nke dị na Jeruselem