Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-eme Uche Chineke N’agbanyeghị na Ọnọdụ Gị Agbanweela

Na-eme Uche Chineke N’agbanyeghị na Ọnọdụ Gị Agbanweela

Na-eme Uche Chineke N’agbanyeghị na Ọnọdụ Gị Agbanweela

ỌNỌDỤ gị ọ̀ gbanweela? Ọ̀ na-esiri gị ike idi ihe ndị bịaara gị? E nweela ọtụtụ n’ime anyị nọrọla n’ọnọdụ ị nọ na ya, e nwekwara ọtụtụ ndị ọzọ o nwere ike ịbịara n’ọdịnihu. Ihe ndị bịaara ụfọdụ ndị n’oge gara aga nwere ike ime ka anyị mata àgwà ndị ga-enyere anyị aka idi ọnọdụ ọ bụla bịaara anyị.

Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Devid na otú dị iche iche ọnọdụ ya si gbanwee. Ọ bụ nwata na-azụ atụrụ mgbe Samuel tere ya mmanụ nke na-egosi na ọ ga-abụ eze n’ọdịnihu. Mgbe ọ bụ nwata, ọ pụtara ịlụso dike ndị Filistia, bụ́ Golayat, agha. (1 Sam. 17:26-32, 42) Eze Sọl gwara nwa okorobịa bụ́ Devid ka ọ bịa biri n’obí ya, a họpụtakwara ya ka ọ bụrụ onyeisi ndị agha. O nweghị ka o si gbatatụ Devid n’obi na ọ ga-enwe mgbanwe ndị a ná ndụ ya; ọ maghịkwa ihe ọzọ nwere ike ịgbanwe ná ndụ ya.

Devid na Sọl mechara see ezigbo okwu. (1 Sam. 18:8, 9; 19:9, 10) Devid gbapụrụ n’Izrel gaa biri n’ala ọzọ ruo ọtụtụ afọ maka na Sọl chọrọ igbu ya. Mgbe Devid na-achị Izrel, ọnọdụ ya gbanwekwara nke ukwuu, karịchaa, mgbe ya na nwunye Yuraya kwara iko, ya egbuo Yuraya iji kpuchie ihe o mere. O nwere ọtụtụ nsogbu n’ezinụlọ ya n’ihi mmehie ndị a. Dị ka ihe atụ, nwa ya bụ́ Absalọm chụpụrụ ya n’ọchịchị nọchie. (2 Sam. 12:10-12; 15:1-14) N’agbanyeghị mmehie ndị a niile Devid mere, mgbe o chegharịrị, Jehova gbaghaara ya, ya na ya adịghachikwa ná mma.

Ọnọdụ gị nwekwara ike ịgbanwe. Ọrịa, ihe isi ike, nsogbu ego, ma ọ bụ nsogbu ezinụlọ ma ọ bụkwanụ ihe anyị mere, na-eme ka ọnọdụ anyị gbanwee. Olee àgwà ndị ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị dị otú a ma ha bịara anyị?

Ịdị Umeala n’Obi Na-enyere Anyị Aka

Onye dị umeala n’obi na-erube isi. Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi n’eziokwu, anyị agaghị na-ebuli onwe anyị elu ma ọ bụkwanụ na-eleda ndị ọzọ anya. Ọ bụrụkwa na anyị anaghị eleda àgwà ndị ọzọ nwere, ma ọ bụkwanụ ihe ndị ha metere nke ọma anya, otú ha si akpa àgwà na ihe ndị ha na-eme ga na-amasị anyị. Otú a kwa ka ịdị umeala n’obi nwere ike isi mee ka anyị mata ihe mere ihe ji mee anyị, o nwekwara ike ime ka anyị mara otú anyị ga-esi die ya.

Ihe mere ná ndụ Jọnatan, bụ́ nwa Sọl, na-egosi na nke a bụ eziokwu. Ihe ndị ọ na-enweghị ihe ọ ga-emeli banyere ha gbanwere ọnọdụ ya. Mgbe Samuel gwara Sọl na Jehova ga-anapụ ya alaeze Izrel, o kwughị na ọ bụ Jọnatan ga-anọchi ya. (1 Sam. 15:28; 16:1, 12, 13) Jọnatan agaghị anọchi nna ya n’ihi na onye Chineke họọrọ ka ọ nọchie Sọl bụ Devid. Nke a pụtara na isi Sọl nupụụrụ Jehova metụtara Jọnatan. N’agbanyeghị na aka Jọnatan adịghị n’isi nna ya nupụụrụ Jehova, ọ gaghị anọchi ya. (1 Sam. 20:30, 31) Olee otú Jọnatan si lee ihe a niile anya? Ò wesoro Devid iwe ma nweere ya anyaụfụ maka na e nyeziri ya ihe gaara abịara ya? Mba. N’agbanyeghị na Jọnatan tọrọ Devid nke ọma, kakwara ya hụ ihe ná ndụ, ọ kwadoro ya. (1 Sam. 23:16-18) N’ihi na Jọnatan dị umeala n’obi, ọ matara na Chineke agọziela Devid, o ‘cheghịkwa banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị iche.’ (Rom 12:3) Jọnatan matakwara ihe Jehova chọrọ ka ọ na-eme, ọ nabatakwara ihe bụ́ uche Chineke n’okwu a.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ mgbe, mgbanwe nwere ike ime ka ihe siere mmadụ ike. O nwere mgbe Jọnatan gbalịrị ime ihe ga-amasị mmadụ abụọ ya na ha dị ná mma. Otu bụ enyi ya Devid, bụ́ onye Jehova họpụtara ịchị n’ọdịnihu. Onye nke ọzọ bụ nna ya Sọl, bụ́ onye Jehova jụrụla, ma, ọ ka na-achị n’oge ahụ. Ọ ga-abụrịrị na nke a nyere Jọnatan nsogbu ka ọ nọ na-agbalị ime uche Jehova. Ọ bụrụ na ọnọdụ anyị agbanwee, anyị nwere ike na-echegbu onwe anyị, ụjọ ana-atụkwa anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị amata uche Jehova, anyị ga-enwe ike ịnọgide na-ejere ya ozi n’agbanyeghị mgbanwe ahụ.

Mmadụ Ịma Otú Ike Ya Hà Dị Mkpa

Onye dị obi umeala nwere ike ọ gaghị amacha otú ike ya hà. Ya mere, mmadụ ịma otú ike ya hà dị iche n’onye ahụ ịdị obi umeala.

Devid maara otú ike ya hà. N’agbanyeghị na Jehova ahọpụtala Devid na ọ ga-abụ eze, ọ maliteghị ịchị ruo mgbe ọtụtụ afọ gafere. Baịbụl ekwughị na Jehova gwara Devid ihe mere na ọ gaghị amalite ịchị ozugbo. Ma, nke ahụ enyeghị ya nsogbu, n’agbanyeghị na ụdị ihe a nwere ike ime ka mmadụ chegbuwe onwe ya. Ọ maara otú ike ya hà, marakwa na o nweghị ihe gbagwojuru Jehova anya, bụ́ onye kwere ka ihe dịrị otú ahụ. Ọ bụ ya mere na Devid egbughị Sọl ka o wee hapụ ya aka, o kweghịkwa ka Abishaị, bụ́ onye agha ya, gbuo ya.—1 Sam. 26:6-9.

Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịhụ ihe anyị na-aghọtachaghị n’ọgbakọ anyị ma ọ bụkwanụ anyị echee na otú e si tinye ihe mere n’ọgbakọ anyị ọnụ adịchaghị mma. Ọ bụrụ na anyị dị obi umeala, ànyị ga-echeta na Jizọs bụ Isi ọgbakọ ya nakwa na o ji ndị okenye mmụọ nsọ họpụtara ka ha na-edu ndú na ya na-arụ ọrụ? Ànyị ga-egosi na anyị dị obi umeala site n’icheta na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe anyị dị Jehova mma, anyị kwesịrị ichere ka o si n’aka Jizọs Kraịst na-edu ọgbakọ ya? Ànyị ga-eji obi umeala na-echere n’agbanyeghị na o siri ike ime otú ahụ?—Ilu 11:2.

Ịdị Umeala n’Obi Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya

Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị ga-adị nwayọọ. Nke a na-eme ka anyị die ihe mmadụ mere anyị n’achọghị otú anyị ga-esi megwara, ma ọ bụkwanụ malite iburu ya iwe n’obi. Mmadụ ịdị umeala n’obi adịghị mfe. Ọ bụ ya mere otu amaokwu dị na Baịbụl ji gwa “ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa” ka ha ‘chọọ ịdị umeala n’obi.’ (Zef. 2:3) Ịdị umeala n’obi na mmadụ ịma otú ike ya hà na-agakọ, ya na àgwà ndị ọzọ, ndị dị ka ịdị mma na ịdị nwayọọ, na-agakwa ụkwụ na ụkwụ. Onye dị umeala n’obi na-anabata ọzụzụ na ntụziaka, nke a na-emekwa ka o nwee ọganihu ime mmụọ.

Olee otú ịdị umeala n’obi nwere ike isi mee ka anyị die ọnọdụ ọ bụla bịaara anyị? Ọ ga-abụ na ị chọpụtala na ọtụtụ ndị na-ele ọnọdụ mmadụ ịgbanwe anya dị ka ihe na-adịghị mma. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova nwere ike iji oge ahụ ọnọdụ anyị gbanwere nyekwuo anyị ọzụzụ. Otú ndụ Mozis si gaa na-egosi na nke a bụ eziokwu.

Mozis enweelarị àgwà ndị magburu onwe ha mgbe ọ dị afọ iri anọ. O mere ihe nke gosiri na ihe a na-eme ụmụ Izrel na-ewute ya, ọ dịkwa njikere ịnapụta ha. (Hib. 11:24-26) Ma, tupu Jehova agwa Mozis ka ọ gaa dupụta ụmụ Izrel n’Ijipt, ọtụtụ ihe gbanwere ná ndụ ya wee mee ka ọ dịkwuo umeala n’obi. Ọ gbapụrụ n’Ijipt wee gbaga ala Midian, bụ́ ebe ọ nọrọ iri afọ anọ na-azụ atụrụ, n’abụkwaghị onye a ma ama. Gịnị ka nke a rụpụtara? Otú a ọnọdụ ya si gbanwee mere ka ọ bụrụkwuo ezigbo mmadụ. (Ọnụ Ọgụ. 12:3) Ọ mụtara na ya kwesịrị ibute ihe Chineke chọrọ ụzọ kama ibute ihe yanwa chọrọ.

Iji gosi na Mozis dị umeala n’obi, ka anyị tụlee ihe mere mgbe Jehova kwuru na ya ga-ajụ ụmụ Izrel wee mee ka ụmụ Mozis bụrụ mba dị ike n’ihi na ụmụ Izrel nupụụrụ ya isi. (Ọnụ Ọgụ. 14:11-20) Ma, Mozis rịọrọ Jehova ka ọ gbaghara ha. Ihe o kwuru gosiri na ihe bụ mkpa ya abụghị ọdịmma ya, kama, ọ bụ ka a ghara ịkọcha aha Chineke nakwa ka ihe dịrị ụmụ Izrel mma. Ọ bụ onye dị umeala n’obi ga-arụli ọrụ ahụ Mozis na-arụ, ya bụ, onye ndú ụmụ Izrel na onye ogbugbo n’etiti ha na Jehova. Miriam na Erọn tamuru ntamu megide Mozis, ma, Baịbụl kwuru na “Mozis dị nnọọ umeala n’obi karịa mmadụ niile nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụ. 12:1-3, 9-15) O yiri ka Mozis ò ji obi umeala die okwu ọjọọ ahụ ha gwara ya. Olee ihe gaara eme ma a si na Mozis adịghị umeala n’obi?

E nwere otu mgbe mmụọ Jehova dakwasịrị ndị ikom ụfọdụ, ha amalite ibu amụma. Jọshụa, bụ́ onye na-ejere Mozis ozi, lere ha anya ka ndị na-eme ihe na-ekwesịghị ekwesị. Ma, Mozis ji obi umeala lee ihe ahụ anya otú Jehova si ele ihe anya, o leghị ha anya ka ndị chọrọ ịnaghara ya ọrụ ya. (Ọnụ Ọgụ. 11:26-29) Ọ bụrụ na Mozis adịghị umeala n’obi, ọ̀ gaara anabata mgbanwe ahụ Jehova mere?

Mozis ji ikike dị ukwuu Jehova nyere ya rụọ ọrụ kwesịrị ekwesị n’ihi na ọ dị umeala n’obi. Otu ụbọchị, Jehova gwara Mozis ka ọ gbagoo n’Ugwu Horeb guzoro n’ihu ụmụ Izrel. Chineke si n’ọnụ otu mmụọ ozi gwa Mozis okwu ma họpụta ya ka ọ bụrụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ahụ ya na ụmụ Izrel gbara. Mozis nabatara nnukwu ọrụ a Chineke nyere ya, nọgidekwa na-eme uche ya n’ihi na ọ dị umeala n’obi.

Oleekwanụ maka anyịnwa? Onye ọ bụla n’ime anyị aghaghị ịdị umeala n’obi iji nwee ọganihu. Ndị nwere ihe ùgwù na ikike n’ọgbakọ Chineke kwesịrị ịdị umeala n’obi. Nke a na-eme ka anyị ghara ịdị mpako mgbe ọnọdụ anyị gbanwere, nyekwara anyị aka ime ihe kwesịrị ekwesị n’oge ahụ. Ihe anyị mere n’oge ahụ dị mkpa. Ànyị ga-anabata mgbanwe ahụ? Ànyị ga-ele ya anya dị ka ihe ga-enyere anyị aka inwe ọganihu? O nwere ike ịbụ ihe ga-eme ka anyị malite ịdị umeala n’obi!

Ọnọdụ anyị ga na-agbanwe site n’oge ruo n’oge. Mgbe ụfọdụ, anyị agaghị aghọtacha ihe mere ihe ji mee. Ezughị okè na nsogbu ụwa nwere ike ime ka anyị ghara ile ihe anya otú Jehova si ele ya. Ma, àgwà ndị dị ka ịdị umeala n’obi na mmadụ ịma otú ike ya ha ga-eme ka anyị nabata mgbanwe ọ bụla bịaara anyị wee nọgide na-eme uche Chineke.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi n’eziokwu, anyị agaghị na-ebuli onwe anyị elu

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Onye ọ bụla n’ime anyị aghaghị ịdị umeala n’obi iji nwee ọganihu

[Foto dị na peeji nke 5]

Mozis nwere ihe isi ike ndị mere ka ọ dịkwuo umeala n’obi