Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ndị Ezi Omume Ga-enwu Gbaa Dị Ka Anyanwụ”

“Ndị Ezi Omume Ga-enwu Gbaa Dị Ka Anyanwụ”

“Ndị Ezi Omume Ga-enwu Gbaa Dị Ka Anyanwụ”

“N’oge ahụ, ndị ezi omume ga-enwu gbaa dị ka anyanwụ n’alaeze nke Nna ha.”—MAT. 13:43.

1. Olee ihe dị iche iche metụtara Alaeze ahụ nke Jizọs ji ihe atụ kọwaa?

JIZỌS KRAỊST ji ọtụtụ ihe atụ, ma ọ bụ ilu, kọwaa ọtụtụ ihe banyere Alaeze Chineke. O ji ‘ihe atụ dị iche iche gwa ìgwè mmadụ ahụ okwu. N’ezie, ọ dịghị agwa ha okwu ma ọ bụrụ na o jighị ihe atụ.’ (Mat. 13:34) N’ihe atụ ahụ Jizọs mere banyere ịgha mkpụrụ nke eziokwu Alaeze, o kwuru ọrụ obi mmadụ na-arụ n’ịnabata ozi ọma, kwuokwa ọrụ Jehova na-arụ n’ime ka onye ahụ nwee ọganihu. (Mak 4:3-9, 26-29) Jizọs mekwara ihe atụ otú Alaeze ahụ si aga nnọọ nke ọma n’ụwa ebe a, ọ bụrụgodị na anyị anaghị ahụ ya ozugbo ná mmalite. (Mat. 13:31-33) O kwukwara na ọ bụghị ndị niile ṅara ntị n’ozi ọma Alaeze Chineke ruru eru ịbụ ndị Alaeze ahụ ga-achị.—Mat. 13:47-50. *

2. Olee ndị ka mkpụrụ ọma ahụ na-anọchi anya ha n’ihe atụ ahụ Jizọs mere banyere ọka wit na ata?

2 Ma, otu n’ime ihe atụ ndị Jizọs mere bụ banyere otú e si achịkọta ndị ga-eso ya achị n’Alaeze ya. A na-akpọkarị ya ilu ọka wit na ata, bụ́ nke e dere na Matiu isi iri na atọ. Ọ bụ ezie na n’ihe atụ ọzọ Jizọs mere, o kwuru na mkpụrụ ahụ a ghara bụ “okwu banyere alaeze ahụ,” n’ihe atụ nke a, o kwuru na mkpụrụ ọma ahụ na-anọchi anya ihe ọzọ dị iche, ya bụ, “ụmụ nke alaeze.” (Mat. 13:19, 38) Ndị a abụghị ndị Alaeze ahụ ga-achị, kama, ha bụ “ụmụ,” ma ọ bụ ndị nketa Alaeze ahụ.—Rom 8:14-17; gụọ Galeshia 4:6, 7.

Ihe Atụ nke Ọka Wit na Ata

3. Kọwaa nsogbu nwoke a a kọrọ akụkọ ya n’ihe atụ a nwere nakwa ihe o kpebiri ime banyere nsogbu ya.

3 Jizọs mere ihe atụ, sị: “Alaeze eluigwe dị ka nwoke ghara ezi mkpụrụ n’ubi ya. Mgbe ndị mmadụ nọ na-ehi ụra, onye iro ya bịara kụọ ata n’etiti ọka wit ahụ, ma pụọ. Mgbe akwụkwọ ya pulitere wee mịa mkpụrụ, ata ndị ahụ pulitekwara. Ya mere, ndị ohu nke onyeisi ezinụlọ ahụ bịara sị ya, ‘Nna anyị ukwu, ọ́ bụghị ezi mkpụrụ ka ị ghara n’ubi gị? Oleezi otú o si nwee ata?’ O wee sị ha, ‘Ọ bụ onye iro nke bụ́ mmadụ mere ihe a.’ Ha wee sị ya, ‘Ị̀ chọrọ ka anyị gaa fopụsịa ha? O wee sị, ‘Ee e; ka ọ ghara ịbụ na mgbe unu na-efopụ ata ahụ, unu efopụkọta ha na ọka wit ahụ. Hapụnụ ha abụọ ka ha tokọọ ruo n’oge owuwe ihe ubi; n’oge owuwe ihe ubi, m ga-agwa ndị na-ewe ihe ubi, sị, Burunụ ụzọ chịkọta ata ahụ ma kee ha n’ùkwù n’ùkwù ka e suo ha ọkụ, e mesia, unu agaa chịkọta ọka wit ahụ chịba n’ụlọ nkwakọba ihe m.’”—Mat. 13:24-30.

4. (a) Ònye bụ nwoke ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ Jizọs mere? (b) Olee mgbe Jizọs malitere ịgha mkpụrụ a, oleekwa otú o si mee nke a?

4 Ònye bụ nwoke ahụ kụrụ mkpụrụ ọma n’ubi ya? Jizọs mechara zaa ajụjụ a mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onye ghara ezi mkpụrụ ahụ bụ Nwa nke mmadụ.” (Mat. 13:37) Jizọs, bụ́ “Nwa nke mmadụ,” kwadebere ubi ahụ ka e wee kụọ ya mkpụrụ mgbe o jere ozi afọ atọ na ọkara n’ụwa. (Mat. 8:20; 25:31; 26:64) Malitezie na Pentikọst nke afọ 33 O.A. gawa, o bidoro ịgha mkpụrụ ọma, ya bụ, “ụmụ nke Alaeze.” A malitere ịgha mkpụrụ a mgbe Jizọs, bụ́ onye nnọchiteanya Jehova, malitere ịwụsa ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ, si otú ahụ tee ha mmanụ ka ha bụrụ ụmụ Chineke. * (Ọrụ 2:33) Mkpụrụ ọma ahụ toro ghọọ ọka wit. Ya mere, ihe mere e ji ghaa mkpụrụ ọma ahụ bụ ka e nwee ike ịchịkọta ndị niile ga-eso Jizọs keta Alaeze wee soro ya chịa.

5. Ònye bụ onye iro e kwuru okwu ya n’ihe atụ ahụ, oleekwa ndị bụ ata?

5 Ònye bụ onye iro ahụ, oleekwa ndị bụ́ ata? Jizọs kwuru na onye iro ahụ “bụ Ekwensu.” O kwuru na ata ndị ahụ bụ “ụmụ ajọ onye ahụ.” (Mat. 13:25, 38, 39) Ikekwe ata Jizọs na-ekwu okwu ya bụ ụdị ata nke na-egbu ọka wit. Mgbe ata a na-eto, ọ na-eyi ọka wit. Nke a bụ nnọọ otú Ndị Kraịst adịgboroja dị, bụ́ ndị na-ekwu na ha bụ ụmụ Alaeze, ma, ha anaghị amị ezigbo mkpụrụ. Ndị Kraịst adịgboroja a, bụ́ ndị sị na ha bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, so ná “mkpụrụ” nke Setan bụ́ Ekwensu.—Jen. 3:15.

6. Olee mgbe ata ahụ malitere ịpụta, oleekwa otú ndị mmadụ si “na-ehi ụra” mgbe ahụ?

6 Olee mgbe Ndị Kraịst a yiri ata pụtara? Jizọs kwuru, sị: “Mgbe ndị mmadụ nọ na-ehi ụra.” (Mat. 13:25) Olee mgbe nke a mere? Ihe Pọl onyeozi gwara ndị okenye nọ n’Efesọs zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “Amaara m na mgbe m pụsịrị, anụ ọhịa wolf ndị obi tara mmiri ga-abata n’etiti unu, ha agaghịkwa emere ìgwè atụrụ ahụ ebere, ndị ikom ga-esikwa n’etiti unu onwe unu bilie, na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.” (Ọrụ 20:29, 30) Ọ gwakwara ndị okenye ahụ ka ha mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ. Mgbe ndịozi nwụrụ, bụ́ ndị bụ “ihe mgbochi” megide Ndị Kraịst adịgboroja, ọtụtụ Ndị Kraịst hiwere ụra n’ụzọ ime mmụọ. (Gụọ 2 Ndị Tesalonaịka 2:3, 6-8.) * Ọ bụ mgbe ahụ ka Ndị Kraịst adịgboroja pụtara nnọọ ìhè.

7. Ọka wit ụfọdụ hà ghọrọ ata? Kọwaa.

7 Jizọs ekwughị na ọka wit ga-aghọ ata, kama, ihe o kwuru bụ na a kụrụ ata n’etiti ọka wit. N’ihi ya, ihe atụ a anaghị ekwu banyere ezigbo Ndị Kraịst ndị hapụrụ eziokwu. Kama nke ahụ, ọ na-ekwu banyere mbọ Setan na-agba imebi ọgbakọ site n’ime ka ndị ọjọọ bata n’ime ya. A malitere ịhụ Ndị Kraịst adịgboroja a nke ọma mgbe onyeozi ikpeazụ fọdụrụ ndụ, bụ́ Jọn, mere agadi.—2 Pita 2:1-3; 1 Jọn 2:18.

“Hapụnụ Ha Abụọ Ka Ha Tokọọ Ruo n’Oge Owuwe Ihe Ubi”

8, 9. (a) Olee ihe mere ihe Nna ukwu ahụ gwara ndị odibo ya ji kwesị ekwesị n’anya ndị na-ege Jizọs ntị? (b) Olee otú ọka wit na ata ahụ si tokọọ?

8 Ndị ohu Nna ukwu ahụ gwara ya ihe merenụ ma jụọ ya, sị: “Ị̀ chọrọ ka anyị gaa fopụsịa [ata ndị ahụ]?” (Mat. 13:27, 28) Ihe ọ zara yiri ka o juru ha anya. Ọ gwara ha ka ha hapụ ọka wit na ata ndị ahụ ka ha tokọọ ruo oge owuwe ihe ubi. Ndị na-eso ụzọ Jizọs kwetara na nke ahụ bụ ihe e kwesịrị ime. Ha ma na o siri ike ịmata nke bụ́ ọka wit na nke bụ́ ata a a na-ekwu okwu ya. Ndị ọrụ ugbo makwaara na mgbọrọgwụ ata ahụ na-atụhịkarị ná mgbọrọgwụ ọka wit, nke na onye chọrọ ifopụ ata ahụ ga-efopụkwu ọka wit. * Ka a sịkwa ihe mere Nna ha ukwu ji gwa ha ka ha chere!

9 Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ọtụtụ ata epupụtala n’ọtụtụ okpukpe Krisendọm. Ebe mbụ nke a mere bụ n’okpukpe Roman Katọlik nakwa na chọọchị Ọtọdọks, e mechaa nwee ya n’okpukpe Protestant ndị pụtara ọhụrụ. E nwekwara ọka wit ole na ole n’ụwa n’oge ndị a. Onye nwe ụlọ nke e kwuru okwu ya n’ihe atụ ahụ nwere ndidi wee na-eche n’ogologo oge niile ihe ndị a na-etolite, ruo oge owuwe ihe ubi, bụ́ nke na-agaghị egbu oge.

Oge Owuwe Ihe Ubi nke A Tụwara Anya Ya Kemgbe

10, 11. (a) Olee mgbe bụ oge owuwe ihe ubi? (b) Olee otú e si na-achịba ọka wit ihe atụ ahụ n’ụlọ nkwakọba ihe nke Jehova?

10 Jizọs gwara anyị, sị: “Owuwe ihe ubi ahụ bụ ọgwụgwụ nke usoro ihe a, ndị ahụ na-ewe ihe ubi bụ ndị mmụọ ozi.” (Mat. 13:39) N’ụbọchị ikpeazụ nke ajọ ụwa a, a na-ekewa ndị mmadụ. A ga-achịkọta ụmụ nke Alaeze ma debe ha iche ka ha na ndị yiri ata ghara ịnọ. Pita onyeozi gwara anyị banyere nke a, sị: “Oge a kara aka eruwo ka ikpe malite n’ụlọ Chineke. Ma ọ bụrụ na ọ ga-amalite n’ebe anyị nọ, gịnị ka ọgwụgwụ ya ga-abụrụ ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma Chineke?”—1 Pita 4:17.

11 Obere oge mgbe ụbọchị ikpeazụ, ma ọ bụ “ọgwụgwụ nke usoro ihe a,” bidoro, a malitere ikpe ndị sị na ha bụ ezigbo Ndị Kraịst ikpe, iji mara ma hà bụ n’ezie “ụmụ nke alaeze” ka ọ̀ bụ “ụmụ ajọ onye ahụ.” Babịlọn Ukwu ahụ ‘bu ụzọ’ daa, “e mesịa” a chịkọta ụmụ nke Alaeze ná mmalite nke oge owuwe ihe ubi ahụ. (Mat. 13:30) Ma, olee otú e si na-achịba ọka wit ihe atụ ahụ n’ụlọ nkwakọba ihe nke Jehova? A na-akpọba ndị a e wetara n’ubi n’ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ ebe ha na Chineke ga-adị ná mma, ya echebekwa ha, ma ọ bụkwanụ ha enweta ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe.

12. Ogologo oge hà otú ole ka owuwe ihe ubi ahụ ga-ewe?

12 Ikpe ahụ ọ̀ ga-ewe oge hà otú ole? Jizọs kwuru na a ga-enwe “oge” owuwe ihe ubi, nke na-egosi na ọ ga-ewetụ oge. (Mkpu. 14:15, 16) A ga na-ekpe onye ọ bụla so ná ndị e tere mmanụ ikpe n’oge ọgwụgwụ a niile. A ga na-ekpe ya ruo mgbe a kara ha akara ikpeazụ.—Mkpu. 7:1-4.

13. Olee otú ata ndị a si na-eme ka a sụọ ngọngọ, oleekwa otú ha si na-emebi iwu?

13 Ole ndị ka a ga-esi n’Alaeze nwa nke mmadụ chịpụta, oleekwa otú ha si na-eme ka a sụọ ngọngọ, na-emebikwa iwu? (Mat. 13:41) Ndị ụkọchukwu Krisendọm, bụ́ ndị yiri ata, eduhiela ọtụtụ nde mmadụ kemgbe ọtụtụ narị afọ. Ha na-eme nke a site n’izi ndị mmadụ ozizi na-anaghị ewetara Chineke nsọpụrụ, ya bụ, “ihe niile na-eme ka a sụọ ngọngọ.” Ha na-akụzi na Chineke na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ, na-akụzikwa ozizi Atọ n’Ime Otu, bụ́ nke dị mgbagwoju anya. Ọtụtụ ndị ndú okpukpe na-esetịpụrụ atụrụ ha ihe nlereanya ọjọọ site n’ịbụ enyi ụwa, bụ́ nke e ji tụnyere ịkwa iko. Mgbe ụfọdụ kwa, ha na-eme omume jọgburu onwe ya. (Jems 4:4) Ihe ọzọkwa bụ na Krisendọm na-ekwe ka ndị na-eme omume rụrụ arụ nọgide n’ime ya. (Gụọ Jud 4.) N’agbanyeghị ihe a niile, ha na-eme ka hà dị nsọ, nakwa ka hà na-eme uche Chineke. Obi dị anyị nnọọ ụtọ na a ga-ekewapụ ụmụ nke Alaeze n’etiti ndị a yiri ata, bụ́ ndị na-ezi ozizi ụgha nke na-eme ka a sụọ ngọngọ.

14. Olee otú ndị yiri ata si akwa ákwá, na-atakwa ikikere ezé?

14 Olee otú ndị yiri ata si na-akwa ákwá ma na-ata ikikere ezé? (Mat. 13:42) Otú “ụmụ nke alaeze” si ata “ụmụ ajọ onye ahụ” ahụhụ bụ na ha na-eme ka a mara ozizi ụgha nke ndị a yiri ata ji eduhie ndị mmadụ. Ha na-enwekwu mwute n’ihi na ọtụtụ ndị chọọchị ha na-ahapụzi ha, nakwa n’ihi na ndị nkịtị anaghịzi akwanyere ha ùgwù.—Gụọ Aịzaya 65:13, 14.

15. Olee otú a ga-esi akpọ ndị yiri ata ọkụ?

15 Olee otú e si achịkọta ata ma na-akpọ ha ọkụ? (Mat. 13:40) Nke a na-ekwu banyere ihe a ga-eme ata ndị a n’ikpeazụ. A ga-atụba ha n’ime ọdọ ọkụ ihe atụ nke pụtara mbibi ebighị ebi. (Mkpu. 20:14; 21:8) A ga-ala Ndị Kraịst adịgboroja yiri ata n’iyi ‘n’oké mkpagbu’ ahụ.—Mat. 24:21.

Ha “Ga-enwu Gbaa Dị Ka Anyanwụ”

16, 17. Gịnị ka Malakaị buru n’amụma banyere ụlọ nsọ Chineke, oleekwa otú nke a si malite imezu?

16 Olee mgbe ndị yiri ọka wit ‘na-enwu gbaa dị ka anyanwụ’? (Mat. 13:43) Malakaị buru amụma banyere mgbe a ga-eme ka ụlọ nsọ Chineke dị ọcha, sị: “‘Na mberede, ezi Onyenwe unu, bụ́ onye unu na-achọ, ga-abịa n’ụlọ nsọ Ya, ya na onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ, onye unu nwere mmasị na ya. Lee! Ọ ga-abịa,’ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. ‘Ma ònye pụrụ idi ụbọchị ọ ga-abịa, ònye pụkwara iguzo mgbe ọ ga-apụta? N’ihi na ọ ga-adị ka ọkụ nke onye na-anụcha ihe, dịkwa ka ncha nke ndị na-asụ ákwà. Ọ ga-anọdụkwa dị ka onye na-anụcha ihe na onye na-eme ka ọlaọcha dị ọcha, ọ ga-emekwa ka ụmụ Livaị dị ọcha; ọ ga-anụcha ha dị ka ọlaedo, nụchaakwa ha dị ka ọlaọcha, ha ga-aghọkwara Jehova ndị na-eweta onyinye inweta ihu ọma n’ezi omume.’”—Mal. 3:1-3.

17 N’oge a, o doro anya na a malitere imezu amụma a n’afọ 1918 mgbe Jehova na “onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ,” bụ́ Jizọs Kraịst, nyochara ụlọ nsọ ime mmụọ. Malakaị gwara anyị ihe mere ozugbo e mechara nnyocha a. Ọ sịrị: “Unu ga-ahụkwa ọzọ ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye ajọ omume, n’etiti onye na-ejere Chineke ozi na onye na-adịghị ejere ya ozi.” (Mal. 3:18) Otú Ndị Kraịst ahụ e mere ka ha nweghachi ume si jiri ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ ahụ gosiri na ọ bụ mgbe ahụ ka oge owuwe ihe ubi ahụ malitere.

18. Olee ihe Daniel buru n’amụma na ọ ga-eme n’oge anyị a?

18 Daniel onye amụma kwuru okwu banyere oge anyị mgbe o buru amụma, sị: “Ndị nwere nghọta ga na-enwu dị ka ìhè mbara igwe; ndị na-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ bụrụ ndị ezi omume ga na-enwukwa dị ka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Dan. 12:3) Olee ndị bụ́ ndị a na-enwu gbaa? E nweghị ndị ọzọ ọ bụ ma ọ́ bụghị Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị bụ́ ezigbo ọka wit ahụ Jizọs kwuru okwu ya n’ihe atụ ahụ o ji ọka wit na ata mee. Oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị na-amụba amụba, ndị yiri atụrụ, ma nke ọma na a ‘na-achịkọta’ Ndị Kraịst adịgboroja, bụ́ ndị yiri ata. Ka ndị Alaeze Chineke ga-achị na Izrel ime mmụọ na-akpakọrịta, ha na-enwukwa gbaa n’ụwa a nke gbara ọchịchịrị.—Zek. 8:23; Mat. 5:14-16; Fil. 2:15.

19, 20. Gịnị ka “ụmụ nke alaeze” na-atụsi anya ya ike, oleekwa ihe a ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a?

19 Taa, “ụmụ nke alaeze” na-atụsi anya ụgwọ ọrụ dị ebube ike, nke bụ́ ịga eluigwe. (Rom 8:18, 19; 1 Kọr. 15:53; Fil. 1:21-24) Tupu e nye ha ụgwọ ọrụ ha, ha aghaghị ịnọgide na-eme uche Chineke, na-enwu gbaa, na-anọpụkwa iche n’ebe “ụmụ ajọ onye ahụ” nọ. (Mat. 13:38; Mkpu. 2:10) Obi dị anyị nnọọ ụtọ na anyị nwere ihe ùgwù nke ịhụ ihe si ná ‘nchịpụta’ a na-achịpụta ata n’oge anyị pụta.

20 Ma, olee ihe jikọrọ ụmụ nke Alaeze na oké ìgwè mmadụ nke na-amụba n’ike n’ike, bụ́ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ha? Isiokwu na-eso nke a ga-aza ajụjụ a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 1 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma ebe a kọwara ihe atụ ndị a nke ọma, gụọ Ụlọ Nche nke July 15, 2008, peeji nke 12-21.

^ par. 4 N’ilu a, ịgha mkpụrụ anaghị anọchi anya ọrụ ikwusa ozi ọma na nke ime ndị na-eso ụzọ anyị na-arụ, bụ́ nke ga-eme ka e nwee ndị ọhụrụ ga-aghọ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Jizọs kwuru banyere mkpụrụ ọma ahụ a ghara n’ubi, sị: “Ezi mkpụrụ ahụ bụ [ọ bụghị “ga-abụ”] ụmụ nke alaeze.” Ọghịgha mkpụrụ ahụ bụ ite ụmụ nke Alaeze ahụ mmanụ n’ime ụwa nke yiri ubi.

^ par. 6 Okwu Grik e si na ya sụgharịta “ndapụ n’ezi ofufe” nwere ike ịpụta ndị si n’ọgbakọ Ndị Kraịst pụọ nakwa Ndị Kraịst adịgboroja, bụ́ ndị Ekwensu kụrụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst.

^ par. 8 Gụọ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peeji nke 1178.

Ì Chetara?

N’ihe atụ ahụ Jizọs mere banyere ọka wit na ata, gịnị ka ihe ndị na-esonụ pụtara?

• Mkpụrụ ọma ahụ

• Nwoke ahụ nke ghara mkpụrụ

• Ịgha mkpụrụ

• Onye iro

• Ata

• Oge owuwe ihe ubi

• Ụlọ nkwakọba ihe

• Ịkwa ákwá na ịta ikikere ezé

• Ọdọ ọkụ

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

A malitere ịgha mkpụrụ ọma ahụ na Pentikọst nke afọ 33 O.A.

[Foto dị na peeji nke 23]

A na-achịba ọka wit ihe atụ ahụ n’ụlọ nkwakọba ihe nke Jehova

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.