Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu Ìgwè Atụrụ, Otu Onye Ọzụzụ Atụrụ

Otu Ìgwè Atụrụ, Otu Onye Ọzụzụ Atụrụ

Otu Ìgwè Atụrụ, Otu Onye Ọzụzụ Atụrụ

“Unu onwe unu ndị sowooro m ga-anọdụkwa ala n’ocheeze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.”—MAT. 19:28.

1. Olee otú Jehova si meso ụmụ Ebreham ihe, oleekwa ihe gosiri na nke a apụtaghị na o leghaara ndị ọzọ niile anya kpamkpam?

JEHOVA hụrụ Ebreham n’anya, ọ bụkwa ya mere o ji hụ ụmụ Ebreham n’anya nke ukwuu. Ruo ihe karịrị otu puku afọ na narị ise, ụmụ Izrel, bụ́ ụmụ Ebreham, bụ ndị ọ họọrọ, ya bụ, ‘ihe onwunwe ya pụrụ iche.’ (Gụọ Diuterọnọmi 7:6.) Nke ahụ ọ̀ pụtara na Jehova leghaara ndị mba ọzọ anya kpamkpam? Mba. N’oge ahụ, Jehova kwere ka ndị na-abụghị ndị Izrel chọrọ ife ya soro mba ya pụrụ iche na-efe ya. A na-ele ndị ahụ malitere ife Jehova, bụ́ ndị na-eso ụzọ ndị Juu, anya dị ka ndị Izrel. Ụmụ Izrel kwesịrị ịna-emeso ha ihe ka ụmụnne ha. (Lev. 19:33, 34) Jehova chọkwara ka ha na-erube isi n’iwu ya niile.—Lev. 24:22.

2. Olee ihe dị ịtụnanya Jizọs kwuru, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-ajụ banyere nke a?

2 Ma, Jizọs gwara ndị Juu oge ahụ ihe tụrụ ha n’anya, sị: “A ga-anapụ unu alaeze Chineke, werekwa ya nye mba nke na-amị mkpụrụ ya.” (Mat. 21:43) Olee ndị ga-abụ ndị mba ọhụrụ a, oleekwa otú mgbanwe a si metụta anyị taa?

Mba Ọhụrụ Ahụ

3, 4. (a) Olee otú Pita si mee ka a mata mba ọhụrụ ahụ? (b) Olee ndị bụ́ ndị mba ọhụrụ ahụ?

3 Pita onyeozi mere ka a mata ndị bụ́ mba ọhụrụ a nke ọma. O degaara ụmụnna ya ihe na-esonụ n’akwụkwọ, sị: “Unu bụ ‘agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ, otu ndị pụrụ iche nke Chineke, ka unu wee kwusaa n’ebe niile ịdị mma’ nke onye ahụ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị wee kpọba unu n’ìhè ya dị ebube.” (1 Pita 2:9) Dị ka e buru n’amụma, ndị Juu nkịtị, bụ́ ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ ndị mbụ Jehova họọrọ ka ha bụrụ ndị mba ọhụrụ ahụ. (Dan. 9:27a; Mat. 10:6) Ka oge na-aga, ọtụtụ ndị na-abụghị ụmụ Izrel ghọkwara ndị mba ahụ n’ihi na Pita kwukwara, sị: “O nwere mgbe unu na-abụghị otu ndị, ma ugbu a, unu bụ ndị Chineke.”—1 Pita 2:10.

4 Olee ndị Pita gwara ihe a? Ná mmalite akwụkwọ ozi ya, ọ sịrị: “[Chineke] mụrụ anyị ọzọ ka anyị wee nwee olileanya dị ndụ site n’ime ka Jizọs Kraịst si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, ka anyị wee nweta ihe nketa a na-apụghị ibibi ebibi, nke a na-emerụghị emerụ, nke na-adịghịkwa emebi emebi. E debeere ya unu n’eluigwe.” (1 Pita 1:3, 4) Ya mere, ndị mba ọhụrụ a bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị nwere olileanya ịga eluigwe. Ha bụ “Izrel nke Chineke.” (Gal. 6:16) Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ na ndị Izrel ime mmụọ a dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. “E si n’etiti ụmụ mmadụ zụta ha dị ka mkpụrụ mbụ a zụtaara Chineke na Nwa Atụrụ ahụ,” ha “ga-esokwa [Jizọs] chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ ahụ.”—Mkpu. 5:10; 7:4; 14:1, 4; 20:6; Jems 1:18.

È Nwere Ndị Ọzọ So ná Mba Izrel?

5. (a) Olee ndị Baịbụl kpọrọ “Izrel nke Chineke”? (b) Gịnị mere na ọ bụghị oge niile ka okwu ahụ bụ́ “Izrel” na-apụta otu ihe?

5 O doro anya na okwu ahụ bụ́ “Izrel nke Chineke,” bụ́ nke dị ná Ndị Galeshia 6:16, na-ekwu naanị banyere Ndị Kraịst e tere mmanụ. Ma, ò nwetụla mgbe Jehova ji Izrel mee ihe atụ nke gụnyere Ndị Kraịst ndị ọzọ na-abụghị ndị e tere mmanụ? Anyị ga-ahụ azịza ajụjụ a n’ihe Jizọs gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ sịrị: “Mụ na unu na-agbakwa ndụ maka alaeze, dị nnọọ ka mụ na Nna m gbara ndụ, ka unu wee rie ma ṅụọ na tebụl m n’alaeze m, nọdụkwa ala n’ocheeze ikpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.” (Luk 22:28-30) Nke a ga-eme n’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst, bụ́ mgbe a “ga-eme ka ihe dị ọhụrụ.”—Gụọ Matiu 19:28.

6, 7. Ole ndị ka akwụkwọ Matiu 19:28 na Luk 22:30 nakwa amaokwu ndị gbara ha gburugburu gosiri na ha bụ “ebo iri na abụọ nke Izrel”?

6 Otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-anọ n’eluigwe na-achị n’oge Ọchịchị Puku Afọ ahụ, ha ga-abụkwa ndị nchụàjà na ndị ikpe n’oge ahụ. (Mkpu. 20:4) Ole ndị ka ha ga na-ekpe ikpe, oleekwa ndị ha ga na-achị? Akwụkwọ Matiu 19:28 nakwa Luk 22:30 kwuru na ha ga-ekpe “ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.” Ole ndị ka “ebo iri na abụọ nke Izrel” e kwuru okwu ya n’amaokwu ndị a na ndị nke gbara ha gburugburu na-anọchi anya ha? Ha na-anọchi anya ndị niile nwere olileanya ibi n’ụwa, ya bụ, ndị nwere okwukwe n’àjà Jizọs chụrụ, ma, ha abụghị ndị ahụ ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà. (A naghị ede aha ebo Livaị n’ebe e depụtara aha ebo iri na abụọ nke Izrel nkịtị.) Ndị ahụ ebo iri na abụọ nke Izrel na-anọchi anya ha n’amaokwu ndị ahụ bụ ndị ọrụ ịchụàjà otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga na-arụ ga-abara uru. Ndị a na-abụghị ndị nchụàjà bụ ndị Chineke, ọ hụkwara ha n’anya, ihe ha dịkwa ya mma. Iji ha tụnyere Izrel oge ochie kwesikwara ekwesị.

7 Ọ bụ ya mere na mgbe Jọn hụrụ mgbe a kara otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ akara tupu oké mkpagbu ukwu ahụ amalite, ọ hụkwara “oké ìgwè mmadụ,” nke a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, bụ́ ndị si “ná mba niile.” (Mkp. 7:9) O nweghị ihe ga-eme ha n’oge oké mkpagbu ahụ, ha ga-anọkwa ndụ mgbe Kraịst ga-achị Ọchịchị Puku Afọ. Ọtụtụ ijeri ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-eso ha dịrị ndụ. (Jọn 5:28, 29; Mkpu. 20:13) Ha niile ga-abụ “ebo iri na abụọ nke Izrel” ihe atụ ahụ, bụ́ ndị Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, ndị ya na ha ga-achị, ga na-ekpe ikpe.—Ọrụ 17:31; 24:15; Mkpu. 20:12.

8. Olee otú ihe ndị a na-eme n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie nke ụmụ Izrel na-eme kwa afọ si egosi ihe jikọrọ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ na ụmụ mmadụ ndị ọzọ?

8 Ihe ndị a na-eme n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie na-egosi ụdị ọnọdụ dị n’etiti otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ na ụmụ mmadụ ndị ọzọ. (Lev. 16:6-10) Iwu ahụ kwuru na nnukwu onye nchụàjà ga-ebu ụzọ chụọ oké ehi n’àjà iji kpuchie “mmehie ya, kpuchiekwara ụlọ ya.” Ya mere, ndị mbụ àjà Jizọs chụrụ baara uru bụ ndị ezinụlọ ya, ya bụ, ndị nchụàjà ndị ọzọ, bụ́ ndị ga-eso ya na-arụ ọrụ ndị nchụàjà n’eluigwe. Ihe ọzọkwa bụ na n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ahụ, a na-egbu ewu abụọ maka mmehie ụmụ Izrel ndị ọzọ. N’ebe a, ebo ndị nchụàjà na-anọchi anya otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, ndị Izrel ndị ọzọ na-anọchi anya ndị niile nwere olileanya ibi n’ụwa. Nke a na-egosi na okwu ahụ bụ́ “ebo iri na abụọ nke Izrel,” nke dị na Matiu 19:28, abụghị ndị e ji mmụọ nsọ mụta, bụ́ ndị ha na Jizọs ga-abụ ndị nchụàjà, kamakwa, ọ bụ ndị ọzọ niile nwere okwukwe n’àjà ahụ Jizọs chụrụ. *

9. N’ọhụụ ahụ Ezikiel hụrụ banyere ụlọ nsọ, ole ndị ka ndị nchụàjà na-anọchi anya ha, oleekwa ndị ndị Izrel ndị ọzọ na-abụghị ndị nchụàjà na-anọchi anya ha?

9 Tụlee ihe atụ ọzọ. Mgbe Ezikiel onye amụma hụrụ ụlọ nsọ Jehova n’ọhụụ, ọ hụrụ ọtụtụ ihe. (Ezik. Isi nke 40 ruo 48) N’ọhụụ ahụ, ndị nchụàjà na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ ahụ, na-akụziri ndị ọzọ ihe, Jehova na-enyekwa ha ndụmọdụ, na-agbazikwa ha. (Ezik. 44:23-31) Ebo dị iche iche na-abịakwa ebe ahụ efe Jehova, na-achụkwara ya àjà. (Ezik. 45:16, 17) N’ọhụụ a, ndị nchụàjà na-anọchi anya ndị e tere mmanụ, ebe ndị Izrel ndị ọzọ, ndị na-esighị n’ebo ndị nchụàjà, na-anọchi anya ndị nwere olileanya ibi n’ụwa. Ọhụụ ahụ na-egosi na ndị nchụàjà na ndị na-abụghị ndị nchụàjà dị n’otu, na-arụkọkwa ọrụ ọnụ, ma, ọ bụ ndị nchụàjà na-ahazi otú ofufe ga-esi na-aga.

10, 11. (a) Olee otú ihe ahụ Jizọs kwuru si na-emezu, bụ́ nke na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike? (b) Olee ajụjụ anyị na-ajụ banyere atụrụ ọzọ?

10 Jizọs kwuru okwu banyere “atụrụ ọzọ,” bụ́ “ndị na-anọghị n’ogige atụrụ” nke “ìgwè atụrụ nta” bụ́ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ. (Jọn 10:16; Luk 12:32) Ọ sịrị: “M ga-akpọtakwa ha, ha ga-ege ntị n’olu m, ha ga-aghọ otu ìgwè atụrụ, nweekwa otu onye ọzụzụ atụrụ.” Otú ihe a Jizọs kwuru sirila mezuo na-eme ka okwukwe anyị sie nnọọ ike. Ìgwè abụọ a adịrịla n’otu, ya bụ, ndị e tere mmanụ bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha na-ehighị nne, na oké ìgwè mmadụ bụ́ atụrụ ọzọ. (Gụọ Zekaraya 8:23.) N’agbanyeghị na atụrụ ọzọ anaghị eje ozi n’ogige nke dị n’ime n’ụlọ nsọ ihe atụ ahụ, ha na-eje ozi n’ogige nke dị ná mpụta.

11 Ma, ọ bụrụ na Jehova na-eji ndị na-abụghị ndị nchụàjà n’Izrel ese onyinyo atụrụ ọzọ mgbe ụfọdụ, ọ̀ pụtara na ndị nwere olileanya ibi n’ụwa kwesịrị iso na-ata achịcha ma ọ bụ na-aṅụ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs? Ugbu a, ka anyị tụlee azịza nke ajụjụ a.

Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ahụ

12. Olee ndokwa ọhụrụ Jehova buru n’amụma?

12 Jehova buru amụma na ya ga-emere ndị ya ndokwa ọhụrụ mgbe ọ sịrị: “Nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị. . . . M ga-etinye iwu m n’ime ha, m ga-edekwa ya n’obi ha. M ga-abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.” (Jer. 31:31-33) Ọgbụgba ndụ ọhụrụ a ga-eme ka nkwa Jehova kwere Ebreham mezuo n’ụzọ dị ebube.—Gụọ Jenesis 22:18.

13, 14. (a) Olee ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? (b) Ole ndị na-erite uru n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, oleekwa otú ha si ‘ejidesi ya ike’?

13 Jizọs kwuru okwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ a n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ, mgbe ọ sịrị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke dabeere n’ọbara m, bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi unu.” (Luk 22:20; 1 Kọr. 11:25) Ndị Kraịst niile hà so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ a? Mba. Ndị ụfọdụ, ndị dị ka ndịozi, bụ́ ndị ṅụrụ mmanya ahụ n’anyasị ahụ, so n’ọgbụgba ndụ ahụ. * Ha na Jizọs gbara ndụ ọzọ na ya na ha ga-achị n’Alaeze ya. (Luk 22:28-30) Ha na Jizọs ga-achị n’Alaeze ya.—Luk 22:15, 16.

14 Oleekwanụ maka ndị ga-ebi n’ụwa mgbe Alaeze ahụ ga na-achị? Ha ga-erite uru n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. (Gal. 3:8, 9) N’agbanyeghị na ha esoghị n’ọgbụgba ndụ a, ha ‘na-ejidesi ya ike’ site n’idebe iwu ya, dị ka Aịzaya onye amụma kwuru, sị: “Ndị mba ọzọ, bụ́ ndị sonyeere Jehova iji jeere ya ozi na iji hụ aha Jehova n’anya, iji bụrụ ndị ohu ya, ndị niile na-edebe ụbọchị izu ike ka ha ghara imerụ ya, ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike, m ga-akpọrọ ha bịa n’ugwu nsọ m, meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ n’ụlọ ekpere m.” Jehova sịkwara: “A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere dịịrị ndị niile.”—Aịza. 56:6, 7.

Olee Ndị Kwesịrị Ịta Achịcha Ma Ọ Bụkwanụ Ṅụọ Mmanya E Ji Echeta Ọnwụ Jizọs?

15, 16. (a) Gịnị ka Pọl onyeozi kwuru na ọ ga-abụ ọrụ ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? (b) Olee ihe mere na ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ekwesịghị ịta achịcha ma ọ bụkwanụ ịṅụ mmanya e ji echeta Ọnwụ Jizọs?

15 Ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ “nwere obi ike isi n’ụzọ e si abanye n’ebe nsọ ahụ gafere.” (Gụọ Ndị Hibru 10:15-20.) Ha “ga-enweta alaeze nke a na-apụghị ime ka ọ maa jijiji.” (Hib. 12:28) Ya mere, ọ bụ naanị ndị ahụ ha na Jizọs Kraịst ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe kwesịrị ịṅụ mmanya dị ‘n’iko’ ahụ, bụ́ nke na-anọchi anya ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Ọ bụ ha ka Nwa Atụrụ ahụ kwere nkwa ọlụlụ. (2 Kọr. 11:2; Mkpu. 21:2, 9) Ndị ọzọ niile, bụ́ ndị na-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ, na-abịa iji kwanye ùgwù, ha anaghị ata achịcha ma ọ bụkwanụ ṅụọ mmanya e ji echeta ya.

16 Pọl mekwara ka anyị mata na ndị nwere olileanya ibi n’ụwa anaghị ata achịcha ma ọ bụkwanụ na-aṅụ mmanya ahụ. Ọ gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ, sị: “N’ihi na n’oge niile unu na-ata ogbe achịcha a ma na-aṅụ iko a, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị, ruo mgbe ọ ga-abịarute.” (1 Kọr. 11:26) Olee mgbe Onyenwe anyị “ga-abịarute”? Ọ bụ mgbe ọ ga-abịa ịkpọrọ ndị ikpeazụ n’ime òtù nwaanyị ọ na-alụ ọhụrụ, bụ́ ndị e tere mmanụ, ndị ọ ga-akpọrọ gaa n’ebe obibi ha n’eluigwe. (Jọn 14:2, 3) Nke a na-egosi na o nwere mgbe anyị ga-akwụsị Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị nke anyị na-eme kwa afọ. “Ndị fọdụrụ n’ime” mkpụrụ nwaanyị ahụ ndị nke ka nọ n’ụwa ga na-ata achịcha ahụ, na-aṅụkwa mmanya ahụ, ruo mgbe ha niile gara eluigwe. (Mkpu. 12:17) A sị na ndị ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi kwesịrị ịna-ata achịcha ahụ, na-aṅụkwa mmanya ahụ, nke a pụtara na anyị ga na-echeta Ọnwụ Jizọs ruo mgbe ebighị ebi.

“Ha Ga-aghọkwa Ndị M”

17, 18. Olee otú amụma ahụ dị n’Ezikiel 37:26, 27 sirila mezuo?

17 Jehova buru amụma na ndị ya ga-adị n’otu. Ọ sịrị: “Mụ na ha ga-agba ọgbụgba ndụ udo; ọgbụgba ndụ nke ga-adịru mgbe ebighị ebi ka mụ na ha ga-agba. M ga-enyekwa ha ala ha ma mee ka ha mụbaa, debekwa ebe nsọ m n’etiti ha ruo mgbe ebighị ebi. Ụlọikwuu m ga-ekpuchikwa ha, m ga-abụkwa Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.”—Ezik. 37:26, 27.

18 Ndị ohu Chineke niile nwere ike irite uru ná nkwa a, bụ́ nkwa o kwere anyị na udo ga-adị n’etiti anyị. N’ezie, Jehova emesiela anyị obi ike na udo ga-adị n’etiti ndị ohu ya niile na-erubere ya isi. Mkpụrụ nke mmụọ nsọ dị n’etiti ha n’ezie. N’ebe a, ebe nsọ ya, bụ́ nke na-anọchi anya otú Ndị Kraịst si efe Chineke ezi ofufe, dị n’etiti ha. Ha aghọọla ndị ya n’ezie, n’ihi na ha ahapụla ụdị ikpere arụsị niile, wee na-efe naanị Jehova.

19, 20. Olee ndị so ná ndị Jehova kpọrọ “ndị m,” oleekwa ihe ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-eme ka anyị nweta?

19 Ọ bụ ihe na-eme obi ụtọ nke ukwuu ịhụ otú e si na-eme ka ìgwè abụọ a dị n’otu n’oge anyị a. N’agbanyeghị na oké ìgwè mmadụ ahụ, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha na-arịwanye elu, enweghị olileanya ịga eluigwe, obi dị ha ụtọ na ha na ndị nwere olileanya ịga eluigwe na-arụkọ ọrụ. Ha na Izrel nke Chineke na-emekọrịta ihe. Nke a mere ka ha soro ná ndị Jehova na-akpọ “ndị m.” Amụma nke na-emezu n’ahụ́ ha sịrị: “Ọtụtụ mba ga-esoro Jehova n’ụbọchị ahụ, ha ga-aghọkwa ndị m; m ga-ebikwa n’ime gị.”—Zek. 2:11; 8:21; gụọ Aịzaya 65:22; Mkpughe 21:3, 4.

20 Ọ bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ka Jehova ji mee ihe ndị a niile. Ọtụtụ nde ndị mba ọzọ esonyerela mba ahụ Jehova hụrụ n’anya. (Maị. 4:1-5) Ha kpebisiri ike na ha ga-anọgide na-ejidesi ọgbụgba ndụ ahụ aka ike site n’irube isi n’iwu ya dị iche iche. (Aịza. 56:6, 7) Nke a ga-eme ka ha na Izrel nke Chineke nwee udo na-enweghị atụ. Anyị na-ekpe ekpere ka nke a mezuo n’ahụ́ gị site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 N’otu aka ahụ, ndị bụ́ isi a na-akpọ ‘ọgbakọ’ bụ ndị e tere mmanụ. (Hib. 12:23) Ma, okwu ahụ bụ́ ‘ọgbakọ’ nwere ike ịpụta ihe ọzọ, ya bụ, Ndị Kraịst niile, n’agbanyeghị ma hà ga-aga eluigwe ma hà ga-ebi n’ụwa.—Gụọ Ụlọ Nche nke ọnwa Eprel 15, 2007, peeji nke 21 ruo nke 23.

^ par. 13 Jizọs bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ahụ, o soghị na ya. O soghị taa achịcha ọgbụgba ndụ ahụ ma ọ bụkwanụ ṅụọ mmanya ya n’ihi na ọ bụ onye ogbugbo n’etiti ha na Jehova.

Ì Chetara?

• Olee ndị bụ “ebo iri na abụọ nke Izrel,” bụ́ ndị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-ekpe ikpe?

• Olee otú ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ si gbasa ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ?

• Ndị Kraịst niile hà kwesịrị ịta achịcha ma ọ bụkwanụ ịṅụ mmanya e ji echeta Ọnwụ Jizọs?

• Olee ndị Jehova buru n’amụma na ha ga-adị n’otu n’oge anyị a?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Ihe e sere ese/Foto dị na peeji 25]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ọtụtụ ndị esorola Izrel nke Chineke na-ejere Jehova ozi

7,313,173

4,017,213

1,483,430

373,430

Afọ 1950 Afọ 1970 Afọ 1990 Afọ 2009