Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọnwụnwa Ndị Bịaara Anyị Mere Ka Anyị Tụkwasịkwuo Jehova Obi

Ọnwụnwa Ndị Bịaara Anyị Mere Ka Anyị Tụkwasịkwuo Jehova Obi

Ọnwụnwa Ndị Bịaara Anyị Mere Ka Anyị Tụkwasịkwuo Jehova Obi

Dị ka Ada Delo Strito Si Kọọ

M ka dechara ebe ihe mmụta dịịrị ụbọchị nke taa sitere n’akwụkwọ m. Adị m afọ iri atọ na isii, ma, ide ahịrịokwu ole na ole ahụ were m awa abụọ. Gịnị mere o ji wee m ogologo oge hà otú ahụ? Ka mama m kọọrọ gị.—Joel

MỤ NA di m bụ Ndịàmà Jehova. E mere anyị baptizim n’afọ 1968. Mgbe m mụchara ụmụ nwoke abụọ ahụ́ gbasiri ike, ndị aha ha bụ Devid na Mak, amụrụ m nwa nwoke nke atọ, aha ya bụ Joel. M mụkworo ya amụkwo n’afọ 1973 n’ụlọ ọgwụ dị na Bensh, bụ́ obodo dị ihe dị ka iri kilomita isii ma e si ebe ndịda Brọsụls, bụ́ isi obodo Beljọm, gawa ya. Joel erughị kilogram abụọ mgbe m mụrụ ya. M hapụrụ ya n’ụlọ ọgwụ ahụ ka ahụ́ gbasikwuo ya ike.

Mgbe ọ na-enweghị nke mere mgbe ọtụtụ izu gafere, mụ na di m, bụ́ Luije, kpọgaara ya dọkịta na-agwọ ụmụaka. Mgbe o lechara Joel ahụ́, ọ sịrị: “Ọ bụ Joel nwere nsogbu niile ụmụnne ya na-enweghị.” Ike gwụrụ anyị mgbe o kwuru nke a. Mgbe ahụ ka o doro m anya na Joel na-arịa ezigbo ọrịa. Dọkịta ahụ wee kpọrọ di m gaa n’otu akụkụ wee gwa ya, sị: “Ụbụrụ nwa gị akpakọghị ọnụ. Ọ ga na-eme iberiibe.”

Anyị kpebiri ịgakwuru dọkịta ọzọ n’ihi na ihe onye nke mbụ ahụ gwara anyị mebiri anyị obi. O lere Joel ahụ́ nke ọma, legide ya ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu awa n’ekwughị ihe ọ bụla. Ọ dị mụ na di m ka ọ bụ mgbe ebighị ebi. N’ikpeazụ dọkịta ahụ lelitere anya elu wee sị: “Ọ bụ unu ga na-emere nwa unu a ihe niile.” Ya ewetuo olu, sị: “Ma, obi ga-adị Joel ụtọ n’ihi na ndị mụrụ ya hụrụ ya n’anya!” Ahụ́ nwụrụ m, mụ ekuru Joel, anyị alawa. Ọ dị izu asatọ mgbe ahụ.

Ọmụmụ Ihe na Ozi Ọma Mere Ka Anyị Sie Ike

Ahụ́ ọzọ e lere Joel gosiri na obi ya zara aza nakwa na ọ naghị arụ ọrụ nke ọma. Obi ya zara aza nke ukwuu nke na ọ malitere ịkpagide akpa ume ya, nke mere ka ọrịa na-arịa ya kwa mgbe kwa mgbe. N’oge na-adịghị anya, mgbe Joel dị ọnwa anọ, oyi bara ya ahụ́, anyị alaghachi n’ụlọ ọgwụ, bụ́ ebe a kpọpụrụ ya iche. Obi adịghị anyị mma n’ihi ihe ọrịa na-eme ya. Anyị gaara na-eku ya, ma, e kweghị ka anyị na-emetụ ya aka ruo izu iri zuru ezu. Naanị ihe mụ na Luije na-eme bụ ile ya n’anya n’anya na ijide onwe anyị aka na ikpe ekpere.

Mgbe ihe ndị a na-eme, anyị akwụsịghị ịga ọmụmụ ihe, anyị na Devid, bụ́ onye dị afọ isii, nakwa Mak, bụ́ onye dị afọ atọ. Ịga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị anyị ka ịnọ n’aka Jehova. Ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị ndị na-agba anyị gburugburu ma anyị nọrọ ebe ahụ na-eme ka obi sie anyị ike na anyị atụkwasịla Jehova ibu arọ anyị. Nke a na-emekwa ka obi jụrụtụ anyị. (Ọma 55:22) Nke a mere ka ndị nọọsụ, bụ́ ndị na-elekọta Joel, kwuo na ha chọpụtara na ọmụmụ ihe anyị na-aga na-enyere anyị aka idi nsogbu anyị.

M rịọkwara Jehova n’oge ahụ ka o nye m ike m ga-eji na-aga ozi ọma. Kama ịnọrọ n’ụlọ na-ebe ákwá, m chọrọ ịna-agwa ndị ọzọ otú okwukwe m nwere ná nkwa Chineke kwere na ya ga-eme ka ọrịa ghara ịdịkwa n’ụwa si enye m ume. Mgbe ọ bụla m gara ozi ọma, obi na-esi m ike na Jehova azala ekpere m.

“Nke A Dị Ịtụnanya!”

Anyị nwere obi ụtọ dị ukwuu ụbọchị anyị si n’ụlọ ọgwụ kpọlata Joel. Ma, n’echi ya, obi malitere ịjọ anyị njọ. Ahụ́ malitere rịasiwe Joel ike nke mere ka anyị kpọrọ ya laghachi n’ụlọ ọgwụ. Mgbe ndị dọkịta lechara ya ahụ́, ha gwara anyị, sị: “Joel agaghị anọfe ọnwa isii.” Mgbe ọnwa abụọ gafere, bụ́ mgbe ọ dị ihe dị ka ọnwa asatọ, ihe ndị dọkịta ahụ kwuru yiri ka ọ ga-emezu n’ihi na ọrịa ya bịara kaa njọ. Otu dọkịta bịakwutere anyị otu ụbọchị wee, sị: “Ọ na-ewute m nke ukwuu na o nweghị ihe ọzọ anyị nwere ike ime ka ahụ́ dị ya mma.” Ya ekwuokwa, sị: “Ka ọ dị ugbu a, ọ bụ naanị Jehova ga-enyere ya aka.”

Ka e mechara, alaghachiri m n’ọnụ ụlọ ọgwụ Joel nọ. M kpebiri na m gaghị esi n’akụkụ àkwà ahụ o dina pụọ, n’agbanyeghị na ike gwụruru m n’ọkpụkpụ. Ọtụtụ ụmụnna ndị inyom na-abịa anọnyere m, onye nọọ, ya laa onye ọzọ abịa, ebe Luije nọ n’ụlọ na-elekọta ụmụ anyị abụọ ndị nke tọrọ Joel. Mgbe anyị nọrọ otu izu, obi Joel kụchiri ná mberede. Ndị nọọsụ gbatara, ma, o nweghị ihe ha nwere ike ime. N’oge na-adịghị anya, otu n’ime ha wetulatara olu wee, sị: “Okwu agwụla . . . ” Ike agwụ m, mụ ebere ákwá pụọ. Agbalịrị m ka m kpee ekpere, ma amaghị m otú m si agwa Jehova otú nke a si na-egbu m mgbu n’obi. Mgbe ihe dị ka nkeji iri na ise gafere, otu nọọsụ gbaara bịakwute m wee jiri oké olu sị, “Joel etetala!” Ya esere m n’aka, sị, “Bịa ka ị hụ ya.” Mgbe m ruru ebe ahụ, ahụrụ m na obi ya amalitela ịkụ akụ ọzọ! Ọ dịghị anya, ọtụtụ ndị anụ na o tetala. Ndị nọọsụ na ndị dọkịta na-abịa eleta ya, ọtụtụ n’ime ha sịrị, “Nke a dị ịtụnanya!”

O Nwere Ọganihu Dị Ịtụnanya Mgbe Ọ Dị Afọ Anọ

Mgbe Joel bụ nwatakịrị, otu dọkịta na-agwakarị anyị na anyị ‘kwesịrị ịhụ ya n’anya nke ukwuu.’ Mụ na Luije hụrụ Joel n’anya nke ukwuu n’ihi na Jehova hụrụ anyị n’anya, karịchaa kemgbe anyị mụrụ Joel. Anyị nwere ọtụtụ ohere anyị ga-eji gosi na anyị hụrụ ya n’anya maka na ọ bụ anyị na-emere ya ihe ọ bụla ọ chọrọ ime.

N’afọ ọ bụla n’ime afọ asaa mbụ ná ndụ Joel, anyị gabigara ọtụtụ nsogbu. N’agbata ọnwa Ọktoba na Mach nke afọ ọ bụla, ya rịa nke a, ya arịa nke ọzọ, anyị na-echukwa ụlọ ọgwụ ka mmiri. N’agbanyeghị nke a, m na-ewepụtakwa oge wee na-elekọta Devid na Mak ruo otú ike kwere m. Ka oge na-aga, ha malitere inyere Joel aka ka o wee nwee ọganihu, bụ́ nke tụrụ onye ọ bụla n’anya mgbe o mere nke a. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị dọkịta gwara anyị na o nweghị ihe ga-eme ka Joel jee ije. Ma, otu ụbọchị, mgbe Joel dị afọ anọ, nwa anyị bụ́ Mak sịrị ya: “Joel, bilite gosi mama na ị ga-ejeli ije!” Ọ tụrụ m n’anya na Joel malitere ije ije! Anyị nwere obi ụtọ. Anyị niile wee kpee ekpere kelee Jehova nke ukwuu. Mgbe ọ bụla Joel mere obere ihe ọ bụla nke na-egosi na ọ na-enwe ọganihu, anyị na-ekele ya nke ọma.

Ọzụzụ Anyị Na-azụ Joel Kemgbe Ọ Bụ Nwata Ka Ọ Mara Chineke Abaa Uru

Anyị na-akpọkarị Joel aga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Anyị na-ekunye ya n’ihe e ji ebugharị ụmụaka a na-ekpuchi ekpuchi nke na-ahụ ụzọ ka nje ghara ịbanye Joel n’ahụ́. N’agbanyeghị n’ihe ahụ ọ nọ, obi na-adị ya ụtọ na ya na ụmụnna nọ n’ọmụmụ ihe.

Ụmụnna anyị hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, ha na-enyere anyị aka, na-emekwa ka obi sie anyị ike. Otu nwanna nwoke na-echetakarịrị anyị ihe dị n’Aịzaya 59:1, bụ́ nke sịrị: “Lee! Aka Jehova adịghị mkpụmkpụ nke na ọ pụghị ịzọpụta unu, ọ bụghịkwa onye ntị ike nke na ọ pụghị ịnụ ihe.” Ihe ahụ dị n’amaokwu ahụ, bụ́ nke na-emesi mmadụ obi ike, mere ka anyị tụkwasị Jehova obi.

Ka Joel na-eto, anyị gbara mbọ kụnye ya ife Jehova n’obi. Anyị na-eji ohere ọ bụla dapụtara agwa ya banyere Jehova ka o wee hụ Nna ya nke eluigwe n’anya. Anyị rịọrọ Jehova ka ọ gọzie mbọ anyị na-agba ka ọzụzụ anyị na-azụ Joel ịmara ya rụpụta ezigbo ihe.

Obi dị anyị ụtọ ịhụ na mgbe Joel gafetụrụ afọ iri, ọ na-amasị ya izi ndị mmadụ ozi ọma. Mgbe ọ nọ na-agbake n’oge a wara ya ahụ́ mgbe ọ dị afọ iri na anọ, obi dị m ụtọ otu ụbọchị mgbe ọ jụrụ m, sị, “Mama, m̀ nye dọkịta akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi?” Mgbe afọ ole na ole gafere, a wara Joel ahụ́ ọzọ. O doro anyị anya na o nwere ike ọ gaghị agbake ná nke a. Tupu a waa ya ahụ́ ahụ, o nyere ndị dọkịta akwụkwọ ozi anyị nyeere ya aka ya edee. O kwuru na ya achọghị ka a mịnye ya ọbara n’ahụ́. Dọkịta nke ga-awa ya ahụ́ ajụọ ya, sị, “Ì kwere ekwe?” Joel azaa ya, sị, “Ee, Dọkịta.” Obi dị anyị ụtọ na nwa anyị tụkwasịrị Onye kere ya obi, kpebiekwa ime ihe ọ na-achọ. Obi dị anyị ụtọ nke ukwuu otú ndị ụlọ ọgwụ ahụ si kwado mkpebi dị iche iche anyị mere.

Joel Nwere Ọganihu Ime Mmụọ

Mgbe Joel dị afọ iri na asaa, e mere ya baptizim iji gosi na ọ rarala onwe ya nye Chineke. Anyị agaghị echefu ụbọchị ahụ echefu. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma anyị cheta ọganihu o nwerela n’ọgbakọ. Otú o si hụ Jehova n’anya na otú o si anụ ọkụ n’obi ka dị otú ha dị kemgbe ahụ. Obi na-adị Joel ụtọ ịgwa onye ọ bụla ọ hụrụ, sị, “Ọ bụ eziokwu ji m ndụ!”

Joel mụtara otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo afọ iri abụọ. Ọ rara anyị na ya ezigbo ahụ́. Ntakịrị mkpụrụ okwu ọ bụla o dere bụ nnukwu ọganihu. Kemgbe ahụ, ihe mbụ ọ na-eme n’ụbọchị bụ iji akwụkwọ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị. Ya mechaa, ya elezie anya dee amaokwu a gụrụ n’ụbọchị ahụ n’akwụkwọ ya, bụ́ nke o jirila dejuo ọtụtụ akwụkwọ!

Ụbọchị ọmụmụ ihe, Joel na-agbasi mbọ ike ka anyị gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’oge n’ihi na ọ na-amasị ya ịnọrọ na-anabata ndị mmadụ tupu a malite ọmụmụ ihe. Obi na-adị ya ụtọ ịza ajụjụ na ime ihe ngosi n’ọmụmụ ihe. Ọ na-elekọtakwa ígwè okwu n’ọgbakọ ma na-arụ ọrụ ndị ọzọ. Ọ na-eso anyị aga ozi ọma kwa izu ma ahụ́ kwe ya. N’afọ 2007, a mara ọkwa n’ọgbakọ anyị na e meela Joel ohu na-eje ozi. Anya mmiri gbara anyị ebe anyị nọ na-enwe aṅụrị. Jehova agọziela anyị n’ụzọ na-enweghị atụ.

Jehova Na-enyere Anyị Aka

Ọnwụnwa ọzọ bịaara anyị n’afọ 1999. Otu ọkwọ ụgbọala nke na-agba ara ara kụrụ ụgbọala anyị wee merụọ Luije ezigbo ahụ́. Nke a mere ka e bee ya otu ụkwụ, wakwaa ọkpụkpụ azụ ya ọtụtụ mgbe. N’oge a kwa, anyị tụkwasịrị Jehova obi wee nweta ike ọ na-enye ndị ohu ya mgbe ọnwụnwa bịaara ha. (Fil. 4:13) N’agbanyeghị na ụkwụ adịghị Luije, o nwere mkpa ndị ọ na-egbo anyị. Ọ ka nwee oge ugbu a ilekọta Joel n’ihi na ọ naghịzi arụ ọrụ. Nke a na-eme ka m nwekwuo ohere ime ihe ime mmụọ. Luije kakwu nwee ohere ugbu a ileba anya n’ihe ime mmụọ ezinụlọ anyị nakwa nke ọgbakọ anyị, bụ́ ebe ọ ka bụ onye na-ahaziri òtù ndị okenye ọrụ.

Ezinụlọ anyị na-anọkọ ọnụ mgbe niile n’ihi na ọnọdụ anyị abụghị otu. Ka ihe dị ugbu a, anyị ma otú ike onye ọ bụla n’ime anyị hà, o nweghị onye n’ime anyị na-atụ anya oké ihe n’aka onye nke ọzọ. Ụbọchị ọ bụla mmụọ anyị jụrụ oyi, anyị na-ekpeku Jehova ekpere kọọrọ ya otú obi dị anyị. Ọ na-ewute anyị na ụmụ anyị bụ́ Devid na Mak dapụrụ n’ọgbakọ mgbe ha toruru ogo mmadụ, bụ́ mgbe ha malitere ibiri onwe ha. Anyị nwere olileanya na ha nwere ike ịlọghachikwute Jehova otu ụbọchị.—Luk 15:17-24.

Kemgbe ọtụtụ afọ, anyị ahụla na Jehova nọnyeere anyị, ọ bụkwa ya na-enyere anyị aka imeri nsogbu ọ bụla bịaara anyị. Ihe dị n’Aịzaya 41:13 na-emesi anyị obi ike. Ọ sịrị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’” Ọ na-akasi anyị obi ma anyị cheta na Jehova sekpụsi anyị n’aka ike. N’ezie, anyị na-ekwu hoo haa na ọnwụnwa dị iche iche anyị diri mere ka anyị tụkwasị Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, obi.

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Joel na mma ya, bụ́ Ada

[Foto dị na peeji nke 18]

Ada, Joel, na Luije

[Foto dị na peeji nke 19]

Ịnabata ụmụnna n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-amasị Joel