Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Achọghị Ka I Nwee “Nsogbu Ọ Bụla”

Jehova Achọghị Ka I Nwee “Nsogbu Ọ Bụla”

Jehova Achọghị Ka I Nwee “Nsogbu Ọ Bụla”

MGBE ihe kacha dị egwu n’ụwa ga-eme, Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile ga-eme ka ndị niile na-eme ihe ọ na-achọ ‘lanahụ.’ (Joel 2:32) Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova na-echebe ndị mmadụ mgbe niile. Ebe ọ bụ “isi iyi nke ndụ,” mmadụ niile dị oké ọnụ ahịa n’anya ya, ọ na-echebekwa ha.—Ọma 36:9.

Ndị fere Chineke n’oge ochie lere ndụ anya otú ahụ o si ele ya anya. Jenesis isi iri atọ na atọ amaokwu nke iri na asatọ kwuru na Jekọb na ezinụlọ ya mere njem dị ize ndụ “n’enweghị nsogbu ọ bụla.” N’agbanyeghị na obi siri Jekọb ike na Jehova ga-echebe ha, o nwere ihe ndị ọzọ o mere iji hụ na o nweghị ihe ga-eme ndị ezinụlọ ya. (Jen. 32:7, 8; 33:14, 15) I nwere ike ichebe onwe gị, chebekwa ndị ọzọ ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru. Ka anyị tụlee otú ndị na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na ndị na-arụ ọrụ ndị ọzọ yiri ya, nakwa ndị gbataara ndị nwere ọdachi ọsọ enyemaka, ga-esi mee nke a.

Ihe Iwu Mozis Kwuru Banyere Ichebe Ndụ

Iwu Mozis kwuru ihe ndị ohu Chineke kwesịrị ịna-eme iji chebe ndụ ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, ndị Izrel na-arụnye ihe nrụbichi n’elu ụlọ ha. Ihe nrụbichi ahụ na-eme ka ha ghara isi n’elu ụlọ dapụ n’ihi na ha na-anọkarị n’elu ụlọ ha. (1 Sam. 9:26; Mat. 24:17) Ọ bụrụ na mmadụ esi n’elu ụlọ nke a na-arụnyeghị ihe nrụbichi ahụ dapụ, onye nwe ụlọ ahụ ga-aza Jehova ajụjụ maka onye ahụ n’ihi na o rubeghị isi n’iwu ya.—Diut. 22:8.

Iwu ahụ kwukwara ihe a ga-eme ma anụ ụlọ merụọ mmadụ ahụ́. Ọ bụrụ na ehi asọgbuo mmadụ, onye nwe ehi ahụ aghaghị igbu ya ka o wee ghara imerụ ndị ọzọ ahụ́. Ezigbo ihe ga-efunahụ ya ma ya gbuo ehi ahụ n’ihi na ọ gaghị eri ya eri ma ọ bụkwanụ resị ya ndị ọzọ. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na onye nwe ehi ahụ ahapụ ehi ya ka ọ na-akpagharị? Ọ bụrụ na ehi ahụ emechaa gbuo onye ọzọ, a ghaghị igbu ya na onye nwe ya. Iwu ahụ mere ka onye ọ bụla nke na-ahapụ anụ ụlọ ya ka ọ na-akpagharị otú masịrị ya kpachara anya.—Ọpụ. 21:28, 29.

Iwu ahụ kwukwara na mmadụ kwesịrị ịkpachara anya n’otú o si eji ngwá ọrụ arụ ọrụ. Ọtụtụ ụmụ Izrel na-eji anyụike awa nkụ. Ọ bụrụ na isi anyụike adapụnahụ onye ji ya na-awa nkụ gaa gbuo onye nọọrọ onwe ya, onye ji anyụike ahụ na-awa nkụ ga-agbaga n’obodo mgbaba. Ọ ga-anọ ebe ahụ ruo mgbe nnukwu onye nchụàjà nọ ndụ mgbe ahụ nwụrụ, nke pụtara na onye gburu mmadụ n’amaghị ụma nwere ike ịnọ ebe ọzọ n’ahụghị ndị ezinụlọ ya anya ma ọ bụ obodo ya ruo ọtụtụ afọ. Nke ahụ mere ka ụmụ Izrel mara na ndụ abụghị obere ihe n’anya Jehova. Onye ọ bụla nke na-ele ndụ anya otú Chineke si ele ya anya na-ahụ na ngwá ọrụ ya dị mma mgbe niile, ọ na-ejikwa ha arụ ọrụ otú ha na-agaghị emerụ mmadụ ahụ́.—Ọnụ Ọgụ. 35:25; Diut. 19:4-6.

Jehova ji ụdị iwu ndị a gosi na ya chọrọ ka ndị ya kpachara anya, ka ihe ọ bụla ghara imerụ ha ahụ́ ma hà nọ n’ụlọ ma hà nọ n’èzí. Onye ọ bụla mere ihe mmadụ ji nwụọ, ma ọ̀ ma ụma ma ọ maghị, na-aza Jehova ajụjụ onye ahụ nwụrụ anwụ. Otú Jehova si ele ndụ anya agbanwebeghị. (Mal. 3:6) Taakwa, ọ chọghị ka ndị ya merụọ onwe ha ahụ́ ma ọ bụkwanụ merụọ ndị ọzọ. Anyị kwesịrị icheta nke a mgbe ọ bụla anyị na-ewu ma ọ bụkwanụ na-arụzi ụlọ ndị anyị na-anọ efe Jehova.

Ilezi Anya Mgbe Anyị Na-ewu Ụlọ

Iwu ma ọ bụkwanụ ịrụzi Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, nakwa alaka ụlọ ọrụ bụụrụ anyị ihe ùgwù na-enweghị atụ. Ịrụ ọrụ e ji enyere ndị nwere ọdachi aka bụkwa nnukwu ihe ùgwù. Anyị kwesịrị iji nlezianya na-arụ ọrụ ọ bụla e nyere anyị ka anyị rụọ, n’ihi na ọ bụrụ na anyị emeghị otú a, anyị nwere ike imerụ onwe anyị ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ ahụ́, a sịgodị na ọrụ ahụ ehighị nne. (Ekli. 10:9) Ọ bụrụ na anyị na-akpachara anya mgbe ọ bụla anyị na-arụ ọrụ, anyị nwere ike na-arụ ọrụ n’emerụghị ahụ́.

Baịbụl sịrị: “Ịma mma nke ụmụ okorobịa bụ ike ha, ịma mma nke ndị agadi bụkwa isi awọ́ ha.” (Ilu 20:29) Ike okorobịa na-enyere anyị aka ịrụ ọrụ ndị siri ike. Ma, ndị bụ́ aka ochie, ya bụ, ndị wuwere ụlọ kemgbe ọtụtụ afọ, na-eji aka ha ma ọ bụkwanụ ngwá ọrụ ha arụ ọrụ ndị chọrọ nkà. O nwekwara mgbe ndị a merela agadi ugbu a ji ike okorobịa na-arụ ọrụ ndị siri ike. Ọ bụrụ na ọ dịbeghị anya ị malitere na-eso ndị a na-ewuru ọgbakọ Jehova ụlọ rụwa ọrụ, na-eleru otú ndị aka ochie a si arụ ọrụ anya, na-emekwa ihe ọ bụla ha gwara gị. Ụmụnna ndị ahụ na-ewu ụlọ kemgbe ọtụtụ afọ ga-akụziri gị ọtụtụ ihe banyere iwu ụlọ. Nke a gụnyere otú ị ga-esi na-eji ngwá ọrụ ndị nwere ike imerụ gị ahụ́ na-arụ ọrụ, nakwa otú ị ga-esi na-ebulite ihe ndị na-anyị arọ. Nke a ga-enyere gị aka iji obi ụtọ na-arụpụta ezigbo ihe n’emerụghị ahụ́.

Ndị na-ewuru ọgbakọ Jehova ụlọ aghaghị ịna-eleru anya mgbe niile. Ihe nwere ike ịgbanwe mgbe ọ bụla. Olulu nwere ike dịrị n’ebe ọ na-adịbughị. Onye ya na mmadụ na-arụ ọrụ nwere ike bupụ ubube ebe ọ dịbu, ma ọ bụkwanụ bupụ osisi ma ọ bụ bọket ágbá dị na ya. I nwere ike imerụ ahụ́ ma ọ bụrụ na i lerughị anya. A na-agwakarị ndị na-ewu ụlọ ka ha yiri ihe ndị ga-egbochi ha imerụ ahụ́. Enyo anya, okpu siri ike na akpụkpọ ụkwụ kwesịrị ekwesị nwere ike inyere gị aka ka ị ghara imerụ ahụ́. Ma, ha nwere ike ichebe gị ma ọ bụrụ na ha ka dị mma, gị ana-eyikwa ha.

Ọtụtụ ngwá ọrụ nwere ike iyi ihe ga-adịrị onye ọ bụla mfe iji ha arụ ọrụ, ma, tupu mmadụ ejiri ha rụọ ọrụ nke ọma n’emerụghị ahụ́, a ghaghị ịkụziri ya otú e si eji ha arụ ọrụ. Ọ bụrụ na otú e si eji ngwá ọrụ ị chọrọ iji arụ ọrụ edoghị gị anya, gwa nwanna na-elekọta ọrụ ahụ. Ọ ga-eme ndokwa ka a kụziere gị ya nke ọma. Ịdị obi umeala, ma ọ bụ mmadụ ịma ihe ọ ga-emeli bụ àgwà ọma. N’eziokwu, nke a dị mkpa ka ị ghara imerụ ahụ́ n’ebe a na-ewu ụlọ ma ọ bụkwanụ merụọ ndị ọzọ ahụ́.—Ilu 11:2.

Ịda elu bụ otu n’ime ihe kacha emerụ ndị mmadụ ahụ́ n’ebe a na-ewu ụlọ. Tupu ị rịgoro ubube ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ, hụ na ihe ndị kwesịrị ichebe onye rịgooro na ya zuru ezu nakwa na ubube ahụ emebighị emebi. Ọ bụrụ na ị ga-anọ n’elu ihe ma ọ bụ n’elu ụlọ na-arụ ọrụ, o nwere ike ịbụ iwu na ị ghaghị iyi ihe ga-eme ka ị ghara ịdapụ. Ọ bụrụ na i nwere ajụjụ banyere ihe ị ga-eme ma ị nọrọ n’elu na-arụ ọrụ, jụọ ya onye na-elekọta ọrụ unu. *

Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na ụlọ ndị ọzọ anyị na-anọ efe Jehova dị mkpa ugbu a n’ihi na ndị na-efe Jehova n’ụwa niile na-adịwanye ọtụtụ. Jehova nyere ndị na-elekọta ọrụ n’ebe ndị a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na ọrụ ndị ọzọ yiri ya ọrụ ichebe atụrụ ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’okpuru ha. (Aịza. 32:1, 2) Ọ bụrụ na ị na-elekọta ụmụnna gị n’ebe ha na-ewu ụlọ, echefula na ịrụ ọrụ n’emerụghị ahụ́ dị mkpa. Mee ihe ọ bụla i nwere ike ime iji hụ na ihu ọrụ ahụ dị ọcha nakwa na ngwongwo na ngwongwo ejughị na ya. Jiri obiọma gwasie ndị na-anaghị akpachara anya okwu ike iji chetara ha ihe ha kwesịrị ime. Ekwela ka ụmụaka ma ọ bụ ndị ka malitere ọrụ ọhụrụ na-aga ebe ihe nwere ike imerụ ha ahụ́. Mee ka ndị ọrụ gị mara ihe nwere ike imerụ ha ahụ́, gwakwa ha otú ha ga-esi zere ya. Cheta na ihe anyị chọrọ bụ ịrụcha ọrụ ahụ n’enweghị onye merụrụ ahụ́.

Ọrụ Ịhụnanya Na-arụ

Mmadụ nwere ike imerụ ahụ́ ma a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na ụlọ ndị ọzọ anyị na-anọ efe Jehova. Ya mere, ndị na-ewu ha aghaghị ịkpachapụ anya. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru, na-arụ ọrụ otú a chọrọ ka i si na-arụ ya, ma na-echebara ihe echiche tupu i mee ya, ị gaghị emerụ ahụ́ ma ọ bụkwanụ merụọ ndị gị na ha na-arụ ọrụ ahụ́.

Gịnị bụ isi ihe mere anyị ji akpachara anya ka anyị wee ghara imerụ ahụ́? Ọ bụ ịhụnanya. Otú anyị si hụ Jehova n’anya na-eme ka anyị jiri ndụ kpọrọ ihe otú yanwa si jiri ndụ kpọrọ ihe. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị mmadụ nọ ga-emekwa ka anyị na-elezi anya n’ihe ọ bụla anyị na-eme ka anyị wee ghara imerụ ha ahụ́. (Mat. 22:37-39) Ya mere, ka anyị wee ghara imerụ ndị ọzọ ahụ́, ka anyị mee ike anyị niile iji hụ na anyị wuru ụlọ anyị na-ewuru ọgbakọ Jehova “n’enweghị nsogbu ọ bụla.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Gụọ igbe bụ́ “Otú Ị Ga-esi Na-arị Ubube Ma Ị Na-arụ Ọrụ Ka Ị Ghara Ịda,” nke dị na peeji nke 30.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 30]

Otú Ị Ga-esi Na-arị Ubube Ma Ị Na-arụ Ọrụ Ka Ị Ghara Ịda

N’oge na-adịbeghị anya gara aga na United States, ihe karịrị otu narị puku ndị ọrụ na iri puku isii si n’elu ubube daa merụọ ahụ́. Ihe dị ka otu narị mmadụ na iri ise esikwala n’ubube daa nwụọ. N’agbanyeghị ebe i bi nakwa ebe ị na-arụ ọrụ, ihe ndị anyị depụtara n’ebe a ga-enyere gị aka ka ị ghara isi n’ubube daa.

◇ Arịla ubube nke na-esighị ike, ma ọ bụ nke mebiri emebi, emezikwala ubube ọ bụla mebiri emebi. Bufuo ya.

◇ Ubube ọ bụla nwere ihe ọ ga-ebuli na ihe ọ na-agaghị ebuli. Hụ na gị na ngwá ọrụ na ihe ndị ọzọ i bu akarịghị ihe ubube ị na-arị ga-ebuli.

◇ Kwụwa ubube gị n’ebe dị larịị ma sie ike. Akwụwala ya n’ihe na-ama jijiji, dị ka n’elu igbe ma ọ bụ n’elu bọket.

◇ Mgbe ọ bụla ị na-arịgo ma ọ bụ na-arịda n’ubube, lewe ya anya.

◇ Anọdụla ọdụ n’abụọ ikpeazụ n’ime ihe ndị ahụ e ji arị ubube.

◇ Arịla ubube nke na-ejighị ihe dị ka otu mita karịa ebe ị gbabewere ya. Kedo ụkwụ ubube ahụ n’ihe, ma ọ bụkwanụ jiri ntu kụgide ya n’elu osisi ka ọ ghara ịchịpụ. Ọ bụrụ na ị gaghị emeli ihe ndị a, gwa mmadụ ka o jidere gị ya aka mgbe ị na-arị ya. Kedosie elu ya ike n’ihe ka ọ ghara ịdala otu akụkụ ma ị rịwa ya.

◇ Edosala ihe ọrụ gị n’ihe e ji arị ubube.

◇ Ọ bụrụ na ị matịa aka gị ma ọ bụ ụkwụ gị karịa ubube i ji na-arụ ọrụ, ọ ga-eme ka ubube ahụ mawa jijiji. Anwala nke a, i nwere ike ịda. Buru ubube gị gaa n’ebe ọ bụla ị chọrọ ịrụ ọrụ ka o wee dịrị gị nso.

◇ Ọ bụrụ na i ji ubube na-arụ ọrụ n’ihu ụzọ e mechiri emechi, tinye ihe n’ọnụ ụzọ ahụ iji gwa ndị mmadụ ka ha ghara imeghe ya, gbachiekwa ya agbachie. Ọ bụrụ na ị gaghị agbachi ya agbachi, gwa mmadụ ka ọ nọrọ n’ebe ahụ ka o wee na-agwa ndị mmadụ ka ha ghara imeghe ụzọ ahụ.

◇ Ọ bụ naanị otu onye ga na-arị ubube n’otu oge ọ gwụla ma e mere ubube ahụ maka mmadụ abụọ. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 33 Ị ga-ahụ ebe e dere ihe ndị ọzọ onye na-arị ubube kwesịrị ime na ihe ndị ọ na-ekwesịghị ime na Teta! nke Febụwarị 8, 2000, peeji nke 22-24.

[Foto dị na peeji nke 29]

E kwuru n’Iwu Mozis ka a rụnye ihe nrụbichi n’elu ụlọ nke dị larịị