Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-eto Eto—Ka Ijere Jehova Ozi Na-agụsikwu Unu Agụụ Ike

Ndị Na-eto Eto—Ka Ijere Jehova Ozi Na-agụsikwu Unu Agụụ Ike

Ndị Na-eto Eto—Ka Ijere Jehova Ozi Na-agụsikwu Unu Agụụ Ike

“Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa.”—EKLI. 12:1.

1. Olee ihe a gwara ụmụaka n’Izrel ka ha mee?

IHE dị ka puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga, onye amụma Jehova, bụ́ Mozis, nyere ndị okenye Izrel iwu, sị: “Kpọkọta ụmụ Izrel, ndị ikom na ndị inyom na ụmụntakịrị . . . , ka ha wee gee ntị, ka ha mụtakwa ihe, ka ha tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya idebe ihe niile e kwuru n’iwu a.” (Diut. 31:12) Ị̀ chọpụtara ndị a gwara ka ha bịa? Ha bụ ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị. Ụmụntakịrị so ná ndị a gwara ka ha gee ntị n’okwu Jehova, mụta ihe na ya, ma mee ihe Jehova kwuru.

2. Olee otú Jehova si gosi na ya na-echebara ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge ochie echiche?

2 Na narị afọ mbụ, Jehova gosiri nnọọ na ya na-echebara ndị na-eto eto na-efe ya ofufe echiche. Dị ka ihe atụ, o mere ka Pọl onyeozi dee ndụmọdụ nke bụ́ kpọmkwem maka ndị na-eto eto n’ụfọdụ n’ime akwụkwọ ozi ndị o degaara ọgbakọ dị iche iche. (Gụọ Ndị Efesọs 6:1; Ndị Kọlọsi 3:20.) Ndị Kraịst na-eto eto, bụ́ ndị mere ihe ahụ o kwuru, gosiri na ha nwere obi ụtọ maka ihe Nna ha nke eluigwe hụrụ ha n’anya na-emere ha, ọ gọzikwara ha.

3. Olee otú ndị na-eto eto taa si egosi na ha chọrọ ijere Chineke ozi?

3 Ndị na-eto eto n’oge a hà so ná ndị a gwara ka ha zukọta iji wee fee Jehova ofufe? Ee! N’ihi ya, ndị Chineke nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa na-enwe obi ụtọ ma ha hụ ka ọtụtụ ndị na-eto eto na-eme ihe ahụ Pọl gbara anyị ume ka anyị na-eme. Ọ sịrị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.” (Hib. 10:24, 25) Ọtụtụ ụmụaka na-esokwa ndị mụrụ ha na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Mat. 24:14) Kwa afọ, ọtụtụ puku ndị na-eto eto na-ewepụta onwe ha ka e mee ha baptizim iji gosi na ha ji obi ha dum hụ Jehova n’anya, ha na-enwetakwa ngọzi ndị na-eso ụzọ Kraịst na-enweta.—Mat. 16:24; Mak 10:29, 30.

Zaa Òkù ahụ A Na-akpọ Ugbu a

4. Olee mgbe ndị na-eto eto nwere ike ịza òkù Chineke kpọrọ ha ka ha bịa jewere ya ozi?

4 Ekliziastis isi iri na abụọ amaokwu mbụ kwuru, sị: “Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa.” Ndị na-eto eto, afọ ole ka unu ga-adị tupu unu aza òkù a wee bịa jewere Jehova ozi? E nweghị afọ ole Akwụkwọ Nsọ kwuru na unu ga-adị. N’ihi ya, alala azụ iwepụta onwe gị, echela na ị ka dị nnọọ obere ige Jehova ntị na ijere ya ozi. N’agbanyeghị afọ ole ị dị, anyị na-agba gị ume ka i mee ihe n’egbughị oge.

5. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi nyere ụmụ ha aka inwe ọganihu n’ọgbakọ?

5 O nwere ike ịbụ na nne ma ọ bụ nna unu, ma ọ bụkwanụ ha abụọ, nyeere ọtụtụ n’ime unu aka inwe ọganihu n’ọgbakọ. Ọ bụrụ otú ahụ, unu dị ka Timoti a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl. Mgbe ọ ka bụ nwa ọhụrụ, nne ya, bụ́ Yunis, na nne nne ya, bụ́ Lọịs, kụziiri ya ihe odide ndị dị nsọ. (2 Tim. 3:14, 15) Ikekwe, ndị mụrụ gị na-akụzikwara gị ihe site n’ịmụrụ gị Baịbụl, ikpe ekpere mgbe ị nọ ya, ịkpọ gị aga ọmụmụ ihe na mgbakọ dị iche iche, nakwa ịkpọ gị aga ozi ọma. N’ezie, ịkụziri gị iwu Chineke bụ ọrụ dị ezigbo mkpa Jehova nyere ndị mụrụ gị. Ì nwere obi ụtọ na ha hụrụ gị n’anya ma na-elekọta gị?—Ilu 23:22.

6. (a) Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 110:3, olee ụdị ofufe na-amasị Jehova? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle ugbu a?

6 N’agbanyeghị nke a, ka unu na-eto na-aga, Jehova chọrọ ka unu “chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche [ya], nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè,” dị ka Timoti mere. (Rom 12:2) I mee otú a, ị ga-eso na-eme ihe dị iche iche a na-eme n’ọgbakọ. Ihe ị ga-eji na-eme ihe ndị a abụghị n’ihi na ndị mụrụ gị chọrọ ka ị na-eme ha, kama ọ bụ n’ihi na ị chọrọ ime uche Chineke. Ọ ga-amasị Jehova ma ọ bụrụ na i jiri obi gị dum na-ejere ya ozi. (Ọma 110:3) Oleezi otú i nwere ike isi gosi na ige Jehova ntị na ime ihe o kwuru na-agụsi gị agụụ ike? Anyị ga-atụle ụzọ atọ dị mkpa i nwere ike isi mee nke a. Ha bụ, otú i si amụ ihe, otú i si ekpe ekpere, na otú i si akpa àgwà. Ka anyị tụlee ihe ndị a otu otu.

Bịaruo Jehova Nso

7. Olee otú Jizọs si setịpụ ezigbo ihe nlereanya n’ịmụ Akwụkwọ Nsọ, gịnịkwa nyeere ya aka ime nke a?

7 Otú mbụ ị ga-esi gosi na ijere Jehova ozi na-agụsi gị agụụ ike bụ ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na ị na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, ị ga-enwe ike ime ka gị na Jehova dịkwuo ná mma, nweekwa ike ịmụta ihe dị ezigbo mkpa. (Mat. 5:3) Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya na nke a. Mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, o nwere mgbe ndị mụrụ ya hụrụ ya n’ụlọ nsọ “ebe ọ nọ ọdụ n’etiti ndị nkụzi, na-egekwa ha ntị ma na-ajụ ha ajụjụ.” (Luk 2:44-46) Jizọs si na nwata nwewe ọchịchọ ịghọta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ. Gịnị nyeere ya aka ime nke a? O doro anya na ọ bụ nne ya bụ́ Meri na nna ya bụ́ Josef, nyeere ya aka. Ha bụ ndị ohu Chineke, ha kụziiri Jizọs okwu Chineke site na nwata.—Mat. 1:18-20; Luk 2:41, 51.

8. (a) Olee mgbe ndị nne na nna kwesịrị ịmalite kụziwere ụmụ ha otú ha ga-esi nwee mmasị n’Okwu Chineke? (b) Kọọ ahụmahụ nke na-egosi na ọ bara uru ka a malite mgbe nwata ka bụ nwa ọhụrụ zụwa ya.

8 N’otu aka ahụ, ndị nne na nna ndị na-efe Chineke ma na ọ dị mkpa ime ka ịmụta eziokwu dị na Baịbụl na-agụsi ụmụ ha agụụ ike site na mgbe ha dị obere. (Diut. 6:6-9) Nke a ka nwanna nwaanyị bụ́ Rubi mere ozugbo ọ mụchara nwa mbụ ya bụ́ Josef. Kwa ụbọchị, ọ na-agụrụ ya Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible. Ka ọ na-eto na-aga, o nyeere ya aka iburu amaokwu Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ n’isi. Ọzụzụ a ọ̀ baara Josef uru? Obere oge ka ọ malitere ikwu okwu, ọ na-akọ ọtụtụ akụkọ ndị dị na Baịbụl. Mgbe ọ dị afọ ise, o mere ihe omume mbụ ya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.

9. Olee ihe mere i ji kwesị ịna-agụ Baịbụl ma na-atụgharị uche n’ihe ị na-agụ?

9 Ọ bụrụ na unu bụ́ ndị na-eto eto chọrọ inwekwu ọganihu n’ọgbakọ, unu kwesịrị ịmalite mgbe unu na-eto eto na-agụchi Baịbụl anya ruo mgbe unu ghọrọ dimkpa. (Ọma 71:17) Olee ihe mere ịgụ Baịbụl ga-eji nyere gị aka inwe ọganihu? Jizọs gwara nna ya n’ekpere, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke.” (Jọn 17:3) N’eziokwu, ka ị na-amụtakwu banyere Jehova, gị na ya ga-adịkwu ná mma, ị ga-ahụkwukwa ya n’anya. (Hib. 11:27) N’ihi ya, mgbe ọ bụla ị gụrụ Baịbụl, jiri ohere ahụ mụtakwuo banyere Jehova. Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka akụkọ a na-akụziri m banyere ụdị onye Jehova bụ? Olee otú amaokwu Baịbụl a si egosi na Chineke hụrụ m n’anya nakwa na ọ na-eche banyere m?’ Iwepụta oge tụgharịa uche n’ajụjụ ndị a ga-enyere gị aka ịmụta otú Jehova si eche echiche na otú o si ele ihe anya, nakwa ihe ọ chọrọ ka i mee. (Gụọ Ilu 2:1-5.) Dị ka e mere Timoti, a ga-eme ka “i kwere” ihe ị mụtara n’Akwụkwọ Nsọ, nke a ga-emekwa ka i jiri obi ọcha gị na-efe Jehova.—2 Tim. 3:14.

Otú Ekpere Ga-esi Nyere Gị Aka Ịhụkwu Jehova n’Anya

10, 11. Olee otú ekpere si eme ka ijere Chineke ozi na-agụsikwu gị agụụ ike?

10 Ekpere bụ ihe nke abụọ nwere ike ime ka ọ gụsikwuo gị agụụ ike iji obi gị dum na-ejere Jehova ozi. Anyị na-agụ n’Abụ Ọma 65:2, sị: “Gị Onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka anụ ahụ́ niile bụ́ mmadụ ga-abịakwute.” Ọbụna mgbe ụmụ Izrel na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ, ndị mba ọzọ ndị na-abịa n’ụlọ nsọ Jehova na-ekpeku ya ekpere. (1 Eze 8:41, 42) Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Jehova na-anụ ekpere ndị na-eme uche ya. (Ilu 15:8) N’ezie, “anụ ahụ́ niile bụ́ mmadụ” gụnyere unu ndị na-eto eto.

11 Ị ma na ọ bụrụ na enyi na enyi na-ekwurịta okwu, ha ga-adị n’ezigbo mma. Ikekwe, ọ na-amasị gị ịkọrọ ezigbo enyi gị ihe dị gị n’obi na ihe ndị na-enye gị nsogbu. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị na-ekpeku Onye Okike Ukwu gị ekpere site n’obi, ị na-agwa ya okwu. (Fil. 4:6, 7) Gwa Jehova okwu ka à ga-asị na ị na-agwa nne ma ọ bụ nna gị hụrụ gị n’anya ma ọ bụ dị ka ị̀ na-agwa ezigbo enyi gị otú obi dị gị. N’eziokwu, otú i si ekpe ekpere na-egosi ihe ị na-eche banyere Jehova. Ị ga-achọpụta na ekpere gị ga-adịkwu mma ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma.

12. (a) Olee ihe mere na ọ bụghị naanị ihe mmadụ kpere n’ekpere na-eme ka ekpere ya dị mma? (b) Gịnị ga-enyere gị aka ịghọta na Jehova nọ gị nso?

12 Ma, buru n’uche na ọ bụghị naanị ihe e kwuru n’ekpere na-eme ka ọ bụrụ ekpere dị mma. Ọ na-agụnye otú obi dị gị n’ezie. Ekpere gị kwesịrị igosi na ị hụrụ Jehova n’anya, na-akwanyere ya ùgwù, ma tụkwasị ya obi kpamkpam. Ka ị na-ahụ otú Jehova si na-aza ekpere gị, ị ga-achọpụta nnọọ nke ọma na “Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso.” (Ọma 145:18) N’ezie, Jehova ga-abịaru gị nso, meekwa ka okwukwe gị sie ike ka i wee nwee ike iguzogide Ekwensu, nyekwara gị aka ịhọrọ ime ihe ndị ziri ezi ná ndụ.—Gụọ Jems 4:7, 8.

13. (a) Olee uru otu nwanna nwaanyị ritere n’ihi na ya na Chineke bụ enyi? (b) Olee otú ị ga-esi nwee ike imeri nsogbu ndị ọgbọ gị na-enye gị ma ọ bụrụ na gị na Chineke bụ enyi?

13 Tụlee otú Sheri si nweta ume n’ihi na ya na Jehova dị n’ezigbo mma. Mgbe ọ nọ kọleji, o ritere ọtụtụ ihe nrite n’ihi na ọ na-eme nnọọ nke ọma n’akwụkwọ nakwa n’egwuregwu. Mgbe ọ gụchara akwụkwọ, e nyere ya ohere ịga mahadum n’efu. Sheri kwuru, sị: “Nke a na-adọ akpịrị, ndị na-akụziri anyị egwuregwu na ụmụ akwụkwọ ibe m gwara m ka m kwere.” Ma, ọ chọpụtara na ọ bụrụ na ya abanye mahadum na ya ga-eji oge dị ukwuu na-amụ akwụkwọ ma na-akwadebe maka egwuregwu. Nke a ga-emekwa ka ọ ghara inwe ohere na-ejere Jehova ozi. Gịnị ka Sheri mere? Ọ sịrị, “Mgbe m kpekuchara Jehova ekpere, ekweghị m anabata ohere ahụ, kama nke ahụ, amalitere m ịrụ ọrụ ịsụ ụzọ.” Ọ rụọla ọrụ ịsụ ụzọ afọ ise ugbu a. O kwuru, sị: “M naghị akwa ụta ọ bụla. Ịmara na m mere mkpebi masịrị Jehova na-eme ka m nwee obi ụtọ. N’eziokwu, ọ bụrụ na i bute Alaeze Chineke ụzọ, a ga-atụkwasịrị gị ihe ndị ọzọ niile.”—Mat. 6:33.

Àgwà Ọma Ị Na-akpa Na-egosi na ‘Obi Gị Dị Ọcha’

14. Gịnị mere àgwà ọma gị ji dị Jehova mkpa?

14 Ụzọ nke atọ i nwere ike isi gosi na i ji obi ọcha na-efe Jehova bụ ịkpa àgwà ọma. Jehova na-agọzi ndị na-eto eto na-akpa àgwà ọma. (Gụọ Abụ Ọma 24:3-5.) Nwa okorobịa bụ́ Samuel ekweghị eṅomi omume rụrụ arụ ụmụ Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ilaị na-eme. Ndị ọzọ makwa na Samuel na-akpa àgwà ọma. Baịbụl sịrị: “N’oge ahụ niile, nwa okoro ahụ bụ́ Samuel nọ na-eto, ihe ya wee na-adịwanye ma Jehova ma mmadụ mma.”—1 Sam. 2:26.

15. Olee ihe ụfọdụ ndị mere i ji kwesị ị na-akpa àgwà ọma?

15 Ndị juru n’ụwa anyị bi na ya bụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị na-anya isi, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-eme ihe ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya. Ihe ndị a bụ naanị ole na ole n’ime ihe ndị Pọl kwuru okwu ha. (2 Tim. 3:1-5) N’ihi ya, ọ ga-esiri mmadụ ezigbo ike ịkpa àgwà ọma n’ebe ndị ọjọọ gbara ya gburugburu. Ma, mgbe ọ bụla i mere ihe ziri ezi ma jụ ime omume rụrụ arụ, ị na-egosi na ị kwụ Jehova n’akụkụ n’okwu ahụ metụtara onye kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. (Job 2:3, 4) Obi ga-adịkwa gị ụtọ ịmara na ị na-eme ihe Jehova rịọrọ gị ka i mee mgbe ọ sịrị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.” (Ilu 27:11) Ịmarakwa na gị na Jehova dị ná mma ga-eme ka ị chọkwuo ijere ya ozi.

16. Olee otú nwanna nwaanyị si mee ka obi Jehova ṅụrịa?

16 Mgbe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ́ Karol ka na-eto eto, ọ na-eme ihe Baịbụl kwuru n’oge niile ọ nọrọ n’ụlọ akwụkwọ, ndị ọzọ chọpụtakwara na ọ na-akpa àgwà ọma. Gịnị mere? Ụmụ klas ha na-akwa ya emo n’ihi na akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ ekweghị ya ka o soro na-eme ememme ụfọdụ, tinyere ndị nke e ji eto mba ha. N’oge ahụ, e nwere mgbe o nwere ohere izi ndị ọzọ ozi ọma. Mgbe ọtụtụ afọ gafere, onye ya na ya nọbu na klas ziteere ya kaadị. O dere, sị: “Ọ dịla anya m chọwara inweta gị ka m kelee gị. Àgwà ọma gị nke na-egosi na ị bụ Onye Kraịst nakwa obi ike i ji jụ iso na-eme ememme ndị ahụ, pụrụ iche. Ọ bụ gị bụ Onyeàmà Jehova mbụ m matara.” Àgwà ọma Karol ruru nnọọ nwa klas ha ahụ n’ahụ́ nke na ọ mechara malite ịmụ Baịbụl. O kwuru na kaadị ahụ na ọ karịala afọ iri anọ ya bụ Onyeàmà e mere baptizim! Dị ka Karol mere, unu ndị na-eto eto, bụ́ ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru, nwere ike ime ka ndị nwere obi eziokwu mara Jehova.

Ndị Na-eto Eto Bụ́ Ndị Na-efe Jehova

17, 18. (a) Olee otú obi na-adị gị maka ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ unu? (b) Olee ihe ndị na-eto eto ndị na-efe Chineke ofufe ga-enweta n’ọdịnihu?

17 Anyị niile ndị nọ n’ọgbakọ Jehova zuru ụwa ọnụ na-enwe obi ụtọ ịhụ ọtụtụ puku ndị na-eto eto bụ́ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-efe Jehova. Ndị a na-eto eto na-eme ka ọchịchọ ha nwere ife Jehova sikwuo ike site n’ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị, site n’ikpe ekpere, nakwa site n’ime ihe Chineke kwuru. Ndị na-eto eto ndị a, bụ́ ndị na-esetịpụ ezigbo ihe nlereanya, na-eme ka ndị mụrụ ha na ndị Jehova niile ṅụrịa.—Ilu 23:24, 25.

18 N’ọdịnihu, ndị na-eto eto ga-eso ná ndị ga-abanye n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere anyị ná nkwa. (Mkpu. 7:9, 14) N’oge ahụ, ndị na-eto eto ga-enweta ọtụtụ ngọzi ka ha na-egosi Jehova na obi dị ha ụtọ maka ihe o meere ha. Ha ga-enwekwa ike ife ya ofufe ruo mgbe ebighị ebi.—Ọma 148:12, 13.

Ì Nwere Ike Ịkọwa?

• Olee otú ndị na-eto eto nwere ike isi soro na-efe Chineke ofufe taa?

• Olee ihe mere i ji kwesị ị na-atụgharị uche ka ọgụgụ Baịbụl gị wee nwee ike ịbara gị uru?

• Olee otú ekpere si enyere gị aka ịbịaru Jehova nso?

• Olee ihe àgwà ọma Ndị Kraịst na-akpa na-arụpụta?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 5]

Ị̀ na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị?