Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Jehova Si Eji Mmụọ Nsọ Emezu Nzube Ya

Otú Jehova Si Eji Mmụọ Nsọ Emezu Nzube Ya

Otú Jehova Si Eji Mmụọ Nsọ Emezu Nzube Ya

‘Okwu m nke si n’ọnụ m pụta ga-emezu ihe m zigara ya ka o mee.’—AỊZA. 55:11.

1. Mee ihe atụ na-egosi otú atụmatụ si dị iche na nzube.

KA ANYỊ were ya na mmadụ abụọ na-akwado iji ụgbọala abụọ gaa njem. Onye nke mbụ ekwuo naanị otu ụzọ ọ ga-esi ruo ebe ọ na-aga. Onye nke ọzọ ma ebe ọ na-aga nke ọma, marakwa ụzọ dị iche iche o nwere ike isi ruo ebe ọ na-aga. Ọ dịkwa njikere isi nke ọ bụla n’ime ụzọ ndị ahụ, ma ọ bụrụ na ihe agbanwee. Otú mmadụ abụọ a si chọọ ịga ebe ahụ ha na-aga na-egosi ọdịiche dị n’atụmatụ na nzube. Onye nke ahụ kwuru kpọmkwem otú ọ ga-esi ruo ebe ahụ mere atụmatụ, ebe onye nke ahụ ma ebe ọ na-aga, marakwa na ya ga-erurịrị ya, ma o kwughị kpọmkwem ụzọ ọ ga-esi ruo ya nwere nzube.

2, 3. (a) Gịnị ka nzube Jehova gụnyere, gịnịkwa ka Jehova mere mgbe Adam na Iv mehiere? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ịma nzube Jehova, ma na-eme ihe kwekọrọ n’otú o si emezu ya?

2 Jehova anaghị eme atụmatụ iji mezuo uche ya, kama nke ahụ, ọ na-ezube ihe, bụ́ nke na-emezu ka oge na-aga. (Efe. 3:11) Nzube ya gụnyere ihe bụ́ uche ya na mbụ banyere ụmụ mmadụ nakwa ụwa, ya bụ, ime ka ụwa ghọọ paradaịs, bụ́ ebe ụmụ mmadụ zuru okè ga-ebi n’udo ma na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. (Jen. 1:28) Mgbe Adam na Iv mehiere, Jehova mere ndokwa nke ga-eme ka nzube ya mezuo. (Gụọ Jenesis 3:15.) Jehova kpebiri na nwaanyị ya, bụ́ nwaanyị ihe atụ, ga-amụpụta otu “mkpụrụ,” ma ọ bụ Ọkpara, bụ́ onye ga-egbu ajọ onye ahụ, bụ́ Setan, ma mezie ihe niile Setan mebiri.—Hib. 2:14; 1 Jọn 3:8.

3 O nweghị onye nọ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa nke nwere ike ime ka nzube Chineke ghara imezu. (Aịza. 46:9-11) Gịnị mere anyị ji kwuo nke a? Ọ bụ n’ihi na mmụọ nsọ Jehova na-akpa ike. Ike ahụ na-enweghị atụ ka Chineke ji ahụ na nzube ya ‘na-emezu.’ (Aịza. 55:10, 11) Anyị kwesịrị ịma otú nzube Chineke si na-emezu, ma na-eme ihe kwekọrọ na ya. Olileanya anyị nwere ịdị ndụ n’ọdịnihu dabeere ná mmezu ya. Ịmata otú Jehova si eji mmụọ nsọ na-arụ ọrụ na-emekwa ka okwukwe anyị sie ike. Ka anyị tụlee otú mmụọ nsọ si mee ka nzube Jehova mezuo n’oge gara aga, otú o si eme ka o mezuo n’oge a nakwa otú ọ ga-esi mee ka o mezuo n’ọdịnihu.

Ọrụ Mmụọ Nsọ Rụrụ n’Oge Gara Aga

4. Olee otú Jehova si jiri nke nta nke nta mee ka a mata ihe nzube ya bụ?

4 N’oge ochie, Jehova ji nke nta nke nta mee ka a mara ihe bụ́ nzube ya. Ná mmalite, ịmata onye bụ́ Mkpụrụ ahụ Chineke kwere ná nkwa bụ ‘ihe nzuzo dị nsọ.’ (1 Kọr. 2:7) Mgbe ọzọ Jehova kwuru banyere mkpụrụ ahụ bụ mgbe ihe dị ka puku afọ abụọ gafere. (Gụọ Jenesis 12:7; 22:15-18.) Nkwa Jehova kwere Ebreham banyere mkpụrụ ahụ mere ka a matakwuo ọtụtụ ihe banyere mkpụrụ ahụ. Okwu ahụ bụ́ “site ná mkpụrụ gị” na-egosi na Mkpụrụ ahụ ga-abụ mmadụ, a ga-amụ ya n’ezinụlọ Ebreham. Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe Chineke mere ka a mata ọtụtụ ihe banyere mkpụrụ ahụ, Setan nụrụ ya wee dị njikere imebi ihe niile. O doro anya na Onye iro ahụ chọrọ imebi ndị si n’ezinụlọ Ebreham ma ọ bụkwanụ merụọ ha iji mee ka nzube Chineke ghara imezu. Ma, o nweghị ike ime ya, n’ihi na o nweghị ihe gbara mmụọ nsọ Chineke gharịị. Olee ihe mmụọ nsọ mere?

5, 6. Olee otú Jehova si jiri mmụọ ya chebe ndị Mkpụrụ ahụ ga-esi n’agbụrụ ha bịa?

5 Jehova ji mmụọ nsọ chebe ndị Mkpụrụ ahụ ga-esi n’agbụrụ ha bịa. Jehova gwara Ebram (ya bụ, Ebreham), sị: “Abụụrụ m gị ọta.” (Jen. 15:1) Nke a abụghị égbè ọnụ. Dị ka ihe atụ, cheta ihe mere n’ihe dị ka afọ 1919 T.O.A. mgbe Ebreham na Sera gara ka ha bitụ na Gira. Abimelek, bụ́ eze Gira, kpọọrọ Sera, ka ọ bụrụ nwunye ya n’ihi na ọ maghị na ọ bụ nwunye Ebreham. Nke a ọ̀ bụ otú Setan si chọọ iji aghụghọ mee ka Sera ghara ịmụ mkpụrụ Ebreham? Baịbụl ekwughị ihe ọ bụla banyere nke a. Naanị ihe ọ gwara anyị bụ na Jehova agbachighị nkịtị. Ọ dọrọ Abimelek aka ná ntị ná nrọ ka ọ ghara imetụ Sera aka.—Jen. 20:1-18.

6 Ọ bụghị naanị nke ahụ bụ mgbe Jehova chebere ha. O chebere Ebreham na ndị ezinụlọ ya ọtụtụ ugboro. (Jen. 12:14-20; 14:13-20; 26:26-29) Ọ bụ ya mere Devid ji kwuo banyere ụmụ Ebreham, sị: “[Jehova ekweghị] ka mmadụ ọ bụla rigbuo ha, kama ọ baara ndị eze mba n’ihi ha, sị: ‘Unu akpala ndị m tere mmanụ aka, unu emekwala ndị amụma m ihe ọjọọ ọ bụla.’”—Ọma 105:14, 15.

7. Olee otú Jehova si chebe mba Izrel?

7 Jehova ji mmụọ ya chebe mba Izrel oge ochie, bụ́ ebe a ga-amụ Mkpụrụ ahụ o kwere ná nkwa. Jehova ji mmụọ ya nye Izrel Iwu ya, bụ́ nke mere ka ha na-efe ya otú o si chọọ, ha na ya wee dị ná mma. Iwu ahụ mekwara ka ha na-adị ọcha wee ghara itinye aka n’omume rụrụ arụ. (Ọpụ. 31:18; 2 Kọr. 3:3) N’oge Ndị Ikpe nọ n’Izrel, mmụọ Jehova nyere ndị ikom ụfọdụ ike ka ha napụta Izrel n’aka ndị iro ha. (Ikpe 3:9, 10) N’ime ọtụtụ narị afọ ndị gafere tupu a mụọ Jizọs, bụ́ onye bụ́ isi ná mkpụrụ Ebreham, ọ ghaghị ịbụ na mmụọ nsọ chebere Jeruselem, Betlehem, na ụlọ nsọ, bụ́ ebe ndị dịcha mkpa maka imezu amụma ndị e buru banyere Jizọs.

8. Gịnị na-egosi na mmụọ nsọ chebere ndụ Ọkpara Chineke, duziekwa ya mgbe ọ na-eje ozi?

8 Mmụọ nsọ chebere ndụ Jizọs, duziekwa ya mgbe ọ na-eje ozi. Mmụọ nsọ rụrụ ọrụ ebube n’akpa nwa nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Meri. Nke a mere ka ihe na-emetụbeghị mbụ mee, ụdị ihe ahụ emebeghịkwa ọzọ. Mmụọ nsọ mere ka nwaanyị na-ezughị okè dịrị ime wee mụọ Nwa zuru okè, bụ́ onye na-eketaghị ọnwụ n’aka Adam. (Luk 1:26-31, 34, 35) Mgbe a mụrụ Jizọs, mmụọ nsọ chebere ya ka a ghara igbu ya. (Mat. 2:7, 8, 12, 13) Mgbe Jizọs dị ihe dị ka afọ iri atọ, Chineke ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ, họpụta ya iketa ocheeze Devid, nyekwa ya ọrụ ikwusa ozi ọma. (Luk 1:32, 33; 4:16-21) Mmụọ nsọ nyeere Jizọs aka ịrụ ọtụtụ ọrụ ebube, ndị dị ka ịgwọ ndị ọrịa, inye ìgwè mmadụ nri, nakwa ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ọrụ ebube ndị ahụ na-egosi ụdị ngọzi ndị anyị na-atụ anya ha n’ọchịchị Jizọs.

9, 10. (a) Olee ihe na-egosi na Jehova nyere Ndị Kraịst oge ochie mmụọ nsọ? (b) Olee otú nzube Jehova si mezuo na narị afọ mbụ nke Oge Anyị?

9 Na Pentikọst nke afọ 33 O.A., Jehova malitere iji mmụọ nsọ na-ete ndị ọzọ ha na Jizọs bụ mkpụrụ Ebreham mmanụ, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha na-abụghị ụmụ Ebreham. (Rom 8:15-17; Gal. 3:29) Jehova nyere Ndị Kraịst oge ochie mmụọ nsọ, nke mere ka ha jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma, rụọkwa ọrụ ebube dị iche iche. (Ọrụ 1:8; 2:1-4; 1 Kọr. 12:7-11) Ọrụ ebube ndị ahụ mmụọ nsọ mere ka ha rụọ mere ka a mata ihe ọhụrụ banyere otú Jehova ga-esi eme ka nzube ya mezuo. Jehova achọkwaghị ka ndị mmadụ nọrọ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem na-efe ya otú ha si efe ya kemgbe ọtụtụ narị afọ. Ọ malitere ịnabata ofufe ọgbakọ Ndị Kraịst nke bidoro ọhụrụ. Kemgbe ahụ, Jehova ji ọgbakọ ahụ o tere mmanụ emezu nzube ya.

10 Ole na ole n’ime ọrụ ndị mmụọ nsọ Chineke na-arụ iji mezuo nzube Jehova n’oge ochie bụ ichebe ndị ya, inye ha ike, na ite mmanụ. Oleekwanụ maka oge a? Olee otú Jehova si eji mmụọ ya emezu nzube ya n’oge a? Anyị kwesịrị ịmara, n’ihi na anyị kwesịrị ịna-eme ihe dị mmụọ nsọ mma. Ugbu a, ka anyị tụlee anọ n’ime ụzọ dị iche iche Jehova si eji mmụọ ya arụ ọrụ n’oge a.

Ọrụ Mmụọ Nsọ Na-arụ n’Oge A

11. Gịnị na-egosi na mmụọ nsọ na-eme ka ndị Chineke dị ọcha, olee otú ị ga-esi gosi na ị naghị emegide ya?

11 Nke mbụ bụ na mmụọ nsọ na-enyere ndị Chineke aka ịdị ọcha. Ndị Jehova, bụ́ ndị na-erite uru na nzube ya, aghaghị ịdị ọcha n’omume. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11.) Ụfọdụ n’ime ndị bụ ezigbo Ndị Kraịst ugbu a bụbu ndị na-akwa iko, ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ndị ikom ha na ndị ikom na-enwe mmekọahụ ma ọ bụkwanụ ndị inyom ha na ndị inyom ibe ha na-enwe mmekọahụ. Ọchịchọ ndị na-eme ka mmadụ mee mmehie na-agbanyesi mgbọrọgwụ ike n’obi. (Jems 1:14, 15) Ma, “a sachawo” ha, nke pụtara na ha agbanweela ndụ ha wee na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ. Gịnị na-enyere onye hụrụ Chineke n’anya aka ịrụ ọchịchọ anụ ahụ́ ya ụka ka o wee na-eme ihe ziri ezi? Ndị Kọrịnt nke mbụ isi isii amaokwu iri na otu sị na ọ bụ “mmụọ nke Chineke.” Ị na-egosi na mmụọ nsọ na-eduzi gị ma ọ bụrụ na ị naghị etinye aka n’omume rụrụ arụ.

12. (a) Olee otú ọhụụ ahụ Ezikiel hụrụ si egosi otú Jehova si eduzi nzukọ ya? (b) Olee otú ị ga-esi gosi na gị na mmụọ nsọ na-aga ụkwụ na ụkwụ?

12 Nke abụọ bụ na Jehova ji mmụọ ya eduzi ọgbakọ ya ebe ọ bụla ọ chọrọ ka ọ na-aga. Ezikiel hụrụ nzukọ Jehova ka ọ dị ka ụgbọ ịnyịnya nke na-agba n’eluigwe n’akwụsịghị akwụsị iji mezuo nzube Jehova. Gịnị na-eme ka ụgbọ ịnyịnya ahụ na-aga ebe ọ bụla o chere ihu? Ọ bụ mmụọ nsọ. (Ezik. 1:20, 21) Ka anyị cheta na nzukọ Jehova dị otu, ma, ọ dị ụzọ ebe abụọ, otu dị n’eluigwe, nke ọzọ adịrị n’ụwa. Ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ nsọ na-eduzi nke ahụ dị n’eluigwe, ọ bụkwa ya na-eduzi nke dị n’ụwa. Ị na-egosi na gị na ụgbọ ịnyịnya ahụ nke dị n’eluigwe na-aga ụkwụ na ụkwụ nakwa na ị na-erubere mmụọ nsọ isi ma ọ bụrụ na ị na-erubere nzukọ Chineke nke dị n’ụwa isi ma na-akwado ya.—Hib. 13:17.

13, 14. (a) Olee ndị bụ “ọgbọ a” Jizọs kwuru banyere ya? (b) Kwuo ihe na-egosi na mmụọ nsọ na-enyere anyị aka ịghọta eziokwu dị na Baịbụl. (Gụọ igbe bụ́ “Ị̀ Na-aghọta Eziokwu Dị na Baịbụl A Na-akọwara Anyị Site n’Oge Ruo n’Oge?”)

13 Nke atọ bụ na Jehova ji mmụọ nsọ eme ka anyị ghọta eziokwu dị na Baịbụl. (Ilu 4:18) Ọ dịlarị anya “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ji Ụlọ Nche mere akwụkwọ bụ́ isi ha ji eme ka ụmụ mmadụ na-aghọtakwu eziokwu dị na Baịbụl. (Mat. 24:45) Dị ka ihe atụ, cheta otú anyị si ghọta ndị bụ “ọgbọ a,” bụ́ nke Jizọs kwuru okwu ya. (Gụọ Matiu 24:32-34.) Olee ọgbọ Jizọs nọ na-ekwu banyere ya? Isiokwu bụ́ “Ọnụnọ Kraịst—Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Gị?” kwuru na Jizọs anọghị na-ekwu banyere ndị ajọ omume, kama, ọ na-ekwu banyere ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị a na-aga iji mmụọ nsọ tee mmanụ n’oge ahụ. * Ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị e tere mmanụ, ndị nọ n’ụwa na narị afọ mbụ, hụrụ ihe ama nke na-egosi na Jizọs “nọ nso n’ọnụ ụzọ,” ha ghọtakwara ihe ihe ama ahụ pụtara. Ndị e tere mmanụ ndị nọ n’ụwa n’oge anyị a na-emekwa otú ahụ.

14 Gịnị ka ihe a Ụlọ Nche kwuru na-akụziri anyị? N’agbanyeghị na anyị amaghị mgbe “ọgbọ a” ga-abịa ná njedebe, anyị kwesịrị iburu ọtụtụ ihe n’uche banyere okwu a bụ́ “ọgbọ”: Ọ na-apụtakarị ndị na-abụghị ebiri, ndị nọrọ ndụ n’otu oge; ọ naghị eto oké ogologo; ọ na-agwụkwa agwụ. (Ọpụ. 1:6) Olee otú anyị ga-esi ghọta ihe ahụ Jizọs kwuru banyere “ọgbọ a”? O doro anya na ihe ọ nọ na-ekwu bụ na ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị nke ka nọ n’ụwa mgbe a malitere ịhụ ihe ama ahụ n’afọ 1914, ga-anọrọ ndụ ruo mgbe ndị ọzọ e tere mmanụ, bụ́ ndị na-ahụghị mmalite nke ihe ama ahụ ma ha ga-ahụ mmalite nke oké mkpagbu ahụ, ga-anọ n’ụwa. Ọgbọ ahụ nwere mmalite, ọ ghaghịkwa ịbịa ná njedebe. Otú ihe dị iche iche si eme iji mezuo ihe ama ahụ na-egosi nke ọma na ọ ghaghị ịbụ na oké mkpagbu ahụ adịla nso. Ị na-egosi na ị na-aghọta eziokwu dị na Baịbụl mgbe ọ bụla a kọwara ya ma na-eso nduzi nke mmụọ nsọ ma ọ bụrụ na ị na-eche nche ma buru n’uche na oké mkpagbu ahụ adịla nso.—Mak 13:37.

15. Gịnị na-egosi na ọ bụ mmụọ nsọ na-enye anyị ike anyị ji na-ekwusa ozi ọma?

15 Nke anọ bụ na mmụọ nsọ na-enye anyị ike anyị ji ekwusa ozi ọma. (Ọrụ 1:8) O nweghị ihe ọzọ na-enye anyị ike anyị ji ekwusa ozi ọma n’ụwa niile ma e wezụga mmụọ nsọ. Chegodị banyere ya. O nwere ike ya abụrụ na i so ná ndị na-ekwu n’oge gara aga n’ihi oké ihere ma ọ bụkwanụ egwu, na-asị, ‘O nweghị ka m ga-esi na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ!’ Ma, i jizi ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma ugbu a. * Ọtụtụ Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị, na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị mmegide na mkpagbu. Ọ bụ naanị mmụọ nsọ Chineke na-enye anyị ike anyị ji emeri nsogbu dị iche iche wee na-eme ihe ndị gaara akarị anyị omume. (Maị. 3:8; Mat. 17:20) Ị na-egosi na ị na-erubere mmụọ nsọ isi ma ọ bụrụ na i ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.

Ọrụ Mmụọ Nsọ Ga-arụ n’Ọdịnihu

16. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na Jehova ga-echebe ndị ya n’oge oké mkpagbu ahụ?

16 N’ọdịnihu, Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya rụọ ọrụ ndị dị ebube iji mezuo nzube ya. Ka anyị buru ụzọ tụlee otú ọ ga-esi chebe ndị ya. Dị ka anyị kwuru na mbụ, n’oge ochie, Jehova ji mmụọ ya chebe ndị ụfọdụ nakwa mba Izrel dum. Nke a mere ka anyị kwenyesie ike na ọ ga-eji otu mmụọ ahụ dị ike chebe ndị ya mgbe oké mkpagbu ahụ nke ga-abịa n’oge na-adịghị anya ga-emecha bịa. Anyị ekwesịghị ikwu na ọ bụ otú a ma ọ bụkwanụ otú a ka Jehova ga-esi chebe anyị n’oge ahụ. Kama nke ahụ, anyị nwere obi ike na ọ ga-echebe anyị, n’ihi na o nweghị ebe ndị hụrụ Jehova n’anya ga-anọ ka ọ ghara ịhụ ha, ọ dịghịkwa ebe ha ga-anọ ka mmụọ nsọ ya ghara iru ebe ahụ wee chebe ha.—2 Ihe 16:9; Ọma 139:7-12.

17. Olee ihe Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya rụọ n’ụwa ọhụrụ?

17 Olee otú Jehova ga-esi eji mmụọ nsọ ya arụ ọrụ n’ụwa ọhụrụ? Ọ bụ mmụọ nsọ ka a ga-eji dee akwụkwọ mpịakọta ọhụrụ ndị a ga-emeghe n’oge ahụ. (Mkpu. 20:12) Gịnị ga-adị n’ime ha? Ọ ghaghị ịbụ ihe niile Jehova chọrọ ka anyị na-eme n’ime otu puku afọ nke ọchịchị Kraịst. Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike ịhụ ihe ga-adị n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ? Anyị na-eche ka ụwa ọhụrụ ahụ bịawa abịawa. Ọ ga-abụ ihe magburu onwe ya mmadụ ịnọ mgbe Jehova ga-agọzi ihe niile, bụ́ mgbe ọ ga-eji mmụọ nsọ ya mezuo ihe bụ́ nzube ya banyere ụwa na ụmụ mmadụ ndị bi na ya.

18. Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

18 Ka anyị ghara ichefu na nzube Jehova ga-emezurịrị, n’ihi na ọ bụ mmụọ nsọ ya, bụ́ ike kacha ike niile n’ụwa na n’eluigwe, ka o ji emezu ya. Nzube ahụ metụtara gị. Ya mere, kpebisie ike na ị ga na-arịọ Jehova mmụọ ya, nakwa na gị na mmụọ ya ga na-aga ụkwụ na ụkwụ. (Luk 11:13) Ọ bụrụ na i mee nke a, i nwere ike inwe olileanya ịdị ndụ otú Jehova zubere ka ndị mmadụ na-adị, ya bụ, ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụ banyere onye na-emebu oké ihere ma mechaa merie ya wee jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, gụọ Ụlọ Nche nke ọnwa Septemba 15, 1993, peeji nke 19.

Ì Chetara?

• Olee otú Jehova si jiri mmụọ nsọ ya mee ka nzube ya mezuo n’oge ochie?

• Olee ihe dị iche iche Jehova ji mmụọ nsọ ya na-emezu n’oge a?

• Olee otú Jehova ga-esi jiri mmụọ ya rụọ ọrụ n’ọdịnihu ka nzube ya wee mezuo?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 10]

Ị̀ Na-aghọta Eziokwu Dị na Baịbụl A Na-akọwara Anyị Site n’Oge Ruo n’Oge?

Jehova na-eme ka eziokwu dị na Baịbụl dokwuo ndị ya anya site n’oge ruo n’oge. Olee eziokwu ndị e mere ka ha dokwuo anyị anya n’Ụlọ Nche?

▪ Gịnị ka anyị mụtara banyere otú mmadụ nwere ike isi ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs n’ihe atụ ahụ Jizọs ji ihe iko achịcha mee? (Mat. 13:33)—July 15, 2008, peeji nke 19-20.

▪ Olee mgbe a kwụsịrị ịhọrọ ndị ga-aga eluigwe?—May 1, 2007, peeji nke 30-31.

▪ Gịnị ka ife Jehova “n’ime mmụọ” pụtara? (Jọn 4:24)—July 15, 2002, peeji nke 15.

▪ N’ogige nke ole ka oké ìgwè mmadụ ahụ nọ na-efe ofufe? (Mkpu. 7:15)—May 1, 2002, peeji nke 30-31.

▪ Olee mgbe a ga-ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ? (Mat. 25:31-33)—October 15, 1995, peeji nke 18-28.