Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Wepụ Anya Gị n’Ihe Na-abaghị Uru!

Wepụ Anya Gị n’Ihe Na-abaghị Uru!

Wepụ Anya Gị n’Ihe Na-abaghị Uru!

“Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru; chebe m ndụ n’ụzọ nke gị.”—ỌMA 119:37.

1. Olee otú anya anyị dịruru anyị mkpa?

ANYA anyị na-abara anyị uru na-enweghị atụ. Anyị na-eji ya ahụ ihe ndị dị anyị gburugburu, ma otú ha dị ma otú ha na-acha. Anyị na-eji anya anyị ahụ ndị enyi anyị hụrụ anyị n’anya, ọ na-enyekwara anyị aka ịhụ ihe ndị nwere ike imerụ anyị ahụ́. Anyị na-eji ya ahụ ihe ndị mara mma na ihe dị iche iche dị ebube e kere eke. Ọ na-enyekwara anyị aka ịhụ ihe ndị na-egosi na Chineke dị, hụkwa ebube ya. (Ọma 8:3, 4; 19:1, 2; 104:24; Rom 1:20) Ebe ọ bụ anya na-agwa uche ihe ọ hụrụ, anya anyị dị anyị mkpa ka anyị wee mara Jehova, ọ na-emekwa ka okwukwe anyị sie ike n’ebe Chineke nọ.—Jọsh. 1:8; Ọma 1:2, 3.

2. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya banyere ihe anyị na-ahụ, oleekwa ihe anyị na-amụta n’ekpere otu ọbụ abụ si n’ala ala obi ya kpee?

2 Ma, ihe anyị ji anya anyị ahụ nwere ike ịkpatara anyị nsogbu. Otú anya na uche si arụkọ ọrụ siri nnọọ ike nke na obi anyị nwere ike ịmalite inwe ọchịchọ nke ihe anyị ji anya anyị hụ. Anyị na-ahụ ọtụtụ foto ma ọ bụkwanụ nụ ọtụtụ ihe ndị nwere ike iduhie anyị, ya sọkwa ya, ya bụrụ na anyị hụpeere ha ahụpe ma ọ bụkwanụ nụpere ha anụpe. Nke a bụ n’ihi na anyị bi n’ụwa Setan bụ́ Ekwensu na-achị, bụ́ ụwa rụrụ arụ nke hụrụ ihe ụtọ n’anya. (1 Jọn 5:19) Ọ bụ ya mere otu ọbụ abụ ji rịọ Chineke arịrịọ, sị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru; chebe m ndụ n’ụzọ nke gị.”—Ọma 119:37.

Otú Anya Nwere Ike Isi Duhie Anyị

3-5. Olee akụkọ a kọrọ na Baịbụl nke na-egosi ihe nwere ike ime anyị ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka anya anyị duhie anyị?

3 Cheta ihe mere nwaanyị mbụ, bụ́ Iv. Setan gwara ya na anya ya “ga-emeghe” ma ọ bụrụ na o rie mkpụrụ si “n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ.” Ọ ghaghị ịbụ na Iv nwere mmasị ka anya ya ‘meghee.’ Mgbe ọ hụrụ “na mkpụrụ osisi ahụ dị mma oriri nakwa na ọ na-agụsi anya agụụ ike, ee, osisi ahụ mara mma ile anya” ọ nwekwuru mmasị iri ya. Mgbe Iv malitere ileru mkpụrụ osisi ahụ anya, ọ gụrụ ya agụụ, o wee mebie iwu Chineke. Di ya, bụ́ Adam, nupụkwaara Chineke isi, bụ́ ihe tinyere mmadụ niile ná nsogbu a anyị nọ na ya taa.—Jen. 2:17; 3:2-6; Rom 5:12; Jems 1:14, 15.

4 N’oge Noa nọ ndụ, ihe ndị mmụọ ozi ụfọdụ hụrụ duhiere ha. Jenesis isi isii amaokwu abụọ kwuru banyere ha, sị: “Ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke malitere ịhụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ, na ha mara mma; ha wee na-alụrụ ndị inyom, bụ́ ndị niile ha họọrọ.” Anya ndị mmụọ ozi ahụ nupụụrụ Jehova isi nke nọ nnọọ na-ele ndị inyom ahụ mere ka ha malite inwe agụụ ka ha na ha nwee mmekọahụ, bụ́ ihe Chineke na-achọghị ka ndị mmụọ na-eme. Ka oge na-aga, ha mụrụ ụmụ na-eme ihe ike. Ihe ọjọọ ụmụ mmadụ na-eme n’oge ahụ mere ka Chineke laa ha niile n’iyi, ma e wezụga Noa na ezinụlọ ya.—Jen. 6:4-7, 11, 12.

5 Mgbe ọtụtụ narị afọ gafere, bụ́ mgbe e bibiri Jeriko, anya otu onye Izrel aha ya bụ Ekan duhiere ya, ya ewee zuru ụfọdụ n’ime ihe dị n’obodo ahụ. Chineke nyere iwu ka e bibie ihe niile dị n’obodo ahụ, ma e wezụga ihe ụfọdụ a ga-ewepụtara ya. A dọrọ ụmụ Izrel aka ná ntị, sị: “Unu emetụkwala ihe a ga-ebibi ebibi aka, ka ọ ghara ịgụ unu agụụ” unu ewee were ụfọdụ ihe n’obodo ahụ. Mgbe Ekan nupụrụ isi, ndị E-aị meriri ụmụ Izrel mgbe ha gara ịlụso E-aị agha, e wee gbuo ọtụtụ n’ime ha. Ekan ekwupụtaghị mmehie ya ruo mgbe a chọgidere wee chọpụta na o zuru ohi. Ya ewee, sị: ‘Mgbe m hụrụ ihe ndị ahụ, ha gụrụ m agụụ, m wee chịrị ha.’ Ọchịchọ nke anya ya mere ka a laa ya na “ihe niile bụ́ nke ya” n’iyi. (Jọsh. 6:18, 19; 7:1-26) Ekan chọrọ inweta ihe Jehova gwara ha ka ha ghara imetụ aka.

Anyị Kwesịrị Ijide Onwe Anyị

6, 7. Olee “atụmatụ” Setan kacha eji amata anyị n’ọnyà, oleekwa otú ndị na-akpọsa ngwá ahịa si eji ya akpọsa ngwá ahịa ha?

6 Ekwensu na-anwakwa ụmụ mmadụ ọnwụnwa otú ahụ o si nwaa Iv, ndị mmụọ ozi ahụ nupụụrụ Jehova isi, nakwa Ekan. Nke kacha njọ n’ime “atụmatụ” niile Setan ji eduhie ụmụ mmadụ bụ “ọchịchọ nke anya.” (2 Kọr. 2:11; 1 Jọn 2:16) Ndị na-akpọsa ngwá ahịa n’oge a ma nke ọma na kemgbe ụwa, ihe mmadụ hụrụ nwere ike ime ka ọ gbanwee otú o si ele ihe anya. Otu nwoke Yurop azụmahịa doro anya kwuru, sị: “Anya kacha ihe niile dị n’ahụ́ eduhie mmadụ. Ọ na-akpa ike karịa ihe ndị ọzọ, na-emekwa ka anyị mee ihe anyị ma na ọ dịghị mma.”

7 Ọ bụ ya mere ndị na-akpọsa ngwá ahịa ji etinye foto ndị na-adọrọ mmasị n’ebe niile, bụ́ ndị e mere ka ha mee ka ngwá ahịa ndị e ji ha akpọsa na-agụsi anyị ike. Otu onye Amerịka bụ́ a gawa a kpọtụrụ n’ihe banyere ịkpọsa ngwá ahịa, bụ́ onye mere nnyocha n’otú ịkpọsa ngwá ahịa si eme ka mmadụ zụọ ihe, kwuru na “ihe ịkpọsa ngwá ahịa na-eme abụghị naanị ịgwa ndị mmadụ na e nwere ihe a na-ere ere, kamakwa, ọ na-eme ka ha nwee ọchịchị ịzụrụ ihe ahụ.” Otu n’ime ihe ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-ejikarị akpọsa ngwá ahịa ha bụ foto ndị gba ọtọ. Nke a mere o ji dịsie mkpa ike ka anyị kpachara anya n’ihe ndị anya anyị na-ahụ, bụ́ ndị na-abanye n’uche anyị.

8. Olee ihe Baịbụl kwuru bụ́ nke na-egosi na anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ihe anya anyị na-ahụ?

8 Ndị Kraịst nwekwara ike inwe ọchịchọ nke anya na nke anụ ahụ́. Ya mere, Baịbụl na-agba anyị ume ka anyị nwee njide onwe onye wee kpachara anya n’ihe anyị na-ahụ na ihe anyị na-enwe ọchịchọ inweta. (1 Kọr. 9:25, 27; gụọ 1 Jọn 2:15-17.) Job, bụ́ nwoke ezi omume, ma na mmadụ na-enwekarị ọchịchị inweta ihe ọ na-ahụ anya. Ọ sịrị: “Mụ na anya m agbawo ndụ. Oleezi otú m ga-esi nwee mmasị n’ebe nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nọ?” (Job 31:1) Job anaghị emetụ nwaanyị aka n’ahụ́ otú ga-eme ka o nwee agụụ mmekọahụ, ọ naghịkwa ekwe ka ụdị ihe ahụ bata ya n’echiche. Jizọs kwusiri okwu ike ka anyị ghara ịna-eche ihe rụrụ arụ n’obi mgbe ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.”—Mat. 5:28.

Ihe Ndị Na-abaghị Uru Anyị Na-ekwesịghị Ịna-ahụ

9. (a) Olee ihe mere anyị ga-eji kpachara anya mgbe anyị na-awagharị n’Ịntanet? (b) Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị ahụpere ihe na-akpali agụụ mmekọahụ?

9 N’ụwa taa, ọtụtụ ndị “na-ele” ihe na-akpali agụụ mmekọahụ anya, karịchaa n’Ịntanet. Foto ndị ahụ nwere ike ịpụta, ọ bụrụgodị na anyị achọghị ikiri ha. Olee otú nke a nwere ike isi mee? Foto nke na-adọrọ mmasị nwere ike ịgba n’ihu kọmputa gị wee kọọrọ gị ihe ndị ọzọ i nwere ike ikiri. I nwekwara ike inweta ozi iimel nke yiri ka o nweghị ihe o mere, bụ́ nke ọ ga-abụ i meghee ya, ya abụrụ naanị foto na-akpali agụụ mmekọahụ juru na ya, mmechi ya abụrụkwa ọgụ na mgba. Ọ bụrụgodị naanị nhụpere ka ị hụpeere ihe dị na ya tupu gị emechie ya, ị gaghị echefu ya echefu. Naanị nhụpere mmadụ hụpeere ihe na-akpali agụụ mmekọahụ nwere ike inye ya nsogbu. O nwere ike ime ka akọnuche onye ahụ malite ịma ya ikpe. Foto ndị ahụ ọ hụrụ nwekwara ike ịra ya ahụ́ nchefu. Nke ka njọ bụ na onye kpachaara anya “na-ele” ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na-egosi na ya emebeghị ka ọchịchọ ihe rụrụ arụ nwụọ n’ahụ́ ya.—Gụọ Ndị Efesọs 5:3, 4, 12; Kọl. 3:5, 6.

10. Olee ihe mere ikiri ma ọ bụ ịgụ ihe na-akpali agụụ mmekọahụ ji ewetara ụmụaka nsogbu, oleekwa ihe nwere ike ime ma ha na-ekiri ma ọ bụ na-agụ ya?

10 Ihe nwere ike ime ka ụmụaka malite ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ bụ na ha na-achọ ịmatacha ihe niile. Ọ bụrụ na nke a emee, ha ga na-elezi mmekọahụ anya n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. Otu nchọpụta e mere kwuru na nke a nwere ike ime ka ha nwee echiche na-ezighị ezi banyere mmekọahụ, nke na ọ ga “na-esiri ha ike ha na mmadụ ịdị n’ezigbo mma; ha ga na-eleda ndị inyom anya; nke a nwekwara ike ime ka ikiri ma ọ bụ ịgụ ihe na-akpali agụụ mmekọahụ rie ha ahụ́, bụ́ nke ga-eme ka ha ghara ịna-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, ka ha ghara inwe ndị enyi ma ọ bụkwanụ mee ka ha na ndị ezinụlọ ha ghara ịdị ná mma.” Nsogbu nke a ga-eweta n’ezinụlọ onye ahụ ma o too lụọ di ma ọ bụ nwunye enweghị atụ.

11. Nye ihe atụ nke na-egosi ụdị nsogbu na-esi n’ịgụ ma ọ bụ n’ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ apụta.

11 Otu nwanna nwoke kwuru ihe mere mgbe ọ natara eziokwu, sị: “Ihe ọjọọ kacha ihe ọjọọ niile riri m ahụ́ tupu m ghọọ Onyeàmà Jehova bụ ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ. M ka na-echeta foto ndị ahụ mgbe m nụrụ ísì ihe ụfọdụ, mgbe m nụrụ egwú ụfọdụ, mgbe m hụrụ ihe ụfọdụ ma ọ bụkwanụ mgbe echiche m gahiere ụzọ. Mụ na nke a na-alụ kwa ụbọchị.” Mgbe nwanna nke ọzọ bụ nwata, ọ na-ekiri akwụkwọ papa ya nke na-abụghị Onyeàmà ma ọ bụrụ na nne ya na nna ya anọghị ya. E sere ndị gba ọtọ n’akwụkwọ ndị ahụ. Nwanna ahụ dere, sị: “Foto ndị ahụ mebiri m. Echefubeghị ụfọdụ n’ime ha kemgbe iri afọ abụọ na ise. M mee elu mee ala, ha anaghị apụ m apụ n’isi. N’agbanyeghị na m na-ewepụ ha n’uche m ozugbo m chetara ha, m na-ama onwe m ikpe.” Anyị ga-eme ka obi anyị ghara ịma anyị ụdị ikpe a ma ọ bụrụ na anyị anaghị ele ihe na-abaghị uru anya. Olee otú anyị nwere ike isi mee nke a? Anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị merie “echiche ọ bụla iji mee ka ọ na-erubere Kraịst isi.”—2 Kọr. 10:5.

12, 13. Olee ihe ndị na-abaghị uru Ndị Kraịst kwesịrị izere, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

12 Ihe ọzọ “na-abaghị uru” anyị na-ekwesịghị itinye aka na ya bụ ntụrụndụ ọ bụla nke na-akwado ịchụ akụnụba ọnwụ ọnwụ, ma ọ bụ nke na-akwado anwansi, ime ihe ike, ịkwafu ọbara, ma ọ bụkwanụ igbu ọchụ. (Gụọ Abụ Ọma 101:3.) Ndị Kraịst mụrụ ụmụ ga-aza Jehova ajụjụ banyere ụdị ihe ha na-ahapụ ụmụ ha ka ha nọrọ n’ụlọ ha na-ekiri. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị ezigbo Onye Kraịst ga-akpachara anya na-etinye aka na mgbaasị. N’agbanyeghị nke a, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịma fim, ihe a na-eme na tiivi, egwuregwu vidio, ma ọ bụkwanụ akwụkwọ ụmụaka bụ́ ndị na-egosi anwansi.—Ilu 22:5.

13 Ma ànyị bụ ụmụaka ma ànyị bụ ndị okenye, anyị ekwesịghị igwu egwuregwu vidio nke a na-eme ihe ike na ya ma ọ bụkwanụ nke na-egosi ebe e ji obi ịta mmiri na-egbu ndị mmadụ. (Gụọ Abụ Ọma 11:5.) Anyị ekwesịghị ịna-atụgharị ihe ọ bụla Jehova kpọrọ asị n’obi. Cheta na Setan chọrọ ka anyị na-atụgharị ihe na-adịghị mma n’uche. (2 Kọr. 11:3) Ọ bụrụgodị na ihe anyị na-ekiri ziri ezi ma anyị ejiri oge dị ukwuu na-ekiri ya, o nwere ike ịna-egbochi anyị inwe ofufe ezinụlọ, ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị, ma ọ bụkwanụ ịkwadebe ọmụmụ ihe.—Fil. 1:9, 10.

Ṅomie Jizọs

14, 15. Olee ihe gbara ọkpụrụkpụ n’ọnwụnwa nke atọ Setan nwara Kraịst, oleekwa otú Jizọs si merie ya?

14 Ọ dị mwute ikwu na anyị aghaghị ịna-ahụ ihe ndị na-abaghị uru n’ụwa ọjọọ a. O nwere mgbe Setan mere ka Jizọs hụ ihe na-abaghị uru. N’ọnwụnwa nke atọ Ekwensu nwara Jizọs, bụ́ nke o ji gbaa mbọ ka Jizọs kwụsị ime uche Chineke, ọ “kpọọrọ ya gaa n’ugwu dị oké elu ma gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha.” (Mat. 4:8) Gịnị mere Setan ji mee nke a? O doro anya na ọ chọrọ iji ihe anya Jizọs na-ahụ nwata ya. O bu n’obi na Jizọs nwere ike chọwa ka ọ bụrụ onye a ma ama n’ụwa ma ọ bụrụ na ọ hụ alaeze niile nke ụwa na ebube ha. Gịnị ka Jizọs mere?

15 Jizọs agaghị chewere ọnwụnwa ahụ echiche. Ọnwụnwa ahụ emeghị ka ọ malite iche ihe na-ezighị ezi n’echiche. Ọ gaghịdị cheere ihe ahụ Ekwensu gwara ya echiche tupu ya ajụ ya. Ọ jụrụ ozugbo. Ọ sịrị: “Si ebe a pụọ, Setan!” (Mat. 4:10) Jizọs echefughị adịm ná mma ya na Jehova, ọ sakwara Setan okwu na-egosi na nzube ya bụ ime uche Chineke. (Hib. 10:7) Jizọs ji nke a tisaa atụmatụ aghụghọ Setan.

16. Olee ihe anyị ga-amụta n’otú Jizọs si merie ọnwụnwa Setan?

16 Anyị ga-amụta ọtụtụ ihe n’ọnwụnwa ndị ahụ Setan nwara Jizọs. Nke mbụ bụ na o nweghị onye n’ime anyị Setan na-enweghị ike ịnwa ọnwụnwa. (Mat. 24:24) Nke abụọ bụ na anyị nwere ike malite ịchọ ka anyị nweta ihe anya anyị na-ahụ, ma ihe ahụ ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. Nke atọ, Setan ga-eme ike ya niile ka o jiri “ọchịchọ nke anya” duhie anyị. (1 Pita 5:8) Nke anọ, anyị nwere ike iguzogide Setan, nke ka nke, ma ọ bụrụ na anyị emee ihe ozugbo ọ nwara anyị.—Jems 4:7; 1 Pita 2:21.

‘Na-elegide Anya Otu Ebe’

17. Gịnị mere na ọ dịghị mma ichere ruo mgbe ihe na-abaghị uru pụtara n’ihu anyị tupu anyị ekpebie ihe anyị ga-eme?

17 Mgbe anyị raara onwe anyị nye Jehova, anyị kwere ya nkwa na anyị ga na-ewepụ anya n’ihe na-abaghị uru. Mgbe ahụ anyị ṅụrụ iyi na anyị ga na-eme uche Chineke, anyị kwuru otu ihe ahụ otu ọbụ abụ kwuru mgbe ọ sịrị: “Egbochiwo m ụkwụ m ịga n’ụzọ ọjọọ ọ bụla, ka m wee debe okwu gị.” (Ọma 119:101) Ọ baghị uru ichere ka ihe na-abaghị uru pụta n’ihu anyị tupu anyị ekpebie ihe anyị ga-eme. Akwụkwọ Nsọ agwala anyị ihe dị iche iche Chineke na-achọghị ka anyị na-eme. Anyị ma atụmatụ dị iche iche nke Setan. Olee mgbe Setan gwara Jizọs ka o mee ka nkume ghọọ achịcha? Ọ bụ mgbe o busịrị ọnụ ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị “agụụ” wee na-agụ. (Mat. 4:1-4) Setan na-ama mgbe anyị na-adịghị ike, bụ́ mgbe o nwere ike ịnwata anyị. N’ihi ya, ugbu a bụ oge anyị kwesịrị ichebara ihe ndị a echiche. Elegharala nke a anya! Ọ bụrụ na anyị ana-echeta kwa ụbọchị nkwa anyị kwere Jehova mgbe anyị raara onwe anyị nye ya, anyị ga-ekpebisi ike na o nweghị ihe ga-eme ka anyị lee ihe na-abaghị uru anya.—Ilu 1:5; 19:20.

18, 19. (a) Kwuo ihe dị iche n’anya “na-elegide otu ebe” na nke “dị njọ.” (b) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-echebara ihe bara uru echiche, oleekwa ndụmọdụ Filipaị 4:8 nyere anyị banyere nke a?

18 Kwa ụbọchị, anyị na-ahụ ọtụtụ ihe na-adọrọ mmasị, ha na-ehiwanyekwa nne. Ya mere, ime ihe ahụ Jizọs kwuru, ya bụ, ka anya anyị “na-elegide otu ebe,” dị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (Mat. 6:22, 23) Anya “na-elegide otu ebe” bu otu ihe n’obi, ya bụ, ime uche Chineke. Ma, anya “dị njọ” na-eme atụmatụ ọjọọ, ọ dị anyaukwu ma na-ele ihe ndị na-abaghị uru.

19 Cheta na ihe anya anyị hụrụ na-aga n’obi anyị ma mee ka anyị chọọ imewe ya emewe. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị na-echebara ihe bara uru echiche. (Gụọ Ndị Filipaị 4:8.) Ka anyị na-ekpe ekpere ka Chineke meere anyị ihe ọbụ abụ ahụ kpere n’ekpere mgbe ọ sịrị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru.” Ọ bụrụ na anyị na-agbalị ime ihe kwekọrọ n’ekpere ahụ, ka obi sie anyị ike na Jehova ga-echebe “ndụ [anyị] n’ụzọ nke [ya].”—Ọma 119:37; Hib. 10:36.

Gịnị Ka Anyị Kwesịrị Icheta Banyere  . . .

• ihe jikọrọ anya anyị na echiche anyị na obi anyị?

• ihe ize ndụ ndị dị n’ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ?

• ịdị mkpa nke mmadụ ilegide anya “otu ebe”?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Olee ihe ndị na-abaghị uru, bụ́ ndị Ndị Kraịst na-ekwesịghị ịna-ekiri?