Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụmụnna Ndị Ikom—Ghaanụ Mkpụrụ Maka Mmụọ Nsọ Ka Unu Wee Ruo Eru!

Ụmụnna Ndị Ikom—Ghaanụ Mkpụrụ Maka Mmụọ Nsọ Ka Unu Wee Ruo Eru!

Ụmụnna Ndị Ikom—Ghaanụ Mkpụrụ Maka Mmụọ Nsọ Ka Unu Wee Ruo Eru!

“Onye na-agha mkpụrụ maka mmụọ nsọ ga-aghọrọ ndụ ebighị ebi.”—GAL. 6:8.

1, 2. Olee otú Matiu 9:37, 38 si na-emezu, gịnị dịkwa ọgbakọ Jehova mkpa n’ihi nke a?

IHE ị na-agaghị echefu echefu na-eme n’ụwa ugbu a! A na-arụ ọrụ Jizọs Kraịst buru n’amụma ugbu a n’ụzọ na-enweghị atụ. Jizọs sịrị: “Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” (Mat. 9:37, 38) Jehova Chineke na-aza ekpere ahụ n’ụzọ na-enweghị atụ. N’afọ ije ozi 2009, e nwekwuru puku ọgbakọ abụọ na iri atọ na otu n’elu ndị nke dị adị, nke mere ka ọgbakọ Ndịàmà Jehova dịrị otu narị puku na ise, narị abụọ na iri itoolu na asatọ n’ụwa niile. E mere ihe dị ka narị mmadụ asaa na iri ise na asaa baptizim kwa ụbọchị!

2 N’ihi otú ọnụ ọgụgụ ọgbakọ si na-ehikwu nne, ụmụnna ndị ikom, bụ́ ndị ruru eru, ndị ga na-ebute ụzọ n’izi ihe na ịzụ atụrụ Chineke dị anyị mkpa. (Efe. 4:11) Kemgbe ọtụtụ iri afọ, Jehova anọwo na-ahọpụta ndị ikom ruru eru ka ha na-elekọta atụrụ ya, obi sikwara anyị ike na ọ gaghị akwụsị ime otú ahụ. Amụma dị na Maịka 5:5 na-eme ka obi sie anyị ike na ndị Jehova ga-enwe “ndị ọzụzụ atụrụ asaa” na “ndị isi asatọ” n’oge ọgwụgwụ a. Nke a na-egosi na a ga-enwe ọtụtụ ndị aka kara aka ga na-elekọta ndị Chineke.

3. Kọwaa ihe ‘ịgha mkpụrụ maka mmụọ nsọ’ pụtara.

3 Ọ bụrụ na ị bụ nwoke e mere baptizim, gịnị ga-enyere gị aka iru eru inwe ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ? Ihe ga-akacha enyere gị aka bụ ‘ịgha mkpụrụ maka mmụọ nsọ.’ (Gal. 6:8) Nke a pụtara na ị ga-ekwe ka mmụọ nsọ na-eduzi gị. Kpebisie ike na ị gaghị “na-agha mkpụrụ maka anụ ahụ́.” Ekwela ka ihe ndị dị ka ịtụsara ahụ́, ihe ụtọ, nakwa ntụrụndụ mee ka ị ghara iji obi gị dum na-ejere Chineke ozi. Ndị Kraịst niile kwesịrị ‘ịna-agha mkpụrụ maka mmụọ nsọ,’ ka oge na-agakwa, ndị ikom ndị mere otú a ga-eru eru inwe ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ. Ihe dị n’isiokwu a gbasara ndị ikom nọ n’ọgbakọ karịchaa n’ihi na a chọsiri ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye ike n’ọgbakọ ugbu a. Ya mere, ndị ikom, anyị na-agba unu ume ka unu chebara ihe dị n’isiokwu a echiche.

Ruo Eru Iji Rụọ Ezi Ọrụ

4, 5. (a) Olee ihe ùgwù ije ozi a na-agba ndị ikom e mere baptizim ume ka ha ruo eru inweta n’ọgbakọ? (b) Olee otú mmadụ ga-esi ruo eru inweta ihe ùgwù ndị ahụ?

4 Mmadụ anaghị abụ okenye n’agbaghị mbọ ọ bụla. Ọ ghaghị iru eru iji rụọ “ezi ọrụ” a. (1 Tim. 3:1) Nke a gụnyere iji obi ọcha na-egbo mkpa ụmụnna ya. (Gụọ Aịzaya 32:1, 2.) Onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ okenye ka o wee nyere ụmụnna ya aka abụghị onye oké ọchịchọ. Kama inwe oké ọchịchọ, mkpa ya bụ inyere ụmụnna ya aka n’eriteghị uru n’aka ha.

5 Onye chọrọ ịbụ ohu na-eje ozi, bụ́ onye ga-emecha ghọọ okenye, aghaghị ịgba mbọ na-eme ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru na ndị chọrọ iru eru inwe ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ kwesịrị ime. (1 Tim. 3:1-10, 12, 13; Taị. 1:5-9) Ọ bụrụ na ị bụ nwoke nke raara onwe ya nye Chineke, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ọma, na-enyekwara ndị ọzọ aka ime otú a? M̀ na-eme ka okwukwe ndị ọzọ sie ike site n’ịchọ ọdịmma ha? È ji ịmụsi Okwu Chineke ike mara m? M̀ na-agba mbọ ka ajụjụ m na-aza n’ọmụmụ ihe na-eriju afọ? M̀ na-arụ ọrụ ndị okenye nyere m nke ọma?’ (2 Tim. 4:5) Anyị kwesịrị ichebara ajụjụ ndị a echiche.

6. Olee ihe bụ́ isi ga-enyere mmadụ aka ka o wee ruo eru inweta ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ?

6 Ihe ọzọ ga-eme ka mmadụ ruo eru inweta ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ bụ onye ahụ ‘iji ike sitere na mmụọ Chineke mee ka ọ dị ike ná mmadụ ọ bụ n’ime.’ (Efe. 3:16) Ọ bụghị ntụli aka elu ka e ji ahọpụta ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye n’ọgbakọ. Naanị mgbe a na-ahọpụta mmadụ bụ mgbe ya na Chineke malitere ịdị n’ezigbo mma. Olee ihe mmadụ ga-eme ka ya na Chineke wee malite ịdị ná mma? Otu n’ime ụzọ ị ga-esi mee nke a bụ ‘ịnọgide na-eje ije site na mmụọ nsọ’ ma na-akpa àgwà na-egosi na i nwere mkpụrụ ya. (Gal. 5:16, 22, 23) Ọ bụrụ na ị na-akpa àgwà na-egosi na ọ bụrụ na e nyekwuo gị ihe ùgwù ije ozi na ị ga-emeli ihe dị na ya, gị ana-egekwa ntị ná ndụmọdụ dị iche iche a na-enye gị ka i wee nwee ọganihu, ‘ọganihu gị ga-apụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.’—1 Tim. 4:15.

Mmadụ Iwepụta Onwe Ya Dị Mkpa

7. Gịnị ka ijere ndị ọzọ ozi pụtara?

7 Tupu anyị enwee ike ijere ndị ọzọ ozi, anyị aghaghị ịna-arụsi ọrụ ike ma na-ewepụta onwe anyị. Nsogbu ọ bụla atụrụ Chineke nwere na-echu ndị okenye ụra n’ihi na ọ bụ ha na-azụ ha. Tụlee otú ịzụ atụrụ Chineke si dị Pọl onyeozi n’obi. Ọ gwara ụmụnna ya nọ na Kọrịnt, sị: “Site n’oké mkpagbu na ihe na-ewute m n’obi ka m ji ọtụtụ anya mmiri detara unu akwụkwọ, ọ bụghị ka o wee wute unu, kama ka unu wee mara ịhụnanya nke m nwere karịsịa n’ebe unu nọ.” (2 Kọr. 2:4) O doro anya na Pọl ji obi ya niile na-azụ atụrụ Chineke.

8, 9. Kọọ akụkọ ụfọdụ dị na Baịbụl ndị na-egosi otú ndị ikom si nyere ndị ọzọ aka.

8 Ihe e ji mara ndị chọrọ ijere ndị ohu Jehova ozi kemgbe ụwa bụ na ha na-eji obi ha dum ewepụta onwe ha. Dị ka ihe atụ, ọ dịghị mgbe Noa gwara ndị ezinụlọ ya, sị: ‘Gwanụ m mgbe unu wuchara ụgbọ ahụ ka m wee soro unu banye na ya.’ Mozis agwaghị ndị Izrel mgbe ha nọ n’Ijipt, sị: ‘M ga-ejekwute unu n’Oké Osimiri Uhie. Unu gawa otú ọ bụla masịrị unu.’ Jọshụa asịghị: ‘Unu bịa gwa m mgbe ọ bụla mgbidi Jeriko dara.’ Aịzaya atụghị onye ọzọ aka wee sị: ‘Lee ya ebe ahụ! Ziga ya.’—Aịza. 6:8.

9 Onye mbụ kacha mee ihe kwekọrọ na mmụọ Chineke n’ụzọ na-enweghị atụ bụ Jizọs Kraịst. O ji obi ya niile kwere ịbịa gbapụta ụmụ mmadụ. (Jọn 3:16) Otú Jizọs si hụ ndị mmadụ n’anya n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ya ó kwesịghị ime ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya? Otu nwanna bụ́ okenye kemgbe ọtụtụ afọ kwuru otú obi ya dị n’ebe atụrụ Chineke nọ, sị: “Ihe Jizọs gwara Pita, ya bụ, na-azụ ụmụ atụrụ m, na-emetụ m n’obi nke ukwuu. Kemgbe ọtụtụ afọ, amụtala m otú mkpụrụ okwu ole na ole mmadụ ji ịhụnanya kwuo ma ọ bụ ntakịrị obiọma nwere ike isi gbaa onye ọzọ ume. Ilekọta ụmụnna m na-enye m nnukwu obi ụtọ.”—Jọn 21:16.

10. Gịnị nwere ike ime ka ndị ikom bụ́ Ndị Kraịst ṅomie otú Jizọs si jeere ndị ọzọ ozi?

10 Ndị ikom raara onwe ha nye Chineke, bụ́ ndị na-elekọta atụrụ Chineke, kwesịrị ịna-eme ka Jizọs, bụ́ onye sịrị: “M ga-emekwa ka unu nweta ume.” (Mat. 11:28) Okwukwe nke ndị ikom bụ́ Ndị Kraịst nwere n’ebe Chineke nọ nakwa ịhụnanya ha nwere n’ebe ụmụnna ha nọ na-eme ka agụụ ịrụ ezi ọrụ a na-agụ ha. Ha anaghị eche na ha agaghị arụli ya n’ihi na ọ tara akpụ. Gịnị ka mmadụ ga-eme ma ọ bụrụ na o nwechaghị mmasị ịgbalị iru eru ịrụ ezi ọrụ a? Ò  nwere ihe nwanna nwoke nwere ike ime ka o wee nwewe mmasị ijere ọgbakọ ozi?

Nwee Mmasị Ijere Ndị Ọzọ Ozi

11. Olee otú mmadụ ga-esi malite inwe mmasị ijere ndị ọzọ ozi?

11 Ọ bụrụ na agụụ iru eru ka i wee malite ije ozi n’ọgbakọ anaghị agụ gị n’ihi na i chere na o nweghị ihe ga-eme ka i ruo eru, kpee ekpere ka Chineke nye gị mmụọ nsọ. (Luk 11:13) Mmụọ Jehova ga-enyere gị aka imeri ihe ọ bụla na-egbochi gị. Ọ bụ Chineke na-eme ka anyị nwee ọchịchọ ijere ndị ọzọ ozi n’ihi na ọ bụ mmụọ ya na-eme ka nwanna nwoke chọọ ije ozi, nyekwa ya ike ọ ga-eji na-eje ya. (Fil. 2:13; 4:13) Ya mere, ọ ga-adị mma ma ị rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị malite inwe mmasị ịnata ihe ùgwù ije ozi.—Gụọ Abụ Ọma 25:4, 5.

12. Olee otú mmadụ nwere ike isi nweta amamihe ga-enyere ya aka ịrụ ọrụ e nyere ya n’ọgbakọ?

12 Onye Kraịst nwere ike ghara ịna-eme ihe ga-eme ka o ruo eru n’ihi na o chere na ijere atụrụ Jehova ozi ga-esiri ya ike maka na ọ tara ezigbo akpụ. O nwekwara ike chee na o nweghị ihe ya ma nke ya ga-eji na-ejere ụmụnna ya ozi. Ọ bụrụ na ọ bụ nke a na-egbochi ya, ọ ga-enwe ike inwetakwu amamihe site n’itinyekwu uchu n’ịmụ Baịbụl nakwa akwụkwọ dị iche iche e ji amụ Baịbụl. O nwere ike ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ na-ewepụta oge na-amụ Baịbụl? M̀ na-ekpe ekpere ka Chineke nye m amamihe?’ Jems onye na-eso ụzọ Jizọs dere, sị: “Ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ, ka ọ na-arịọ Chineke, n’ihi na ọ na-eji mmesapụ aka enye mmadụ niile ihe, n’akọchaghịkwa ha; ọ ga-enye onye ahụ amamihe.” (Jems 1:5) Ì kwere na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu? Chineke zara ekpere Sọlọmọn kpekuru ya wee nye ya “obi nwere amamihe na nke na-aghọta ihe,” bụ́ nke nyeere ya aka ịmata ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi mgbe ọ na-ekpe ikpe. (1 Eze 3:7-14) N’eziokwu, nke Sọlọmọn dị iche. Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke ga-enye ndị na-elekọta ọgbakọ ya amamihe ha ga-eji na-elekọta atụrụ ya nke ọma.—Ilu 2:6.

13, 14. (a) Kwuo otú “ịhụnanya nke Kraịst nwere” si nyere Pọl aka. (b) Olee otú “ịhụnanya nke Kraịst nwere” kwesịrị isi nyere anyị aka?

13 Ihe ọzọ ga-eme ka anyị malite inwe mmasị ijere ndị ọzọ ozi bụ icheta ihe niile Jehova na Ọkpara ya meere anyị. Dị ka ihe atụ, tụlee 2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15. (Gụọ.) Olee otú o si bụrụ na ‘ịhụnanya nke Kraịst nwere na-akpali anyị’? Otú Kraịst si gosi na ya hụrụ anyị n’anya mgbe ọ tọgbọrọ ndụ ya n’ihi anyị, bụ́ nke kwekọrọ n’uche Chineke, enweghị atụ nke na ọ na-emetụ anyị n’obi, anyị ana-enwekwu obi ụtọ maka ya. Pọl kwere ka ịhụnanya Kraịst duzie ya n’ihe ọ na-eme. Nke a mere ka ọ ghara ịna-eme ihe ga-abara naanị onwe ya uru, o nyekwaara ya aka mee ka ihe niile ọ na-eme hiwe isi n’ijere Chineke na ụmụ mmadụ ozi, ma ụmụ mmadụ ndị nọ n’ọgbakọ ma ndị na-anọghị.

14 Ịtụgharị uche n’ịhụnanya Kraịst nwere n’ebe ndị mmadụ nọ ga-eme ka obi dịkwuo anyị ụtọ maka ihe ọ na-emere anyị. Nke a mere ka anyị mara na o nweghị uru anyị ga-erite ‘n’ịgha mkpụrụ maka anụ ahụ́’ site n’ịchụso ihe ga-abara naanị onwe anyị uru nakwa ịchụso naanị ihe ụtọ. Kama ihe ndị a, anyị kwesịrị ịgbanwe ihe ndị anyị na-eme ná ndụ iji mee ka ọrụ Chineke nyere anyị bụrụ ihe mbụ ná ndụ anyị. Anyị kwesịrị ‘ịna-agbara ụmụnna anyị ohu’ n’ihi na anyị hụrụ ha n’anya. (Gụọ Ndị Galeshia 5:13.) Ọ bụrụ na anyị na-ewere onwe anyị ka ndị ohu ji obi umeala na-ejere ndị raara onwe ha nye Jehova ozi, anyị ga na-akwanyere ha ùgwù, na-asọpụrụkwa ha. N’eziokwu, anyị ekwesịghị ịna-akọcha ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ na-akatọ ha, bụ́ ihe Setan na-eme ka ndị mmadụ na-eme.—Mkpu. 12:10.

Ọrụ Ndị Ezinụlọ Ga-arụkọ Ọnụ

15, 16. Olee ihe ndị ezinụlọ mmadụ kwesịrị ịna-eme ka o wee ruo eru ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye?

15 Ọ bụrụ na nwanna nwoke lụrụ nwaanyị, mụọkwa ụmụ, otú ezinụlọ ya dị ga-ekpebi ma ò ruru eru ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye. Nke bụ́ eziokwu bụ na otú ndị ezinụlọ ya si ele ofufe Jehova anya nakwa aha ha meere onwe ha ga-ekpebi ma à ga-ahọpụta ya ma ọ bụ na a gaghị ahọpụta ya. Nke a na-egosi na ọ dị mkpa ka nwunye mmadụ na ụmụ ya na-akwado ya ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye.—Gụọ 1 Timoti 3:4, 5, 12.

16 Obi na-adị Jehova mma ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ Onye Kraịst na-akwado ibe ha. (Efe. 3:14, 15) Onyeisi ezinụlọ kwesịrị ịhazi ihe ọ na-eme ahazi ka o wee nwee ike na-arụ ọrụ ya n’ọgbakọ ma na-elekọta ezinụlọ ya “nke ọma.” Ọ bụ nke a mere o ji dị mkpa ka okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi na nwunye ya na ụmụ ya na-amụ Baịbụl ka ha niile wee na-erite uru n’Ofufe Ezinụlọ kwa izu. Ya na ha kwesịrị ịna-agachi ozi ọma anya. Ọ dịkwa mkpa ka ndị ezinụlọ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi na-akwado mgbalị dị iche iche ọ na-eme.

Ị̀ Ga-abụghachi Okenye Ma Ọ Bụ Ohu Na-eje Ozi?

17, 18. (a) Gịnị ka nwanna nwoke nwere ike ime ma ọ bụrụ na o rukwaghị eru ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi? (b) Olee otú obi kwesịrị ịdị nwanna bụbu okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi?

17 O nwere ike ịbụ na ọ dị mgbe ị bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, ma, ị bụghịzi ugbu a. Ị hụrụ Jehova n’anya, ihe banyere gịnwa na-emetụkwa ya n’obi. (1 Pita 5:6, 7) À gwara gị ebe ụfọdụ ị ga-arụ ọrụ ná ndụ gị? Nabata ihe a gwara gị, rịọkwa Chineke ka o nyere gị aka ime ya. Ka nke a ghara iwe gị iwe. Na-eme ihe i kwesịrị ime, na-enwekwa obi ụtọ. Otu nwanna nke bụ okenye ọtụtụ afọ ma e mechaa napụ ya ihe ùgwù ahụ kwuru, sị: “M kpebiri ịna-agụchi Baịbụl anya ma na-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma otú m si na-aga mgbe m bụ okenye, m mekwara ihe ndị a. M nọ na-enwe ndidi n’ihi na m chere na m ga-abụghachi okenye n’ime otu afọ ma ọ bụ abụọ, ma, e meghachiri m okenye mgbe ọ fọrọ nke nta ka o ruo afọ asaa. N’oge ahụ, ume a na-agba m ka m jisie ike, ka m nọgide na-eme ihe ga-enyere m aka iru eru ịbụghachi okenye, nyeere m aka nke ukwuu.”

18 Ọ bụrụ na ụdị ihe a nke mere nwanna a mere gị, adala mbà. Na-echeta otú Jehova si na-agọzi ozi gị na ezinụlọ gị. Na-eme ihe ga-eme ka okwukwe ezinụlọ gị sikwuo ike, na-eleta ndị ahụ́ na-adịghị, na-agbakwa ndị na-adịghị ike ume. Nke ka nke, jiri ihe ùgwù i nwere kpọrọ ihe, ya bụ, ito Chineke na ikwusa ozi ọma Onyeàmà Jehova kwesịrị ịna-ekwusa. *Ọma 145:1, 2; Aịza. 43:10-12.

Chebara Otú Ihe Si Dịrị Gị Echiche

19, 20. (a) Gịnị ka a na-agba ụmụnna niile bụ́ ndị ikom e mere baptizim ume ka ha mee? (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a?

19 Inwekwu ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi n’ọgbakọ dị anyị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ya mere, anyị na-agba ndị ikom niile e mere baptizim ume ka ha chebara otú ihe si dịrị ha ugbu a echiche ma jụọ onwe ha n’otu n’otu, sị, ‘Ọ bụrụ na abụghị m ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye, gịnị mere na abụghị m?’ Ka mmụọ Chineke nyere gị aka ikpebi ihe dị mma ị ga-eme banyere ihe a dị mkpa.

20 Ndị niile nọ n’ọgbakọ na-erite uru ma ụmụnna ha wepụta onwe ha na-ejere ha ozi. Anyị ga-enweta ọṅụ a na-enweta n’ijere ndị ọzọ ozi nakwa n’ịgha mkpụrụ maka mmụọ nsọ ma ọ bụrụ na anyị ji obiọma na-ejere ndị ọzọ ozi. Ma, dị ka isiokwu na-eso nke a na-egosi, anyị ekwesịghị ime ka mmụọ Chineke nwee mwute. Olee otú anyị ga-esi zere nke a?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Gịnị ka amụma dị na Maịka 5:5 na-emesi anyị obi ike banyere ya?

• Kwuo ihe mmadụ iwepụta onwe ya pụtara.

• Olee otú mmadụ ga-esi malite inwe mmasị ijere ndị ọzọ ozi?

• Olee ihe mere nkwado si n’aka ndị ezinụlọ mmadụ ji dị mkpa ka onye ahụ wee ruo eru ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Gịnị ka ị ga-eme ka i wee ruo eru ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi?