Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Emela Ka Mmụọ Nsọ Jehova Nwee Mwute

Emela Ka Mmụọ Nsọ Jehova Nwee Mwute

Emela Ka Mmụọ Nsọ Jehova Nwee Mwute

“Unu adịkwala na-eme ka mmụọ nsọ Chineke nwee mwute, bụ́ nke e ji kaa unu akara.”—EFE. 4:30.

1. Gịnị ka Jehova meerela ọtụtụ nde mmadụ, gịnịkwa ka ha kwesịrị ịna-eme?

JEHOVA emeerela ọtụtụ nde mmadụ ndị nọ ndụ n’ụwa a nke nsogbu jupụtara ihe pụrụ iche. O meela ka ọ dịrị ha mfe ịbịaru ya nso site n’aka Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, bụ́ Jizọs Kraịst. (Jọn 6:44) I so n’ọtụtụ nde mmadụ ndị ahụ ma ọ bụrụ na ị rarala onwe gị nye Chineke ma na-ebi ndụ kwekọrọ na nke a. Ebe ọ bụ na e meela gị baptizim n’aha nke mmụọ nsọ, i kwesịrị ịna-eme ihe dị mmụọ nsọ mma.—Mat. 28:19.

2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

2 Anyị bụ́ ndị “na-agha mkpụrụ maka mmụọ nsọ” na-eyiri mmadụ ọhụrụ. (Gal. 6:8; Efe. 4:17-24) Ma, Pọl onyeozi nyere anyị ndụmọdụ, dọọkwa anyị aka ná ntị ka anyị ghara ime ka mmụọ nsọ nwee mwute. (Gụọ Ndị Efesọs 4:25-32.) Anyị ga-elebazi anya ugbu a na ndụmọdụ ahụ Pọl onyeozi nyere anyị. Gịnị ka Pọl bu n’obi mgbe ọ sịrị ka anyị ghara ime ka mmụọ nsọ nwee mwute? Olee otú onye raara onwe ya nye Jehova nwere ike isi mee ka mmụọ nsọ nwee mwute? Oleekwa otú anyị nwere ike isi zere ime ka mmụọ nsọ nwee mwute?

Ihe Ihe ahụ Pọl Kwuru Pụtara

3. Olee otú ị ga-esi kọwaa ihe ahụ dị ná Ndị Efesọs 4:30?

3 Buru ụzọ cheta ihe Pọl kwuru ná Ndị Efesọs 4:30. O dere, sị: “Unu adịkwala na-eme ka mmụọ nsọ Chineke nwee mwute, bụ́ nke e ji kaa unu akara maka ụbọchị a ga-eji ihe mgbapụta tọhapụ unu.” Pọl achọghị ka ụmụnna ya ọ hụrụ n’anya mee ihe ha na Chineke ga-eji kwụsị ịdị ná mma. Ọ bụ mmụọ nsọ ka ‘e ji kaa ha akara maka ụbọchị a ga-eji ihe mgbapụta tọhapụ ha.’ Mmụọ Chineke bụ akara, ma ọ bụ “ihe àmà nke ihe gaje” ịbịara ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. (2 Kọr. 1:22) Akara ahụ na-egosi na ọ bụ Chineke nwe ha nakwa na ha ga-aga eluigwe. Ndị a kara akara ahụ dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ.—Mkpu. 7:2-4.

4. Olee ihe o ji dị mkpa ka anyị ghara ime ihe ga-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute?

4 Ime ka mmụọ nsọ nwee mwute nwere ike ịbụ nke mbụ n’ime ihe ndị ọ ga-abụ Onye Kraịst mee mmụọ nsọ ahapụ ya kpamkpam. Ihe Devid kwuru mgbe ya na Bat-shiba mechara mmehie na-egosi na mmụọ Chineke nwere ike ịhapụ Onye Kraịst. Mgbe Devid chegharịrị, ọ rịọrọ Jehova, sị: “Achụpụla m n’ihu gị; biko, anapụkwala m mmụọ nsọ gị.” (Ọma 51:11) Ọ bụ naanị ndị “kwesịrị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ” n’ime ndị ahụ e tere mmanụ ga-enweta “okpueze,” nke bụ́ ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe. (Mkpu. 2:10; 1 Kọr. 15:53) Mmụọ nsọ dịkwa Ndị Kraịst ndị nwere olileanya ibi n’ụwa mkpa ka ha wee nwee ike irubere Chineke isi wee nweta onyinye ya, bụ́ ndụ ebighị ebi, nke ndị nwere okwukwe n’àjà mgbapụta e ji Kraịst chụọ ga-enweta. (Jọn 3:36; Rom 5:8; 6:23) Ya mere, anyị niile ga-akpachara anya ka anyị wee ghara ime ihe ga-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute.

Olee Otú Onye Kraịst Nwere Ike Isi Mee Ka Mmụọ Nsọ Nwee Mwute?

5, 6. Olee otú Onye Kraịst nwere ike isi mee ka mmụọ nsọ nwee mwute?

5 Anyị bụ́ ndị Kraịst raara onwe ha nye Chineke nwere ike izere ime ihe ga-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute. Anyị ga-emeli nke a ma ọ bụrụ na anyị ‘anọgide na-eje ije, na-adịkwa ndụ site na mmụọ nsọ,’ n’ihi na ọ bụ nke a ga-eme ka anyị ghara inwe ọchịchị anụ ahụ́ ndị na-adịghị mma, ma ọ bụkwanụ tinye aka n’àgwà na-adịghị mma. (Gal. 5:16, 25, 26) Ma, nke a nwere ike ịgbanwe. Anyị nwere ike ime ka mmụọ nsọ nwee mwute ma ọ bụrụ na anyị ejiri nke nta nke nta na-etinyetụ aka n’ihe Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee katọrọ.

6 Anyị na-eme ihe ga-eme ka mmụọ nsọ na Onye Nwe ya, bụ́ Jehova, nwee mwute ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme ihe na-adịghị mmụọ nsọ mma. Ndị Efesọs 4:25-32 ga-egosi anyị otú anyị kwesịrị isi na-akpa àgwà, ọ ga-enyekwara anyị aka izere ime ihe ga-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute.

Ihe Anyị Ga-eme Ka Mmụọ Nsọ Ghara Inwe Mwute

7, 8. Kwuo ihe mere na anyị aghaghị ịna-ekwu eziokwu.

7 Anyị Aghaghị Ịna-ekwu Eziokwu. Pọl dere ná Ndị Efesọs 4:25, sị: “Ebe unu hapụworo okwu ụgha, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu, n’ihi na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu ahụ́.” Ebe ọ bụ na “anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu ahụ́,” anyị ekwesịghị ịna-aghọ aghụghọ ma ọ bụkwanụ na-agwa ụmụnna anyị ihe anyị ma na ha abụghị eziokwu, n’ihi na nke ahụ pụtara ịghara ha ụgha. Onye na-eme ụdị ihe a na Chineke agaghị adị ná mma.—Gụọ Ilu 3:32.

8 Okwu aghụghọ na omume aghụghọ nwere ike ime ka ọgbakọ ghara ịdị n’otu. Ya mere, anyị kwesịrị ịdị ka Daniel onye amụma, bụ́ onye kwesịrị ntụkwasị obi, onye ndị ọzọ na-ahụghị ihe ọjọọ ọ bụla n’aka ya. (Dan. 6:4) Anyị kwesịkwara icheta ndụmọdụ Pọl nyere ndị nwere olileanya ịga eluigwe mgbe ọ sịrị na onye ọ bụla nke so ‘n’ahụ́ nke Kraịst’ bụ nke ahụ́ ahụ dum nakwa na ya na ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị e tere mmanụ na-ekwu eziokwu, kwesịrị ịdị n’otu. (Efe. 4:11, 12) Ọ bụrụ na anyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs, anyịnwa aghaghị ịna-ekwu eziokwu, nke a ga-emekwa ka anyị na ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile nọgide na-adị n’otu.

9. Olee ihe mere anyị ji kwesị ime ihe dị ná Ndị Efesọs 4:26, 27?

9 Anyị aghaghị iguzogide Ekwensu, ka o wee ghara imebi adịm ná mma anyị na Chineke. (Jems 4:7) Mmụọ nsọ na-enyere anyị aka iguzogide Setan. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike iguzogide ya ma ọ bụrụ na anyị anaghị ewebiga iwe ókè. Pọl dere, sị: “Weenụ iwe, ma unu emehiela; unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara, unu enyekwala Ekwensu ohere.” (Efe. 4:26, 27) Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere n’obi anyị ozugbo e mere anyị ihe were anyị iwe, anyị ‘ga-adị jụụ’ ma jite onwe anyị kama ime ihe ga-eme ka mmụọ Chineke nwee mwute. (Ilu 17:27) Ya mere, ka anyị ghara ịnọgide na-ewe iwe mgbe a kpasuru anyị iwe ka anyị wee ghara inye Setan ohere ọ ga-eji mee ka anyị mee ihe na-adịghị mma. (Ọma 37:8, 9) Otu n’ime ụzọ anyị ga-esi na-eguzogide ya bụ ime ihe ahụ Jizọs nyere anyị ndụmọdụ ka anyị na-eme, ya bụ, anyị na mmadụ ikpezi ozugbo anyị na ya sere okwu.—Mat. 5:23, 24; 18:15-17.

10, 11. Gịnị mere na anyị ekwesịghị izu ohi ma ọ bụ ime ihe n’akwụwaghị aka ọtọ?

10 Anyị ekwesịghị ikwe ka a nwata anyị ka anyị zuo ohi ma ọ bụ mee ihe n’akwụwaghị aka ọtọ. Pọl dere banyere izu ohi, sị: “Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi, kama ka ọ rụsie ọrụ ike, jiri aka ya na-arụ ọrụ ọma, ka o wee nwee ihe ọ ga-ekenye onye nọ ná mkpa.” (Efe. 4:28) Ọ bụrụ na Onye Kraịst nke raara onwe ya nye Chineke ezuo ohi, ọ pụtara na o ‘metọọla aha Chineke’ n’ihi na o mere ihe ndị mmadụ ga-eji kọchawa aha Chineke. (Ilu 30:7-9) Ọ bụrụgodị na mmadụ dara ogbenye, o kwesịghị ịga zuo ohi. Ndị hụrụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya ma na ha ekwesịghị izu ohi, ihe ọ sọkwara ya mee.—Mak 12:28-31.

11 Pọl ekwughị naanị ihe anyị na-ekwesịghị ime; o kwukwara ihe anyị kwesịrị ime. Ọ bụrụ na anyị na-adị ndụ site na mmụọ nsọ, na-ejekwa ije na ya, anyị ga na-arụsi nnọọ ọrụ ike ka anyị wee na-elekọta ezinụlọ anyị ma ‘nwee ihe anyị ga-ekenye onye nọ ná mkpa.’ (1 Tim. 5:8) Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nwere ebe ha na-etinye ego ha ji enyere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha aka, ma, onye ahụ raara ya nye, bụ́ Judas Iskarịọt, na-ezuru ụfọdụ n’ime ego ahụ. (Jọn 12:4-6) O doro anya na ọ bụghị mmụọ nsọ na-edu ya. Anyị bụ́ ndị mmụọ Chineke na-edu “na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile,” dị ka Pọl mere. (Hib. 13:18) Nke a na-eme ka anyị ghara ime ihe ga-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute.

Ihe Ndị Ọzọ Anyị Kwesịrị Ịna-eme Ka Mmụọ Nsọ Ghara Inwe Mwute

12, 13. (a) Dị ka Ndị Efesọs 4:29 kwuru, olee ụdị okwu anyị na-ekwesịghị ịna-ekwu? (b) Olee ụdị ihe anyị kwesịrị ịna-ekwu?

12 Ọ bụghị ihe niile batara anyị n’ọnụ ka anyị ga na-ekwu. Pọl sịrị: “Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta, kama nke ahụ, ka ọ bụrụ okwu dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee mee ka ndị na-anụ ya nweta ihe dị mma.” (Efe. 4:29) Na nke a kwa, Pọl agwaghị anyị naanị ihe anyị na-ekwesịghị ime; ọ gwakwara anyị ihe anyị kwesịrị ịna-eme. Ọ bụrụ na mmụọ Chineke na-edu anyị, anyị ga ‘na-ekwu okwu dị mma maka iwuli elu ka o wee mee ka ndị na-anụ ya nweta ihe dị mma.’ Ihe ọzọkwa bụ na anyị ekwesịghị ikwe ka “okwu rere ure” si n’ọnụ anyị pụta. E ji okwu Grik e si sụgharịta “rere ure” akọwa mkpụrụ osisi, azụ̀, ma ọ bụ anụ rere ure. Anyị kwesịrị ịna-asọ okwu ọ bụla Jehova sị na ọ dịghị mma oyi otú ahụ anyị si asọ mkpụrụ osisi, azụ̀, ma ọ bụ anụ rere ure.

13 Anyị kwesịrị ịna-ekwu okwu na-egosi na anyị nwere obiọma, bụ́ okwu “e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ,” nke dị mma ná ntị. (Kọl. 3:8-10; 4:6) Ndị mmadụ kwesịrị ịhụ na anyị dị iche ná ndị ọzọ ma ha gee ntị n’ihe anyị na-ekwu. Ya mere, ka anyị na-enyere ndị ọzọ aka site n’ikwu ihe “dị mma maka iwuli elu.” Ka anyị kpebie ịdị ka ọbụ abụ bụ́ Devid, bụ́ onye bụrụ abụ, sị: “Ka ihe ọnụ m na-ekwu na ihe m na-atụgharị n’uche bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, Jehova, Oké Nkume m na Onye Mgbapụta m.”—Ọma 19:14.

14. Gịnị ka Ndị Efesọs 4:30, 31 kwuru na anyị aghaghị iwepụ n’etiti anyị?

14 Anyị aghaghị iwepụ obi ilu, iwe, okwu mkparị na ihe ọjọọ niile n’obi anyị. Mgbe Pọl dọchara anyị aka ná ntị ka anyị ghara ime ihe ga-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute, o dere, sị: “Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu.” (Efe. 4:30, 31) Anyị niile kwesịrị ịna-arụsi ọrụ ike iji kpachara anya banyere ihe ndị anyị na-eche na ihe ndị anyị na-eme n’ihi na anyị ezughị okè. Anyị nwere ike ime ka mmụọ nsọ nwee mwute ma ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike ịchịkwa “obi ilu niile na iwe na ọnụma.” Anyị nwekwara ike ịna-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute ma ọ bụrụ na anyị na-agụkọ ihe ndị ọzọ mere anyị, na-eburu ha iwe n’obi, wee jụ na anyị na ha emekataghị kpezie. Ọ bụrụ na anyị amalite ileghara ndụmọdụ dị na Baịbụl anya, anyị nwere ike imewe ihe ga-eme ka anyị mehie megide mmụọ nsọ, bụ́ nke ga-ewetara anyị nsogbu jọgburu onwe ya.

15. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na mmadụ emee anyị ihe ọjọọ?

15 Anyị kwesịrị inwe obiọma, obi ọmịiko, na-agbagharakwa ndị ọzọ. Pọl dere, sị: “Nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko, na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam dị nnọọ ka Chineke sikwa n’aka Kraịst gbaghara unu kpamkpam.” (Efe. 4:32) Ọ bụrụgodị na ihe mmadụ mere anyị na-ewutebiga anyị ókè, anyị kwesịrị ịgbaghara onye ahụ otú Chineke si agbaghara anyị. (Luk 11:4) Ka e were ya na o nwere nwanna kwuru ihe na-adịghị mma banyere anyị. Anyị agakwuru ya ka anyị na ya kpezie. Ya ekwuo na ya ekwuteghị ihe ahụ ya kwuru wee rịọ anyị mgbaghara. O nwere ihe ọzọ anyị ga-eme ma e wezụga ịgbaghara ya. Levitikọs 19:18 kwuru, sị: “Abọla ọbọ, eburula ụmụ ndị gị iwe n’obi; hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị. Abụ m Jehova.”

Anyị Kwesịrị Ịna-elezi Anya

16. Nye ihe atụ nke na-egosi na anyị kwesịrị ịgbanwe àgwà anyị ka anyị wee ghara ime ihe ga-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute.

16 Anyị nwere ike ịchọ ime ihe na-adịghị mma ma ọ bụrụ na mmadụ anọghị ya. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na otu nwanna na-ege egwú na-adịghị mma kemgbe. Ka oge na-aga, akọnuche ya malitere ịma ya ikpe n’ihi na o legharala ndụmọdụ Baịbụl nyere anyị anya, bụ́ nke dị n’akwụkwọ dị iche iche “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” bipụtarala. (Mat. 24:45) O nwere ike icheta ihe Pọl kwuru ná Ndị Efesọs 4:30 wee kpee ekpere ka Chineke gbaghara ya. Ya ekpebie na ya agaghị eme ihe ga-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute, kpebiekwa na malite ugbu a gawa, ya agaghịzi na-ege egwú ọ bụla na-adịghị mma. Jehova ga-agọzi mkpebi a nwanna nwoke a mere. Ya mere, ka anyị kpachara anya mgbe niile ka anyị ghara ime ihe ga-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute.

17. Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị anaghị elezi anya ma na-ekpe ekpere mgbe niile?

17 Ọ bụrụ na anyị anaghị elezi anya ma ọ bụkwanụ na-ekpe ekpere mgbe niile, anyị nwere ike ịmalite ime ihe na-adịghị mma nke nwere ike ime ka mmụọ nsọ nwee mwute. Ebe ọ bụ na mmụọ nsọ na-eme ka anyị na-akpa àgwà ndị yiri nke Nna anyị nke eluigwe, ọ bụrụ na anyị emee ihe ga-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute, anyị emeela ihe ga-eme ka Nna anyị nwee mwute, bụ́kwanụ ihe anyị na-agaghị achọ ime. (Efe. 4:30) Ndị Juu bụ́ ndị odeakwụkwọ, bụ́ ndị nọ ndụ mgbe Jizọs bịara n’ụwa, kwuru na ọ bụ Setan nyere Jizọs ike o ji na-arụ ọrụ ebube. (Gụọ Mak 3:22-30.) Ndị ahụ, bụ́ ndị kpọrọ Jizọs asị, ‘kwuluru mmụọ nsọ’ wee mee mmehie na-enweghị mgbaghara. Ka anyị ghara ịdị ka ha!

18. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịmata na anyị emebeghị mmehie nke na-enweghị mgbaghara?

18 Ebe ọ bụ na anyị agaghị achọ itinyetụ aka n’ihe ọ bụla ga-eme ka anyị mee mmehie nke na-enweghị mgbaghara, anyị kwesịrị ịna-echeta ihe Pọl kwuru banyere ime ihe ga-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị emeela mmehie dị oké njọ? Anyị nwere ike ikwu na Chineke agbagharala anyị nakwa na anyị emehieghị megide mmụọ nsọ ma ọ bụrụ na anyị echegharịala, ndị okenye enyekwara anyị aka. Chineke ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ime ihe ọ bụla ọzọ ga-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute.

19, 20. (a) Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị anyị kwesịrị izere? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebi na anyị ga na-eme?

19 Chineke ji mmụọ ya na-eme ka ndị ya nwekwuo ịhụnanya, ọṅụ na ịdị n’otu. (Ọma 133:1-3) Ya mere, anyị ekwesịghị ime ihe ga-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute, ihe dị ka ịgba asịrị iji mebie aha ndị ọzọ ma ọ bụ ikwu okwu iji kparịa ndị okenye, bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ họpụta. (Ọrụ 20:28; Jud 8) Kama ime ihe ndị a, anyị kwesịrị ịna-akwanyere ụmụnna anyị ùgwù ma na-eme ihe ga-eme ka anyị na ha dị n’otu. N’eziokwu, anyị ekwesịghị inwe ndị òtù, bụ́ ndị ọ bụ naanị ha ka anyị na ha ga na-akpa n’ọgbakọ. Pọl dere, sị: “M na-agba unu ume, ụmụnna m, site n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ka unu niile na-ekwu otu ihe, ka nkewa gharakwa ịdị n’etiti unu, kama ka unu dị n’otu n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’otu obi na n’otu echiche.”—1 Kọr. 1:10.

20 Ọ na-enu Jehova enu n’obi inyere anyị aka ka anyị ghara ime ka mmụọ nsọ nwee mwute, ọ ga-emelikwa nke a. Ka anyị nọgide na-ekpe ekpere ka Jehova nye anyị mmụọ nsọ, ka anyị kpebisiekwa ike na anyị agaghị eme ihe ga-eme ka mmụọ ya nwee mwute. Ka anyị nọgide “na-agha mkpụrụ maka mmụọ nsọ,” wee na-achọ otú ọ ga-esi na-eduzi anyị malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Gịnị ka mmadụ ime ihe ga-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute pụtara?

• Olee otú onye raara onwe ya nye Jehova nwere ike isi mee ka mmụọ nsọ nwee mwute?

• Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka anyị wee ghara ime ihe ga-eme ka mmụọ nsọ nwee mwute?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 30]

Dozie esemokwu ozugbo

[Foto dị na peeji nke 31]

Olee mkpụrụ osisi nke yiri okwu ị na-ekwu?