Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Heran Obodo Na-ekwo Ekwo N’oge Ochie

Heran Obodo Na-ekwo Ekwo N’oge Ochie

Heran Obodo Na-ekwo Ekwo N’oge Ochie

IHE na-agbata ndị maara Akwụkwọ Nsọ n’obi ozugbo ha nụrụ Heran bụ nna ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ebreham. Mgbe ya na nwunye ya bụ́ Sera, na nna ya bụ́ Tira, na nwa nwanne ya, bụ́ Lọt, si Ọọ na-aga Kenan, ha kwụsịrị na Heran. Ebreham kpatara nnukwute akụ̀ ebe ahụ. Mgbe nna ya nwụrụ, Ebreham bulikwara ije gawa ala ahụ ezi Chineke kwere ya ná nkwa. (Jen. 11:31, 32; 12:4, 5; Ọrụ 7:2-4) Ebreham mechara ziga ohu ya nke kacha okenye ka ọ gaa Heran, ma ọ bụkwanụ obodo dị ya nso, lụtara Aịzik nwaanyị. Nwa nwa Ebreham, bụ́ Jekọb, bikwara ebe ahụ ọtụtụ afọ.—Jen. 24:1-4, 10; 27:42-45; 28:1, 2, 10.

Heran so n’otu n’ime “mba dị iche iche” Eze Senakerib nke Asiria meriri, bụ́ ndị o ji yie Eze Hezekaya nke Juda egwu. N’ebe a, “Heran” anaghị anọchi anya naanị otu obodo, kama, ọ na-anọchikwa anya obodo ndị gbara ya gburugburu. (2 Eze 19:11, 12) Amụma Ezikiel kwuru na Heran bụ otu n’ime obodo ndị bụ́ isi ha na Taya na-azụkọ ahịa, nke gosiri na Heran bụ obodo na-ekwo ekwo ebe e nwere nnukwu ahịa.—Ezik. 27:1, 2, 23.

Ugbu a, Heran bụ obere obodo nke dị nso na Shanlụafa, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Tọki. Ma, e nwere mgbe Heran bụ obodo na-ekwo ekwo n’oge ochie. Heran so n’obodo ole na ole n’ime obodo ndị e nwere n’oge ochie ndị ka na-aza aha a kpọrọ ha na Baịbụl. Aha ya n’asụsụ ndị Asiria, nke bụ́ Heranu, nwere ike ịpụta “Okporo Ụzọ” ma ọ bụ “Okporo Ụzọ Ndị Ahịa.” Nke a na-egosi na Heran dị n’akụkụ nnukwu ụzọ abụọ gara nnukwu obodo abụọ na-ekwo ekwo. Dị ka ihe e dere n’otu ihe e gwupụtara n’ala na Heran na-egosi, nne Eze Nabonaịdọs nke Babịlọn bụ onye nchụàjà n’ụlọ nsọ Sin, nke bụ́ chi ọnwa nke ndị Heran na-efe. E kwuru na Nabonaịdọs wughachiri ụlọ nsọ ahụ. Mgbe nke a gachara, e nwere ọtụtụ alaeze ukwu ndị malitere ma mechaa daa, ma Heran ka dị.

Taa, Heran dị nnọọ iche n’otú ọ dị mbụ. N’oge ochie, e nwere mgbe Heran bụ obodo dị mkpa nke mepere nnọọ emepe. Ma taa, Heran bụ obere obodo ebe e nwere ụlọ ole na ole ndị elu ha dị gburugburu. Obodo oge ochie ndị e bibiri ebibi gbakwara ya gburugburu. N’ụwa ọhụrụ nke Chineke ga-eweta, ọtụtụ ndị biburu na Heran, gụnyere Ebreham, Sera, na Lọt, ga-ebilite n’ọnwụ. Eleghị anya, ha ga-enwe ike ịkọtụkwuru anyị banyere Heran, bụ́ obodo na-ekwo ekwo n’oge ochie.

[Foto dị na peeji nke 20]

Otú Heran dị mgbe e bibiri ya

[Foto dị na peeji nke 20]

Ụlọ ndị elu ha dị gburugburu

[Foto dị na peeji nke 20]

Otú Heran dị taa ma a nọrọ n’ụgbọelu lee ya