Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nọgide Na-ejere Jehova Ozi Ka Ị Na-elekọta Onye Gị Ahụ́ Na-adịghị

Nọgide Na-ejere Jehova Ozi Ka Ị Na-elekọta Onye Gị Ahụ́ Na-adịghị

Nọgide Na-ejere Jehova Ozi Ka Ị Na-elekọta Onye Gị Ahụ́ Na-adịghị

MGBE a hụrụ ihe toro Kim, bụ́ Onyeàmà Jehova, n’akụkụ ọkpụkpụ azụ, a gwara ya na ọ na-arịa ọrịa kansa. * Di ya bụ́ Stiv kwuru, sị: “Ozugbo a wachara ya ihe ahụ toro ya, a malitere ịgwọ ya ọrịa kansa ahụ. Ọgwụ ndị e ji na-agwọ ya siri nnọọ ike nke na ha mere ka ike na-agwụ ya. Nke a mere na ọ naghịzi enwe ike ịgagharị agagharị.”

Cheedị otú obi ga-adị Stiv ịhụ ka nwunye ya ọ hụrụ n’anya na-arịa ọrịa na-eme ka ike na-agwụ ya. Ikekwe, e nwere onye ezinụlọ gị nke na-arịa ụdị ọrịa a, ma ọ bụkwanụ onye nke karala ezigbo nkà. (Ekli. 12:1-7) Ọ bụrụ na e nwere, cheta na ị ga na-elekọta onwe gị ka i wee nwee ike ilekọta onye ị hụrụ n’anya nke ọma. Ọ bụrụ na ị jụọ oyi n’ozi Chineke, nke a nwere ike ime ka obi ghara ịdị gị mma, meekwa ka ọrịa rịawa gị. I nwekwara ike ị gaghịzi elekọtali onye ezinụlọ gị ahụ. Olee otú i nwere ike isi hụ na o nweghị ihe mere adịm ná mma gị na Chineke mgbe ị na-elekọta onye gị na-ejighị ahụ́ ma ọ bụ onye nke merela agadi? Olee ihe ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nwere ike ime iji gosi na ha hụrụ ndị ahụ na-ejighị ahụ́ n’anya?

Olee Otú Ị Ga-esi Na-eme Ha Abụọ nke Ọma?

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na Chineke nọgide na-adị ná mma, ka ị gharakwa ịrịawa nke gị mgbe ị na-elekọta onye gị ahụ́ na-adịghị, i kwesịrị ịhazi oge gị nke ọma. Ilu 11:2 sịrị: “Ndị dị obi umeala nwere amamihe.” N’ebe a, “obi umeala” pụtara mmadụ ịma ebe ike ya ruru. Ka i wee ghara ime ihe karịrị ike gị, ọ ga-adị mma ma i lebara oge na ọrụ ndị ọzọ ị na-arụ anya.

Stiv gosiri na ya nwere amamihe nakwa na ya ma otú ike ya hà site n’ichebara ọrụ ndị ọ na-arụ echiche. E wezụga ọrụ o ji akpata ego, ọ bụkwa ya bụ onye na-ahaziri otú ndị okenye ọgbakọ ọ nọ na ya dị n’Aịland ọrụ, bụrụkwa onye nlekọta ije ozi. O sokwa na Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ n’ebe o bi. Stiv kwuru, sị: “O nweghị mgbe Kim mere mkpesa na m na-eleghara ya anya ma na-eji oge dị ukwuu na-arụ ọrụ a niile m na-arụ. Ma, ama m na m na-arụgbu onwe m n’ọrụ.” Olee ihe Stiv mere banyere nke a? Ọ sịrị: “Mgbe m kpechara ekpere banyere nke a, ekpebiri m ịkwụsị ịbụ onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ. M ka bụ okenye, ma mgbe m nyere ndị ọzọ ọrụ ụfọdụ m na-arụ n’ọgbakọ, m nweziri ike ilekọta Kim dị ka m kwesịrị.”

Ka oge na-aga, Kim gbaketụrụ. Stiv na Kim kwurịtara ọnọdụ ha. Kim kwadokwara di ya ka o wereghachi ọrụ ndị ahụ ọ na-arụ n’ọgbakọ. Stiv kwuru, sị: “Anyị abụọ mụtara na anyị ekwesịghị ime ihe karịrị ihe ọrịa nyere anyị ohere ime. Ana m ekele Jehova nke ukwuu maka otú o si nyere m aka, na-ekelekwa nwunye m maka na ọ naghị eme mkpesa n’agbanyeghị na ahụ́ adịghị ya.”

Tụleekwa ihe banyere Jeri, bụ́ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, na nwunye ya bụ́ Marịa. Ha hapụrụ ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ ha bu n’uche iru ka ha wee nwee ike ilekọta nne na nna ha merela agadi. Marịa kwuru, sị: “Ihe mgbaru ọsọ mụ na di m bu n’uche bụ ije ozi ala ọzọ. Ma, ọ bụ naanị Jeri ka nne na nna ya mụrụ, ha chọkwara onye ga-elekọta ha. N’ihi ya, anyị kpebiri ịnọwa n’Aịland ka anyị wee nwee ike ilekọta ha. Nke a mere ka anyị nwee ike ịnọ ya mgbe niile mgbe papa Jeri nọrọ n’ụlọ ọgwụ tupu ya anwụọ. Ugbu a, anyị na mama Jeri na-ekwurịta okwu kwa ụbọchị, anyị na-enyekwara ya aka ngwa ngwa ọ chọrọ enyemaka n’ihi na anyị nọ ya nso. Ndị nọ n’ọgbakọ nke mama Jeri nọ na ya na-enyere anyị nnọọ aka ilekọta ya, nke a emekwaala ka anyị nwee ike ịnọgide n’ọrụ njegharị.”

Otú Ndị Ọzọ Nwere Ike Isi Nye Aka

Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu okwu banyere ihe ndị e kwesịrị imere ụmụnna nwaanyị merela agadi di ha nwụrụ, ọ sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha, karịsịa, ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya, ọ jụwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” Pọl chetaara Ndị Kraịst ibe ya na ọ bụrụ na ha chọrọ ka ihe ha na-eme “dị mma n’anya Chineke,” ha kwesịrị iwepụta ego gbooro ndị mụrụ ha merela agadi mkpa ha. (1 Tim. 5:4, 8) Ma, ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nwekwara ike inye aka. N’ezie, ha kwesịrị ime nke a.

Tụlee ihe banyere Hakan na Inga, bụ́ di na nwunye merela agadi, ndị bi na Swidin. Hakan kwuru, sị: “Ahụ́ nwụrụ mụ na nwunye m mgbe a chọpụtara na ọ na-arịa ọrịa kansa. Ahụ́ gbasiburu Inga ike. Nke a meziri ka anyị na-echu ụlọ ọgwụ ka mmiri, ọgwụ ndị e ji agwọ ya na-enyekwa ya nsogbu dị egwu n’ahụ́. O nweghị ebe Inga na-agazi, nke a mere ka ọ dị mkpa na m ga na-anọnyere ya ka m wee na-elekọta ya.” Olee otú ndị ọgbakọ Hakan na Inga si nyere ha aka?

Ndị okenye ọgbakọ ha mere ndokwa ka ha si na telefon na-egere ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe. Ụmụnna na-abịakwa eleta ha, na-akpọkwa ha na fon. Ha na-edetakwara ha akwụkwọ ozi, na-ezitekwara ha kaadị. Hakan kwuru, sị: “Ụmụnna niile nakwa Jehova nyeere anyị nnọọ aka. Nke a mere ka anyị kwụsie ike n’ọgbakọ. Obi dị m ụtọ na Inga agbakeela, anyị na-agakwa ọmụmụ ihe ugbu a n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.” Mgbe ndị nọ n’ọgbakọ na-eme ike ha iji nyere ndị ọrịa na ndị merela agadi aka, ha na-egosi na ha bụ ‘ezi ndị enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, bụrụkwa ụmụnne a mụrụ maka oge nsogbu.’—Ilu 17:17.

Jehova Ji Mgbalị Unu Kpọrọ Ihe

Mmadụ ilekọta onye ya nke na-arịa ọrịa abụghị obere ọrụ. Ma, Eze Devid dere, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye ji nghọta na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe,” dị ka onye chọrọ enyemaka n’ihi na ahụ́ adịghị ya.—Ọma 41:1.

Olee ihe mere ndị na-elekọta ndị na-arịa ọrịa na ndị na-ata ahụhụ ga-eji na-enwe obi ụtọ? Ilu 19:17 kwuru, sị: “Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe, Ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe o mere.” Ezi Chineke anyị na-ahụ ahụhụ ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi na-arịa ọrịa na-ata, ọnọdụ ha na-emetụkwa ya n’ahụ́. Ọ na-agọzi ndị na-enyere ha aka. Ọbụ abụ bụ́ Devid bụrụ abụ, sị: “Jehova ga-enye [onye ahụ] ume mgbe ọ nọ n’ute ọrịa; ị ga-agbanwe ihe ndina ya dum n’oge ọ na-arịa ọrịa.” (Ọma 41:3) Ka obi sie anyị niile ike na ọ bụrụ na onye na-enyere ndị ihe na-esiri ike aka enwee nsogbu, Jehova ga-enyere ya aka.

Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ ịmara na Jehova Chineke na-ahụ mbọ anyị na-agba iji nyere ndị ezinụlọ anyị na-ejighị ahụ́ aka, ọ na-enyekwa ya ọṅụ. N’agbanyeghị na inyere ha aka adịghịrị anyị mfe, Akwụkwọ Nsọ na-eme ka obi sie anyị ike na “àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.”—Hib. 13:16.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Aha ndị a a kpọrọ ha abụghị ezigbo aha ha.

[Foto dị na peeji nke 18]

Ekwela ka ihe ọ bụla mee adịm ná mma gị na Chineke, nabata enyemaka si n’aka ndị ọzọ