Na-azụ Ikike Nghọta Gị
Na-azụ Ikike Nghọta Gị
Ọ NA-ATỌ anyị ụtọ ịhụ ka onye bụ́ aka ochie n’ime egwuregwu na-atụli onwe ya elu, tụgharịa ugboro ugboro ma wụtuo n’emerụghị ahụ́. Baịbụl na-agwa Ndị Kraịst ka ha zụọ ikike nghọta ha otú onye a si azụ onwe ya.
Pọl onyeozi degaara ndị Hibru akwụkwọ, sị: “Nri siri ike dịịrị ndị tozuru okè, ndị zụworo ikike nghọta ha azụ, site n’iji ya eme ihe, ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.” (Hib. 5:14) Olee ihe mere Pọl ji gbaa ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst ume ka ha na-azụ ikike nghọta ha otú onye a na-eme egwuregwu si azụ onwe ya? Olee otú anyị nwere ike isi zụọ ikike nghọta anyị?
‘Anyị Kwesịrị Ịbụ Ndị Ozizi’
Mgbe Pọl na-akọwa na Jizọs bụ “nnukwu onye nchụàjà dị ka Melkizedek,” o dere, sị: “Banyere onye a [ya bụ, Jizọs], anyị nwere ọtụtụ ihe ikwu, ndị sikwara ike ịkọwa, ebe unu ghọworo ndị ntị ike n’ịnụ ihe. N’ihi na, n’ezie, n’agbanyeghị na unu kwesịrị ịbụ ndị ozizi ka ọ dị ugbu a, ọ dị unu mkpa ọzọ ka mmadụ bido n’isi kụziwere unu ihe ndị mbụ e dere n’okwu dị nsọ nke Chineke; unu aghọwokwa ndị mmiri ara dị mkpa, ọ bụghị nri siri ike.”—Hib. 5:10-12.
O doro anya na a ka nwere ọtụtụ ihe ndị ka na-esiri ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst ike nghọta n’oge ahụ, ha enwebeghịkwa ọganihu ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, o siiri ha ike ikweta mgbanwe ndị e mere n’Iwu Mozis nakwa banyere ibi úgwù. (Ọrụ 15:1, 2, 27-29; Gal. 2:11-14; 6:12, 13) O siiri ụfọdụ ndị ike ịhapụ ụfọdụ omenala ndị a na-eme kwa izu n’Ụbọchị Izu Ike nakwa n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie kwa afọ. (Kọl. 2:16, 17; Hib. 9:1-14) Nke a mere ka Pọl gwa ha ka ha zụọ ikike nghọta ha ka ha wee nwee ike ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, gwakwa ha ka ha “jisie ike ruo ntozu okè.” (Hib. 6:1, 2) Ọ ga-abụ na ndụmọdụ ya mere ka ụfọdụ n’ime ha chebara otú ha si azụ ikike nghọta ha echiche. Ọ ga-abụkwa na o nyeere ha aka inwe ọganihu ime mmụọ. Oleekwanụ banyere anyị?
Na-azụ Ikike Nghọta Gị
Olee otú anyị nwere ike isi na-azụ ikike nghọta anyị ka anyị wee nwee ike iru ntozu okè? Pọl kwuru na ọ bụ “site n’iji ya eme ihe.” Dị ka ndị na-eme egwuregwu na-azụ ahụ́ ha site n’imega ahụ́ ka ha wee nwee ike ịtụli onwe ha elu ugboro ugboro n’adaghị ada, anyị kwesịrị ịna-azụ ikike nghọta anyị ka anyị wee nwee ike ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.
Otu prọfesọ n’ihe banyere isi mgbaka n’Ụlọ Akwụkwọ Nkà Mmụta Ọgwụ na Ahụ́ Ike na Havad, bụ́ Jọn Rati, kwuru, sị: “[Ịtụgharị uche] bụ ụzọ kacha mma ị ga-esi na-azụ ụbụrụ gị.” Dịkwa ka Jin Kohen, bụ́ onyeisi ná Ngalaba Na-amụ Banyere Ime Agadi, Ahụ́ Ike, na Ihe Banyere Ụmụ Mmadụ na Mahadum Jọj Wọshịntịn si kwuo, “ọ bụrụ na anyị ejiri ụbụrụ anyị na-echepụta ihe, mkpụrụ ndụ ndị dị n’ụbụrụ ga na-agbasi ike, nke a ga-emekwa ka ha na-arụkọ ọrụ nke ọma.”
N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-azụ ikike nghọta anyị ka anyị wee nwee ike ịmụtakwu Okwu Chineke. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú a, anyị ga-abụ ndị a kwadebere nke ọma ime ‘uche Chineke, nke zuru okè.’—Rom 12:1, 2.
Ka “Nri Siri Ike” Na-agụ Gị Agụụ
Ọ bụrụ na anyị chọrọ ‘iru ntozu okè,’ onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Àna m aghọtakwu eziokwu dị na Baịbụl? Ndị ọzọ hà na-ewere m ka onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe?’ Nwaanyị nke mụrụ nwa ọhụrụ na-enwe mmasị inye nwa ya mmiri ara ehi na nri ụmụaka. Ma, cheedị otú obi ga-adị ya ma ọ bụrụ na ọtụtụ afọ agafee ma nwa ya ahụ enweghị ike iri nri siri ike. N’otu aka ahụ, obi na-adị anyị ụtọ mgbe ndị anyị na-amụrụ Baịbụl nwere ọganihu ruo n’ịrara onwe ha nye Jehova, e meekwa ha baptizim. Oleekwanụ otú obi ga-adị anyị ma ọ bụrụ na ha akwụsị inwe ọganihu mgbe e mechara ha baptizim? Nke a ọ́ gaghị na-ewute anyị? (1 Kọr. 3:1-4) Onye nkụzi ahụ bu n’uche na ka oge na-aga, onye ahụ ghọrọ onye na-eso ụzọ Kraịst ọhụrụ ga-aghọkwa onye nkụzi.
Iji ikike nghọta anyị echebara ihe echiche pụtara ịtụgharị uche n’ihe. Nke a chọkwara ka anyị na-agba ezigbo mbọ. (Ọma 1:1-3) Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla, dị ka ile tiivi, ma ọ bụ ihe ntụrụndụ ndị ọzọ, bụ́ ndị na-anaghị enyere anyị aka ịzụ ikike nghọta anyị, gbochie anyị ịtụgharị uche nke ọma n’ihe ndị bara uru. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịzụ ikike nghọta anyị, anyị kwesịrị inwe ọchịchọ ịmụ Baịbụl na akwụkwọ ndị “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” bipụtara. (Mat. 24:45-47) E wezụga ịgụchi Baịbụl anya, anyị kwesịkwara iwepụta oge anyị ga-eji na-enwe Ofufe Ezinụlọ ma na-eme nchọnchọ banyere ihe ndị anyị na-amụ na Baịbụl.
Jeronimo, bụ́ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na Megziko, kwuru na ya na-amụ Ụlọ Nche ọ bụla ozugbo ya nwetara ya. Ọ na-ewepụtakwa oge ya na nwunye ya ga-eji na-amụ ihe. Jeronimo kwuru, sị, “Mụ na nwunye m na-agụkọ Baịbụl ọnụ kwa ụbọchị, anyị na-ejikwa akwụkwọ bụ́ ‘Ezi Ala ahụ’ eme nke a.” Nwanna nwoke aha ya bụ́ Ronald kwuru na ya na-agụ ebe anyị kwesịrị ịgụ kwa izu na Baịbụl. Ọ na-ewepụtakwa otu ihe ma ọ bụ ihe abụọ tara akpụ ọ ga-achọ ịmụ banyere ha. O kwuru sị: “Nke a na-eme ka m na-atụ anya oge m ji enwe ọmụmụ ihe onwe onye.”
Oleekwanụ banyere anyị? Ànyị na-ewepụta ezigbo oge anyị ga-eji na-amụ Okwu Chineke ma na-atụgharị uche na ya? Ànyị na-azụ ikike nghọta anyị ma na-enwekwu ike iji ihe Baịbụl kwuru na-eme mkpebi ndị tara akpụ? (Ilu 2:1-7) Ka anyị niile kpebisie ike na anyị ga-enwe ọganihu ime mmụọ ma bụrụ ndị maara ihe site n’ịzụ ikike nghọta anyị ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.
[Foto dị na peeji nke 23]
Anyị na-azụ ikike nghọta anyị “site n’iji ya eme ihe”