Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Inyom, Olee Ihe Mere Unu Ji Kwesị Ido Onwe Unu n’Okpuru Ndị Nọ n’Isi?

Ndị Inyom, Olee Ihe Mere Unu Ji Kwesị Ido Onwe Unu n’Okpuru Ndị Nọ n’Isi?

Ndị Inyom, Olee Ihe Mere Unu Ji Kwesị Ido Onwe Unu n’Okpuru Ndị Nọ n’Isi?

“Nwoke bụkwa isi nke nwaanyị.”—1 KỌR. 11:3.

1, 2. (a) Gịnị ka Pọl onyeozi dere banyere ndokwa Jehova mere maka ịbụisi na ido onwe onye n’okpuru ndị nọ n’isi? (b) Olee ajụjụ ndị a ga-atụle n’isiokwu a?

JEHOVA ahaziela otú ihe ga-esi na-aga n’usoro, bụ́ nke Pọl onyeozi kwuru okwu ya mgbe o dere na “Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla” nakwa na ‘Chineke bụ isi nke Kraịst.’ (1 Kọr. 11:3) N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị mụtara na ọ bụụrụ Jizọs ihe ùgwù na ihe na-enye ọṅụ ido onwe ya n’okpuru Isi ya, bụ́ Jehova Chineke. Anyị mụtakwara na Kraịst bụ isi ndị ikom bụ́ Ndị Kraịst. Kraịst nwere obiọma, dị nwayọọ, nwee ọmịiko, jirikwa obi ọcha na-emeso ndị ọzọ ihe. Ndị ikom nọ n’ọgbakọ kwesịrị ịna-emeso ndị ọzọ otú ahụ, karịchaa, ndị nwunye ha.

2 Oleekwanụ banyere onye bụ́ nwaanyị? Ònye bụ isi ya? Pọl dere, sị: “Nwoke bụkwa isi nke nwaanyị.” Olee otú ndị inyom kwesịrị isi na-ele ihe a e dere n’Akwụkwọ Nsọ anya? Hà ka ga-ekwere nke a ma ọ bụrụ na di ha bụ ndị na-ekweghị ekwe? Nwaanyị ido onwe ya n’okpuru di ya ọ̀ pụtara na ọ gaghị na-etinye ọnụ mgbe a na-eme mkpebi n’ụlọ? Olee otú nwaanyị si enwetara onwe ya otuto?

“M Gaje Imere Ya Onye Inyeaka”

3, 4. Olee ihe mere ndokwa e mere ka e nwee onye bụ́ isi n’etiti di na nwunye ji baa uru?

3 Ọ bụ Chineke mere ndokwa na a ga na-enwe ndị bụ́ isi. Mgbe e kere Adam, Jehova Chineke kwuru, sị: “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọgide naanị ya. M gaje imere ya onye inyeaka, ka ọ bụrụ onye ga-eme ka o zuo ezu.” Mgbe e kere Iv, obi tọgburu Adam atọgbu na ya enweela onye ya na ya ga na-anọ, bụ́ onye ga na-enyere ya aka. Ọ sịrị: “Ehee! Onye a bụ ọkpụkpụ nke si n’ọkpụkpụ m na anụ ahụ́ nke si n’anụ ahụ́ m.” (Jen. 2:18-24) Adam na Iv nwere olileanya magburu onwe ya nke ịbụ nna na nne nke ụmụ mmadụ ndị zuru okè, bụ́ ndị ga na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa nke bụ́ paradaịs.

4 Adam na Iv kwụsịrị izu okè mgbe ha nupụụrụ Chineke isi. (Gụọ Ndị Rom 5:12.) Ma, Chineke ka weere di ka isi nke nwunye ya. Ọ bụrụ na di abụrụ isi otú kwesịrị ekwesị, ọ ga-abara ya na nwunye ya uru nke ukwuu, meekwa ka ha na-enwe obi ụtọ. Ọ ga-adị ha otú ahụ ọ dị Jizọs, bụ́ onye na-edo onwe ya n’okpuru Isi ya, bụ́ Jehova. Tupu Jizọs abịa n’ụwa, “ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu [Jehova] mgbe niile.” (Ilu 8:30) N’ihi ezughị okè, ụmụ nwoke anaghịzi enwe ike abụ ndị isi otú kwesịrị ekwesị, ụmụ nwaanyị anaghịkwa edo onwe ha n’okpuru di ha otú kwesịrị ekwesị. Ma, mgbe di na nwunye gbasiri mbọ ike na-arụ ọrụ dịịrị ha, ndokwa a na-eme ka ha nwee obi ụtọ n’oge a.

5. Olee ihe mere di na nwunye ji kwesị ịna-eme ihe ahụ a dụrụ n’ọdụ ná Ndị Rom 12:10?

5 Ọ bụrụ na di na nwunye emee ihe Akwụkwọ Nso gwara Ndị Kraịst niile ka ha na-eme, ha ga-enwe obi ụtọ. Baịbụl sịrị: “N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ. N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Rom 12:10) Di na nwunye kwesịkwara ịgbasi mbọ ike ka ha ‘na-enwe obiọma n’ebe ibe ha nọ, na-enwe obi ọmịiko, na-agbagharakwa ibe ha kpamkpam.’—Efe. 4:32.

Ọ Bụrụ na Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Bụ Onye Na-ekweghị Ekwe

6, 7. Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na Onye Kraịst bụ́ nwunye na-edo onwe ya n’okpuru di ya na-ekweghị ekwe?

6 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị abụghị onye Jehova? Ọ bụ nwoke na-abụkarị onye na-ekweghị ekwe. Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú nwunye ya kwesịrị isi na-emeso ya? Baịbụl zara sị: “Unu ndị bụ́ nwunye, doonụ onwe unu n’okpuru di unu, ka e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nwunye ha, ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha adịghị erube isi n’okwu Chineke, ebe ha ji anya ha hụ omume unu nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù dị ukwuu.”—1 Pita 3:1, 2.

7 Baịbụl gwara nwunye ka ọ na-edo onwe ya n’okpuru di ya nke na-ekweghị ekwe. Àgwà ọma ya nwere ike ime ka di ya chọọ ịma ihe mere o ji na-akpa àgwà ọma. Nke a nwere ike ime ka ọ chọọ ịmata ihe nwunye ya kweere, o nwekwara ike imecha nata eziokwu.

8, 9. Olee ihe Onye Kraịst bụ́ nwunye kwesịrị ime ma ọ bụrụ na di ya anaghị emeso ya mmeso dị mma n’agbanyeghị na ọ na-akpa àgwà ọma?

8 Ma, gịnị ka nwaanyị ga-eme ma ọ bụrụ na di ya na-ekweghị ekweghị enweghị mmasị n’okpukpe ya? Akwụkwọ Nsọ gwara nwaanyị a di ya na-ekweghị ekwe ka ọ na-akpa àgwà ọma mgbe niile n’agbanyeghị na o nwere ike isiri ya ike ime otú a. Dị ka ihe atụ, anyị na-agụ ná 1 Ndị Kọrịnt 13:4, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi.” N’ihi ya, nwunye bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ‘ịdị umeala n’obi, dịkwa nwayọọ n’ụzọ zuru ezu, n’ogologo ntachi obi,’ jirikwa ịhụnanya na-edi ọnọdụ ya. (Efe. 4:2) Site n’enyemaka nke mmụọ Chineke, ọ ga-enwe ike ịnọgide na-akpa àgwà Onye Kraịst n’agbanyeghị na ihe na-esiri ya ike.

9 Pọl dere, sị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.” (Fil. 4:13) Mmụọ Chineke na-enyere di ma ọ bụ nwunye bụ́ Onye Kraịst aka ime ọtụtụ ihe ndị nwere ike isiri ya ike. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye mmadụ na-emeso ya mmeso ọjọọ, o nwere ike chọọ ka ya megwara. Ma, Baịbụl gwara Ndị Kraịst niile, sị: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ. . . . N’ihi na e dere, sị: ‘Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ, ka Jehova kwuru.’” (Rom 12:17-19) N’otu aka ahụ, 1 Ndị Tesalonaịka 5:15 dụrụ anyị ọdụ, sị: “Hụnụ na ọ dịghị onye ji ihe ọjọọ na-akwụ onye ọ bụla ọzọ ụgwọ ihe ọjọọ, kama na-emerenụ ibe unu na ndị ọzọ niile ihe ọma mgbe niile.” Site n’enyemaka nke mmụọ Jehova, anyị ga-emeli ihe anyị na-agaaraghị emeli n’ike anyị. Nke a mere o ji dị oké mkpa ka anyị rịọ Chineke ka o nye anyị mmụọ ya.

10. Olee ihe Jizọs mere mgbe ndị ọzọ gwara ya okwu ọjọọ ma ọ bụ kpaso ya àgwà ọjọọ?

10 Jizọs setịpụrụ ezigbo ihe nlereanya n’otú o si meso ndị gwara ya okwu ọjọọ ma ọ bụ kpaso ya àgwà ọjọọ ihe. 1 Pita 2:23 kwuru, sị: “Mgbe a na-ekwujọ ya, ọ dịghị ekwujọgwara. Mgbe ọ na-ata ahụhụ, o yighị onye ọ bụla egwu, kama ọ nọ na-enyefe onwe ya n’aka onye ahụ nke na-ekpe ikpe ziri ezi.” A gwara anyị ka anyị ṅomie àgwà ọma ya. Ekwela ka àgwà ọjọọ nke ndị ọzọ na-akpa kpasuo gị iwe. Dị nnọọ ka a dụrụ Ndị Kraịst niile ọdụ ka ha na-eme, ‘nwee obi ọmịiko, dịrị umeala n’obi, ejila ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọjọọ, ejila nkwujọ akwụ ụgwọ nkwujọ.’—1 Pita 3:8, 9.

Ì Kwesịrị Ịna-ele n’Anya n’Anya?

11. Olee ihe ùgwù pụrụ iche nke e nyere ụfọdụ ụmụ nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst?

11 Na nwaanyị ga na-edo onwe ya n’okpuru di ya ọ̀ pụtara na ọ ga na-ele n’anya n’anya n’ihe niile a na-eme n’ezinụlọ? Mba. Jehova nyere ụmụ nwaanyị na ụmụ nwoke ọtụtụ ihe ùgwù. Chegodị ụdị ihe ùgwù nke otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ nwere, nke bụ́ iso Kraịst bụrụ eze na ndị nchụàjà n’eluigwe mgbe Kraịst ga-achịwa ụwa. Ụmụ nwaanyị so n’ọnụ ọgụgụ a. (Gal. 3:26-29) O doro anya na Jehova nyere ụmụ nwaanyị ọrụ ha ga na-arụ, ọ bụghị ile n’anya n’anya.

12, 13. Nye ihe atụ iji gosi na ndị inyom buru amụma.

12 Dị ka ihe atụ, ụmụ nwaanyị so buo amụma n’oge ochie. E buru amụma na Joel 2:28, 29, sị: “M ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla, ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma. . . . Ọbụna n’ahụ́ ndị ikom na-eje ozi nakwa n’ahụ́ ndị inyom na-eje ozi n’ụbọchị ndị ahụ.”

13 Ụmụ nwaanyị so ná ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị dị ihe dị ka otu narị na iri abụọ, bụ́ ndị nọ n’ọnụ ụlọ dị n’elu na Jeruselem na Pentikọst nke afọ 33 O.A. A wụkwasịrị ha niile mmụọ Chineke. Ọ bụ nke a mere Pita ji kwuo ihe Joel onye amụma buru n’amụma ma gosi na o mezuru n’ahụ́ ndị nwoke na ndị nwaanyị. Pita sịrị: “Nke a bụ ihe e kwuru site n’ọnụ Joel onye amụma, ‘N’oge ikpeazụ,’ ka Chineke na-ekwu, ‘m ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla, ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma . . . ; ọbụnakwa n’ahụ́ ndị ohu m ndị nwoke na n’ahụ́ ndị ohu m ndị nwaanyị ka m ga-awụkwasị mmụọ m n’ụbọchị ndị ahụ, ha ga-ebukwa amụma.’”—Ọrụ 2:16-18.

14. Olee otú ụmụ nwaanyị si nye aka mee ka e nwee ọgbakọ Ndị Kraịst n’ọtụtụ ebe?

14 Na narị afọ mbụ, ụmụ nwaanyị so mee ka e nwee ọgbakọ Ndị Kraịst n’ọtụtụ ebe. Ha kwusara ozi ọma banyere Alaeze Chineke, rụọkwa ọrụ ndị metụtara ikwusa ozi ọma. (Luk 8:1-3) Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi kpọrọ Fibi “onye na-eje ozi n’ọgbakọ dị na Senkrea.” Mgbe Pọl na-ekele Ndị Kraịst ibe ya, ọ kpọrọ aha ụfọdụ ụmụ nwaanyị, ndị gụnyere “Traịfina na Traịfosa, bụ́ ụmụ nwaanyị na-arụsi ọrụ ike n’ime Onyenwe anyị.” Ọ kpọtụkwara aha “Pesis, onye anyị hụrụ n’anya, n’ihi na nwaanyị a rụrụ ọtụtụ ọrụ n’ime Onyenwe anyị.”—Rom 16:1, 12.

15. Olee otú ụmụ nwaanyị si na-enye aka taa eme ka e nwee ọgbakọ Ndị Kraịst n’ọtụtụ ebe?

15 N’oge a, ọtụtụ n’ime ihe karịrị nde mmadụ asaa ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile bụ ụmụ nwaanyị ndị nọ n’afọ ndụ dị iche iche. (Mat. 24:14) Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ozi oge niile, ndị ozi ala ọzọ, na ndị ezinụlọ Betel. Ọbụ abụ bụ́ Devid bụrụ abụ, sị: “Ọ bụ Jehova kwuru okwu; ndị inyom na-ezisa ozi ọma bụ ìgwè dị ukwuu.” (Ọma 68:11) Nke a bụ nnọọ eziokwu. Jehova ji mbọ ụmụ nwaanyị na-agba ikwusa ozi ọma na iji mezuo nzube ya kpọrọ ihe. N’eziokwu, na ọ chọrọ ka ụmụ nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst na-edo onwe ha n’okpuru di ha apụtaghị na ha ga na-ele n’anya n’anya.

Ụmụ Nwaanyị Abụọ Ndị Na-emechighị Ọnụ

16, 17. Olee otú ihe nlereanya Sera si gosi na ụmụ nwaanyị ekwesịghị ịna-ele n’anya n’anya?

16 Ebe Jehova nyere ụmụ nwaanyị ọtụtụ ihe ùgwù, ọ̀ bụ na ndị bụ́ di ekwesịghị ịjụ ndị nwunye ha ihe ha chere tupu ha emee mkpebi ndị dị mkpa? Ha ga-egosi na ha ma ihe ma ọ bụrụ na ha na-eme otú a. Akwụkwọ Nsọ kwuru ọtụtụ mgbe ụmụ nwaanyị kwuru okwu ma ọ bụ mee ihe n’echeghị ka di ha gwa ha agwa. Ka anyị tụlee abụọ.

17 Sera, bụ́ nwunye nna ochie bụ́ Ebreham, nọ na-agwa ya ka ọ chụpụ nwunye ya nke abụọ na nwa ya n’ihi na ha anaghị akwanyere ya ùgwù. “Ihe ahụ wutere nnọọ Ebreham,” ma o wuteghị Chineke. Jehova gwara Ebreham, sị: “Ekwela ka ihe ọ bụla Sera na-agwa gị banyere nwa okoro ahụ nakwa banyere ohu gị nwaanyị wute gị. Gee ntị n’olu ya.” (Jen. 21:8-12) Ebreham mere ihe Jehova kwuru, gee Sera ntị, ma mee ihe Sera kwuru.

18. Olee ihe Abigel mere n’echeghị ka di ya gwa ya agwa?

18 Cheekwa banyere Abigel, bụ́ nwunye Nebal. Ka Devid na-agba ọsọ ndụ mgbe Eze Sọl ekworo ji na-achụ ya, ọ kwụsịrị n’ebe dị nso n’ebe ìgwè atụrụ Nebal nọ. Kama iweretụ ihe ọgaranya a, Devid na ndị ikom ya chebeere ya ihe onwunwe ya. Ma, Nebal “dị aka ike, na-akpakwa agwa ọjọọ,” ‘ọ kpọkwara’ ndị ohu Devid iyi. Ọ bụ ‘nwoke na-abaghị n’ihe,’ “nzuzu dịkwa ya n’ahụ́.” Mgbe ndị ohu Devid ji obi umeala rịọ Nebal ka o nyetụ ha ihe, ọ jụrụ. Olee ihe Abigel mere mgbe ọ nụrụ ihe merenụ? N’agwaghị di ya agwa, o “mere ngwa ngwa chịrị narị ogbe achịcha abụọ, burukwa nnukwu ite mmanya abụọ na atụrụ ise a kwadebeworo na ihe ọ̀tụ̀tụ̀ sia ise nke ọka a ṅara n’ọkụ nakwa otu narị achịcha mkpụrụ vaịn a mịrị amị nakwa mbadamba achịcha mkpụrụ fig dị narị abụọ” bugara Devid na ndị ohu ya. Ihe Abigel mere ò kwesịrị ekwesị? Baịbụl kwuru, sị: “Jehova tiri Nebal ihe, o wee nwụọ.” Devid mechara lụwa Abigel.—1 Sam. 25:3, 14-19, 23-25, 38-42.

‘Nwaanyị nke Na-enwetara Onwe Ya Otuto’

19, 20. Olee ihe nwaanyị ga-eme ya eruo ka a jaa ya mma?

19 Akwụkwọ Nsọ na-aja nwaanyị na-eme ihe otú Jehova si chọọ mma. Akwụkwọ Ilu jara “ezigbo nwunye” mma. Ọ sịrị: “Ọnụ ahịa ya dị nnọọ ukwuu karịa nke nkume kọral. Onye nwe ya tụkwasịrị ya obi, ọ dịghịkwa uru kọrọ ya. O jiriwo ihe ọma kwụọ di ya ụgwọ, ọ bụghị ihe ọjọọ, n’ụbọchị niile nke ndụ ya.” Ihe ọzọkwa bụ na “o meghewo ọnụ ya n’amamihe, iwu obiọma dịkwa n’ire ya. Ọ na-eleru anya n’ihe ndị na-eme n’ezinụlọ ya, ọ naghịkwa eri nri umengwụ. Ụmụ ya ebiliwo kpọọ ya onye obi ụtọ; onye nwe ya na-ebili, na-ajakwa ya mma.”—Ilu 31:10-12, 26-28.

20 Olee ihe nwaanyị ga-eme ya eruo ka a jaa ya mma? Ilu 31:30 kwuru, sị: “Ịma mma pụrụ ịbụ ụgha, mma elu ahụ́ pụkwara ịbụ ihe efu; ma nwaanyị nke na-atụ egwu Jehova na-enwetara onwe ya otuto.” Ihe so n’egwu Jehova bụ mmadụ ịma na ya kwesịrị ido onwe ya n’okpuru ndị nọ n’isi. ‘Nwoke bụ isi nke nwaanyị,’ dị nnọọ ka “Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla,” “Chineke bụkwa isi nke Kraịst.”—1 Kọr. 11:3.

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Onyinye Chineke Nyere Gị

21, 22. (a) Olee ihe mere di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ji kwesị ịna-ekele Chineke maka onyinye nke o nyere ha, bụ́ di na nwunye ha bụ? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi gosi na anyị na-akwanyere ndokwa Jehova mere ka e nwee ndị bụ́ isi ùgwù? (Lee igbe dị na peeji nke 17.)

21 Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye nwere ọtụtụ ihe mere ha ga-eji na-ekele Chineke. Ha nwere ike iji obi ụtọ na-emekọ ihe ọnụ ka di na nwunye. Ha kwesịrị ikele Chineke karịchaa n’ihi onyinye pụrụ iche o nyere ha, nke bụ́ di na nwunye ha bụ, n’ihi na nke a na-eme ka ha bikọọ ọnụ ma soro Jehova na-eje ije. (Rut 1:9; Maị. 6:8) Jehova, bụ́ Onye malitere alụmdi na nwunye, ma ihe ga-eme ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ. Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe mgbe niile dị ka Jehova si chọọ, ‘ọṅụ Jehova ga-abụ ebe unu e wusiri ike,’ ọbụna n’ụwa a nsogbu juru.—Neh. 8:10.

22 Onye Kraịst bụ́ di nke hụrụ nwunye ya n’anya, ga-eji obiọma na-emeso ya ihe, ọ gaghịkwa na-achị ya n’aka ike. Nwunye ya nke na-asọpụrụ Chineke ga-abụkwa ezigbo nwaanyị n’ihi na ọ ga na-erubere ya isi, na-akwanyekwara ya ùgwù miri emi. Nke kacha mkpa bụ na alụmdi na nwunye ha nke bụ́ ezigbo ihe nlereanya ga-emekwa ka a na-asọpụrụ Chineke anyị nke kwesịrị ka e too ya, bụ́ Jehova.

Ì Chetara?

• Olee otú Jehova si hazie ịbụisi, oleekwa otú ọ chọrọ ka anyị si na-edo onwe anyị n’okpuru ndị nọ n’isi?

• Olee ihe mere di na nwunye ji kwesị ịna-asọpụrụ ibe ha?

• Olee otú nwunye bụ́ Onye Kraịst kwesịrị isi na-emeso di ya na-ekweghị ekwe?

• Olee ihe mere ndị bụ́ di ji kwesị ịjụta ndị nwunye ha echiche ha tupu ha emee mkpebi ndị dị mkpa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 17]

Olee Ihe Mere I Ji Kwesị Ịsọpụrụ Ndị Nọ n’Isi?

Jehova haziri ndị niile o kere eke nwere ọgụgụ isi otú onye ọ bụla ga-enwe onye ọ nọ n’okpuru ya. O mere nke a maka ọdịmma ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ. Ndokwa a na-eme ka ha nwee ohere ikpebiri onwe ha ihe ha ga na-eme, meekwa ka ha dịrị n’otu na-efe ya.—Ọma 133:1.

Ọgbakọ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ na-edo onwe ha n’okpuru Jizọs Kraịst. (Efe. 1:22, 23) N’ikpeazụ, iji gosi na ya nọ n’okpuru Jehova, “Ọkpara ahụ n’onwe ya ga-edokwa onwe ya n’okpuru Onye ahụ nke doro ihe niile n’okpuru ya, ka Chineke wee bụrụ ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.” (1 Kọr. 15:27, 28) N’ihi ya, o kwesịrị ka ndị raara onwe ha nye Chineke na-edo onwe ha n’okpuru ndị na-edu ha n’ọgbakọ nakwa n’ezinụlọ ha. (1 Kọr. 11:3; Hib. 13:17) Ọ bụrụ na anyị emee otú a, ọ ga-abara anyị uru n’ihi na anyị na Jehova ga-adị ná mma, ọ ga-agọzikwa anyị.—Aịza. 48:17.

[Foto dị na peeji nke 13]

Ekpere nwere ike inyere nwunye bụ́ Onye Kraịst aka ịkpa àgwà ọma

[Foto dị na peeji nke 15]

Jehova ji ọrụ ụmụ nwaanyị na-arụ iji mee ka ihe metụtara Alaeze ya na-aga n’ihu kpọrọ ihe