Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-asọpụrụ Ndị Agadi?

Olee Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-asọpụrụ Ndị Agadi?

Olee Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-asọpụrụ Ndị Agadi?

E NWERE otu osisi dị na Kalịfonia, Amerịka, nke aha ya bụ Lon Saịpres. Ọ bụ osisi a kacha ese foto n’ụwa niile. E kwuru na osisi a akarịala narị afọ abụọ na iri afọ ise. Osisi a bụ anwụ anwụ. E nwekwara ọtụtụ ihe mere ọmarịcha osisi a ji amasị ọtụtụ ndị. Dị ka ihe atụ, e ji ụdọ kedosie ya ike, e nwekwara nkume ndị mere ka ọ kwụsikwuo ike.

Lon Saịpres na-echetara anyị ụmụnna anyị ndị merela agadi, bụ́ ndị na-atachi nnọọ obi. Otu ụzọ pụtara ìhè ha si eme nke a bụ ikwusa ozi ọma. Joel onye amụma kwuru na “ndị agadi” ga-ekwusa ozi ọma. (Joel 2:28-32; Ọrụ 2:16-21) Chegodị awa niile a na-enweghị ike ịgụta ọnụ ha ji na-enyere nnọọ ndị ọzọ aka ịnụ “ozi ọma nke alaeze” Chineke! (Mat. 24:14) Ụfọdụ ndị agadi a ediela mkpagbu na ihe isi ike ndị ọzọ ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụrụ na e nwere mmasị na saịpres bụ́ osisi nkịtị n’ihi na ọ bụ anwụ anwụ, nakwa n’ihi ụdọ e ji kedosie ya ike nakwa nkume mere ka ọ kwụsie ike, anyị kwesịrị ịkwanyere ndị agadi nọ n’etiti anyị ùgwù ma sọpụrụ ha karị.

Jehova Chineke nyere ndị ohu ya iwu n’oge ochie, sị: “Ị ga-ebiliri onye isi awọ́, sọpụkwara onye mere agadi.” (Lev. 19:32) N’etiti ndị ohu Jehova taa, e nwere ọtụtụ ndị ‘so Chineke na-eje ije’ kemgbe ọtụtụ iri afọ. (Maị. 6:8) N’ezie, isi awọ́ ha ga-abụ “okpueze mara mma” ma ọ bụrụ na ha anọgide na-eme ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru.—Ilu 16:31.

Pọl onyeozi gwara nwa okorobịa bụ́ Timoti, sị: “Abasirila okenye mba ike. Kama nke ahụ, na-arịọ ya arịrịọ dị ka nna gị, na-emeso . . . ụmụ nwaanyị mere okenye dị ka ndị nne.” (1 Tim. 5:1, 2) Ihe nke a pụtara bụ na Timoti kwesịrị ‘ibili ọtọ’ n’ihu onye isi awọ́. Ya mere, Jehova chọrọ ka anyị na-agwa ha okwu otú ga-egosi na anyị na-asọpụrụ ha.

Ndị Rom isi iri na abụọ amaokwu iri kwuru, sị: “N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” Ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ịsọpụrụ ụmụnna ndị merela agadi. Ma, anyị niile kwesịrị ibute ụzọ n’ịsọpụrụ ibe anyị.

N’eziokwu, ndị bụ́ ụmụ nwere ọrụ pụrụ iche ha kwesịrị ịrụrụ ndị nne na nna ha na ndị nne nne na ndị nna nna ha merela agadi. Ọtụtụ ndị agbaala ezigbo mbọ iji hụ na ọ dịghị ihe mere Lon Saịpres, ha ka na-emekwa nke a. Ya mere, anyị kwesịrị ịchọ ụzọ ndị anyị ga-esi na-asọpụrụ ndị nne na nna anyị na ndị nne nne na ndị nna nna anyị merela agadi. Dị ka ihe atụ, ige ha ntị nke ọma ga-eme ka anyị ghara ịna-esi ọnwụ ka e mee ihe anyị chọrọ, n’achọghị ịma ihe ha chere.—Ilu 23:22; 1 Tim. 5:4.

Ndị agadi nọ n’etiti anyị dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova. Ọ naghị eleghara ha anya. (Ọma 71:18) Ezi Chineke anyị na-ewusi ha ike ka ha wee nọgide na-ejere ya ozi. Ka anyị gbalịsie ike na-enyere ha aka ma na-asọpụrụ ha.

[Foto dị na peeji nke 7]

Dị nnọọ ka osisi Lon Saịpres chọrọ ka a na-elekọta ya, otú ahụ ka ndị agadi ndị na-ejere Jehova ozi chọrọ ka a na-elekọta ha ma na-asọpụrụ ha

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto si n’American Spirit Images/age fotostock