Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ndị Kraịst Oge Ochie Si Lee Chi Dị Iche Iche A Na-efe na Rom Anya

Otú Ndị Kraịst Oge Ochie Si Lee Chi Dị Iche Iche A Na-efe na Rom Anya

Otú Ndị Kraịst Oge Ochie Si Lee Chi Dị Iche Iche A Na-efe na Rom Anya

PLINI nke Nta, bụ́ gọvanọ Bitinia, degaara Eze Ukwu na-achị Rom onye aha ya bụ Trejan akwụkwọ ozi, sị: “Ka m kọọrọ gị ihe m na-eme ndị e boro ebubo na ha bụ Ndị Kraịst. M na-ajụ ha ma hà bụ Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na ha asị na ha bụ, m na-ajụ ha ya ọzọ, jụọkwa ha ya nke ugboro atọ wee gwa ha na ọ bụrụ na ha anọgide na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst na m ga-ata ha ahụhụ. Ọ bụrụ na ha agbanweghị obi ha, m na-enye iwu ka e gbuo ha.” Onye ọ bụla n’ime ha nke gbanwere obi ya wee kwujọọ okpukpe Ndị Kraịst ma malite ife oyiyi eze nakwa arụsị ndị Plini debere n’obí ya, Plini dere banyere ya, sị: “M naghị akpa ya aka.”

A kpagburu Ndị Kraịst maka na ha jụrụ ife eze na ihe oyiyi nke arụsị dị iche iche. Oleekwanụ maka okpukpe ndị ọzọ ndị e nwere n’oge ahụ ndị Rom na-achị? Olee chi dị iche iche ndị mmadụ na-efe n’oge ahụ, oleekwa otú ndị Rom si lee chi ndị ahụ anya? Gịnị mere e ji kpagbuo Ndị Kraịst n’ihi na ha jụrụ ịchụrụ chi ndị Rom àjà? Azịza nke ajụjụ ndị a ga-enyere anyị aka ịmata ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ achọọ ka anyị fee chi ụgha ọ bụla.

Okpukpe Ndị E Nwere n’Oge Rom Na-achị

Otú e si nwee ọtụtụ asụsụ na omenala n’ebe dị iche iche Rom na-achị ka e si nwee ọtụtụ chi. N’agbanyeghị na okpukpe ndị Juu gbagwojuru ndị Rom anya, ha nabatara ya ma chebe ya. A na-achụrụ Siza na mba Rom ụmụ atụrụ abụọ na otu oké ehi a pịrị apị n’àjà ugboro abụọ n’ụbọchị ọ bụla n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ma è ji àjà ndị a enweta ihu ọma nke otu chi ma ọ bụ ọtụtụ chi adịghị ndị Rom mkpa. Ihe doro ha anya bụ na àjà ndị a na-egosi na ndị Juu na-adụnyere ọchịchị ndị Rom úkwù.

Okpukpe ọ bụla dị n’oge ahụ nwere ụzọ dị iche iche ha si ekpere arụsị. Ọtụtụ ndị nabatara nkwenkwe ndị Gris, ịgba afa jupụtakwara ebe niile. Okpukpe dị iche iche ndị na-eme anwansi, bụ́ ndị si Eshia, nọ na-akụziri ndị mmadụ na ndị òtù ha agaghị anwụ anwụ, na ha ga na-ahụ ihe ga-eme n’ọdịnihu nakwa na chi dị iche iche na-enye ha ike ha ji eme anwansi. Okpukpe ndị a gbasaruru n’ebe niile alaeze ahụ na-achị. Chi ndị mmadụ na-efe n’oge ochie a ma ama gụnyere chi ndị Ijipt aha ya bụ Serapis nakwa chi nwaanyị bụ́ Aịsis, chi azụ̀ bụ́ Atagatis, bụ́ nke ndị Siria na-efe, nakwa chi anyanwụ ndị Peshia na-efe bụ́ Mitra.

Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi gosiri otú ndị na-ekpere arụsị si gbaa Ndị Kraịst oge ochie gburugburu. Dị ka ihe atụ, ọ bụ otu onye Juu bụ́ dibịa afa bụ onye ndụmọdụ nke onye na-achị Saịprọs. (Ọrụ 13:6, 7) Ndị Listra sị na Pọl na Banabas bụ chi ndị Gris aha ha bụ Hemis na Zus. (Ọrụ 14:11-13) Mgbe Pọl gara Filipaị, ọ hụrụ otu nwa agbọghọ na-eje ozi nke ndị mmadụ na-ajụta ase. (Ọrụ 16:16-18) Mgbe Pọl gara Atens, o kwuru na ‘o yiri ka ndị ebe ahụ hà na-ekpere chi dị iche iche karịa ndị ọzọ.’ N’obodo ahụ, ọ hụkwara ebe ịchụàjà e dere “Nye Chi A Na-amaghị Ama.” (Ọrụ 17:22, 23) Ndị Efesọs na-efe Atemis, bụ́ chi nwaanyị. (Ọrụ 19:1, 23, 24, 34) N’àgwàetiti bụ́ Mọlta, ndị ebe ahụ kwuru na Pọl bụ chi n’ihi na o nweghị ihe mere ya mgbe agwọ tara ya. (Ọrụ 28:3-6) Ebe ọ bụ na ndị na-ekpere arụsị gbara Ndị Kraịst gburugburu, ha kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara iduhie ha.

Okpukpe Ndị Rom

Ka alaeze Rom na-ehiwanye nne, ha weere na chi ọhụrụ dị iche iche a na-efe n’alaeze ha bụ chi ha mabu ama, ndị pụtara n’ụdị ọzọ. Ndị Rom nabatara okpukpe dị iche iche ndị ha meriri n’agha na-ekpe, malitekwa isonyere ha, kama ịkwụsị ha ikpe okpukpe ndị ahụ. Nke a mere ka e nwee okpukpe dị iche iche n’alaeze Rom otú ahụ e nwere omenala dị iche iche. Ndị Rom echeghị na o nwere ihe o mere ma mmadụ na-ekpe ọtụtụ okpukpe n’otu oge. Otu onye nwere ike ịna-efe ọtụtụ chi ma ya chọọ.

Chi bụ́ isi n’ime chi niile a na-efe n’alaeze Rom bụ Jupita, bụ́ nke ha kwuru na ọ bụ ya kacha chi niile mma, karachakwaa ha ukwuu. Ha kwuru na ọ bụ ya bụ chi ikuku, chi mmiri ozuzo, chi àmụ̀mà mmiri na égbè eluigwe. Ha kwuru na Juno, bụ́ nwanne Jupita nakwa nwunye ya, onye bụ́kwa chi ọnwa, na-elekọta ụmụ nwaanyị. Nwa nwaanyị Jupita mụrụ bụ Minava bụ chi ọrụ aka, nkà na agha.

Chi dị n’alaeze Rom karịrị akarị. Laris na Penatis bụ chi na-adị n’ezinụlọ dị iche iche. Vesta bụ chi ekwu. Jenọs, bụ́ chi nwere ihu abụọ, bụ chi mmalite niile. Aka ọrụ ọ bụla nwere chi nke ya. Ndị Rom kwekwara na ihe ndị a na-anaghị ahụ anya nwegasịrị chi nke ha. Paks bụ chi udo, Salọs bụ chi ahụ́ ike, Pudikitia bụ chi obi umeala na ịdị ọcha, Fides bụ chi ikwesị ntụkwasị obi, Vetọs bụ chi obi ike, ebe Voluptas bụ chi ihe ụtọ. Ndị Rom kwere na ihe ọ bụla a na-eme n’alaeze ha, ma ọ̀ bụ n’ọchịchị ma ọ̀ bụ ná ndụ mmadụ, dị n’aka otu chi ma ọ bụkwanụ n’aka chi nke ọzọ. Ya mere, ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ka ihe ọ bụla ọ na-eme gaara ya nke ọma, ọ ghaghị inweta ihu ọma n’aka chi ihe ahụ ọ na-eme dị n’aka site n’ikpeku ya ekpere, ịchụrụ ya àjà ma ọ bụkwanụ imere ya oriri.

Otu n’ime ụzọ e si achọpụta uche chi ndị ahụ bụ ịgakwuru ndị na-agba afa. Otu n’ime ụzọ ha kacha si na-agba afa bụ ileru anya n’ihe ndị dị n’ime anụ ha ji chụọ àjà. Ha kwere na otú ihe ndị ahụ dị ga-egosi ha ma ihe ha chọrọ ime ọ̀ dị chi ha mma ma ọ bụ na ọ́ dịghị ya.

Ka narị afọ nke abụọ T.O.A. na-akwadebe ịgwụ, ndị Rom malitere ikwere na chi ukwu ha dị iche iche na ndị nke ndị Gris bụ otu. Dị ka ihe atụ, ha kwere na Jupita bụ Zus, na Juno bụ Hira. Ndị Rom na-akọ ụdị akụkọ ifo ndị Gris na-akọ banyere chi ha dị iche iche. Akụkọ ndị ahụ anaghị ekwu ihe ọma banyere chi ndị ahụ, bụ́ ndị omume ọjọọ ha yiri omume ụmụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, a na-akọkarị akụkọ otú Zus si edina ndị inyom na ụmụaka, ma ndị nke e kwuru na ha na-anwụ anwụ ma ndị nke e kwuru na ha anaghị anwụ anwụ. Ihe ndị na-eme ihere a na-egosi na chi ndị ahụ na-eme, bụ́ ndị ndị na-ekiri ihe n’ama egwuregwu na-enwekarị obi ụtọ ikiri, na-eme ka ndị na-efe ha na-eme ihe ndị jọgburu onwe ha.

O yiri ka ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime ndị ma nke a na-akọ kweere na ihe a na-akọ n’akụkọ ndị ahụ mere eme n’ezie. Ụfọdụ na-ewere ha na ha bụ naanị akụkọ ifo. Ọ ga-abụ nke a mere Pọntịọs Paịlet ji jụọ Jizọs ajụjụ ahụ a na-anaghị echefu echefu, ya bụ,“Gịnị bụ eziokwu?” (Jọn 18:38) E kwuru na nke a na-egosi “otú ndị ma nke a na-akọ si ele ihe anya, ya bụ na o nweghị otú a ga-esi mara nke bụ́ eziokwu banyere ihe ọ bụla.”

Ife Eze Ofufe

Ndị Rom malitere ife eze ofufe n’oge Ọgọstọs na-achị, bụ́ onye a mụrụ n’afọ 27 T.O.A., ya anwụọ n’afọ 14 O.A. Ndị bi ná mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, bụ́ ndị na-asụ Grik, kacha nwee obi ụtọ maka ihe Ọgọstọs meere ha, bụ́ onye mere ka ihe dịrị ha ná mma ma wetara ha udo mgbe agha ndị Rom lụrụ ọtụtụ afọ biri. Ndị mmadụ chọrọ ka ha nọgide na-enwe onye na-achị ha nke ha na-ahụ anya, bụ́ onye ga na-echebe ha. Ha chọrọ ihe ga-eme ka okpukpe niile dịrị n’otu, ka ha hụ ala ha n’anya, nke ga-emekwa ka ụwa niile dịrị n’otu n’okpuru “onye nzọpụta.” Nke a mere ka ha na-efe eze ha ka chi.

N’agbanyeghị na mgbe Ọgọstọs nọ ndụ o kweghị ka ndị mmadụ na-akpọ ya chi, o nyere iwu ka a na-efe Rom ofufe n’ihi na ọ bụ chi nwaanyị, bụ́ nke ọ kpọrọ Roma Dia. E mere Ọgọstọs chi mgbe ọ nwụrụ. A na-anọ n’ógbè dị iche iche emere isi obodo alaeze Rom na eze ya ememme okpukpe, ha jikwa nke a egosi na ha hụrụ Rom n’anya. Ofufe a malitere ife eze, bụ́ nke na-egbughị oge wee gbasaruo alaeze ahụ niile, ghọrọ ụzọ e si akwanyere Rom ùgwù ma na-akwado ya.

Dọmịshian, bụ́ onye chịrị Rom malite n’afọ 81 ruo n’afọ 96 O.A., bụ eze mbụ nyere iwu ka e fewe ya. N’oge ahụ, ndị Rom amarala na Ndị Kraịst dị iche ná ndị Juu, ha malitekwara ịkpagbu ndị ha kpọrọ ndị okpukpe ọhụrụ. Ọ ga-abụ n’oge Dọmịshian na-achị ka a chụgara Jọn onyeozi n’àgwàetiti Patmọs maka “ịgbara Jizọs àmà.”—Mkpu. 1:9.

Ọ bụ n’oge ahụ ka Jọn dere akwụkwọ Mkpughe. N’akwụkwọ ahụ, o kwuru banyere Antipas, bụ́ Onye Kraịst e gburu na Pagamọm, bụ́ ebe a na-ejighị ife eze ofufe egwu egwu. (Mkpu. 2:12, 13) Ọ ga-abụ n’oge ahụ ka ọchịchị nyere Ndị Kraịst iwu ka ha na-eme ihe okpukpe ndị Rom na-eme. Ma ọ̀ bụ ihe mere ma ọ́ bụghị, n’ihe dị ka n’afọ 112 O.A., dị ka akwụkwọ ozi ahụ Plini degaara Trejan, nke anyị kwuru okwu ya ná mmalite nke isiokwu a, kwuru, Plini chọrọ ka Ndị Kraịst nọ na Bitinia na-eme ihe ụfọdụ ndị okpukpe Rom na-eme.

Trejan jara Plini mma maka otú o si na-ekpebi ụdị okwu ahụ, wee nye iwu ka e gbuo Onye Kraịst ọ bụla jụrụ ife chi dị iche iche ndị Rom na-efe. Trejan dere, sị: “Ma, ọ bụrụ na Onye Kraịst ahụ agbanwee obi ya, e wee hụ ihe gosiri na ọ gbanweela obi ya, dị ka ịkpọku chi anyị, gbaghara ya, n’agbanyeghị na ọ jụrụ na mbụ.”

Ndị Rom ahụghị ihe mere mmadụ ga-eji sie ọnwụ na ọ bụ otu Chi ka ọ ga na-efe ofufe. Ọ dịghịkwa chi dị iche iche ndị Rom na-efe mkpa ka a na-efe naanị ha. Gịnịzi mere Chineke Ndị Kraịst ga-eji chọọ ka a na-efe naanị ya? N’anya ndị Rom, onye ọ bụla nke na-ekpe okpukpe ọchịchị ha guzobere na-akwado ọchịchị ha. Ya mere, onye ọ bụla jụrụ ife ha na-agba ọchịchị ha mgba okpuru. Plini mechara chọpụta na o nweghị ihe ya ga-eme ka ọtụtụ n’ime Ndị Kraịst gbanwee obi. Ndị Kraịst ndị ahụ ma na nke a bụ inupụrụ Jehova isi, ọtụtụ n’ime ha họọrọ ịnwụ kama ife eze ofufe.

Gịnị ka nke a ji gbasa anyị? Mba ụfọdụ na-enye iwu ka ndị ha na-achị na-efe ihe ndị e ji mara mba ha. Anyị bụ́ Ndị Kraịst na-asọpụrụ ndị ọchịchị. (Rom 13:1) Ma, o ruhaala n’ikele ọkọlọtọ, anyị anaghị echefu na Jehova Chineke chọrọ ka anyị na-efe naanị ya nakwa na o nyere anyị iwu ka anyị ‘gbaara ikpere arụsị ọsọ,’ gwakwa anyị ka anyị ‘kpachara anya ka anyị ghara ikpere arụsị.’ (1 Kọr. 10:14; 1 Jọn 5:21; Nehọ. 1:2) Jizọs sịrị: “Ọ bụ Jehova Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.” (Luk 4:8) Ya mere, ka anyị nọgide na-erubere Chineke anyị na-efe ofufe isi.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke]

Ezigbo Ndị Kraịst na-efe naanị Jehova

[Foto dị na peeji nke 3]

Ndị Kraịst oge ochie jụrụ ife eze Rom ma ọ bụ ihe oyiyi nke chi ọ bụla

Eze Dọmịshian

Zus

[Ebe E Si Nweta Foto]

Eze Dọmịshian: Todd Bolen/Bible Places.com; Zus: Foto si na Todd Bolen/Bible Places.com, nke e sere n’Ebe A Na-edebe Ihe Mgbe Ochie E Gwutere n’Ala nke dị n’Istanbul

[Foto dị na peeji nke 4]

Ndị Kraịst nọ n’Efesọs jụrụ ife chi nwaanyị a ma ama bụ́ Atemis.—Ọrụ 19:23-41