Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ahụ́ Ga-eru Gị Ala Ma Gị na Ndị Chineke Nọrọ

Ahụ́ Ga-eru Gị Ala Ma Gị na Ndị Chineke Nọrọ

Ahụ́ Ga-eru Gị Ala Ma Gị na Ndị Chineke Nọrọ

“M ga-anọ n’ime ọgbakọ buru ibu too gị.”—ỌMA 35:18.

1-3. (a) Gịnị nwere ike imebi adịm ná mma mmadụ na Chineke? (b) Olee ebe ndị Chineke nwere ike ịnọ e wee chebe ha?

KA JOO na nwunye ya na-egwu mmiri n’ebe ha gara ezumike, ha hụrụ ọtụtụ azụ̀ mara mma, ma ndị nta ma ndị ukwu, bụ́ ndị tụrụ àgwà dị iche iche. Ha gwuuru mmiri gakwuo n’ala mmiri ka ha hụkwuo ha nke ọma. Mgbe ha gwururu ebe mmiri miri emi, nwunye Joo gwara ya sị, “Ọ dị ka anyị na-agami agami.” Joo gwara ya, sị: “Ụjọ atụla gị, ama m ihe m na-eme.” Joo kwuru na ka ha gwuuru na-aga, ya ajụọ onwe ya sị, ‘Oleekwanụ ebe azụ̀ ndị ọ bụ gara?’ Ezigbo egwu jidere ya ozugbo ọ hụrụ ihe mere ha ji gbalagachaa. Ọ hụrụ azụ̀ shak nke nọ na-abịakwute ya. Ọ ma na ya aghọọrọla ya anụ oriri. Mgbe ọ fọrọ obere ka o rute ya nso, shak ahụ tinyere isi ebe ọzọ.

2 Ihe ndị juru n’ụwa Setan, ndị dị ka ihe ndị e ji atụrụ ndụ, ọrụ, na ihe onwunwe, nwere ike ịna-adọ Onye Kraịst akpịrị nke na ọ gaghị achọpụta na ya etinyewela isi n’ebe dị ize ndụ. Joo anyị kwuru okwu ya, onye bụ́ okenye ọgbakọ, kwuru, sị: “Ihe a mere m mere ka m chee echiche banyere ndị anyị na ha na-akpa. Na-egwu mmiri n’ebe na-adịghị ize ndụ, ya bụ, n’ọgbakọ!” Egwurula mmiri gaa n’ebe miri emi, bụ́ ebe i nwere ike ịnọ naanị gị, nke nwekwara ike ime ka gị na Jehova ghara ịdị ná mma. Ọ bụrụ na e nwee otú i si gwuru mmiri gaa ebe dị otú ahụ, pụta ozugbo. Ma ọ́ bụghị ya, nke a nwere ike imebi adịm ná mma gị na Jehova.

3 Ụwa dịịrị Ndị Kraịst ize ndụ taa. (2 Tim. 3:1-5) Setan ma na oge ya agwụwala, o kpebiekwala iripịa ndị na-amụghị anya. (1 Pita 5:8; Mkpu. 12:12, 17) Ma, Jehova na-echebe anyị. O meela ka ndị ya nwee ebe ha ga-anọ ihe ọ bụla aghara imebi adịm ná mma ha na ya, ya bụ, n’ọgbakọ Ndị Kraịst.

4, 5. Olee ihe ọtụtụ ndị na-eche banyere ọdịnihu, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

4 Ụwa a agaghị echebe anyị nke ọma n’ụzọ ọ bụla. Ahụ́ anaghị eru ọtụtụ ndị ala n’ihi ndị na-eme mpụ, ndị na-eme ihe ike, oké ọnụ ihe na-ada, nakwa otú e si na-emetọ ebe ha bi. O nweghị onye na-anaghị arịa ọrịa, onye ọ bụla na-akakwa nkà. Ndị nwekwara ọrụ, ụlọ, ego, ahụ́ adịtụkwa ha, nwere ike ịnọ na-eche ma ihe ndị a hà ga-anọtekwa aka.

5 O nwere ndị ọ na-esiri ike inwe obi iru ala. Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị, bụ́ ndị chọrọ ka ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha, nakwa ndị ezinụlọ ha dịrị n’udo ma na-enwe obi ụtọ, na-achọpụta na ihe ha tụrụ anya ya enweghị isi. E tigharịala ọtụtụ ndị chọọchị anya ebe ha na-achọ otú ha na Chineke ga-esi dịrị ná mma, obi akakwaghị ha na ndị na-edu ha ga-enyere ha aka. Ihe mechara nke a ji dị otú a bụ na ndị isi chọọchị ha na-eme omume rụrụ arụ, na-akụzikwa ihe na-adịghị n’Akwụkwọ Nsọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị chere na o nweghị ihe ọzọ ha ga-eme ma ọ́ bụghị ịtụkwasị obi na nkà na ụzụ nakwa n’ebe ndị nkịtị nwere ike inyere ha aka nọ. Ya mere, ọ naghị eju anyị anya na ahụ́ anaghị eru ndị gbara anyị gburugburu ala. Ọ naghịkwa eju anyị anya na ha achọghịzi ichebara ihe nwere ike ime ná ndụ ha n’ọdịnihu echiche.

6, 7. (a) Olee otú olileanya ndị na-ejere Chineke ozi si dị iche na nke ndị na-anaghị ejere ya ozi? (b) Olee ihe anyị ga-atụle?

6 Otú Ndị Kraịst si ele ihe anya dị nnọọ iche n’otú ndị na-abụghị Ndị Kraịst si ele ihe anya. N’agbanyeghị na ihe na-esiri anyị bụ́ ndị Jehova ike otú o si na-esiri ndị agbata obi anyị, anyị anaghị ekwe ka o wute anyị otú o si ewute ha. (Gụọ Aịzaya 65:13, 14; Malakaị 3:18.) Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị na-agụta na Baịbụl ihe mere ụmụ mmadụ ji na-enwe nsogbu ha na-enwe taa, nke a emeekwala ka anyị nwee ike idi ihe ndị a. Nke a mere ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị banyere ọdịnihu. Ofufe anyị na-efe Jehova emeela ka anyị ghara itinye aka n’omume rụrụ arụ, meekwa ka anyị ghara ịna-eche ihe ọjọọ n’echiche. O meekwala ka anyị ghara ịna-ata ahụhụ ndị na-esi n’ihe ndị a apụta. Ya mere, ahụ́ na-eru ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ala, ma, ọ naghị eru ndị na-abụghị Ndị Kraịst.—Aịza. 48:17, 18; Fil. 4:6, 7.

7 E nwere ihe ụfọdụ mere n’oge ochie ndị nwere ike inyere anyị aka ịtụgharị uche n’otú ahụ́ si eru ndị na-ejere Jehova ozi ala, ma, ọ naghị eru ndị ọzọ. Ihe ndị a nwere ike inyere anyị aka ịma ihe ndị anyị na-eche n’echiche na omume ndị anyị na-eme, ma mara ma ànyị ga-enwe ike imekwu ihe Chineke kwuru, bụ́ ihe ndị ga-echebe anyị.—Aịza. 30:21.

“Ọ Fọrọ nke Nta Ka M Zọhie Ụkwụ”

8. Olee ihe ndị ohu Jehova na-agba mbọ ime mgbe niile?

8 Kemgbe ụwa, ndị na-ejere Jehova ozi ma na-erubere ya isi na-agba mbọ ka ha na ndị na-anaghị ejere ya ozi ghara ịna-akpa. N’ezie, Jehova kwuru na a ga-enwe iro n’etiti ndị na-efe ya na ndị òtù Setan. (Jen. 3:15) Ihe mere na ndị Chineke anaghị eme ka ndị gbara ha gburugburu bụ n’ihi na ha na-eme ihe Chineke kwuru. (Jọn 17:15, 16; 1 Jọn 2:15-17) Ime nke a mgbe niile adịghị mfe. N’eziokwu, ụfọdụ ndị ohu Jehova na-eche mgbe ụfọdụ ma hà kwesịdịrị ịnọgide na-eme uche Chineke.

9. Kọwaa ihe ya na onye dere Abụ Ọma nke iri asaa na atọ nọ na-alụ.

9 Otu n’ime ndị ohu Jehova nke chere ma ihe ya kpebiri ime ò ziri ezi bụ onye dere Abụ Ọma nke iri asaa na atọ. Ikekwe, ọ bụ onye si n’ezinụlọ Esaf. Ọbụ abụ ahụ jụrụ ihe mere o ji yie ka ndị ajọ omume hà na-enwe ihe ịga nke ọma, na-enwe obi ụtọ, na-enwekwa ọganihu, ebe ihe na-esiri ụfọdụ ndị na-agba mbọ ijere Chineke ozi ike.—Gụọ Abụ Ọma 73:1-13.

10. Olee ihe mere i ji kwesị ichebara ajụjụ ndị ahụ ọbụ abụ ahụ jụrụ echiche?

10 È nwetụla mgbe ị jụrụ ụdị ajụjụ ndị ahụ ọbụ abụ ahụ dere na Baịbụl? Ọ bụrụ otú ahụ, obi ekwesịghị ịna-ama gị ikpe, i kwesịghịkwa ichewe na okwukwe gị ajụwala oyi. N’eziokwu, ọtụtụ ndị ohu Jehova, gụnyere ụfọdụ ndị nke o nyere ike ka ha dee Baịbụl, chere ụdị ihe a. (Job 21:7-13; Ọma 37:1; Jere. 12:1; Hab. 1:1-4, 13) N’ezie, ndị niile chọrọ ijere Jehova ozi aghaghị ichebara otu ajụjụ dị mkpa echiche ma kwere n’azịza ya. Ajụjụ ahụ bụ: Ijere Chineke ozi na irubere ya isi ọ̀ bụ ihe kacha mma mmadụ kwesịrị ime? Nke a metụtara okwu ahụ Setan welitere n’ogige Iden. Ọ gbasara nnọọ okwu ahụ dị mkpa nke metụtara ma ọ̀ bụ Chineke kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. (Jen. 3:4, 5) Ya mere, anyị niile kwesịrị ichebara ajụjụ ndị ahụ ọbụ abụ ahụ jụrụ echiche. Ànyị kwesịrị ịna-emere ndị ajọ omume na-etu ọnụ anyaụfụ, bụ́ ndị yiri ka hà na-enwe ihe ịga nke ọma? Ànyị kwesịrị ‘ịzọhie ụkwụ’ ma kwụsị ijere Jehova ozi wee dịrị ka ha? Nke a bụ ihe Setan ga-achọ ka anyị mee.

11, 12. (a) Olee otú ọbụ abụ ahụ si kwụsị inwe obi abụọ, gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị? (b) Olee ihe nyeere gị aka ikpebi ime ihe ọbụ abụ ahụ kpebiri ime?

11 Gịnị nyeere ọbụ abụ ahụ aka ịkwụsị inwe obi abụọ? Ọ bụ eziokwu na o kwuru na ọ fọrọ nke nta ka ọ zọhie ụkwụ, ọ gbanwere echiche ya mgbe ọ banyere “ná nnukwu ebe nsọ Chineke,” ya bụ, mgbe ya na ndị Chineke malitere ịkpakọrịta n’ụlọikwuu ma ọ bụ n’ụlọ nsọ Chineke, ya atụgharịakwa uche n’ihe Chineke zubere. O doziri ọbụ abụ ahụ anya na ya achọghị ka ihe ga-eme ndị na-emebi iwu mee ya. Ọ hụrụ na otú ha si ebi ndụ na ihe ha na-eme mere ka ha nọrọ “n’ala na-amị amị.” Ọbụ abụ ahụ chọpụtara na ndị niile hapụrụ Jehova ma na-eme omume rụrụ arụ, aghaghị ‘ịtụ ụjọ na mberede’ nwụọ, ebe Jehova ga-echebe ndị na-ejere ya ozi. (Gụọ Abụ Ọma 73:16-19, 27, 28.) O doro anya na ị chọpụtala na okwu a bụ eziokwu. O nwere ike ịna-amasị ọtụtụ ndị ibi ndụ otú masịrị ha n’achọghị ịma ihe Chineke kwuru, ma, ha ga-atarịrị ahụhụ ga-esi ná ndụ ọjọọ dị otú ahụ pụta.—Gal. 6:7-9.

12 Olee ihe ọzọ anyị na-amụta n’ihe mere ọbụ abụ ahụ? Ahụ́ ruru ya ala mgbe ya na ndị Chineke nọ, ọ mụtakwara ihe. Ọ malitere iche echiche nke ọma mgbe ọ gara n’ebe a na-anọ efe Jehova. N’otu aka ahụ taa, ọ bụrụ na anyị agaa ọmụmụ ihe, anyị nwere ike ịhụ ezigbo ndị ndụmọdụ, rijuokwa nri ime mmụọ afọ. N’ihi ya, e nwere ezigbo ihe mere Jehova ji gwa ndị ohu ya ka ha na-aga ọmụmụ ihe. A ga-agba ha ume ebe ahụ, a ga-akpalikwa ha ime ihe ziri ezi.—Aịza. 32:1, 2; Hib. 10:24, 25.

Mete Ezigbo Ndị Enyi

13-15. (a) Olee ihe mere Daịna, oleekwa ihe nke a na-akụziri anyị? (b) Olee ihe mere anyị na Ndị Kraịst ibe anyị ịkpa ga-eji echebe anyị?

13 Nwa Jekọb bụ́ Daịna bụ ihe atụ nke onye banyere n’ezigbo nsogbu n’ihi na ya na ndị ụwa na-akpa. A kọrọ n’akwụkwọ Jenesis na ọ na-agakwukarị ụmụ agbọghọ ndị Kenan ndị nọ n’ebe ezinụlọ ya bi. Ndị Kenan anaghị akpa àgwà ọma dị ka ndị na-efe Jehova na-akpa. Kama ime ka ndị Jehova, ihe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie hụrụ na-egosi na otú ndị Kenan si ebi ndụ mere ka ikpere arụsị, omume rụrụ arụ, mmekọahụ rụrụ arụ ha ji efe arụsị, na ime ihe ike jupụta n’obodo ha. (Ọpụ. 23:23; Lev. 18:2-25; Diut. 18:9-12) Cheta ihe mere Daịna n’ihi na ya na ndị Kenan na-akpa.

14 Otu nwoke onye ebe ahụ, onye aha ya bụ Shikem, bụ́ onye e kwuru na ọ bụ “onye a kasị asọpụrụ n’ụlọ nna ya,” hụrụ Daịna “ma kpọrọ ya dinaa ya wee merụọ ya.” (Jen. 34:1, 2, 19) Nke a jọgburu nnọọ onwe ya! Ì chere na o nwere mgbe ọ gbatara Daịna n’obi na ihe dị otú a nwere ike ime ya? Ikekwe naanị ihe ọ chọrọ bụ ka ya na ndị na-eto eto ndị ebe ahụ, bụ́ ndị o weere na o nweghị ihe ọjọọ ha ga-eme ya, bụrụ enyi. Ma, Daịna gbajọrọ ya.

15 Gịnị ka akụkọ a na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na anyị ekwesịghị iche na anyị na ndị na-ekweghị ekwe nwere ike ịna-akpa ihe ọjọọ aghara ime anyị. Akwụkwọ Nsọ kwuru na “mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” (1 Kọr. 15:33) Ma, o nweghị ihe ga-eme gị ma ọ bụrụ na gị na ndị kweere ihe i kweere na-akpa, bụ́ ndị na-eme omume ọma ka gị, hụkwa Jehova n’anya ka gị. Ezigbo ndị enyi dị otú a ga-agba gị ume ka ị na-eme omume ka onye maara ihe.—Ilu 13:20.

“A Sachawo Unu”

16. Olee ihe Pọl onyeozi kwuru banyere ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ dị na Kọrịnt?

16 Ọgbakọ Ndị Kraịst enyerela ọtụtụ ndị aka ịkwụsị àgwà rụrụ arụ. Mgbe Pọl onyeozi degaara ọgbakọ dị na Kọrịnt akwụkwọ ozi ya nke mbụ, o kwuru okwu banyere mgbanwe Ndị Kraịst nọ n’ebe ahụ mere ka ha wee nwee ike ime ihe Chineke chọrọ. Ụfọdụ n’ime ha bụbu ndị na-akwa iko, ndị na-ekpere arụsị, ndị di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ndị na-edina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha, ndị ohi, ndị aṅụrụma, nakwa ndị na-eme ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ. Pọl gwara ha, sị: “Ma a sachawo unu.”—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11.

17. Olee otú ndụ ọtụtụ ndị sirila gbanwee n’ihi na ha na-eme ihe Baịbụl kwuru?

17 Ndị na-enweghị okwukwe enweghị ezigbo ihe na-eduzi ha. Ha na-eji aka ha ekpebiri onwe ha ihe ha ga-eme, ma ọ bụkwanụ na-eme omume rụrụ arụ ndị gbara ha gburugburu na-eme, dị ka ụfọdụ ndị nọ na Kọrịnt oge ochie mere tupu ha aghọọ Ndị Kraịst. (Efe. 4:14) Ma, ịmara Okwu Chineke na nzube ya nke ọma nwere ike ịgbanwe ndụ ndị mmadụ ha ewee mewe ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. (Kọl. 3:5-10; Hib. 4:12) Ọtụtụ ndị bụ́ Ndị Kraịst taa nwere ike ịgwa gị na ha biri ndụ rụrụ arụ tupu ha aghọọ ndị Jehova. Ma, ha enweghị afọ ojuju mgbe ahụ, obi adịghịkwa ha ụtọ. Mgbe obi ruru ha ala bụ mgbe ha na ndị Chineke malitere ịkpa nakwa mgbe ha mewere ihe Baịbụl kwuru.

18. Olee ihe mere otu nwa agbọghọ, oleekwa ihe nke a na-egosi?

18 Ma, ụfọdụ ndị hapụrụ ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ ebe ahụ́ ruru ha ala, na-akwa nnọọ ụta maka ihe ha mere. Otu nwanna nwaanyị anyị ga-akpọ Tanya, kwuru na ya na-agatụ ọmụmụ ihe na ozi ọma mgbe ya dị obere. Ma, o kwuru na ya hapụrụ ọgbakọ mgbe ya dị afọ iri na isii gaa “na-achụ ihe nke ụwa.” Otu n’ime ihe ọjọọ ndị mere ya bụ na o butere ime ọkwa tee ya. O kwuru ugbu a, sị: “Afọ atọ m nọrọ n’ụwa mere ka m na-enwe obi amamikpe nke na-ekweghị aha m aka. Otu ihe na-enye m nsogbu n’obi mgbe niile bụ na m gburu nwa m bu n’afọ. . . . M na-agwa ndị niile na-eto eto, bụ́ ndị chọrọ ‘idetụ ụwa ire,’ sị, ‘Unu anwala ya anwa!’ o nwere ike ịtọ unu ụtọ ná mmalite, ma, ọ na-elu ajọ ilu mgbe e mechara. Ihe ụwa na-ewetara ndị mmadụ bụ obi mgbawa. Ama m nke a. Edetụrụ m ya ire. Nọrọnụ n’ọgbakọ Jehova! Ọ bụ naanị na ya ka mmadụ ga-anọrọ, ya enwee obi ụtọ.”

19, 20. Ọgbakọ na-echebe anyị ka gịnị ghara ime anyị, oleekwa otú o si eme nke a?

19 Cheedị ihe ga-eme gị ma ọ bụrụ na gị ahapụ ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ ebe ị ga-anọ gbanahụ nsogbu. Ọtụtụ ndị bụ́ ndị biri ndụ rụrụ arụ tupu ha aghọọ ndị Jehova achọghị ichetatụdị nke ahụ n’echiche. (Jọn 6:68, 69) Ọ bụrụ na ị nọrọ ụmụnna gị nso mgbe niile, Jehova ga na-echebe gị ka i wee gbanahụ ọdachi na obi mgbawa juru n’ụwa Setan. Iso ha na-agachi ọmụmụ ihe anya ga na-echetara gị uru ime ihe Jehova kwuru bara, ọ ga-agbakwa gị ume ịnọgide na-eme uche ya. E nwere ọtụtụ ihe mere ị ga-eji ‘na-eto Jehova n’ime ọgbakọ buru ibu,’ dị ka ọbụ abụ ahụ mere.—Ọma 35:18.

20 N’ezie, e nwere ọtụtụ ihe mere ịnọgide na-eme uche Chineke ji esiri Ndị Kraịst niile ike mgbe ụfọdụ. Naanị ihe dị ha mkpa ma nke a mee bụ onye ga-eduzi ha. Olee ihe gịnwa, nakwa ndị niile nọ n’ọgbakọ, nwere ike ime iji nyere ụmụnna gị aka ma nke a mee? Isiokwu na-eso nke a ga-egosi otú i nwere ike isi ‘na-akasi ụmụnna gị obi ma na-ewuli ha elu.’—1 Tesa. 5:11.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee ihe anyị na-amụta n’ihe mere onye dere Abụ Ọma nke iri asaa na atọ?

• Olee ihe ihe mere Daịna na-akụziri anyị?

• Olee ihe mere ọgbakọ Ndị Kraịst ji bụrụ ebe mmadụ ga-anọ ahụ́ eruo ya ala?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Na-egwu mmiri n’ebe ihe na-agaghị emerụ gị ahụ́; nọrọ n’ọgbakọ!