Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-eme Ka Ọgbakọ Sie Ike

Na-eme Ka Ọgbakọ Sie Ike

Na-eme Ka Ọgbakọ Sie Ike

“Na-akasirịtanụ ibe unu obi ma na-ewulirịtanụ ibe unu elu.”—1 TESA. 5:11.

1. Olee ngọzi ndị anyị na-enweta n’ọgbakọ Ndị Kraịst, oleekwa nsogbu ndị anyị na-enwe?

Ị BỤ onye a gọziri agọzi ma ọ bụrụ na ị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Gị na Jehova dị ná mma. Otú i si kwe ka Okwu ya na-eduzi gị mere ka ị ghara ịna-enwe nsogbu ndị na-emebi iwu Chineke na-enwe. I nwere ọtụtụ ezigbo ndị enyi, bụ́ ndị chọrọ ka ị na-eme nke ọma. N’eziokwu, i nwere ọtụtụ ngọzi. Ma, e nwere ọtụtụ Ndị Kraịst ha na otu nsogbu ma ọ bụ ọzọ na-alụ. O nwere ike nsogbu ụfọdụ n’ime ha na-enwe bụ na ọ na-esiri ha ike ịghọta ihe ndị miri emi dị n’Okwu Chineke. Ndị nke ọzọ nwere ike na-arịa ọrịa ma ọ bụkwanụ nwee ihe na-echegbu ha, ma ọ bụ ya abụrụ na ha na-enwe nsogbu n’ihi mkpebi ha mere. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị niile bi n’ụwa nke na-amaghị Chineke.

2. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ụmụnna anyị nwee ihe isi ike, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

2 O nweghị onye n’ime anyị ọ na-atọ ụtọ ka ụmụnna ya na-ata ahụhụ. Pọl onyeozi ji ọgbakọ tụnyere ahụ́ mmadụ wee sị na ọ bụrụ na “otu akụkụ ahụ́ na-ata ahụhụ, akụkụ ndị ọzọ dum na-eso ya ata ahụhụ.” (1 Kọr. 12:12, 26) Ọ bụrụ na ụmụnna anyị na-ata ahụhụ, anyị ga-agbalịsi ike nyere ha aka. E nwere ọtụtụ akụkọ a kọrọ n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ ndị na-egosi otú ndị nọ n’ọgbakọ si nyere ibe ha aka idi ihe isi ike. Ka anyị na-atụle akụkọ ndị ahụ, na-eche otú i nwere ike isi na-enyere ụmụnna anyị aka ma ha nọrọ n’ụdị ọnọdụ ndị ahụ. Olee otú ị ga-esi nyere ụmụnna gị aka ka ha nọgide na-efe Jehova, wee si otú a na-eme ka ọgbakọ Jehova sie ike?

“Ha Kpọbatara Ya n’Etiti Onwe Ha”

3, 4. Olee otú Akwịla na Prisila si nyere Apọlọs aka?

3 Apọlọs na-eji ịnụ ọkụ n’obi ezisa ozi ọma tupu ya akwaga Efesọs. Ọrụ Ndịozi kwuru, sị: “Ebe ọ na-anụ ọkụ na mmụọ, ọ malitekwara na-ekwu okwu ma na-ezi ihe ndị metụtara Jizọs n’ụzọ ziri ezi, ma ọ bụ naanị banyere baptizim Jọn ka ọ maara.” Na Apọlọs amaghị banyere ime baptizim “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ” nwere ike ịpụta na ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim, ma ọ bụkwanụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ziri ya ozi ọma tupu Pentikọst nke afọ 33 O.A. N’agbanyeghị na Apọlọs na-anụ ọkụ n’obi, o nwere ihe ndị dị mkpa ọ na-amatabeghị. Olee otú mkpakọrịta ya na ụmụnna ya si nyere ya aka?—Ọrụ 1:4, 5; 18:25; Mat. 28:19.

4 Mgbe di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst, bụ́ Akwịla na Prisila, nụrụ otú Apọlọs si kwuo okwu n’ụlọ nzukọ n’atụghị egwu, ha kpọbatara ya n’etiti onwe ha wee kụziere ya ihe ndị ọ na-amaghị. (Gụọ Ọrụ 18:24-26.) Ihe a ha mere gosiri na ha hụrụ ya n’anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ ga-abụrịrị na Akwịla na Prisila kpọrọ Apọlọs wee jiri akọ gwa ya okwu ka obi ghara ịjọ ya njọ. Ọ ga-abụ na ha gwara ya ihe ndị megasịrị n’ọgbakọ Ndị Kraịst mgbe ọ malitere ọhụrụ. O doro anya na obi dị Apọlọs ụtọ maka otú ndị enyi o metere ọhụrụ si gwa ya ihe ndị a dị mkpa. Apọlọs ji ihe a a gwara ya ‘nyere ụmụnna ya nọ n’Akeya aka nke ukwuu,’ o jikwa ya zie ozi ọma nke ọma.—Ọrụ 18:27, 28.

5. Olee otú ọtụtụ puku ndị nkwusa Alaeze si jiri ịhụnanya na-enyere ndị mmadụ aka, gịnịkwa ka nke a na-arụpụta?

5 Ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ taa na-enwe obi ụtọ dị ukwuu maka otú ụmụnna ha si nyere ha aka ịghọta ihe dị na Baịbụl. Ọtụtụ ụmụnna na ndị mụụrụ ha ihe bụkwa ezigbo enyi. Ihe na-enyekarịrị ndị mmadụ aka ịghọta eziokwu dị na Baịbụl bụ ndị nkwusa iwepụta oge mụọrọ ha ihe ọtụtụ ọnwa n’esepụghị aka. Ma, ndị nkwusa Alaeze na-eji obi ha dum eme nke a n’ihi na ha ma na o metụtara ndụ. (Jọn 17:3) Ọ na-enyekwa anyị ọṅụ dị ukwuu ma ndị anyị mụụrụ ihe ghọta ihe dị na Baịbụl, mewe ihe ha mụtara, ma jiri ndụ ha na-efe Jehova.

‘A Kọrọ Akụkọ Ọma Banyere Ya’

6, 7. (a) Gịnị mere Pọl ji họrọ Timoti ka o soro ya na-eje ozi ala ọzọ? (b) Olee ọganihu Pọl nyeere Timoti aka inwe?

6 Mgbe ndịozi bụ́ Pọl na Saịlas gara Listra mgbe ha gara njem ozi ala ọzọ nke abụọ, ha hụrụ otu nwa okorobịa aha ya bụ Timoti n’ebe ahụ, bụ́ onye dị ihe dị ka afọ iri abụọ. “Ụmụnna nọ na Listra na Aịkoniọm kọkwara akụkọ ọma banyere ya.” Nne Timoti bụ́ Yunis na nne nne ya bụ́ Lọịs bụ Ndị Kraịst raara onwe ha nye Chineke, ma, nna ya abụghị Onye Kraịst. (2 Tim. 1:5) Ọ ga-abụ na Pọl matara ezinụlọ ahụ mgbe mbụ ọ gara ebe ha bi afọ ole na ole tupu mgbe ahụ. Ma ka ọ dị ugbu a, Pọl nwere mmasị n’ebe Timoti nọ n’ihi na ọ bụ nwa okorobịa e ji ama atụ. Ya mere, ndị okenye nke ọgbakọ Timoti nọ na ya kwere ka o soro Pọl na-aga ozi ala ọzọ.—Gụọ Ọrụ 16:1-3.

7 E nwere ọtụtụ ihe Timoti ga-amụta n’aka Pọl, bụ́ onye tọrọ ya. N’oge na-adịghị anya, ọ mụtara ọtụtụ ihe nke mere ka obi sie Pọl ike iziga ya ka ọ gaa nọchite anya ya leta ọgbakọ dị iche iche. N’ime ihe dị ka afọ iri na ise Timoti na Pọl so gaa ozi, o nwere ọganihu wee ghọọ onye nlekọta nwere ezigbo amamihe, ọ kwụsịkwara ime ihere.—Fil. 2:19-22; 1 Tim. 1:3.

8, 9. Olee otú ndị nọ n’ọgbakọ ga-esi na-agba ndị na-eto eto ume? Nye ihe atụ.

8 Ọtụtụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa ndị nọ n’ọgbakọ taa ga-enwe nnọọ ọganihu ma e nyere ha aka. Ọ bụrụ na ndị enyi ha ndị ji ozi Chineke kpọrọ ihe agbaa ha ume, ha ga-agbasi mbọ ike ruo eruo ma nweta ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ. Leruo anya n’ọgbakọ ị nọ! Ò nwere ndị na-eto eto ị hụrụ, bụ́ ndị nwere ike iwepụta onwe ha otú ahụ Timoti mere? Ọ bụrụ na i nyere ha aka ma gbaa ha ume, ha nwere ike ịghọ ndị ọsụ ụzọ, ndị Betel, ndị ozi ala ọzọ, ma ọ bụkwanụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Olee ihe i nwere ike ime ka ha wee ruo eru inweta ihe ùgwù ndị a?

9 Matịn, bụ́ onye na-eje ozi na Betel kemgbe iri afọ abụọ, ji obi ụtọ kwuo otú otu onye nlekọta sekit si gbaa ya ume afọ iri atọ gara aga mgbe ha abụọ nọ ozi ọma. Onye nlekọta ahụ ji obi ụtọ gwa ya otú o si jee ozi na Betel mgbe ọ bụ nwa okorobịa. Ọ gbara Matịn ume ka o lee ma ọ̀ ga-ejeli ozi na Betel. Matịn kwuru na ya echefughị agbamume ahụ nwanna ahụ nyere ya nakwa na ọ bụ ihe nyeere ya aka ime mkpebi ndị ya mechara mee. nwere ike inyere ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ unu aka site n’ịgwa ha ihe ha ga-eme ka ha wee nwee ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ.

“Na-agụgụnụ Mkpụrụ Obi Dara Mbà”

10. Olee otú obi dị Epafrọdaịtọs, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

10 Epafrọdaịtọs si na Filipaị gaa Rom, bụ́ njem dị anya ma na-agwụ ike. Ọ gara ebe ahụ ịhụ Pọl onyeozi, bụ́ onye a tụrụ mkpọrọ maka na ọ bụ Onye Kraịst. Ọ bụ ndị Filipaị zipụrụ ya ka ọ gaa hụ Pọl. O wegaara ya ihe ha nyere ya, chọọkwa ịnọnyetụrụ ya iji nyere ya aka n’oge ahụ ọ nọ mkpọrọ. Ma, mgbe Epafrọdaịtọs nọ na Rom, ọ dara ọrịa “nke na ọ fọrọ nke nta ka ọ nwụọ.” Ọ dara mbà n’obi n’ihi na ọ dị ya ka ozi ọ gara enweghị isi.—Fil. 2:25-27.

11. (a) Gịnị mere ọ gaghị eju anyị anya ma ọ bụrụ na ụfọdụ ụmụnna anyị adaa mbà n’obi? (b) Gịnị ka Pọl gwara ndị Filipaị ka ha meere Epafrọdaịtọs?

11 E nwere ọtụtụ ihe na-eme ka ndị mmadụ daa mbà n’obi taa. Nchọpụta Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike mere na-egosi na ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ ise ọ bụla nwere mgbe ọ ga-ada mbà n’obi ná ndụ ya. Ndị ohu Jehova na-adakwa mbà n’obi mgbe ụfọdụ. Mmadụ nwere ike ịda mba n’obi n’ihi na o nweghị ego ọ ga-eji elekọta ezinụlọ ya. Ọrịa, mmadụ ichegbu onwe ya n’ihi ihe o mehiere, ma ọ bụkwanụ ihe ndị ọzọ, nwekwara ike ime ka mmadụ daa mbà n’obi. Gịnị ka ndị Filipaị nwere ike ime iji nyere Epafrọdaịtọs aka? Pọl dere, sị: “Jirinụ ọṅụ niile nabata ya dị ka unu si anabata ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị; na-akwanyerenụ ndị dị otú ahụ ùgwù, n’ihi na ọ fọrọ ntakịrị ka ọ nwụọ n’ihi ọrụ Onyenwe anyị, o tinyekwara mkpụrụ obi ya n’ihe . . . ize ndụ, ka o wee jeere m ozi unu gaara ejere m ma a sị na unu nọ n’ebe a.”—Fil. 2:29, 30.

12. Gịnị nwere ike ịgụgụ ndị dara mbà n’obi?

12 Anyịnwa kwesịkwara ịna-agba ụmụnna anyị ume ma ha daa mbà n’obi. O doro anya na e nwere ihe ndị dị mma anyị nwere ike ikwu banyere ozi ha na-ejere Jehova. O nwere ike ịbụ na ha emeela nnukwu mgbanwe ná ndụ ha iji bụrụ Ndị Kraịst ma o bụ iji malite ije ozi oge niile. Obi kwesịrị ịdị anyị mma maka mbọ ndị ha na-agba, anyị kwesịkwara ịgwa ha na ihe ha na-eme dị Jehova mma. Ọ bụrụ na nká ma ọ bụ ọrịa emee ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi ghara ijecha ozi otú ha si ejebu, anyị kwesịrị ịna-akwanyere ha ùgwù maka ozi ha jeerela Jehova kemgbe ọtụtụ afọ. Ihe ọ sọkwara ya bụrụ ya kpatara nsogbu ha, ihe Jehova gwara ndị niile na-erubere ya isi bụ: “Na-agụgụnụ mkpụrụ obi dara mbà, na-akwadonụ ndị na-adịghị ike, na-enwenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ niile nọ.”—1 Tesa. 5:14.

“Jirinụ Obiọma Gbaghara Ya ma Kasie Ya Obi”

13, 14. (a) Olee ihe dị mkpa ọgbakọ Kọrịnt mere, gịnịkwa mere ha ji mee ya? (b) Gịnị ka nchụpụ a chụpụrụ nwoke ahụ n’ọgbakọ rụpụtara?

13 N’ọgbakọ Kọrịnt oge ochie, e nwere otu nwoke kpọrọ ekwo nkụ na-akwa iko. Àgwà ya mere ka ọgbakọ ahụ ghara ịdị ọcha, omume ya jọkwara njọ n’anya ndị na-ekweghị ekwe. Ọ bụ nke a mere Pọl ji kwuo ka a chụpụ ya n’ọgbakọ.—1 Kọr. 5:1, 7, 11-13.

14 Ahụhụ ahụ a tara ya rụpụtara ezigbo ihe. O mere ka ọgbakọ ahụ dị ọcha, meekwa ka nwoke ahụ na-akwa iko ghọta onwe ya wee chegharịa. N’akwụkwọ nke abụọ Pọl degaara ọgbakọ Kọrịnt, ọ gwara ha ka ha nabata nwoke ahụ n’ọgbakọ n’ihi na àgwà ya na-egosi na o chegharịala. Ma, ihe ha ga-eme abụghị naanị ịnabata ya. Pọl gwakwara ọgbakọ ahụ ka ha jiri “obiọma gbaghara [nwoke ahụ] ma kasie ya obi, ka onye dị otú ahụ wee ghara ịda mbà n’ụzọ ọ bụla n’ihi inwebiga mwute ókè.”—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 2:5-8.

15. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele onye meburu mmehie anya, bụ́ onye chegharịrị e wee nabata ya?

15 Gịnị ka anyị mụtara n’akụkọ a? Ọ na-ewute anyị ma a chụpụ mmadụ n’ọgbakọ. O nwere ike ịbụ na onye ahụ wetaara aha Chineke na ọgbakọ ya nkọcha. O nwekwara ike ịbụ na onye ahụ mehiere anyị. Ma, ọ bụrụ na ndị okenye ndị lebara okwu ya anya atụlechaa ihe Jehova kwuru ma kpebie na e kwesịrị ịnabata ya n’ihi na o chegharịala, ọ na-egosi na Jehova agbagharala ya. (Mat. 18:17-20) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iṅomi Jehova? Ọ bụrụ na iwe eju anyị obi ma ọ bụkwanụ anyị ajụ ịgbaghara onye ahụ, ọ pụtara na anyị na-emegide Jehova. Iji nye aka mee ka ọgbakọ Chineke dịrị n’otu dịrịkwa n’udo wee nwee ihu ọma Jehova, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ‘igosi na anyị hụrụ onye meburu mmehie n’anya,’ bụ́ onye chegharịrị n’eziokwu e wee nabata ya n’ọgbakọ?—Mat. 6:14, 15; Luk 15:7.

“Ọ Baara M Uru”

16. Olee ihe mere na ihe Mak mere adịghị Pọl mma?

16 Akụkọ ọzọ a kọrọ n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi na anyị ekwesịghị ịna-eburu ndị mere ihe na-adịghị anyị mma iwe n’obi. Dị ka ihe atụ, Jọn Mak mere ihe na-adịghị Pọl onyeozi mma. Gịnị ka o mere? Mgbe Pọl na Banabas malitere njem ozi ala ọzọ nke mbụ ha jere, Mak so ha na-enyere ha aka. Ma, o nwere ebe ha ruru, Jọn Mak ahapụ ha laa. Baịbụl agwaghị anyị ihe mere o ji mee nke a. Ihe o mere adịghị Pọl mma, nke a mekwara ka Pọl na Banabas nwee nghọtahie mgbe Banabas chọrọ ka Mak soro ha gaa njem ozi ala ọzọ nke abụọ. Pọl achọghị ka Mak soro ha gaa ebe ọzọ n’ihi ihe mere mgbe ha na-aga njem nke mbụ.—Gụọ Ọrụ 13:1-5, 13; 15:37, 38.

17, 18. Olee otú anyị si mara na Pọl na Mak kpeziri, gịnịkwa ka anyị nwere ike ịmụta na nke a?

17 N’agbanyeghị na Pọl ekweghị ka Mak soro ha, Mak ewebigaghị iwe ókè. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na o sooro Banabas gaa ozi ala ọzọ ebe ọzọ. (Ọrụ 15:39) Ihe Pọl dere banyere Mak mgbe ọtụtụ afọ gafere gosiri na Mak kwesịrị ntụkwasị obi. Pọl, bụ́ onye a tụrụ mkpọrọ mgbe ahụ na Rom, degaara Timoti akwụkwọ ozi ka ọ bịa. Pọl kwuru n’otu akwụkwọ ozi ahụ, sị: “Kpọrọ Mak ka gị na ya bịa, n’ihi na ọ baara m uru maka ije ozi.” (2 Tim. 4:11) N’eziokwu, o doola Pọl anya na Mak enweela ọganihu.

18 E nwere ihe anyị ga-amụta na nke a. Mak kpara àgwà ezigbo onye ozi ala ọzọ kwesịrị ịkpa. Ọjụjụ ahụ Pọl jụrụ na ọ gaghị eso ha na mbụ akụdaghị ya mmụọ. Ya na Pọl ji ozi Chineke kpọrọ ihe, ha agaghị buwere ibe ha iwe n’obi. Kama nke ahụ, Pọl mechara kwuo na Mak baara ya uru. Nke a na-egosi na ọ bụrụ na ụmụnna esee okwu ma mechaa kpezie, ha kwesịrị ịgbaghara ibe ha ma nọgide na-enyerịtara ibe ha aka ka ha na Chineke nọgide na-adị ná mma. Ọgbakọ anyị ga-adị n’otu ma anyị na-elekwasị anya n’ebe ụmụnna anyị na-eme nke ọma.

Gị na Ọgbakọ

19. Olee otú ndị niile nọ n’ọgbakọ ga-esi na-enyere ibe ha aka?

19 Enyemaka gị dị ụmụnna gị mkpa n’oge a “dị oké egwu, nke tara akpụ,” nke ha dịkwa gị mkpa. (2 Tim. 3:1) O nwere ike ọ bụghị mgbe niile ka ụmụnna anyị na-ama ihe ha ga-eme ma nsogbu bịara ha, ma, Jehova ma otú ọ ga-esi nyere ha aka. O nwekwara ike iji ndị anyị na ha nọ n’otu ọgbakọ, gụnyere gịnwa, mee ka ụmụnna anyị na-eme ihe ziri ezi. (Aịza. 30:20, 21; 32:1, 2) Ya mere, ka anyị na-echeta ume ahụ Pọl onyeozi gbara anyị, nke bụ́ “na-akasirịtanụ ibe unu obi ma na-ewulirịtanụ ibe unu elu, dị nnọọ ka unu na-eme.”—1 Tesa. 5:11.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mee ka okwukwe ụmụnna anyị sie ike?

• Olee ụdị ihe isi ike i nwere ike inyere ndị ọzọ aka ka ha die?

• Olee ihe mere enyemaka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ anyị ji dị anyị mkpa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 11]

Anyị nwere ike inyere nwanna anyị aka mgbe e nwere ihe na-esiri ya ike

[Foto dị na peeji nke 12]

Ọtụtụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa ndị nọ n’ọgbakọ ga-enwe nnọọ ọganihu ma e nyere ha aka