Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na-emeri Ihe Ọjọọ” Site n’Ijide Onwe Gị Mgbe A Kpasuru Gị Iwe

“Na-emeri Ihe Ọjọọ” Site n’Ijide Onwe Gị Mgbe A Kpasuru Gị Iwe

“Na-emeri Ihe Ọjọọ” Site n’Ijide Onwe Gị Mgbe A Kpasuru Gị Iwe

“Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, . . . kama jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.”—ROM 12:19, 21.

1, 2. Olee ezigbo ihe nlereanya Ndịàmà ụfọdụ nọ na-eme njem setịpụrụ?

NDỊÀMÀ JEHOVA iri atọ na anọ nọ na-aga ememme e ji arara alaka ụlọ ọrụ ha nye Jehova. Ụgbọelu ha ji na-aga nwere nsogbu nke mere ka ha gbuo ezigbo oge. Ihe kwesịrị iwe otu awa were awa iri anọ na anọ. Ha tara ezigbo ahụhụ n’otu ọdụ ụgbọelu nke dị n’ime ime obodo, bụ́ ebe a na-enweghị ihe oriri na mmiri ga-ezuru ndị mmadụ, enweghịkwa ezigbo ụlọ mposi. Ọtụtụ ndị nọ n’ụgbọelu ahụ malitere iwe ezigbo iwe wee na-abara ndị na-arụ n’ọdụ ụgbọelu ahụ mba. Ma, ụmụnna ndị ahụ nọ nnọọ jụụ.

2 Ụmụnna ndị ahụ mechara rute ebe ha na-aga mgbe ememme ahụ na-agwụzi agwụ. N’agbanyeghị na ike gwụchara ha, ha cheretụrụ mgbe a gbasara ka ha wee nwee ike ikele ụmụnna ndị nọ ebe ahụ ha gara. Mgbe e mechara, ha nụrụ na e nwere ndị hụrụ otú ahụ ha si nwee ndidi ma jide onwe ha. Otu n’ime ndị njem nọ n’ụgbọelu ahụ gwara ndị nwe ụgbọelu ahụ, sị: “A sị na ọ bụghị Ndị Kraịst iri atọ na anọ a nọ n’ụgbọelu a, a gaara enwe ọgba aghara n’ọdụ ụgbọelu a.”

Anyị Bi n’Ụwa E Nwere Ọtụtụ Ndị Na-ewe Iwe

3, 4. (a) Olee otú ụmụ mmadụ si malite iwe iwe ọkụ, kemgbe ole mgbe kwa ka nke a mewere? (b) Ken ọ̀ gaara enwe ike ijide onwe? Kọwaa.

3 Nsogbu e nwere n’ụwa ọjọọ a nwere ike ime ka ndị mmadụ na-ewe iwe. (Ekli. 7:7) Iwe a na-emekarị ka ndị mmadụ kpọọ ibe ha asị ma na-emeso ha ihe ike. Ọ na-eme ka agha na-ada n’etiti mba na mba, nakwa n’ime mba dị iche iche. Ọ na-akpatakwa nsogbu n’ọtụtụ ezinụlọ. Ọ bụghị taa ka iwe na ọgụ na mgba bidoro. Ken, bụ́ diọkpara Adam na Iv, gburu nwanne ya ọ tọrọ bụ́ Ebel n’ihi ekworo. Ken mere ihe ọjọọ a n’agbanyeghị na Jehova gwara ya ka o jide onwe ya, kwekwa ya nkwa na ya ga-agọzi ya ma o mee otú ahụ.—Gụọ Jenesis 4:6-8.

4 N’agbanyeghị na Ken ezughị okè, ọ garaghị egbu nwanne ya ma ọ bụrụ ọ chọghị igbu ya. Ọ gaara ejide onwe ya. Ọ bụ ya mere ikpe ji ma ya maka ihe ahụ o mere. N’otu aka ahụ, ijide onwe anyị mgbe a kpasuru anyị iwe nwere ike isiri anyị ike n’ihi na anyị ezughị okè. Nsogbu ndị ọzọ juru ebe niile na-eme ka ‘oge a dị oké egwu’ kakwuo njọ. (2 Tim. 3:1) Dị ka ihe atụ, ụkọ ego nwere ike ime ka obi na-ajọ anyị njọ. Ndị uwe ojii na òtù dị iche iche ndị na-enye ezinụlọ ndụmọdụ kwuru na ọ bụ iwe ọkụ na nsogbu ezinụlọ mere ka e nwee nsogbu akụnụba e nwere taa.

5, 6. Olee otú ụwa si ele iwe anya, oleekwa otú anyị nwere ike isi na-eme ka ha?

5 Ihe ọzọkwa bụ na ọtụtụ ndị anyị na ha na-emekọ ihe taa bụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya,” “ndị mpako,” nakwa “ndị na-eme ihe ike.” Ọ dị mfe ịmụta àgwà ndị a, ha nwekwara ike ịkpasu anyị iwe. (2 Tim. 3:2-5) A na-egosi na fim nakwa tiivi na mmadụ kwesịrị imegwara onye mere ya ihe, na-egosikwa na ọgụ na mgba bụ ụzọ e kwesịrị isi na-edozi nsogbu. Ka ị na-ele fim ụfọdụ, ị ga na-atụ anya mgbe otu dike nọ na fim ahụ ga-emesi otu agamevu ike, nke na-abụkarị ná ngwụcha nke fim ahụ.

6 Ihe nkiri ndị dị otú a anaghị akwado uche Chineke, kama ọ na-akwado “mmụọ nke ụwa” na nke onye obi ọjọọ na-achị ya, bụ́ Setan. (1 Kọr. 2:12; Efe. 2:2; Mkpu. 12:12) Mmụọ ahụ na-eme ka ụmụ mmadụ na-eme ihe ahụ́ ha na-ezughị okè chọrọ, bụ́ nke na-emegide mmụọ nsọ na mkpụrụ ya. N’eziokwu, ihe bụ́ isi a na-akụziri Ndị Kraịst bụ ka ha ghara imegwara mmadụ ihe. (Gụọ Matiu 5:39, 44, 45.) Oleezi otú anyị nwere ike isi na-eme ihe Jizọs kụziri?

Ihe Atụ Ndị Dị Mma na Ndị nke Na-adịghị Mma

7. Gịnị mere mgbe Simiọn na Livaị na-achịkwalighị iwe ha?

7 E nwere ọtụtụ ndụmọdụ na Baịbụl, bụ́ ndị na-agwa anyị otú anyị ga-esi na-ejide onwe anyị ma a kpasuo anyị iwe, e nwekwara ihe atụ ndị na-egosi ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na mmadụ ejide onwe ya nakwa ma ọ bụrụ na mmadụ ejideghị onwe ya. Tụlee ihe mere mgbe ụmụ Jekọb, bụ́ Simiọn na Livaị, bọrọ ọbọ n’ahụ́ Shikem n’ihi na o dinara nwanne ha nwaanyị bụ́ Daịna. Ha “wee nwee mwute na mmụọ ha, ha wee wee oké iwe.” (Jen. 34:7) Ihe ọzọ merenụ bụ na ụmụ Jekọb ndị nke ọzọ lụsoro ndị obodo Shikem hà ọgụ, kwakọrọ ihe ha hụrụ n’ebe ahụ, kpọrọkwa ma ndị inyom ma ụmụaka. O nwere ike ọ bụghị naanị n’ihi Daịna ka ha ji mee ihe a, eleghị anya ọ bụ mpako mere ha ji mee ya, ha chere na e ledara ha anya. Ha chere na Shikem emejọọla ha na nna ha bụ́ Jekọb. Ma, olee ihe Jekọb chere banyere ihe a ha mere?

8. Olee ihe akụkọ banyere Simiọn na Livaị na-egosi banyere ịbọ ọbọ?

8 Ọ ghaghị ịbụ na ihe mere Daịna wutere Jekọb nke ukwuu, n’agbanyeghị nke ahụ, ọ baara ụmụ ya ezigbo mba maka ọbọ ha bọrọ. Simiọn na Livaị gbalịrị igosi na ihe ha mere ziri ezi site n’ịsị: “Mmadụ ò kwesịrị imeso nwanne anyị nwaanyị ihe dị ka à ga-asị na ọ bụ akwụna?” (Jen. 34:31) Ma, ọ bụghị ebe a ka okwu ahụ biri n’ihi na ihe ahụ merenụ wutere Jehova. Mgbe ọtụtụ afọ gara, Jekọb buru amụma na ụmụ Simiọn na ụmụ Livaị ga-agbasasị n’Izrel n’ihi ihe ahụ ha abụọ ji iwe ọkụ mee. (Gụọ Jenesis 49:5-7.) N’eziokwu, ihe ha mere mere ka Chineke na nna ha wesa ha iwe.

9. Olee mgbe ọ fọrọ obere ka Devid jiri iwe mebie ihe?

9 Eze Devid emeghị ka Simiọn na Livaị. O nwere ọtụtụ ohere ịbọrọ onwe ya ọbọ, ma, o meghị otú ahụ. (1 Sam. 24:3-7) Ma, o nwere mgbe ọ fọrọ obere ka o jiri iwe mebie ihe. Otu nwoke bara ọgaranya onye aha ya bụ Nebal kparịrị ndị ikom Devid, n’agbanyeghị na ha chebeere ya atụrụ ya niile na ndị na-azụ ha. Ikekwe, ọ bụ n’ihi mkparị Nebal kparịrị ndị ikom Devid mere Devid ji gawa igbu ya na ezinụlọ ya. Mgbe Devid na ndị ikom ya na-aga igbu Nebal na ezinụlọ ya, otu nwa okorobịa gwara Abigel, bụ́ nwunye Nebal, bụ́ nwaanyị nwere uche, ihe merenụ, gwakwa ya ka o mee ihe ngwa ngwa. Abigel bukọtara ọtụtụ ihe ozugbo ma gawa ịhụ Devid. O ji obi umeala rịọ Devid ka o jiri maka Jehova gbaghara mkparị Nebal kparịrị ha. Devid ghọtara onwe ya ma kwuo, sị: ‘Ka gị onwe gị, bụ́ onye gbochiri m taa ịba n’ikpe ọmụma ọbara bụrụ onye a gọziri agọzi.’—1 Sam. 25:2-35.

Àgwà Ndị Kraịst

10. Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ele ịbọ ọbọ anya?

10 Akụkọ banyere Simiọn na Livaị na Devid na Abigel gosiri nnọọ na ọ na-ewute Jehova ma ọ bụrụ na mmadụ ejitelighị onwe ya wee megwara ihe e mere ya, gosikwa na ọ na-amasị ya ma ọ bụrụ na anyị na-agba mbọ na-eme udo. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ahụ ohere; n’ihi na e dere, sị: ‘Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ, ka Jehova kwuru.’ Ma, ‘ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri; ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ; n’ihi na site n’ime nke a, ị ga-ekpokwasị icheku ọkụ n’isi ya.’ Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.”—Rom 12:18-21. *

11. Olee otú otu nwanna nwaanyị si mụta otú o kwesịrị isi na-akpa àgwà ma a kpasuo ya iwe?

11 Anyị nwere ike ime ihe a Pọl dụrụ anyị n’ọdụ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị gwara otu okenye na manịja ọhụrụ e wetaara ha na-emeso ya mmeso ọjọọ. O kwuru na ihe ọ na-eme ya na-ewe ya iwe, na ya chọkwara ịgba arụkwaghịm. Okenye ahụ gwara ya ka o nwee ndidi. Ọ chọpụtara na nsogbu ahụ bịara ka njọ n’ihi na nwanna nwaanyị ahụ wesara manịja ahụ iwe maka otú o si kpaso ya àgwà. (Taị. 3:1-3) Okenye ahụ gwara ya na ọ bụrụgodị na ọ chọta ọrụ ọzọ, ọ ka kwesịrị ịgbanwe otú o si akpa àgwà ma ndị mmadụ kpaso ya àgwà ọjọọ. Ọ gwara ya ka o meso manịja ahụ ihe otú ọ ga-achọ ka e si na-emeso ya, dị ka Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-eme. (Gụọ Luk 6:31.) Nwanna nwaanyị ahụ kweere na ya ga-agbalị. Gịnị si na ya pụta? Ka oge na-aga, manịja ahụ gbanwere otú o si emeso nwanna nwaanyị ahụ ihe, o keledịrị ya maka ọrụ ọ na-arụ.

12. Olee ihe mere ọ ga-eji wute anyị, karịchaa, ma ọ bụrụ na nwanna anyị akpaso anyị àgwà ọjọọ?

12 Ọ gaghị eju anyị anya ma onye na-anọghị n’ọgbakọ kpaso anyị àgwà ọjọọ. Anyị ma na nsogbu juru n’ụwa Setan, marakwa na anyị ekwesịghị ikwe ka ndị ajọ omume na-akpasu anyị iwe. (Ọma 37:1-11; Ekli. 8:12, 13; 12:13, 14) Ma, ọ na-ewute anyị karịa ma nwanna anyị kpaso anyị àgwà ọjọọ. Otu Onyeàmà kwuru sị, “Otu ihe kacha siere m ike omume mgbe m batara n’ọgbakọ bụ ikwere na ndị Jehova ezughị okè.” Ebe ọ bụ na anyị ahapụla ụwa ebe ndị na-enweghị ịhụnanya juru wee bata n’ọgbakọ, anyị na-atụ anya ka ndị niile nọ n’ọgbakọ jiri obiọma na-emeso anyị ihe. N’ihi ya, ọ bụrụ na nwanna anyị, karịchaa, onye nwere ihe ùgwù n’ọgbakọ, agwa anyị okwu ọjọọ ma ọ bụ kpaso anyị àgwà ọjọọ, o nwere ike iwute anyị ma ọ bụkwanụ kpasuo anyị iwe. Anyị nwere ike ịjụ sị, ‘Olee otú onye Jehova ga-esi eme ụdị ihe a?’ N’ezie, ihe ndị dị otú a mere n’etiti Ndị Kraịst e tere mmanụ n’oge ndịozi. (Gal. 2:11-14; 5:15; Jems 3:14, 15) Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ụdị ihe a mee anyị?

13. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịgba mbọ dozie nsogbu anyị na ndị ọzọ nwere, oleekwa otú anyị kwesịrị isi na-eme nke a?

13 Nwanna nwaanyị ahụ anyị ka kwupụrụ okwu ya sịrị, “Amụtala m ikpe ekpere maka onye ọ bụla kpasuru m iwe. Nke a na-enyere m aka mgbe niile.” Dị ka anyị gụrụ na Baịbụl, Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere maka ndị na-akpagbu anyị. (Mat. 5:44) Ọ bụrụ na anyị ga na-ekpe ekpere maka ndị na-akpagbu anyị, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ikpe ekpere karị maka ụmụnna anyị? Dị nnọọ ka nna na-achọ ka ụmụ ya hụ ibe ha n’anya, otú ahụ ka Jehova si achọ ka ndị ohu ya nọ n’ụwa na ibe ha na-adị ná mma. Anyị na-atụ anya mgbe anyị niile ga-ebi n’udo ma na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi, Jehova na-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi na-eme nke ahụ ugbu a. Ọ chọrọ ka anyị na ibe anyị na-arụkọ ọrụ ya dị ebube ọnụ. N’ihi ya, ka anyị dozie nsogbu anyị na ndị ọzọ nwere ozugbo, ma ọ bụkwanụ anyị ‘eleghara mmejọ’ ahụ anya, ka anyị na ha wee ka dịrị n’udo. (Gụọ Ilu 19:11.) Kama ịgbara ụmụnna anyị ọsọ mgbe anyị na ha nwere nsogbu, anyị kwesịrị inyere ibe anyị aka ka ha nọgide n’etiti ndị Chineke, ya bụ, ime ka ha nọrọ ‘n’ogwe aka Jehova nke na-adịru mgbe ebighị ebi.’—Diut. 33:27.

Imeso Mmadụ Niile Ihe n’Ụzọ Dị Nwayọọ Na-arụpụta Ezigbo Ihe

14. Olee otú anyị nwere ike isi merie mbọ Setan na-agba ibute nkewa n’etiti anyị?

14 Setan na ndị mmụọ ọjọọ na-agbasi mbọ ike ka ha na-eweta nsogbu n’ezinụlọ nwere obi ụtọ nakwa n’ọgbakọ udo dị, ka anyị wee ghara ikwusa ozi ọma. Ha na-agbalị ịkpata nkewa, n’ihi na ha ma na nke a ga-emebiri anyị ihe. (Mat. 12:25) Ka anyị wee nwee ike imeri ha, anyị kwesịrị ime ihe Pọl dụrụ anyị n’ọdụ. Ọ sịrị: “Ohu nke Onyenwe anyị ekwesịghị ịlụ ọgụ, kama o kwesịrị ịbụ onye na-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ.” (2 Tim. 2:24) Cheta na ọgụ anyị na-alụ abụghị “megide ọbara na anụ ahụ, kama . . . megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ.” Ka anyị wee nwee ike imeri n’ọgụ a, anyị kwesịrị iyiri ihe agha ime mmụọ, nke gụnyere “ngwá ọrụ nke ozi ọma nke udo.”—Efe. 6:12-18.

15. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ndị na-abụghị ndị Jehova emegidewe anyị?

15 Ndị iro Jehova na-emegide nnọọ ndị ohu ya nọ n’udo. Ụfọdụ n’ime ndị iro ndị a na-alụso Ndịàmà Jehova ọgụ. Ndị ọzọ na-ekwutọ anyị n’akwụkwọ akụkọ ma ọ bụkwanụ n’ụlọikpe. Jizọs gwara ụmụazụ ya ka ha na-atụ anya nke a. (Mat. 5:11, 12) Olee ihe anyị kwesịrị ime banyere nke a? Anyị agaghị anwa anwa na-eji “ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ,” ma n’okwu ọnụ ma n’omume.—Rom 12:17; gụọ 1 Pita 3:16.

16, 17. Olee nsogbu otu ọgbakọ nwere?

16 N’agbanyeghị ihe ọ bụla Ekwensu na-eme anyị, ọ bụrụ na anyị “jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ,” anyị nwere ike ịgbara ndị ọzọ ezigbo àmà. Dị ka ihe atụ, otu ọgbakọ dị n’otu agwaetiti dị na Pasifik nwetara otu ụlọ ezumezu ha ga-anọ echeta ọnwụ Jizọs. Mgbe ndị isi chọọchị nụrụ nke a, ha gwara ndị ụka ha ka ha zukọta n’ụlọ ezumezu ahụ ka ha malite ụka ha n’otu oge ahụ anyị ji echeta ọnwụ Jizọs. Ma, onyeisi ndị uwe ojii gwara ndị isi chọọchị ahụ ka ha hụ na ha anọchirighị Ndịàmà Jehova n’ụlọ ezumezu ahụ. Ma, mgbe oge ruru, ndị chọọchị juru n’ụlọ ahụ, ha malitekwara ụka ha.

17 Ka ndị uwe ojii na-achọ ka ha chụpụ ha n’ike, onyeisi chọọchị ahụ bịakwutere otu n’ime ndị okenye anyị ma jụọ ya, sị: “Ò nwere ihe pụrụ iche unu chọrọ ime ebe a ná mgbede a?” Nwanna ahụ gwara ya banyere Ncheta Ọnwụ Jizọs ha chọrọ ime, nwoke ahụ agwa ya sị: “Ewoo, amaghị m!” Mgbe o kwuru nke a, otu onye uwe ojii ji iwe gwa ya, sị: “Ma anyị gwara gị n’ụtụtụ a!” Nwoke ahụ lere nwanna anyị anya wee chịa ọchị aghụghọ, jụọ ya, sị: “Oleekwanụ ihe unu ga-emenụ ugbu a? Ndị mmadụ ejula n’ụlọ a. Ùnu ga-ekwenụ ka ndị uwe ojii chụpụ anyị?” O ji aghụghọ kwuo nke a ka o yie ka ọ̀ bụ Ndịàmà na-emegide ha! Olee ihe ụmụnna anyị ga-eme?

18. Olee ihe ụmụnna anyị mere mgbe a chọrọ ha okwu, gịnịkwa ka nke a rụpụtara?

18 Ụmụnna anyị kwere ka ndị chọọchị ahụ jiri iri nkeji atọ mee ihe ha chọrọ ime, ha mechaa, hanwa ebido Ncheta Ọnwụ Jizọs. Chọọchị ahụ riri oge, ma, mgbe ha gbasara, ụmụnna mere Ncheta Ọnwụ Jizọs. N’echi ya, ndị ọchịchị hiwere òtù nke ga-achọpụta ihe kpatara ihe ahụ ji mee. Mgbe ha mechara nchọpụta, òtù ahụ gwara ndị chọọchị ka ha gwa ọha na eze ihe kpatara nsogbu ahụ, na ọ bụghị Ndịàmà Jehova kama ọ bụ onyeisi chọọchị ahụ. Ndị òtù ahụ kelekwara Ndịàmà Jehova maka otú ha si nwee ndidi mgbe e nwere nsogbu ahụ. Mbọ a Ndịàmà ahụ gbara ka ha na “mmadụ niile dịrị n’udo” rụpụtara ezigbo ihe.

19. Olee ihe ọzọ nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ dịrị n’udo?

19 Ihe ọzọ nke ga-eme ka mmadụ na ibe ya dịrị n’udo bụ ịgwa ndị ọzọ okwu ọma. Isiokwu na-eso nke a ga-egosi ihe okwu ọma bụ nakwa otú anyị nwere ike isi mụta ikwu ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 “Icheku ọkụ” e kwuru okwu ya bụ ihe e ji agbaze ọla n’oge ochie. A na-edebe ọla n’elu icheku ọkụ, wụkwasịkwa ọzọ n’elu ya ka e wee nwee ike ịnụcha ya ma mee ka ezigbo ọla pụta. Ọ bụrụ na anyị emeere ndị na-akpaso anyị àgwà ọjọọ ihe ọma, nke a nwere ike ime ka ha gbanwee àgwà ha.

Ì Nwere Ike Ịkọwa?

• Olee ihe mere ndị nọ n’ụwa taa ji ewe oké iwe?

• Olee ihe atụ ndị dị na Baịbụl, bụ́ ndị na-egosi ihe na-eme ma ọ bụrụ na mmadụ achịkwaa iwe ya ma ọ bụkwanụ ghara ịchịkwa iwe ya?

• Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na Onye Kraịst ibe anyị emee ihe wutere anyị?

• Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ndị na-abụghị ndị Jehova emegidewe anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16]

Simiọn na Livaị esi n’ebe ha gara gbuo ndị mmadụ n’ihi iwe lọta

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ọ bụrụ na anyị egosi ndị ọzọ obiọma, o nwere ike ime ka ha gbanwee otú ha si ele anyị anya