Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ịhụnanya Mere Ka Ha Dị n’Otu—Akụkọ Banyere Nzukọ A Na-enwe Kwa Afọ

Ndị Ịhụnanya Mere Ka Ha Dị n’Otu—Akụkọ Banyere Nzukọ A Na-enwe Kwa Afọ

Ndị Ịhụnanya Mere Ka Ha Dị n’Otu—Akụkọ Banyere Nzukọ A Na-enwe Kwa Afọ

IHE karịrị puku mmadụ ise ndị zukọtara n’Ụlọ Mgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Jesi Siti, Niu Jesi, nke dị n’Amerịka, n’ụtụtụ Ọktoba 3, 2009, nwere obi ụtọ dị ukwuu. Ha zukọtara maka nzukọ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania na-enwe kwa afọ. Nke a bụ nke otu narị na iri abụọ na ise ya. Ọtụtụ puku ndị ọzọ ndị nọ n’ebe atọ ndị Betel bi n’Amerịka nakwa n’alaka ụlọ ọrụ dị na Kanada lere ya na tiivi. Mmadụ niile dị puku iri na atọ, narị abụọ, na iri atọ na ise, bụ́ ndị ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova nọ mere ka ha dị n’otu, nwere obi ụtọ na ha bịara nzukọ ahụ were awa atọ.

Nwanna Jiofri Jaksịn, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, bụ onyeisi oche nke nzukọ ahụ. O meghere nzukọ ahụ site n’ịkpọpụta ụfọdụ ndị Betel bụ́ ndị bụrụ abụ ụfọdụ dị n’akwụkwọ abụ ọhụrụ anyị. Onye duziri ndị ahụ bụrụ abụ bụ onye ọzọ so n’Òtù Na-achị Isi, bụ́ Devid Splen. O bu ụzọ kọwatụ uru abụ bara n’ofufe anyị na-efe Jehova. A gwara ndị niile bịara nzukọ ahụ ka ha soro bụọ abụ atọ n’ime abụ ọhụrụ anyị; ndị Betel ahụ bu ụzọ bụọ ha, ndị niile bịaranụ esorozie ha. Ọ bụ naanị maka nzukọ a pụrụ iche ka e ji bụọ abụ ndị a otú a; ọ bụghị otú a ka a ga-esi na-abụ ha n’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ dị iche iche.

Akụkọ Ndị Si Alaka Ụlọ Ọrụ Dị Iche Iche

Ndị so na Kọmitii Alaka si esi bịa kọrọ otú ọrụ anyị si na-aga ná mba ise. Kenet Lịtụl kwuru na n’oge na-adịghị anya, alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Kanada ga-amalite ibiri mba Amerịka na Kanada ihe ka ukwuu na magazin ha, nke a ga-amụba ọrụ alaka ụlọ ọrụ ahụ na-arụ okpukpu iri. Ka nke a wee kwe omume, e butere ìgwè obibi akwụkwọ ọhụrụ nke ga na-arụ ọrụ ugboro abụọ n’ụbọchị, ya bụ, awa iri na isii kwa ụbọchị.

Reina Tọmsịn kọrọ otú ọrụ anyị si na-aga na Dọminikan Ripọblik, ebe Albat Oli kọrọ otú ọrụ anyị si aga na Naịjirịa. Emil Kritzinga, onye si Mozambik, kọrọ na mgbe a kwụsịrị mkpagbu a kpagburu Ndịàmà Jehova ọtụtụ afọ ná mba ahụ, e debara aha anyị n’akwụkwọ n’afọ 1992. Ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa nọ ná mba atọ a amụbaala nke ukwuu n’oge na-adịbeghị anya. Viv Moriz, bụ́ onye si alaka ụlọ ọrụ Ọstrelia, kọrọ ihe ndị na-eme n’Ist Timọ, bụ́ obodo alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Ọstrelia na-elekọta.

Kọmitii Ndị E Nwere n’Òtù Na-achị Isi

N’afọ 1976, e hiwere kọmitii isii nke Òtù Na-achị Isi, bụ́ ndị na-elekọta ọrụ niile Ndịàmà Jehova na-arụ. Ka oge na-aga, a họpụtara ụfọdụ ndị so n’atụrụ ọzọ ka ha na-enyere ha aka. Ugbu a, e nwere mmadụ iri abụọ na atọ na-enyere ha aka. A gbara mmadụ isii n’ime ha ajụjụ ọnụ. Afọ niile ha nọrọla n’ozi oge niile bụ narị afọ atọ na iri anọ na otu, nke pụtara na onye ọ bụla n’ime ha anọọla ihe dị ka afọ iri ise na asaa.

Dọn Adams, bụ́ onye bịara Betel n’afọ 1943, kwuru na ndị nọ na Kọmitii nke Ndị Na-ahazi Ọrụ bụ ndị nlekọta nke kọmitii ise ndị nke ọzọ. Kọmitii a na-ahụ na kọmitii ise ndị nke ọzọ na-arụkọ ọrụ ọnụ. Kọmitii a na-agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka mgbe ha nwere nnukwu nsogbu, ha na-ahụkwa banyere ndị a na-akpagbu, okwu dị n’ụlọikpe, ọdachi, nakwa ihe ndị ọzọ e kwesịrị ime ihe ngwa ngwa banyere ha, bụ́ ndị metụtara Ndịàmà Jehova n’ụwa niile.

Dan Molchan kọwara ihe bụ́ ọrụ Kọmitii Na-ahụ Maka Ndị Na-arụ Ọrụ na Betel. O kwuru na ha na-ahụ maka ihe ime mmụọ na nke anụ ahụ́ nke ndị Betel dị puku iri na itoolu, narị asatọ, na iri ise na otu n’ụwa niile. Devid Sinklee kwuru otú Kọmitii Mbipụta si ahụ maka ịzụtara alaka dị iche iche ngwá ọrụ. Onye ọzọ kwuru okwu bụ Rọbọt Wọlin, bụ́ onye jerela ozi ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri isii na Betel. O kwuru otú Kọmitii Ije Ozi si elekọta ọrụ nkwusa ndị Jehova na-arụ nakwa otú o si ahụ maka ihe na-eme n’ọgbakọ. Wiliam Malenfant kọwara otú Kọmitii Izi Ihe si na-arụsi ọrụ ike ịkwadebe maka mgbakọ. N’ikpeazụ, Jọn Wischọk kwuru otú Kọmitii Ide Ihe si ahụ maka ịkwadebe na ịhazi ihe ndị a ga-ebipụta n’akwụkwọ anyị. *

Isiokwu Dịịrị Afọ 2010 Na-ekwu Banyere Ịhụnanya

Ọ bụ ndị so n’Òtù Na-achị Isi kwuru okwu atọ ọzọ. Gerit Lọsh malitere okwu ya site n’ịjụ, sị, “Ị̀ chọrọ ka ndị ọzọ hụ gị n’anya?” Ọ kọwara na ịhụnanya so n’ihe ndị kacha mkpa ụmụ mmadụ chọrọ, anyị niile na-emekwa nke ọma ma ọ bụrụ na a hụ anyị n’anya. Ihe mere anyị ji dịrị ndụ bụ na Jehova kere anyị maka na ọ hụrụ anyị n’anya. Ihe bụ́ isi mere anyị ji ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl bụ na anyị hụrụ Jehova n’anya.

Ọ bụrụ na anyị hụrụ ma ndị agbata obi anyị ma ndị iro anyị n’anya, anyị amara na anyị nwere ezigbo ịhụnanya. (Mat. 5:43-45) Nwanna Lọsh gwara ndị na-ege ntị ka ha chee echiche banyere ahụhụ Jizọs taara anyị. A pịara ya ihe, kwaa ya emo, gbụọ ya asọ mmiri, mapuokwa ya ahụ́. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, o kpere ekpere maka ndị agha ahụ kpọgburu ya. Ọ̀ bụ na nke a anaghị eme ka anyị hụkwuo ya n’anya? Nwanna Lọsh kwuziri na isiokwu dịịrị afọ 2010 bụ ‘Ịhụnanya na-atachi obi n’ihe niile. Ịhụnanya adịghị ada ada,’ nke sitere ná 1 Ndị Kọrịnt 13:7, 8. Olileanya anyị nwere abụghị naanị ịdị ndụ ebighị ebi, kama ọ bụ ịhụ ndị ọzọ n’anya na ịbụ ndị a hụrụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi.

Ị̀ Na-anya Ụgbọala Gị n’Enweghị Mmanụ Ụgbọala?

Samuel Hed ji ihe atụ malite okwu ya. Ka e were ya na otu enyi gị chọrọ iburu gị n’ụgbọala ka unu gaa ebe dị kilomita iri ise. Ka ị banyere, gị achọpụta na o nweghị mmanụ dị n’ụgbọala ahụ. Gị agwa enyi gị na mmanụ adịghị n’ụgbọala ya, ya asị gị enyela onwe gị nsogbu na mmanụ dị n’ụgbọala ahụ ka ruru lita anọ. Ma, n’oge na-adịghị anya, mmanụ ahụ ga-agwụ. Ị̀ ga-ekwe eso ya gbara na-aga ‘n’agbanyeghị ya mmanụ’ ka o liwe unu n’ụzọ? Ọ ga-aka mma ma unu gbajuo mmanụ n’ụgbọala ahụ. Anyị kwesịrị ịgbaju mmanụ n’ime onwe anyị, ya bụ, anyị kwesịrị ịma banyere Jehova nke ọma.

Ya mere, anyị kwesịrị ịna-agbanye mmanụ ga-ezuru anyị mgbe niile. E nwere ụzọ anọ anyị nwere ike isi mee nke a. Nke mbụ bụ site n’inwe ọmụmụ ihe onwe onye, anyị kwesịkwara ịma Baịbụl nke ọma site n’ịgụ ya kwa ụbọchị. Ọ bụghị naanị ịgụ ya agụ, anyị kwesịkwara ịghọta ihe anyị na-agụ. Nke abụọ bụ site n’inwe Ofufe Ezinụlọ. Ànyị na-agbaju mmanụ n’ime onwe anyị kwa izu ka ànyị na-agbara ntakịrị? Nke atọ bụ ịgachi ọmụmụ ihe anya. Nke anọ bụ ịnọ n’ebe a na-enweghị onye ma ọ bụ ihe ga-enye anyị nsogbu na-atụgharị uche banyere Jehova. Abụ Ọma 143:5 kwuru, sị: “Echetawo m oge dị anya gara aga; atụgharịwo m uche n’ọrụ gị dum.”

“Ndị Ezi Omume Ga-enwu Gbaa”

Jọn Baa kwuru okwu nke atọ, nke bụ́kwanụ nke ikpeazụ. Ọ kọwara ihe atụ ahụ Jizọs ji ọka wit na ata mee. (Mat. 13:24-30, 38, 43) Ihe atụ ahụ na-ekwu banyere “oge owuwe ihe ubi,” bụ́ mgbe a ga-achịkọta “ụmụ alaeze” ma chịpụ ata iche ka e wee kpọọ ha ọkụ.

Nwanna Baa mere ka o doo anya na a gaghị anọgide na-achịkọta ụmụ alaeze ruo mgbe ebighị ebi. O kwuru banyere ihe e dere na Matiu 24:34, bụ́ nke sịrị: “Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị ruo mgbe ihe ndị a niile mere.” Ọ gụrụ ihe a ugboro abụọ, sị: “O doro anya na ihe [Jizọs] nọ na-ekwu bụ na ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị nke ka nọ n’ụwa mgbe a malitere ịhụ ihe àmà ahụ n’afọ 1914, ga-anọrọ ndụ ruo mgbe ndị ọzọ e tere mmanụ ga-anọ n’ụwa, bụ́ ndị na-ahụghị mmalite nke ihe àmà ahụ ma ha ga-ahụ mmalite nke oké mkpagbu ahụ.” Anyị amaghị ogologo oge “ọgbọ a” ga-anọru. Ma, ọ ga-agụnye ụzọ ndị abụọ a e kwuru okwu ha, bụ́ ndị biri ndụ n’otu oge. N’agbanyeghị na afọ ndụ ha abụghị otu, ha dịkọrọ ndụ n’otu oge, ya bụ, n’oge ikpeazụ. Ọ bụ ihe na-akasi obi ịmara na ndị e tere mmanụ na-emebeghị agadi, bụ́ ndị ha na ndị nke nọ ndụ mgbe ihe àmà ahụ malitere n’afọ 1914 dịkọrọ ndụ, agaghị anwụcha tupu oké mkpagbu ahụ amalite.

“Ụmụ nke alaeze” na-atụsi anya ụgwọ a ga-akwụ ha ike, nke bụ́ ịga eluigwe. Ma, anyị niile kwesịrị ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi wee na-enwu gbaa ruo ọgwụgwụ. Anyị nwere nnọọ ezigbo ihe ùgwù ịhụ ka a na-achịkọta “ọka wit” n’oge anyị.

Mgbe a bụchara abụ mmechi, Tiodọọ Jarak, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, kpere ekpere mmechi. Ihe omume ahụ gbara mmadụ niile bịara nnọkọ ahụ ume n’ezie.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ị chọọ ịgụ ebe a kọwara ọrụ kọmitii dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi, gaa n’Ụlọ Nche nke Mee 15, 2008, peeji nke 29.

[Igbe dị na peeji nke 5]

ỤLỌ AKWỤKWỌ MAKA NDỊ OKENYE

Ná nzukọ ahụ, Antoni Moris, onye so n’Òtù Na-achị Isi, mara ọkwa na a ga na-enye ndị okenye ọgbakọ ọzụzụ. Ụlọ akwụkwọ maka ndị okenye nọ n’Amerịka malitere ná mbido afọ 2008 n’ebe agụmakwụkwọ dị na Patasịn, Niu Yọk. Klas nke iri asaa na abụọ ka gụchara akwụkwọ n’ebe ahụ, a zụọkwala puku ndị okenye isii, narị asaa, na iri abụọ na ya. A ka nwere ọtụtụ ndị a ga-azụ. Ndị okenye e nwere naanị n’Amerịka karịrị puku iri asatọ na isii. N’ihi ya, Òtù Na-achị Isi kpebiri ka e bido ụlọ akwụkwọ ọzọ na Bruklin, Niu Yọk, malite na Disemba 7, 2009.

A ga-eji ọnwa abụọ zụọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị anọ na Patasịn ka ha bụrụ ndị nkụzi. A zụchaa ha, a ga-akpọga ha Bruklin ka ha kụziwe ihe, a ga-azụkwa mmadụ anọ ọzọ. Ha ga-akụziwezi ihe n’ụlọ akwụkwọ dị na Bruklin, ndị nkụzi anọ ndị nọbu ebe ahụ ga-aga kụziwe n’ụlọ akwụkwọ ndị nke a ga-enwegasị n’Ụlọ Mgbakọ nakwa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. A ga na-eme nke a ruo mgbe e nwere ndị nkụzi iri na abụọ ga na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ isii kwa izu n’asụsụ Bekee n’Amerịka. A ga-azụkwa ndị nkụzi anọ ga na-akụzi ihe n’asụsụ Spanish. Ụlọ akwụkwọ a agaghị anọchi anya Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze e nwere ugbu a; ihe mere e ji hiwe ya bụ ka e wee nyere ndị okenye aka inwekwu ọganihu. Alaka ụlọ ọrụ dị iche iche ga-amalite inwe ụlọ akwụkwọ nke ha n’Ụlọ Mgbakọ nakwa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche n’afọ ije ozi nke 2011.

[Foto dị na peeji nke 4]

E ji abụ sitere n’abụ ọhụrụ anyị bụ́ “Bụkuo Jehova Abụ” malite nzukọ a a na-enwe kwa afọ