Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nweta Ume Site n’Ime Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ife Jehova

Nweta Ume Site n’Ime Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ife Jehova

Nweta Ume Site n’Ime Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ife Jehova

“Nyaranụ yok m, . . .  mkpụrụ obi unu ga-enweta ume.”—MAT. 11:29.

1. Gịnị ka Chineke mere ndokwa ya n’Ugwu Saịnaị, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

OTU n’ime ihe ndị a gwara ụmụ Izrel n’Iwu ahụ e nyere ha n’Ugwu Saịnaị bụ ka ha na-edebe Ụbọchị Izu Ike kwa izu. Jehova si n’ọnụ onye na-ekwuchitere ya, bụ́ Mozis, gwa mba Izrel, sị: “Ụbọchị isii ka ị ga-arụ ọrụ gị; ma n’ụbọchị nke asaa, arụla ọrụ, ka ehi gị na ịnyịnya ibu gị wee zuo ike, ka nwa ohu gị nwaanyị na onye mbịarambịa wee nweta ume.” (Ọpụ. 23:12) Jehova ji ịhụnanya mee ndokwa ka ụmụ Izrel nwee ụbọchị ezumike iji “nweta ume” n’ihi na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi.

2. Olee uru idebe Ụbọchị Izu Ike baara ụmụ Izrel?

2 Ụbọchị Izu Ike ọ̀ bụ ụbọchị e ji atụrụ naanị ndụ? Mba, ihe ndị a na-eme n’ụbọchị ahụ so n’ihe ndị dị mkpa ụmụ Izrel na-eme iji fee Jehova. Idebe Ụbọchị Izu Ike na-eme ka ndị isi ezinụlọ nwee ohere ịkụziri ezinụlọ ha “ka ha debe ụzọ Jehova iji na-eme ezi omume.” (Jen. 18:19) Ọ na-emekwa ka ezinụlọ na ndị enyi nwee ohere ịnọkọ chebara ihe dị iche iche Jehova meere ha echiche, bụ́ nke na-eme ka ha na-enwekọ obi ụtọ ọnụ. (Aịza. 58:13, 14) Nke ka nke bụ na ọ na-egosi otú ndị mmadụ ga-esi nweta ezigbo ume mgbe Kraịst ga-achị otu puku afọ. (Rom 8:21) Olee otú nke a si gbasa oge a? Olee ebe ezigbo Ndị Kraịst, bụ́ ndị nwere mmasị ime ihe Jehova kwuru, ga-enweta ume? Oleekwa otú ha ga-esi nweta ya?

Nweta Ume n’Etiti Ụmụnna Gị

3. Olee otú Ndị Kraịst oge ochie si kwado ibe ha, gịnịkwa si na nke a pụta?

3 Pọl onyeozi kwuru na ọgbakọ Ndị Kraịst bụ “ogidi na ihe nkwado nke eziokwu.” (1 Tim. 3:15) Ndị Kraịst oge ochie kwadoro ibe ha site n’ịgba ha ume nakwa site n’iji ịhụnanya na-eme ka okwukwe ibe ha sie ike. (Efe. 4:11, 12, 16) Nleta ndị nọ n’ọgbakọ Kọrịnt gara leta Pọl mgbe ọ nọ n’Efesọs gbara ya ume. Pọl kwuru uru ọ baara ya mgbe ọ sịrị: ‘M na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ọnụnọ Stefanas na Fọtunetọs na Akeikọs nọ ya, n’ihi na ha emewo ka mmụọ m na mmụọ unu dị ọhụrụ.’ (1 Kọr. 16:17, 18) Mgbe Taịtọs gachara leta ụmụnna ya nọ na Kọrịnt, Pọl deere ọgbakọ ahụ akwụkwọ, sị: “Unu niile emewo ka mmụọ ya dị ọhụrụ.” (2 Kọr. 7:13) N’otu aka ahụ kwa, taa, Ndịàmà Jehova na-enweta ezigbo agbamume mgbe ha na ibe ha nọkọrọ.

4. Olee otú ọmụmụ ihe si eme ka anyị nwee ume?

4 O doro gị anya na anyị na-enwe obi ụtọ dị ukwuu ma anyị gaa ọmụmụ ihe. N’ebe ahụ ka anyị na-agbarịta “ibe anyị ume, onye ọ bụla site n’okwukwe nke ibe ya.” (Rom 1:12) Ụmụnna anyị adịghị ka ndị anyị na-ezute n’ụzọ mgbe ụfọdụ, ya bụ, ndị anyị na-amachaghị ndị ha bụ. Ha bụ ezigbo ndị enyi anyị, ndị anyị hụrụ n’anya ma na-akwanyere ùgwù. Anyị na-enweta ọṅụ na nkasi obi na-enweghị atụ mgbe anyị na-abịachi ọmụmụ ihe anya.—Faị. 7.

5. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ụmụnna anyị nwee ume mgbe anyị bịara mgbakọ?

5 Ebe ọzọ anyị na-enweta ume bụ ná mgbakọ ndị anyị na-aga kwa afọ. E wezụga na mgbakọ ndị a na-eme ka anyị nweta mmiri eziokwu nke na-enye ndụ nke dị n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, ha na-enyere anyị aka ‘imeghe obi’ anyị ka anyị na ndị ọzọ wee na-akpakọrịta. (2 Kọr. 6:12, 13) Ma, gịnịkwanụ ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị na-emekarị ihere nke na ọ na-esiri anyị ike ịga ndị ọzọ nso? Otu n’ime ụzọ anyị ga-esi mata ụmụnna anyị bụ iwepụta onwe anyị jeere ha ozi ná mgbakọ. Mgbe otu nwanna nwaanyị nyechaara ụmụnna bịara mgbakọ mba niile aka, o dere, sị: “Amaghị m ndị ọzọ bịara mgbakọ ahụ ma e wezụga ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi m ole na ole. Ma, mgbe m so na-arụ ọrụ mkpocha na nzacha, m matara ọtụtụ ụmụnna! Obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu!”

6. Olee otu n’ime ụzọ anyị nwere ike isi nweta ume ma anyị nọrọ ezumike?

6 Ụmụ Izrel na-aga Jeruselem ugboro atọ n’afọ iji mee ememme ha ji efe Jehova. (Ọpụ. 34:23) Ha na-ahapụkarị ugbo ha na ahịa ha wee jiri ụkwụ gaa ije ọtụtụ ụbọchị n’ụzọ bụ uzuzu uzuzu. N’agbanyeghị nke a, ndị gara Jeruselem na-enwe “oké ọṅụ” ka ndị nọ ebe ahụ “na-enye Jehova otuto.” (2 Ihe 30:21) Taa, ọtụtụ ndị ohu Jehova na-enwekwa nnukwu ọṅụ ma ha na ezinụlọ ha gaa leta Betel, bụ́ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị ha nso. Ì nwere ike ịga Betel mgbe ọzọ gị na ezinụlọ gị ga-eme njem ma unu nwee ezumike?

7. (a) Olee otú nnọkọ ntụrụndụ ga-esi mee ka anyị nweta ume ọhụrụ? (b) Olee ihe ga-eme ka nnọkọ anyị mee ka okwukwe anyị sikwuo ike, obi adịkwa anyị ụtọ mgbe ọ bụla anyị chetara ihe mere n’ụbọchị ahụ?

7 Anyị nwere ike inweta ume ma anyị na ezinụlọ anyị ma ọ bụkwanụ ndị enyi anyị nọkọọ ọnụ na-atụrụ ndụ. Eze Sọlọmọn, bụ́ nwoke ma ihe sịrị: “Ọ dịghị ihe dịịrị mmadụ mma karịa iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, meekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya.” (Ekli. 2:24) E wezụga na anyị na-enweta ume ma anyị na ụmụnna anyị nọkọọ na-atụrụ ndụ, anyị na ha na-adịkwukwa ná mma ka anyị na-amatakwu ha. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ụdị nnọkọ a mee ka okwukwe anyị sikwuo ike nakwa ka obi dị anyị ụtọ mgbe ọ bụla anyị chetara ihe mere n’ụbọchị ahụ, anyị kwesịrị ịhazi ya ka ọ dị ntakịrị, ka anyị wee mara ihe niile na-aga na ya, nke ka nke, ma ọ bụrụ na anyị ga-enye ndị ga-abịa ya mmanya na-aba n’anya.

Ozi Ọma Na-eme Ka Anyị Nweta Ume

8, 9. (a) Kwuo ihe dị iche n’ihe Jizọs kụziiri ndị mmadụ na nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii kụziiri ha. (b) Olee uru anyị na-erite mgbe anyị na-agwa ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl?

8 Jizọs ji ịnụ ọkụ n’obi jee ozi ọma, ọ gbakwara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha meekwa otú ahụ. Ihe ọ gwara ha gosiri na nke a bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” (Mat. 9:37, 38) Ozi Jizọs ziri ndị mmadụ mere ka ha nwee ume n’eziokwu; ọ bụ “ozi ọma” n’ezie. (Mat. 4:23; 24:14) Nke a dị nnọọ iche n’iwu ndị siri ike ndị Farisii manyere ndị Juu ka ha na-edebe.—Gụọ Matiu 23:4, 23, 24.

9 Mgbe anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, anyị na-agba ha ume ka ha na Chineke dịrị ná mma, anyị na-aghọtakwu eziokwu dị na Baịbụl, obi na-atọkwukwa anyị ụtọ na anyị ghọtara ya. Otu ọbụ abụ kwutere ya mgbe ọ sịrị: “Toonụ Jaa, n’ihi na ọ dị mma ịbụku Chineke anyị abụ olu ụtọ; n’ihi na ọ dị ụtọ.” (Ọma 147:1) Ì nwere ike inwekwu ọṅụ mgbe ị na-eto Jehova n’ihu ndị agbata obi gị?

10. Ihe na-egosi na anyị na-enwe ọganihu n’ozi ọma ọ̀ bụ otú ndị mmadụ si ege anyị ntị? Kọwaa.

10 Nke bụ́ eziokwu bụ na n’ebe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ege ntị n’ozi ọma anyị na-ezi, n’ebe ndị ọzọkwa, ha anaghị egecha ntị. (Gụọ Ọrụ 18:1, 5-8.) Ọ bụrụ na i bi n’ebe ndị mmadụ na-anaghị egecha ntị n’ozi ọma, gbalịa ka i na-elekwasị anya n’ihe dị mma i ji ozi ọma a na-arụzu. Cheta na mbọ ị na-agba ikwusa aha Jehova abụghị n’efu. (1 Kọr. 15:58) Ọ bụghị ma ndị mmadụ hà na-ege anyị ntị ma ọ bụkwanụ na ha anaghị ege na-ekpebi ma ànyị na-enwe ọganihu n’ozi ọma anyị na-ekwusa ma ọ bụ na anyị anaghị enwe. Ka obi sie anyị ike na Jehova ga-eme ka ndị niile nwere ezi obi nụ ozi ọma Alaeze ya.—Jọn 6:44.

Ofufe Ezinụlọ Na-eme Ka Anyị Nweta Ume

11. Olee ọrụ Jehova nyere ndị nne na nna, oleekwa otú ha nwere ike isi na-arụ ya?

11 Ọ bụ ndị nne na nna bụ́ ndị ohu Chineke ka ọ dịịrị ịkụziri ụmụ ha banyere Jehova na ụzọ ya niile. (Diut. 11:18, 19) Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna ị̀ na-ewepụta oge na-akụziri ụmụ gị banyere Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya? Ka i wee rụọ ọrụ a dị mkpa ma nyere ezinụlọ gị aka, Jehova ejirila akwụkwọ, magazin, vidio, na ihe ndị ọzọ a na-egere egere na-enye anyị nri ime mmụọ n’ụba, bụ́ nke na-eme ka anyị nweta ume.

12, 13. (a) Olee otú ezinụlọ dị iche iche nwere ike isi na-erite uru n’Ofufe Ezinụlọ ha na-enwe ná mgbede? (b) Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi mee ka ofufe ezinụlọ na-enye ezinụlọ ha ume?

12 E wezụga ihe ndị a, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, emeela ndokwa ka anyị nwee otu mgbede anyị ga-eji na-enwe Ofufe Ezinụlọ. Nke a bụ mgbede ezinụlọ ọ bụla na-ewepụta kwa izu iji na-amụ ihe. Ọtụtụ ndị achọpụtala na Ofufe Ezinụlọ emeela ka ezinụlọ ha dịrị n’otu, ha na Jehova adịrịkwa ná mma. Ma, olee otú ndị nne na nna nwere ike isi mee ka ofufe ezinụlọ na-enye ezinụlọ ha ume?

13 Mgbe a na-enwe Ofufe Ezinụlọ ekwesịghị ịbụ mgbe a ga-eji na-akpasu onye ọ bụla iwe. A si ka e kwuwe, anyị na-efe “Chineke bụ́ onye obi ụtọ,” ọ chọkwara ka anyị na-enwe obi ụtọ mgbe anyị na-efe ya. (1 Tim. 1:11; Fil. 4:4) Ndokwa a e mere ka anyị nwekwuo otu mgbede anyị ga-eji na-amụ Baịbụl kwa izu na-ewetara anyị ezigbo ngọzi. Ndị nne na nna kwesịrị ịchọpụta otú ka mma ha ga-esi na-akụziri ụmụ ha ihe ka ọ baa ha n’obi. Dị ka ihe atụ, otu ezinụlọ gwara nwa ha nwoke dị afọ iri bụ́ Brandọn ka o kwuo okwu n’isiokwu bụ́ “Olee Ihe Mere E Ji Kpọọ Setan Agwọ na Baịbụl?” Obi adịghị Brandọn mma na a kpọrọ Setan agwọ na Baịbụl n’ihi na ọ na-amasị ya ịhụ agwọ. Ezinụlọ ụfọdụ na-eji akụkọ dị na Baịbụl eme ihe ngosi, onye ọ bụla n’ime ha ana-eme ihe otu n’ime ndị e kwuru banyere ha n’akụkọ ahụ mere site n’ịgụ ihe onye ahụ kwuru na Baịbụl. Ha nwekwara ike iji ihe ọ bụla ọzọ mee ihe ngosi. Isi otú a akụzi ihe na-enye obi ụtọ, na-emekwa ka ụmụaka na-etinye ọnụ n’ihe a na-eme, ka ihe dị na Baịbụl wee bamie ha n’obi. *

Zere Ihe Ga-eme Ka Ị Daa Mbà n’Obi

14, 15. (a) Olee otú nsogbu na obi erughị mmadụ ala si ju ebe niile n’oge ikpeazụ a? (b) Olee nsogbu ndị ọzọ nwere ike ịbịara anyị?

14 N’oge ikpeazụ a nke jọgburu onwe ya, ọtụtụ ndị na-enwe nsogbu, obi anaghị erukwa ha ala. Enweghị ọrụ na ihe isi ike ndị ọzọ na-akpa ọtụtụ nde mmadụ aka ọjọọ. Ndị nke nwere ihe ha na-arụ na-ekwu na ha na-etinye ego ha na-arụta n’akpa puru epu, na ọ naghị abachara ezinụlọ ha uru. (Tụlee Hagaị 1:4-6.) Ike agwụla ndị ọchịchị na ndị ndú dị iche iche ka ha na-agbasi mbọ ike ịgbaso ihe ọjọọ dị iche iche na ndị mmadụ na-eyi ndị ọzọ egwu mgba. Obi anaghị ezu ọtụtụ ndị ike n’ihi mmehie ha.—Ọma 38:4.

15 Nsogbu nke ụwa Setan na-ewetara ụmụ mmadụ na-emetụtakwa ezigbo Ndị Kraịst. (1 Jọn 5:19) Mgbe ụfọdụ, Ndị Kraịst na-enwe nsogbu ndị ọzọ n’ihi na ha na-agba mbọ ka ha mee ihe dị Jehova mma. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu.” (Jọn 15:20) Ma, mgbe “a na-akpagbu anyị, . . .  a dịghị ahapụ anyị.” (2 Kọr. 4:9) Gịnị mere nke a ji bụrụ eziokwu?

16. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe obi ụtọ?

16 Jizọs sịrị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume.” (Mat. 11:28) Anyị na-enyefe Jehova onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ Jizọs chụrụ. Nke a na-enyere anyị aka inweta “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Kọr. 4:7) “Ihe inyeaka,” ya bụ, mmụọ nsọ, na-eme ka okwukwe anyị sie nnọọ ike nke na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị na-abịara anyị.—Jọn 14:26; Jems 1:2-4.

17, 18. (a) Olee ụdị mmụọ anyị kwesịrị izere? (b) Gịnị nwere ike ime anyị ma ọ bụrụ na anyị na-achụ ihe ụwa ọnwụ ọnwụ?

17 Taa, ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị ịnọ ná nche ka ụwa a nke hụbigara ihe ụtọ n’anya ókè ghara iduhie ha. (Gụọ Ndị Efesọs 2:2-5.) Ma ọ́ bụghị ya, “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ” nwere ike ịmata anyị n’ọnyà. (1 Jọn 2:16) Ma ọ bụkwanụ, anyị nwere ike na-eche na ime ihe anụ ahụ́ anyị chọrọ ga-eme ka anyị nweta ume. (Rom 8:6) Dị ka ihe atụ, ụfọdụ chere na ihe ga-enye ha obi ụtọ bụ ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ịṅụbiga mmanya ókè, ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, igwu egwuregwu ndị na-etinye ndụ mmadụ n’ihe ize ndụ na ihe ọjọọ ndị ọzọ. “Atụmatụ aghụghọ” Setan na-eme ka ndị mmadụ na-eche na ha na-enweta ume mgbe ha na-anaghị enweta ya.—Efe. 6:11.

18 Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị ihe ọjọọ dị na mmadụ iri ihe, ịṅụ ihe ma ọ bụkwanụ iji ihe ndị kwesịrị ekwesị na-atụrụ ndụ, ma ọ bụrụ na o mebigaghị ha ókè. Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ndị a bụrụ ihe mbụ ná ndụ anyị. Mmadụ imeru ihe n’ókè nakwa ijite onwe ya dị mkpa ugbu a n’ihi oge anyị bi na ya. Ọ bụrụ na anyị na-achọ inwetacha ihe ndị a anụ ahụ́ anyị chọrọ, anyị nwere ike “ghara ịbụ ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ n’ihe metụtara ezi ihe ọmụma banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.”—2 Pita 1:8.

19, 20. Olee otú anyị nwere ike isi nweta ezigbo ume?

19 Ọ bụrụ na anyị na-eme uche Jehova, anyị ga-amata na ihe ụtọ ọ bụla dị n’ụwa a anaghị adịte aka. Mozis matara nke a, anyị kwesịkwara ịmata ya. (Hib. 11:25) Nke bụ́ eziokwu bụ na ime uche Nna anyị nke eluigwe na-eme ka anyị nweta ezigbo ume, na-emekwa ka anyị nwee ezigbo ọṅụ na afọ ojuju.—Mat. 5:6.

20 Ka anyị nọgide na-enweta ume n’ife Jehova. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú a, anyị ga-ajụ “asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa, . . . ebe anyị na-echere olileanya ahụ nke na-enye obi ụtọ na ngosipụta dị ebube nke Chineke ukwu ahụ nakwa nke Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Kraịst Jizọs.” (Taị. 2:12, 13) Ya mere, ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-anya yok Jizọs site n’irubere ya isi na ime ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na anyị na-eme nke a, anyị ga na-enwe ezigbo obi ụtọ na ume!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú ọmụmụ ihe ezinụlọ nwere ike isi na-atọ ndị ezinụlọ ụtọ, ha ana-amụtakwa ihe na ya, gụọ Ozi Alaeze Anyị nke Mach 1991, peeji nke 4.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee otú ndị Jehova si enweta ume taa?

• Olee otú ozi ọma si eme ka anyị na ndị anyị na-ezi ya nwee ume?

• Olee ihe ndị isi ezinụlọ nwere ike ime ka ofufe ezinụlọ wee nyere ezinụlọ ha aka inweta ume?

• Olee ihe ndị nwere ike ime ka anyị daa mbà n’obi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ọ bụrụ na anyị anyara yok Jizọs, anyị ga-enwe ọtụtụ ihe ga na-enye anyị ume