Okwu Ọma Na-eme Ka Mmadụ na Ibe Ya Dịrị ná Mma
Okwu Ọma Na-eme Ka Mmadụ na Ibe Ya Dịrị ná Mma
“Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile.”—KỌL. 4:6.
1, 2. Olee ezigbo ihe okwu ọma otu nwanna kwuru rụpụtara?
OTU nwanna nwoke kwuru, sị: “Ka m na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ezigbo iwe were otu nwoke mgbe m rutere n’ụlọ ya. Ọnụ ya na ahụ́ ya malitere ịma jijiji n’ihi iwe. Eji m nwayọọ gbalịa ka m jiri Akwụkwọ Nsọ gwa ya ihe m bịara, ma nke a wekwuru ya iwe. Nwunye ya na ụmụ ya sooro ya na-akparị m, nke a mere ka m kpebie ịlawa. Agwara m ha na m ji obiọma bịa, chọọkwa iji obiọma laa. Agwara m ha ihe e dere ná Ndị Galeshia 5:22 na 23, bụ́ ebe e kwuru okwu banyere ịhụnanya, ịdị nwayọọ, njide onwe onye, na udo. M hapụziri ha lawa.
2 “Mgbe e mechara, ka m na-aga n’ụlọ ndị chere ụlọ ha ihu, ahụrụ m ezinụlọ ahụ ka ha nọ ọdụ na steepụ ụlọ ha. Ha sịrị m bịa. Ajụrụ m onwe m sị, ‘Oleekwa nke ha chọrọ ugbu a?’ Nwoke ahụ bu nnukwu iko mmiri oyi n’aka, ọ gbanyekwara m mmiri ka m ṅụọ. Ọ rịọrọ m ka m gbaghara ya maka mkparị ọ kparịrị m, jaakwa m mma n’ihi otú okwukwe m si sie ike. Anyị gawaara onwe anyị n’ebughịrị ibe anyị iwe n’obi.”
3. Olee ihe mere na anyị ekwesịghị ikwe ka ndị ọzọ kpasuo anyị iwe?
3 N’ụwa a nsogbu juru, anyị na-ahụkarị ndị iwe ji, ma mgbe anyị nọ n’ozi ọma ma mgbe anyị na-anọghị. Ọ bụrụ na anyị ahụ ndị dị otú a, anyị kwesịrị iji “obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu” meso ha ihe. (1 Pita 3:15) A sị na nwanna ahụ were iwe n’ihi otú onye ahụ ọ gara na nke ya si wesa ya iwe ma gwa ya okwu ọjọọ, nwoke ahụ agaraghị agbanwe obi ya; ikekwe iwe gaara ewekwu ya. Otú nwanna ahụ si jide onwe ya wee gwa ha okwu ọma mere ka ezi ihe si na nke ahụ pụta.
Olee Ihe Bụ́ Okwu Ọma?
4. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịna-ekwu okwu ọma?
4 Ma ndị anyị na ha na-emekọ ihe hà bụ ndị ụwa, ụmụnna anyị, ma ọ̀ bụ ndị ezinụlọ anyị, anyị kwesịrị ime ihe Pọl onyeozi dụrụ anyị n’ọdụ. Ọ sịrị: “Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.” (Kọl. 4:6) Ọ bụrụ na mmadụ na-ekwu okwu otú a, ya na ndị ọzọ ga na-akparịta ụka otú dị mma, ya na ha ga-adịkwa ná mma.
5. Olee ihe ezigbo mkparịta ụka na-abụghị? Nye ihe atụ.
5 Ọ dịghị mkpa na ị ga-ekwu ihe niile i chere ma ọ bụ otú ọ dị gị n’obi, karịchaa mgbe iwe na-ewe gị, ka mkparịta ụka gị na ndị ọzọ wee bụrụ nke ezigbo ya. Akwụkwọ Nsọ na-egosi na onye na-anaghị ejiteli onwe ya mgbe a kpasuru ya iwe nwere ike iche na ya dị ike, ma, ọ maghị na ya adịghị ike. (Gụọ Ilu 25:28; 29:11.) Mozis, onye “dị nnọọ umeala n’obi karịa” mmadụ niile nọ n’ụwa n’oge ya, nwere mgbe o kwere ka nnupụisi mba Izrel mee ka o wee oké iwe ma mee ihe na-ewetaraghị Chineke otuto. O doro anya na Mozis kwuru ihe dị ya n’obi, ma, nke a adịghị Jehova mma. Mozis duru ụmụ Izrel afọ iri anọ, ma, Jehova ekweghị ka o duba ha n’Ala Nkwa ahụ.—Ọnụ Ọgụ. 12:3; 20:10, 12; Ọma 106:32.
6. Gịnị ka ịchịkwa ire anyị pụtara?
6 Akwụkwọ Nsọ na-aja ndị na-ejiteli onwe ha mma, nakwa ndị na-eche okwu eche tupu ha ekwuo ya. “N’ọtụtụ okwu, mmehie anaghị ahapụ ịdị, ma onye na-achịkwa egbugbere ọnụ ya ji ezi uche eme ihe.” (Ilu 10:19; 17:27) Ma, na mmadụ kwesịrị ịchịkwa ire ya apụtaghị na onye ahụ agaghị na-ekwu okwu. Ọ pụtara na ‘okwu onye ahụ ga-adị n’amara,’ ya bụ, ọ ga-eji ire ya na-agba ndị ọzọ ume ọ bụghị iji ya na-akụda ha mmụọ.—Gụọ Ilu 12:18; 18:21.
“Oge Ịgbachi Nkịtị na Oge Ikwu Okwu”
7. Olee ụdị ihe ndị anyị na-ekwesịghị ịna-ekwu, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
7 Otú ahụ okwu anyị si kwesị ịdị ụtọ ná ntị mgbe anyị na-agwa ndị ọrụ ibe anyị na ndị anyị gara ozi ọma n’ụlọ ha okwu ka o kwesịrị ịdị mgbe anyị na-agwa ụmụnna anyị ma ọ bụ ndị ezinụlọ anyị okwu. Ọ bụrụ na mmadụ ejiri iwe kwuo okwu n’ebughị ụzọ chee ihe ga-esi na ya pụta, o nwere ike ịkpatara onye ahụ na ndị ọzọ nsogbu. O nwere ike ime ka onye ahụ, ma ọ bụ onye ọzọ, na Chineke ghara ịdị ná mma. O nwekwara ike ime ka obi ghara ịdị ndị o metụtara mma ma ọ bụkwanụ kpatara onye ahụ na ndị ọzọ ọrịa. (Ilu 18:6, 7) Ọ bụ ezughị okè na-akpata iwe, bụ́ ihe anyị kwesịrị ịna-achịkwa. Anyị ekwesịghị ịna-agwa ndị ọzọ okwu mkparị, na-akwa ha emo, na-elelị ha, ma ọ bụkwanụ kpọọ ha asị. (Kọl. 3:8; Jems 1:20) Àgwà ndị a nwere ike ime ka anyị na Jehova, nakwa ndị mmadụ ibe anyị, ghara ịdị ná mma. Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-eweso nwanne ya iwe ga-aza ajụjụ n’ụlọikpe; ma onye ọ bụla nke na-agwa nwanne ya okwu nlelị jọgburu onwe ya ga-aza ajụjụ n’Ụlọikpe Kasị Elu, onye ọ bụla nke na-asịkwa, ‘Gị onye nzuzu na-abaghị uru!’ a ga-atụba ya na Gehena bụ́ ebe ọkụ na-ere.”—Mat. 5:22.
8. Olee mgbe anyị kwesịrị ikwu otú ihe dị anyị n’obi, oleekwa otú anyị kwesịrị isi eme ya?
8 Ma, e nwere ihe ụfọdụ anyị kwesịrị ikwu okwu banyere ha. Ọ bụrụ na ihe otu nwanna kwuru ma ọ bụ ihe o mere gị na-ewe gị ezigbo iwe nke na ọ na-esiri gị ike ichefu ya, eburula ya iwe n’obi. (Ilu 19:11) Ọ bụrụ na mmadụ akpasuo gị iwe, jide onwe gị, meekwa ihe ndị i kwesịrị ime iji dozie nsogbu ahụ. Pọl dere, sị: “Anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara.” Ọ bụrụ na ihe ahụ ka na-enye gị nsogbu n’obi, jiri obiọma gakwuru onye ahụ n’oge kwesịrị ekwesị ka unu dozie ya. (Gụọ Ndị Efesọs 4:26, 27, 31, 32.) Jiri obiọma gwa nwanna ahụ otú ihe ahụ o mere dị gị n’obi. Ihe i kwesịrị iburu n’uche na-eme nke a bụ ka unu wee kpezie.—Lev. 19:17; Mat. 18:15.
9. Gịnị mere anyị ji kwesị ichere ka iwe anyị dajụọ tupu anyị agaa ka anyị na ndị anyị na ha nwere nsogbu dozie?
Ekli. 3:1, 7) Ihe ọzọkwa bụ na “obi onye ezi omume na-atụgharị uche iji zaa okwu.” (Ilu 15:28) Iji mee nke a, o nwere ike ịdị mkpa ka i chere ruo oge dị mma ka unu wee kwurịta nsogbu ahụ. Nsogbu ahụ nwere ike ịka njọ ma ọ bụrụ na unu ekwurịtawa ya mgbe iwe ka ji unu; ma, i kwesịghị ichere ruo ogologo oge.
9 Ma, i kwesịrị ịchọta oge dị mma ị ga-eji agakwuru ya. E nwere “oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Anyị na Ndị Ọzọ Ga-adị ná Mma Ma Ọ Bụrụ na Anyị Na-eme Amara
10. Olee otú imere ndị ọzọ ihe ọma nwere ike isi mee ka anyị na ha dịkwuo ná mma?
10 Okwu ọma na ezigbo mkparịta ụka na-eme ka mmadụ na ibe ya na-adị n’udo. N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ mee ka anyị na ndị ọzọ dịkwuo ná mma, nke a ga-eme ka anyị na ha na-ekwurịta okwu nke ọma. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi ọcha na obiọma na-emere ndị ọzọ ihe, ya bụ, na-achọ otú anyị ga-esi na-enyere ha aka, na-enye ha onyinye si n’ala ala obi, ma na-emere ha ihe ọma, o nwere ike ime ka anyị na ha na-akparịta ụka nke ọma. Nke a nwedịrị ike ‘ikpokwasị mmadụ icheku ọkụ n’isi,’ nweekwa ike ime ka onye ahụ kpawa àgwà ọma ndị ga-eme ka ọ dịrị unu mfe ikwurịta nsogbu unu nwere.—Rom 12:20, 21.
11. Olee otú Jekọb si gbaa mbọ ka ya na Isọ dịghachi ná mma, gịnịkwa si na ya pụta?
11 Nna ochie bụ́ Jekọb ghọtara na nke a bụ eziokwu. Ejima ya, bụ́ Isọ, wesara ya iwe nke mere ka ọ gbalaga n’ihi na ụjọ tụrụ ya na ọ ga-egbu ya. Mgbe ọtụtụ afọ gafere, Jekọb lọghachiwere. Isọ kpọọrọ narị ndị ikom anọ bịawa izute ya. Jekọb rịọrọ Jehova n’ekpere ka o nyere ya aka. Mgbe o kpechara, o zigaara Isọ ọtụtụ anụmanụ. Nke a mere ka udo dị. Mgbe ha zutere, obi Isọ agbanweela, ọ gbaara ọsọ gaa makụọ Jekọb.—Jen. 27:41-44; 32:6, 11, 13-15; 33:4, 10.
Jiri Okwu Ọma Na-agba Ndị Ọzọ Ume
12. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịna-agwa ụmụnna anyị okwu dị mma?
12 Ndị Kraịst na-efe Chineke, ọ bụghị mmadụ. Ma, ọ na-agụsi anyị agụụ ike ka anyị na ndị ọzọ dịrị ná mma. Okwu ọma anyị na-agwa ụmụnna anyị nwere ike ime ka ihe dịrị ha mfe. Ma, ọ bụrụ na anyị na-akatọkarị ha, o nwere ike ime ka ihe sikwuoro ha ike, ma ọ bụdị mee ka ụfọdụ chewe ma Jehova ọ̀ ka hụkwara ha n’anya. N’ihi ya, ka anyị gbalịsie ike na-agwa ndị ọzọ “okwu dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee mee ka ndị na-anụ ya nweta ihe dị mma.”—Efe. 4:29.
13. Gịnị ka ndị okenye kwesịrị iburu n’obi (a) mgbe ha na-enye ndụmọdụ? (b) mgbe ha na-ede akwụkwọ ozi?
13 Ọ bụ ndị okenye kacha kwesị ‘ịdị nwayọọ,’ kwesịkwa iji ịhụnanya na-emeso atụrụ Jehova ihe. (1 Tesa. 2:7, 8) Ọ bụrụ na ndị okenye achọọ ịdọ mmadụ aka ná ntị, ha kwesịrị ịgba mbọ “jiri nwayọọ” mee ya, ọbụnadị mgbe ha na-enye “ndị isi ike” ndụmọdụ. (2 Tim. 2:24, 25) Ndị okenye kwesịkwara ịna-ede okwu dị mma mgbe ha na-edegara ndị okenye nọ n’ọgbakọ ọzọ, ma ọ bụ alaka ụlọ ọrụ, akwụkwọ ozi. Ha kwesịrị ịdị obiọma, ma jiri akọ na-eme ihe, dị ka e kwuru na Matiu 7:12.
Ikwu Okwu Ọma n’Ezinụlọ
14. Olee ndụmọdụ Pọl nyere ndị bụ́ di, n’ihi gịnịkwa ka o ji nye ha ya?
14 Okwu ọnụ anyị, otú ihu dị anyị, na otú anyị si emegharị ahụ́, nwere ike imetụta ndị ọzọ nke ukwuu ma anyị agaghị ama. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ụmụ nwoke amaghị otú okwu ha na-ekwu si eru ụmụ nwaanyị n’ahụ́. Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị, “Ezigbo ụjọ na-ejide m ma di m jiri iwe na-abara m mbà.” Okwu e ji iwe kwuo nwere ike iwute nwaanyị karịa ka ọ ga-ewute nwoke, o nwekwara ike isiri ya ike ichefu. (Luk 2:19) Nke a na-aka njọ ma ọ bụrụ na onye gwara nwaanyị ahụ okwu ahụ bụ onye ọ hụrụ n’anya ma na-akwanyere ùgwù. Pọl dụrụ ndị bụ́ di ọdụ, sị: “Na-ahụnụ nwunye unu n’anya, unu ewesola ha oké iwe.”—Kọl. 3:19.
15. Nye ihe atụ iji gosi otú di kwesịrị isi jiri obiọma na-emeso nwunye ya.
15 Otu nwanna nwoke lụrụla nwaanyị ọtụtụ afọ ji ihe atụ kọwaa otú di kwesịrị isi jiri obiọma na-emeso nwunye ya ihe, dị ka “arịa na-esighị ike.” Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na i jiri ihe dị oké ọnụ ahịa nke na-awa awa, ị gaghị ejiri ike gị niile jide ya, ma ọ́ bụghị ya, ya awaa. Ọ bụrụgodị na ị nyachie ebe ahụ wara awa, a ka ga na-ahụ ya. Ọ bụrụ na di agwa nwunye ya okwu ọjọọ, nke a nwere ike igbu ya mmụọ. O nwekwara ike ibute nsogbu ga-adịte aka n’etiti ha.”—Gụọ16. Olee otú nwunye nwere ike isi wulite ụlọ ya?
16 Okwu onye ọzọ kwuru nwekwara ike ịgba ndị nwoke ume ma ọ bụkwanụ gbuo ha mmụọ. Nke ndị nwunye ha kwuru nwekwara ike ime otú ahụ. “Nwaanyị nke nwere uche,” ya bụ, nwaanyị di ya nwere ike ‘ịtụkwasị obi,’ anaghị achọ ikwu ihe ga-ewute di ya, dị nnọọ ka ọ na-agaghị achọ ka di ya gwa ya. (Ilu 19:14; 31:11) N’ezie, nwunye nwere ike ime ka ezinụlọ ya dị mma ma ọ bụkwanụ mee ka ezinụlọ ya tisaa. “Nwaanyị nke maara ihe n’ezie ewulitewo ụlọ ya, ma nwaanyị nzuzu na-eji aka ya akwatu ya.”—Ilu 14:1.
17. (a) Olee otú ụmụaka kwesịrị isi na-agwa ndị mụrụ ha okwu? (b) Olee otú ndị torola eto kwesịrị isi na-agwa ụmụaka okwu, n’ihi gịnịkwa?
17 Ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha kwesịkwara ịna-agwa ibe ha okwu ọma. (Mat. 15:4) Ọ bụrụ na anyị echee ihe anyị na-ekwu nke ọma mgbe anyị na-agwa ụmụaka okwu, ọ ga-eme ka anyị ghara ‘ịna-akpasu ha iwe.’ (Kọl. 3:21; Efe. 6:4) Ọ bụrụgodị na ndị nne na nna na ndị okenye achọọ ịdọ ụmụaka aka ná ntị, ha kwesịrị ịkwanyere ha ùgwù ma ha na-agwa ha okwu. Ọ bụrụ na ha emee otú a, ha ga-eme ka ọ dịrị ụmụaka mfe ịgbanwe ndụ ha, meekwa ka ha na Chineke na-adị ná mma. Ime otú a dị mma karịa ime ka ọ dị ha ka ànyị chere na ha enweghị mmekwata, bụ́ ihe ga-eme ka ha chewe na ha abaghị uru ọ bụla. E nwere ike ụmụaka agaghị echeta ndụmọdụ niile e nyere ha, ma ha ga-echeta otú ndị ọzọ si gwa ha okwu.
Iji Obi Ọcha Na-ekwu Ihe Dị Mma
18. Olee ihe ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ibu iwe n’obi?
18 Na ihu mmadụ agbụrụghị agbarụ apụtachaghị na obi dị onye ahụ mma. Ihe anyị Ndị Rom 12:2; Ndị Efesọs 4:23, 24.
kwesịrị iburu n’uche abụghị naanị ime ka iwe anaghị ewe anyị. Ọ bụrụ na anyị emee ihu ka iwe anaghị ewe anyị, ma ya abụrụ na obi adịghị anyị mma, ọ ga-eme ka obi na-agbawa anyị. Ọ dị ka ịgbado ụkwụ na brek ụgbọala nakwa n’ihe e ji enye ya ọkụ n’otu mgbe ahụ. Nke a ga-enye ụgbọala ahụ nsogbu ma mebie ihe na ya. N’ihi ya, eburula mmadụ iwe n’obi na-echere mgbe ị ga-eme ya ihe. Kpekuo Jehova ekpere ka o nyere gị aka ka ị ghara ịna-ebu iwe n’obi. Kwe ka mmụọ nsọ mee ka ihe dị gị n’uche na n’obi kwekọọ n’uche Jehova.—Gụọ19. Olee ihe ndị nwere ike inyere anyị aka ijide onwe anyị mgbe a kpasuru anyị iwe?
19 Na-eme ihe ụfọdụ ga-enyere gị aka ijide onwe gị. Ọ bụrụ na ị nọ n’ebe a kpasuru gị iwe, gị achọpụtakwa na iwe amalitela iju gị obi, gbalịa si ebe ahụ pụọ, nke a ga-eme ka iwe ahụ jiri nwayọọ dajụọ. (Ilu 17:14) Ọ bụrụ na onye gị na ya na-ekwu okwu amalite iwe iwe, gbalịa ka i jiri olu ọma gwa ya okwu. Cheta na “azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa, ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.” (Ilu 15:1) Ikwu okwu ọjọọ dị ka ịwụnye mmanụ n’ọkụ, ọ bụrụgodị na e jiri olu dị nwayọọ kwuo ya. (Ilu 26:21) N’ihi ya, mgbe a kpasuru gị iwe, gbalịa ka ị ghara ‘ikwu okwu ngwa ngwa na iwe iwe ngwa ngwa.’ Kpekuo Jehova ekpere ka mmụọ ya nyere gị aka ka ị na-ekwu okwu ọma, ọ bụghị okwu ọjọọ.—Jems 1:19.
Jiri Obi Gị Dum Na-agbaghara Ndị Ọzọ
20, 21. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ịgbaghara ndị ọzọ, oleekwa ihe mere anyị ji kwesị ime ya?
20 Ọ dị mwute na o nweghị onye nwere ike ịchịkwa ire ya mgbe niile. (Jems 3:2) N’agbanyeghị mbọ onye ọ bụla na-agba, mgbe ụfọdụ, ọbụna ndị ezinụlọ anyị na ụmụnna anyị nwere ike ịgbaghewe ọnụ kwuo okwu nke nwere ike ịkpasu anyị iwe. Kama iwewe iwe ozugbo, nwee ndidi ma chee ihe o nwere ike ịbụ ya mere ha ji kwuo ihe ha kwuru. (Gụọ Ekliziastis 7:8, 9.) Ọ̀ ga-abụ na obi adịchaghị ha mma, ka ọ̀ bụ na ụjọ ji ha, ka ọ̀ bụkwanụ na o nwere ihe ha na ya na-alụ?
21 Ihe ndị a emeghị ka ikwu okwu n’echeghị ya eche zie ezie. Ma, ọ bụrụ na anyị eburu ihe ndị a n’uche, ha ga-enyere anyị aka ịghọta ihe mere ndị mmadụ ji ekwu ihe ụfọdụ ha na-ekwesịghị ikwu ma ọ bụ eme ihe ha na-ekwesịghị ime, nke a ga-emekwa ka anyị nwee ike ịgbaghara ha. Anyị niile enweela mgbe anyị kwuru okwu ma ọ bụ mee ihe were ndị ọzọ iwe, chọọkwa ka ha jiri obiọma gbaghara anyị. (Ekli. 7:21, 22) Jizọs kwuru na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke gbaghara anyị, anyị aghaghị ịgbaghara ndị ọzọ. (Mat. 6:14, 15; 18:21, 22, 35) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịrịọ mgbaghara ngwa ngwa, kwesịkwa ịgbaghara ndị ọzọ ngwa ngwa. Ọ bụrụ na anyị emee otú a, anyị ga-eme ka ịhụnanya, bụ́ “ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu,” dịgide n’ezinụlọ anyị nakwa n’ọgbakọ.—Kọl. 3:14.
22. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịgba mbọ na-ekwu okwu ọma?
22 O nwere ike ịna-esikwuru anyị ike ịdị n’otu na inwe ọṅụ ka ụwa ochie a ndị iwe ji juru na-agwụcha. Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe dị n’Okwu Chineke, nke a ga-enyere anyị aka iji ire anyị na-ekwu okwu ọma, ọ bụghị okwu ọjọọ. Anyị na ndị nọ n’ọgbakọ anyị na ndị ezinụlọ anyị ga-adịkwu ná mma, omume anyị ga-emekwa ka ndị ọzọ mara Jehova, bụ́ ‘Chineke anyị bụ́ onye obi ụtọ.’—1 Tim. 1:11.
Ì Nwere Ike Ịkọwa?
• Olee ihe mere anyị ji kwesị iwepụta oge dị mma anyị ga-eji kwurịta nsogbu?
• Olee ihe mere ndị ezinụlọ ji kwesị ime ka ‘okwu ha dị n’amara’ mgbe ha na-agwa ibe ha okwu?
• Olee otú anyị nwere ike isi zere ikwu okwu ga-akpasu ndị ọzọ iwe?
• Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ịgbaghara ndị ọzọ?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 21]
Chere ka iwe gị dajụọ, chọtazie oge dị mma unu ga-eji kwurịta nsogbu unu nwere
[Foto dị na peeji nke 23]
Nwoke kwesịrị iji obiọma na-agwa nwunye ya okwu mgbe niile