Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmụrụ Anya Na-eme Ka Anyị Rụpụta Ezigbo Ihe

Ịmụrụ Anya Na-eme Ka Anyị Rụpụta Ezigbo Ihe

Ịmụrụ Anya Na-eme Ka Anyị Rụpụta Ezigbo Ihe

Ị̀ MỤ anya ka i wee nwee ike ikwusa ozi ọma n’ókèala ọgbakọ unu mgbe ọ bụla ohere ya dapụtara? Ụmụnna anyị ndị nọ na Tọku, bụ́ obodo dị mkpa nke nwere ọdụ ụgbọ mmiri na Finland, mụ anya. Nke a mere ka ha rụpụta ezigbo ihe.

N’oge na-adịbeghị anya, ụmụnna anyị ndị nọ na Tọku chọpụtara na o nwere ndị Eshia bịara obodo ahụ ka ha rụchaa otu nnukwu ụgbọ mmiri a na-arụ n’ebe ahụ. Ka oge na-aga, otu nwanna nwoke chọpụtara họtel ndị ọrụ ahụ bi. Ọ chọpụtakwara na bọs na-abịa na họtel ahụ n’isi ụtụtụ eburu ha ebuga n’ọdụ ụgbọ mmiri. Ọ gwara ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ Bekee dị na Tọku ozugbo.

Ndị okenye ọgbakọ ahụ chọpụtara na ọbịbịa ọtụtụ ndị ọrụ ndị si ala ọzọ bịara n’ebe ahụ bụ ohere dapụtara a ga-eji zie ha ozi ọma, n’egbughị oge, ha mere ndokwa pụrụ iche maka nke a. N’elekere asaa nke ụtụtụ Sọnde nke izu ahụ, ndị nkwusa iri gbakọtara n’akụkụ ebe bọs na-akwụsị n’ebe ahụ. O nweghị ndị ha hụrụ mgbe ha rutere. Ha malitere ịjụ ibe ha, sị: ‘Ọ̀ bụ na anyị abịaghị n’oge?’ ‘Hà ahapụla Tọku?’ Ka ha na-ajụ nke a, otu n’ime ndị ọrụ ahụ nke yi uwe mwụda, rutere ebe ahụ. Onye ọzọ esochie ya, ọtụtụ ndị ọzọ abịawakwa. N’oge na-adịghị anya, ìgwè ndị ọrụ ahụ eju ebe ahụ bọs na-akwụsị. Ndị nkwusa ahụ malitere izi ha ozi ọma, na-enyekwa ha akwụkwọ dị iche iche e biri n’asụsụ Bekee. Ihe ọma mere n’ụbọchị ahụ bụ na o were ndị ọrụ ahụ ihe dị ka otu awa ịbanyecha n’ụgbọala, bụ́ nke mere ka ụmụnna nwee ike izi ọtụtụ n’ime ha ozi ọma. Tupu ụgbọala ha apụọ, ụmụnna anyị enyela ha otu narị akwụkwọ nta na iri abụọ na isii, nakwa narị magazin atọ na iri abụọ na itoolu!

Ezigbo ihe nke si n’ozi ọma ahụ ha ziri pụta mere ka ụmụnna ndị ahụ kpebie na ha ga-agaghachi ebe ahụ n’izu ya ọzọ, mgbe ha na onye nlekọta sekit ga-anọ. N’otu ụbọchị mmiri na-ezo, mgbe o ji ọkara gafee elekere isii nke ụtụtụ, onye nlekọta sekit duziri nzukọ ozi ubi ndị nkwusa iri abụọ na anọ ewee gawa n’ebe ahụ bọs na-akwụsị. Na nke ugbu a, ha ji akwụkwọ ndị e biri n’asụsụ Tagalọg n’ihi na ha chọpụtara na ọtụtụ n’ime ndị ọrụ ahụ si Filipinz. Ndị ọrụ ahụ ji akwụkwọ ukwu asaa, iri akwụkwọ nta isii na itoolu, na narị magazin anọ na iri asaa na itoolu banye ụgbọala ndị buuru ha gawa n’ọdụ ụgbọ mmiri n’ụtụtụ ahụ. Cheedị otú obi si bụrụ ụmụnna ndị gara ozi ọma ahụ ọṅụ ọṅụ!

Tupu ndị ọrụ ahụ alaa mba ha dị iche iche, ụmụnna gara na họtel ndị ha nọ wee kọkwuoro ha banyere Alaeze Chineke. Ụfọdụ n’ime ha kwuru na Ndịàmà Jehova eziela ha ozi ọma ná mba ndị ọzọ ha garala. Ndị ọrụ ahụ kwuru na obi dị ha ụtọ otú ụmụnna ndị ahụ si gbaa mbọ bịa zie ha ozi ọma n’oge ahụ ha nọ Finland.

Ị̀ mụ anya ka i wee nwee ike iji ohere ọ bụla dapụtaranụ n’ókèala ọgbakọ unu na-ezi ozi ọma? Ị̀ na-agba mbọ izi ndị agbụrụ ọzọ ozi ọma? Ọ bụrụ na ị na-eme otú a, ị nwekwara ike izi ụdị ndị a ụmụnna anyị nọ na Tọku gakwuuru ozi ọma.

[Map/Foto dị na peeji nke 32]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

FINLAND

HELSINKI

Tọku