“Chebaranụ Ụdị Mmadụ Unu Kwesịrị Ịbụ Echiche”
“Chebaranụ Ụdị Mmadụ Unu Kwesịrị Ịbụ Echiche”
“Ebe a ga-esi otú a gbazee ihe ndị a niile, chebaranụ ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ echiche n’ihe banyere àgwà dị nsọ na omume ịsọpụrụ Chineke.” —2 PITA 3:11.
1. Olee ihe akwụkwọ ozi nke abụọ Pita degaara Ndị Kraịst n’oge ochie ji bụrụ agbamume bịara n’oge kwesịrị ekwesị?
MGBE Pita onyeozi dere akwụkwọ ozi nke abụọ o ji ike mmụọ nsọ dee, a kpagbuhiela ọgbakọ Ndị Kraịst nne, ma, nke a emeghị ka ha daa mbà ma ọ bụ mee ka ọnụ ọgụgụ ha belata. Nke a mere ka Ekwensu malite ịnwa ha n’ụzọ ọzọ, bụ́ ụzọ o sirila nwata ọtụtụ ndị. Pita kwuru na Setan na-agba mbọ ka o jiri ndị ozizi ụgha duhie ndị Chineke. ‘Anya ndị ozizi ụgha ahụ jupụtara n’ịkwa iko,’ ha nwekwara “obi a zụrụ azụ n’anyaukwu.” (2 Pita 2:1-3, 14; Jud 4) Pita ji akwụkwọ nke abụọ o dere gbaa anyị ume ka anyị nọgide na-eme uche Chineke.
2. Gịnị ka Pita nke abụọ isi atọ na-ekwu, oleekwa ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
2 Pita dere, sị: “Ebe m ka nọ n’ụlọikwuu a, echere m na o ziri ezi ịkpali unu site n’ichetara unu ihe ndị a, ebe unu maara dị ka m maara na iyipụ ụlọikwuu m adịla nso . . . Ya mere, m ga-agbalịsi ike ka unu wee nwee ike ikwu banyere ihe ndị a niile n’onwe unu n’oge ọ bụla mgbe m pụsịrị.” (2 Pita 1:13-15) N’eziokwu, Pita ma na ya ga-anwụ n’oge na-adịghị anya, ma, ọ chọrọ ka ụmụnna ya ghara ichefu ihe ndị ahụ ọ gwara ha n’oge kwesịrị ekwesị. Ihe ndị ahụ dị na Baịbụl, anyị niile nwekwara ike ịgụ ha taa. Isi atọ nke akwụkwọ ozi nke abụọ ahụ Pita dere gbasara nnọọ anyị, n’ihi na ọ na-ekwu banyere ‘oge ikpeazụ’ nke usoro ihe a nakwa mbibi nke eluigwe na ụwa ihe atụ. (2 Pita 3:3, 7, 10) Olee ndụmọdụ Pita nyere anyị? Oleekwa otú ime ihe ọ gwara anyị ga-esi mee ka anyị na Jehova dị ná mma?
3, 4. (a) Gịnị ka Pita kwuru, oleekwa ndụmọdụ o nyere anyị? (b) Olee ihe atọ anyị ga-atụle?
3 Mgbe Pita kwuchara banyere mgbaze ụwa Setan ga-agbaze, ọ sịrị: “Chebaranụ ụdị 2 Pita 3:11, 12) Pita ma na ọ bụ naanị ndị na-eme uche Jehova ma na-akpa àgwà na-amasị ya ka a ga-echebe ‘n’ụbọchị Chineke anyị ga-abọ ọbọ.’ (Aịza. 61:2) Ọ bụ ya mere o ji kwuokwa, sị: “Ya mere, ndị m hụrụ n’anya, ebe unu bu ụzọ mara ihe ndị a, kpacharanụ anya ka a ghara idufu unu na ha [ya bụ, ndị ozizi ụgha] site ná njehie nke ndị na-eleda iwu anya, unu ewee kwụsị iguzosi ike.”—2 Pita 3:17.
mmadụ unu kwesịrị ịbụ echiche n’ihe banyere àgwà dị nsọ na omume ịsọpụrụ Chineke.” (4 Ebe Pita so ná ndị “bu ụzọ mara ihe ndị a,” ọ ma na n’oge ikpeazụ, Ndị Kraịst ga-akpachara ezigbo anya ka ha wee nọgide na-eme uche Chineke. Ka oge na-aga, Jọn onyeozi kwuru ihe mere ha ga-eji mee otú a. Ọ hụrụ ọhụụ otú a ga-esi si n’eluigwe chụdata Setan nakwa otú ọ ga-esi na-eweso “ndị na-edebe ihe Chineke nyere n’iwu, ndị nwekwara ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs” “oké iwe.” (Mkpu. 12:9, 12, 17) Ndị ohu Chineke ndị na-erubere ya isi, bụ́ ndị e tere mmanụ, nakwa ndị enyi ha, bụ́ “atụrụ ọzọ” kwesịrị ntụkwasị obi, ga-emeri ya. (Jọn 10:16) Ma, oleekwanụ maka onye ọ bụla n’ime anyị? Ànyị ga-anọgide na-erubere Jehova isi? A ga-enyere anyị aka ime nke a ma ọ bụrụ na anyị na-agba mbọ (1) na-akpa àgwà e ji mara ndị Chineke, (2) na-eme omume dị ọcha ma na-efe Chineke n’ụzọ ọ na-anara nke ọma, (3) na-enwekwa echiche ziri ezi banyere ọnwụnwa. Ka anyị tụlee ihe ndị a.
Na-akpa Àgwà E Ji Mara Ndị Chineke
5, 6. Olee àgwà ndị anyị kwesịrị ịgba mbọ na-akpa, oleekwa ihe nke a ji chọọ “oké mgbalị”?
5 Pita dere ná mmalite nke akwụkwọ ozi ya nke abụọ, sị: “Gosinụ otú ọ dị unu n’obi site n’itinye oké mgbalị. Tụkwasịnụ omume ọma n’okwukwe unu, n’omume ọma unu, tụkwasịnụ ihe ọmụma, n’ihe ọmụma unu, tụkwasịnụ njide onwe onye, ná njide onwe onye unu, tụkwasịnụ ntachi obi, ná ntachi obi unu, tụkwasịnụ nsọpụrụ Chineke, ná nsọpụrụ Chineke unu, tụkwasịnụ ịhụnanya ụmụnna, n’ịhụnanya ụmụnna unu, tụkwasịnụ ịhụnanya. N’ihi na ọ bụrụ na ihe ndị a adịrị n’ime unu ma jubiga ókè, ha ga-eme ka unu ghara ịbụ ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ n’ihe metụtara ezi ihe ọmụma banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.”—2 Pita 1:5-8.
6 N’eziokwu, anyị ga-eme “oké mgbalị” ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe ndị ga-enyere anyị aka ịkpa àgwà e ji mara ndị Chineke. Dị ka ihe atụ, anyị aghaghị ịgba mbọ tupu anyị enwee ike ịna-aga ọmụmụ ihe niile, na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, ma ọ bụkwanụ na-enwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya. Anyị ga-arụsikwa ọrụ ike tupu anyị enwee ike ịna-enwechi Ofufe Ezinụlọ anya, na-enwekwa ya otú ọ ga-atọ onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ụtọ ma na-eme ka okwukwe ya sie ike. Ma, mgbe ọ bụla ime ihe ndị a maara anyị ahụ́, ha agaghịzi na-esiri anyị ike omume, karịchaa, mgbe anyị hụrụ uru dị na ha.
7, 8. (a) Olee ihe ụfọdụ ndị kwurula banyere Ofufe Ezinụlọ ha na-enwe ná mgbede? (b) Olee uru unu na-erite n’ofufe ezinụlọ unu na-enwe?
7 Otu nwanna nwaanyị dere banyere ofufe ezinụlọ, sị: “Ọ na-enyere anyị aka ịma ọtụtụ ihe.” Onye nke ọzọ asị: “Eziokwu m niile, achọghị m ka a kwụsị ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ. Ọ bụ ya kacha amasị m n’ọmụmụ ihe niile. Ma, ugbu a anyị malitere inwe Ofufe Ezinụlọ ka m chọpụtara na Jehova ma ihe dị anyị mkpa, marakwa mgbe anyị kwesịrị inweta ihe ahụ.” Otu onyeisi ezinụlọ sịrị: “Ofufe ezinụlọ na-enyere anyị nnukwu aka. Ọmụmụ ihe a amaka n’ihi na ọ na-enyere mụ na nwunye m aka ileba anya n’ihe anyị kwesịrị ịrụ ọrụ na ya. Anyị ma na ugbu a, anyị na-akpakwu àgwà na-egosi na anyị nwere mkpụrụ nke mmụọ nsọ, anyị na-enwekwa ọṅụ ugbu a n’ozi ọma karịa mgbe ọ bụla ọzọ.” Onye ọzọ bụ́ onyeisi ezinụlọ sịrị: “Ụmụ anyị ji aka ha na-eme nchọnchọ, ha na-amụtakwa ọtụtụ ihe, nke a dịkwa ha mma. Ndokwa a na-eme ka obi sie anyị ike na
Jehova ma ihe na-akpa anyị, na-azakwa ekpere anyị.” Obi ọ̀ dị gị otú a ọ dị ụmụnna ndị a banyere ndokwa a magburu onwe ya Jehova meere anyị?8 Ekwela ka ihe ndị na-enweghị isi gbochie unu inwe ofufe ezinụlọ. Otu di na nwunye kwuru, sị: “Kwa mgbede Tọzdee, kemgbe izu anọ gara aga, e nwere ihe na-eme n’ezinụlọ anyị nke na-afọ obere ka o gbochie anyị ịmụ ihe, ma, anyị ekweghị ka nke a mee.” Nke bụ́ eziokwu bụ na otu ihe nwere ike ịdapụta nke ga-eme ka unu nwee ofufe ezinụlọ mgbe unu na-ejibughị enwe ya. N’agbanyeghị nke a, kpebienụ na o nweghị izu unu na-agaghị enwe Ofufe Ezinụlọ.
9. Olee otú Jehova si kwado Jeremaya, oleekwa ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe nlereanya o setịpụrụ?
9 Jeremaya onye amụma setịpụụrụ anyị ezigbo ihe nlereanya. Nri ime mmụọ Jehova na-enye ya dị ya mkpa, o nwekwara nnukwu obi ụtọ maka ya. Nri ime mmụọ ahụ nyeere ya aka inwe ndidi mgbe ọ na-ezi ndị na-anaghị ege ya ntị ozi ọma. Ọ sịrị: “Okwu Jehova . . . dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro ụzọ n’ime ọkpụkpụ m.” (Jere. 20:8, 9) O nyekwaara ya aka idi ihe isi ike e nwere n’oge ahụ, bụ́ nke e nwegidere ruo mgbe e bibiri Jeruselem. Taa, anyị nwere Okwu Chineke e dere ede, nke zuru ezu. Ọ bụrụ na anyị na-amụ ya nke ọma ma na-ele ihe anya otú Chineke si ele ya, anyị ga-enwe ike iji ọṅụ na-ezisa ozi ọma, nweekwa ike ịnọgide na-erubere Chineke isi mgbe ọnwụnwa bịaara anyị, na-eme omume dị ọcha ma na-efe Chineke n’ụzọ ọ na-anara nke ọma, dị ka Jeremaya mere.—Jems 5:10.
Enwela ‘Ntụpọ na Mmerụ’
10, 11. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agbalịsi ike ka anyị ghara inwe ‘ntụpọ na mmerụ,’ oleekwa ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ime nke a?
10 Anyị bụ́ Ndị Kraịst ma na anyị bi n’oge ikpeazụ. Ya mere, ọ naghị atụ anyị n’anya na ihe na-amasị ụwa bụ ihe Jehova kpọrọ asị, ihe ndị dị ka anyaukwu, mmekọahụ rụrụ arụ, na ime ihe ike. Ihe bụ́ mkpa Setan bụ: ‘Ọ bụrụgodị na a gaghị eme ka ụjọ bịa ndị ohu Chineke, e nwere ike ime ka ha tinye aka n’ihe ọjọọ.’ (Mkpu. 2:13, 14) Ọ bụ nke a mere na anyị ekwesịghị ichefu ndụmọdụ Pita ji ịhụnanya nye anyị. Ọ sịrị: “Gbalịsienụ ike ka o wee hụ unu n’ikpeazụ dị ka ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-enweghị mmerụ na ndị nọ n’udo.”—2 Pita 3:14.
11 Okwu bụ́ “gbalịsienụ ike” yiri ihe ahụ Pita kwuru na mbụ mgbe ọ sịrị ka anyị tinye “oké mgbalị.” O doro anya na Jehova, bụ́ onye nyere Pita mmụọ nsọ o ji dee ihe ndị ahụ, ma na anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị ghara ịbụ ndị ụwa Setan rụrụ arụ mere ka ha nwee ‘ntụpọ ma ọ bụ mmerụ.’ Ọ bụrụ na anyị na-agbasi mbọ ike ka anyị ghara inwe ọchịchọ na-ezighị ezi, ọ na-egosi na anyị na-agbalịsi ike. (Gụọ Ilu 4:23; Jems 1:14, 15.) Ọ pụtakwara na anyị agaghị ekwe ka ndị otú anyị si ebi ndụ na-eju anya, ya bụ, ndị “na-ekwujọ [anyị],” duhie anyị—1 Pita 4:4.
12. Olee otú Luk 11:13 si eme ka obi sie anyị ike?
12 Ime ihe ziri ezi na-esiri anyị ike n’ihi na anyị ezughị okè. (Rom 7:21-25) Naanị ihe ga-eme ka anyị nwee ike ime ihe ziri ezi bụ ikpeku Jehova ekpere, bụ́ onye na-ewere nnọọ mmụọ nsọ ya nye ndị na-arịọsi ya ike. (Luk 11:13) Mmụọ ya ahụ na-eme ka anyị na-akpa àgwà ndị ga-eme ka anyị na ya dịrị ná mma. Ọ bụrụ na anyị na Chineke adịrị ná mma, anyị ga-enwe ike idi ọnwụnwa na nsogbu ndị na-abịara anyị, bụ́ ndị nwere ike ịna-ehiwanye nne ka ụbọchị Jehova na-abịaru nso.
Ka Ọnwụnwa Mee Ka Okwukwe Gị Sie Ike
13. Gịnị ga-enyere anyị aka idi ọnwụnwa mgbe ọ bụla ọ bịaara anyị?
13 O nweghị otú anyị ga-esi gbanahụ ọnwụnwa n’ụwa ochie a. Kama nke a ịkụda anyị mmụọ, anyị kwesịrị iwere na ọ bụ otú anyị si egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya nakwa otú anyị ga-esi mee ka okwukwe anyị nwere na Chineke nakwa n’Okwu ya sikwuo ike. Jems, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs dere, sị: “Gụọnụ ya n’ihe ọṅụ, ụmụnna m, mgbe unu zutere ọnwụnwa dị iche iche, ebe unu maara na okwukwe unu nke a nwalere anwale otú a na-arụpụta ntachi obi.” (Jems 1:2-4) Chetakwa na “Jehova maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa.”—2 Pita 2:9.
14. Olee otú ihe nlereanya Josef si agba gị ume?
14 Tụlee ihe banyere nwa Jekọb, bụ́ Josef, onye ụmụnne ya rere ka ọ ga gbawa ohu. (Jen. 37:23-28; 42:21) Josef ọ̀ kwụsịrị inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ n’ihi arụrụala ahụ ụmụnne ya rụsara ya? Ò wesoro Chineke iwe maka na ọ gbachiri nkịtị ha emee ya ihe ọjọọ? Baịbụl kwuru na o meghị otú ahụ. Ọ bụghị ebe ahụ ka nsogbu Josef kwụsịrị. E mechara boo ya ebubo na ọ chọrọ idina otu nwaanyị n’ike, a tụkwara ya mkpọrọ n’ihi ya. Nke a emeghịkwa ka ọ kwụsị ife Chineke. (Jen. 39:9-21) Kama nke ahụ, o kwere ka ọnwụnwa mee ka okwukwe ya sikwuo ike, Jehova gọzikwara ya nke ukwuu maka nke a.
15. Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe nlereanya Neomi?
15 Nke bụ́ eziokwu bụ na ọnwụnwa nwere ike ime ka obi jọọ anyị njọ ma ọ bụkwanụ kụda anyị mmụọ. O nwere ike ịbụ na e nwere mgbe nke a mere Josef. O mekwara ndị ọzọ bụ́ ndị ohu Chineke. Tụlee banyere Neomi, bụ́ onye di ya na ụmụ ya abụọ nwụrụ. Ọ sịrị: “Unu akpọla m Neomi. Kpọwanụ m Mera [nke pụtara “Ihe Ilu”], n’ihi na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile emewo m ihe obi ilu dị ukwuu.” (Rut 1:20, 21) Onye ọ bụla ụdị ihe ahụ mere Neomi mere nwere ike ikwu ụdị ihe a o kwuru. Dị ka Josef mere, ọ kwụsịghị inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ, ọ nọgidekwara na-erubere ya isi. Jehova gọzikwara nwaanyị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. (Rut 4:13-17, 22) Na Paradaịs a ga-enwe n’ụwa a, Jehova ga-edozikwa ihe niile Setan na ụwa ọjọọ ya mebirila. “A gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.”—Aịza. 65:17.
16. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ekpere anya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
16 Ebe ọ bụ na Chineke hụrụ anyị n’anya, ọ na-enyere anyị aka ma ọnwụnwa ọ bụla bịara anyị. (Gụọ Ndị Rom 8:35-39.) Ọ bụ eziokwu na Setan agaghị akwụsị ịnwa anyị ọnwụnwa, ọ ga-akụ afọ n’ala ma ọ bụrụ na anyị na-enwe “uche zuru okè” ma ‘mụrụ anya ka anyị wee na-ekpe ekpere.’ (1 Pita 4:7) Jizọs sịrị: “Ya mere, mụrụnụ anya, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike mgbe niile ka unu wee nwee ike ịgbanahụ ihe ndị a niile a kara aka na ha ga-eme, nakwa n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.” (Luk 21:36) N’amaokwu a, Jizọs kwuru ka anyị ‘na-arịọsi arịrịọ ike,’ nke pụtara ikpesi ekpere ike. Ihe mere Jizọs ji gbaa anyị ume ka anyị na-arịọsi arịrịọ ike bụ iji gosi anyị na oge a abụghị oge anyị kwesịrị iji iguzo n’ihu ya na Nna ya egwu egwu. Ọ bụ naanị ndị ha na Jehova na Jizọs dị ná mma ka a na-agaghị egbu n’ụbọchị Jehova.
Na-anụ Ọkụ n’Obi n’Ozi Jehova
17. Ọ bụrụ na ọtụtụ ndị anaghị anabata ozi ọma n’ókèala unu, olee otú ị ga-esi rite uru n’ezigbo ihe nlereanya ndị amụma oge ochie setịpụụrụ anyị?
17 Anyị na-enwe ume ma anyị soro na-eme ihe ọ bụla metụtara ofufe anyị na-efe Jehova. Nke a na-echetara anyị ihe Pita kwuru. Ọ sịrị: “Chebaranụ ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ echiche n’ihe banyere àgwà dị nsọ na omume ịsọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:11) Nke mbụ n’ime omume ahụ bụ ikwusa ozi ọma. (Mat. 24:14) N’eziokwu, izi ozi ọma n’ebe ụfọdụ na-esi ike. Nke a nwere ike ịbụ n’ihi na ndị bi ebe ndị ahụ enweghị mmasị ma ọ bụ na ha na-akpagbu ụmụnna anyị ma ọ bụkwanụ n’ihi na ha anaghị enwe ohere. A kpasoro ndị ohu Jehova ụdị àgwà ndị a n’oge ochie. N’agbanyeghị nke a, ha gakwuuru ha “ugboro ugboro” iji zie ha ozi Chineke ziri ha. (Gụọ 2 Ihe E Mere 36:15, 16; Jere. 7:24-26) Gịnị nyeere ha aka idi ihe ndị ahụ? Ihe nyeere ha aka bụ na ha lere ozi ha anya otú Jehova si ele ya, ọ bụghị otú ụwa si ele ya. Ihe ọzọ nyeere ha aka bụ na ha weere ya na o nweghị ihe ùgwù karịrị aha Chineke a kpọkwasịrị ha.—Jere. 15:16.
18. Olee otú ikwusa ozi ọma Alaeze ga-esi mee ka e too aha Chineke n’ọdịnihu?
18 Anyịnwa nwekwara ihe ùgwù nke ikwusa aha Jehova na nzube ya. Chegodị banyere nke a: N’ihi ozi ọma anyị na-ezi, n’ụbọchị Jehova, ndị iro ya agaghị asị na o nweghị onye gwara ha banyere Chineke na nzube ya. N’eziokwu, dị ka ọ dị Fero n’oge ochie, ha ga-ama na ọ bụ ha na Jehova na-alụ. (Ọpụ. 8:1, 20; 14:25) Ma, Jehova ga-akwanyere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi ùgwù site n’ime ka o doo ewu na ọkụkọ anya na ha na-anọchite anya ya.—Gụọ Ezikiel 2:5; 33:33.
19. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị chọrọ iji ndidi Jehova mee ihe ga-abara anyị uru?
19 Ná ngwụcha akwụkwọ ozi nke abụọ Pita degaara ụmụnna ya, ọ sịrị: “Na-agụkwanụ ndidi Onyenwe anyị dị ka nzọpụta.” (2 Pita 3:15) Ka anyị jiri oge a Jehova nwere ndidi na-eme ihe ga-abara anyị uru. Olee otú anyị ga-esi mee ya? Ọ bụ site n’ịkpa àgwà na-amasị Chineke, site n’ịbụ ndị ‘na-enweghị ntụpọ na mmerụ,’ site n’inwe echiche ziri ezi banyere ọnwụnwa, nakwa site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze. Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị a, anyị ga-enwe olileanya inweta ngọzi ndị “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ga-eweta.—2 Pita 3:13.
Ì Chetara?
• Olee otú anyị nwere ike isi na-akpa àgwà e ji mara ndị Chineke?
• Olee otú anyị nwere ike isi nọgide na-abụ “ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-enweghị mmerụ”?
• Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Josef na Neomi?
• Gịnị mere mmadụ ikwusa ozi ọma ji bụrụ ihe ùgwù na-enweghị atụ?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 9]
Unu ndị bụ́ di, gịnị ga-enyere unu na ezinụlọ unu aka ịkpa àgwà ndị e ji mara ndị Chineke?
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú Josef si die ọnwụnwa ndị bịaara ya?