Ihe Ụbọchị Jehova Ga-ekpughe
Ihe Ụbọchị Jehova Ga-ekpughe
“Ụbọchị Jehova ga-abịa dị ka onye ohi, . . . a ga-ekpughekwa ụwa na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya.”—2 PITA 3:10.
1, 2. (a) Olee otú a ga-esi ebibi ụwa ọjọọ a? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?
IHE ajọ ụwa a ji malite bụ ụgha mbụ ahụ Setan ghara, nke bụ́ na ndị mmadụ nwere ike ịchị onwe ha nke ọma n’enweghị enyemaka Jehova. (Ọma 2:2, 3) Ò nwere ihe ọ bụla ji ụgha malite nke nwere ike ịdịru ebighị ebi? N’ebeekwanụ! Ma, anyị agaghị atụ anya na ụwa Setan ga-eji aka ya ebibi onwe ya. Kama, ọ bụ Chineke ga-ebibi ya n’oge ọ kara aka, nakwa otú o si chọọ. Ihe Chineke ga-eme ụwa ọjọọ a ga-egosi nnọọ na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nakwa na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya.—Ọma 92:7; Ilu 2:21, 22.
2 Pita onyeozi dere, sị: “Ụbọchị Jehova ga-abịa dị ka onye ohi, bụ́ mgbe eluigwe ga-eji oké ụzụ gabiga, ma ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa ga-adị oké ọkụ wee gbazee, a ga-ekpughekwa ụwa na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya.” (2 Pita 3:10) Gịnị bụ “eluigwe” na “ụwa” e kwuru okwu ha ebe a? Gịnị bụ “ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa” bụ́ ndị a ga-agbaze? Oleekwa ihe Pita bu n’uche mgbe o kwuru na ‘a ga-ekpughe ụwa na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya’? Ịmata azịza nke ajụjụ ndị a ga-enyere anyị aka ijikere maka ihe ndị dị egwu ga-eme n’oge na-adịghị anya.
Eluigwe na Ụwa Ndị Ga-agabiga
3. Gịnị bụ “eluigwe” e kwuru okwu ya na 2 Pita 3:10, oleekwa otú ọ ga-esi agabiga?
3 Mgbe e ji okwu ahụ bụ́ eluigwe mee ihe atụ na Baịbụl, ọ na-anọchikarị anya ndị na-achị achị, bụ́ ndị ka ndị ha na-achị elu. (Aịza. 14:13, 14; Mkpu. 21:1, 2) ‘Eluigwe nke ga-agabiga’ na-anọchi anya ọchịchị ụmụ mmadụ nke na-achị ndị na-anaghị efe Chineke. Ngabiga nke ọ ga-eji “oké ụzụ” gabiga, ma ọ bụ “oké mbigbọ,” dị ka nsụgharị ọzọ si kwuo ya, nwere ike ịpụta na a ga-ebibi ya ngwa ngwa.
4. Gịnị bụ “ụwa” e kwuru okwu ya na 2 Pita 3:10, oleekwa otú a ga-esi bibie ya?
4 “Ụwa” na-anọchi anya ụmụ mmadụ ndị ha na Chineke na-adịghị ná mma. E nwere ụdị ụwa a n’oge Noa, Iju Mmiri lakwara ya n’iyi mgbe Chineke nyere iwu ka nke a mee. “Site n’otu okwu ahụ, eluigwe na ụwa dị ugbu a ka e debeere ọkụ, a na-edebekwa ha ruo ụbọchị ikpe na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:7) N’agbanyeghị na Iju Mmiri lara ndị niile na-anaghị asọpụrụ Chineke n’iyi n’otu mgbe, “n’oké mkpagbu ahụ,” a gaghị ebibi ndị niile na-anaghị asọpụrụ Chineke otu mgbe. (Mkpu. 7:14) Ná mmalite nke oké mkpagbu ahụ, Chineke ga-eme ka ndị ọchịchị bibie “Babịlọn Ukwu ahụ.” Ọ ga-esi otú a gosi na ya kpọrọ okpukpe ahụ yiri nwaanyị akwụna asị. (Mkpu. 17:5, 16; 18:8) Nke a gachaa, n’agha Amagedọn, nke ga-abụ agba nke ikpeazụ nke oké mkpagbu ahụ, Jehova ga-eji aka ya bibie ihe ndị fọdụrụ n’ụwa Setan.—Mkpu. 16:14, 16; 19:19-21.
‘Ihe Ndị Dị n’Eluigwe na Ụwa Ga-agbaze’
5. Gịnị bụ ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa?
5 Olee “ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa” bụ́ ndị ‘ga-agbaze’? “Ihe ndị dị n’eluigwe na 1 Kọr. 2:12; gụọ Ndị Efesọs 2:1-3.) Mmụọ ahụ, ma ọ bụ “ikuku,” juru n’ụwa Setan. Ọ na-eme ka ndị mmadụ na-eche echiche, na-eme atụmatụ, na-ekwu okwu, na-emekwa ihe kwekọrọ n’uche Setan, bụ́ onye mpako obi fere azụ nke “na-achị ikike nke ikuku.”
ụwa” ndị Pita kwuru okwu ha bụ ihe ndị mere ka ụwa bụrụ nke na-anaghị asọpụrụ Chineke. Ha gụnyere àgwà a na-akpa na ya, otú e si eme ihe na ya, na ihe ndị a na-achụso n’ime ya. “Ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa” gụnyekwara “mmụọ nke ụwa,” bụ́ “nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi.” (6. Olee otú e si ama onye nwere mmụọ nke ụwa?
6 N’ihi ya, ma ndị nwere mmụọ ụwa hà ma ma ọ̀ bụ na ha amaghị, ha ekwetala ka Setan na-eduzi uche ha na obi ha ka ha wee na-eche echiche ma na-akpa àgwà ka ya. Nke a na-eme ka ha na-eme ihe ọ bụla dị ha mma n’achọghị ịma ihe bụ́ uche Chineke. Ha dị mpako ma na-achọ ihe ga-adịrị naanị ha mma. Ha na-enupụrụ ndị na-achị achị isi, na-emekwa ihe ‘anụ ahụ́ ha na anya ha chọrọ.’—Gụọ 1 Jọn 2:15-17. *
7. Olee ihe mere anyị ji kwesị ‘ichebe obi anyị’?
7 Ya mere, ọ dị oké mkpa ka anyị “chebe obi” anyị site n’ime ihe ndị ga-amasị Chineke mgbe anyị na-emete ndị enyi, mgbe anyị na-ahọrọ ụdị akwụkwọ anyị ga-agụ, ụdị ihe ndị anyị ga-eji atụrụ ndụ, na ebe ndị anyị ga-aga n’Ịntanet. (Ilu 4:23) Pọl onyeozi dere, sị: “Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.” (Kọl. 2:8) Nke a dị mkpa nke ukwuu ugbu a ụbọchị Jehova na-eru nso, n’ihi na ‘oké ọkụ’ ya ga-agbaze “ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa” Setan. Ọ na-egosi na ha agaghị alanahụli iwe na-ere ka ọkụ nke Chineke ga-eweso ha n’ụbọchị ahụ. Nke a na-echetara anyị ihe e dere na Malakaị 4:1, bụ́ ebe sịrị: “Ụbọchị nke na-ere dị ka oké ọkụ na-abịa, ndị niile dị mpako na ndị niile na-eme ajọ omume ga-adị ka ahịhịa ọka. Ụbọchị ahụ nke na-abịa ga-erepịakwa ha.”
“A Ga-ekpughekwa Ụwa na Ọrụ Ndị A Rụrụ n’Ime Ya”
8. Olee otú a ga-esi ‘kpughee’ ụwa na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya?
8 Gịnị ka Pita bu n’uche mgbe o kwuru na “a ga-ekpughekwa ụwa na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya”? Okwu ahụ bụ́ ‘ikpughe’ nwekwara ike ịpụta ‘ịchọpụta’ ma ọ bụ ‘ịgba ihe n’anwụ.’ Ihe Pita na-ekwu bụ na n’oké mkpagbu ahụ, Jehova ga-agba ụwa Setan n’anwụ, mee ka a mara na ọ na-emegide ya na Alaeze ya, bụ́ nke na-egosi na e kwesịrị ibibi ya. Amụma dị n’Aịzaya 26:21 sịrị: “Jehova si n’ebe ọ nọ na-abịa ime ka ndị bi n’ala a zaa ajụjụ maka njehie ha. Ala a ga-ekpughekwa ọbara ndị ọ wụfuru, ọ gakwaghị ekpuchi ndị ya e gburu egbu ọzọ.”
9. (a) Olee ihe ndị anyị kwesịrị izere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee ihe anyị kwesịrị inwe, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
9 N’ụbọchị Jehova, ndị ụwa na mmụọ ya mere ka ha bụrụ ndị ọjọọ ga-egosi ụdị ndị ha bụ n’ezie, ha ga-egbudị ibe ha. N’eziokwu, o yiri ka ihe ntụrụndụ ndị na-ewu ewu taa, bụ́ ndị na-egosi ime ihe ike, na-azụ uche ọtụtụ mmadụ maka mgbe ahụ onye ọ bụla ‘ga-emegide ibe ya.’ (Zek. 14:13) Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị jụ fim, akwụkwọ, egwuregwu vidio, na ihe ndị ọzọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka anyị na-akpa àgwà ndị na-anaghị amasị Chineke, dị ka mpako na ịhụ ihe ike n’anya. (2 Sam. 22:28; Ọma 11:5) Kama ime ihe ndị na-anaghị amasị Chineke, ka anyị nwee mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke n’ihi na ọkụ ihe atụ ahụ agaghị akpa àgwà ndị e ji ama onye nwere mkpụrụ nke mmụọ nsọ aka.—Gal. 5:22, 23.
“Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ”
10, 11. Olee ihe bụ́ “eluigwe ọhụrụ” na “ụwa ọhụrụ”?
10 Gụọ 2 Pita 3:13. “Eluigwe ọhụrụ” bụ Alaeze eluigwe nke Chineke, bụ́ nke e guzobere n’afọ 1914 mgbe “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” zuru. (Luk 21:24) Ndị eze ga-achị n’ọchịchị a bụ Kraịst Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, ndị ọtụtụ n’ime ha nwetarala ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe. N’akwụkwọ Mkpughe, a kpọrọ ndị a a họọrọ ‘obodo nsọ ahụ, bụ́ Jeruselem Ọhụrụ, nke si n’eluigwe, n’ebe Chineke nọ, na-agbadata. A kwadebekwara ya dị ka nwaanyị a na-alụ ọhụrụ nke a chọrọ mma maka di ya.’ (Mkpu. 21:1, 2, 22-24) Dị nnọọ ka Jeruselem nke dị n’ụwa bụ isi obodo ọchịchị Izrel oge ochie, Jeruselem Ọhụrụ ahụ na Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bụ ndị ọchịchị nke usoro ihe ọhụrụ ahụ. Obodo a ga-esi ‘n’eluigwe gbadata,’ ya bụ na ọ ga-amalite ịchị ụwa.
11 “Ụwa ọhụrụ” ahụ bụ ụmụ mmadụ ndị ga-ebi n’ụwa ọhụrụ ahụ, bụ́ ndị ji obi ọcha ha na-edo onwe ha n’okpuru ọchịchị Alaeze Chineke ugbu a. Paradaịs ime mmụọ nke ndị Chineke nọ na ya n’ụwa ochie a ga-emecha dịrị ebe o kwesịrị ịdị, n’ọmarịcha “elu ụwa [ahụ] mmadụ bi nke gaje ịbịa.” (Hib. 2:5) Olee otú anyị nwere ike isi banye n’usoro ihe ọhụrụ a a na-ekwu okwu ya?
Jikere Maka Oké Ụbọchị Jehova
12. Olee ihe mere ụbọchị Jehova ga-eji bịakwasị ụwa na mberede?
12 Ma Pọl ma Pita buru amụma na ụbọchị Jehova ga-abịa “dị ka onye ohi,” ya bụ na ọ ga-abịa mgbe a na-atụghị anya ya. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:1, 2.) Ọ ga-abịakwasịdị ezigbo Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-atụ anya ụbọchị ahụ, na mberede. (Mat. 24:44) Ma, ọ ga-eme ụwa ihe karịrị ịda ha na mberede. Pọl dere, sị: “Mgbe ọ bụla ha [ya bụ, ndị ha na Jehova na-adịghị ná mma] na-asị: ‘Udo na obi iru ala!’ mgbe ahụ ka mbibi mberede ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya dị nnọọ ka ihe mgbu nke na-abịakwasị nwaanyị dị ime; ha agaghịkwa agbanahụ ya ma ọlị.”—1 Tesa. 5:3.
13. Olee otú anyị ga-esi ghara ikwe ka okwu “Udo na obi iru ala!” duhie anyị?
13 Ikwu “Udo na obi iru ala!” ga-abụ ụgha ọzọ ndị mmụọ ọjọọ ga-eji eduhie ndị mmadụ; ma, ọ gaghị emegharị ndị ohu Jehova anya. Pọl dere, sị: “Unu onwe unu . . . anọghị n’ọchịchịrị, nke mere ụbọchị ahụ ga-eji bịakwasị unu na mberede dị ka chi ọbụbọ si abịakwasị ndị ohi, n’ihi na unu niile bụ ụmụ nke ìhè na ụmụ nke ehihie.” (1 Tesa. 5:4, 5) Ya mere, ka anyị nọgide n’ìhè wee nọrọ n’ebe dị anya n’ọchịchịrị nke ụwa Setan. Pita dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ebe unu bu ụzọ mara ihe ndị a, kpacharanụ anya ka a ghara idufu unu na ha [ya bụ, ndị ozizi ụgha nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst] site ná njehie nke ndị na-eleda iwu anya, unu ewee kwụsị iguzosi ike.”—2 Pita 3:17.
14, 15. (a) Olee otú Jehova si na-akwanyere anyị ùgwù? (b) Olee okwu sitere n’ike mmụọ nsọ nke anyị kwesịrị iburu n’uche?
14 Cheta na ihe Jehova mere abụghị ịgwa anyị ka anyị ‘kpachara anya’ ya agwụ. Kama, ọ kwanyeere anyị ùgwù site n’ime ka anyị
‘buru ụzọ mara ihe ndị a,’ ya bụ, ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.15 Ma, ọ dị mwute na ụfọdụ ejighị ncheta a na-echetara anyị ka anyị mụrụ anya akpọrọ ihe, ebe ndị ọzọ na-eleda ya anya. Ha nwere ike ịna-asị, ‘Ọ bụghị taa ka anyị nụwara ihe ndị a.’ Ma, ndị dị otú a kwesịrị ịma na mgbe ha na-ekwu otú a, ọ bụghị naanị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ka ha na-agbagha okwu ha, kama, ha na-agbagha okwu Jehova na Ọkpara ya. Jehova sịrị: “Na-atụ anya ya.” (Hab. 2:3) Jizọs kwukwara, sị: “Na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.” (Mat. 24:42) Pita dekwara, sị: “Chebaranụ ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ echiche n’ihe banyere àgwà dị nsọ na omume ịsọpụrụ Chineke, na-echere ma na-eburu ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’uche.” (2 Pita 3:11, 12) Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na Òtù Na-achị Isi nke na-anọchite anya ya agaghị anwa anwa jiri okwu a dị mkpa gwurie egwu.
16. Olee àgwà anyị kwesịrị izere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
16 N’eziokwu, ọ bụ “ajọ ohu” kwuru na Nna ya ukwu na-egbu oge. (Mat. 24:48) Ajọ ohu ahụ so ná ndị e kwuru okwu ha na 2 Pita 3:3, 4. Pita dere na “n’oge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-eji ịkwa emo ha bịa,” bụ́ ndị “na-agbaso ọchịchọ nke onwe ha.” Ha ga na-akwa ndị na-erubere Jehova isi, bụ́ ndị bu ụbọchị ya n’uche, emo. N’ezie, kama ịna-eche banyere ihe metụtara Alaeze Chineke, ndị a na-akwa emo na-eche naanị banyere onwe ha nakwa naanị banyere ọdịmma ha. Ka anyị ghara inupụ isi ka ha, àgwà dị otú a dị ize ndụ. Kama ịdị ka ha, ka anyị ‘na-agụ ndidi Onyenwe anyị dị ka nzọpụta.’ Otú anyị ga-esi egosi na anyị na-eme nke a bụ ịna-ejechi ozi ọma Alaeze anya ma na-eme ndị na-eso ụzọ, gharakwa ichegbu onwe anyị banyere oge ihe ndị a ga-eme, bụ́ nke naanị Jehova Chineke ma.—2 Pita 3:15; gụọ Ọrụ Ndịozi 1:6, 7.
Tụkwasị Chineke nke Nzọpụta Obi
17. Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi si rubere Jizọs isi wee gbapụ na Jeruselem, gịnịkwa mere ha ji mee nke a?
17 Mgbe ndị agha Rom nọchibidoro Judia n’afọ 66 O.A., Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi rubere isi n’ihe Jizọs gwara ha wee gbapụ na Jeruselem ozugbo ha nwetara ohere. (Luk 21:20-23) Gịnị mere ha ji mee ihe n’egbughị oge? O doro anya na ha chetara ihe ahụ Jizọs gwara ha. Ha ma na ihe ahụ ha mere ga-eme ka ihe siere ha ike, dị nnọọ ka Kraịst gwara ha. Ma, ha makwa na Jehova agaghị ahapụ ndị na-erubere ya isi.—Ọma 55:22.
18. Olee otú i si ele oké mkpagbu ahụ anya n’ihi ihe Jizọs kwuru na Luk 21:25-28?
18 Anyị onwe anyị kwesịkwara ịtụkwasị Jehova Luk 21:25-28.
obi kpamkpam n’ihi na ọ bụ naanị ya ga-azọpụta anyị mgbe a ga-enwe oké mkpagbu a na-enwetụbeghị ụdị ya n’ụwa. Ka oké mkpagbu ahụ na-aga n’ihu, tupu Jehova ebibie ihe ndị fọdụrụ n’ụwa, e nwere mgbe ‘ndị mmadụ ga-atụbọ n’ihi egwu nakwa n’ihi ihe ndị ha na-atụ anya ga-abịakwasị elu ụwa mmadụ bi.’ Ma, ka ndị iro Chineke na-ama jijiji n’ihi ụjọ, ndị ohu Jehova na-erubere ya isi agaghị atụ egwu. Kama ịtụ egwu, ha ga na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na ha ma na nnapụta ha eruwela.—Gụọ19. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a?
19 N’eziokwu, ihe mara mma na-echere ndị nọpụrụ iche n’ụwa a na ‘n’ihe ndị dị n’ime ya.’ Ma, dị ka isiokwu na-eso nke a ga-akọwa, anyị ga-eme ihe karịrị izere ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ. Anyị kwesịrị ịna-akpa àgwà ndị na-amasị Jehova ma na-arụ ọrụ ndị dị ya mma.—2 Pita 3:11.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụ ebe a kọwara àgwà ndị e ji ama mmụọ nke ụwa nke ọma, gụọ akwụkwọ bụ́ Reasoning From the Scriptures, peeji nke 389-393.
Ì Nwere Ike Ịkọwa?
• Gịnị bụ . . .
“eluigwe na ụwa” dị ugbu a?
“ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa”?
“eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ”?
• Olee ihe mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Chineke obi kpamkpam?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 5]
Olee otú i nwere ike isi “chebe obi gị” ma nọpụ iche n’ụwa a?
[Foto dị na peeji nke 6]
Olee otú anyị si egosi na anyị ‘na-agụ ndidi Onyenwe anyị dị ka nzọpụta’?