Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Obi Gị Dum Na-arụ Nnukwu Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Ahụ

Jiri Obi Gị Dum Na-arụ Nnukwu Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Ahụ

Jiri Obi Gị Dum Na-arụ Nnukwu Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Ahụ

‘Nwee ọtụtụ ihe ị na-arụ n’ọrụ Onyenwe anyị.’—1 KỌR. 15:58.

1. Olee ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee?

KA JIZỌS si n’obodo Sameria na-agafe ná ngwụcha afọ 30 O.A., ọ kwụsịrị n’olulu mmiri dị na Saịka ka o zuo ike. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ọ nọ gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Welienụ anya unu lee ubi, na ihe a kụrụ na ha achaala maka owuwe ihe ubi.” (Jọn 4:35) Ihe Jizọs na-ekwu okwu ya n’ebe a abụghị owuwe ihe ubi nkịtị, kama ọ bụ ịchịkọta ndị nwere ezi obi, ndị ga-aghọ ndị na-eso ụzọ ya. Ihe Jizọs na-eme ebe a bụ ịkpọ ndị na-eso ụzọ ya ọrụ. Ọrụ a ga-arụ buru ibu, ma, oge a ga-eji rụọ ya ebughị ibu!

2, 3. (a) Gịnị na-egosi na anyị bi n’oge owuwe ihe ubi? (b) Olee ihe ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ihe Jizọs kwuru banyere owuwe ihe ubi nwere ihe pụrụ iche ọ pụtara n’oge a. Anyị bi n’oge ihe ubi bụ́ ụmụ mmadụ bi n’ụwa ‘charala maka owuwe.’ Kwa afọ, a na-akpọ ọtụtụ nde mmadụ òkù ka ha bịa nara eziokwu na-enye ndụ, a na-emekwa ọtụtụ puku ndị ọhụrụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs baptizim. Anyị nwere ihe ùgwù nke iso na-arụ ọrụ owuwe ihe ubi kachanụ a rụtụrụla n’ụwa, bụ́ nke Onye nwe owuwe ihe ubi, bụ́ Jehova Chineke, na-ahụ maka ya. Ì nwere ‘ọtụtụ ihe ị na-arụ’ n’ọrụ owuwe ihe ubi a?—1 Kọr. 15:58.

3 Mgbe Jizọs jere ozi n’ụwa afọ atọ na ọkara, ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-ewe ihe ubi. N’isiokwu a, anyị ga-atụle atọ n’ime ọtụtụ ihe ndị dị mkpa Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. Nke ọ bụla n’ime ha ga-eme ka anyị mata àgwà ga-abara anyị uru ka anyị na-agba mbọ ime ike anyị n’ọrụ ịchịkọta ndị na-eso ụzọ n’oge a. Ka anyị tụlee àgwà ndị a otu otu.

Anyị Kwesịrị Ịdị Umeala n’Obi

4. Olee ihe atụ Jizọs ji gosi na ịdị umeala n’obi dị mkpa?

4 Weregodị ya na ị na-ahụ ihe a ka ọ na-eme: Ndị na-eso ụzọ Jizọs ka rụchara ụka banyere onye ka ibe ya. Eleghị anya, otú ihu ha dị na-egosi na ha na-ewe iwe ma na-enyo ibe ha enyo. Ya mere, Jizọs kpọtara nwatakịrị n’etiti ha. O lekwasịrị nwa ahụ anya, sị: “Onye ọ bụla nke ga-eweda onwe ya ala dị ka nwatakịrị a bụ onye kasị ukwuu n’alaeze eluigwe.” (Gụọ Matiu 18:1-4.) Kama iche echiche ka ndị ụwa, bụ́ ndị onye ha na-ewere ka onye ukwu bụ onye nọ n’ọchịchị, onye nwere ego, ma ọ bụ onye nọ n’ọkwà dị elu, Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta na onye dị ukwuu bụ ‘onye wedara onwe ya ala’ n’ihu ndị ọzọ. Jehova ga-agọzi ha ma jiri ha na-arụ ọrụ naanị ma ọ bụrụ na ha adịrị umeala n’obi.

5, 6. Gịnị mere i ji kwesị ịdị umeala n’obi ma ọ bụrụ na ị chọrọ iji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ iwe ihe ubi ahụ? Nye ihe atụ.

5 Ọtụtụ ndị n’ụwa taa na-eji ndụ ha niile na-achọ otú ha ga-esi nwee ike ma nọrọ n’ọkwá dị elu, ha na-achụkwa ego ọnwụ ọnwụ. Nke a na-eme ka ha ghara inwe ohere na-amụ ihe banyere Chineke ma fewe ya ofufe. (Mat. 13:22) Ma, obi na-adị ndị Jehova ụtọ ‘iweda onwe ha ala’ n’ihu ndị ọzọ ka ha wee na-eme ihe na-atọ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ụtọ.—Mat. 6:24; 2 Kọr. 11:7; Fil. 3:8.

6 Tụlee banyere Francisco, bụ́ okenye na Ndịda Amerịka. Ọ hapụrụ mahadum mgbe ọ na-eto eto ka o wee malite ịsụ ụzọ. Ọ sịrị: “Mgbe m chọtara nwaanyị m ga-alụ, m gaara enweta ọrụ ga-eme ka mụ na nwunye m nwee ezigbo ego. Kama nke ahụ, anyị kpebiri ileghara ihe ndị a anya iji nọgide na-eje ozi oge niile. Ka oge na-aga, anyị malitere ịmụ ụmụ, ihe malitekwara isiri anyị ike. Ma, Jehova nyeere anyị aka ịnọgide n’ihe anyị kpebiri ime.” Francisco kwukwara, sị: “M bụ okenye kemgbe ihe karịrị iri afọ atọ, enwekwaala m ọtụtụ ihe ùgwù ndị ọzọ pụrụ iche. O nwetụbeghị mgbe anyị kwara ụta maka mkpebi anyị mere.”

7. Olee otú i sirila gbalịa ime ihe a dụrụ anyị n’ọdụ ná Ndị Rom 12:16?

7 Ọ bụrụ na ị jụ ‘ihe ndị dị elu’ nke ụwa a ma kwe “ka ihe ndị dị ala na-eduzi” gị, ị ga-enweta ọtụtụ ngọzi na ihe ùgwù n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ.—Rom 12:16; Mat. 4:19, 20; Luk 18:28-30.

Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-eweta Ngọzi

8, 9. (a) Kọwaa ihe atụ ahụ Jizọs ji talent mee. (b) Olee ndị ka ihe atụ ahụ kacha agba ume?

8 Ịnụ ọkụ n’obi bụ àgwà ọzọ anyị kwesịrị inwe ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iji obi anyị dum na-arụ ọrụ owuwe ihe ubi ahụ. Jizọs mere ka nke a doo anya n’otu ihe atụ o ji mkpụrụ ego talent mee. * Ihe atụ ahụ bụ banyere otu nwoke nke chọrọ ịga mba ọzọ wee kpọkọta ndị ohu ya atọ nyefee ha ihe onwunwe ya. O nyere ohu nke mbụ talent ise, nye nke abụọ talent abụọ, nyekwa nke atọ otu talent. Mgbe nna ha ukwu gawara mba ọzọ, ohu nke mbụ na nke abụọ ji ịnụ ọkụ n’obi were talent ha “zụọ ahịa.” Ma, ohu nke atọ dị “umengwụ.” O liri talent nke ya n’ala. Mgbe nna ha ukwu lọtara, ọ kwụrụ ohu nke mbụ na nke abụọ ụgwọ site n’ime ha ndị “na-elekọta ọtụtụ ihe.” Ọ naara ohu nke atọ ahụ talent ya chụpụ ya n’ụlọ ya.—Mat. 25:14-30.

9 O doro anya na ị chọrọ ịna-agachi ozi ọma ahụ anya otú ike kwere gị iji ṅomie ohu ndị ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi rụọ ọrụ n’ihe atụ ahụ Jizọs mere. Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na e nwere ihe ndị na-egbochi gị ịgachi ozi ọma anya? Ma eleghị anya ihe isi ike mere ka i jiri ọtụtụ awa na-arụ ọrụ ka i wee kpata ihe ị ga-eji na-azụ ezinụlọ gị. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na nkà emeela ka ike ghara ịdịzi gị, gị ana-arịakwa ọrịa. Ya bụrụ otú ahụ, e nwere ihe e kwuru n’ihe atụ ahụ e ji talent mee nke ga-agba gị ume.

10. Olee otú nna ukwu ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ ahụ Jizọs ji talent mee si gosi na ya ma ihe, gịnịkwa mere ihe ahụ o mere ji na-agba gị ume?

10 Cheta na nna ukwu ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ ahụ ma na ike ndị ohu ya atọ ahụ ahaghị otu. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na o nyere “onye ọ bụla dị ka ike ya hà.” (Mat. 25:15) Ohu nke mbụ ahụ mere ihe a tụrụ anya ya wee nweta uru karịrị nke onye nke abụọ. Ma, nna ukwu ahụ gosiri na ya nwere mmasị n’otú ohu abụọ ahụ si rụsie ọrụ ike site n’ịkpọ nke ọ bụla n’ime ha “ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi” ma jiri otu ụdị ihe kwụọ ha ụgwọ. (Mat. 25:21, 23) Otú ahụ ka ọ dịkwa Jehova Chineke, bụ́ Nna Ukwu nwe owuwe ihe ubi ahụ. Ọ ma na e nwere ihe ndị nwere ike igbochi gị ịgachi ozi ọma anya. Ọ gaghị echefu otú i si eji obi gị dum na-ejere ya ozi, ọ ga-akwụkwa gị ụgwọ.—Mak 14:3-9; gụọ Luk 21:1-4.

11. Nye ihe atụ iji gosi otú e nwere ike isi gọzie mmadụ nke ukwuu n’ihi na o ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ owuwe ihe ubi ahụ n’agbanyeghị na ihe siiri ya ike.

11 Ihe mere Selmira, bụ́ nwanna nwaanyị bi na Brazil, gosiri na ọ bụghị naanị mgbe ihe dịịrị mmadụ mma ka o kwesịrị ịna-agachi ozi ọma anya. Afọ iri abụọ gara aga, ndị ohi gbagburu di ya nke mere ka naanị ya zụwa ụmụ atọ. Odibo ọ na-agbara otu ezinụlọ mere ka ọ na-arụ ọrụ ọtụtụ awa nke gụnyere iji ụgbọ njem ọtụtụ mmadụ na-eju eme njem na-agwụ ya ike. N’agbanyeghị ihe ndị a, ọ haziri oge ya ka o wee nwee ike ịbụ ọsụ ụzọ oge niile. Abụọ n’ime ụmụ ya atọ mechara ghọọkwa ndị ọsụ ụzọ. Selmira sịrị: “Kemgbe ahụ, a mụọrọla m ihe karịrị iri mmadụ abụọ Baịbụl, ha esorokwala ná ndị ‘ezinụlọ m.’ Mụ na ha ka bụ enyi, anyị ka hụkwara ibe anyị n’anya. Ọ bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke a na-enweghị ike iji ego zụta.” N’eziokwu, Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ agọziela Selmira maka otú o si jiri ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ!

12. Olee otú anyị nwere ike isi jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma?

12 Ọ bụrụ na otú ihe si dịrị gị ugbu a anaghị ekwecha ka ị na-ejechi ozi ọma anya, ị ka nwere ike ịrụpụtakwu ihe n’ozi gị ma ọ bụrụ na i wepụtakwuo oge na-aga ozi ọma. Ọ bụrụ na i lezie anya na-eme ihe ndị a na-atụ n’aro kwa izu ná Nzukọ Ije Ozi, ọ ga-eme ka otú i si ezi ozi ọma kakwuo mma, meekwa ka i nwee ike ịnwale ụzọ dị iche iche e si ekwusa ozi ọma. (2 Tim. 2:15) Ọ bụrụkwa na ọ ga-ekwe gị omume, i nwere ike ịkwụsị ịna-eme ihe ndị na-abachaghi uru ma ọ bụkwanụ na-eme ha n’oge ndị ọzọ ka i wee nwee ike iso ọgbakọ na-aga ozi ọma.—Kọl. 4:5.

13. Olee ihe bụ́ isi ga-enyere anyị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi?

13 Echefula na ihe mere anyị ji eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma bụ na obi dị anyị ụtọ n’ihi ihe Chineke na-emere anyị. (Ọma 40:8) Ohu nke atọ ahụ Jizọs kwuru okwu ya n’ihe atụ ahụ o mere tụrụ ụjọ nna ya ukwu, o weere ya na nna ya ukwu bụ onye aka ike na onye a na-anaghị emete mma. N’ihi ya, nwoke ahụ liri talent ya n’ala kama iji ya nwetakwuoro nna ya ukwu uru. Ọ bụrụ na anyị achọghị ịkpa àgwà ka ohu a, anyị na Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, bụ́ Jehova, kwesịrị ịdị n’ezigbo mma. Wepụta oge ị ga-eji na-amụ ihe ma na-atụgharị uche n’àgwà ya ndị magburu onwe ha, ya bụ, ịhụnanya, ndidi, na ebere. Ọ bụrụ na i mee otú a, ị ga-eji obi gị dum na-eme ike gị niile n’ozi ya.—Luk 6:45; Fil. 1:9-11.

“Unu Ga-adị Nsọ”

14. Olee ihe dị mkpa ndị chọrọ ịrụ ọrụ owuwe ihe ubi ahụ ga-emerịrị?

14 Pita onyeozi kwughachiri ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ ihe Chineke chọrọ n’aka ndị ohu ya nọ n’ụwa. Ọ sịrị: “Dị ka Onye Nsọ ahụ nke kpọrọ unu, bụrụkwanụ ndị dị nsọ n’omume unu niile, n’ihi na e dere, sị: ‘Unu ga-adị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.’” (1 Pita 1:15, 16; Lev. 19:2; Diut. 18:13) Ihe a Pita kwuru gosiri na ndị na-ewe ihe ubi ahụ kwesịrị izere omume ọjọọ na ihe ndị nwere ike imebi mmekọrịta ha na Chineke. Anyị ga-emeli ihe a dị mkpa a chọrọ anyị n’aka ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ga-eme ka a sachaa anyị. Olee otú a ga-esi mee nke a? Ọ bụ eziokwu nke okwu Chineke ga-eme ya.

15. Olee ihe eziokwu nke okwu Chineke nwere ike imere anyị?

15 E ji eziokwu nke okwu Chineke tụnyere mmiri nke e ji eme ka ihe na-adịghị ọcha dị ọcha. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi dere na Ndị Kraịst e tere mmanụ dị ọcha n’anya Chineke, dị ka nwunye ọhụrụ a lụtaara Kraịst, bụ́ onye ‘ji mmiri saa ya wee mee ka ọ dị ọcha site n’okwu Chineke, ka o wee dị nsọ, gharakwa inwe mmerụ.’ (Efe. 5:25-27) Tupu Pọl ekwuo ihe a, Jizọs eburularị ụzọ kwuo banyere otú okwu Chineke nke ọ na-ekwusa nwere ike isi sachaa ndị mmadụ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu adịworị ọcha n’ihi okwu m gwara unu.” (Jọn 15:3) Ya mere, eziokwu nke okwu Chineke nwere ike ịsacha omume mmadụ, meekwa ka onye ahụ na Chineke dị ná mma. Ọ bụ naanị mgbe anyị kwere ka eziokwu nke okwu Chineke si otú a sachaa anyị ka ọ ga-anabata ofufe anyị na-efe ya.

16. Olee otú anyị ga-esi na-eme omume dị ọcha nakwa ihe ndị ga-eme ka anyị na Chineke dịrị ná mma?

16 N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ iso na-ewe ihe ubi n’ọrụ owuwe ihe ubi Chineke, ihe mbụ anyị ga-eme bụ ịkwụsị omume ọjọọ na ihe niile nwere ike imebi mmekọrịta anyị na Chineke. N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ka chọrọ iso na-ewe ihe ubi ahụ, anyị ga-anọgide na-agba mbọ na-eme omume dị mma, na-emekwa ihe ndị ga-eme ka anyị na Jehova nọgide na-adị ná mma. (Gụọ 1 Pita 1:14-16.) Anyị kwesịrị iji okwu Chineke nke bụ́ eziokwu na-asacha onwe anyị otú ahụ anyị si eji mmiri asacha onwe anyị. Nke a gụnyere ịgụ Baịbụl na ịga ọmụmụ ihe. Ọ gụnyekwara ịgba mbọ na-eme ihe Chineke na-agwa anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị a, ha ga-eme ka anyị na-agbaso ọchịchọ anyị na-enwe ime mmehie mgba, anyị agaghịkwa ekwe ka ụwa metọọ anyị. (Ọma 119:9; Jems 1:21-25) Ọ na-akasị anyị nnọọ obi ịmara na eziokwu nke okwu Chineke nwere ike ‘ịsacha anyị’ mmehie dị oké njọ anyị mere.—1 Kọr. 6:9-11.

17. Olee ihe Baịbụl kwuru nke anyị kwesịrị ịna-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-adị ọcha?

17 Ị̀ na-ekwe ka okwu Chineke nke bụ́ eziokwu na-asacha gị? Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị na-eme ma a gwa gị ihe ihe ntụrụndụ ndị rụrụ arụ dị n’ụwa a nwere ike ime gị? (Ọma 101:3) Ị̀ na-ezere gị na ụmụ akwụkwọ ibe gị na ndị ọrụ ibe gị bụ́ ndị na-abụghị ndị Jehova ịkpachi anya? (1 Kọr. 15:33) Ị̀ na-agbasi mbọ ike ịkwụsị ihe ụfọdụ na-adịghị mma ị na-eme bụ́ ndị nwere ike ime ka ị ghara ịdị ọcha n’anya Jehova? (Kọl. 3:5) Ị̀ na-ezere itinye aka n’esemokwu ndị a na-enwe n’ọchịchị nakwa ịhụ mba n’anya ndị mmadụ ji maka ya asọ mpi n’ọtụtụ egwuregwu?—Jems 4:4.

18. Olee otú ime omume dị ọcha na anyị na Chineke ịdị ná mma ga-esi nyere anyị aka ịrụsi ọrụ owuwe ihe ubi anyị na-arụ ike?

18 Ọ bụrụ na i rube nnọọ isi n’ihe ndị a e kwuru, ọ ga-abara gị uru dị ukwuu. Jizọs ji ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ tụnyere alaka osisi vaịn wee kwuo, sị: “[Nna m] na-ewepụ alaka ọ bụla dị na m nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke ọ bụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-eme ka ọ dị ọcha, ka o wee na-amịkwu mkpụrụ.” (Jọn 15:2) Ị ga-amịkwu mkpụrụ ma ọ bụrụ na i kwe ka eziokwu Baịbụl na-asacha gị.

Ngọzi Ndị Anyị Na-enweta Ugbu A Nakwa Ndị Anyị Ga-enweta n’Ọdịnihu

19. Olee otú e si gọzie ọrụ owuwe ihe ubi ndị na-eso ụzọ Jizọs rụrụ?

19 Na Pentikọst nke afọ 33 O.A., mmụọ nsọ mechara nye ndị na-eso ụzọ Jizọs ike ka ha bụrụ ndị àmà Jizọs ‘ruo n’ebe kasị anya n’ụwa’ n’ihi na ha kwesịrị ntụkwasị obi, nabatakwa ọzụzụ o nyere ha. (Ọrụ 1:8) Nke a mere ka ụfọdụ n’ime ha soro n’òtù na-achị isi, ndị ọzọ abụrụ ndị ozi ala ọzọ, nakwa ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ha rụrụ ọrụ dị mkpa n’ịhụ na e kwusara ozi ọma “n’etiti ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.” (Kọl. 1:23) A gọziri ha nke ukwuu, ha mekwara ka ndị ọzọ nwee ọṅụ.

20. (a) Olee ngọzi ndị i nwetarala n’ihi na ị na-arụsi ọrụ owuwe ihe ubi ahụ ike? (b) Gịnị ka i kpebiri ime?

20 N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ owuwe ihe ubi ahụ ma na-eme ihe Okwu Chineke kwuru, anyị ga-eso na-arụsi ọrụ owuwe ihe ubi a na-arụ ugbu a ike. N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị anaghị enwe obi ụtọ n’ihi ịchụ akụnụba na ihe ụtọ dị n’ụwa a, anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ na ọṅụ. (Ọma 126:6) Ihe kacha mkpa bụ na ‘ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ abụghị n’efu n’ime Onyenwe anyị.’ (1 Kọr. 15:58) Jehova Chineke, bụ́ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ga-akwụ anyị ụgwọ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ‘ọrụ anyị na-arụ na ịhụnanya anyị gosiri maka aha ya.’—Hib. 6:10-12.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ihe bụ́ isi Jizọs bu n’obi mee ihe atụ ahụ bụ otú o si emeso ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ ihe, ma, ihe o kwuru na ya metụtakwara Ndị Kraịst niile.

Ì Chetara?

Ka ị na-agba mbọ ịrụsi ọrụ owuwe ihe ubi ahụ ike . . .

• gịnị mere i ji kwesị ịdị umeala n’obi?

• olee otú ị ga-esi jiri ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ya?

• gịnị mere i ji kwesị ịna-eme omume ọma, kwesịkwa izere ihe ọ bụla ga-emebi adịm ná mma gị na Chineke?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 17]

Ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi, anyị ga-enwe ike ibi ụdị ndụ ga-eme ka anyị lekwasị anya n’ihe ndị metụtara Alaeze Chineke