Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na-etinyesi Mgbalị Ike . . . n’Izi Ihe”

“Na-etinyesi Mgbalị Ike . . . n’Izi Ihe”

“Na-etinyesi Mgbalị Ike . . . n’Izi Ihe”

JIZỌS gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu na-akpọ m, ‘Onye Ozizi,’ na, ‘Onyenwe anyị,’ ihe unu na-akpọ m zikwara ezi, n’ihi na ọ bụ ihe m bụ.” (Jọn 13:13) Otú a ka Jizọs si mee ka ndị na-eso ụzọ ya mata na ya bụ onye ozizi. Mgbe ọ fọrọ obere ka ọ laghachi eluigwe, o nyere ụmụazụ ya iwu, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. . . . Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Mat. 28:19, 20) Ka oge na-aga, Pọl onyeozi gosikwara otú o si dị mkpa ka mmadụ bụrụ onye na-ezi ndị ọzọ Okwu Chineke. Ọ gwara Timoti bụ́ okenye ọgbakọ, sị: “Na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha, n’inye ndụmọdụ, n’izi ihe. . . . Na-echebara ihe ndị a echiche; na-etinye obi gị dum na ha, ka ọganihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.”—1 Tim. 4:13-15.

Taakwa, anyị na-ezi ihe ma n’ozi ọma ma n’ọmụmụ ihe. Olee otú anyị ga-esi na-etinyesi mgbalị ike n’izi ihe, oleekwa otú ọ ga-esi enyere anyị aka inwe ọganihu n’izi Okwu Chineke?

Ṅomie Onye Ozizi Ukwu Ahụ

Otú Jizọs si kụzie ihe ruru ọtụtụ ndị gere ya ntị n’obi. Lee ihe ndị nọ n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret mere mgbe ọ gwara ha okwu. Luk dere, sị: “Ha niile wee malite ịgba àmà dị mma banyere ya, okwu ọma ndị si n’ọnụ ya na-apụta tụkwara ha n’anya.” (Luk 4:22) Ndị na-eso ụzọ Jizọs ṅomiri otú Nna ha ukwu si kwusaa ozi ọma. Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi m, ọbụna dị ka m bụ onye na-eṅomi Kraịst.” (1 Kọr. 11:1) Pọl ghọrọ aka ochie ‘n’izi ihe n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ’ n’ihi na o ṅomiri otú Jizọs si zie ihe.—Ọrụ 20:20.

Izi Ihe “n’Ọma Ahịa”

Ọrụ Ndịozi isi iri na asaa gosiri ụzọ magburu onwe ya Pọl si kwusaa ozi ọma n’ihu ọha. N’ebe ahụ, anyị na-agụ banyere otú o si zie ozi ọma n’Atens dị na Gris. Pọl hụrụ arụsị ebe ọ bụla o lere anya n’obodo ahụ, ma n’okporo ámá ma n’ebe ọhaneze na-anọ. Obi adịghị Pọl mma maka nke a. Ma, o webigaghị iwe ókè. Kama nke ahụ, “ọ malitere iso ndị Juu na ndị ọzọ bụ́ ndị na-efe Chineke na-atụgharị uche n’ụlọ nzukọ. Kwa ụbọchị, ọ na-esokwa ndị nọ n’ọma ahịa atụgharị uche.” (Ọrụ 17:16, 17) Anyị kwesịrị iṅomi ya. Ọ bụrụ na anyị na-agwa ndị mmadụ okwu otú na-egosi na anyị na-akwanyere ha ùgwù, ọ bụghị ịkatọ ha, o nwere ike ime ka ụfọdụ gee ntị, ha nwekwara ike imecha pụta n’agbụ nke okpukpe ụgha.—Ọrụ 10:34, 35; Mkpu. 18:4.

Ọtụtụ ndị Pọl ziri ozi ọma n’ọma ahịa anabataghị ozi ọma o ziri ha. Ụfọdụ ndị o ziri ozi ọma bụ ndị ọkà ihe ọmụma, bụ́ ndị na-akụzi ihe dị iche n’eziokwu ọ na-ekwusa. Mgbe ndị Pọl gwara okwu kwuru ihe megidere ihe ọ gwara ha, o chebaara ihe ha kwuru echiche. Ụfọdụ kpọrọ ya “onye ekwurekwu,” (nke pụtara “onye na-atụtụ mkpụrụ,” n’asụsụ Grik). Ndị ọzọ sịrị: “O yiri onye na-ekwusa banyere chi ndị mba ọzọ.”—Ọrụ 17:18.

Ma, ọnụ ndị na-ege Pọl ntị kọrọ ya emeghị ka ọ kwụsị ịgwa ha ihe ọ nọ na-agwa ha. Kama nke ahụ, mgbe ha gwara ya ka ọ kọwaa ihe ọ na-ekwu, o ji ohere ahụ kwuo okwu ruru ndị ahụ n’obi nke gosiri na ọ ma nke a na-akọ. (Ọrụ 17:19-22; 1 Pita 3:15) Ka anyị tụlee ihe ọ gwara ha ma mụta ihe ga-eme ka otú anyị si akụzi ihe dịkwuo mma.

Gwa Ndị Mmadụ Ihe Gbasara Ha

Pọl kwuru, sị: “Ndị Atens, ahụrụ m na, n’ihe niile, o yiri ka ùnu na-ekpere chi dị iche iche karịa ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, mgbe m . . . na-eleru anya nke ọma n’ihe unu na-enye nsọpụrụ, ahụkwara m otu ebe ịchụàjà nke ihe e dere n’elu ya bụ: ‘Nye Chi A Na-amaghị Ama.’ Ya mere, ihe unu na-efe n’amaghị ama, ọ bụ ya ka m na-ekwusara unu.”—Ọrụ 17:22, 23.

Pọl leruru anya gburugburu ya. Ihe ndị ọ hụrụ nyeere ya aka ịma ụdị ndị ọ na-agwa okwu. Ọ bụrụkwa na anyị na-eleru anya, anyị ga-ahụ ihe anyị ga-eji zie onye nwe ụlọ ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị ahụ ihe ụmụaka ji egwu egwu n’èzí ma ọ bụkwanụ ihe e sere n’ọnụ ụzọ, anyị ga-ama ụdị ndị anyị na-aga ịgwa okwu. Ọ bụrụ na anyị ma otú ihe si dịrị onye anyị bịara ozi ọma na nke ya, anyị ga-elezi anya mara ihe anyị ga-ekwu nakwa otú anyị ga-esi kwuo ya.—Kọl. 4:6.

Pọl akatọghị ndị Atens. Ma, ọ chọpụtara na ha “na-efe” Chineke n’ụzọ ọ na-anaghị anabata. Pọl mere ka ha ghọta otú ha nwere ike isi na-efe ezi Chineke. (1 Kọr. 14:8) Ọ dị nnọọ mkpa ka anyị na-ekwu okwu doro anya mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị ekwesịghịkwa ịkatọ ndị ọzọ.

Jiri Akọ Na-ekwu Okwu, Akpala Ókè

Pọl kwukwara, sị: “Chineke nke kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya, ebe ọ bụ Onyenwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebi n’ụlọ nsọ ndị e ji aka wuo, aka ụmụ mmadụ adịghịkwa ejere ya ozi dị ka à ga-asị na o nwere ihe na-akpa ya, n’ihi na ya onwe ya na-enye mmadụ niile ndụ na ume na ihe niile.”—Ọrụ 17:24, 25.

N’amaokwu abụọ a, Pọl kwuru na Jehova bụ Onye Na-enye Ndụ. O ji akọ kwuo nke a site n’ịkpọ ya “Onyenwe eluigwe na ụwa.” Ọ bụ ihe ùgwù inyere ndị okpukpe na ndị dị iche iche nwere ezi obi aka ịghọta na ọ bụ Jehova Chineke kere ihe niile.—Ọma 36:9.

Ihe ọzọ Pọl kwuru bụ: “O sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, . . . o kpebikwara oge dị iche iche a kara aka, kpaakwara ebe obibi nke ụmụ mmadụ ókè. ka ha wee chọọ Chineke, ka ha wee sọọ ìsì ma chọta ya n’ezie, ọ bụ ezie na ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.”—Ọrụ 17:26, 27.

Otú anyị si akụziri ndị mmadụ ihe ga-egosi ha ụdị Chi anyị na-efe. Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu, o kwere ka ndị mba niile ‘na-asọ ìsì ma chọta ya n’ezie.’ Anyị kwesịkwara ịna-ezi mmadụ niile ozi ọma n’akpaghị ókè. Anyị ga-agba mbọ na-enyere ndị kwere na Onye Okike dị aka ka ha na ya dịrị ná mma, bụ́ nke ga-eme ka ha nweta ndụ ebighị ebi. (Jems 4:8) Ma, olee otú anyị ga-esi nyere ndị na-ekweghị na Chineke dị aka? Anyị kwesịrị iṅomi Pọl. Ka anyị tụlee ihe ọzọ o kwuru.

Ọ sịrị: “Ọ bụ ya nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-ejegharị, na-adị ndụ, ọbụna dị ka ụfọdụ ndị na-ede abụ uri n’etiti unu kwuru, ‘N’ihi na anyị bụkwa ndị ọ mụrụ.’ Ya mere, ebe ọ bụ na anyị bụ ndị Chineke mụrụ, anyị ekwesịghị iche na Chineke yiri ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ nkume.”—Ọrụ 17:28, 29.

N’amaokwu ndị a, Pọl chọrọ ka ndị Atens gee ya ntị. Iji mee nke a, o kwuru ihe otu onye ha maara ma na-akwanyere ùgwù, nke na-ede uri, kwuru. Anyị kwesịkwara ịgwa ndị anyị na-ezi ozi ọma ihe gbasara ha site n’iji ihe anyị ma na ha ga-ekweta gwa ha okwu. Dị ka ihe atụ, ihe atụ ahụ Pọl dere n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru enweghịkwa mgbagha taa. Ọ sịrị: “Ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.” (Hib. 3:4) Ọ bụrụ na anyị enyere ndị anyị gara ozi ọma na nke ha aka ichebara ihe atụ a dị mfe nghọta echiche, ha ga-ekweta na ihe anyị na-agwa ha bụ eziokwu. Ka anyị tụleekwa ihe ọzọ gosiri na Pọl bụ ezigbo onye ozizi. Okwu ya na-enyere mmadụ aka ime ihe a gwara ya.

Mee Ka Ndị Mmadụ Mara na Oge Agwụwala

Pọl sịrị: “N’eziokwu, Chineke elefuruwo oge amaghị ihe dị otú ahụ anya, ma ugbu a ọ na-agwa ihe a kpọrọ mmadụ na ha niile kwesịrị ichegharị n’ebe niile. N’ihi na o wepụtawo otu ụbọchị nke o zubere ikpe elu ụwa mmadụ bi ikpe n’ezi omume site n’aka otu nwoke onye ọ họpụtara.”—Ọrụ 17:30, 31.

Nkwere Chineke kwere ka ihe ọjọọ dịrị ruo nwa oge mere ka anyị niile nwee ohere igosi Chineke ihe dị anyị n’obi n’ezie. Anyị kwesịrị ime ka ndị mmadụ mara na oge agwụwala, kwesịkwa ịgwa ha okwu otú ga-eme ka ha kweta na Alaeze Chineke, bụ́ nke dị ezigbo nso, ga-ewetara anyị ọtụtụ ngọzi.—2 Tim. 3:1-5.

Ụfọdụ Na-ekwe Ụfọdụ Anaghị Ekwe

Pọl sịrị: “Mgbe ha nụrụ banyere mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ụfọdụ malitere ịkwa emo, ebe ndị ọzọ sịrị: ‘Anyị ga-anụ banyere nke a ọbụna n’oge ọzọ.’ Ya mere, Pọl si n’etiti ha pụọ, ma ndị ikom ụfọdụ sonyeere ya wee ghọọ ndị kwere ekwe.”—Ọrụ 17:32-34.

Ụfọdụ ndị na-ekwere ozi ọma anyị ozugbo ha nụrụ ya; ma, o nwere ike iwetụ oge tupu ndị ọzọ ekweta na ihe anyị na-ekwu bụ eziokwu. Ma, ọ bụrụgodị otu onye ka anyị nyeere aka ka ọ mụta banyere Jehova mgbe anyị ziri ya ozi ọma n’ụzọ doro anya ma kwe nghọta, anyị ga-enwe obi ụtọ na Chineke ji anyị na-adọta ndị mmadụ n’ebe Ọkpara ya nọ.—Jọn 6:44.

Ihe Anyị Ga-amụta

Ka anyị na-echebara ihe ndị ahụ Pọl kwuru echiche, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe banyere otú anyị ga-esi na-akọwara ndị ọzọ eziokwu Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị na-ekwu okwu ihu ọha n’ọgbakọ, anyị ga-agba mbọ ṅomie Pọl site n’iji akọ na-ekwu okwu otú ga-eme ka onye na-ekweghị ekwe ghọta eziokwu Baịbụl ma kwere na ya. Anyị kwesịrị ikwu okwu otú doro anya, ma anyị ga-elezi anya ka anyị ghara ikwu okwu otú ga-eme ka o yie ka anyị na-akatọ ihe onye ahụ kweere. Mgbe anyị na-ekwusakwa ozi ọma, anyị ga-agba mbọ na-ekwu okwu otú ga-eru ndị anyị na-agwa okwu n’obi, jirikwa akọ na-ekwu ya. Ọ bụrụ na anyị emee otú a, anyị na-eme ihe Pọl dụrụ anyị ọdụ ka anyị mee, ya bụ, ka anyị ‘na-etinyesi mgbalị ike n’izi ihe.’

[Foto dị na peeji nke 30]

Pọl ziri ihe otú doro anya, kwe nghọta, o jikwa akọ kwuo okwu

[Foto dị na peeji nke 31]

Anyị na-eṅomi Pọl ma ọ bụrụ na anyị na-echebara ndị anyị na-ezi ozi ọma echiche