Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ọ̀ tọrọ gị ụtọ ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Legodị ma ị ga-azali ajụjụ ndị a na-esonụ:

• Gịnị ga-enyere gị aka ịzụlite ụmụ gị ka ha na-arụ ọrụ dịịrị ha?

‘Na-enye nwa gị ihe nlereanya’ nke ga-eme ka ọ na-akpa àgwà dị mma. (Jọn 13:15) Atụla anya ka nwa gị mee ihe ọ na-agaghị emeli; ka ọ na-etolite, i nwere ike ịgwa ya ka ọ na-adịkwu ọcha, na-emekwu ihe n’oge ma na-eme ihe omume ndị a na-enye ya n’ụlọ akwụkwọ. Nye nwa gị ntụziaka doro anya ka o wee nwee ike ịna-arụ ọrụ ndị dịịrị ya.—5/1, peeji nke 19-20.

• Olee ihe mere na Chineke ataghị Erọn ahụhụ maka nwa ehi ọlaedo ọ kpụrụ?

Erọn mebiri iwu Chineke nyere banyere ikpere arụsị. (Ọpụ. 20:3-5) Ma, Mozis rịọsiri Chineke arịrịọ ike maka Erọn, arịrịọ ahụ ọ rịọrọ “dị ike.” (Jems 5:16) Erọn kwesịrị ntụkwasị obi kemgbe ọtụtụ afọ. N’agbanyeghị na ụmụ Izrel gwasiri ya ike ka ọ kpụọrọ ha nwa ehi ahụ, o mechara mee ihe gosiri na o soghị ha kpeere arụsị, n’ihi na o sooro ụmụ Livaị kwụrụ n’akụkụ Jehova. (Ọpụ. 32:25-29)—5/15, peeji nke 21.

• Olee ebe Ofa dị, bụ́ ebe Baịbụl kpọrọ ebe e si enweta ọlaedo?

Sọlọmọn rụrụ ọtụtụ ụgbọ mmiri n’Iziọn-giba, bụ́ ụgbọ ndị na-esi n’Ofa ebutere ya ọlaedo. (1 Eze 9:26-28) Ọdụ ụgbọ mmiri ahụ dị n’elu elu Alaka Oké Osimiri Akaba nke dị nso n’obodo Ilat na Akaba nke oge a, n’Oké Osimiri Uhie. Nke a na-egosi na ọ ga-abụ na Ofa dị n’Arebia, n’ụsọ Oké Osimiri Uhie ma ọ bụ n’ụsọ oké osimiri dị n’Afrịka ma ọ bụ n’India.—6/1, peeji nke 15.

• Gịnị bụ ‘bọlsọm nke Gilied’? (Jere. 8:22)

Bọlsọm bụ mmiri na-esi ísì ụtọ na-adịkarị mmanụ mmanụ nke na-agbapụta n’osisi dị iche iche dị na Gilied, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan. A na-ete ya n’ọnyá n’ihi na ọ na-agwọ ọrịa. Ọnọdụ ọjọọ Izrel nọ na ya kwesịrị ime ka ha chọọ ọgwụgwọ, ma, ha emeghị otú ahụ. (Jere. 8:9)—6/1, peeji nke 21-22.

• Olee ihe ga-enyere Onye Kraịst di ya ma ọ bụ nwunye ya kwara iko aka idi nke a?

Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye ahụ aka ya dị ọcha na-eme ihe Baịbụl kwuru, o kwesịghị iche na ọ bụ ya kpatara ihe onye nke ọzọ ji kwaa iko. Chineke ma na nkasi obi na agbamume dị gị mkpa. O nwere ike iji ụmụnna gị kasie gị obi.—6/15, peeji nke 30-31.

• Gịnị ka i nwere ike ime iji nyere onye nọ n’ọrịa aka?

Na-ege ntị nke ọma n’ihe ọ na-agwa gị. (Ekli. 3:1, 7) Nwee ọmịiko ma na-echebara ya echiche. (Rom 12:15) Na-ekwu okwu na-agba ume, na-enyekwara ya aka. (Kọl. 4:6; 1 Jọn 3:18) Ahapụla ya. (Ilu 17:17)—7/1, peeji nke 10-13.

• Olee otú anyị si mara na Chineke enweghị mmalite?

Mozis kwuru nke a n’ekpere o kpere. (Ọma 90:2) Ọ bụ ya mere o ji bụrụ Jehova ka a na-etu aha ahụ pụrụ iche bụ́ “Eze mgbe ebighị ebi.” (1 Tim. 1:17)—7/1, peeji nke 28.

• Olee otú i nwere ike isi mee ka ụmụ gị nwee mmasị ịgụ ihe?

Otú nne na nna si eji ịhụnanya akụziri ụmụ ha ihe na ezigbo ihe nlereanya ha na-esetịpụrụ ha ga-eme ka ha nwee mmasị ịgụ ihe. Ihe ọzọ bụ ịhụ na ha nwere akwụkwọ ha ga na-agụ. Na-agụpụta ihe agụpụta. Hụ na ụmụ gị na-etinye ọnụ, na-ekwurịtakwanụ ihe unu gụrụ. Gwa ụmụ gị ka ha na-agụ ihe ka ị na-egere egere, gbaakwa ha ume ka ha na-ajụ gị ajụjụ.—7/15, peeji nke 26.

• Gịnị mere na Jizọs agaghị hụ enyi ya Lazarọs ngwa ngwa mgbe ọ na-arịa ọrịa ka ọ gwọọ ya?

O meela ụbọchị anọ Lazarọs nwuru tupu Jizọs erute ebe ahụ. Nchere Jizọs cheere mere ka ọ gbakwuo àmà banyere Nna ya. Nke a mere ka ọtụtụ ndị kwere na Chineke. (Jọn 11:45)—8/1, peeji nke 14-15.

• Olee ihe bụ́ “ebe ndị dị elu”?

Ha na-abụkarị mbara ala dị n’elu ugwu ma ọ bụ ebe ndị ọzọ a na-anọ efe ofufe ụgha. Mgbe ụfọdụ, a na-ewu ebe ịchụàjà, ogidi dị nsọ ma ọ bụ ogwe osisi dị nsọ n’ebe ndị ahụ. A na-edebekwa arịa ndị ọzọ e ji efe ofufe n’ebe ndị ahụ, bụ́ ihe ha ji eme ihe Chineke kpọrọ asị. (Ọnụ Ọgụ. 33:52)—8/1, peeji nke 23.