Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee ihe nwere ike ịbụ ya mere Jizọs ji gwa nwaanyị a ma na ọ bụ onye mmehie na a gbagharala ya?—Luk 7:37, 48.

Ka Jizọs na-eri nri n’ụlọ otu onye Farisii aha ya bụ Saịmọn, otu nwaanyị bịara ‘nọdụ n’azụ, n’akụkụ ụkwụ Jizọs.’ O ji anya mmiri ya dee ụkwụ Jizọs, jirikwa ntutu isi ya hichaa ya. O ji nwayọọ susuo ụkwụ Jizọs ọnụ ma tee ha mmanụ na-esi ísì ụtọ. Oziọma Luk kwuru na “a maara n’obodo ahụ na [nwaanyị ahụ] bụ onye mmehie.” Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ ọ bụla na-ezughị okè bụ onye mmehie, ma, mgbe ọ bụla Baịbụl kwuru na mmadụ bụ onye mmehie, ọ pụtara na e ji ime mmehie mara onye ahụ. O yiri ka nwaanyị ahụ ọ̀ bụ onye akwụna. Ọ bụ onye a ka Jizọs gwara, sị: “A gbagharawo gị mmehie gị.” (Luk 7:36-38, 48) Gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara? Ebe ọ bụ na e jibeghị Jizọs chụọ àjà mgbapụta, olee otú ọ ga-esi kwe omume na a ga-agbaghara nwaanyị ahụ?

Mgbe nwaanyị ahụ sachara ụkwụ Jizọs wee tee ha mmanụ, tupu Jizọs ekwuo na a gbagharala ya, Jizọs ji otu ihe atụ o mere kọwaara Saịmọn, bụ́ onye ọ bịara na nke ya, otu ihe dị mkpa. Jizọs ji mmehie tụnyere ụgwọ hiri nne wee gwa Saịmọn, sị: “Mmadụ abụọ ji otu onye na-agbazinye mmadụ ego ụgwọ; otu onye ji ụgwọ narị mkpụrụ ego dinarịọs ise, ma onye nke ọzọ ji iri ise. Mgbe ha na-enweghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwụọ ụgwọ ha ji, ọ gbaghaara ha abụọ kpamkpam. Ònye n’ime ha ga-ahụ ya n’anya karị?” Saịmọn zara, sị: “Echere m na ọ bụ onye ahụ ọ gbaghaara ego ka ukwuu kpamkpam.” Jizọs wee sị ya: “Ị zatara ya.” (Luk 7:41-43) Anyị niile ji Chineke ụgwọ irubere ya isi, n’ihi ya, ọ bụrụ na anyị enupụrụ ya isi mee mmehie, ọ pụtara na anyị akwụghị ya ụgwọ anyị ji ya. Otú a ka anyị si eji nwayọọ nwayọọ eji ya nnukwu ụgwọ. Ma, Jehova dị ka onye na-agbazinye ndị mmadụ ego nke dị njikere ịgbaghara ndị ji ya ụgwọ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-arịọ Chineke n’ekpere, sị: “Gbaghara anyị ụgwọ anyị ji, dị ka anyị gbaghakwaara ndị ji anyị ụgwọ.” (Mat. 6:12) Luk 11:4 kwuru na ụgwọ ahụ bụ mmehie.

Gịnị mere Chineke ji gbaghara ndị mmehie n’oge ochie? N’ikwekọ n’ikpe ziri ezi Chineke na-ekpe, bụ́ nke zuru okè, onye mere mmehie kwesịrị ịnwụ. Ọ bụ ya mere Adam ji jiri ndụ ya kwụọ ụgwọ mmehie ya. Ma, n’Iwu ahụ Chineke nyere mba Izrel, e nwere ike ịgbaghara onye mmehie ma ọ bụrụ na o jiri anụmanụ chụọrọ Jehova àjà. Pọl onyeozi sịrị: “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a na-eji ọbara eme ka ihe niile dị ọcha dị ka Iwu ahụ si dị, ọ gwụla ma à wụsịrị ọbara, a gaghị enwe mgbaghara ọ bụla.” (Hib. 9:22) O nweghị ihe ọzọ ndị Juu maara mmadụ ga-eme ka Chineke wee gbaghara ya. Ka a sịkwa ihe mere na ndị nụrụ mgbe Jizọs gwara nwaanyị ahụ ihe ahụ anabataghị ihe o kwuru. Ndị ha na Jizọs nọ na-eri nri jụrụ ibe ha, sị: “Ònye bụ onye a nke na-agbaghara mmehie?” (Luk 7:49) Gịnịzi mere a ga-eji gbaghara nwaanyị a bụ́ onye mmehie?

Amụma mbụ e buru mgbe di na nwunye mbụ mehiere mere ka a mata nzube Jehova, nke bụ́ na a ga-enwe “mkpụrụ,” bụ́ nke Setan na “mkpụrụ” ya ga-emerụ ahụ́ n’ikiri ụkwụ. (Jen. 3:15) Setan merụrụ Jizọs ahụ́ n’ikiri ụkwụ mgbe ndị iro Chineke gburu Jizọs. (Gal. 3:13, 16) Ọbara Kraịst a wụsịrị bụ ihe e ji gbapụta ndị mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ. Ebe ọ bụ na o nweghị ihe ga-emeli ka nzube Jehova ghara imezu, ozugbo o kwuru ihe ahụ dị na Jenesis 3:15, Chineke weere ya na a kwụọla ihe mgbapụta ahụ. O nweziri ike ịgbaghara ndị nwere okwukwe ná nkwa ndị o kwere ụmụ mmadụ.

Tupu Kraịst abịa n’ụwa, e nwere ọtụtụ ndị bụ́ ndị ezi omume n’anya Jehova. Ụfọdụ n’ime ha bụ Inọk, Noa, Ebreham, Rehab, na Job. Okwukwe ha nwere mere ka ha na-atụ anya mgbe Chineke ga-emezu nkwa ya. Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs dere, sị: “Ebreham nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ, e wee gụọrọ ya nke ahụ dị ka ezi omume.” Jems kwuru banyere Rehab, sị: “Otú ahụkwa, ọ̀ bụ na e siteghịkwa n’ọrụ kpọọ nwaanyị akwụna ahụ bụ́ Rehab onye ezi omume?”—Jems 2:21-25.

Eze Devid nke chịrị Izrel n’oge ochie mere ọtụtụ mmehie dị oké njọ, ma, o nwere okwukwe siri ike n’ebe ezi Chineke nọ, o jikwa obi ya dum chegharịa mgbe ọ bụla o mere mmehie. Akwụkwọ Nsọ kwukwara, sị: “Chineke wepụtara [Jizọs] dị ka àjà ime udo; udo a na-abịa site n’inwe okwukwe n’ọbara ya. Nke a bụ iji gosi ezi omume nke ya, n’ihi na ọ na-agbaghara mmehie ndị e mere n’oge gara aga mgbe Chineke nọ na-enwe ndidi; iji gosi ezi omume nke ya n’oge a a kara aka, ka o wee bụrụ onye ezi omume ọbụna mgbe ọ na-akpọ onye nwere okwukwe n’ebe Jizọs nọ onye ezi omume.” (Rom 3:25, 26) Jehova gbaghaara Devid n’ihi àjà mgbapụta a ga-eji Jizọs chụọ n’ọdịnihu. Nke a emegideghị ikpe ziri ezi e ji mara ya.

O doro anya na ọnọdụ nwaanyị ahụ nke tere ụkwụ Jizọs mmanụ yiri nke Devid. O biri ndụ rụrụ arụ, ma, o chegharịala. Nwaanyị ahụ chọpụtara na ọ dị mkpa ka a gbapụta ya ná mmehie, o mekwara ihe gosiri na ọ nabatara Jizọs, bụ́ onye Jehova ga-eji agbapụta ndị mmadụ. N’agbanyeghị na a chụbeghị àjà ihe mgbapụta ahụ n’oge ahụ, o doro anya na ọ dịghị ihe ga-eme ka a ghara ịchụ ya. Ọ bụ nke a mere e ji jiri ya na-agbaghara ndị dị ka nwaanyị ahụ mmehie tupu a chụọ ya. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ya, sị: “A gbagharawo gị mmehie gị.”

Akụkọ a gosiri nnọọ na Jizọs agbaraghị ndị mmehie ọsọ. O meere ha ihe ọma. Jehova dịkwa njikere ịgbaghara ndị mmehie chegharịrị echegharị. Nke a na-agba nnọọ anyị, bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ume.

[Foto dị na peeji nke 7]

A gụọrọ ha ya dị ka ezi omume