Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekwela Ka Otú Ụwa Si Ele Ihe Anya Gbochie Gị Ime Uche Chineke

Ekwela Ka Otú Ụwa Si Ele Ihe Anya Gbochie Gị Ime Uche Chineke

Ekwela Ka Otú Ụwa Si Ele Ihe Anya Gbochie Gị Ime Uche Chineke

IHE e weere na ọ dị mma ma ọ bụ kwesị ekwesị n’otu obodo nwere ike ịdị njọ n’obodo ọzọ. Otú ndị mmadụ si ele ihe anya na-agbanwekwa ka oge na-aga. N’ihi ya, mgbe anyị na-agụ akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl, bụ́ ihe ndị mere n’oge ochie, anyị kwesịrị iburu otú ndị mmadụ si eme ihe n’oge ahụ n’uche, kama iji aka anyị kpebie ihe ihe anyị na-agụ pụtara.

Ka anyị were ihe abụọ e kwuru okwu ha ọtụtụ ebe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst dị ka ihe atụ, ha bụ, ùgwù na ihere. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọta nnọọ amaokwu Baịbụl ndị kwuru banyere ùgwù na ihere, anyị kwesịrị ibu ụzọ chebara otú ndị mmadụ si ele ha anya n’oge ahụ echiche.

Ihe Ndị Biri Ndụ na Narị Afọ Mbụ Ji Kpọrọ Ihe

Otu ọkà mmụta kwuru, sị: “Ndị Gris, ndị Rom, na ndị Judia lere ùgwù na ihere anya dị ka ihe ndị dị oké mkpa. Ọtụtụ ndị dị njikere ịnwụ ebe ha na-achọ otú ha ga-esi bụrụ ndị a na-akwanyere ùgwù na ndị a ma ama.” Nke a mere ka otú ndị ọzọ si ele ha anya na-echu ha ụra.

N’ebe e ji ọkwá na ùgwù kpọrọ oké ihe, ọ na-agụ ma ndị nnukwu mmadụ ma ndị ohu agụụ ka a na-anụ aha ha. Ọ bụghị naanị otú mmadụ si ele onwe ya anya na-egosi na ọ bụ onye a na-akwanyere ùgwù kama ọ bụ otú ndị ọzọ si ele ya anya. Ịkwanyere mmadụ ùgwù pụtara ikwu n’ihu ọha na onye ahụ mere ihe o kwesịrị ime. Ọ pụtakwara inwe mmasị n’ebe mmadụ nọ n’ihi na ọ bara ọgaranya, ma ọ bụ n’ihi na ọ nọ n’ọkwá dị elu, ma ọ bụkwanụ n’ihi na ọ bụ onye a ma ama, bụ́ ihe ndị na-eme ka a na-akwanyere ya ùgwù. E nwekwara ike ịkwanyere mmadụ ùgwù n’ihi ezigbo ihe ọ na-eme ma ọ bụkwanụ n’ihi na ọ na-eme nke ọma karịa ndị ọzọ. Ma, ịkọcha mmadụ n’ihu ọha na-eweta ihere ma ọ bụ mmechuihu. Ihe na-akpata ihere ma ọ bụ mmechuihu abụghị otú mmadụ si ele onwe ya anya ma ọ bụ ihe obi ya na-agwa ya banyere onwe ya, kama ọ bụ otú ọha mmadụ si akatọ ya.

Mgbe Jizọs kwuru banyere ịgwa mmadụ ka ọ nọdụ “n’ebe kasị elu” ma ọ bụ “n’ebe kasị ala” n’oriri, ihe ọ na-ekwu okwu ya bụ ihe a na-eme n’oge ahụ, ya bụ, ịkwanyere mmadụ ùgwù ma ọ bụ imenye mmadụ ihere. (Luk 14:8-10) Ndị na-eso ụzọ Jizọs rụrụ ụka banyere “onye ga-abụ onye kasị ukwuu n’ime ha” ihe dị ka ugboro abụọ. (Luk 9:46; 22:24) Ihe a ha mere gosiri ihe na-echu ndị oge ha ụra. N’oge ahụ, ndị ndú okpukpe ndị Juu, bụ́ ndị mpako na-azọkarị ọkwá, chere na ozi ọma Jizọs na-ezi ga-eme ka ndị mmadụ ghara ịkwanyere ha ùgwù, ma ọ bụkwanụ ghara irubere ha isi. Ma, ha kụrụ afọ n’ala mgbe ha gbalịrị igosi ndị mmadụ na ha ka Jizọs mara ihe.—Luk 13:11-17.

Na narị afọ mbụ, ihe ọzọ ndị Juu, ndị Gris, na ndị Rom na-ele anya dị ka ihe ihere bụ “ịkpụrụ mmadụ wee bo ya ebubo n’ihu ọha na o mere ihe ọjọọ.” A na-ele ịtụ mmadụ ịgà anya ka ihe ihere. Nke a na-emechu mmadụ ihu n’ihu ndị enyi ya, ndị ezinụlọ ya, na ndị obodo ya, ma ò mere ihe ahụ e boro ya ebubo ya ma ọ bụ na o meghị ya. Ihe dị otú a ga-eme ka onye ahụ na-eche na o nweghị ihe ya bụ, meekwa ka ndị ọzọ na-ele ya anya ọjọọ. Ihe ka nke a emechu mmadụ ihu bụ iyipụ onye ahụ uwe ma ọ bụ ịpịa ya ụtarị. Ime mmadụ otú a na-eme ka a na-eleda ya anya ma na-akwa ya emo, ọ na-emekwa ka a ghara ịkwanyere ya ùgwù.

O nweghị ihe ihere karịrị ịkpọgide mmadụ n’osisi ịta ahụhụ. Otu ọkà mmụta aha ya bụ Martin Hengel sịrị na ọ bụ otú ahụ ka e si “egbu ndị ohu. E si otú a eweda onye ahụ ala, menye ya ihere ma ọ bụkwanụ mekpọọ ya ọnụ.” Ndị mmadụ na-akparị ndị ezinụlọ na ndị enyi onye ahụ, nke nwere ike ime ka ha jụ ya. E menyere ndị niile chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na narị afọ mbụ nke Oge Anyị ihere n’ihu ọha n’ihi na a kpọgburu Jizọs n’osisi ịta ahụhụ. Ọ ga-abụ na ọtụtụ ndị lere onye ọ bụla nke bụ́ onye na-eso ụzọ onye a kpọgburu n’osisi ịta ahụhụ anya dị ka onye iberiibe. Pọl onyeozi dere, sị: “Anyị na-ekwusa Kraịst a kpọgidere n’osisi, ọ bụụrụ ndị Juu ihe ịsụ ngọngọ, ma bụụrụ ndị mba ọzọ ihe nzuzu.” (1 Kọr. 1:23) Olee otú Ndị Kraịst oge ochie si merie nsogbu ahụ?

Ihe Ndị Kraịst Ji Kpọrọ Ihe Dị Iche

Ndị Kraịst oge ochie rubere isi n’iwu ma gbalịa ka ha ghara ime ihe ga-ewetara ha ihere. Pita onyeozi dere, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịta ahụhụ n’ihi ịbụ onye na-egbu ọchụ ma ọ bụ onye ohi ma ọ bụ onye ajọ omume ma ọ bụ onye na-enyonye anya n’ihe na-agbasaghị ya.” (1 Pita 4:15) Ma, Jizọs buru amụma na a ga-akpagbu ndị na-eso ụzọ ya n’ihi aha ya. (Jọn 15:20) Pita dere, sị: “Ọ bụrụ na [mmadụ] na-ata ahụhụ n’ihi ịbụ Onye Kraịst, ka ihere ghara ime ya, kama ka ọ na-enye Chineke otuto.” (1 Pita 4:16) Ihe mere ka ihere ghara ime Ndị Kraịst maka na ha bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst bụ na ha eleghị ihe anya otú ndị mmadụ si ele ihe anya n’oge ahụ.

Ndị Kraịst ekweghị ka ndị ọzọ mee ka ha kpawa àgwà ka ha. Ndị dịrị ndụ na narị afọ mbụ weere ya na ọ bụ iberiibe mmadụ ikwu na onye a kpọgburu n’elu osisi bụ Mesaya. Ọ ga-abụ na nke a mere ka Ndị Kraịst chewe ma hà na-emekwa ihe ziri ezi. Ma, ha ga na-eso Jizọs iji gosi na ha kwere na ọ bụ Mesaya, ọ bụrụgodị na ndị ọzọ ga-achị ha ọchị. Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla ihere m na ihere okwu m na-eme n’ọgbọ a nke na-akwa iko, nke na-emekwa mmehie, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke mmadụ mgbe ọ ga-abịarute n’ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.”—Mak 8:38.

Taa, ndị mmadụ nwere ike ịna-eme anyị ihe nwere ike ime ka anyị kwụsị ịbụ Ndị Kraịst. Ndị nwere ike ime anyị ụdị ihe a bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị agbata obi anyị ma ọ bụ ndị ọrụ ibe anyị, bụ́ ndị ga-agbalị ime ka anyị tinye aka n’omume rụrụ arụ, ka anyị ghara ịkwụwa aka ọtọ ma ọ bụkwanụ mee ka anyị tinye aka n’ihe ndị ọzọ a na-enyo enyo. Ndị dị otú a nwere ike imenye anyị ihere n’ihi na anyị anaghị etinye aka n’ihe na-ezighị ezi. Gịnị ka anyị kwesịrị ime?

Ṅomie Ndị Leghaara Ihere Anya

Jizọs nwụrụ ọnwụ ihere iji gosi na o nweghị ihe ga-egbochi ya ime uche Jehova. “O diri osisi ịta ahụhụ, leghara ihere anya.” (Hib. 12:2) Ndị iro Jizọs mara ya ụra, gbụọ ya ọnụ mmiri, yipụ ya uwe, pịa ya ụtarị, kpọgbuo ya, kwaakwa ya emo. (Mak 14:65; 15:29-32) Ma, Jizọs leghaara ihere a niile ha nwara imenye ya anya. Olee otú o si mee nke a? Ihe ndị ahụ ha mere ya emeghị ka ọ daa mbà. Jizọs ma na Jehova na-akwanyere ya ùgwù, o nweghịkwa mgbe ọ chọrọ ka ndị mmadụ too ya. N’agbanyeghị na Jizọs nwụrụ ọnwụ ka ohu, Jehova kwanyeere ya ùgwù site n’ịkpọlite ya n’ọnwụ, nyekwa ya ọkwà a kacha akwanyere ùgwù, ya bụ, onye na-esote ya. Ndị Filipaị 2:8-11, sịrị: “[Kraịst Jizọs] wedara onwe ya ala wee rube isi ruo ọnwụ, ee, ọnwụ n’osisi ịta ahụhụ. N’ihi nke a, Chineke buliri ya elu ka ọ nọrọ n’ọkwá ka elu, o jikwa obiọma nye ya aha dị elu karịa aha ọ bụla ọzọ, ka ikpere ọ bụla wee gbuo n’ala n’aha Jizọs, ma nke ndị nọ n’eluigwe ma nke ndị nọ n’elu ụwa ma nke ndị nọ n’okpuru ala, ka ire ọ bụla wee kwupụtakwa na Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị iji wetara Chineke bụ́ Nna otuto.”

O doro Jizọs anya na otú a ga-esi egbu ya ga-eweta ihere. Ihe kacha nye ya nsogbu bụ otú ikpe a ga-ama ya na o kwuluru Chineke ga-esi wetara Nna ya nkọcha. Jizọs rịọrọ Jehova ka ọ ghara ikwe ka ihe ihere a mee ya. O kpere ekpere, sị: “Wepụ iko a n’ebe m nọ.” Ma, Jizọs mere uche Chineke. (Mak 14:36) Jizọs diri ihe ahụ niile e mere ya ma leghara ihere anya. Ọ bụ naanị ndị na-eche echiche ka ndị ha na ha dịkọrọ ndụ n’oge ahụ ka ihere ga-eme. Jizọs emeghị otú ahụ.

E jidekwara ndị na-eso ụzọ Jizọs pịa ha ụtarị. N’anya ọtụtụ ndị, nke a bụ ihe ihere. E ledara ha anya. Ma, nke a akụdaghị ha mmụọ. Ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs diri okwu ọjọọ ndị mmadụ gwara ha, legharakwa ihere anya. (Mat. 10:17; Ọrụ 5:40; 2 Kọr. 11:23-25) Ha ma na ha kwesịrị ‘ibuli osisi ịta ahụhụ ha kwa ụbọchị, nọgidekwa na-eso Jizọs.’—Luk 9:23, 26.

Oleekwanụ banyere anyị taa? Ihe ụwa na-ele anya ka ihe nzuzu, ihe na-adịghị ike, na ihe dị ala ka Chineke na-ele anya ka ihe maara ihe, ihe dị ike, na ihe e kwesịrị ịkwanyere ùgwù. (1 Kọr. 1:25-28) Ọ̀ bụ na ọ́ bụghịrị anyị iberiibe ikwe ka ọ bụrụ naanị otú ụwa si ele ihe anya ga-agwa anyị otú anyị ga-esi na-akpa àgwà?

Ndị chọrọ ka ụwa na-akwanyere ha ùgwù ga na-echegbu onwe ha maka ihe ụwa na-eche banyere ha. Ma, dị ka Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya n’oge ochie mere, ihe anyị chọrọ bụ ka anyị na Jehova nọgide na-abụ Enyi. Ya mere, anyị kwesịrị ịkwanyere ihe ndị ọ na-akwanyere ùgwù ùgwù, kwesịkwa iwere ihe ndị o lere anya ka ihe ihere ka ihe ihere.

[Foto dị na peeji nke 4]

Ọ bụghị ihe ụwa weere ka ihe ihere ka Jizọs weere ka ihe ihere