Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ihe Mgbapụta Ahụ Si Azọpụta Anyị

Otú Ihe Mgbapụta Ahụ Si Azọpụta Anyị

Otú Ihe Mgbapụta Ahụ Si Azọpụta Anyị

“Onye nwere okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ, kama ọnụma Chineke na-adịgide n’ahụ́ ya.”—JỌN 3:36.

1, 2. Olee otu n’ime ihe mere e ji malite ibipụta Zion’s Watch Tower?

ỤLỌ NCHE nke anọ, bụ́ nke e bipụtara n’Ọktoba 1879, kwuru, sị: “O nweghị onye na-amụ Baịbụl nke ọma nke na-amaghị uru ọnwụ Jizọs bara.” Ụlọ Nche ahụ ji ndụmọdụ gbara ọkpụrụkpụ mechie. Ọ sịrị: “Anyị kwesịrị ịjụ ihe ọ bụla na-akatọ ọnwụ Jizọs, ma ọ bụ ihe ọ bụla na-egosi na ọnwụ Jizọs abụghị àjà ime udo maka mmehie.”—Gụọ 1 Jọn 2:1, 2.

2 Otu n’ime ihe mere e ji malite ibipụta Zion’s Watch Tower n’ọnwa Julaị 1879 bụ ka e wee gosi na ihe mgbapụta ahụ e kwuru okwu ya na Baịbụl dị ezigbo mkpa. Ihe ndị e dere na ya bụ ‘nri bịara n’oge kwesịrị ekwesị,’ n’ihi na n’oge ahụ, ọtụtụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst malitere ikwu na o nweghị otú ọnwụ Jizọs ga-esi agbapụta anyị ná mmehie. (Mat. 24:45) Ọtụtụ ndị n’oge ahụ malitere ikwere n’ozizi evolushọn, bụ́ nke megidere eziokwu ahụ bụ́ na mmadụ ezughịzi okè. Ndị kweere n’ozizi evolushọn na-ekwu na ụmụ mmadụ na-aka mma n’onwe ha, nakwa na ihe mgbapụta adịghị ha mkpa. N’ihi ya, ndụmọdụ ahụ Pọl nyere Timoti kwesịrị nnọọ ekwesị. Ọ sịrị: “Chee ihe ahụ e nyefere n’aka gị nche, na-agbakụta okwu nzuzu ndị na-emerụ ihe dị nsọ azụ nakwa ihe ndị ahụ na-emegiderịta onwe ha nke a na-akpọ ‘ihe ọmụma’ n’ụzọ ụgha. N’ihi iji ihe ọmụma dị otú ahụ na-akpa nganga, ụfọdụ adapụwo n’okwukwe.”—1 Tim. 6:20, 21.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

3 O doro anya na i kpebisiri ike na ị gaghị ‘adapụ n’okwukwe.’ Ya bụrụ otú ahụ, i kwesịrị ịtụle ajụjụ ndị a: Gịnị mere ihe mgbapụta ahụ ji dị m mkpa? Gịnị ka o furu Jehova na Jizọs? Olee otú ihe a dị okè ọnụ ahịa nke nwere ike ịzọpụta m n’iwe Chineke ga-esi baara m uru?

E Nwere Ike Ịzọpụta Anyị n’Iwe Chineke

4, 5. Gịnị na-egosi na ọnụma Chineke na-adịgide n’usoro ihe ọjọọ dị ugbu a?

4 Baịbụl na ihe ndị merela eme gosiri na “ọnụma Chineke na-adịgide n’ahụ́” ụmụ mmadụ kemgbe Adam mehiere. (Jọn 3:36) Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ. Ọchịchị Setan enweghị ike ịnapụta ụmụ mmadụ n’ihe ọjọọ na-eme ha, o nweghịkwa ọchịchị mmadụ nke nwere ike igboro ndị niile ọ na-achị mkpa ha. (1 Jọn 5:19) Ọ bụ ya mere agha, ime mpụ, na ịda ogbenye ji na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ.

5 Ihe ndị a na-egosi na usoro ihe ọjọọ dị ugbu a enweghị ngọzi Jehova. Pọl kwuru na “e si n’eluigwe na-ekpughe ọnụma Chineke megide asọpụrụghị Chineke.” (Rom 1:18-20) Ya mere, ndị niile na-achọghị ichegharị ná mmehie ha ga-aghọrọ mkpụrụ ha kụrụ. Taa, ihe na-egosi na Chineke na-ewesa Setan iwe bụ okwu ikpe Chineke nke a na-awụsa ụwa Setan dị ka ihe otiti. Okwu ikpe ndị a dị n’ọtụtụ akwụkwọ anyị e ji amụ Baịbụl.—Mkpu. 16:1.

6, 7. Olee ọrụ Ndị Kraịst e tere mmanụ na-ebute ụzọ na ya, oleekwa ihe ndị nọ n’ụwa Setan ka nwere ike ime?

6 Nke a ò gosiri na oge e nwere ike ịnapụta ụmụ mmadụ n’aka Setan ka ha na Chineke dịrị ná mma agaala? Mba. N’ihi na ndị mmadụ na Jehova ka nwere ike ịdị ná mma. Ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị bụ́ “ndị nnọchiteanya nọ n’ọnọdụ Kraịst,” na-ebute ụzọ n’ikwusa ozi ọma ahụ e ji na-akpọ ndị nke mba niile òkù, sị: “Meenụ ka unu na Chineke dị ná mma.”—2 Kọr. 5:20, 21.

7 Pọl onyeozi kwuru na Jizọs “ga-anapụta anyị n’ọnụma ahụ nke na-abịanụ.” (1 Tesa. 1:10) Oge Jehova ga-ewesa ụwa iwe ikpeazụ, ọ ga-ebibi ndị mmehie na-achọghị ichegharị. (2 Tesa. 1:6-9) Ole ndị ka ọ na-agaghị ebibi? Baịbụl kwuru, sị: “Onye nwere okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ, kama ọnụma Chineke na-adịgide n’ahụ́ ya.” (Jọn 3:36) N’eziokwu, mgbe Chineke ga-ewesa ụwa iwe ikpeazụ, ọ gaghị ebibi ndị dị ndụ nwere okwukwe na Jizọs nakwa n’ihe mgbapụta ahụ.

Uru Ihe Mgbapụta ahụ Bara

8. (a) Olee ihe ọma Adam na Iv gaara enweta? (b) Olee otú Jehova si gosi na ya bụ Chineke nke na-ekpe ikpe ziri ezi?

8 Adam na Iv zuru okè mgbe e kere ha. A sị na ha nọgidere na-erubere Chineke isi, ha na ụmụ ha gaara ebi n’ụwa bụ́ Paradaịs na-enwe obi ụtọ. Ma, ọ dị mwute na ha kpachaara anya nupụrụ Chineke isi. Nke a mere ka Chineke maa ha ikpe na ha ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi, ọ chụpụkwara ha na Paradaịs ahụ. Mmehie adịla n’ụwa tupu Adam na Iv amalite ịmụ ụmụ, ha mechakwara kaa nká nwụọ. Nke a gosiri na Jehova mere ihe o kwuru. Chineke bụkwa onye na-ekpe ikpe ziri ezi. O bu ụzọ gwa Adam na ha ga-anwụ ma ha rie mkpụrụ osisi ahụ ọ sịrị ha erila, ha nwụkwara.

9, 10. (a) Gịnị mere ụmụ Adam ji anwụ anwụ? (b) Olee ihe anyị ga-eme ka anyị wee ghara ịnwụ ọnwụ ebighị ebi?

9 Anyị bụ́ ụmụ Adam ketara ezughị okè, ọ bụ ya mere anyị ji na-eme mmehie ma na-anwụ anwụ. Adam amụtabeghị ụmụ mgbe o mehiere. N’ihi ya, anyị so ná ndị a mara ikpe ọnwụ. Ọ bụrụ na Jehova akwụsị ọnwụ n’ebughị ụzọ jiri ndụ zuru okè gbapụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie, ọ pụtara na o meghị ihe o kwuru. Pọl kwuchitere ọnụ anyị niile mgbe ọ sịrị: “Anyị maara na Iwu ahụ bụ ihe ime mmụọ; ma abụ m anụ ahụ́, onye e rere ịnọ n’okpuru mmehie. Lee nhụsianya m nọ na ya! Ònye ga-anapụta m n’ahụ́ nke na-eduga m n’ịnwụ ụdị ọnwụ a?”—Rom 7:14, 24.

10 Ọ bụ naanị Jehova Chineke ga-ewetali ihe ọ ga-eji gbaghara anyị mmehie anyị ma napụta anyị n’ikpe a mara anyị na anyị ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi. Otú o si mee nke a bụ na o zitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ka a mụọ ya n’ụwa ka ọ bụrụ mmadụ zuru okè, onye nwere ike inye ndụ ya ka e jiri ya gbapụta anyị. Jizọs adịghị ka Adam, ọ nọgidere na-abụ onye zuru okè. N’eziokwu, “ọ dịghị mmehie o mere.” (1 Pita 2:22) N’ihi nke a, Jizọs nwere ike ịmụ ụmụ zuru okè. Ma, kama ime otú a, o kwere ka ndị iro Chineke gbuo ya ka o wee nwee ike ịbụ nna ụmụ Adam, bụ́ ndị mmehie. Nke a ga-emekwa ka ndị nwere okwukwe n’Ọkpara ahụ dị ndụ ebighị ebi. Akwụkwọ Nsọ kwuru, sị: “E nwere otu Chineke, na otu onye ogbugbo n’etiti Chineke na mmadụ, onye bụ́ mmadụ, ya bụ, Kraịst Jizọs, onye nyere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ maka mmadụ niile.”—1 Tim. 2:5, 6.

11. (a) Olee ihe atụ e nwere ike iji kọwaa uru ihe mgbapụta ahụ bara? (b) Olee ndị ihe mgbapụta ahụ ga-abara uru?

11 Anyị nwere ike iji otú ihe si dịrị ndị dabara n’ụgwọ n’ihi na e rikpọrọ ego dị n’ụlọ akụ̀ ha tinyere ego mee ihe atụ nke uru ihe mgbapụta ahụ bara. A tụrụ ndị nwe ụlọ akụ̀ ahụ mkpọrọ ọtụtụ afọ. Oleekwanụ banyere ndị tinyere ego na ya, bụ́ ndị aka ha dị ọcha? Ebe ha na-enweghịzi ego, o nweghị otú ha ga-esi pụta n’ọnọdụ ọjọọ ha nọ na ya ọ gwụkwala ma otu ọgaranya nwere obiọma ò weghaara ụlọ akụ̀ ahụ ma nyeghachi ha ego ha, ha ewee kwụọ ụgwọ ha ji. Ọ bụ ụdị ihe ahụ ka Jehova Chineke na Ọkpara ọ hụrụ n’anya mere. Ha ji ọbara Jizọs o ji chụọ àjà zụrụ ụmụ Adam ma kagbuo ụgwọ ha ji, bụ́ mmehie. Ọ bụ ya mere Jọn Onye Na-eme Baptizim ji kwuo banyere Jizọs, sị: “Lee Nwa Atụrụ Chineke nke na-ewepụ mmehie nke ụwa!” (Jọn 1:29) Ndị e wepụrụ mmehie ha gụnyere ma ndị dị ndụ ma ndị nwụrụ anwụ.

Ihe Ihe Mgbapụta ahụ Furu

12, 13. Gịnị ka anyị na-amụta n’otú Ebreham si kwere iji Aịzik chụọ àjà?

12 Anyị agaghị aghọtachali kpọmkwem ihe ihe mgbapụta ahụ furu Nna anyị nke eluigwe na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya. Ma, Baịbụl kọrọ ihe ndị nwere ike inyere anyị aka ichebara ihe a na-ekwu echiche. Dị ka ihe atụ, chegodị otú obi dị Ebreham mgbe o mere ihe Chineke gwara ya wee gaa Moraya, bụ́ njem were ya ụbọchị atọ. Chineke sịrị ya: “Biko, kpọrọ nwa gị nwoke, nwa ị mụrụ naanị ya, onye ị hụrụ n’anya nke ukwuu, bụ́ Aịzik, gaa n’ala Moraya, nọrọkwa n’ebe ahụ chụọ ya dị ka àjà nsure ọkụ n’otu n’ime ugwu m ga-akpọrọ gị aha.”—Jen. 22:2-4.

13 Ebreham mechara ruo ebe ahụ. Cheedị otú o si wute ya mgbe o kere Aịzik agbụ ụkwụ na aka n’elu ebe ịchụàjà ọ rụrụ. Chegodị otú o si wute Ebreham mgbe o weliri mma ka o gbuo nwa ya! Cheekwa otú obi dị Aịzik ka o dina n’elu ebe ịchụàjà ahụ, na-echere ụdị ihe ụfụ ọ ga-edi mgbe nna ya ga-egbu ya. Mmụọ ozi Jehova ekweghị ka Ebreham gbuo ya. Ihe ahụ Ebreham na Aịzik mere na-enyere anyị aka ịghọta ihe o furu Jehova mgbe o kwere ka ndị na-ejere Setan ozi gbuo Ọkpara ya. Otú Aịzik si rubere nna ya isi bụ ihe atụ nke otú Jizọs si kwere taa ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị.—Hib. 11:17-19.

14. Olee ihe mere Jekọb nke ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ihe mgbapụta ahụ furu?

14 E nwekwara ike iji ihe mere Jekọb mee ihe atụ iji gosi ihe ihe mgbapụta ahụ furu. Ọ bụ Josef ka Jekọb kacha hụ n’anya n’ụmụ ya niile. Ọ dị mwute na ụmụnne Josef nweere ya anyaụfụ ma kpọ ya asị. Ma, mgbe nna ya gwara ya ka ọ gaa mara otú ụmụnne ya mere, o kwere ịga. N’oge ahụ, ebe ha nọ na-azụ atụrụ dị ihe dị ka otu narị kilomita ma e si ebe ha bụ́ Hibrọn gbagowe ya. Chegodị otú obi dị Jekọb mgbe ụmụ ya chịlatara uwe mwụda Josef ọbara juru. O tiri mkpu, sị: “Ọ bụ uwe mwụda nwa m! Ọ ghaghị ịbụ na ajọ anụ ọhịa eriwo ya! Ọ ghaghị ịbụ na anụ ọhịa adọriwo Josef!” Ihe a niile wutere Jekọb nke ukwuu, nke mere ka o ruoro Josef uju ọtụtụ ụbọchị. (Jen. 37:33, 34) Otú ihe si ewute ụmụ mmadụ na-ezughị okè abụghị otú o si ewute Jehova. Ma, ichebara ihe a mere Jekọb echiche nwere ike inyetụrụ anyị aka ịghọta otú obi dị Chineke mgbe e mesoro Ọkpara ọ hụrụ n’anya mmeso ọjọọ n’ụwa ma mee ka ọ nwụọ ọnwụ ike.

Otú Ihe Mgbapụta ahụ Si Abara Anyị Uru

15, 16. (a) Olee otú Jehova si gosi na ya nabatara àjà mgbapụta ahụ? (b) Olee otú i sirila rite uru n’ihe mgbapụta ahụ?

15 Jehova Chineke kpọlitere Ọkpara ya na-erubere ya isi n’ọnwụ ka ọ bụrụ mmụọ dị ebube. (1 Pita 3:18) Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya ugboro ugboro ruo ụbọchị iri anọ. O mere ka okwukwe ha sie ike ma kwadebe ha maka nnukwu ọrụ nkwusa ha ga-arụ. Ọ rịgoziri eluigwe. Mgbe o ruru ebe ahụ, o chere uru nke ọbara ya e ji chụọ àjà n’ihu Chineke, ka e wee jiri ya gbaghara ezigbo ndị na-eso ụzọ ya mmehie ha, bụ́ ndị nwere okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ. Jehova Chineke gosiri na ya nabatara àjà mgbapụta ahụ e ji Kraịst chụọ site n’ime ka Jizọs wụkwasị ndị na-eso ụzọ ya gbakọtara na Jeruselem mmụọ nsọ n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 O.A.—Ọrụ 2:33.

16 Ndị na-eso ụzọ Kraịst, bụ́ ndị ahụ e tere mmanụ, malitere ozugbo ịgwa ndị ọzọ ihe ha ga-eme ka Chineke ghara iwesa ha iwe, ya bụ, ka e mee ha baptizim n’aha Jizọs Kraịst ka e wee gbaghara ha mmehie. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 2:38-40.) Malite n’ụbọchị ahụ pụrụ iche ruo taa, a dọtala ọtụtụ nde mmadụ ndị si mba niile n’ebe Chineke nọ ka ha na ya malite ịdị ná mma n’ihi okwukwe ha nwere n’àjà mgbapụta ahụ e ji Jizọs chụọ. (Jọn 6:44) Ugbu a, ka anyị tụlee ajụjụ abụọ ọzọ, ha bụ: È nwere onye n’ime anyị e kwere nkwa na ọ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ihi na ọ bụ onye ezi omume? Ndụ ebighị ebi ò nwere ike ịkwa mmadụ mgbe e kwechara ya nkwa a?

17. Olee otú i kwesịrị isi na-ele ọbụbụ ị bụ enyi Chineke anya, nke bụ́ ngọzi magburu onwe ya?

17 Ihe mgbapụta ahụ bụ onyinye na-erughịrị ụmụ mmadụ. Ma, ọtụtụ nde ụmụ mmadụ aghọọla ndị enyi Chineke taa maka na ha nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ. Nke a emekwaala ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs. Ma, mmadụ nwere ike ịbụ enyi Jehova taa, bụrụ onye iro ya echi. Ọ bụrụ na anyị achọghị iso ná ndị Chineke ga-ewesa iwe n’ụbọchị iwe ya, anyị aghaghị ịnọgide na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ‘ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ.’—Rom 3:24; gụọ Ndị Filipaị 2:12.

Nọgide Na-enwe Okwukwe n’Ihe Mgbapụta Ahụ

18. Gịnị ka mmadụ inwe okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ gụnyere?

18 Amaokwu Akwụkwọ Nsọ ebe isiokwu a si, ya bụ, Jọn 3:36, gosiri na inwe okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst gụnyere irubere ya isi. Ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ, anyị kwesịrị ịna-eme ihe Jizọs kụziri, nke gụnyere ihe ọ kụziri banyere otú anyị ga-esi na-akpa àgwà. (Mak 7:21-23) “Ọnụma nke Chineke na-abịakwasị” ndị niile na-akwa iko, ndị na-ekwu okwu njakịrị rụrụ arụ nakwa ndị na-etinye aka ‘n’ụdị adịghị ọcha ọ bụla,’ nke gụnyekwara ndị na-ekiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, ma ha achọghị ichegharị.—Efe. 5:3-6.

19. Olee otú dị mma anyị nwere ike isi gosi na anyị nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ?

19 Ọ bụrụ na anyị nwere obi ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ, anyị ga na-eme “omume ịsọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:11) Ka anyị wepụta oge na-ekpechi ekpere si n’ala ala obi anya, na-enwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya, na-agachi ọmụmụ ihe anya, na-enwechi ofufe ezinụlọ anya, jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ka anyị gharakwa ichefu “ime ihe ọma na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.”—Hib. 13:15, 16.

20. Olee ngọzi ndị niile nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ ga-atụ anya inweta n’ọdịnihu?

20 Mgbe Jehova ga-ewesa ajọ usoro ihe a iwe, obi ga-adị anyị ụtọ nke ukwuu na anyị nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ nakwa na anyị gosiri na obi dị anyị ụtọ maka ya. N’ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere anyị ná nkwa, anyị ga na-ekele Chineke ruo mgbe ebighị ebi maka ihe mgbapụta a magburu onwe ya o ji mee ka iwe ya ghara imetụta anyị.—Gụọ Jọn 3:16; Mkpughe 7:9, 10, 13, 14.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Gịnị mere ihe mgbapụta ji dị anyị mkpa?

• Gịnị ka ihe mgbapụta ahụ furu?

• Olee uru ihe mgbapụta ahụ bara?

• Olee otú anyị si egosi na anyị nwere okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ e ji Jizọs chụọ?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 13]

Ndị mmadụ nwere ohere ka ha na Jehova dịrị ná mma

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ịtụgharị uche n’akụkọ banyere Ebreham, Aịzik, na Jekọb nwere ike inyere anyị aka ịghọta ihe ihe mgbapụta ahụ furu