Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Jizọs Si Gosi Na Chineke Bụ Onye Ezi Omume

Otú Jizọs Si Gosi Na Chineke Bụ Onye Ezi Omume

Otú Jizọs Si Gosi Na Chineke Bụ Onye Ezi Omume

“Chineke wepụtara [Kraịst] dị ka àjà ime udo; udo a na-abịa site n’inwe okwukwe n’ọbara ya. Nke a bụ iji gosi ezi omume nke ya.”—ROM 3:25.

1, 2. (a) Gịnị ka Baịbụl gwara anyị banyere nsogbu ụmụ mmadụ? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

ỌTỤTỤ mmadụ ma akụkọ dị na Baịbụl banyere otú e si nupụrụ Chineke isi n’ogige Iden. Baịbụl kwuru na mmehie ahụ Adam mere na-akpa anyị niile aka ọjọọ. Ọ sịrị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Rom 5:12) Ihe ọ sọkwara anyị gbalịa ime ihe ziri ezi, anyị na-eme ihe ọjọọ, bụ́ nke anyị ga-achọ ka Chineke gbaghara anyị. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji kwuo, sị: “Ezi ihe nke m na-achọ ime ka m na-adịghị eme, kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị ime ka m na-eme. Lee nhụsianya m nọ na ya!”—Rom 7:19, 24.

2 Ebe ọ bụ na a mụrụ anyị niile ná mmehie, anyị kwesịrị ichebara ajụjụ ndị a dị mkpa echiche, ha bụ: Olee otú o si bụrụ na a mụrụ Jizọs onye Nazaret o ketaghị mmehie, oleekwa ihe mere e ji mee ya baptizim? Olee otú otú Jizọs si bie ndụ mgbe ọ bịara n’ụwa si gosi na Jehova bụ onye ezi omume? Nke kacha mkpa bụ, olee uru ọnwụ Kraịst nwụrụ bara?

Setan Ekwuo na Chineke Abụghị Onye Ezi Omume

3. Olee otú Setan si duhie Iv?

3 Nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, ji iberiibe jụ ọchịchị Chineke wee họrọ ka “agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan,” chịwa ha. (Mkpu. 12:9) Ka anyị tụlee otú nke a si mee. Setan kwuru na otú Jehova Chineke si achị adịghị mma. O kwuru nke a mgbe ọ jụrụ Iv, sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke sịrị unu erila mkpụrụ si n’osisi ọ bụla dị n’ubi a?” Iv gwara ya iwu doro anya Chineke nyere ha, nke bụ́ ka ha ghara imetụ otu osisi aka, na ọ bụrụ na ha emetụ ya aka na ha ga-anwụ. Setan wee kwuo na Chineke na-agha ụgha. Ọ gwara Iv, sị: “Unu agaghị anwụ ma ọlị.” O duhiere Iv ya ekwere na o nwere ihe ọma Chineke na-achọghị ka o rute ya aka, gwakwa ya na ọ bụrụ na o rie mkpụrụ osisi ahụ, na ọ ga-adị ka Chineke, nwere onwe ya ime ihe ọ bụla dị ya mma.—Jen. 3:1-5.

4. Olee otú Setan, bụ́ onye iro Chineke, si malite ịchị ụmụ mmadụ?

4 Ihe ihe ahụ Setan kwuru pụtara bụ na ụmụ mmadụ ga-aka enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na Chineke anaghị achị ha. Kama Adam ga-egosi na otú Chineke si achị dị mma, o gere nwunye ya ntị ma soro rie mkpụrụ osisi ahụ a sị ha erila. Nke a mere ka Adam na Jehova gharazie ịdị ná mma, meekwa ka anyị na-eme mmehie ma na-anwụ anwụ. O mekwara ka Setan, bụ́ onye iro Chineke nakwa “chi nke usoro ihe a,” chịwa ụmụ mmadụ.—2 Kọr. 4:4; Rom 7:14.

5. (a) Olee otú Jehova si mezuo ihe o kwuru? (b) Olee olileanya Chineke mere ka ụmụ Adam na Iv nwee?

5 Jehova mezuru ihe o kwuru wee ma Adam na Iv ikpe ọnwụ. (Jen. 3:16-19) Ma nke a apụtaghị na nzube Chineke agaghịzi emezu. Ọ ga-emezurịrị! Mgbe Jehova na-ama Adam na Iv ikpe, o kwuru ihe ga-eme ka ụmụ ha ga-amụta n’ọdịnihu nwee ezigbo olileanya. Otú o si mee ka ha nwee olileanya bụ ikwu na nzube ya bụ na ya ga-eme ka e nwee otu “mkpụrụ,” bụ́ onye Setan ga-emerụ ahụ́ n’ikiri ụkwụ. Ma, Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-agbake wee ‘gwepịa Setan isi.’ (Jen. 3:15) Baịbụl mere ka okwu a dokwuo anya mgbe o kwuru banyere Jizọs Kraịst, sị: “Ọ bụ ihe a mere e ji mee ka Ọkpara Chineke pụta ìhè, ya bụ, ka o wee bibie ọrụ Ekwensu.” (1 Jọn 3:8) Ma, olee otú àgwà Jizọs na ọnwụ ya si gosi na Chineke bụ onye ezi omume?

Ihe Baptizim E Mere Jizọs Pụtara

6. Olee otú anyị si mara na Jizọs eketaghị mmehie Adam?

6 Mgbe Jizọs ga-etoru ogo mmadụ, ya na Adam, bụ́ onye zuburu okè, ga-ahà nhata. (Rom 5:14; 1 Kọr. 15:45) Nke a pụtara na Jizọs ga-abụ onye zuru okè mgbe a mụrụ ya. Olee otú nke a ga-esi kwe omume? Mmụọ ozi bụ́ Gebriel gwara Meri nne Jizọs ihe a doro anya, sị: “Mmụọ nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi nke ahụ, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ, Ọkpara Chineke.” (Luk 1:35) Mgbe Jizọs bụ nwata, ọ ga-abụ na Meri kọọrọ ya ihe ụfọdụ banyere otú e si mụọ ya. Ọ bụ ya mere na mgbe Meri na Josef, bụ́ nna Jizọs, chọtara nwata ahụ bụ́ Jizọs n’ụlọ nsọ Chineke, ọ jụrụ ha, sị: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na m ga-anọ n’ụlọ Nna m?” (Luk 2:49) O doro anya na mgbe Jizọs bụ nwata, ọ ma na ya bụ Ọkpara Chineke. N’ihi ya, igosi na Chineke bụ onye ezi omume bụ ihe kacha dịrị ya mkpa.

7. Olee ihe ndị dị oké ọnụ ahịa Jizọs nwere?

7 Jizọs gosiri na ya ji ife Chineke kpọrọ ihe site n’ịgachi ebe a na-anọ efe Chineke anya. Ebe ọ bụ na o zuru okè, ọ ga-abụrịrị na ọ ghọtara ihe ọ bụla ọ nụrụ nakwa ihe ọ bụla ọ gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. (Luk 4:16) Jizọs nwekwara ihe ọzọ dị oké ọnụ ahịa, ya bụ, ahụ́ zuru okè nke a ga-eji chụọ àjà maka ụmụ mmadụ. Mgbe e mere Jizọs baptizim, o nwere ike ịbụ na ọ nọ na-eche banyere amụma ahụ dị n’Abụ Ọma 40:6-8 mgbe ọ na-ekpe ekpere.—Luk 3:21; gụọ Ndị Hibru 10:5-10. *

8. Gịnị mere na Jọn Onye Na-eme Baptizim achọghị ime Jizọs baptizim?

8 Jọn Onye Na-eme Baptizim achọbughị ime Jizọs baptizim. Ọ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jọn nọ na-eme ndị Juu baptizim iji gosi na ha echegharịala ná mmehie ha. Ebe ọ bụ na Jọn bụ onye ikwu Jizọs, ọ ma nke ọma na Jizọs bụ onye ezi omume, nke mere na nchegharị adịghị ya mkpa. Jizọs gwara Jọn na o kwesịrị ime ya baptizim. Ọ sịrị: “Otú a ka o kwesịrị ekwesị ka anyị mezuo ihe niile bụ́ ezi omume.”—Mat. 3:15.

9. Gịnị ka baptizim e mere Jizọs na-egosi?

9 Ebe ọ bụ na Jizọs zuru okè, ọ gaara ekpebi na ya ga-abụ nna ụmụ mmadụ zuru okè, otú ahụ Adam gaara abụ. Ma, nke a abụghị mkpa Jizọs n’ihi na ọ bụghị ihe Jehova chọrọ ka o mee. Ihe mere Chineke ji zite Jizọs n’ụwa bụ ka ọ bịa rụọ ọrụ mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, ma ọ bụ Mesaya, kwesịrị ịrụ. Nke a gụnyere Jizọs ịchụ ndụ ya zuru okè n’àjà. (Gụọ Aịzaya 53:5, 6, 12.) Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe mere e ji mee Jizọs baptizim abụghị ihe mere e ji eme anyị baptizim taa. Ebe ọ bụ na Jizọs bụ onye Izrel, bụ́ mba a raara nye Chineke, ọ dịghị mkpa ka ọ rara onwe ya nye Jehova. Kama nke ahụ, baptizim e mere Jizọs gosiri na o wepụtala onwe ya ime uche Chineke bụ́ nke e dere n’Akwụkwọ Nsọ na Mesaya ga-eme.

10. Gịnị ka Jizọs ime uche Chineke, nke bụ́ ịrụ ọrụ Mesaya, gụnyere, oleekwa otú obi dị ya maka nke a?

10 Ihe Jehova chọrọ ka Jizọs mee gụnyere ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke, ime ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, nakwa ịkụziri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi mee ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’ọdịnihu. Otú Jizọs si dịrị njikere idi ọnwụnwa na ịnwụ ọnwụ ike iji gosi na ọ na-akwado ọchịchị ezi omume Jehova Chineke gosikwara na ọ bịara ime uche Chineke. Ihe mere ime uche Chineke ji atọ Jizọs ụtọ, ya enweekwa mmasị iji ndụ ya chụọ àjà, bụ na ọ hụrụ Nna ya nke eluigwe n’anya. (Jọn 14:31) Obi dịkwa ya ụtọ ịmara na ọ bụ ndụ ya zuru okè ka a ga-eji chụọrọ Chineke àjà iji gbapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. Obi ọ̀ dị Chineke ụtọ n’otú Jizọs si wepụta onwe ya ịrụ nnukwu ọrụ a? Obi dị ya nnọọ ụtọ!

11. Olee otú Jehova si gosi na ọ masịrị ya ka Jizọs bụrụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa, ma ọ bụ Kraịst?

11 Matiu, Mak, Luk na Jọn kwuchara na Jehova Chineke kwuru okwu ọma banyere Jizọs mgbe o si n’Osimiri Jọdan na-apụta. Jọn Onye Na-eme Baptizim kwuru, sị: “Ahụrụ m mmụọ nsọ ka o si n’eluigwe na-efedata dị ka nduru, ọ dịgidekwara n’isi [Jizọs] . . . Ahụwo m ya, agbawokwa m àmà na onye a bụ Ọkpara Chineke.” (Jọn 1:32-34) Jehova kwukwara mgbe ahụ, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.”—Mat. 3:17; Mak 1:11; Luk 3:22.

Jizọs Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ruo Mgbe Ọ Nwụrụ

12. Mgbe e mechara Jizọs baptizim, olee ọrụ ọ rụrụ afọ atọ na ọkara?

12 Mgbe e mechara Jizọs baptizim, o ji afọ atọ na ọkara rụsie ọrụ ike iji kụziere ndị mmadụ banyere Nna ya, nakwa banyere otú ọchịchị Chineke si dị mma. Iji ụkwụ agazu obodo niile dị n’Ala Nkwa ahụ adịrịghị ya mfe, ma, nke a akwụsịghị ya ịgbara eziokwu ahụ àmà nke ọma. (Jọn 4:6, 34; 18:37) Jizọs kụziiri ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke. O gosiri ihe Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ site n’ịrụ ọrụ ebube wee gwọọ ndị ọrịa, nye ndị agụụ ji nri, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ.—Mat. 11:4, 5.

13. Gịnị ka Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpe n’ekpere?

13 Jizọs anaraghị otuto maka ihe ndị ọ kụziiri ndị mmadụ nakwa ọrịa ndị ọ gwọrọ ha, kama ime otú ahụ, o setịpụụrụ anyị ezigbo ihe nlereanya site n’iji obi umeala mee ka e nye Jehova otuto niile. (Jọn 5:19; 11:41-44) Jizọs mekwara ka anyị mata ihe ndị kacha mkpa anyị kwesịrị ikpe ekpere banyere ha. Ha gụnyere ikpe ekpere ka ‘e doo aha Chineke bụ́ Jehova nsọ,’ nakwa ka ọchịchị Chineke, nke bụ́ ọchịchị ezi omume, bịa nọchie ọchịchị ọjọọ Setan. Ọchịchị Chineke ga-eme ‘ka uche ya mee n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.’ (Mat. 6:9, 10) Jizọs gwakwara anyị ka anyị mee ihe ndị ahụ anyị kpere n’ekpere site n’ibu “ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.”—Mat. 6:33.

14. N’agbanyeghị na Jizọs zuru okè, gịnị mere ọ ga-eji gbasie mbọ ike ka o wee rụọ ọrụ o kwesịrị ịrụ iji mezuo nzube Chineke?

14 Mgbe ọ fọrọ obere ka Jizọs jiri ndụ ya chụọ àjà, ọ bịakwuru doo ya anya na ya na-aga ịrụ nnukwu ọrụ. Ọ bụrụ na Jizọs edie ikpe na-ezighị ezi nakwa ọnwụ ike ọ na-aga ịnwụ, ọ ga-eme ka nzube Nna ya mezuo, meekwa ka a kwanyere Nna ya ùgwù. Mgbe ọ fọrọ abalị ise ka Jizọs nwụọ, o kpere ekpere, sị: “Ọ dị ihe na-echegbu mkpụrụ obi m ugbu a, gịnịkwa ka m ga-ekwu? Nna, zọpụta m n’oge awa a. Otú o sina dị, ọ bụ nke a mere m ji bịaruo n’oge awa a.” Mgbe Jizọs kwuchara ihe a mmadụ ọ bụla nọ n’ụdị ọnọdụ a nwere ike ikwu, o lekwasịziri anya n’ihe ka mkpa ma kpee ekpere, sị: “Nna, mee ka aha gị dị ebube.” Jehova kwuru ozugbo, sị: “Emewo m ka ọ dị ebube, m ga-emekwa ka ọ dị ebube ọzọ.” (Jọn 12:27, 28) N’eziokwu, Jizọs kpebisiri ike idi ọnwụnwa kacha ọnwụnwa a nwatụrụla mmadụ ọ bụla. Ma, mgbe Jizọs nụrụ ihe ahụ Nna ya nke eluigwe kwuru, o doro anya na o mere ka obi sie ya ike na ya ga-emeli ka e too ọchịchị Jehova, meekwa ka a mata na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị. Ọ bụ nnọọ ihe o mere.

Uru Ọnwụ Jizọs Bara

15. Mgbe ọ fọrọ obere ka Jizọs kubie ume, gịnị mere o ji kwuo, sị: “E mechawo ya!”?

15 Mgbe ọ fọrọ obere ka Jizọs kubie ume n’osisi ịta ahụhụ ahụ a kpọgidere ya, o kwuru, sị: “E mechawo ya!” (Jọn 19:30) Chineke nyeere Jizọs aka ịrụzu nnukwu ihe n’afọ atọ na ọkara ahụ o jere ozi, ya bụ, malite mgbe e mere ya baptizim ruo mgbe ọ nwụrụ. Mgbe Jizọs nwụrụ, e nwere oké ala ọma jijiji nke mere ka onyeisi ndị agha Rom gburu ya kwuo, sị: “N’ezie, onye a bụ Ọkpara Chineke.” (Mat. 27:54) O doro anya na onyeisi ndị agha ahụ hụrụ mgbe a kwara Jizọs emo n’ihi ịsị na ya bụ Ọkpara Chineke. N’agbanyeghị ahụhụ niile a tara Jizọs, ọ nọgidere na-eme uche Chineke ma gosi na Setan bụ onye ụgha obi fere azụ. Setan kwuru banyere ndị niile na-akwado ọchịchị Chineke sị: “Onye ọ bụla, ga-enye ihe nile o nwere ka o wee dị ndụ.” (Job 2:4, Nsụgharị bụ́ Bịble Nsọ Ọhụụ) Otú Jizọs si rubere Chineke isi gosiri na a sị na Adam na Iv chọrọ ha gaara erubere Chineke isi mgbe a nwara ha ọnwụnwa na-esirughị ike ka nke Jizọs. Ihe kacha mkpa bụ na otú Jizọs si bie ndụ nakwa otú o si nwụọ gosiri na ọchịchị Jehova bụ ọchịchị ezi omume, o mekwara ka e too ọchịchị Jehova. (Gụọ Ilu 27:11.) Ò nwere uru ọzọ ọnwụ Jizọs bara? À na-ajụkwa ajụ!

16, 17. (a) Olee ihe mere Jehova ji gụọ ndị ohu ya dịrị ndụ tupu Kraịst abịa n’ụwa ná ndị ezi omume? (b) Olee otú Jehova si kwụọ Ọkpara ya ụgwọ n’ihi irubere ya isi, oleekwa ihe Kraịst Jizọs na-eme?

16 Ọtụtụ ndị ohu Jehova biri ndụ tupu Jizọs abịa n’ụwa. Ha mere uche Chineke, e mekwara ka ha nwee olileanya na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ. (Aịza. 25:8; Dan. 12:13) Ma, olee ihe Jehova Chineke dị nsọ ga-eji maka ya gọzie ụmụ mmadụ n’ụzọ a magburu onwe ya, bụ́ ụmụ mmadụ na-eme mmehie? Baịbụl sịrị: “Chineke wepụtara [Jizọs Kraịst] dị ka àjà ime udo; udo a na-abịa site n’inwe okwukwe n’ọbara ya. Nke a bụ iji gosi ezi omume nke ya, n’ihi na ọ na-agbaghara mmehie ndị e mere n’oge gara aga mgbe Chineke nọ na-enwe ndidi; iji gosi ezi omume nke ya n’oge a a kara aka, ka o wee bụrụ onye ezi omume ọbụna mgbe ọ na-akpọ onye nwere okwukwe n’ebe Jizọs nọ onye ezi omume.”—Rom 3:25, 26. *

17 Jehova kwụrụ Jizọs ụgwọ site n’ịkpọlite ya n’ọnwụ wee mee ka ọ nọrọ n’ọkwá ka nke ọ nọ na ya tupu ya abịa n’ụwa. Nke a mere ka Jizọs bụrụ mmụọ na-anaghị anwụ anwụ. (Hib. 1:3) Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà na Eze, na-enyere ndị na-eso ụzọ ya aka igosi na Chineke bụ onye ezi omume. Obi dịkwa anyị ụtọ nke ukwuu na Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, na-akwụ ndị na-erubere ya isi ma na-eṅomi Ọkpara ya ụgwọ, bụ́ ndị na-egosi na Jehova bụ onye ezi omume.—Gụọ Abụ Ọma 34:3; Ndị Hibru 11:6.

18. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Chineke na ndị fere ya malite n’oge Ebel dị ná mma n’ihi na ha nwere okwukwe ná Mkpụrụ ahụ o kwere ná nkwa, nweekwa obi ike na ọ ga-abịarịrị. Jehova ma na Ọkpara ya ga-erubere ya isi nakwa na ọnwụ ya ga-ekpuchi “mmehie nke ụwa” kpamkpam. (Jọn 1:29) Ọnwụ Jizọs bakwaara ndị mmadụ uru taa. (Rom 3:26) Olee ngọzi àjà mgbapụta Kraịst chụrụ nwere ike iwetara gị? Anyị ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 N’ebe a, Pọl onyeozi kwughachiri ihe e dere n’Abụ Ọma 40:6-8 dị ka e si sụgharịa ya na Septuagint Grik, nke ihe dị na ya gụnyere okwu bụ́ “ị kwadebeere m ahụ́.” Okwu a adịghị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nke e nwere n’oge a.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee otú Setan si kwuo na Chineke abụghị onye ezi omume?

• Gịnị ka baptizim e mere Jizọs gosiri?

• Olee uru ọnwụ Jizọs bara?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Ị̀ ma ihe baptizim e mere Jizọs gosiri?