Ịdị n’Otu Ndị Kraịst Na-eme Ka E Too Chineke
Ịdị n’Otu Ndị Kraịst Na-eme Ka E Too Chineke
“Na-agbasi mbọ ike ka unu nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ.”—EFE. 4:3.
1. Olee otú Ndị Kraịst bi n’Efesọs na narị afọ mbụ si mee ka e too Chineke?
OTÚ ọgbakọ Ndị Kraịst nke dị n’Efesọs n’oge ochie si dịrị n’otu mere ka e too ezi Chineke bụ́ Jehova. Ọ ga-abụ na ụfọdụ ụmụnna, bụ́ ndị bi n’obodo ahụ ahịa na-aga aga, bara ọgaranya ma nwee ndị na-agbara ha ohu, ebe ndị ọzọ bụ ndị ohu, eleghị anya bụrụkwa ndị ogbenye ọnụ ntụ. (Efe. 6:5, 9) Ụfọdụ bụ ndị Juu ndị natara eziokwu ahụ mgbe Pọl onyeozi kwuru okwu ọnwa atọ n’ụlọ nzukọ ha. Ndị ọzọ na-efebu chi Atemis, na-emekwa anwansi. (Ọrụ 19:8, 19, 26) O doro anya na ife Chineke ezi ofufe mere ka ndị dị iche iche dịrị n’otu. Pọl ghọtara na otú ọgbakọ ahụ si dịrị n’otu mere ka e too Jehova. O dere, sị: “Ka otuto dịrị ya site n’ọgbakọ ahụ.”—Efe. 3:21.
2. Olee ihe chọrọ ịkpata nkewa n’etiti Ndị Kraịst nọ n’Efesọs?
2 Ma, e nwere ihe chọrọ ịkpata nkewa n’ọgbakọ ahụ. Pọl dọrọ ndị okenye ọgbakọ ahụ aka ná ntị, sị: “Ndị ikom ga-esikwa n’etiti unu onwe unu bilie, na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.” (Ọrụ 20:30) Ihe ọzọ bụ na ụfọdụ ụmụnna akwụsịchabeghị àgwà na-akpata nkewa, nke Pọl kwuru na ọ ‘na-arụ ọrụ n’ime ụmụ nnupụisi.’—Efe. 2:2; 4:22.
Akwụkwọ Ozi nke Kwuru Banyere Ịdị n’Otu
3, 4. Olee otú akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Efesọs si mesie mkpa ịdị n’otu dị ike?
3 Pọl ghọtara na ọ bụrụ na Ndị Kraịst chọrọ ịnọgide na-arụkọ ọrụ ọnụ, onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-eme ihe ndị ga-eme Efe. 1:10) O jikwa Ndị Kraịst tụnyere nkume dị iche iche e ji wuo ụlọ. “Ụlọ ahụ dum, ebe ọ bụ nke e jikọrọ akụkụ ya niile ọnụ, na-eto eto ka ọ ghọọrọ Jehova ụlọ nsọ.” (Efe. 2:20, 21) Ihe ọzọ bụ na Pọl gwasiri ha okwu ike na Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu na ndị nke bụ́ ndị Jentaịl kwesịrị ịdị n’otu, o chetakwaara ha na ọ bụ Chineke kere ha niile. Ọ kpọrọ Jehova ‘Nna, bụ́ onye ezinụlọ ọ bụla n’eluigwe na n’ụwa sitere n’ebe ọ nọ nweta aha ya.’—Efe. 3:5, 6, 14, 15.
ka ha dịrị n’otu. Chineke ji mmụọ nsọ ya mee ka Pọl degara ndị Efesọs akwụkwọ ozi nke kwuru banyere ịdị n’otu. Dị ka ihe atụ, Pọl dere banyere nzube Chineke, nke bụ́ “ịchịkọtaghachi ihe niile n’ime Kraịst.” (4 Ka anyị na-atụle isi anọ nke akwụkwọ Ndị Efesọs, anyị ga-ahụ ihe mere anyị ji kwesị ịgbasi mbọ ike ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị n’otu. Anyị ga-atụlekwa otú Jehova si enyere anyị aka ịdị n’otu, nakwa àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-adị n’otu. Jisie ike gụọ Ndị Efesọs isi anọ ka i wee ritekwuo uru.
Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịgbasi Mbọ Ike Ka Anyị Wee Dị n’Otu
5. Gịnị mere na ndị mmụọ ozi Chineke nwere ike iji otu obi na-ejere ya ozi, ma, gịnị mere ịdị n’otu nwere ike iji na-esiri anyị ike?
5 Pọl gwara ụmụnna ya nọ n’Efesọs ka ha ‘na-agbasi mbọ ike iji nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ.’ (Efe. 4:3) Ka anyị wee ghọta ihe mere ha ji kwesị ịgbasi mbọ ike iji dị n’otu, ka anyị tụlee banyere ndị mmụọ ozi Chineke. Ebe ọ bụ na e nweghị ihe abụọ dị ndụ n’ụwa nke ya na ibe ya yiri kpamkpam, o ziri ezi ikwu na mmụọ ozi nke ọ bụla n’ime ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi Jehova kere nwere ihe o ji dị iche n’ibe ya. (Dan. 7:10) N’agbanyeghị nke a, ha ji otu obi na-efe Jehova n’ihi na ha niile na-ege ya ntị, na-emekwa uche ya. (Gụọ Abụ Ọma 103:20, 21.) Àgwà mmụọ ozi nke ọ bụla kwesịrị ntụkwasị obi dị iche na nke ibe ya, otú ahụkwa ka Onye Kraịst ọ bụla si nwee ebe ọ na-anaghị eme nke ọma. Nke a nwere ike ime ka ịdị n’otu na-esiri anyị ike.
6. Olee àgwà ndị ga-enyere anyị aka ime ka anyị na ụmụnna anyị, bụ́ ndị na-akpa àgwà ụfọdụ na-adịghị anyị mma, dịrị n’otu?
6 Ọ na-esikarịrị ụmụ mmadụ na-ezughị okè ike ịrụkọ ọrụ ọnụ. Ka e were ya na e nwere nwanna dị umeala n’obi ma ọ na-abịakarị ihe n’azụ oge, nweekwa nwanna na-abịakarị ihe n’oge ma iwe anaghị ara ahụ́ ewe ya. Onye nke ọ bụla n’ime ha nwere ike iche na àgwà onye nke ọzọ adịghị mma, ma, ya echefuo na yanwa nwekwara àgwà na-adịghị mma. Olee otú ụmụnna abụọ a ga-esi na-efekọ Jehova ọnụ n’udo? Tụlee otú àgwà dị iche iche Pọl kwuru okwu ha ná Ndị Efesọs 4:1-3 ga-esi enye aka. Chee echiche otú inwe àgwà ndị a ga-esi enyere anyị aka ịdị n’otu. Pọl dere, sị: “[M] na-arịọsi unu ike ka unu na-eje ije n’ụzọ kwesịrị . . . , n’ịdị umeala n’obi na ịdị nwayọọ zuru ezu, n’ogologo ntachi obi, jirikwa ịhụnanya na-ediri ibe unu ihe, na-agbasi mbọ ike ka unu nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.”—Efe. 4:1-3.
7. Gịnị mere anyị ji kwesị ịgbasi mbọ ike ka anyị na ụmụnna anyị ndị ọzọ na-ezughị okè dịrị n’otu?
7 Anyị kwesịrị ịmụta otú anyị na ụmụnna anyị ndị na-ezughị okè ga-esi jiri otu obi na-efe Chineke n’ihi na e nwere naanị otu ndị na-efe Chineke ezi ofufe. “E nwere otu ahụ́, nweekwa otu mmụọ nsọ, ọbụna dị ka a kpọrọ unu n’otu olileanya ahụ nke a kpọrọ unu ka unu nweta; otu Onyenwe anyị, otu okwukwe, otu baptizim; otu Chineke na Nna nke mmadụ niile.” (Efe. 4:4-6) Ọ bụ naanị otu ndị Chineke ji arụ ọrụ ka ọ na-enye mmụọ nsọ ya, na-agọzikwa. Ọ bụrụ na e nwee onye kpasuru anyị iwe n’ọgbakọ, olee ebe ọzọ anyị ga-aga? E nweghị ebe ọzọ anyị ga-anụ okwu nke ndụ ebighị ebi.—Jọn 6:68.
Ndị Bụ́ “Onyinye n’Ụdị Mmadụ” Na-eme Ka A Dịrị n’Otu
8. Olee ndị Kraịst ji enyere anyị aka ịnọgide na-adị n’otu?
8 Pọl ji ihe ndị agha na-emekarị n’oge ochie kọwaa otú Jizọs si nye anyị “onyinye n’ụdị mmadụ” ka ha nye aka mee ka ọgbakọ dịrị n’otu. Onye agha nke meriri n’agha nwere ike ịkpọlata onye ọ dọọrọ n’agha ka ọ bịa na-enyere nwunye ya aka n’ụlọ. (Ọma 68:1, 12, 18) Otú ahụ ka ọ dị Jizọs, mmeri o meriri ụwa mere ka o nweta ọtụtụ ndị ohu, ndị dị njikere ijere ya ozi. (Gụọ Ndị Efesọs 4:7, 8.) Olee ọrụ ndị a a kpọrọ ndị ohu na-arụrụ ya? “O nyere ụfọdụ ka ha bụrụ ndịozi, nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma, nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma, nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ na ndị ozizi, iji na-agbazi ndị nsọ, maka ọrụ ije ozi, maka iwuli ahụ́ nke Kraịst elu, ruo mgbe anyị niile ga-adị n’otu n’okwukwe.”—Efe. 4:11-13.
9. (a) Olee otú ndị bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ” si enye aka eme ka anyị dị n’otu? (b) Gịnị mere onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ji kwesị inye aka mee ka ọgbakọ dịrị n’otu?
9 Ebe ọ bụ na ndị a bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ” bụ ndị ọzụzụ atụrụ hụrụ anyị n’anya, ha na-enye aka eme ka anyị dị n’otu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na okenye ahụ ebe ụmụnna abụọ “na-akpali ịsọ mpi n’etiti onwe” ha, okenye ahụ ga-enye aka mee ka ọgbakọ dịrị n’otu site n’ịkpọ ha nye ha ndụmọdụ, nke bụ́ iji “mmụọ dị nwayọọ gbazie [ha].” (Gal. 5:26–6:1) Ndị a bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ” bụkwa ndị nkụzi, ha na-eji Baịbụl akụziri anyị ihe ndị ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. Ha na-esi otú a eme ka anyị dịrị n’otu, nyekwara anyị aka ịbụ Ndị Kraịst tozuru okè. Pọl dere na nke a bụ “ka anyị wee ghara ịbụkwa ụmụ ọhụrụ, ndị ebili mmiri na-enugharị na ndị ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị, site n’aghụghọ nke ụmụ mmadụ, site ná njehie e ji aghụghọ chepụta.” (Efe. 4:13, 14) Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị inye aka mee ka ụmụnna anyị dịrị n’otu, otú ahụ akụkụ ahụ́ ọ bụla si enyere ibe ya aka site n’ịhụ na o nwetara ihe dị mkpa.—Gụọ Ndị Efesọs 4:15, 16.
Na-akpa Àgwà Ọma
10. Olee otú omume rụrụ arụ nwere ike isi mee ka anyị ghara ịdị n’otu?
10 Ị̀ chọpụtara na isi nke anọ nke akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Efesọs gosiri na inwe ịhụnanya bụ isi ihe na-enyere Ndị Kraịst tozuru okè aka ịdị n’otu? Ihe ọzọ bụ na o mere ka anyị mata ihe inwe ịhụnanya gụnyere. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị nwere ịhụnanya, anyị agaghị na-akwa iko ma ọ bụ na-eme omume rụrụ arụ. Pọl gbara ụmụnna ya ume ka ha ghara “ịnọgide na-eje ije dị nnọọ ka ndị mba ọzọ.” ‘Mmehie ha adịkwaghị ewute ha, ha mikpukwara onwe ha n’omume rụrụ arụ.’ (Efe. 4:17-19) Ụwa rụrụ arụ anyị bi na ya achọghị ka anyị dị n’otu. Ndị mmadụ na-eji ịkwa iko egwu egwu, jiri ya agụ egwu, na-ekiri ya mgbe ha na-atụrụ ndụ, na-akwadị iko ma n’ìhè ma na nzuzo. Ma, ọ bụrụ na ị na-achụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ya bụ, ị na-eme ka ị̀ hụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị ị na-ebughị n’obi ịlụ n’anya, nke a nwere ike ime ka ị nọrọ Jehova na ọgbakọ ya n’ebe dị anya. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ naghị ara ahụ́ onye na-eme otú a akwaa iko. Ọ bụrụkwa na ọ bụ onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye na-eme nke a, o nwere ike ime ka ọ kwaa iko, bụ́ ihe nwere ike ime ka di ma ọ bụ nwunye onye ahụ hapụ ya. Nke a nwekwara ike ime ka ụmụaka tagbuo onwe ha n’ahụhụ n’ihi na ha na ndị mụrụ ha ebighịzi. N’ezie, ọ na-eme ka a ghara ịdị n’otu! Ka a sịkwa ihe mere Pọl ji dee, sị: “Unu amụtaghị Kraịst dị ka onye dị otú ahụ”!—Efe. 4:20, 21.
11. Olee mgbanwe Baịbụl gbara Ndị Kraịst ume ka ha mee?
11 Pọl gwasiri anyị ike ka anyị hapụ àgwà ndị nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ ghara ịdị n’otu ma na-akpa àgwà ndị ga-eme ka anyị na ha dịrị n’otu. Ọ sịrị: “Unu kwesịrị iyipụ mmadụ ochie ahụ, nke kwekọrọ n’ụzọ unu si eme omume n’oge gara aga, bụrụkwa nke a na-emerụ dị ka ọchịchọ aghụghọ ya [ya bụ mmadụ ochie ahụ] si dị; . . . unu kwesịrị ime ka ike nke na-eduzi uche unu dị ọhụrụ, unu kwesịkwara iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị, n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.” (Efe. 4:22-24) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ‘ike nke na-eduzi uche anyị dị ọhụrụ’? Ọ bụrụ na anyị ejiri obi ụtọ na-echebara ihe ndị anyị na-amụta n’Okwu Chineke nakwa n’àgwà ọma nke ụmụnna ndị ji ọgbakọ kpọrọ ihe echiche, anyị ‘ga-eyiri mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị’ ma anyị gbasie mbọ ike.
Na-ekwu Okwu Kwesịrị Ekwesị
12. Olee otú ikwu eziokwu si eme ka a dị n’otu, oleekwa ihe mere ikwu eziokwu ji esiri ụfọdụ ndị ike?
12 Ndị nọ n’otu ezinụlọ ma ọ bụ n’otu ọgbakọ kwesịrị ịna-agwa ibe ha eziokwu. Ọ bụrụ na ndị mmadụ na-agwa ibe ha eziokwu n’ezoghị ọnụ, na-agwakwa ha okwu ọma, o nwere ike ime ka ha na ibe ha dịrị n’otu. (Jọn 15:15) Ma, gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ aghaara nwanne ya ma ọ bụ nwanna ya ụgha? Ọ bụrụ na onye ahụ achọpụta na ọ bụ ụgha ka ọ ghaara ya, ọ ga-esiri ya ike ịtụkwasị ya obi ọzọ. Ị̀ hụlanụ ihe mere Pọl ji dee, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu, n’ihi na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu ahụ́”? (Efe. 4:25) Ọ bụrụ na mmadụ bụ onye e ji ụgha mara, eleghị anya kemgbe ọ bụ nwata, o nwere ike isiri ya ike ịmalite ikwu eziokwu. Ma, obi ga-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na ọ na-agba mbọ ịkwụsị ịgha ụgha, ọ ga-enyekwara ya aka ịkwụsị ya.
13. Olee ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịkwụsị ikwu okwu mkparị?
13 Jehova na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị ezinụlọ anyị nakwa ndị nọ n’ọgbakọ ùgwù nakwa otú anyị na ha ga-esi dịrị n’otu. O mere nke a site n’ịgwa anyị otú anyị kwesịrị isi na-ekwu okwu. “Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta . . . Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu.” (Efe. 4:29, 31) Otu n’ime ihe ga-eme ka anyị ghara ịna-agwa ndị ọzọ okwu ọjọọ bụ ịkwanyere ha ùgwù. Dị ka ihe atụ, nwoke nke na-agwa nwunye ya okwu ọjọọ kwesịrị ịgba mbọ kwụsị ya, karịchaa mgbe ọ mụtara otú Jehova si akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù. E nwedịrị ụmụ nwaanyị ndị Chineke ji mmụọ nsọ tee mmanụ, bụ́ nke mere ka ha nwee olileanya iso Kraịst bụrụ ndị eze. (Gal. 3:28; 1 Pita 3:7) Nwaanyị nke na-ejikarịkwa olu ike agwa di ya okwu kwesịrị ịkwụsị ya mgbe ọ mụtara otú Jizọs si ejide onwe ya mgbe a kpasuru ya iwe.—1 Pita 2:21-23.
14. Olee ihe mere iwe ọkụ ji emebi ihe?
14 Ihe ọzọ ya na ikwu okwu mkparị yiri bụ iwe ọkụ. Iwe ọkụ nwere ike ime ka mmadụ abụọ dị ná mma see okwu. Iwe dị ka ọkụ. O nwere ike ibibi ihe ma ọ bụrụ na a chịkwaghị ya. (Ilu 29:22) Onye a kpasuru iwe kwesịrị ịchịkwa iwe ya ka ọ ghara ime ka ya na ndị enyi ya see okwu. Ndị Kraịst kwesịrị ịgba mbọ na-agbaghara ndị ọzọ, ha ekwesịghị ịna-ebu iwe n’obi, ma ọ bụkwanụ na-ekwukarị banyere ihe ọjọọ e mere ha. (Ọma 37:8; 103:8, 9; Ilu 17:9) Pọl gwara ndị Efesọs, sị: “Weenụ iwe, ma unu emehiela; unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara, unu enyekwala Ekwensu ohere.” (Efe. 4:26, 27) Ọ bụrụ na mmadụ achịkwaghị iwe ya, ọ ga-eme ka Ekwensu nwee ohere ọ ga-eji mee ka ọgbakọ ghara ịdị n’otu, ma ọ bụkwanụ mee ka ndị nọ na ya na-eserịta okwu.
15. Gịnị ka iwere ihe na-abụghị nke anyị nwere ike ịkpata?
15 Ọ bụrụ na anyị anaghị ewere ihe ndị ọzọ n’agwaghị ha agwa, ọ ga-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu. Baịbụl kwuru, sị: “Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi.” (Efe. 4:28) Ndị Jehova tụkwasịrị ibe ha obi. Ọ bụrụ na Onye Kraịst emee ka ụmụnna ya kwụsị ịtụkwasị ya obi site n’iwere ihe na-abụghị nke ya, ọ ga-eme ka ọgbakọ ghara ịdị n’otu.
Ịhụ Chineke n’Anya Na-eme Ka Anyị Dị n’Otu
16. Olee otú anyị nwere ike isi na-ekwu okwu na-ewuli elu ka anyị wee dịkwuo n’otu?
16 Ihe mere ọgbakọ Ndị Kraịst ji dị n’otu bụ na anyị niile hụrụ Chineke n’anya. Nke a na-emekwa ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya. Ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ n’otú Jehova si jiri obiọma na-emeso anyị ihe, anyị ga-agbasi mbọ ike ime ihe Pọl onyeozi dụrụ n’ọdụ. Ọ sịrị: “[Na-ekwunụ] okwu dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee mee ka ndị na-anụ ya nweta ihe dị mma. . . . Nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko, na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam dị nnọọ ka Chineke sikwa n’aka Kraịst gbaghara unu kpamkpam.” (Efe. 4:29, 32) Jehova na-eji obiọma agbaghara anyị bụ́ ndị na-ezughị okè. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgbaghara ndị ọzọ ma ha mejọọ anyị?
17. Gịnị mere anyị ji kwesị ịgbasi mbọ ike na-adị n’otu?
17 Otú ndị Chineke si dịrị n’otu na-ewetara Jehova otuto. E nwere ọtụtụ ụzọ mmụọ nsọ si eme ka anyị na-eme ihe ndị ga-eme ka anyị dịrị n’otu. Anyị ekwesịghị ịgba isi akwara mgbe mmụọ nsọ na-eduzi anyị. Pọl dere, sị: “Unu adịkwala na-eme ka mmụọ nsọ Chineke nwee mwute.” (Efe. 4:30) Anyị kwesịrị ime ike anyị niile ka anyị wee nọgide na-adị n’otu. Ndị niile nọ n’ebe a dị n’otu na-enwe obi ụtọ. Ịdị n’otu na-ewetakwara Jehova otuto. “Ya mere, ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya, na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya.”—Efe. 5:1, 2.
Gịnị Ka Ị Ga-aza?
• Olee àgwà ndị na-eme ka Ndị Kraịst dịrị n’otu?
• Olee otú anyị nwere ike isi na-akpa àgwà ya emee ka ọgbakọ dịrị n’otu?
• Olee otú anyị ga-esi na-ekwu okwu ya emee ka anyị na ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 17]
Ndị si ná mba dị iche iche dị n’otu
[Foto dị na peeji nke 18]
Ị̀ ma ihe nwere ike ime nwoke na-achụ nwaanyị ma ọ bụ nwaanyị na-achụ nwoke?