E Ji Ịdị n’Otu Mara Ndị Na-efe Chineke Ezi Ofufe
E Ji Ịdị n’Otu Mara Ndị Na-efe Chineke Ezi Ofufe
“M ga-eme ka ha dịrị n’otu, dị ka ìgwè atụrụ nke nọ n’ogige atụrụ.”—MAỊ. 2:12.
1. Olee otú ihe ndị e kere eke si egosi na Chineke nwere amamihe?
OTU ọbụ abụ bụrụ abụ, sị: “Jehova, lee ka ọrụ gị si dị ọtụtụ! I ji amamihe rụọ ha niile. Ụwa jupụtara n’ihe ị rụrụ.” (Ọma 104:24) Anyị na-ahụ amamihe Chineke n’otú dị egwu ọtụtụ nde osisi dị iche iche, ụmụ ahụhụ, ụmụ anụmanụ na nje dị iche iche si arụkọ ọrụ n’ụwa. E nwekwara ọtụtụ ihe ndị na-arụkọ ọrụ n’ahụ́ gị ka ahụ́ wee gbasie gị ike, ma akụkụ ahụ́ gị ndị buru ibu ma ụmụ mkpụrụ ndụ ndị pere mpe.
2. Dị ka e gosiri n’ihe osise dị na peeji nke iri na atọ, gịnị mere o ji atụ ndị mmadụ n’anya na Ndị Kraịst dị n’otu?
2 Jehova kere ụmụ mmadụ ka ha na-arụkọ ọrụ ọnụ. Mmadụ niile nọ n’ụwa eyighị otu, àgwà ha na otú ha si eme ihe dịgasịkwa iche. Ihe ọzọ bụ na o kere mmadụ abụọ mbụ otú ha ga-enwe ike ịna-akpa àgwà ka ya, bụ́ nke ga-eme ka ha na-arụkọ ọrụ ọnụ ma na-enyerịtara ibe ha aka. (Jen. 1:27; 2:18) Ma, ụmụ mmadụ ahapụla Chineke, nke a emekwaala ka ha ghara ịdị n’otu. (1 Jọn 5:19) Ya mere, ebe ọ bụ na ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ bụ ma ndị Efesọs bụ́ ndị ohu, ma ụmụ nwaanyị Grik a ma ama, ma ndị Juu gụrụ akwụkwọ, ma ndị na-ekpeburu arụsị, ọ tụrụ mmadụ niile n’anya na ha dị n’otu.—Ọrụ 13:1; 17:4; 1 Tesa. 1:9; 1 Tim. 6:1.
3. Olee otú Baịbụl si kọwaa ịdị n’otu Ndị Kraịst, oleekwa ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?
3 Ezi ofufe na-eme ka ndị mmadụ na-arụkọ ọrụ ọnụ ka akụkụ ahụ́ anyị dị iche iche. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 12:12, 13.) Ihe ụfọdụ anyị ga-atụle n’isiokwu a bụ: Olee otú ezi ofufe si eme ka ndị mmadụ dịrị n’otu? Gịnị mere o ji bụrụ naanị Jehova ga-emeli ka ọtụtụ nde ndị si mba dị iche iche dịrị n’otu? Olee ihe ndị na-egbochi ndị mmadụ ịdị n’otu, bụ́ ndị Jehova na-enyere anyị aka izere? Oleekwa otú ezigbo Ndị Kraịst si dị iche na Krisendọm n’ihe banyere ịdị n’otu?
Olee Otú Ezi Ofufe Si Eme Ka Ndị Mmadụ Dịrị n’Otu?
4. Olee otú ezi ofufe si eme ka ndị mmadụ dịrị n’otu?
4 Ndị na-efe Jehova ezi ofufe ma na ọ bụ ya kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa n’ihi na ọ bụ ya kere ihe niile. (Mkpu. 4:11) N’agbanyeghị na ezigbo Ndị Kraịst bi n’ebe dị iche iche, ọnọdụ ha ná ndụ adịrịkwa iche iche, ha niile na-erube isi n’iwu Chineke, na-emekwa ihe Baịbụl kwuru. Ha niile na-akpọ Jehova “Nna.” (Aịza. 64:8; Mat. 6:9) N’ihi ya, ha niile bụ ụmụnna, ha dịkwa nnọọ n’otu otú ahụ otu ọbụ abụ si kwuo ya mgbe ọ sịrị: “Lee ka o si dị mma, bụrụkwa ihe na-enye obi ụtọ mgbe ụmụnne bikọtara ọnụ n’ịdị n’otu!”—Ọma 133:1.
5. Olee àgwà na-eme ka ndị na-efe Chineke ezi ofufe dịrị n’otu?
5 N’agbanyeghị na ezigbo Ndị Kraịst ezughị okè, ha na-efekọ Jehova n’ihi na ha hụrụ ibe ha n’anya. Jehova na-akụziri ha ka ha na-ahụ ndị ọzọ n’anya karịa ka onye ọ bụla ọzọ nwere ike ịkụzi. (Gụọ 1 Jọn 4:7, 8.) Okwu ya sịrị: “Yirinụ obi ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi, dị ka uwe. Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ. Ma, e wezụga ihe ndị a niile, yirinụ ịhụnanya dị ka uwe, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Kọl. 3:12-14) Ịhụnanya, bụ́ ihe nkekọ a zuru okè nke ịdị n’otu, bụ isi ihe e ji mara ezigbo Ndị Kraịst. Ọ̀ bụ na gịnwa ahụbeghị na e ji ịdị n’otu mara ndị na-efe Chineke ezi ofufe?—Jọn 13:35.
6. Olee otú olileanya anyị nwere na Alaeze Chineke ga-abịa si eme ka anyị dịrị n’otu?
6 Ezigbo ndị na-efe Chineke dịkwa n’otu n’ihi na ha kweere na Alaeze Chineke bụ naanị ihe ga-akwụsị nsogbu ụmụ mmadụ nwere. Ha ma na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ ma mee ka ụmụ mmadụ ndị na-erubere ya isi dịrị n’udo ruo mgbe ebighị ebi. (Aịza. 11:4-9; Dan. 2:44) N’ihi ya, Ndị Kraịst na-eme ihe Jizọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ sịrị: “Ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.” (Jọn 17:16) Ezigbo Ndị Kraịst anaghị eso alụ agha a na-alụ n’ụwa; ọ bụ ya mere ha ji dịrị n’otu n’agbanyeghị na ndị ọzọ na-alụ agha.
Naanị Ebe Anyị Si Amụta Banyere Chineke
7, 8. Olee otú ihe ndị e ji Baịbụl akụziri anyị si eme ka anyị dịrị n’otu?
7 Ihe mere ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ dịrị n’otu bụ na ha si otu ebe amụ banyere Chineke. Ha ma na Jizọs si n’aka òtù na-achị isi, nke ndị so na ya bụ ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem, akụziri ọgbakọ ihe ma na-eduzi ya. Ndị ikom a na-eji Baịbụl eme mkpebi ma ziga ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị n’ọgbakọ ndị dị ná mba dị iche iche ka ha gwa ha ihe ha kpebiri. Baịbụl kwuru banyere ụfọdụ n’ime ndị nlekọta a na-ejegharị ejegharị, sị: “Mgbe ha na-agafe obodo dị iche iche, ha na-enye ndị nọ n’ebe ahụ iwu ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem kpebiri ka ha debe.”—Ọrụ 15:6, 19-22; 16:4.
8 Taakwa, Òtù Na-achị Isi, nke ndị so na ya bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, na-eme ka ọgbakọ e nwere n’ụwa niile dịrị n’otu. Ha na-ebipụta akwụkwọ ndị e ji amụ banyere Chineke n’ọtụtụ asụsụ. Ọ bụ n’Okwu Chineke ka e si enweta ihe ndị a na-ede na ha. N’ihi ya, ihe a na-akụzi esighị n’aka mmadụ, kama, o si n’aka Jehova.—Aịza. 54:13.
9. Olee otú ọrụ Chineke nyere anyị si eme ka anyị dịrị n’otu?
9 Ndị okenye na-emekwa ka ọgbakọ dịrị n’otu site n’ibute ụzọ n’ikwusa ozi ọma. Ihe mere ka ndị na-efe Chineke dịrị n’otu siri ike karịa ihe na-ejikọ ndị nọ n’òtù dị iche iche e nwere n’ụwa. Ọgbakọ Ndị Kraịst adịghị ka òtù dị iche iche. Ihe mere e ji hiwe ya bụ ka a nọrọ na ya na-efe Jehova ma na-arụ ọrụ ndị dị mkpa, ya bụ, ikwusa ozi ọma, ime ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, na iwuli ọgbakọ elu. (Rom 1:11, 12; 1 Tesa. 5:11; Hib. 10:24, 25) Ọ bụ nke a mere Pọl onyeozi ji kwuo banyere Ndị Kraịst, sị: “Unu guzosiri ike n’otu mmụọ, jiri otu mkpụrụ obi na-agbakọ mbọ maka okwukwe nke sitere n’ozi ọma.”—Fil. 1:27.
10. Olee ihe ụfọdụ mere anyị bụ́ ndị Chineke ji dịrị n’otu?
10 N’ihi ya, ihe mere anyị bụ́ ndị Jehova ji dịrị n’otu bụ na anyị kwere ka Jehova na-achị anyị, anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya, nwee olileanya na Alaeze Chineke ga-egbo mkpa anyị, ma na-erubere ndị Jehova ji edu anyị isi. Jehova na-enyere anyị aka ịkwụsị àgwà ụfọdụ ezughị okè na-eme ka anyị na-akpa, bụ́ ndị nwere ike ime ka anyị ghara ịdị n’otu.—Rom 12:2.
Ịkwụsị Mpako na Ekworo
11. Gịnị mere ịdị mpako ji eme ka ndị mmadụ ghara ịdị n’otu, oleekwa otú Jehova si enyere anyị aka ịkwụsị ya?
11 Mpako na-eme ka ndị mmadụ ghara ịdị n’otu. Onye dị mpako na-ebulikarị onwe ya elu, ọ na-etugbukwa onwe ya n’ọnụ. Ma nke a na-emekarị ka a ghara ịdị n’otu; ndị na-anụ ka ọ na-etu ọnụ nwekwara ike ịna-ekwosa ya ekworo. Jems, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, kwuru hoo haa, sị: “Ụdị ịkpa nganga ahụ niile bụ ihe ọjọọ.” (Jems 4:16) Ọ dịghị mma ileda ndị ọzọ anya. Jehova na-egosi na ya dị nnọọ umeala n’obi n’otú o si emeso anyị bụ́ ndị na-ezughị okè ihe. Devid dere, sị: ‘Ọ bụ ịdị umeala n’obi Chineke na-eme ka m dị ukwuu.’ (2 Sam. 22:36) Okwu Chineke na-enyere anyị aka ịkwụsị mpako site n’ịkụziri anyị otú anyị ga-esi na-eche echiche n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Pọl ji ike mmụọ nsọ jụọ, sị: “Ònye mere ka ị dị iche n’ebe onye ọzọ nọ? N’ezie, olee ihe i nwere nke a na-enyeghị gị enye? Ma, ọ bụrụ na e nyere gị ya enye n’ezie, gịnị mere i ji na-anya isi dị ka à ga-asị na e nyeghị gị ya enye?”—1 Kọr. 4:7.
12, 13. (a) Gịnị mere ikwo ekworo ji dị mfe? (b) Gịnị ka ile ndị ọzọ anya otú Jehova si ele ha ga-arụpụta?
12 Ekworo bụ ihe ọzọ na-eme ka ndị mmadụ ghara ịdị n’otu. Anyị niile nwere “mmụọ nke anyaụfụ” n’ihi na anyị ezughị okè. Ndị jeerela Chineke ozi ruo ogologo oge na-enwedịrị ndị ọzọ anyaụfụ mgbe ụfọdụ n’ihi otú ihe si agaziri ndị ahụ, ihe ndị ha nwere, ihe ùgwù ije ozi ha nwere, ma ọ bụ n’ihi ihe ndị ọzọ ha nwere ike ime. (Jems 4:5) Dị ka ihe atụ, nwanna nwere ezinụlọ nwere ike ịna-ekwosa onye na-eje ozi oge niile ekworo n’amaghị na onye ahụ na-eje ozi oge niile nwekwara ike ịna-enwetụrụ ya anyaụfụ n’ihi na o nwere ụmụ. Olee ihe anyị ga-eme ka nke a ghara ime ka anyị ghara ịdị n’otu?
13 Ihe ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ikwosa ndị ọzọ ekworo bụ icheta na Baịbụl ji ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ tụnyere akụkụ dị iche iche nke ahụ́ mmadụ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 12:14-18.) Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị na anaghị ahụ obi anya otú e si ahụ anya, ọ̀ bụ na ha abụọ adịghị mkpa? Jehova jikwa onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ kpọrọ ihe, n’agbanyeghị na e nwere ndị nwere ike ịna-apụta ìhè mgbe ụfọdụ karịa ibe ha. N’ihi ya, ka anyị na-ele ụmụnna anyị anya otú Jehova si ele ha. Kama ịna-enwere ha anyaụfụ, anyị nwere ike igosi ha na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi nakwa na anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ. Ọ bụrụ na anyị emee otú a, ọ ga-eme ka a hụ ihe dị iche n’ezigbo Ndị Kraịst na okpukpe dị iche iche nke Krisendọm.
E Ji Nkewa Mara Krisendọm
14, 15. Olee ihe mere na Krisendọm si n’ezi ofufe pụọ adịghị n’otu?
14 Ezigbo Ndị Kraịst dị n’otu, ha adịghị ka
okpukpe dị iche iche nke Krisendọm, bụ́ ndị na-eserịta okwu. Na narị afọ nke anọ, e nwere ọtụtụ Ndị Kraịst ụgha, nke na eze ukwu Rom, bụ́ onye na-ekpere arụsị, ghọrọ onye òtù ha ma na-ekwu otú ha ga-esi na-efe ofufe. Nke a mere ka e nwee Krisendọm. N’oge ahụ, mba dị iche iche si n’aka ndị Rom pụọ ma hiwe okpukpe nke ha.15 Ọtụtụ n’ime mba ndị a lụrịtara agha ruo ọtụtụ afọ. Na narị afọ nke iri na asaa na nke iri na asatọ, ndị Briten, Fransị, na Amerịka mere ka ndị mmadụ na-ahụ mba ha n’anya, nke a mere ka ịhụ mba n’anya dị ka okpukpe a na-ekpe ekpe. Na narị afọ nke iri na itoolu na nke iri abụọ, ọtụtụ mmadụ malitere ịhụ mba ha n’anya. Na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm, e mechara nwee ọtụtụ òtù, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha kwadoro ịhụ mba n’anya. Ndị na-aga chọọchị na-alụsodị ndị ha na ha na-ekpe otu okpukpe, bụ́ ndị nọ ná mba ọzọ, agha. Taa, òtù dị iche iche dị na Krisendọm enweghị otu olu n’ihe ha na-ezi, ha hụkwara mba ha n’anya.
16. Olee ihe ụfọdụ mere ka ndị nọ na Krisendọm ghara ịdị n’otu?
16 Na narị afọ nke iri abụọ, ọtụtụ narị òtù e nwere na Krisendọm chọwara ka ha dịrị n’otu. Ma, mgbe ha nwara ike ha ruo ọtụtụ afọ, ọ bụ naanị chọọchị ole na ole n’ime ha kwetara ịdị n’otu. N’agbanyeghị nke a, ha enweghị otu olu n’ihe ha na-ekwu banyere evolushọn, ite ime, nwoke na nwoke inwe mmekọahụ ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ, na ichi ndị nwaanyị ụkọchukwu. Ndị ndú nke okpukpe dị iche iche dị na Krisendọm na-achọ ka ndị nọ n’òtù dị iche iche dịrị n’otu site n’ime ka ndị chọọchị ha leghara nkwenkwe ụfọdụ na-akpata nkewa anya. Ma, nke a na-eme ka ndị mmadụ ghara ịma nke ha ga-ekwere ekwere, ọ naghịkwa eme ka chọọchị dị iche iche nke Krisendọm, bụ́ ndị na-adịghị n’otu, dịrị n’otu.
Ndị Na-efe Chineke Ezi Ofufe Anaghị Ahụ Mba n’Anya
17. Olee amụma e buru banyere otú ezi ofufe ga-esi mee ka ndị mmadụ dịrị n’otu “n’oge ikpeazụ”?
17 N’agbanyeghị na ụmụ mmadụ adịtụdịghị n’otu ugbu a, ndị na-efe Chineke ezi ofufe dị n’otu. Onye amụma Chineke bụ́ Maịka buru amụma, sị: “M ga-eme ka ha dịrị n’otu, dị ka ìgwè atụrụ nke nọ n’ogige atụrụ.” (Maị. 2:12) Maịka buru amụma na a ga-ebuli ezi ofufe elu karịa ụdị ofufe ọ bụla ọzọ, ma ife chi ụgha ma ife mba. O dere, sị: “Ọ ga-eru n’oge ikpeazụ na a ga-eme ka ugwu nke ụlọ Jehova guzosie ike n’ebe dị elu karịa ugwu ukwu niile, a ga-ebulikwa ya ka ọ dị elu karịa ugwu nta niile; ndị dị iche iche ga-enubakwa n’ime ya. N’ihi na ndị niile dị iche iche ga na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha chi ya; ma anyị onwe anyị ga na-ejegharị n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị.”—Maị. 4:1, 5.
18. Olee ihe ụfọdụ ife Chineke ezi ofufe merela ka anyị gbanwee otú anyị si eme ha?
Maị. 4:2, 3) Ndị kwụsịrị ife chi mmadụ mere ma ọ bụ kwụsị ife mba ha ma malite ife Jehova dị n’otu n’ụwa niile. Chineke na-akụziri ha ka ha hụ ndị ọzọ n’anya.
18 Maịka kwukwara otú ezi ofufe ga-esi mee ka ndị bụbu ndị iro dịrị n’otu. “[Ndị si] ọtụtụ mba ga-ejekwa, sị: ‘Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova, n’ụlọ Chineke nke Jekọb; ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya, anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.’ . . . Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi. Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.” (19. Olee ihe ojiji ọtụtụ nde mmadụ ji ịdị n’otu efe Chineke ezi ofufe na-egosi?
19 Otú ezigbo Ndị Kraịst si dịrị n’otu n’ụwa niile pụrụ iche, ọ na-egosikwa na Jehova ka ji mmụọ ya na-edu ndị ya. A na-eme ugbu a ka ndị si ná mba niile dịrị n’otu n’ụzọ a na-emetụbeghị mbụ. Nke a na-egosi na ihe ahụ e kwuru ná Mkpughe 7:9, 14 na-emezu, ọ na-egosikwa na n’oge na-adịghị anya, ndị mmụọ ozi Chineke ga-ahapụ “ifufe” ndị ahụ ga-akpata mbibi nke usoro ihe a. (Gụọ Mkpughe 7:1-4, 9, 10, 14.) Í cheghị na ọ bụ ihe ùgwù iso n’ụmụnna dị n’otu n’ụwa niile? Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike isi mee ka anyị dịrị n’otu? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.
Gịnị Ka Ị Ga-aza?
• Olee otú ezi ofufe si eme ka ndị mmadụ dịrị n’otu?
• Olee otú anyị ga-esi mee ka ekworo ghara ime ka anyị kwụsị ịdị n’otu?
• Gịnị mere ndị na-efe Chineke ezi ofufe ji adị n’otu n’agbanyeghị na e ji ịhụ mba n’anya mara ndị mmadụ?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 13]
Ndị Kraịst oge ochie si ebe dị iche iche
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Olee otú gị iso na-arụ ọrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ga-esi eme ka ụmụnna dịrị n’otu?