Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ije Ozi n’Oge a a Na-enwe Ọganihu Na-enweghị Atụ

Ije Ozi n’Oge a a Na-enwe Ọganihu Na-enweghị Atụ

Ije Ozi n’Oge a a Na-enwe Ọganihu Na-enweghị Atụ

Dị ka Harley Harris si kọọ

Na Septemba 2, n’afọ 1950, anyị gara mgbakọ sekit n’obodo Kenet, Mizuri, nke dị n’Amerịka. Ìgwè mmadụ ndị na-eme ihe ike gbara anyị gburugburu. Onyeisi obodo ahụ zitere ndị agha ka ha napụta anyị n’aka ha. Ndị agha ahụ ji égbè na daga nọrọchaa n’okporo ámá obodo ahụ. Ìgwè mmadụ ahụ nọ na-akparị anyị mgbe anyị banyere ụgbọala anyị gawa Kep Jirado dị na Mizuri, ịga nọrọ ebe ahụ mechaa mgbakọ ahụ. Ọ bụ ebe ahụ ka e mere m baptizim mgbe m dị afọ iri na anọ. Ma, ka m gwa gị otú m si malite ife Jehova n’oge ahụ e nwere ọgba aghara.

TUPU afọ 1940, nne na nna papa m na ụmụ ha asatọ gere okwu dị iche iche Nwanna Rutherford kwuru, bụ́ ndị dị na rekọd. Ha kwetara na ihe ha na-egere bụ eziokwu. E mere papa m na mama m, bụ́ Bay na Mildred Harris, baptizim ná mgbakọ e nwere na Wọshịntịn Diisi n’afọ 1935. Obi dị ha nnọọ ụtọ iso ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ, bụ́ ndị a matara ndị ha bụ ná mgbakọ ahụ.—Mkpu. 7:9, 14.

Ọ bụ n’afọ 1936 ka a mụrụ m. Papa m na mama m kwagara n’ókèala dịpụrụ adịpụ na Misisipi, n’afọ 1937. O nweghị onye nlekọta na-ejegharị ejegharị bịara ebe ahụ leta anyị. Ezinụlọ anyị na-edega akwụkwọ na Betel, na-agakwa mgbakọ dị iche iche n’oge ahụ. Ọ bụ naanị otú a ka anyị na ụmụnna si akpakọrịta.

Otú Anyị Si Tachie Obi n’Oge A Na-akpagbu Anyị

A kpagbuhiri Ndịàmà Jehova nne n’oge Agha Ụwa nke Abụọ n’ihi na ha esoghị na-alụ agha. Anyị kwagara na Mawntin Hom, nke dị n’Akịnsọọ. Otu ụbọchị, ka mụ na papa m nọ na-agba àmà okporo ámá, otu nwoke pụtara hịọnara papa m magazin ọ chị n’aka, gbaa ha ọkụ ozugbo. Ọ kpọrọ anyị ndị ụjọ maka na anyị anaghị ekwe aga agha. M dị naanị afọ ise mgbe ahụ. M malitere ibe ákwá. Papa m ji nwayọọ lee nwoke ahụ anya n’agwaghị ya ihe ọ bụla ruo mgbe nwoke ahụ si ebe ahụ pụọ.

E nwekwara ndị ezigbo mmadụ, bụ́ ndị ihe anyị na-amasị. Otu ụbọchị, mgbe ìgwè mmadụ ndị na-eme ihe ike gbara anyị gburugburu, otu ọkàiwu e nwere n’obodo ahụ bịara ka ọ mara ihe na-aganụ. Ọ jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ gịnị na-eme?” Otu onye n’ime ha zara ya, sị: “Ndịàmà Jehova a ekweghị alụrụ mba anyị agha!” Ọkàiwu ahụ bịara ebe ahụ ụgbọala anyị dị ma magoro n’ụgbọala anyị kwuo, sị: “Eso m lụọ Agha Ụwa nke Mbụ, m ga-esokwa lụọ nke a! Hapụnụ ha. O nweghị onye ha na-enye nsogbu!” Ìgwè mmadụ ahụ ji nwayọọ lasaa. Anyị nwere obi ụtọ dị ukwuu na e nwere ndị ezigbo mmadụ ji obiọma na-emeso anyị ihe!—Ọrụ 27:3.

Mgbakọ Dị Iche Iche Gbara Anyị Ume

Mgbakọ e nwere na Senti Luwiz, Mizuri, n’afọ 1941 bịara n’oge ya. Ihe dị ka otu narị puku na puku mmadụ iri na ise bịara ya. E mere puku mmadụ atọ na narị itoolu na atọ baptizim. M ka na-echeta okwu Nwanna Rutherford kwuru, nke isiokwu ya bụ “Ụmụ Eze ahụ.” Ọ bụ anyị bụ́ ụmụaka ka o bu n’obi kwuo okwu ya, anyị niile natakwara akwụkwọ bụ́ Children, bụ́ akwụkwọ mara mma nke mkpo ya na-acha anụnụ anụnụ. Mgbakọ ahụ nyeere m aka idi ihe mere n’afọ sochiri ya, bụ́ afọ m malitere ụlọ akwụkwọ praịmarị. A chụrụ mụ na ụmụ nwanne papa m n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na anyị jụrụ ikele ọkọlọtọ. Anyị na-aga ụlọ akwụkwọ kwa ụbọchị iji mara ma ndị isi ụlọ akwụkwọ anyị hà agbanweela obi. Ọtụtụ mgbe, anyị wachaa ọhịa niile anyị na-awa rute, a chụghachi anyị azụ. Ma, m weere ya na ọ bụ otú anyị si egosi na anyị na-akwado Ọchịchị Chineke.

Ma, ọ dịghị anya, Ụlọikpe Kacha Elu n’Amerịka ekwuo na ọ bụghị iwu na mmadụ ga-ekele ọkọlọtọ. N’ikpeazụ, anyị malitere ịga akwụkwọ ọzọ. Onye nkụzi anyị nwere obiọma, ọ kụzikwaara anyị ihe ndị anyị na-anọghị mgbe ọ kụziri ha. Ụmụ akwụkwọ anyị na-akwanyekwara anyị ùgwù.

M na-echetakwa mgbakọ e nwere na Klivland, Ohayo n’afọ 1942, bụ́ ebe Nwanna Nathan H. Knorr kwuru okwu nke isiokwu ya bụ “Udo—Ọ̀ Pụrụ Ịdịgide?” Otú o si kọwaa Mkpughe isi iri na asaa n’isiokwu ahụ gosiri na udo ga-adịtụ ma a lụchaa Agha Ụwa nke Abụọ. Ya mere, a tụrụ anya na a ka ga-arụ ọrụ dị ukwuu. Iji nwee ike ịkwadebe maka ọrụ ahụ, a malitere Ụlọ Akwụkwọ Gilied n’afọ 1943. Amaghị m n’oge ahụ na Ụlọ Akwụkwọ Gilied ga-enyere m aka n’ọdịnihu. Udo dị mgbe a lụchara agha ahụ, a kwụsịtụkwara ịkpagbu anyị. Ma, mgbe Agha Koria malitere n’afọ 1950, a malitere ịkpagbu anyị ọzọ, dị ka m kwuru ná mmalite.

Iso Na-ejechi Ozi Anya

N’afọ 1954, apụtara m n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, malitekwa ịsụ ụzọ mgbe otu ọnwa gachara. Mgbe m jetụrụ ozi na Kenet, Mizuri, bụ́ ebe ndị ahụ na-eme ihe ike bu ọgụ bịakwute anyị n’afọ 1950, a kpọrọ m ka m bịa jewe ozi na Betel na Mach 1955. Taịm Skwịa, bụ́ nke dị n’etiti Niu Yọk Siti, so n’ókèala ọgbakọ m nọ na ya. Ebe a dị nnọọ iche n’ime ime obodo m si. Otú m si eme ka ọtụtụ ndị bi na Niu Yọk na-anaghị enwe ohere nwee mmasị n’ozi ọma bụ imepe otu isiokwu na-eme ka mmadụ chee echiche, ma jụọ sị, “Ị̀ jụtụla onwe gị ajụjụ a?” Ọtụtụ n’ime ha na-anara magazin ndị ahụ.

Otu n’ime ihe ndị kacha amasị m na Betel bụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị nke Nwanna Knorr na-eduzi kwa ụtụtụ. Ọ na-akọwa Baịbụl otú na-eru n’obi. Ọ na-agwa anyịnwa bụ́ ụmụ okorobịa na-alụbeghị nwaanyị otú nna si agwa ụmụ ya okwu, ọ na-agwakarịkwa anyị otú anyị kwesịrị isi na-emeso ụmụ agbọghọ ihe. Ekpebiri m ịlụ nwaanyị n’ihe dị ka n’afọ 1960.

Edere m akwụkwọ ozi m ji gwa alaka ụlọ ọrụ na m chọrọ ịhapụ Betel n’ime iri ụbọchị atọ, ma, ha azaghachighị m ya. Mgbe oge ahụ ruru, n’agbanyeghị na m bụ onye ihere, m jisiri ike kpọọ ha na fon jụọ ha ma hà natakwara akwụkwọ ozi m detaara ha. Nwanna Robert Wallen zara fon ahụ ma mechaa chọrọ m bịa n’ebe m na-arụ ọrụ jụọ m ma m̀ ga-achọ ka e mee m ọsụ ụzọ pụrụ iche ka ọ̀ bụ onye nlekọta sekit. M zara ya, sị: “Ị manụ na adị m naanị afọ iri abụọ na anọ, o nwebeghịkwa ihe m ma.”

Ilekọta Sekit

Enwetara m nnukwu envelopu mgbe m batara n’ọnụ ụlọ m n’abalị ahụ. Fọm abụọ dị ya n’ime, otu bụ nke onye chọrọ ịbụ ọsụ ụzọ pụrụ iche, nke ọzọ bụ nke onye chọrọ ịbụ onye nlekọta sekit. Nke a tụrụ m n’anya. Enwere m ihe ùgwù pụrụ iche ịbụ onye nlekọta sekit nke ụmụnna anyị bi n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ Mizuri nakwa ebe ọwụwa anyanwụ Kanzes. Ma, tupu mụ apụọ na Betel, agara m nnọkọ a kpọrọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Mgbe Nwanna Knorr na-ekwu okwu mmechi, ọ sịrị: “Na unu bụ ndị nlekọta sekit na ndị nlekọta distrikti apụtaghị na unu ka ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị iche iche mara ihe. Ụfọdụ n’ime ha anọteela aka n’ọgbakọ. Ma, otú ihe si dịrị ha agaghị ekwe ha ịbụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Unu ga-amụta ọtụtụ ihe n’aka ha.”

Ihe ahụ o kwuru mezuru. Anyị mụtara ihe dị ukwuu n’aka Nwanna Fred Molohan na nwunye ya nakwa nwanne Fred bụ́ Charley nke si Pasịns, Kanzes. Ha batara n’ọgbakọ n’ihe dị ka n’afọ 1900. Obi na-atọ m ụtọ ma ha na-akọrọ m ahụmahụ ndị ha nwere tupu amụọ m. Nwanna ọzọ bụ John Wristen, bụ́ nwanna nwoke katarala ahụ́, onye nwere obiọma, nke si Jọplin, Mizuri. Ọ sụọla ụzọ ọtụtụ iri afọ. Ụmụnna ndị a ejighị otú ihe si na-aga n’ọgbakọ Jehova egwu egwu. N’agbanyeghị na ha tọrọ m nke ọma, ha na-akwanyere m ùgwù e kwesịrị ịkwanyere onye nlekọta sekit.

N’afọ 1962, alụrụ m Cloris Knoche, bụ́ ọsụ ụzọ nwere ihu ọchị, nke ntutu isi ya na-acha anwụ anwụ. Mụ na Cloris sozi na-aga eleta ọgbakọ. Ọnụnọ anyị na-anọ n’ụlọ ụmụnna dị iche iche mere ka anyị mata ha nke ọma. Anyị gbara ndị na-eto eto ume ka ha malite ozi oge niile. Jay Kosinski na JoAnn Kresyman, bụ́ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eto eto nọ na sekit anyị, dị njikere ịmalite ọrụ ịsụ ụzọ. Ọrụ anyị na ha rụkọrọ n’ozi ọma na akụkọ anyị kọọrọ ha banyere ọṅụ ndị na-anaghị achọ naanị ọdịmma ha na-enweta nyeere ha aka ịma ihe ha ga-eme ná ndụ. JoAnn ghọrọ ọsụ ụzọ, Jay agaa Betel. Ha abụọ mechara bụrụ di na nwunye, ha arụkwaala ọrụ njegharị ihe dị ka iri afọ atọ.

Ije Ozi Ala Ọzọ

N’afọ 1966, Nwanna Knorr jụrụ anyị ma ànyị ga-achọ ije ozi ná mba ọzọ. Anyị zara ya sị, “Ebe anyị nọ dị anyị mma, ma, ọ bụrụ na e nwere ebe ọzọ a chọrọ ka anyị gaa, nsogbu adịghị.” Mgbe otu izu gara, a kpọrọ anyị ka anyị bịa Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Obi dị anyị ụtọ ịbịaghachi Betel bụ́ ebe ụlọ akwụkwọ ahụ dị. Obi dịkwa anyị ụtọ ịhụ ọtụtụ ndị anyị hụrụ n’anya, na-akwanyekwara ùgwù. Anyị na ndị anyị na ha gụkọrọ akwụkwọ, bụ́ ndị ka ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi ruo taa, ghọkwara ezigbo enyi.

E zigara mụ na Cloris nakwa Dennis na Edwina Crist, Ana Rodríguez, na Delia Sánchez Ekwedọọ nke dị na Kọntinent Ebe Ndịda Amerịka. Dennis na Edwina Crist gawara isi obodo Ekwedọọ bụ́ Kito. E zigara anyị na Ana na Delia n’obodo nke atọ kacha ukwuu n’Ekwedọọ, bụ́ Kwenka. E nwere ógbè abụọ n’obodo ahụ. Ọ bụ na palọ anyị ka ọgbakọ mbụ e nwere na Kwenka malitere. Ọ bụ anyị anọ na mmadụ abụọ ọzọ nọ na ya. Nke a mere ka anyị na-eche otú naanị anyị ga-esi nwee ike ikwusa ozi ọma ebe ahụ niile.

E nwere ọtụtụ ụlọ chọọchị na Kwenka, ha nwekwara ọtụtụ ụbọchị ha na-akpọ ụbọchị nsọ, bụ́ mgbe ha na-eme ọtụtụ ememme okpukpe. N’agbanyeghị nke a, ndị Kwenka na-ajụ anyị ọtụtụ ajụjụ. Dị ka ihe atụ, mgbe mbụ mụ na Mario Polo, bụ́ ọkaibe n’ịgba ígwè na Kwenka, kwurịtara okwu, ọ jụrụ m ajụjụ tụrụ m n’anya. Ọ jụrụ m, sị: “Ònye bụ akwụna ahụ akwụkwọ Mkpughe kwuru okwu ya?”

O nwere ụbọchị Mario bịara n’ụlọ anyị n’abalị, ma, ihu adịghị ya mma. Otu pastọ nyere ya akwụkwọ ụfọdụ na-akatọ Ndịàmà Jehova. M gwara ya na onye a na-egbu egbu kwesịrị ịzara ọnụ. N’echi ya, Mario kpọrọ mụ na pastọ ahụ n’ụlọ ya ka m zara ọnụ m. Mgbe anyị rutere, agwara m ya ka anyị buru ụzọ kwuo banyere Atọ n’Ime Otu. Mgbe pastọ ahụ gụrụ Jọn 1:1, Mario ji aka ya kọwaa ihe amaokwu ahụ pụtara. Ọ bụkwa ya ji aka ya kọwaa amaokwu ndị ọzọ a gụrụ na Baịbụl. Pastọ ahụ emelighị ka a ghọta na ozizi Atọ n’Ime Otu si na Baịbụl tupu ya alawa. Nke a mere ka o doo Mario na nwunye ya anya na ihe anyị na-akụzi bụ eziokwu, ha malitekwara ịkọrọ ndị ọzọ ihe dị na Baịbụl. Obi dị anyị ụtọ na e nweela ọgbakọ iri atọ na atọ na Kwenka, nweekwa ọgbakọ iri isii na atọ ná nnukwu ókèala ahụ anyị malitere ozi ala ọzọ. N’eziokwu, ọ bụ ọganihu na-enweghị atụ!

Ije Ozi n’Alaka Ụlọ Ọrụ

N’afọ 1970, a gwara mụ na Al Schullo ka anyị gaa jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Guayakwil. Ọ bụ anyị abụọ na-elekọta ọrụ a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ n’oge ahụ. Joe Sekerak na-abịa alaka ụlọ ọrụ mgbe ụfọdụ enyere anyị aka akwadebe akwụkwọ a na-ebugara ọgbakọ iri anọ na isii dị n’obodo ahụ niile. E nwere mgbe m na-arụ ọrụ na Betel, ebe Cloris na-aga ekwusa ozi ọma. O nyeere iri mmadụ ise na ise aka ịbụ ndị e mere baptizim. Ná mgbakọ ọ bụla, a na-eme ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, mmadụ atọ ọ na-amụrụ Baịbụl baptizim, ha na-erukwa mmadụ ise mgbe ụfọdụ.

Dị ka ihe atụ, Cloris mụụrụ otu nwaanyị aha ya bụ Lucresia Baịbụl, bụ́ onye di ya na-achọghị ka ọ mụọ Baịbụl. N’agbanyeghị nke a, e mechara mee Lucresia baptizim, ya amalite ịsụ ụzọ. Lucresia mụụrụ ụmụ ya Baịbụl. Ụmụ ya abụọ bụ ndị okenye ọgbakọ ugbu a, otu bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche; nwa ya nwaanyị bụ ọsụ ụzọ. Otu nwanna nwoke, bụ́ ezigbo mmadụ, lụrụ nwa nwa ya, ha abụọ bụkwa ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ezinụlọ a enyerela ọtụtụ ndị aka ịbata n’ọgbakọ.

N’afọ 1980, e nwere ihe dị ka puku ndị nkwusa ise n’Ekwedọọ. Nke a pụtara na anyị ga-achọ ebe ọzọ ka ukwuu anyị ga-anọ na-arụ ọrụ. Otu nwanna nyere anyị ala dị hekta iri atọ na abụọ, nke dị ná mpụga Guayakwil. N’afọ 1984 anyị malitere ịrụ alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ na Ụlọ Mgbakọ n’ala ahụ, a raara ha nye Jehova n’afọ 1987.

Ụmụnna Dị Njikere Iso Na-arụ Ọrụ Ahụ

Kemgbe ọtụtụ afọ, obi dị m ụtọ ịhụ ka ọtụtụ ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ si mba dị iche iche na-abịa Ekwedọọ ka ha nwee ike inye aka n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa Alaeze. Otu onye n’ime ha m na-anaghị echefu echefu bụ Andy Kidd, bụ́ onye nkụzi lara ezumike nkà, nke si Kanada. Ọ kwafetere n’Ekwedọọ n’afọ 1985 bụ́ mgbe ọ dị iri afọ asaa, o jikwa ikwesị ntụkwasị obi na-eje ozi ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 2008 mgbe ọ dị iri afọ itoolu na atọ. Ụbọchị mbụ m gara ọgbakọ ọ nọ, ọ bụ naanị ya bụ okenye n’obere ọgbakọ ahụ. Ọ na-eji asụsụ Spanish ekwu okwu ihu ọha, n’agbanyeghị na ọ machaghị ya nke ọma, ya kwuchaa, ya eduzie Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ọ bụkwa ya na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, na-emekwa ihe ka ukwuu n’ihe omume ndị a na-eme ná Nzukọ Ije Ozi! E nweela ọgbakọ abụọ kwụ chịm n’ebe ahụ ugbu a. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị ndị nkwusa abụọ nọkwa na ha, ọtụtụ n’ime ndị okenye nọ na ha bụkwa ndị ebe ahụ.

Nwanna nwoke ọzọ aha ya bụ Ernesto Diaz, bụ́ onye si Amerika kwata Ekwedọọ, kwuru mgbe o mere ọnwa asatọ o bi ebe ahụ, sị: “Ụmụ atọ anyị amụtala asụsụ Spanish, ha jikwa ya ezi ozi ọma nke ọma. Amalitere m ime ihe m chere na ọ gaghị ekwe m bụ́ nna omume n’usoro ihe a, ya bụ, mụ na ezinụlọ m ije ozi oge niile. Anyị niile na-amụrụ iri mmadụ abụọ na ise Baịbụl. Nke a emeela ka ezinụlọ anyị dịkwuo n’otu, nke ka nke, o meela ka mụ na Jehova dị ná mma, bụ́ ihe na-emetụbeghị.” Ihe ụmụnna ndị a mere masịrị anyị nke ukwuu.

E wusakwuru alaka ụlọ ọrụ anyị n’afọ 1994, nke a mere ka alaka ụlọ ọrụ anyị bụrụ okpukpu abụọ nke otú ọ habu. N’afọ 2005, ndị nkwusa anyị gafere puku iri ise, nke a mere ka ọ dị mkpa na a ga-ewusakwu alaka ụlọ ọrụ anyị. A ga-arụkwa Ụlọ Mgbakọ bukwuru ibu, ebe obibi ọhụrụ, na ụlọ a ga-anọ na-eme nsụgharị. A raara ihe ndị a nye Jehova n’Ọktoba 31, 2009.

Mgbe ahụ a chụrụ m n’ụlọ akwụkwọ n’afọ 1942, e nwere ihe dị ka puku Ndịàmà iri isii n’Amerịka. Ugbu a, e nwere ihe karịrị otu nde ndị nkwusa n’ebe ahụ. Mgbe anyị bịara Ekwedọọ n’afọ 1966, e nwere ihe dị ka otu puku ndị nkwusa na narị anọ na ya. Ugbu a, e nwere ihe karịrị iri puku ndị nkwusa isii na asatọ ebe ahụ. Otu narị puku na puku iri abụọ a na-amụrụ Baịbụl nakwa narị puku mmadụ abụọ na puku iri atọ na puku abụọ bịara Ncheta Ọnwụ Kraịst n’afọ 2009 gosiri na a ka nwere ọtụtụ ndị nwere ike ịbata n’ọgbakọ. N’eziokwu, Jehova agọziela ndị ya nke ukwuu otú anyị na-atụghị anya ya. Obi dị m ụtọ ịnọ ndụ n’oge a a na-enwe ọganihu na-enweghị atụ n’ọgbakọ Jehova. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 34 Ka a na-akwadebe ibipụta Ụlọ Nche a, Harley Harris nwụrụ. O jeere Jehova ozi ruo ọnwụ.

[Foto dị na peeji nke 5]

Mgbakọ e nwere na mbara èzí n’afọ1981 na Ụlọ Mgbakọ dị na Guayakwil (n’afọ 2009) n’ala ahụ a nọ nwee mgbakọ n’afọ 1981