Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ònye Maara Uche Jehova?”

“Ònye Maara Uche Jehova?”

“Ònye Maara Uche Jehova?”

“‘Ònye maara uche Jehova, ka o wee kụziere ya ihe?’ Ma anyị nwere uche nke Kraịst.”—1 KỌR. 2:16.

1, 2. (a) Olee ihe na-esiri ọtụtụ ndị ike ịmara? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi banyere otú anyị si eche echiche na otú Jehova si eche?

Ò NWEELA mgbe o siiri gị ike ịmara uche onye ọzọ? O nwere ike ịbụ na ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye n’oge na-adịbeghị anya, gị ana-echekwa na o nweghị otú ị ga-esi marachaa uche di gị ma ọ bụ nwunye gị. Nke bụ́ eziokwu bụ na otú ụmụ nwoke si eche echiche dị iche n’otú ụmụ nwaanyị si eche. Otú ha si ekwu ihe dị ha n’obi dịkwa iche. N’ebe ụfọdụ, otú ụmụ nwoke si asụ asụsụ dị iche n’otú ụmụ nwaanyị si asụ, n’agbanyeghị na ọ bụ otu asụsụ ka ha na-asụ. Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na mmadụ abụọ esighị otu ebe ma ọ bụ na-asụ otu asụsụ, otú ha ga-esi na-eche echiche ma ọ bụkwanụ na-akpa àgwà agaghị abụ otu. Ma, ọ bụrụ na ị na-abịakwu ndị ọzọ nso, ọ ga-adịrị gị mfe ịmara otú ha si eche echiche.

2 Ya mere, o kwesịghị iju anyị anya na otú anyị si eche echiche dị nnọọ iche n’otú Jehova si eche. Jehova si n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịzaya gwa ụmụ Izrel, sị: “Echiche unu abụghị echiche m, ụzọ m abụghịkwa ụzọ unu.” Jehova mere ihe atụ iji gosi na nke a bụ eziokwu. Ọ sịrị: “N’ihi na dị ka eluigwe dị elu karịa ụwa, otú ahụ ka ụzọ m dị elu karịa ụzọ unu, otú ahụkwa ka echiche m dị elu karịa echiche unu.”—Aịza. 55:8, 9.

3. Olee ihe abụọ n’ime ihe ndị ga-eme ka anyị na Jehova nwee “mmekọrịta chiri anya”?

3 Ma, nke a ọ̀ pụtara na anyị ekwesịghị ịgba mbọ ọ bụla iji mara otú Jehova si eche echiche? Mba. N’agbanyeghị na anyị enweghị ike ịmacha echiche Jehova, Baịbụl gbara anyị ume ka anyị na ya “na-enwe mmekọrịta chiri anya.” (Gụọ Abụ Ọma 25:14; Ilu 3:32.) Otu n’ime ụzọ ndị anyị ga-esi bịaruo Jehova nso bụ ichebara ihe ndị o mere, bụ́ ndị e dere n’Okwu ya bụ́ Baịbụl, echiche na igosi na obi dị anyị ụtọ maka ha. (Ọma 28:5) Ụzọ ọzọ bụ ịmara “uche nke Kraịst,” onye bụ́ “onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya.” (1 Kọr. 2:16; Kọl. 1:15) Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge na-amụ Baịbụl ma na-echebara ihe ndị anyị na-amụ echiche, anyị ga-amatawa àgwà Jehova nakwa otú o si eche echiche.

Lezie Anya Ka Ị Ghara Inwe Echiche Na-ezighị Ezi

4, 5. (a) Olee echiche na-ezighị ezi anyị kwesịrị izere? Kọwaa. (b) Olee echiche na-ezighị ezi ụmụ Izrel nwere?

4 Ka anyị na-echebara ihe dị iche iche Jehova mere echiche, anyị ekwesịghị ịtụ anya ka Jehova na-eme ihe ka ụmụ mmadụ. Baịbụl kwuru banyere ụdị echiche a n’Abụ Ọma 50:21, sị: “I chere na m ga-adị ka gị.” Nke a yiri ihe otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru n’ihe karịrị otu narị afọ na iri asaa na ise gara aga. Ọ sịrị: “Ụmụ mmadụ na-achọ ka Chineke na-eme ka ha. Ha chekwara na o kwesịrị ịna-edebe iwu ndị ha na-edebe.”

5 Anyị kwesịrị ilezi anya ka anyị ghara ịtụ anya ka Jehova na-ele ihe anya otú mmadụ si ele ya. Olee ihe mere anyị ji kwesị ime nke a? Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, ka anyị na-agụ Akwụkwọ Nsọ, anyị nwere ike ịna-eche na ihe ụfọdụ Jehova mere ezichaghị ezi. N’oge ochie, ụmụ Izrel nwere ụdị echiche a, nke mere ka ha katọọ otú Jehova si emeso ha ihe. Jehova gwara ha, sị: “Unu ga-asịkwa: ‘Ụzọ Jehova ezighị ezi.’ Biko, nụrụ, gị ụlọ Izrel. Ọ̀ bụ na ụzọ m ezighị ezi? Ọ́ bụghị ụzọ unu bụ nke na-ezighị ezi?”—Ezik. 18:25.

6. Olee ihe Job mụtara n’ihe mere ya, oleekwa ihe anyị ga-amụta na nke a?

6 Otu n’ime ihe ga-eme ka anyị ghara ịtụ anya ka Jehova na-eme ihe ka anyị bụ ịghọta na anyị amachaghị ihe niile nakwa na mgbe ụfọdụ, echiche anyị anaghị ezi ezi. Job kwesịrị ịghọta nke a. Oge ọ na-ata ahụhụ, o nwere mwute dị ukwuu nke mere ka o chewe naanị banyere onwe ya. Ọ ghọtaghị ihe mere o ji na-ata ahụhụ. Ma, Jehova gosiri ya na ya hụrụ ya n’anya site n’inyere ya aka ya agbanwee echiche ya. Jehova jụrụ Job ihe karịrị ajụjụ iri asaa, bụ́ ndị ọ na-azalighị. O si otú a gosi Job na o nwere ihe ndị ọ na-amaghị. Nke a mere ka Job weda onwe ya ala wee gbanwee echiche ya.—Gụọ Job 42:1-6.

Otú Anyị Ga-esi Mara “Uche nke Kraịst”

7. Olee otú ịtụle ihe dị iche iche Jizọs mere mgbe ọ bịara n’ụwa ga-esi nyere anyị aka ịmara otú Jehova si eche echiche?

7 Jizọs ṅomiri Nna ya n’ihe niile, ma n’okwu ọnụ ma n’omume. (Jọn 14:9) N’ihi ya, anyị ga-amara otú Jehova si eche echiche ma ọ bụrụ na anyị na-atụle ihe dị iche iche Jizọs mere mgbe ọ bịara n’ụwa. (Rom 15:5; Fil. 2:5) Ya mere, ka anyị tụlee ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ Jọn na akwụkwọ Mak.

8, 9. Dị ka e kwuru na Jọn 6:1-5, olee ihe merenụ nke mere ka Jizọs jụọ Filip ajụjụ, gịnịkwa mere o ji jụọ ya ajụjụ ahụ?

8 Were ya na ị nọ ya mgbe ihe a na-eme. Ọ fọrọ obere ka e mee Ememme Ngabiga nke afọ 32 O.A. Ndịozi Jizọs ka si ozi ọma pụrụ iche ha gara na Galili lọta. Ebe ọ bụ na ike gwụrụ ha, Jizọs kpọọrọ ha gaa ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke Oké Osimiri Galili, bụ́ ebe dịpụrụ nnọọ adịpụ. Ma, ọtụtụ puku mmadụ sooro ha gaa ebe ahụ. E nwere otu nsogbu mgbe Jizọs gwọchara ìgwè mmadụ a ọrịa ma kụziere ha ọtụtụ ihe. Olee otú mmadụ niile a ga-esi enweta ihe ha ga-eri n’ebe a dịpụrụ adịpụ? Jizọs ghọtara na ha kwesịrị iri nri wee jụọ Filip, bụ́ onye si ebe ahụ, sị: “Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ka ndị a rie?”—Jọn 6:1-5.

9 Gịnị mere Jizọs ji jụọ Filip ajụjụ a? Ọ̀ pụtara na Jizọs amaghị ihe ọ ga-eme? Mba. Gịnị ka ọ nọ na-eche? Jọn onyeozi, bụ́ onye nọ ya mgbe ihe a mere, kwuru, sị: “[Jizọs] na-ekwu ihe a iji nwalee ya, n’ihi na ya onwe ya maara ihe ọ chọrọ ime.” (Jọn 6:6) Jizọs ji ya mara otú okwukwe ndịozi ya siruru ike. Ajụjụ a ọ jụrụ mere ka uche ha dịrị n’ihe ọ na-ekwu, meekwa ka ha nwee ohere igosi na ha nwere okwukwe na ọ ga-emeli ihe banyere nsogbu ahụ. Ma, ha gosiri na ha enweghị okwukwe, gosikwa na ha amaghị ihe niile. (Gụọ Jọn 6:7-9.) Jizọs meziri ka ha ghọta na ya na-aga ime ihe ha na-echetụghị na ọ ga-emeli. Ọ rụrụ ọrụ ebube wee nye ọtụtụ puku mmadụ ahụ agụụ ji nri.—Jọn 6:10-13.

10-12. (a) Gịnị mere na Jizọs emereghị nwaanyị ahụ ihe ọ rịọrọ ya ozugbo? Kọwaa. (b) Gịnị ka anyị ga-atụlezi?

10 E nwere ihe ọzọ merenụ, bụ́ nke ihe a Baịbụl kọrọ nwere ike inyere anyị aka ịmara otú Jizọs si eche echiche. Obere oge ka Jizọs nyechara ìgwè mmadụ ahụ nri, ya na ndịozi ya si n’ebe ugwu Izrel gawa ebe ndị dị Taya na Saịdọn nso. N’ebe ahụ, ha hụrụ otu nwaanyị bụ́ onye Grik, onye rịọrọ Jizọs ka ọ gwọọ nwa ya nwaanyị ọrịa. Ná mmalite, Jizọs ekweghị na ya ga-agwọ ya. Ma, mgbe nwaanyị ahụ nọgidere na-arịọ Jizọs, Jizọs sịrị ya: “Ka ụmụaka buru ụzọ rijuo afọ, n’ihi na o zighị ezi iwere nri ụmụaka tụpụrụ ụmụ nkịta.”—Mak 7:24-27.

11 Gịnị mere na Jizọs ekweghị agwọ nwa nwaanyị ahụ ná mmalite? Jizọs ọ̀ chọrọ ime ya ihe o mere Filip, ya bụ, ịma ihe nwaanyị ahụ ga-eme, ka o wee mara ma ò nwere okwukwe n’ebe ọ nọ? N’agbanyeghị na Baịbụl ekwughị otú Jizọs si dowe ọnụ gwa nwaanyị ahụ okwu, o doro anya na ihe o kwuru akụdaghị nwaanyị ahụ mmụọ. Ọkpụkpọ Jizọs kpọrọ ndị obodo ahụ “ụmụ nkịta” kama ịkpọ ha nkịta mere ka ọ ghara iwute ha nke ukwuu. N’ihi ya, ọ ga-abụ na Jizọs mere ka nna nke chọrọ inye nwa ya ihe ọ rịọrọ ya ma ọ chọghị ka nwa ahụ mara na ya bu n’obi inye ya ihe ahụ ka o wee mara ma ihe ahụ ọ̀ dị nwa ahụ mkpa n’ezie. Ma ọ̀ bụ ihe a ka Jizọs bu n’obi ime ma ọ̀ bụ na ọ bụghị, mgbe nwaanyị ahụ gosiri na ya nwere okwukwe, Jizọs meere ya ihe ọ rịọrọ ya.—Gụọ Mak 7:28-30.

12 Ihe ndị a a kọrọ n’akwụkwọ Jọn na Mak na-eme nnọọ ka anyị mara “uche nke Kraịst.” Ka anyị tụlezie otú akụkọ abụọ a ga-esi nyere anyị aka ịmara uche Jehova.

Otú Jehova Si Meso Mozis Ihe

13. Olee otú ịmara otú Jizọs si eche echiche si enyere anyị aka?

13 Ọ bụrụ na anyị amara otú Jizọs si eche echiche, anyị ga-enwe ike ịghọta amaokwu Baịbụl ndị yiri ka hà siri ike nghọta. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe Jehova gwara Mozis mgbe ụmụ Izrel kpụrụ nwa ehi ọlaedo wee na-efe ya ofufe. Chineke sịrị: “Ahụwo m ndị a, lee, ha bụ ndị na-ekwesi olu ike. Ya mere hapụ m, ka m weso ha iwe dị ọkụ wee kpochapụ ha, ka m meekwa ka ị ghọọ mba dị ukwuu.”—Ọpụ. 32:9, 10.

14. Olee ihe Mozis mere mgbe Jehova gwara ya ihe ọ chọrọ ime?

14 Baịbụl kwukwara sị: “Mozis wee mee ka obi Jehova bụ́ Chineke ya jụrụ wee kwuo, sị: ‘Jehova, gịnị mere i ji na-eweso ndị gị, bụ́ ndị i ji ike dị ukwuu na aka dị ike kpọpụta n’ala Ijipt, iwe dị ọkụ? Gịnị mere ndị Ijipt ga-eji asị, “O bu ihe ọjọọ n’obi kpọpụta ha ka o wee gbuo ha n’ugwu ma kpochapụ ha n’elu ala”? Ka iwe gị dị ọkụ dajụọ, gbanweekwa obi gị n’ihe ọjọọ a nke ị ga-eme ka ọ bịakwasị ndị gị. Cheta Ebreham, Aịzik na Izrel bụ́ ndị ohu gị, bụ́ ndị i ji onwe gị ṅụọrọ iyi, n’ihi na ị sịrị ha, “M ga-eme ka mkpụrụ unu mụbaa dị ka kpakpando nke eluigwe, m ga-enyekwa mkpụrụ unu ala a dum m gosiri unu, ka ha wee bichie ya ruo mgbe a na-akaghị aka.”’ Jehova wee malite ịgbanwe obi ya banyere ihe ọjọọ o kwuru na ọ ga-eme ndị ya.”—Ọpụ. 32:11-14. *

15, 16. (a) Olee ihe Mozis nwere ohere ime n’ihi ihe Jehova kwuru? (b) Olee otú o si bụrụ na Jehova ‘gbanwere obi ya’?

15 Nke a ọ̀ pụtara na Mozis gbaziri Jehova? Mbanụ! Ọ bụ eziokwu na Jehova kwuru ihe ọ chọrọ ime, o kpebibeghị na ọ bụ ihe ọ ga-emerịrị. E nwere ike ikwu na Jehova chọrọ ịma ihe Mozis ga-eme, otú ahụ Jizọs mere Filip na nwaanyị ahụ bụ́ onye Grik. Jehova nyere Mozis ohere ka o kwuo uche ya. * Jehova mere Mozis onye ogbugbo ya na ụmụ Izrel, ọ hapụkwara ya ka ọ rụọ ọrụ ya. Mozis ọ̀ ga-ekwe ka iwe mee ka ọ ghara imetere ha ebere? Ọ̀ ga-eji ohere a gwa Jehova ka o leghara ụmụ Izrel anya ma mee ka ụmụ ya ghọọ mba dị ukwuu?

16 Ihe Mozis zara Jehova gosiri na o nwere okwukwe na Jehova, tụkwasịkwa ya obi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. Ihe o mere gosiri na ọ naghị eche naanị banyere onwe ya, kama, na ihe banyere aha Jehova na-echu ya ụra. Ọ chọghị ka a kọchaa aha Jehova. Mozis si otú a gosi na ya ma “uche Jehova” n’okwu a. (1 Kọr. 2:16) Gịnị si na ya pụta? Ebe ọ bụ na ọ naghị abụ Jehova kwuo o kwuchaala, Baịbụl kwuru na ọ ‘malitere ịgbanwe obi ya.’ N’asụsụ Hibru, nke a nwere ike ịpụta na Jehova ewetaghị ọdachi o kwuru na ya chọrọ iwetara mba ahụ.

Otú Jehova Si Meso Ebreham Ihe

17. Olee otú Jehova si gosi na ya nwehiri ndidi nne n’otú o si meso Ebreham ihe?

17 Akụkọ ọzọ nke na-egosi otú Jehova si enye ndị ohu ya ohere ka ha gosi na ha nwere okwukwe na ya ma tụkwasị ya obi bụ mgbe Ebreham rịọrọ arịrịọ banyere ndị Sọdọm. Jehova gosiri na ya nwehiri ndidi nne mgbe o kwere ka Ebreham jụọ ya ajụjụ asatọ, ya jụpụ ya ajụchie. O nwere ebe o ruru Ebreham ekwuo ihe a na-emetụ n’obi: “Tụfịakwa! Ị gaghị eme otú a, igbukọta onye ezi omume na onye ajọ omume, nke na ihe ga-eme onye ajọ omume ga-emekwa onye ezi omume. Tụfịakwa! Ị gaghị eme ya. Ọ̀ bụ na Onyeikpe nke ụwa dum agaghị eme ihe ziri ezi?”—Jen. 18:22-33.

18. Gịnị ka anyị mụtara n’otú Jehova si meso Ebreham ihe?

18 Gịnị ka akụkọ a na-akụziri anyị banyere otú Jehova si eche echiche? Enyemaka Ebreham ọ̀ dị Jehova mkpa ka o wee nwee ike ime ihe ziri ezi? Mba. A sị na Jehova chọrọ, ọ gaara ekwu ná mmalite ihe mere o ji kpebie ihe ahụ ọ chọrọ ime. Ma, Jehova kwere ka Ebreham jụọ ya ajụjụ ndị ahụ ka ha wee nyere Ebreham aka ịghọta ihe o kpebiri ime nakwa otú o si eche echiche. O nyekwaara Ebreham aka ịghọta na Jehova nwere ọmịiko dị ukwuu ma na-ekpe ikpe ziri ezi. Jehova mesoro Ebreham ihe otú enyi si emeso enyi ya ihe.—Aịza. 41:8; Jems 2:23.

Ihe Anyị Na-amụta

19. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Job?

19 Olee ihe anyị mụtara banyere “uche Jehova”? Anyị kwesịrị ikwe ka Okwu Chineke na-enyere anyị aka ịmara uche Jehova. Ebe ọ bụ na otú anyị si ele ihe anya anaghị ezicha ezi, anyị ekwesịghị ịtụ anya ka Jehova na-ele ihe anya otú anyị si ele ya. Job sịrị: ‘Chineke abụghị mmadụ dị ka mụ onwe m nke na m ga-asa ya okwu, nke na anyị ga-ezukọ ka e kpeere anyị ikpe.’ (Job 9:32) Ọ bụrụ na anyị aghọta uche Jehova dị ka Job ghọtara, anyị ga-ekwu ka Job, bụ́ onye sịrị: “Lee! Ihe ndị a bụ ntakịrị ihe n’ọrụ ya niile, leekwa ka ihe a nụworo banyere ya si dị ntakịrị! Ma ònye pụrụ ịghọta ụzọ égbè eluigwe ya nke dị ike?”—Job 26:14.

20. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị agụta ihe siiri anyị ike nghọta mgbe anyị na-agụ Akwụkwọ Nsọ?

20 Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị ahụ ihe siiri anyị ike nghọta mgbe anyị na-agụ Akwụkwọ Nsọ, karịchaa, ma ọ bụrụ ihe metụtara otú Jehova si ele ihe anya? Ọ bụrụ na ọ ka siiri anyị ike nghọta mgbe anyị mechara nchọnchọ, ka anyị lee ya anya ka ihe na-anwale ma ànyị tụkwasịrị Jehova obi. Cheta na mgbe ụfọdụ, ihe ụfọdụ Jehova kwuru na-enye anyị ohere igosi ma àgwà Jehova ọ̀ dị anyị mma. Ka anyị jiri obi umeala kweta na ọ bụghị ihe niile ọ na-eme ka anyị na-aghọta. (Ekli. 11:5) Nke a ga-eme ka anyị kweta na Pọl onyeozi kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị: “Lee otú ngọzi na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke si dị omimi! Lee otú a na-apụghị ịchọpụtacha ikpe ya, na otú a na-apụghị ịchọpụtacha ụzọ ya! N’ihi na ‘ònye maara uche Jehova, ma ọ bụ, ònye bụ onye ndụmọdụ ya?’ Ma ọ bụ, ‘Ònye bu ụzọ nye ya ihe, nke na a ghaghị ịkwụ ya ụgwọ ya?’ N’ihi na ihe niile si n’ebe ọ nọ, sitekwa n’aka ya, dịrịkwa n’ihi ya. Ka otuto dịrị ya ruo mgbe ebighị ebi. Amen.”—Rom 11:33-36.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Ụdị akụkọ a dịkwa n’Ọnụ Ọgụgụ 14:11-20.

^ par. 15 Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na okwu Hibru e si sụgharịta “hapụ m,” nke dị n’Ọpụpụ 32:10, nwere ike ịpụta na e nyere Mozis ohere ka o kwuo ihe o chere banyere Jehova na mba Izrel. (Ọma 106:23; Ezik. 22:30) Nke ọ bụla ọ bụ, o doro anya na obi ruru Mozis ala mgbe ọ na-agwa Jehova ihe o chere.

Ì Chetara?

• Gịnị ga-eme ka anyị ghara ịtụwa anya ka Jehova na-ele ihe anya otú anyị si ele?

• Olee otú ịghọta ihe ndị Jizọs mere ga-esi mee ka anyị na Jehova “na-enwe mmekọrịta chiri anya”?

• Gịnị ka ị mụtara ná mkparịta ụka Jehova na Mozis nakwa Ebreham nwere?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Gịnị ka otú Jehova si meso Mozis na Ebreham ihe na-akụziri anyị banyere otú o si ele ihe anya?