Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịkụdo Ihe Aka Olee Otú Jehova Si Ele Ya Anya?

Ịkụdo Ihe Aka Olee Otú Jehova Si Ele Ya Anya?

Ịkụdo Ihe Aka Olee Otú Jehova Si Ele Ya Anya?

ADAM gwara Jehova, sị: “Nwaanyị ahụ i nyere m ka mụ na ya biri, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ si n’osisi ahụ, m wee rie.” Iv agwa Jehova, sị: “Ọ bụ agwọ duhiere m, m wee rie ya.” Ihe a nne na nna anyị mbụ gwara Chineke bụ otú ụmụ mmadụ si malite ịkụdo ihe aka mgbe ọ bụla ha chọrọ ịzọrọ onwe ha.—Jen. 3:12, 13.

Otú Jehova si kpee Adam na Iv ikpe maka isi ha kpachaara anya nupụrụ ya mere ka o doo anya na ọ nabataghị ihe ahụ ha kwuru. (Jen. 3:16-19) Nke a ọ̀ pụtara na Jehova anaghị anabata ihe niile mmadụ kụdoro aka iji zọrọ onwe ya? Ka è nwere ndị nke Chineke na-anabata? Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú anyị nwere ike isi mara ndị nke ọ na-anabata na ndị nke ọ na-anaghị anabata? Tupu anyị azaa ajụjụ a, ka anyị buru ụzọ kwuo ihe ịkụdo ihe aka pụtara.

Ịkụdo ihe aka bụ mmadụ ikwu ihe mere o ji mee ihe, ihe mere ọ na-ejighị mee ihe, ma ọ bụkwanụ ihe mere ọ na-agaghị eji mee ihe. Ịkụdo ihe aka nwere ike ịbụ mmadụ ikwu ezigbo ihe mere ọ na-ejighị meta ihe a gwara ya mee, bụ́ nke nwere ike ime ka o jiri obi ya niile rịọ mgbaghara, nke ga-emekwa ka a gbaghara ya. Ma, dị ka Adam na Iv mere, mmadụ nwere ike ịkụdo ihe aka ka o wee ghọgbuo onye ọzọ, o nwekwara ike ịbụ ụgha mmadụ ghara ka e wee ghara ịmata ihe bụ́ eziokwu. Ebe ọ bụ na onye na-akụdo ihe aka na-emekarị ihe ndị a, a na-enyokarị ya enyo.

Ọ bụrụ na anyị na-achọ ihe anyị ga-akudo aka ka anyị wee ghara ime ihe anyị kwesịrị ime, karịchaa n’ihe gbasara ozi anyị na-ejere Chineke, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ‘iji echiche ụgha na-aghọgbu onwe anyị.’ (Jems 1:22) N’ihi ya, ka anyị tụlee ihe ụfọdụ dị na Baịbụl, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ‘ịchọpụta ihe dị Onyenwe anyị mma.’—Efe. 5:10.

Ihe Chineke Chọrọ Ka Anyị Mee

Iwu ndị anyị bụ́ ndị Jehova kwesịrị idebe dị n’Okwu Chineke. Dị ka ihe atụ, ihe ahụ Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘gaa mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ’ ya ka gbasara ezigbo ndị na-eso ụzọ ya taa. (Mat. 28:19, 20) N’eziokwu, ihe a Jizọs kwuru ka anyị mee dị ezigbo mkpa. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji kwuo, sị: “Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na ezisaghị m ozi ọma!”—1 Kọr. 9:16.

Ụfọdụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl kemgbe achọghị iso na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Mat. 24:14) Ụfọdụ ndị na-esobu ekwusa ozi ọma akwụsịla. Gịnị ka ha na-ekwu mgbe ụfọdụ na ọ bụ ya mere ha ji kwụsị? N’oge ochie, olee otú Jehova si nyere ndị obi na-akachaghị ime ihe ọ chọrọ aka?

Ihe Chineke Na-achọghị Ka Anyị Na-akụdo Aka

“O siri ezigbo ike.” Ikwusa ozi ọma nwere ike ịna-esiri ndị na-emekarị ihere ike. Ka anyị lee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe mere Jona. Jehova nyere ya ọrụ o chere na o siri ezigbo ike. Ọ gwara ya ka ọ gaa gwa ndị Ninive na a na-aga ibibi obodo ha. O sighị ike ịmata ihe mere o ji raa Jona ahụ́ ime ihe a Jehova gwara ya. Ninive bụ isi obodo Asiria, bụ́ mba obi fere azụ. Jona nwere ike ịnọ na-eche, sị: ‘Olee ihe mụ na ndị a ga-eje eje? Gịnị ka ha ga-eme m?’ Tupu a mara ihe na-emenụ, ọ gbaala ọsọ. Ma, Jehova anabataghị ihe ahụ Jona kụdoro aka wee jụ ịrụ ọrụ o dunyere ya. Kama nke ahụ, ọ gwara ya ọzọ ka ọ gaa kwusaara ndị Ninive ozi ọma. Jona ji obi ya niile jee ozi nke ugbu a, Jehova gọzikwara ozi ahụ o jere.—Jona 1:1-3; 3:3, 4, 10.

Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị gaghị ekwusali ozi ọma a gwara anyị ka anyị na-ekwusa, cheta na “ihe niile kwere omume n’ebe Chineke nọ.” (Mak 10:27) Obi sie gị ike na Chineke ga-akwado gị ma ọ bụrụ na ị rịọ ya ka o nyere gị aka, ọ ga-agọzikwa gị ma ị kata obi na-ekwusa ozi ọma.—Luk 11:9-13.

“Achọghị m Ịga.” Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na obi gị adịchaghị n’ikwusa ozi ọma? Cheta na Jehova nwere ike ịrụ ọrụ n’ime gị ka ị malite inwe mmasị ijere ya ozi. Pọl kwuru, sị: “Ọ bụ Chineke na-arụ ọrụ n’ime unu, n’ihi ihe dị ya ụtọ, ka unu wee na-enwe ọchịchọ ma na-eme ihe.” (Fil. 2:13) Ya mere, i nwere ike ịrịọ Jehova ka o mee ka i nwee mmasị ime uche ya. Ọ bụ ihe Eze Devid mere. Ọ rịọrọ Jehova, sị: “Mee ka m jee ije n’eziokwu gị.” (Ọma 25:4, 5) I nwere ike ime ka Devid site n’ịrịọsi Jehova arịrịọ ike ka o mee ka i nwee mmasị ime ihe ọ chọrọ.

N’eziokwu, anyị na-ejisi ike aga ozi ọma ma ọ bụ ọmụmụ ihe mgbe ike gwụrụ anyị ma ọ bụ mgbe obi na-adịghị anyị mma. Ọ bụrụ na nke a emee anyị, ànyị ga-eche na anyị ahụchaghị Jehova n’anya? Mbanụ. Ndị ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Chineke ozi n’oge ochie gbasiri mbọ ike ka ha wee na-eme uche ya. Dị ka ihe atụ, Pọl kwuru na ya ‘na-etipụta ahụ́ ya ọnyá’ ka ya wee rubere Chineke isi. (1 Kọr. 9:26, 27) Ya mere, ọ bụrụgodị na anyị ejisie ike gaa ozi ọma, ka obi sie anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị bu ezi ihe n’obi gbasie mbọ ike ka anyị wee mee uche Chineke, ya bụ, n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. Anyị mee otú a, Chineke ga-enwezi ike ịza Setan okwu, bụ́ onye kwuru na ndị ohu Chineke ga-ahapụ ya ma a nwaa ha ọnwụnwa.—Job 2:4.

“Anaghị m enwe ohere.” Ọ bụrụ na ihe mere ị naghị aga ozi ọma bụ na i chere na i nweghị ohere, i kwesịrị ichebara ihe ndị ị na-eme echiche. Jizọs kwuru, sị: “Ya mere, burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ.” (Mat. 6:33) Ọ bụrụ na ị chọrọ ime ihe a Jizọs kwuru, o nwere ike ịdị mkpa ka ị kwụsị ihe ụfọdụ na-ewekọrọ oge gị, ma ọ bụ jiri oge ụfọdụ i ji atụrụ ndụ na-ekwusa ozi ọma. Nke a apụtaghị na ị gaghị enwe oge ị ga-eji na-atụrụ ndụ ma ọ bụ na-eme ihe ndị ọzọ dị gị mkpa, ma, i kwesịghị iji maka ha kwụsị ikwusa ozi ọma. Ohu Chineke kwesịrị ibute Alaeze Chineke ụzọ.

“Erughị m eru.” I nwere ike iche na i rughị eru ije ozi ọma. Ụfọdụ n’ime ndị ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi n’oge ochie chere na ha erughị eru ịrụ ọrụ Jehova nyere ha. Tụlee banyere Mozis. Mgbe Jehova nyere ya ọrụ, ọ sịrị: “Biko, Jehova, abụghị m onye okwu na-aga were were n’ọnụ, abụghị m ya kemgbe ụnyaahụ ma ọ bụkwanụ tupu mgbe ahụ ma ọ bụkwanụ kemgbe ị gwara ohu gị okwu, n’ihi na ọnụ m na ire m na-anyị m arọ ikwu okwu.” N’agbanyeghị na Jehova mesiri Mozis obi ike, ọ sịrị: “Biko, Jehova, biko ziga onye ọ bụla ọzọ ị ga-eziga.” (Ọpụ. 4:10-13) Gịnịzi ka Jehova mere?

Jehova enyeghị onye ọzọ ọrụ ahụ ọ chọrọ inye Mozis, kama, ọ kpọnyere ya Erọn ka o nyere ya aka. (Ọpụ. 4:14-17) Ka oge na-aga, Jehova nyekwaara Mozis aka ịrụ ọrụ ndị ọzọ o nyere ya. Taa, Jehova ga-emekwa ka ụmụnna gị ndị nọterela aka n’ọgbakọ nyere gị aka ikwusa ozi ọma. Nke kacha mkpa bụ na Okwu Chineke mesiri anyị obi ike na Jehova ga-eme ka anyị ruo eru ịrụ ọrụ o nyere anyị.—2 Kọr. 3:5; gụọ igbe bụ́  “Afọ Ndị M Kacha Nwee Obi Ụtọ.”

“E nwere onye kpasuru m iwe.” Ndị ụfọdụ na-akwụsị ịbịa ọmụmụ ihe ma ọ bụ ịga ozi ọma n’ihi na e nwere onye kpasuru ha iwe. Obi ha bụ na Jehova ga-aghọta ihe a mere ha ji kwụsị ijere ya ozi. Ọ bụ eziokwu na mmadụ nwere ike iwe iwe ma a kpasuo ya iwe, nke a ò kwesịrị ịbụ ihe ga-eme ka onye ahụ kwụsị ijere Jehova ozi? Ọ ga-abụ na Pọl na nwanna ya bụ́ Banabas wesoro ibe ha iwe mgbe nghọtahie ha nwere mere ka ha “see ezigbo okwu.” (Ọrụ 15:39) Ma, nke a ò mere ka onye ọ bụla n’ime ha kwụsị ijere Jehova ozi? Mbanụ!

N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na nwanna gị akpasuo gị iwe, cheta na ọ bụghị nwanna gị ahụ na-ezughị okè bụ onye iro gị, kama, ọ bụ Setan, bụ́ onye chọrọ iripịa gị. Ma, Ekwensu agaghị enweta gị ma ọ bụrụ na i ‘guzogide ya, siekwa ike n’okwukwe.’ (1 Pita 5:8, 9; Gal. 5:15) Ọ bụrụ na okwukwe gị siri ike, Jehova ‘agaghị emechu gị ihu.’—Rom 9:33.

E Nwere Ihe Ndị Anyị Na-agaghị Emeli

Ihe ole na ole a anyị kwuru okwu ha na-egosi na o nweghị ihe ọ bụla mmadụ ga-ekwu na o gbochiri ya ime ihe Jehova nyere n’iwu, nke gụnyere ikwusa ozi ọma, nke Akwụkwọ Nsọ kwadoro. Ma, e nwere ezigbo ihe ndị nwere ike ime ka anyị ghara ikwusaru ozi ọma otú anyị chọrọ. Ọrụ ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ kwuru na anyị kwesịrị ịrụ nwere ike ime ka oge anyị ji eje ozi ọma dị ntakịrị. Ihe ọzọ bụ na mgbe ụfọdụ, ike ọgwụgwụ ma ọ bụkwanụ ọrịa nwere ike ime ka anyị ghara ijere Jehova ozi otú anyị chọrọ. Ma, Okwu Chineke mesiri anyị obi ike na Jehova ma ihe bụ́ mkpa anyị, marakwa otú ike anyị hà.—Ọma 103:14; 2 Kọr. 8:12.

Ya mere, anyị kwesịrị ilezi anya ka anyị ghara ịtụ anya ka anyị ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ mee ihe na-agaghị ekwe anyị ma ọ bụ ndị ahụ omume. Pọl onyeozi dere, sị: “Ònye ka ị bụ ikpe odibo onye ọzọ ikpe? Ọ bụ nna ya ukwu ka ọ dịịrị ikpebi ma ọ̀ ga-eguzo ma ọ̀ ga-ada.” (Rom 14:4) Kama iji onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ, anyị kwesịrị icheta na “onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.” (Rom 14:12; Gal. 6:4, 5) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iji “akọ na uche ziri ezi” na-ekwu okwu mgbe ọ na-ekpeku Jehova ekpere iji gwa ya ihe mere na ọ gaghị arụli ọrụ o nyere anyị.—Hib. 13:18.

Ihe Mere Ijere Jehova Ozi Ji Enye Anyị Ọṅụ

N’agbanyeghị otú ọ bụla ihe si dịrị anyị ná ndụ, anyị nwere ike iji ọṅụ dị ukwuu na-ejere Jehova ozi n’ihi na ihe ọ chọrọ n’aka anyị bụ ihe anyị ga-emeli. Gịnị mere anyị ji kwuo otú a?

Okwu Chineke, sịrị: “Ajụla imere ha ihe ọma bụ́ ndị e kwesịrị imere ya, mgbe ọ dị n’ike aka gị ime ya.” (Ilu 3:27) Olee ihe ị chere ilu a na-ekwu na ọ bụ ihe Chineke chọrọ n’aka anyị? Jehova agwaghị gị ka ị gbalịa na-eme ihe dị n’ike aka nwanna gị, kama, ọ bụ ka ị na-eme ihe “dị n’ike aka gị.” N’eziokwu, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike iji obi ya dum na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị ma ihe dị n’ike aka anyị ò hiri nne ma ọ̀ dị obere.—Luk 10:27; Kọl. 3:23.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]

 “Afọ Ndị M Kacha Nwee Obi Ụtọ”

Ọ bụrụgodị na anyị na-arịa ọrịa, ma ọ bụkwanụ na obi adịghị anyị mma, anyị ekwesịghị ikwu ngwa ngwa na nke a ga-egbochi anyị ijechi ozi ọma anya. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe mere Ernest, bụ́ nwanna nwoke nọ na Kanada.

Ernest na-asụ nsụ, na-emekwa ihere. Ọ kwụsịrị ọrụ ido blọk n’ihi na ọkpụkpụ azụ ya gbajiri. Nkwarụ a o nwere emeghị ka ọ kwụsị iji oge buru ibu na-eje ozi ọma. Otú e si na-agba ụmụnna ume n’ọmụmụ ihe ka ha were ọrụ ịsụ ụzọ inyeaka mere ka ọ chọsie ike ịsụ ụzọ. Ma, o chere na ya agaghị emeli ya.

Ka o wee gosi na ya agaghị arụli ya, o weere nke naanị otu ọnwa. Ma, ọ tụrụ ya n’anya na ọ rụliri ya. Ma, ọ gwara onwe ya sị, ‘Ama m na agaghị m emeli ya ọzọ.’ O tinyere akwụkwọ maka ọnwa ọzọ iji gosi na ya agaghị arụli ya. Ma, ọ rụzuru awa ya.

Ernest rụrụ ọsụ ụzọ inyeaka otu afọ. Ma, ọ sịrị, “O doro anya na agaghị m arụli ọsụ ụzọ oge niile.” Ijikwa gosi na ihe o kwuru bụ eziokwu, o tinyere akwụkwọ maka ọsụ ụzọ oge niile. Ọ tụrụ ya n’anya mgbe ọ rụzuru awa ya n’afọ mbụ ọ rụrụ ọrụ ịsụ ụzọ oge niile. O kpebiri ịrụrụ ya na-aga, o jikwara ọṅụ rụọ ya afọ abụọ, bụ́ mgbe nsogbu ahụ o nwere n’ọkpụkpụ azụ gburu ya. Ma, tupu ya anwụọ, ọ na-ejikarị anya mmiri agwa ndị bịara ileta ya sị, “Afọ ndị ahụ m sụrụ ụzọ bụ afọ ndị m kacha nwee obi ụtọ.”

[Foto dị na peeji nke 13]

Anyị nwere ike imeri ihe ọ bụla nwere ike igbochi anyị ije ozi ọma

[Foto dị na peeji nke 15]

Jehova na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị dum na-ejere ya ozi, ya bụ, ịna-eme ihe ọ bụla ọnọdụ anyị kwere anyị mee