Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọ Na-enyere M Aka Ime Ka Ozi Ọma Ruo Ndị Mmadụ n’Obi”

“Ọ Na-enyere M Aka Ime Ka Ozi Ọma Ruo Ndị Mmadụ n’Obi”

“Ọ Na-enyere M Aka Ime Ka Ozi Ọma Ruo Ndị Mmadụ n’Obi”

A NỌ na Poruto Alegri, bụ́ obodo dị n’ebe ndịda Brazil, nwee otu nnọkọ nke ọtụtụ mba bịara, bụ́ nke a nọ tinye ọnụ ná mmekọrịta ndị mmadụ na ibe ha. Ọtụtụ puku mmadụ si otu narị mba na iri atọ na ise bịa nnọkọ ahụ. Mgbe ọ bụla ha kwụsịtụrụ nnọkọ ahụ iji tụrụ ndụ, Ndịàmà Jehova si ọgbakọ dị na Poruto Alegri na-abịakwute ọtụtụ ndị bịara ya ka ha wee zie ha ozi ọma. Olee otú ha si agwa ha okwu?

Elizabete, bụ́ ọsụ ụzọ, kwuru sị: “Anyị na-eji akwụkwọ bụ́ Good News for People of All Nations ezi ha ozi ọma.” O kwukwara, sị: “Ọtụtụ n’ime ndị bịara nnọkọ ahụ anụtụbeghị ozi ọma Alaeze Chineke, ma, ha gere anyị ntị. Anyị ziri ndị si Bolivia, Chaịna, Fransị, India, Izrel, na Naịjirịa ozi ọma. O nwere ụfọdụ n’ime ha anyị nyere akwụkwọ e ji amụ Baịbụl ndị e dere n’asụsụ ha, ha jikwa obi ụtọ nara ha.”

Na Meksiko, ọsụ ụzọ aha ya bụ Raúl na-eji akwụkwọ a ezi ndị mmadụ ozi ọma, ha na-egekwa ya ntị nke ọma. N’oge na-adịbeghị anya, ọ gakwuuru otu nwoke Arab dị afọ iri asatọ nke nwunye ya nwụrụ ọhụrụ. Mgbe nwoke ahụ gụrụ peeji nke e dere ozi ọma Alaeze n’asụsụ Arabik, anya mmiri gbara ya n’ihi ọṅụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na nkwa Chineke kwere na ọnwụ agakwaghị adị, nke dị ná Mkpughe 21:3, 4, metụrụ ya n’ahụ́ mgbe ọ gụrụ ya n’asụsụ ya. N’oge ọzọ, mgbe Raúl na-anọghị ozi ọma, ọ hụrụ otu nwoke na-asụ Pọchugiiz, bụ́ onye nwa ya nwoke ọ hụrụ n’anya nwụrụ. Raúl nyere ya akwụkwọ ahụ ka ọ gụọ ebe e ji asụsụ ya dee ozi ọma ahụ. Mgbe ọ gụchara ya, o kwuru na ya chọrọ ịmụkwu Baịbụl, o kwekwara ka a bịa mụwara ya Baịbụl.

Raúl na-eji Good News for People of All Nations ezi ndị na-asụ asụsụ Aminian, Chaịniiz, Bekee, French, Jaman, Hindi, Korian, Miks, Peshian, Rọshịan, na Zapọtek ozi ọma. Ọ sịrị: “Achọpụtala m na iji akwụkwọ a aga ozi ọma bara uru. Ọ na-enyere m aka ime ka ozi ọma ruo ndị mmadụ n’obi n’agbanyeghị na anaghị m asụ asụsụ ha.”

Ka ndị mmadụ na-aga mba ọzọ, anyị nwere ike izute ndị na-asụ asụsụ anyị na-anaghị asụ. Anyị ga-ezi ha ozi ọma ma anyị jiri akwụkwọ bụ́ Good News for People of All Nations. Nke gị ọ̀ na-adị n’akpa gị?

[Foto ndị dị na peeji nke 32]

Ebe Raúl ji akwụkwọ nke na-enyere ya aka ime ka ozi ọma ruo n’obi ndị mmadụ