Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Burunụ Ụzọ Na-achọ “Ezi Omume Chineke”

Burunụ Ụzọ Na-achọ “Ezi Omume Chineke”

Burunụ Ụzọ Na-achọ “Ezi Omume Chineke”

“Ya mere, burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.”—MAT. 6:33.

1, 2. Gịnị bụ ezi omume Chineke, oleekwa otú o si egosi ya?

JIZỌS nyere ndụmọdụ n’Ozizi Elu Ugwu ya, sị: “Burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ.” (Mat. 6:33) Taa, Ndịàmà Jehova ma ndụmọdụ a Jizọs nyere nke ọma. N’ihe ọ bụla anyị na-eme ná ndụ, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike iji gosi na anyị ji Alaeze ahụ kpọrọ ihe nakwa na anyị na-akwadosi ya ike. Anyị kwesịkwara iburu ihe ọzọ e kwuru n’amaokwu ahụ n’uche, ya bụ, “na ezi omume Chineke.” Gịnị bụ ezi omume Chineke, gịnịkwa ka ibu ụzọ na-achọ ya pụtara?

2 E nwere ike ịsụgharị okwu Grik e si sụgharịta “ezi omume” ka ọ bụrụ “ikpe ziri ezi” ma ọ bụ “ihe ziri ezi.” N’ihi ya, ezi omume Chineke pụtara ihe ziri ezi n’anya Chineke. Ebe Jehova bụ Onye Okike, ọ bụ ya kwesịrị ikwu ihe bụ́ ihe dị mma na ihe na-adịghị mma ma ọ bụkwanụ ihe bụ́ ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. (Mkpu. 4:11) Ma, ezi omume Chineke abụghị iwu na-enweghị ọgwụgwụ nke na-anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́. Kama, ọ na-egosi ụdị onye Jehova bụ, na-egosikwa na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, bụ́ otu n’ime àgwà ya ndị bụ́ isi nke ya na àgwà ya ndị ọzọ bụ́ ịhụnanya, amamihe, na ike na-agakọ. Ya mere, e nwere ihe jikọrọ ezi omume Chineke na uche ya na nzube ya. Ọ gụnyere ihe ọ chọrọ ka ndị chọrọ ife ya na-eme.

3. (a) Gịnị ka ibu ụzọ na-achọ ezi omume Chineke pụtara? (b) Gịnị mere anyị ji edebe iwu dị iche iche ziri ezi Jehova nyere?

3 Gịnị ka ibu ụzọ na-achọ ezi omume Chineke pụtara? Ọ pụtara ime uche Chineke ka anyị wee mee ya obi ụtọ. Ịchọ ezi omume ya gụnyere ịgba mbọ na-eme ihe ziri ezi o nyere n’iwu, ọ bụghị ihe anyịnwa chọrọ. (Gụọ Ndị Rom 12:2.) Ihe mere anyị ga-eji na-eme nke a bụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova dịrị ná mma. Anyị anaghị erubere ya isi n’ihi na ụjọ na-atụ anyị ka ọ ghara ịta anyị ahụhụ. Kama nke ahụ, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-eme ka anyị gbalịsie ike ime ka obi dị ya ụtọ site n’ime ihe ọ na-achọ, ọ bụghị ihe anyịnwa chọrọ. Anyị ma na ime nke a kwesịrị ekwesị, ọ bụ ya mere e ji kee anyị. Anyị kwesịrị ịhụ ezi omume n’anya, dị ka Jizọs Kraịst, bụ́ Eze Alaeze Chineke, mere.—Hib. 1:8, 9.

4. Gịnị mere anyị ji kwesị ịchọ ezi omume Chineke?

4 Gịnị mere anyị ji kwesị ịchọ ezi omume Jehova? Tụlee ihe a merenụ: Ule ahụ e lere Adam na Iv n’ogige Iden bụ iji mara ma hà kwere na ọ bụ Jehova kwesịrị ịgwa ha ihe ha ga na-eme ma ọ bụ na ha ekweghị. (Jen. 2:17; 3:5) Ọdịda ha dara ule ahụ mere ka anyị bụ́ ụmụ ha na-ata ahụhụ ma na-anwụ anwụ. (Rom 5:12) Ma, Okwu Chineke kwuru, sị: “Onye na-achụso ezi omume na obiọma ga-enweta ndụ, ezi omume na nsọpụrụ.” (Ilu 21:21) Ọ bụrụ na anyị na-achọ ezi omume Chineke, anyị na ya ga-adị ná mma, nke a ga-emekwa ka a zọpụta anyị.—Rom 3:23, 24.

Ihe Mere na Mmadụ Ịbụ Onye Ezi Omume n’Anya Onwe Ya Adịghị Mma

5. Olee ihe anyị kwesịrị izere?

5 Mgbe Pọl onyeozi na-edegara Ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ, o mere ka a mata ihe anyị niile ga-ezere ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ibu ụzọ na-achọ ezi omume Chineke. O kwuru banyere ndị Juu ibe ya sị: “Ana m agbara ha akaebe na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ijere Chineke ozi; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị; n’ihi na, ebe ha na-amaghị ezi omume Chineke, kama na-achọ ime ka ezi omume nke ha guzosie ike, ha edoghị onwe ha n’okpuru ezi omume Chineke.” (Rom 10:2, 3) Pọl kwuru na ndị ahụ amaghị ezi omume Chineke n’ihi na ha nọ na-achọ otú ha ga-esi mee ka ezi omume nke ha guzosie ike. *

6. Olee àgwà anyị na-ekwesịghị ịna-akpa, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

6 Otu n’ime ụzọ anyị nwere ike isi na-eme ka ezi omume nke onwe anyị guzosie ike bụ ile ozi anyị na-ejere Chineke anya dị ka asọmpi, ya bụ, iji onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ. Nke a nwere ike ime ka anyị na-eche na anyị ka ndị ọzọ mara ihe. Ma, ọ bụrụ na anyị na-eme otú a, anyị na-echefu ezi omume Jehova. (Gal. 6:3, 4) Ihe kwesịrị ime ka anyị na-eme ihe ziri ezi bụ na anyị hụrụ Jehova n’anya. Ọ bụrụ na anyị na-agbalị ịbụ ndị ezi omume n’anya onwe anyị, anyị na-egosi na anyị ahụghị ya n’anya.—Gụọ Luk 16:15.

7. Olee otú Jizọs si gosi na mmadụ ịbụ onye ezi omume n’anya onwe ya adịghị mma?

7 Jizọs gosiri na obi adịghị ya mma n’ihi “ndị tụkwasịrị onwe ha obi na ha bụ ndị ezi omume, ndị na-ewerekwa ndị ọzọ dị ka ndị na-enweghị ihe ha bụ.” O nyere otu ihe atụ nke o ji gosi na mmadụ ịbụ onye ezi omume n’anya onwe ya adịghị mma. Ọ sịrị: “Ndị ikom abụọ gbagoro n’ụlọ nsọ ikpe ekpere, otu bụ onye Farisii, nke ọzọ bụ onye ọnaụtụ. Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ wee malite ikpe ekpere n’obi ya, sị, ‘Chineke, ana m ekele gị na adịghị m ka ụmụ mmadụ ndị ọzọ, bụ́ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị ajọ omume, ndị na-akwa iko ma ọ bụ ọbụna dị ka onye ọnaụtụ a. Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ n’izu, ana m enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile m nwetara.’ Ma onye ọnaụtụ ahụ guzo n’ebe dị anya, ọ chọghị ọbụna ileli anya ya lee eluigwe, kama ọ nọ na-eti aka n’obi, na-asị, ‘Chineke, meere mụ onwe m bụ́ onye mmehie amara.’” Jizọs kwuru ná mmechi sị: “Ana m asị unu, Nwoke a laruru n’ụlọ ya wee bụrụ onye ezi omume karịa nwoke ahụ; n’ihi na onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, ma onye na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”—Luk 18:9-14.

Ihe Mere na Mmadụ Ekwesịghị Ịbụ “Onye Ezi Omume Gabiga Ókè”

8, 9. Gịnị ka ịbụ “onye ezi omume gabiga ókè” pụtara, oleekwa ihe o nwere ike ịkpata?

8 E kwuru ihe ọzọ anyị kwesịrị izere n’Ekliziastis 7:16. Ọ sịrị: “Abụla onye ezi omume gabiga ókè, egosikwala na ị bụ onye maara ihe gabiga ókè. Gịnị mere ị ga-eji kpatara onwe gị mbibi?” N’amaokwu ya nke iri abụọ, onye dere ihe ahụ gwara anyị ihe mere anyị ji kwesị izere ịbụ ndị ezi omume gabiga ókè. Ọ sịrị: “N’ihi na e nweghị onye ezi omume n’ụwa nke na-eme naanị ezi ihe, nke na-adịghịkwa emehie.” Onye bụ onye ezi omume “gabiga ókè” na-eme ihe o chere na ọ bụ ezi omume ma chọọ ka ndị ọzọ na-eme ya. Ma, ọ na-echefu na ime otú ahụ bụ ịchọ ka iwu ya kara nke Chineke mma, bụ́ ihe na-eme ka yanwa bụrụ onye ajọ omume n’anya Chineke.

9 Ịbụ “onye ezi omume gabiga ókè,” ma ọ bụ ‘imefe eziomume oke,’ dị ka e si sụgharịa ya na Baịbụl ọzọ, nwedịrị ike ime ka anyị chewe na otú Jehova si eme ihe adịghị mma. Ma, anyị ga-echeta na ọ bụrụ na anyị echewe na otú Jehova si eme ihe ezighị ezi, ihe anyị na-ekwu bụ na anyị bụ ndị ezi omume karịa ya. Ọ dị ka ịkpọpụta Jehova ma jiri otú anyị si ele ihe anya na-ekpe ya ikpe. Ma, ọ bụ Jehova ka ọ dịịrị ikwu ihe bụ́ ihe ziri ezi, ọ bụghị anyịnwa.—Rom 14:10.

10. Gịnị nwere ike ime ka anyị kwuo na Chineke mere ihe na-ezighị ezi, dị ka Job kwuru?

10 N’agbanyeghị na o nweghị onye n’ime anyị ga-akpachara anya na-ekwu na Chineke emetaghị ihe o mere, ezughị okè mmadụ nwere ike ime ka anyị mee otú a. Anyị nwere ike ime nke a mgbe e nwere ihe anyị chere na otú e si mee ya adịghị mma ma ọ bụkwanụ mgbe anyị na-ata ahụhụ. Job, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, medịrị ụdị ihe a. Ná mmalite, e kwuru na ọ bụ onye ‘na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta, onye ezi omume, onye na-atụ egwu Chineke, na onye na-anaghị etinye aka n’ihe ọjọọ.’ (Job 1:1) Ma, nsogbu ndị o chere na ha ekwesịghị ịbịara ya malitere izoro ya ka mmiri. Nke a mere ka ọ kpọọ “mkpụrụ obi nke ya onye ezi omume kama ịkpọ Chineke onye ezi omume.” (Job 32:1, 2) Jehova gbaziri ya. Ya mere, o kwesịghị iju anyị anya ma ụdị ihe a mee anyị mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na nke a emee, gịnị ga-enyere anyị aka ichezi echiche?

Anyị Anaghị Amacha Ihe Mere Ihe Ji Mee

11, 12. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma anyị chee na otú e si mee ihe ezighị ezi? (b) N’ihe atụ Jizọs ji ndị e goro ka ha rụọ ọrụ n’ubi vaịn mee, olee ihe mere mmadụ nwere ike iji chee na ọ dị ihe onyeisi ezinụlọ ahụ na-emetaghị?

11 Ihe anyị kwesịrị ibu ụzọ cheta bụ na ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-amacha ihe mere ihe ji mee. Nke a bụ ihe mere Job. Ọ maghị banyere nzukọ ndị mmụọ ozi nwere n’eluigwe, bụ́ ebe Setan nọ bo ya ebubo. (Job 1:7-12; 2:1-6) Job amaghị na ọ bụ Setan kpatara nsogbu ya. N’eziokwu, anyị amaghị ma Job ọ̀ makwa na e nwere onye bụ́ Setan! Ọ bụ ya mere o ji chee na ọ bụ Chineke kpataara ya nsogbu ndị ahụ. Ọ bụrụ na anyị amaghị ihe niile mere ihe ji mee, ọ dị mfe ikwu ihe na-ezighị ezi banyere ihe ahụ.

12 Dị ka ihe atụ, tụlee ihe atụ Jizọs mere banyere ndị e goro ka ha rụọ ọrụ n’ubi vaịn. (Gụọ Matiu 20:8-16.) Jizọs kọrọ banyere otu onyeisi ezinụlọ nke kwụrụ ndị ọrụ ya niile otu ụgwọ, ma ndị nke rụrụ ọrụ ụbọchị dum ma ndị nke rụrụ ọrụ naanị otu awa. Olee ihe i chere banyere nke a? Ọ̀ dị gị ka ihe o mere ò ziri ezi? Ma eleghị anya, i chere na ego nke ndị nọ n’oké anwụ rụọ ọrụ n’ụbọchị ahụ dum kwesịrị ịka. Nke bụ́ eziokwu bụ na e kwesịrị ịkwụ ha ego karịrị nke ndị ọzọ! E si otú a lee ya anya, e nwere ike ikwu na onyeisi ezinụlọ ahụ emetaghị ihe o mere. E nwekwara ike ikwu na otú o si saa ndị ahụ mere mkpesa okwu jọgburu onwe ya. Ma, ànyị ma ihe niile mere o ji mee ihe o mere?

13. Olee ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi lee ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere ndị e goro ịga rụọ ọrụ n’ubi vaịn anya?

13 Ka anyị lee ihe atụ ahụ anya n’ụzọ ọzọ. O doro anya na onyeisi ezinụlọ ahụ ma na ndị ahụ niile o goro ọrụ chọrọ ego ha ga-eji nye ndị ezinụlọ ha nri. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ na-abụ ndị ọrụ rụchaa ọrụ n’ụbọchị a kwụọ ha ụgwọ. Ọ bụ ihe a kwụrụ ha n’ụbọchị ka ha ji enye ezinụlọ ha nri. Iburu nke a n’uche ga-eme ka anyị ghọta nsogbu nke ndị ahụ onyeisi ezinụlọ ahụ goro ọrụ mgbe oge garala nwere, bụ́ ndị rụrụ ọrụ naanị otu awa. Ikekwe, ego naanị otu awa agaghị ezuru ha inye ezinụlọ ha nri; ma, ha chọrọ ịrụ ọrụ, nke mere ka ha chee ọtụtụ awa ma ò nwere onye ga-ego ha ọrụ. (Mat. 20:1-7) Ọ bụghị ha kpatara ihe ha na-ejighị rụọ ọrụ ụbọchị ahụ dum. E nweghị ihe gosiri na ha kpachaara anya ghara ịrụ ọrụ. Weregodị ya na ọ bụ gịnwa ka ihe a mere. I nwere ezinụlọ ị ga-eji ego ị ga-arụta n’ụbọchị ahụ nye nri, ma, i chegidela ụbọchị ahụ dum o nweghị onye goro gị ọrụ. Obi ga-atọgbu gị atọgbu ma ị hụ ọrụ ị ga-arụ. Ọ ga-adịkwa gị ka ọ̀ bụ ná nrọ ma e nye gị ego ga-ezuru gị inye ndị ezinụlọ gị nri.

14. Olee ezigbo ihe anyị na-amụta n’ihe atụ ahụ Jizọs ji ubi vaịn mee?

14 Ka anyị chebakwuoro ihe ahụ onyeisi ezinụlọ ahụ mere echiche. O nweghị onye ọ na-akwụzughị ụgwọ. Kama nke ahụ, o mesoro ndị ahụ niile rụụrụ ya ọrụ ihe otú ga-eme ka ha na ezinụlọ ha nwee ihe ha ga-eri. Ọ gaghị kwụwa ha ihe na-erughị ihe a na-akwụ ndị ọrụ n’ụbọchị n’ihi na ndị ọrụ juru eju. Ndị niile gaara ya ọrụ ji ego ga-ezuru ezinụlọ ha laa n’ụbọchị ahụ. Ihe ndị a anyị tụlerela ugbu a ga-enyere anyị aka ile ihe ahụ onyeisi ezinụlọ ahụ mere anya n’ụzọ ọzọ. Ihe o mere dị mma, o nweghị onye o megburu. Gịnị ka anyị na-amụta na nke a? Ọ bụrụ na anyị atụleghị ihe niile mere mmadụ ji mee ihe o mere, anyị nwere ike ikwu na o metaghị ihe o mere. N’eziokwu, ihe atụ a na-egosi na ezi omume Chineke enweghị atụ, ọ naghị eme ya iji mezuo iwu ma ọ bụ iji menyere ndị ụfọdụ.

Echiche Anyị Nwere Ike Ọ Gaghị Ezicha Ezi

15. Olee ihe ndị nwere ike ime ka echiche anyị ghara izi ezi?

15 Ihe nke abụọ anyị ga-echeta mgbe e nwere ihe anyị chere na otú e si mee ya adịghị mma bụ na echiche anyị nwere ike ghara izicha ezi. Ezughị okè, ịkpọasị, ma ọ bụ otú e si zụlite anyị nwere ike ime ka echiche anyị ghara izi ezi. Ihe ọzọkwa bụ na anyị enweghị ike ịma ihe mere mmadụ ji mee ihe o mere ma ọ bụkwanụ ihe dị ya n’obi. Ma, Jehova na Jizọs enweghị ụdị nsogbu ndị a.—Ilu 24:12; Mat. 9:4; Luk 5:22.

16, 17. Olee ihe mere Jehova ejighị ihe o nyere n’iwu banyere ịkwa iko kpee Devid na Bat-shiba ikpe mgbe ha mehiere?

16 Ka anyị tụlee akụkọ a kọrọ na Baịbụl banyere iko Devid na Bat-shiba kwara. (2 Sam. 11:2-5) Dị ka Iwu Mozis kwuru, e kwesịrị igbu ha. (Lev. 20:10; Diut. 22:22) Ọ bụ eziokwu na Jehova tara ha ahụhụ, o gbughị ha dị ka o kwuru n’iwu ya. Jehova ò kpere ikpe na-ezighị ezi ebe a? Ò lere Devid anya n’ihu wee leghara iwu ya ziri ezi anya? Ụfọdụ ndị na-agụ Baịbụl chere otú a.

17 Ma, ọ bụ ndị ikpe na-ezughị okè, bụ́ ndị na-amaghị ihe dị ndị ọzọ n’obi, ka Jehova nyere iwu ahụ. N’agbanyeghị na ha ezughị okè, iwu a ga-enyere ha aka ịna-ekpe ikpe ziri ezi. Ma, Jehova ma ihe dị mmadụ n’obi. (Jen. 18:25; 1 Ihe 29:17) N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na Jehova ga-edeberịrị iwu o nyere ndị ikpe ahụ na-ezughị okè. Ịchọwa ka o mee otú a ọ́ gaghị adị ka ịmanye onye na-ahụ ụzọ nke ọma ka o yiwe enyo anya e mere ka o nyere onye na-anaghị ahụ ụzọ nke ọma aka ka ọ hụwa ụzọ? Jehova nyochara obi Devid na Bat-shiba ma hụ na ha nwere ezigbo nchegharị. Ọ bụ nke a mere o ji meere ha ebere, ọ maghị ha ikpe ọnwụ.

Nọgide Na-achọ Ezi Omume Jehova

18, 19. Gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara iji otú mmadụ si ele ihe anya na-ekpe Jehova ikpe?

18 Ya mere, ọ bụrụ na o nwere ihe ọ bụla anyị chere na Jehova emetaghị, ma ànyị gụtara ya na Baịbụl ma ò bụ ihe mere anyị, ka anyị ghara iji otú anyị si ele ihe anya kpee Chineke ikpe. Cheta na ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-ama ihe niile merenụ nakwa na echiche anyị nwere ike ghara izicha ezi. Echefukwala na “iwe mmadụ adịghị arụpụta ezi omume Chineke.” (Jems 1:19, 20) Ọ bụrụ na anyị eburu nke a n’uche, obi anyị agaghị ‘eweso Jehova oké iwe.’—Ilu 19:3.

19 Dị ka Jizọs mere, ka anyị cheta mgbe niile na ọ bụ naanị Jehova ka ọ dịịrị ikpebi ihe bụ́ ezi omume na ihe ziri ezi. (Mak 10:17, 18) Gbaa mbọ ka i nweta “ezi ihe ọmụma” banyere otú o si ele ihe anya. (Rom 10:2; 2 Tim. 3:7) Ọ bụrụ na anyị emee nke a, na-emekwa uche ya, anyị na-egosi na anyị bu ụzọ na-achọ “ezi omume Chineke.”—Mat. 6:33.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Otu ọkà mmụta kwuru na okwu Grik e si sụgharịta ‘ime ka ihe guzosie ike’ n’amaokwu ahụ nwekwara ike ịpụta ‘ịrụ ihe ncheta.’ Ya mere, e nwere ike ikwu na ndị Juu ndị ahụ nọ na-arụrụ onwe ha ihe ncheta a ga-eji na-eto ha kama ito Chineke.

Ì Chetara?

• Gịnị mere anyị ji kwesị ịchọ ezi omume Jehova?

• Olee ihe abụọ anyị na-ekwesịghị ime?

• Olee otú anyị nwere ike isi buru ụzọ na-achọ ezi omume Chineke?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe atụ ahụ Jizọs mere banyere mmadụ abụọ ahụ gara ikpe ekpere n’ụlọ nsọ?

[Foto dị na peeji nke 10]

Ọ̀ dị njọ na a kwụrụ ndị malitere ọrụ n’awa nke iri na otu ego ole ahụ a kwụrụ ndị rụrụ ọrụ ụbọchị dum?