Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nyere Ndị Na-eto Eto Aka Ịma Otú Ihe Si Aga n’Ọgbakọ Jehova

Nyere Ndị Na-eto Eto Aka Ịma Otú Ihe Si Aga n’Ọgbakọ Jehova

Nyere Ndị Na-eto Eto Aka Ịma Otú Ihe Si Aga n’Ọgbakọ Jehova

ỊMA otú ihe si aga na-amasị ụmụaka. Chegodị banyere ajụjụ ndị ọ ga-abụ na ụmụaka Izrel ndị nọ n’Ijipt jụrụ n’abalị ahụ ụmụ Izrel mere Ememme Ngabiga mbụ. Ọ ga-abụ na ha jụrụ, sị: ‘Gịnị mere e ji gbuo nwa atụrụ?’ ‘Gịnị mere Papa ji na-ete ọbara n’ọnụ ụzọ?’ ‘Olee ebe anyị na-aga?’ Ihe gosiri na Jehova eweghị iwe mgbe ụmụaka jụrụ ụdị ajụjụ ndị a bụ ihe ọ gwara ndị Izrel bụ́ nna. Jehova gwara ha banyere Ememme Ngabiga ndị a ga-eme n’ọdịnihu, sị: “Mgbe ụmụ unu ga-asị unu, ‘Gịnị ka ememme a unu na-eme pụtara?’ unu ga-asị, ‘Ọ bụ àjà ememme ngabiga nke a na-achụrụ Jehova, bụ́ onye gabigara ụlọ ụmụ Izrel n’Ijipt mgbe o tiri ndị Ijipt ihe otiti, ma ọ napụtara ezinụlọ anyị.’” (Ọpụ. 12:24-27) Jehova mechara chetara ndị nne na nna bụ́ ndị Izrel ihe mere ha ji kwesị ịza ụmụ ha ajụjụ ndị ha ga-ajụ banyere “ụkpụrụ na mkpebi ikpe” ndị ahụ o nyere.—Diut. 6:20-25.

O doro anya na Jehova chọrọ ka a zaa ụmụaka ajụjụ ọ bụla ha jụrụ banyere ezi ofufe, ya bụ, ka a zaa ha ihe ndị ga-eme ka ha hụ Jehova bụ́ Chineke ha, bụ́ Onye Nzọpụta ha, n’anya. Taa, Jehova chọkwara ka ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ nweta ụdị azịza ahụ. Otu n’ime ụzọ ndị nne na nna nwere ike isi kụnye n’ime ụmụ ha ka ha jiri obi ha dum hụ Chineke na ndị ya n’anya bụ inyere ha aka ịma otú ihe si aga n’ọgbakọ Jehova, nakwa otú ndokwa ndị e mere n’ọgbakọ si abara ha uru. Ka anyị tụlee ụfọdụ ụzọ e nwere ike isi nyere ndị na-eto eto aka ịghọtakwu otú ihe si aga n’ọgbakọ Chineke.

Ọgbakọ Unu So Amụ Ihe

Ndị na-eto eto kwesịrị ịma otú ihe si aga n’ọgbakọ ha na ezinụlọ ha so amụ ihe. Ihe ga-enyere ndị nne na nna aka ime ka ụmụ ha mee nke a bụ ịkpọrọ ha na-aga ọmụmụ ihe niile. Ọ bụrụ na unu emee otú a, unu na-eme ihe Jehova gwara ụmụ Izrel mgbe o nyere ha iwu, sị: “Kpọkọta ụmụ Izrel, ndị ikom na ndị inyom na ụmụntakịrị . . . , ka ha wee gee ntị, ka ha mụtakwa ihe, ka ha tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya idebe ihe niile e kwuru n’iwu a. Ụmụ ha ndị na-amabeghị ihe ndị a ga-ege ntị, ha ga-amụtakwa ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke unu.”—Diut. 31:12, 13.

Ụmụaka nwere ike ịmalite mgbe ha dị obere mụwa Okwu Jehova. Pọl onyeozi kwuru banyere Timoti, sị: “Malite n’oge ị bụ nwa ọhụrụ ka ị maara ihe odide ndị ahụ dị nsọ.” (2 Tim. 3:15) Ụmụaka na-amalitedị mgbe a mụrụ ha ọhụrụ ghọtawa ihe a na-ekwu n’ọmụmụ ihe nakwa abụ Alaeze ndị a na-abụ. Ha na-amụta ile anya na Baịbụl ha nakwa n’akwụkwọ a na-amụ mgbe ọmụmụ ihe na-aga n’ihu, ma ghara iji ha na-egwu egwu. Ihe ọzọ bụ na n’ọmụmụ ihe, ha ga-ahụ ebe a na-egosi ezigbo ịhụnanya, bụ́ àgwà e ji ama ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst. Jizọs sịrị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:34, 35) Obi ga-adị ụmụaka mma ma ọ bụrụ na ha achọpụta na ndị nọ n’ọgbakọ hụrụ ibe ha n’anya nakwa na obi ruru onye ọ bụla ala, ọ ga-emekwa ka ha na-abịachi ọmụmụ ihe anya.

Ọ bụrụ na unu na-abịakarị ọmụmụ ihe n’oge, na-echeretụkwa mgbe a gbasara ka unu wee kelee ụmụnna, ụmụ unu ga-emete ndị enyi. Kama ịhapụ ha ka naanị ha na ụmụaka ibe ha na-akpa, gosi ha ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ ha na ha nwere ike ịna-akpa, ma ndị bụ́ ọgbọ ha ma ndị tọrọ ha. Ọ bụrụ na ụmụ gị emete ndị katarala ahụ́ enyi, ha ga-amụta ọtụtụ ihe n’aka ha. Taa, ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi kemgbe ọtụtụ afọ nwere ike inyere ndị na-eto eto aka ime nke ọma n’ọgbakọ, otú ahụ Zekaraya, bụ́ onye ‘kụziri ịtụ egwu Chineke’ n’oge ochie, si nyere Eze Juda bụ́ Ọzaya, onye bụ́ nwata, aka ime ihe ziri ezi. (2 Ihe 26:1, 4, 5) Unu nwekwara ike igosi ụmụ unu ihe e ji ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, bọọdụ ịma ọkwa, nakwa ihe ndị ọzọ dị na ya, eme.

Ọgbakọ Zuru Ụwa Ọnụ

Ụmụaka kwesịrị ịghọta na ọgbakọ ha so n’ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ e nwere n’ụwa niile. Gwa ha otú ihe si aga n’ọgbakọ Jehova, otú e si eduzi ya, nakwa otú ụmụaka ga-esi kwado ọrụ a na-arụ na ya. Gwa ha ihe mere i ji achọ ka mgbakọ sekit, mgbakọ distrikti, nakwa ọbịbịa onye nlekọta sekit, ruo eruo.—Gụọ igbe bụ́  “Ihe Ndị E Nwere Ike Ịmụ Mgbe A Na-enwe Ofufe Ezinụlọ,” nke dị na peeji nke 28.

Mgbe ọ bụla o kwere omume, gwa ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị ozi ala ọzọ, ndị ozi Betel, na ndị ọzọ na-eje ozi oge niile ka ha bịa soro unu rie nri. Echela na ha enweghị ohere ha na ụmụaka ịnọ. Ndị na-eje ozi oge niile na-agba mbọ iṅomi Jizọs, bụ́ onye na-achọ ka ụmụntakịrị bịakwute ya nakwa onye ya na ụmụaka na-akpa nkata. (Mak 10:13-16) Ụmụ gị nwere ike inwe mmasị ije ozi oge niile ma ha nụ ka ụmụnna ndị a na-akọ ahụmahụ na ọṅụ ndị ha nwetarala n’ozi Jehova.

Olee ụzọ ọzọ i nwere ike isi nyere ụmụ gị aka ịmarakwu otú ihe si aga n’ọgbakọ Jehova? Ihe ụfọdụ i nwere ike ime bụ gị na ndị ezinụlọ gị ịmụ akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom. Mee ka ha mara otú ndị Jehova si jiri obi ha dum na-ejere ya ozi, nakwa otú ha si dịrị umeala n’obi. Mee ka ha mata otú Jehova si jiri ha na-eme ka ndị mmadụ nụ ozi ọma n’ụwa niile. Jiri vidio ndị ọgbakọ Jehova wepụtara na-akụziri ụmụ gị ihe ndị dị mkpa mere n’oge gara aga nakwa ndị na-eme n’oge a. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe unu omume, gaanụ leta alaka ụlọ ọrụ, ma ọ bụ Betel, dị ná mba unu ma ọ bụkwanụ ndị nke dị ná mba ọzọ. Ọ bụrụ na unu agaa, ụmụ unu ga-aghọtakwu otú ihe si aga ná nzukọ Jehova n’ụwa. Ha ga-aghọtakwa otú ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi si enye ọgbakọ Jehova nri ime mmụọ, na-eduzikwa ya, dị ka o mere na narị afọ mbụ O.A.—Mat. 24:45-47; Ọrụ 15:22-31.

Ịkụziri Nwa Gị nke Ọ Bụla Ihe Otú Ọ Ga-aghọta Ya

Buru otú Jizọs si kụziere ndịozi ya ihe n’uche mgbe ị na-akụziri ụmụ gị ihe. O nwere mgbe ọ gwara ha, sị: “M ka nwere ọtụtụ ihe m ga-agwa unu, ma unu apụghị ịghọta ha ugbu a.” (Jọn 16:12) Jizọs akụzirighị ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ihe otu mgbe. Kama ịkụziri ha ihe otu mgbe, o ji nwayọọ nwayọọ kụziere ha eziokwu ndị dị mkpa ka ha wee ghọta ha nke ọma. Ṅomie Jizọs, akụzirila ụmụ gị ọtụtụ ihe otu oge. Ọ bụrụ na i jiri nwayọọ nwayọọ na-akụziri ha ihe banyere ọgbakọ Jehova mgbe niile, ị ga-eme ka ha nwee mmasị ịmụ banyere otú ihe si aga n’ọgbakọ. Ka ụmụ gị na-eto, i nwere ike ime ka ihe ndị ị kụziiri ha na mbụ dokwuo ha anya, i nwekwara ike ịgwaghachi ha ihe ndị ị gwarala ha n’oge gara aga.

Ọ bụ n’ọgbakọ ka anyị na-amụta ihe ndị ga-enyere anyị aka ime ka anyị na Jehova nọgide na-adị ná mma. Ọ bụrụkwa na ụmụaka na-eso eme ihe ndị a na-eme na ya, ụwa Setan agaghị enweta ha. (Rom 12:2) Obi siri anyị ike na obi ga-adị unu ụtọ ka unu na-enyere ụmụ unu aka ịghọtakwu otú ihe si aga n’ọgbakọ Jehova. Ka Chineke, bụ́ onye anyị na-efe nakwa onye hụrụ anyị n’anya, nyere ha aka ịnọgide n’ọgbakọ ya, ka o nyekwara ha aka ịnọgide na-ejere ya ozi.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 28]

 Ihe Ndị E Nwere Ike Ịmụ Mgbe A Na-enwe Ofufe Ezinụlọ

Ihe ndị na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị metụtara ọgbakọ Jehova, bụ́ ihe ndị unu nwere ike ịtụle n’Ofufe Ezinụlọ.

▪ Kọọrọ ụmụ gị akụkọ banyere ọgbakọ unu. Òlee mgbe ọ malitere? Oleekwa otú o si malite? Ụlọ Nzukọ Alaeze ole ka ọgbakọ unu nọrọla na ya mụọ ihe? Unu chọọ ịmụ ihe ndị a, ọ ga-adị mma ma ị kpọọ nwanna nọrọla ọdụ n’ọgbakọ unu ka o soro unu nwee Ofufe Ezinụlọ ka o wee zaa ajụjụ ndị ụmụ gị ga-ajụ?

▪ Gwa ụmụ gị ihe mere anyị ji aga ọmụmụ ihe na mgbakọ dị iche iche, gwakwa ha otú ụmụaka nwere ike isi rite uru na ha.

▪ Kụziere ụmụ gị ihe mere e ji malite ụlọ akwụkwọ dị iche iche e nwere n’ọgbakọ Jehova. Kọọrọ ha ihe ndị merela eme, bụ́ ndị na-egosi ihe ọma ndị gara ụlọ akwụkwọ ndị ahụ na-arụpụta.

▪ Nyere ụmụ gị aka ịghọta ihe mere ha ji kwesị ịbụ ndị nkwusa na-agachi ozi anya. Gosi ha ihe ha kwesịrị ime ka akụkọ ozi ha wee na-eso ná ndị a na-ebipụta na Yearbook of Jehovah’s Witnesses.

▪ Gwa ha ozi oge niile ndị ndị na-eto eto nwere ike ịbanye n’ọgbakọ Jehova. Isi nke iri nke akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova ga-enyere gị aka ime nke a.

▪ Nyere ụmụ gị aka ịghọta ihe mere anyị ji eme ihe ndị anyị na-eme n’ọgbakọ. Gwa ha ihe mere na ha ekwesịghị ime otú o si masị ha, ma n’ihe ukwu ma n’ihe nta. Gwa ha na ha ga-eso na-eme ka ihe na-aga n’usoro n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ha na-erubere ndị okenye isi.

[Foto]

Ụmụ gị ga-erite uru ma ha mete ndị nọterela aka n’ọgbakọ enyi

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Dị ka ndị nne na nna mere n’Izrel oge ochie, taa, ndị nne na nna na-agba mbọ na-aza ụmụ ha ajụjụ ndị ha na-ajụ banyere ọgbakọ Jehova