Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Unu aghaghị izu okè, dị ka Nna unu nke eluigwe zuru okè.” Olee otú ụmụ mmadụ ga-esi ‘zuo okè’ taa?—Mat. 5:48.

Ihe bụ́ isi ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a bụ ịghọta ihe e bu n’uche n’ebe ọ bụla e dere okwu bụ́ “zuru okè” na “izu okè” na Baịbụl. Ọ bụghị ihe niile Akwụkwọ Nsọ kwuru na o “zuru okè” zuru okè n’ihe niile. N’eziokwu, ọ bụ naanị Jehova zuru okè n’ihe niile. Ụmụ mmadụ ma ọ bụ ihe dị iche iche nwere ike izu okè ruo n’ókè ụfọdụ. Okwu Hibru na Grik e si sụgharịta “zuru okè” na Baịbụl na-apụtakarị ihe e kwekọrịtara na ọ bụ ihe “zuru ezu,” ihe “tozuru etozu,” ma ọ bụkwanụ ihe “na-enweghị ntụpọ.”

Adam na Iv zuru okè ma n’omume ma ná mmekọrịta ha na Chineke, ha anaghịkwa arịa ọrịa. Ha zuru okè otú onye kere ha si ele ihe anya. Mgbe ha nupụụrụ Chineke isi, ha eruzighị ihe Chineke chọrọ, nke a mere ka ha na ụmụ ha ghara izu okè. N’ihi ya, ọ bụ n’aka Adam ka mmadụ niile si keta mmehie, ezughị okè, na ọnwụ.—Rom 5:12.

Ma, dị ka Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu, ndị na-ezughị okè nwedịrị ike izu okè ruo n’ókè ụfọdụ. N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, o kwuru ụdị ịhụnanya mmadụ ga-enwe ya abụrụ nke zuru okè, ma ọ bụ nke zuru ezu. Ọ bụ ụdị ịhụnanya Chineke gosiri ụmụ mmadụ. Jizọs sịrị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu; ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe, n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Mat. 5:44, 45) Ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs enwee ụdị ịhụnanya a, ha na-eṅomi ịhụnanya zuru okè Chineke nwere.

Taa, Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-agbasi mbọ ike ka ha hụ ndị ọzọ n’anya otú a Jizọs kwuru. Ha na-agbalị inyere ndị si n’ezinụlọ dị iche iche, agbụrụ dị iche iche, na ndị na-ekpe okpukpe dị iche iche, aka ịmụta eziokwu dị na Baịbụl. Taa, Ndịàmà Jehova na-amụrụ ihe karịrị nde mmadụ asaa Baịbụl na narị ala abụọ na iri atọ na isii.

Jizọs jụrụ ajụjụ, sị: “Ọ bụrụ na ọ bụ ndị hụrụ unu n’anya ka unu hụrụ n’anya, olee ụgwọ ọrụ unu nwere? Ọ̀ bụ na ndị ọnaụtụ adịghị eme otu ihe ahụ? Ọ bụrụkwa na ọ bụ naanị ụmụnne unu ka unu na-ekele, olee oké ihe unu na-eme? Ọ̀ bụ na ndị mba ọzọ adịghị emekwa otu ihe ahụ?” (Mat. 5:46, 47) Ezigbo Ndị Kraịst anaghị emelara ndị mmadụ ihe n’ihi otú ha gụruru akwụkwọ ma ọ bụ ebe ha si; ọ bụghịkwa naanị ndị hụrụ ha n’anya ka ha na-ahụ n’anya. Kama nke ahụ, ha na-enyere mmadụ niile aka ma ndị ogbenye ma ndị na-arịa ọrịa, ma ụmụaka ma ndị agadi. Ndị Kraịst si otú a eṅomi ịhụnanya Jehova, nke a na-emekwa ka ha zuo okè ruo n’ókè ụfọdụ.

Ma, ànyị nwere ike izu okè otú ahụ Adam zuru mgbe Chineke kere ya? Ee, ndị nwere okwukwe n’àjà ahụ Jizọs chụrụ iji gbapụta anyị ga-ezu okè kpamkpam n’Ọchịchị Otu Puku Afọ nke Kraịst, bụ́ mgbe ‘Ọkpara Chineke ga-ebibi ọrụ Ekwensu.’—1 Jọn 3:8.