Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Ga-eje Ije n’Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Nke Anyị!

Anyị Ga-eje Ije n’Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Nke Anyị!

Anyị Ga-eje Ije n’Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Nke Anyị!

“Ma mụ onwe m ga-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe nke m.”—Ọma 26:11.

1, 2. Gịnị ka Job kwuru banyere otú o si guzosie ike n’ezi ihe, gịnịkwa ka akwụkwọ Job isi iri atọ na otu kwuru banyere Job?

DỊ KA a na-eme taa, a na-ejikarị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ atụ ihe n’oge ochie. Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị oge ochie na-enwe mkpọrọ ígwè a na-atụhie n’elu mkpọrọ ígwè nke kwụ ọtọ otú ọ ga na-ete ete. A na-ekonye efere abụọ n’ígwè ahụ e ji tụhie nke kwụ ọtọ, otu n’aka nri otu n’aka ekpe. A na-etinye nkume nke ruru ihe a chọrọ ịtụ n’otu efere ma wụnye ihe a chọrọ ịtụ n’efere nke ọzọ. E nyere ụmụ Izrel iwu ka ha na-eji ezigbo nkume ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-atụ ihe.—Ilu 11:1.

2 Mgbe nwoke ezi omume bụ́ Job na-ata ahụhụ Setan wetaara ya, ọ sịrị: “[Jehova] ga-eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi tụọ m, Chineke ga-amarakwa na m na-eguzosi ike n’ezi ihe.” (Job 31:6) Job kwuru ọtụtụ ihe ndị nwere ike itinye onye na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ọnwụnwa. Ma, ihe Job kwuru na Job isi iri atọ na otu gosiri na o meriri ọnwụnwa ndị bịaara ya. Ezigbo ihe nlereanya o setịpụrụ nwere ike ime ka anyị mee ka ya ma jiri obi ike kwuo ụdị ihe ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru mgbe ọ sịrị: “Ma mụ onwe m ga-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe nke m.”—Ọma 26:11.

3. Olee ihe o ji dị mkpa ka anyị na-erubere Chineke isi, ma n’ihe nta ma n’ihe ukwu?

3 Job nọgidere na-erubere Chineke isi n’agbanyeghị na a nwara ya ọnwụnwa kpụ ọkụ n’ọnụ. Ụfọdụ ndị nwedịrị ike ikwu na Job setịpụrụ ihe nlereanya na-enweghị atụ n’agbanyeghị ọnwụnwa kpụ ọkụ n’ọnụ bịaara ya. Ọ bụghị kpọmkwem ụdị ọnwụnwa ndị ahụ bịaara Job na-abịara anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ iguzosi ike n’ezi ihe ma na-akwado ọchịchị Chineke, anyị aghaghị ikwesị ntụkwasị obi, ma n’ihe nta ma n’ihe ukwu.—Gụọ Luk 16:10.

Anyị Kwesịrị Ịna-eme Omume Dị Mma

4, 5. Olee omume Job na-etinyeghị aka na ha n’ihi na ọ na-eguzosi ike n’ezi ihe?

4 Ọ bụrụ na anyị chọrọ iguzosi ike n’ezi ihe, anyị aghaghị irube isi n’iwu Jehova, dị ka Job mere. Job sịrị: “Mụ na anya m agbawo ndụ. Oleezi otú m ga-esi nwee mmasị n’ebe nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nọ? Ọ bụrụ na a ratawo obi m iche banyere nwaanyị ọzọ, m wee nọrọ n’ọnụ ụzọ mmadụ ibe m chebiri ya, ka nwunye m gweere nwoke ọzọ nri, ka ndị ikom ọzọ gbaakwa agada n’elu ya.”—Job 31:1, 9, 10.

5 Job anaghị ele nwaanyị ọzọ anya ka agụụ ya na ya inwe mmekọahụ wee gụwa ya n’ihi na o kpebiri iguzosi ike n’ezi ihe. Job nwere nwaanyị, ọ chụghị nwaanyị na-alụbeghị di ma ọ bụkwanụ nke nọ na di. Jizọs kwuru ihe gbara ọkpụrụkpụ banyere mmekọahụ mgbe ọ na-ezi Ozizi Elu Ugwu. Ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe kwesịrị iburu ihe ahụ o kwuru n’uche.—Gụọ Matiu 5:27, 28.

Aghọla Aghụghọ

6, 7. (a) Dị ka Chineke mere Job, gịnị ka o ji ekpebi ma ànyị na-eguzosi ike n’ezi ihe? (b) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-aghọ aghụghọ?

6 Anyị ekwesịghị ịbụ ndị aghụghọ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. (Gụọ Ilu 3:31-33.) Job sịrị: “Ọ bụrụ na mụ na ndị na-adịghị eme ihe n’eziokwu na-eje ije, ọ bụrụkwa na ụkwụ m na-eme ngwa ịgbaga n’aghụghọ, ọ ga-eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi tụọ m, Chineke ga-amarakwa na m na-eguzosi ike n’ezi ihe.” (Job 31:5, 6) Jehova ji “ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi” atụ mmadụ niile. Dị ka Chineke mere Job, ọ na-eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi ekpebi ma ànyị na-eguzosi ike n’ezi ihe.

7 Ọ bụrụ na anyị bụ ndị aghụghọ anyị amara na anyị anaghị erubere Chineke isi. Ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe “ajụwo omume nzuzo ndị na-eme ihere,” ha anaghịkwa “eje ije n’aghụghọ.” (2 Kọr. 4:1, 2) Gịnịkwanụ ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ji ihe anyị kwuru ma ọ bụ ihe anyị mere ghọgbuo nwanna anyị nke mere ka o tikuo Chineke mkpu enyemaka? Onye mere otú a abaala ná nsogbu! Otu ọbụ abụ bụrụ abụ, sị: “Akpọkuru m Jehova n’oge m nọ n’ahụhụ, o wee za m. Jehova, biko, napụta mkpụrụ obi m n’egbugbere ọnụ nke na-ekwu okwu ụgha, nakwa n’ire na-aghọ aghụghọ.” (Ọma 120:1, 2) Ọ dị mma icheta na Chineke na-enyocha ụdị mmadụ anyị bụ n’ime. Ọ “na-enyocha obi na akụrụ” anyị iji mara ma ànyị na-eguzosi ike n’ezi ihe n’eziokwu.—Ọma 7:8, 9.

Na-emeso Ndị Ọzọ Mmeso Ọma

8. Olee otú Job si meso ndị ọzọ ihe?

8 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-eguzosi ike n’ezi ihe, anyị kwesịrị ịdị ka Job, bụ́ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, dịrị obi umeala ma na-emeso ndị ọzọ mmeso ọma. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na m na-ajụbu ime ka ohu m nwoke ma ọ bụ ohu m nwaanyị nweta ikpe ziri ezi n’okwu ikpe ha nwere megide m, gịnịzi ka m ga-eme mgbe Chineke biliri ọtọ? Mgbe ọ ga-achọ ka m zaa ajụjụ, gịnị ka m ga-aza ya? Ọ́ bụghị Onye ahụ kere m n’afọ kere ya, ọ́ bụghịkwa otu Onye ahụ kere mụ na ya n’ime afọ?”—Job 31:13-15.

9. Olee otú Job si meso ndị ohu ya ihe, oleekwa otú anyị ga-esi eṅomi ya?

9 Mgbe Job nọ ndụ, o yiri ka o nweghị oké ihe a na-eme tupu e leba anya n’ikpe. A na-ahazi otú e si eleba anya n’ikpe n’usoro, ndị ohu nwekwaara onwe ha ịga n’ụlọikpe. Job jikwa obi ebere meso ndị ohu ya ihe. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-eguzosi ike n’ezi ihe, anyị aghaghị ịdị ka Job, karịchaa, ọ bụrụ na anyị bụ ndị okenye ọgbakọ.

Na-emesapụ Aka, Adịla Anyaukwu

10, 11. (a) Olee otú anyị si mara na Job na-emesapụ aka ma na-enyere ndị ọzọ aka? (b) Olee ndụmọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ nke Job 31:16-25 na-echetara anyị?

10 Job na-emesapụ aka ma na-enyere ndị ọzọ aka. Ọ naghị achọ ọdịmma nke naanị onwe ya, ọ dịghịkwa anyaukwu. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na m . . . na-eme ka anya nwaanyị di ya nwụrụ gharakwa ịhụ ụzọ, ọ bụrụkwa na ọ bụ naanị m na-eribu obere nri m, ma nwa na-enweghị nna esoghị m rie ya . . . ; ọ bụrụ na m na-ahụbu onye ọ bụla ka ọ na-anwụ n’ihi enweghị uwe, . . . ọ bụrụ na m ji iwe na-atụ nwa na-enweghị nna aka, mgbe m hụrụ ka ọ nọ n’ọnụ ụzọ ámá na-achọ enyemaka m, ka ọkpụkpụ ubu m chikwapụ, ka ogwe aka m kwokapụkwa na nkwonkwo ubu m.” Job agaraghịkwa abụ onye na-eguzosi ike n’ezi ihe ma ọ bụrụ na ọ na-asị ọlaedo: “Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi!”—Job 31:16-25.

11 Ihe ndị a mara mma Job kwuru na-echetara anyị ihe Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Ụdị ofufe nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ụzọ Chineke bụ́ Nna anyị si ele ihe anya bụ: ilekọta ụmụ mgbei na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ná mkpagbu ha, na mmadụ idebe onwe ya ka ọ ghara inwe ntụpọ site n’ụwa.” (Jems 1:27) Anyị nwekwara ike icheta ịdọ aka ná ntị Jizọs dọrọ anyị mgbe ọ sịrị: “Ghewenụ anya unu oghe, lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla, n’ihi na ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.” Mgbe Jizọs kwuchara nke a, o ji otu nwoke bara ọgaranya, onye nwekwara anyaukwu, mee ihe atụ, bụ́ onye mechara nwụọ n’abụghị “ọgaranya n’ebe Chineke nọ.” (Luk 12:15-21) Ọ bụrụ na anyị chọrọ iguzosi ike n’ezi ihe, anyị ekwesịghị ịdị anyaukwu. Anyaukwu bụ ikpere arụsị n’ihi na ihe onye anyaukwu na-achụ inweta anaghị ekwe ya fee Jehova otú kwesịrị ekwesị. Nke a na-eme ka ihe ahụ ghọọ chi ya. (Kọl. 3:5) Iguzosi ike n’ezi ihe na anyaukwu anaghị agakọ!

Nọgide Na-efe Chineke Ezi Ofufe

12, 13. A bịa n’izere ikpere arụsị, olee otú Job si setịpụrụ anyị ihe nlereanya?

12 Ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe anaghị adapụ n’ezi ofufe. Job emeghị otú ahụ, n’ihi na ọ sịrị: “Ọ bụrụ na m na-ahụbu ìhè ma o nwuo, ma ọ bụ ọnwa dị ebube mgbe ọ na-aga, e wee malite ịra obi m ụrà na nzuzo, m wee susuo aka m ọnụ, nke ahụkwa ga-abụ mmejọ nke ndị ikpe ga-eleba anya, n’ihi na ọ ga-apụta na mụ agọnahụwo ezi Chineke bi n’elu.”—Job 31:26-28.

13 Job efeghị ihe na-adịghị ndụ. Ọ bụrụ na a rara obi ya ụrà na nzuzo mgbe ọ hụrụ ihe ndị dị n’eluigwe, dị ka ọnwa, ọ bụrụkwa na ‘o susuru aka ya ọnụ’ wee feere ihe ndị ahụ aka iji fee ha ofufe, ọ gaara abụ na o kpeere arụsị wee gọnahụ Chineke. (Diut. 4:15, 19) Anyị aghaghị izere ụdị ikpere arụsị niile ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-erubere Chineke isi.—Gụọ 1 Jọn 5:21.

Abụla Onye Na-emegwara Ihe E Mere Ya Ma Ọ Bụ Onye Ihu Abụọ

14. Gịnị mere anyị ji kwuo na Job abụghị onye obi ilu?

14 Job abụghị onye obi ilu, ọ bụghịkwa onye obi ọjọọ. Ọ ma na onye na-eme ihe ndị a anaghị eguzosi ike n’ezi ihe, n’ihi na ọ sịrị: “Ọ bụrụ na m na-aṅụrịbu ọṅụ mgbe e bibiri onye kpọrọ m oké asị, ma ọ bụ na m nwere obi ụtọ n’ihi na ihe ọjọọ dakwasịrị ya— ekweghịkwa m ka okpo ọnụ m mehie site n’ikwu ka ọ ṅụọ iyi ga-emegide mkpụrụ obi ya.”—Job 31:29, 30.

15. Gịnị mere o ji dị njọ ịṅụrị ọṅụ mgbe ọdachi dakwasịrị onye kpọrọ anyị asị?

15 Nwoke ezi omume bụ́ Job anaghị aṅụrị ọṅụ ma ọdachi dakwasị onye kpọrọ ya asị. Otu ilu dụrụ anyị ọdụ, sị: “Mgbe onye iro gị dara, aṅụrịla ọṅụ; mgbe e mere ka ọ sụọ ngọngọ, ka obi gị ghara inwe aṅụrị, ka Jehova wee ghara ịhụ ya, o wee dị njọ n’anya ya, o wee kwụsị iweso ya iwe.” (Ilu 24:17, 18) Ebe Jehova na-enyocha obi, ọ ma ma ànyị na-aṅụrị ọṅụ n’obi anyị mgbe ọdachi dakwasịrị onye ọzọ, ọ naghịkwa amasị ya ma anyị na-aṅụrị ọṅụ. (Ilu 17:5) Chineke nwere ike imesi anyị ike ma ọ bụrụ na anyị na-eme otú a, n’ihi na ọ sịrị: “Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ na ịkwụ ụgwọ.”—Diut. 32:35.

16. Ọ bụrụgodị na anyị abaghị ọgaranya, olee otú anyị nwere ike isi bụrụ ndị na-ele ọbịa?

16 Job na-ele ọbịa. (Job 31:31, 32) Ọ bụrụgodị na anyị abaghị ọgaranya, anyị nwere ike ‘na-ele ọbịa.’ (Rom 12:13) Anyị na ndị ọzọ nwere ike iri obere nri anyị nwere ma ọ bụrụ na anyị echeta na “nri e ji naanị akwụkwọ nri sie dị mma n’ebe e nwere ịhụnanya karịa ehi mara abụba n’ebe e nwere ịkpọasị.” (Ilu 15:17) Ọ bụrụ na anyị na ụmụnna anyị ejiri ịhụnanya rikọọ nri, obi ga-adị anyị ụtọ, a ga-ewulikwa anyị elu, ya sọkwa nri ahụ ya dị obere.

17. Gịnị mere na anyị ekwesịghị izochi mmehie dị oké njọ?

17 Ọ ghaghị ịbụ na Job gbara onye ọ bụla o lere ọbịa ume n’ihi na ọ bụghị onye ihu abụọ. Ọ dịghị ka ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke na narị afọ mbụ, bụ́ ndị gbebatara n’ọgbakọ ma “na-enwe mmasị n’ihe ndị mmadụ bụ n’ihi uru ha ga-erite.” (Jud 3, 4, 16) Job ekpuchighịkwa njehie ya ma ọ bụ zoo ya ‘n’ime akpa uwe ya,’ na-atụ ụjọ na nke a ga-ewetara ya ihere ma ndị ọzọ mara banyere ya. Ọ dị njikere ikwe ka Chineke, bụ́ onye ọ ga-ekwupụtara mmehie ya, nyochaa ya. (Job 31:33-37) Na anyị achọghị ka aha anyị mebie ekwesịghị ime ka anyị zochie mmehie dị oké njọ anyị mere. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-eguzosi ike n’ezi ihe? Ọ bụ site n’ikweta na anyị emehiela, chegharịa, chọọ enyemaka ndị okenye, gbaakwa mbọ ghara ime ihe ahụ ọzọ.—Ilu 28:13; Jems 5:13-15.

Job Dị Njikere Igosi na Ya Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe

18, 19. (a) Olee ihe mere anyị ji nwee ike ikwu na o nweghị onye Job megburu? (b) Gịnị ka Job dị njikere ime ma ọ bụrụ na e gosi na o mere ihe na-adịghị mma?

18 Job na-akwụwa aka ọtọ, o nweghị onye ọ na-emegide. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Ọ bụrụ na ala m etie mkpu enyemaka megide m, ọ bụrụkwa na ebe niile a kọrọ akọ akwaa ákwá n’otu mgbe; ọ bụrụ na mụ erie mkpụrụ ya n’akwụghị ụgwọ, meekwa ka mkpụrụ obi nke ndị nwe ya sụọ ude, ka ahịhịa ogwu pulite n’ọnọdụ ọka wit, ka ahịhịa na-esi ísì puokwa n’ọnọdụ ọka bali.” (Job 31:38-40) Job anaraghị ndị ọzọ ala ha, o righịkwa ego ndị rụụrụ ya ọrụ. Dị ka Job mere, anyị kwesịrị irubere Jehova isi ma n’ihe nta ma n’ihe ukwu.

19 Job nọ n’ihu ndị enyi ya atọ nakwa n’ihu nwa okorobịa bụ́ Elaịhu kwuo otú o si bie ndụ, wee gwa onye ọ bụla nke nwere ihe ọ ga-ekwu megide ya ka ọ pụta gbaa ya akaebe. Ọ dị njikere ịta ahụhụ ma onye ahụ gosi na ihe ahụ o boro ya bụ eziokwu. Job kwuchara nke a wee chere ka Chineke bie ikpe. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ‘okwu Job gwụrụ.’—Job 31:35, 40.

I Nwere Ike Iguzosi Ike n’Ezi Ihe

20, 21. (a) Gịnị nyeere Job aka iguzosi ike n’ezi ihe? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ahụ Chineke n’anya?

20 Job guzosiri ike n’ezi ihe n’ihi na ọ hụrụ Chineke n’anya, Jehova hụkwara ya n’anya ma nyere ya aka. Job sịrị: “I nyewo m ndụ, gosikwa m obiọma [ya bụ, ịhụnanya na-adịgide adịgide]; nlekọta ị [ya bụ, Jehova] na-elekọta m echebewo mmụọ m.” (Job 10:12, ihe e dere n’ala ala peeji.) Ihe ọzọ bụ na Job hụrụ ndị ọzọ n’anya n’ihi na ọ ma na onye na-enwereghị mmadụ ibe ya ịhụnanya nke na-adịgide adịgide anaghị atụ egwu Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. (Job 6:14) Ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe hụrụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya.—Mat. 22:37-40.

21 Anyị ga-anọgide na-ahụ Chineke n’anya site n’ịgụ Okwu ya kwa ụbọchị, na-atụgharịkwa uche n’ihe Baịbụl na-ekwu banyere Chineke. Anyị nwere ike iji ekpere si anyị n’ala ala obi too Jehova ma kelee ya maka ihe ọ na-emere anyị. (Fil. 4:6, 7) Ọ bụrụ na anyị ana-abịachi ọmụmụ ihe anya, anyị ga-erite uru na ya, sorokwa na-abụku Jehova abụ. (Hib. 10:23-25) Anyị ga-ahụkwukwa Chineke n’anya ma anyị na-aga ozi ọma wee ‘na-ekwusa ozi ọma banyere nzọpụta ya.’ (Ọma 96:1-3) Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị a, anyị ga-eguzosi ike n’ezi ihe dị ka otu ọbụ abụ mere, bụ́ onye bụrụ abụ, sị: “Ịbịaru Chineke nso dị m mma. Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ka m ji mere ebe mgbaba.”—Ọma 73:28.

22, 23. Olee otú àgwà anyị, bụ́ ndị na-akwado ọchịchị Jehova, si yie nke ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe n’oge ochie?

22 Kemgbe ọtụtụ narị afọ, Jehova na-enye ọtụtụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe ọrụ dị iche iche. Noa wuru ụgbọ, bụrụkwa “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) Jọshụa duuru ụmụ Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ, ma, ihe mere o ji nwee ike ime nke a bụ na ọ na-agụ “akwụkwọ iwu . . . ehihie na abalị,” na-emekwa ihe ọ gụtara na ya. (Jọsh. 1:7, 8) Ndị Kraịst narị afọ mbụ mere ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, ha na-ezukọkwa mgbe niile na-amụ Baịbụl.—Mat. 28:19, 20.

23 Anyị na-akwado ọchịchị Jehova ma na-erubere iwu Chineke isi site n’ikwusa ezi omume, ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ime ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, nakwa iso ụmụnna anyị na-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa n’Ụlọ Mgbakọ. Ime ihe ndị a na-enyere anyị aka inwe obi ike, ịgbasi ike n’okwukwe, na ime uche Chineke. Nke a anaghị esiri anyị oké ike n’ihi na Nna anyị nke eluigwe na Ọkpara ya na-akwado anyị. (Diut. 30:11-14; 1 Eze 8:57) Ihe ọzọ na-eme ka nke a ghara isiri anyị oké ike bụ na “òtù ụmụnna dum,” bụ́ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe ma na-erubere Jehova isi n’ihi na ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị, na-akwado anyị.—1 Pita 2:17.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele iwu Jehova anya?

• Olee àgwà Job ndị kacha amasị gị?

• Dị ka e kwuru na Job 31:29-37, olee otú Job si kpaa àgwà?

• Olee otú anyị si mara na anyị ga-eguzosili ike n’ezi ihe?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 29]

Job guzosiri ike n’ezi ihe. Anyị nwekwara ike ime otú ahụ!

[Foto dị na peeji nke 32]

Anyị nwere ike iguzosi ike n’ezi ihe!