Jehova Bụ Ọkaakaa Onyenwe Anyị!
Jehova Bụ Ọkaakaa Onyenwe Anyị!
“Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ka m ji mere ebe mgbaba.”—ỌMA 73:28.
1. Gịnị ka o yiri ka Pọl ọ̀ na-ekwu banyere ya mgbe o kwuru ihe ahụ dị ná 1 Ndị Kọrịnt 7:31?
PỌL onyeozi dere, sị: “Ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe.” (1 Kọr. 7:31) O yiri ka o ji ụwa tụnyere ebe a na-anọ eme ihe nkiri, bụ́ ebe ndị na-eme ihe nkiri na-eme ma ihe dị mma ma ihe na-adịghị mma. Ha mepụ otu agba ha emee ọzọ.
2, 3. (a) Gịnị ka e nwere ike iji tụnyere aka mgba Ekwensu na-echere ọchịchị Jehova? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?
2 Otu ihe dị ezigbo mkpa nke e nwere ike iji ihe nkiri tụnyere na-eme n’ụwa taa. Ihe ahụ gbasakwara gịnwa! Nke kacha mkpa bụ na o metụtara otú Jehova bụ́ Chineke ga-esi gosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị. E nwere ike iji nke a tụnyere ihe nwere ike ime n’otu mba. Ka e were ya na ná mba ahụ, e nwere ezigbo ndị ọchịchị ndị mba ahụ họpụtara, bụ́ ndị na-achị nke ọma, nweekwa ndị ọchịchị ọzọ na-arụ arụrụala, na-eme ihe ike, na-egbukwa ndị mmadụ. Ndị ọchịchị arụrụala ahụ na-echere ezigbo ndị ọchịchị ahụ aka mgba, na-agbalịkwa ime ka ndị mba ahụ na-enupụrụ ezigbo ndị ọchịchị ahụ isi.
3 A na-eme ọchịchị Chineke ihe yiri nke a. Ọchịchị “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova” bụ nke ezigbo ya. (Ọma 71:5) Ma, ọchịchị “ajọ onye ahụ” na-ewetara ụmụ mmadụ nsogbu. (1 Jọn 5:19) Ọ na-echere ezigbo ọchịchị Chineke aka mgba, na-agbakwa mbọ ime ka ụmụ mmadụ na-enupụrụ ọchịchị Chineke isi. Olee otú nke a si malite? Gịnị mere Chineke ji gba nkịtị ka nke a na-eme? Gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ime banyere nke a?
Ihe Ndị Na-ese Okwu
4. Olee ihe abụọ yiri ibe ha, bụ́ ndị na-ese okwu?
4 E nwere ihe abụọ na-ese okwu, bụ́ ndị yiri ibe ha. Ha metụtara ọchịchị Jehova nakwa ma ụmụ mmadụ hà ga-anọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe. Akwụkwọ Nsọ na-akpọkarị Jehova “Ọkaakaa Onyenwe anyị.” Dị ka ihe atụ, otu ọbụ abụ tụkwasịrị Jehova obi ya dum nke mere o ji bụọ abụ, sị: “Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ka m ji mere ebe mgbaba.” (Ọma 73:28) E nwere ezigbo ihe ndị mere anyị ji kwesị ikwere na Jehova bụ́ Chineke bụ Onye Kasị Elu.—Dan. 7:22.
5. Olee ihe mere anyị ji kwesị iji obi anyị niile na-akwado ọchịchị Jehova?
5 Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke na-achị eluigwe Mkpughe 4:11.) Jehova bụ Onyeikpe anyị, Onye na-enye anyị iwu, na Eze anyị. (Aịza. 33:22) Anyị kwesịrị ịna-erubere Chineke isi n’ihi na ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụrụkwa ya kere anyị, ọ dịghịkwa ihe anyị ga-emeli ma e wezụga ya. Anyị ga-eji obi anyị niile na-eme ihe gosiri na ọ bụ onye dị elu ma ọ bụrụ na anyị na-echeta mgbe niile na “Jehova emewo ka ocheeze ya guzosie ike n’eluigwe; alaeze ya na-achịkwa ihe niile.”—Ọma 103:19; Ọrụ 4:24.
na ụwa dum n’ihi na ọ bụ ya kere ihe niile. (Gụọ6. Gịnị ka iguzosi ike n’ezi ihe pụtara?
6 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-akwado ọchịchị Jehova, anyị aghaghị iguzosi ike n’ezi ihe. “Iguzosi ike n’ezi ihe” bụ omume dị mma ma ọ bụ nke zuru ezu. Onye na-eguzosi ike n’ezi ihe bụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta, bụrụkwa onye ezi omume. Nke a bụ ihe e ji mara nna ochie bụ́ Job.—Job 1:1.
Otú Esemokwu ahụ Si Malite
7, 8. Olee otú Setan si kwuo na otú Jehova si achị adịghị mma?
7 Ihe karịrị puku afọ isii gara aga, otu mmụọ ozi kwuru na otú Jehova si achị ọchịchị adịghị mma. Ihe mere onye nnupụisi ahụ ji kwuo ihe a ma mee ihe o mere bụ na ọ chọrọ ka e fewe ya ofufe. O mere ka di na nwunye mbụ, bụ́ Adam na Iv, nupụrụ ọchịchị Chineke isi. Ọ gbalịkwara imebi aha Jehova mgbe o kwuru na ọ ghara ụgha. (Gụọ Jenesis 3:1-5.) Onye nnupụisi ahụ ghọrọ Onye Iro ukwu, Setan (ma ọ bụ Onye nguzogide), Ekwensu (ma ọ bụ Onye nkwutọ), agwọ (ma ọ bụ onye nduhie), na dragọn (ma ọ bụ onye nripịa).—Mkpu.12:9.
8 Setan ghọrọ onye ọchịchị na-echere Jehova aka mgba. Gịnị ka Ọkaakaa Onyenwe anyị bụ́ Jehova ga-eme? Ọ̀ ga-egbu ndị nnupụisi atọ ahụ, ya bụ, Setan, Adam, na Iv? O doro anya na ọ ga-emeli ya, nke a gaara eme ka o doo ewu na ọkụkọ anya na Jehova pụrụ ime ihe niile. Ọ gakwaara egosi na Jehova kwuru eziokwu banyere ahụhụ ọ ga-ata ndị ahụ nupụrụ isi n’iwu ya. Gịnị mere na Chineke egbughị ha?
9. Olee ihe dị iche iche omume Setan gosiri?
9 Mgbe Setan ghara ụgha ahụ, nke mere ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi, ihe ọ na-ekwu bụ na ụmụ mmadụ ekwesịghị irubere Jehova isi. Ihe ọzọ bụ na ihe ahụ Setan mere, nke bụ́ ime ka di na nwunye ahụ nupụrụ Chineke isi, gosiri na o kwuru na ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi agaghị erubeliri Chineke isi. Setan jikwa ọnwụnwa ọ nwara Job, bụ́ onye na-erubere ọchịchị Chineke isi, kwuo na ya ga-emeli ka mmadụ niile nupụrụ Chineke isi.—Job 2:1-5.
10. Gịnị ka nkịtị Chineke gbara ndị nnupụisi ahụ nyere ohere ya?
10 Nkịtị Jehova gbara ndị nnupụisi ahụ mere ka Setan nwee ohere iji gosi ma ọ̀ ga-emeli ihe o kwuru. Chineke enyekwala ndị mmadụ ohere ka ha wee gosi ma hà na-erubere ọchịchị ya isi. Gịnị merela kemgbe ọtụtụ narị afọ ndị a? Ọchịchị Setan emeela ka ọchịchị arụrụala ju ebe niile. Jehova ga-ebibi Ekwensu na ọchịchị ya, bụ́ nke ga-eme ka onye ukwu na onye nta mara na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. Jehova bụ́ Chineke ma na nke a ga-emerịrị, nke mere ka o buo amụma banyere ya mgbe Adam na Iv nupụụrụ ya isi n’Iden.—Jen. 3:15.
11. Gịnị ka ọtụtụ mmadụ merela banyere ọchịchị Jehova?
11 E nweela ọtụtụ ndị nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ, rubekwara ọchịchị ya isi ma doo aha ya nsọ. Ha gụnyere Ebel, Inọk, Noa, Ebreham, Sera, Mozis, Rut, Devid, Jizọs, ndị na-eso Kraịst n’oge ochie, nakwa ọtụtụ nde ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe n’oge a. Ndị a, bụ́ ndị na-akwado ọchịchị Chineke, so egosi na Setan bụ onye ụgha. Ha sokwa eme ka ndị mmadụ ghara ịna-emebi aha Jehova, bụ́ nke Ekwensu malitere imebi mgbe o turu ọnụ na ya ga-eme ka mmadụ niile nupụrụ Chineke isi.—Ilu 27:11.
Ihe Ga-emecha Mee Doro Anya
12. Olee otú anyị si mara na Chineke agaghị anọgide na-agbachi nkịtị ka ajọ omume na-aga n’ihu?
12 O doro anya na Jehova ga-amalite ịchị ụwa niile n’oge na-adịghị anya. Ọ gaghị anọgide na-agbachi nkịtị ka ajọ omume na-aga n’ihu, anyị makwa na anyị nọ ugbu a n’oge ikpeazụ. Jehova ji Iju Mmiri bibie ndị ajọ omume n’oge Noa. O bibiri Sọdọm na Gọmọra, bibiekwa Fero na ndị agha ya. O nweghị ihe Sisera na ndị agha ya nakwa Senakerib onye Asiria na ndị agha nke ya meliri Onye Kasị Ihe Niile Elu. (Jen. 7:1, 23; 19:24, 25; Ọpụ. 14:30, 31; Ikpe 4:15, 16; 2 Eze 19:35, 36) Nke a ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova bụ́ Chineke agaghị anọgide na-agbachi nkịtị ka a na-emebi aha ya ma na-emegide Ndịàmà ya. Ihe ọzọ bụ na anyị na-ahụ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Jizọs nakwa nke ọgwụgwụ usoro ihe a.—Mat. 24:3.
13. Olee ihe anyị ga-eme ka a ghara ibibi anyị mgbe a ga-ebibi ndị iro Jehova?
13 Anyị aghaghị ịna-erubere ọchịchị Jehova isi ma ọ bụrụ na anyị achọghị ka e bibie anyị mgbe a ga-ebibi ndị iro Chineke. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme nke a? Ọ bụ site n’ịnọpụ iche n’ọchịchị arụrụala Setan, gharakwa ikwe ka ndị na-ejere ya ozi mee ka anyị kwụsị ife Jehova. (Aịza. 52:11; Jọn 17:16; Ọrụ 5:29) Ọ bụ naanị mgbe anyị mere ihe ndị a ka anyị na-akwado ọchịchị Chineke. Nke a ga-emekwa ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ mgbe Jehova ga-ebibi ndị na-emetọ aha ya, gosikwa na ya bụ Ọkaakaa Eluigwe na Ụwa.
14. Gịnị ka mpaghara dị iche iche dị na Baịbụl kwuru?
14 Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe banyere ụmụ mmadụ na ọchịchị Jehova. Isi atọ mbụ nke Baịbụl gwara anyị otú Chineke si kee ihe na otú mmadụ si mehie, ebe isi atọ ikpeazụ nke Baịbụl gwara anyị otú ụmụ mmadụ ga-esi nwetaghachi ngọzi Chineke. Isiakwụkwọ ndị ọzọ gwara anyị ihe dị iche iche Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova mere ka ihe niile o zubeere ụmụ mmadụ, ụwa, na eluigwe wee mezuo. Jenesis kwuru otú Setan na ajọ omume si bata n’ụwa, ngwụcha nke Mkpughe ekwuokwa otú a ga-esi kwụsị ihe ọjọọ, laa Ekwensu n’iyi, nakwa otú uche Chineke ga-esi mee n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe. N’eziokwu, Baịbụl gwara anyị otú mmehie na ọnwụ si malite, gwakwa anyị otú a ga-esi wepụ ha n’ụwa ma mee ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe malite ịdị ndụ ebighị ebi na inwe ọṅụ na-enweghị atụ.
15. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị wee rite uru mgbe Jehova ga-ebibi onye na-echere ọchịchị ya aka mgba?
15 Ọnọdụ ụwa a ga-agbanwe kpamkpam n’oge na-adịghị anya. Aka mgba Setan na-echere ọchịchị Chineke ga-akwụsị. Setan ga-akwụsị ịchị, a ga-alakwa ya n’iyi, uche Chineke ga na-emekwa. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọ ya mgbe nke a ga-eme, anyị enwetakwa ọtụtụ Ọma 118:6, 7.
ngọzi e kwere anyị ná nkwa n’Okwu Chineke, anyị aghaghị ịkwado ọchịchị Jehova ugbu a. Anyị ga-akwadorịrị otu. Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị ga na-asị: “Jehova nọnyeere m,” anyị aghaghị ịna-akwado ya.—Anyị Ga-eguzosili Ike n’Ezi Ihe!
16. Olee otú anyị si mara na ụmụ mmadụ ga-eguzosili ike n’ezi ihe?
16 Anyị ga-akwadoli ọchịchị Jehova ma na-eguzosi ike n’ezi ihe, n’ihi na Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ dịghị ọnwụnwa bịakwasịrị unu nke na-abụghị nke na-abịara ụmụ mmadụ. Ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ idi, kama mgbe ọnwụnwa bịara, ọ ga-emere unu ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike idi ya.” (1 Kọr. 10:13) Olee ụdị ọnwụnwa Pọl kwuru banyere ya, oleekwa otú Chineke si emere anyị ụzọ mgbapụ?
17-19. (a) Olee ọnwụnwa ụmụ Izrel na-emerilighị mgbe ha nọ n’ala ịkpa? (b) Olee ihe mere obi ji sie anyị ike na anyị ga-eguzosili ike n’ezi ihe?
17 Ihe mere ụmụ Izrel n’ala ịkpa na-egosi na “ọnwụnwa” a na-ekwu okwu ya bụ ihe ndị nwere ike ime ka anyị mebie iwu Chineke. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:6-10.) Ụmụ Izrel gaara emeri ọnwụnwa bịaara ha, ma, ha nwere “ọchịchọ ihe ọjọọ” mgbe Jehova rụrụ ọrụ ebube wee nye ha nnụnụ kwel ga-ezuru ha otu ọnwa. Ọ bụ eziokwu na ọ dịla anya ha na-eribeghị anụ, Chineke nyere ha mana ga-ezuru ha n’oge ahụ. Ma, mgbe e nyere ha nnụnụ kwel, ha malitere iji anyaukwu na-ekpokọrọ ya.—Ọnụ Ọgụ. 11:19, 20, 31-35.
18 Tupu mgbe ahụ, mgbe Mozis nọ n’Ugwu Saịnaị na-anata Iwu iri ahụ, ụmụ Izrel malitere ikpere chi nwa ehi, ha mekwara oriri nke dugara ha n’ime omume rụrụ arụ. Ha emerilighị ọnwụnwa bịaara ha n’ihi na onye ndú ha a na-ahụ anya anọghị ya. (Ọpụ. 32:1, 6) Obere oge tupu ụmụ Izrel abanye Ala Nkwa ahụ, ụmụ nwaanyị Moab rafuru ọtụtụ puku ndị Izrel, ha na ha wee kwaa iko. Ọtụtụ puku ụmụ Izrel nwụrụ n’oge ahụ n’ihi mmehie ha. (Ọnụ Ọgụ. 25:1, 9) Mgbe ụfọdụ, ụmụ Izrel ji iwe mee mkpesa. N’otu n’ime mkpesa ha mere, ha kwuru okwu megide Mozis na Chineke! (Ọnụ Ọgụ. 21:5) Mgbe e gburu Kora, Detan, Abaịram, na ndị òtù ha, bụ́ ndị kpara àgwà ọjọọ, ụmụ Izrel tamuru ntamu wee kwuo na ogbugbu e gburu ha ezighị ezi. Nke a mere ka Chineke tie ụmụ Izrel ihe otiti nke gburu puku mmadụ iri na anọ na narị mmadụ asaa.—Ọnụ Ọgụ. 16:41, 49.
19 O nweghị nke ọ bụla n’ime ọnwụnwa ndị a anyị kwuru banyere ha nke ụmụ Izrel na-agaraghị ezereli ma à sị na ha chọrọ. Ha emerighị ọnwụnwa ndị ahụ n’ihi na ha enweghị okwukwe n’ebe Jehova nọ, ha chefukwara Jehova, ịhụnanya o nwere n’ebe ha nọ, nakwa ezi omume ya. Dị ka ọ bịaara ụmụ Izrel, ọnwụnwa ndị na-abịara anyị adịghị iche n’ọnwụnwa ndị na-abịara ụmụ mmadụ ndị ọzọ. Ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ merie ha ma nwee okwukwe na Chineke ga-enyere anyị aka, anyị ga-eguzosi ike n’ezi ihe. Obi siri anyị ike na anyị ga-emeli nke a n’ihi na “Chineke kwesịrị ntụkwasị obi,” ọ naghịkwa ekwe ka “a nwaa [anyị] gabiga ihe [anyị] pụrụ idi.” Jehova anaghị ahapụ anyị ka a nwaa anyị ruo n’ókè ọ ga-esiri anyị ike ime uche ya.—Ọma 94:14.
20, 21. Olee otú Chineke si emere anyị “ụzọ mgbapụ” mgbe ọnwụnwa bịaara anyị?
1 Ndị Kọrịnt 10:13, bụ́ nke na-emesi anyị obi ike, anyị ga-ama na ọnwụnwa ahụ agaghị adịte aka. Jehova agaghị ekwe ka o ruo n’ókè anyị na-agaghị enwe ike irubere ya isi. Chineke ga-eme ka okwukwe anyị sie ike ka anyị wee guzosie ike n’ezi ihe.
20 Jehova na-emere anyị “ụzọ mgbapụ” site n’inye anyị ike anyị ga-eji na-emeri ọnwụnwa. Dị ka ihe atụ, ndị na-akpagbu anyị nwere ike ịta anyị ahụhụ ka anyị wee jụ Jehova. Ahụhụ ahụ ha na-ata anyị nwere ike ime ka anyị jụ okwukwe anyị ka ha wee kwụsị ihe ha na-eti anyị, ahụhụ ha na-ata anyị, ma ọ bụkwanụ ka ha ghara igbu anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị echeta ihe ahụ Pọl ji ike mmụọ nsọ dee ná21 Jehova jikwa mmụọ nsọ ya eme ka anyị kwụsie ike. Mmụọ nsọ na-emekwa ka anyị cheta ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka imeri ọnwụnwa. (Jọn 14:26) Nke a ga-eme ka a ghara ime ka anyị tinye aka n’ihe na-ezighị ezi. Dị ka ihe atụ, anyị ma ihe ndị metụtara ọchịchị Jehova na ihe mere anyị ji kwesị ịna-eguzosi ike n’ezi ihe. Nke a emeela ka ọtụtụ ndị kwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ site n’enyemaka Chineke. Ma, ọ bụghị ọnwụ ha nwụrụ meere ha ụzọ mgbapụ; ọ bụ Jehova nyeere ha aka ịtachi obi ruo ọnwụ n’ekweghị ka ọnwụnwa merie ha. Ọ ga-emekwara anyị otú o meere ha. N’eziokwu, ọ na-agwakwa ndị mmụọ ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi ka ha na-ejere anyị ozi n’ihi na ha bụ “ndị e zipụrụ ijere ndị ga-eketa nzọpụta ozi.” (Hib. 1:14) Isiokwu na-eso nke a ga-eme ka anyị mara na ọ bụ naanị ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe ga-enwe olileanya inwe nnukwu ihe ùgwù nke ịkwado ọchịchị Chineke ruo mgbe ebighị ebi. Anyị ga-eso na ha ma ọ bụrụ na anyị na-erubere Jehova isi maka na ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị.
Olee Ihe Ị Ga-aza?
• Olee ihe mere anyị ji kwesị ịnabata na Jehova bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị?
• Gịnị ka irubere Chineke isi pụtara?
• Olee otú anyị si mara na Jehova ga-amalite ịchị ụwa n’oge na-adịghị anya?
• Olee otú 1 Ndị Kọrịnt 10:13 si gosi na anyị ga-eguzosili ike n’ezi ihe?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 24]
Setan mere ka Adam na Iv nupụrụ Jehova isi
[Foto dị na peeji nke 26]
Kpebisie ike na ị ga na-akwado ọchịchị Jehova