Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-eto Eto—unu Esola Ndị Ọgbọ Unu Eme Ihe Na-adịghị Mma

Ndị Na-eto Eto—unu Esola Ndị Ọgbọ Unu Eme Ihe Na-adịghị Mma

Ndị Na-eto Eto—unu Esola Ndị Ọgbọ Unu Eme Ihe Na-adịghị Mma

“Ka okwu unu . . . bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.”—KỌL. 4:6.

1, 2. Olee otú ọtụtụ ndị na-eto eto si ele ịgbapụ iche anya, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

IKEKWE ị nụla banyere “nsogbu ndị ọgbọ,” eleghịkwa anya e nweela mgbe ndị na-eto eto ibe gị nyere gị nsogbu. O nwekwara ike ịbụ na e nweela mgbe mmadụ gwara gị mee ihe ị ma na ọ dịghị mma. Olee otú ọ na-adị gị ma ụdị ihe a mee? Christopher, bụ́ onye dị afọ iri na anọ kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m ka ala meghee ka m daba, ọ na-adịkwa m ka m malite ịkpa àgwà ka ụmụ akwụkwọ ibe m ka m wee ghara ịgbapụ iche.”

2 Ndị na-eto eto ibe gị hà na-emegharị gị anya? Ọ bụrụ na ha na-emegharị gị anya, gịnị kpatara ya? Ọ̀ ga-abụ na ị chọghị ịgbapụ iche? Ọ bụghị mgbe niile ka ime otú a dị njọ. Ndị torola eto anaghịkwa achọ ịgbapụ iche n’ebe ndị ibe ha nọ. O nweghị onye na-achọ ka ndị ibe ya jụ ya, ma onye ahụ ọ̀ ka na-eto eto ma ọ bụkwanụ na o toola. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị ụfọdụ nwere ike ịjụ anyị ma ọ bụrụ na anyị anaghị eso ha eme ihe na-ezighị ezi. Otú ahụ ka ndị mmadụ mere Jizọs. N’agbanyeghị nke a, mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nweghị mgbe ọ kwụsịrị ime ihe ziri ezi. Ndị ụfọdụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya, ebe ndị ọzọ ledara ya anya, “ọ dịghịkwa ihe [ha] ji ya kpọrọ.”—Aịza. 53:3.

Gịnị Mere O Ji Esi Ike Mmadụ Ịgbapụ Iche?

3. Olee ihe o jighị dị mma ka ị na-eme ka ndị ọgbọ gị nọ n’ụwa?

3 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị gị ka i mewe ka ndị na-eto eto ibe gị, bụ́ ndị na-eme ihe na-ezighị ezi, ka ha wee ghara ịjụ gị. Nke a adịghị mma. Ndị Kraịst ekwesịghị ịbụ “ụmụ ọhụrụ, ndị ebili mmiri na-enugharị.” (Efe. 4:14) Ndị ọzọ nwere ike ime ka ụmụaka mee ihe ha na-achọghị ime. Ma, ị bụghịzi nwata, ọ fọrọ obere ka ị bụrụ okenye. Ya mere, ọ bụrụ na i kwere na iwu Jehova nyere anyị bụ maka ọdịmma gị, i kwesịrị ime ihe ị ma na ọ dị mma. (Diut. 10:12, 13) Ọ bụrụ na i meghị otú ahụ, ọ pụtara na ọ bụ ndị ọzọ na-agwa gị ihe ị na-eme. N’eziokwu, ọ bụrụ na ị na-agba mbọ ka ị dịrị ka ndị ibe gị nọ n’ụwa, ị ga-adị ka oche nkwagharị.—Gụọ 2 Pita 2:19.

4, 5. (a) Olee ihe Erọn mere mgbe ụmụ Izrel ibe ya gwara ya ka ọ kpụọrọ ha chi, gịnịkwa ka ị mụtara na ya? (b) Olee otú ndị ọgbọ gị nwere ike isi gbalịa ime ka i mee ihe na-adịghị mma?

4 O nwere mgbe Erọn, bụ́ nwanne Mozis, mere ihe na-adịghị mma ndị ọzọ chọrọ ka o mee. O gere ụmụ Izrel ntị mgbe ha gwara ya ka ọ kpụọrọ ha chi. Erọn abụghị onye ụjọ. Tupu ihe a emee, ọ na-eso Mozis agakwuru Fero, bụ́ eze Ijipt. Erọn atụghị Fero ụjọ mgbe ọ na-agwa ya ihe Chineke kwuru. Ma, mgbe ụmụ Izrel ibe ya gwara ya mee ihe na-adịghị mma, o mere ya. Nke a na-egosi na ọ dị mfe ndị ibe mmadụ ime ka o mee ihe na-adịghị mma. Ọ dịịrị Erọn mfe ịgakwuru eze Ijipt gwa ya ihe niile Chineke gwara ya, ma, ọ dịrịghị ya mfe ịjụ ime ihe na-adịghị mma ụmụ Izrel ibe ya gwara ya mee.—Ọpụ. 7:1, 2; 32:1-4.

5 Dị ka ihe a mere Erọn na-egosi, ọ bụghị naanị ndị na-eto eto ma ọ bụ ndị chọrọ ime ihe na-adịghị mma nwere ike ime ihe na-ezighị ezi ndị ibe ha chọrọ. Ndị ji obi ha niile na-achọ ime ihe dị mma nwere ike ime ihe na-adịghị mma nke ndị ibe ha chọrọ ka ha mee. Ụdị ihe a nwekwara ike ime gịnwa. Ndị na-eto eto ibe gị nwere ike inye gị nsogbu site n’ịgwa gị na ọ bụrụ na ị bụ dimkpa gị mee otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, bụ́ nke nwere ike imerụ gị ahụ́. Ha nwekwara ike na-ebo gị ebubo ma ọ bụkwanụ na-eme gị akaje. Nke ọ sọrọ ya ya bụrụ, nsogbu ndị ibe anyị na-enye anyị ka anyị mee ihe ọjọọ adịghị mfe mmeri. Ọ bụrụ na ị chọọ imeri ya, obi ga-ebu ụzọ sie gị ike na ihe ndị i kwere bụ eziokwu.

“Na-anwapụtanụ Ihe Unu Onwe Unu Bụ”

6, 7. (a) Olee ihe mere obi ji kwesị ịka gị n’ihe ndị i kweere, oleekwa ihe i nwere ike ime ka obi wee na-aka gị n’ihe ndị i kweere? (b) Olee ajụjụ ndị i nwere ike ịjụ onwe gị ka i wee ghọta ihe ndị na-edochaghị gị anya?

6 Ọ bụrụ na ị chọrọ imeri nsogbu ndị ọgbọ gị na-enye gị ka i mee ihe ọjọọ, obi kwesịrị ibu ụzọ sie gị ike na ihe i kweere bụ eziokwu. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 13:5.) Nke a ga-eme ka obi kaa gị ime ihe ziri ezi, n’agbanyeghị na i nwere ike ịbụ onye ihere. (2 Tim. 1:7, 8) Ma, ọ bụrụgodị na mmadụ abụghị onye ihere, o nwere ike isiri ya ike ịkwado ihe ọ na-ekwechaghị na ọ bụ eziokwu. Ya mere, mee ka obi sie gịnwa ike na ihe ị mụtara na Baịbụl bụ nnọọ eziokwu. Jiri ihe ndị bụ́ isi a kụziiri gị malite nke a. Dị ka ihe atụ, i kwere na Chineke, ị nụkwala ka ndị mmadụ na-ekwu ihe mere ha ji kwere na ọ dị. Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ihe mere ji kwere na Chineke dị?’ Ihe mere ị ga-eji jụọ onwe gị ajụjụ a abụghị na i nwere obi abụọ, kama, ọ bụ iji mee ka okwukwe gị sikwuo ike. Jụọkwa onwe gị sị, ‘Olee otú m si mara na Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke?’ (2 Tim. 3:16) ‘Olee ihe mere m ji kweta na anyị nọ “n’oge ikpeazụ”?’ (2 Tim. 3:1-5) ‘Gịnị mere m ji kwere na iwu dị iche iche Jehova nyere anyị bụ maka ọdịmma m?’—Aịza. 48:17, 18.

7 O nwere ike ịbụ na ị na-atụ ụjọ ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a n’ihi na ị maghị azịza ha. Nke a yiri onye na-anya ụgbọala nke na-ekweghị ele anya n’ihe e ji ama ma mmanụ ọ̀ dịkwa n’ụgbọala, n’ihi na ọ na-atụ ụjọ na ọ bụrụ na ya elee anya ebe ahụ na ya ga-achọpụta na o nweghị mmanụ dị n’ụgbọala ya! Ọ bụrụ na mmanụ adịghị n’ụgbọala gị, i kwesịrị ịchọpụta ka i wee gbanye ya mmanụ. N’otu aka ahụ, ọ kacha mma ma ị chọpụta ihe ndị na-edochaghị gị anya ka i wee mee ihe banyere ha.—Ọrụ 17:11.

8. Kwuo ihe ndị ga-enye aka mee ka obi sie gị ike na iwu Chineke nyere anyị ka anyị gbaara ịkwa iko ọsọ dị mma.

8 Ka anyị tụlee otu ihe atụ. Baịbụl gwara gị ka ị ‘gbaara ịkwa iko ọsọ.’ Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị mere m ji kwesị idebe iwu a?’ Chee banyere ihe niile mere ndị ọgbọ gị ji eme ihe ọjọọ. Chetakwa ihe dị iche iche mere Baịbụl ji sị na onye na-akwa iko “na-emehie megide ahụ́ nke ya.” (1 Kọr. 6:18) Mgbe i chebachaara ihe ndị a echiche, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe m kwesịrị ime? Ò nwere uru ime omume rụrụ arụ bara?’ Chebakwuoro nke a echiche site n’ịjụ onwe gị, sị, ‘Olee otú ọ ga-adị m ma ọ bụrụ na mụ akwaa iko?’ Ná mmalite, nke a nwere ike ime ka ụfọdụ ndị ọgbọ gị kwee gị n’aka. Ma, olee otú ọ ga-adị gị mgbe ị lọkwutere ndị mụrụ gị ma ọ bụkwanụ mgbe gị na ụmụnna gị nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? Olee otú ọ ga-adị gị mgbe ị chọrọ ikpeku Chineke ekpere? Ị̀ ga-achọ n’ezie ka i mee ihe na-adịghị Chineke mma ka i wee mee ihe ga-amasị ụmụ klas unu?

9, 10. Olee otú obi abụọ ị na-anaghị enwe banyere ihe i kweere ga-esi nyere gị aka inwe obi ike mgbe gị na ndị ọgbọ gị nọ?

9 Ọ bụrụ na ị ka na-eto eto, ị nọ n’oge ‘ike iche echiche’ gị kacha aghọ nkọ. (Gụọ Ndị Rom 12:1, 2.) Jiri oge a chebara ihe a chọrọ gị n’aka iji bụrụ Onyeàmà Jehova echiche nke ọma. Nke a ga-eme ka obi sie gị ike na ihe i kweere bụ eziokwu. Ọ dịrị otú a, obi ga-aka gị ịjụ ime ihe na-adịghị mma ndị ọgbọ gị na-agwa gị mee. Obi ga-adị gị otú ọ na-adị otu nwanna nwaanyị dị afọ iri abụọ na otu, bụ́ onye sịrị: “Mgbe ọ bụla m jụrụ ime ihe ndị ọgbọ m chọrọ, m na-eme ka ndị ọzọ mara onye m bụ. Ihe mere m ji eme nke a bụ na adịm ná mma mụ na Chineke dị m ezigbo mkpa. Ọ bụ ya ka m na-eche, ọ na-ebute ụzọ n’ihe ndị m chọrọ ime, ọ na-achịkwa ndụ m nakwa omume m.”

10 N’eziokwu, ị ghaghị ịgbasi mbọ ike ka i wee mee ihe ị ma na o ziri ezi. (Luk 13:24) I nwere ike iche ma mbọ a ị na-agba ò kwesịkwara ya. Ma, cheta na ọ bụrụ na ọ na-eme gị obi abụọ ime ihe ị ma na o ziri ezi ma ọ bụkwanụ na ime ya na-eme gị ihere, ndị ọzọ ga-achọpụta nke a, ha nwekwara ike inyekwu gị nsogbu ka i mee ihe na-ezighị ezi. Ma, ọ bụrụ na ị na-agwa ha okwu na-egosi na o nweghị ihe ga-eme ka ị hapụ ime ihe ziri ezi, ọ ga-atụ gị n’anya otú ha ga-esi hapụ gị ozugbo.—Tụlee Luk 4:12, 13.

“Na-atụgharị Uche Iji Zaa Okwu”

11. Olee uru ọ ga-abara mmadụ ma o buru ụzọ mara ihe ọ ga-eme tupu ndị ọgbọ ya amalite inye ya nsogbu ka o soro ha mee ihe ọjọọ?

11 Ihe ọzọ dị mkpa ị ga-eme ka i wee merie nsogbu ndị ọgbọ gị na-enye gị bụ ịkwadebe maka ha. (Gụọ Ilu 15:28.) Nke a pụtara ibu ụzọ chee echiche banyere ihe ha nwere ike ime. Mgbe ụfọdụ, i nwere ike izere nsogbu ha n’ihi na i bula ụzọ mara ihe ị ga-eme ma ha bịa. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i lepụ anya wee hụ ụmụ akwụkwọ unu ka ha nọ na-aṅụ sịga, chee echiche ihe ha nwere ike ime. Hà nwere ike inye gị sịga? Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ha enye gị? Ilu 22:3 sịrị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” I nwere ike izere nsogbu ahụ ma ọ bụrụ na i si ụzọ ọzọ gawa ebe ị na-aga. Nke a abụghị n’ihi na ị na-atụ ha ụjọ; kama, i ji amamihe mee ihe.

12. Olee ihe i nwere ike ime mgbe onye na-eto eto ibe gị na-enye gị nsogbu ka i mee ihe na-adịghị mma?

12 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ihe merenụ abụghị ihe ị ga-esiri ụzọ ọzọ? Ka e were ya na o juru onye na-eto eto ibe gị anya ya ajụọ gị, sị, “Ị̀ na-ekwu na gị na mmadụ enwetụbeghị mmekọahụ?” I kwesịrị ime ihe ahụ dị ná Ndị Kọlọsi 4:6. Ọ sịrị: “Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.” Amaokwu a na-egosi na ọ bụ ihe mere n’oge ahụ ga-enyere gị aka ịma otú ị ga-esi aza ajụjụ ahụ. O nwere ike ọ gaghị adị mkpa ịga gụwara ya Baịbụl. Ikekwe, azịza dị nkenke i ji obi ike zaa ga-ezu. Dị ka ihe atụ, ị chọọ ịza onye ahụ jụrụ gị ma ọ̀ bụ na e nwetụbeghị onye gị na ya nwere mmekọahụ, naanị ihe i nwere ike ịsị ya bụ, “Ee,” ma ọ bụ, “Ọ gbasaghị gị.”

13. Olee ihe mere amamihe ji dị mkpa mgbe anyị chọrọ ịza ndị na-eto eto ibe anyị ndị na-ekwujọ anyị okwu?

13 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ naghị ekwu ọtụtụ okwu ma ọ hụ na o nweghị ezigbo ihe ga-esi n’ikwuru ihe ahụ gawa pụta. N’eziokwu, Jizọs atụpụrụghị Herọd ọnụ mgbe ọ jụrụ ya ajụjụ. (Luk 23:8, 9) Ọ na-adịkarị mma ma ị gbachie onye jụrụ gị ajụjụ mkparị nkịtị. (Ilu 26:4; Ekli. 3:1, 7) Ma, ọ bụrụgodị na mmadụ kwujọrọ gị ná mmalite, i nwere ike ịchọpụta ma ò juru ya anya n’eziokwu na ị naghị akwa iko, ya achọọkwa ịmata ihe mere i ji dị iche. (1 Pita 4:4) Ọ bụrụ otú ahụ, ọ gaghị adị njọ ma i medaa obi jiri Baịbụl gwa ya ihe mere i ji dị iche. Ọ bụrụ na i chee na i kwesịrị ime otú ahụ, kata obi mee ya. Dị “njikere mgbe niile ịzara ọnụ” gị.—1 Pita 3:15.

14. Mgbe ụfọdụ, olee otú i nwere ike isi jiri akọ nye onye ọgbọ gị nsogbu ọ chọrọ inye gị?

14 Mgbe ụfọdụ, i nwere ike inye ha nsogbu ahụ ha chọrọ inye gị. Ma, i kwesịrị iji akọ mee nke a. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwa akwụkwọ unu ejiri mkparị chọọ ka ịnara ya sịga, i nwere ike ịsị, “Mba, i meela.” I nwekwara ike ịsị, “Echere m na ị ma ihe, gị ana-aṅụ sịga!” Ị̀ hụla otú i si nye ya nsogbu ahụ ọ chọrọ inye gị? Kama ịgwawa ya ihe mere na ị naghị aṅụ sịga, ihe a ị gwara ya nwere ike ime ka o chebara onwe ya echiche. *

15. Olee mgbe i kwesịrị isi n’ebe ndị ọgbọ gị nọ, bụ́ ndị chọrọ ka i mee ihe ọjọọ, pụọ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

15 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ọgbọ gị aka na-enye gị nsogbu? Ọ ga-akacha mma ma ị pụọ ebe ahụ. I nwere ike itinye aka n’ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na gị na ha anọrọ ebe ahụ. Ya mere, hapụrụ ha ebe ahụ. Nke a apụtaghị na ha emeriela gị. A sị ka e kwuwe, i mere ka dimkpa. I meghị ihe masịrị ha, kama, i mere ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.

Mee ‘Atụmatụ Na-eweta Uru’

16. Olee otú ụfọdụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst nwere ike isi mee ka ndị na-eto eto ibe ha tinye aka n’ihe ọjọọ?

16 Mgbe ụfọdụ, ndị ọgbọ gị sị na ha bụ ndị ohu Jehova nwere ike ime ihe ga-eme ka i tinye aka n’ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ị gaa nnọkọ oriri ndị dị otú a haziri wee chọpụta na ọ dịghị onye torola eto nọ ebe ahụ iji mara otú ihe si na-aga? Ma ọ bụkwanụ, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na mmanya na-aba n’anya hiri nne ebe ahụ, ndị ọzọ nọ ebe ahụ ana-aṅụbigakwa ya okè? Ọtụtụ ihe nwere ike ime, bụ́ ndị ga-achọ ka i mee ihe akọnuche gị e ji Baịbụl zụọ gwara gị. Otu nwanna nwaanyị dị afọ iri na isii, kwuru, sị: “Mụ na nwanne m nwaanyị si n’ebe anyị nọ na-ekiri fim, nke a na-ekwu okwu rụrụ arụ na ya, pụọ. Ndị anyị na ha gara ebe ahụ gbachiri nkịtị na-ekiri ihe ha na-ekiri. Ndị mụrụ anyị jara anyị mma maka nke a. Ma, ndị ahụ anyị na ha so gaa ebe ahụ wesoro anyị iwe n’ihi na ha sị na otú anyị si hapụ ha ebe ahụ mere ka ha yie ndị ọjọọ.”

17. Mgbe ị na-aga nnọkọ oriri, gịnị ka i kwesịrị iburu n’uche ka i wee rube isi n’iwu Chineke?

17 Dị ka ihe a kọrọ na paragraf nke iri na isii na-egosi, ime ihe ziri ezi akọnuche gị e ji Baịbụl zụọ na-agwa gị nwere ike ime ka ndị ọzọ na-eweso gị iwe. N’agbanyeghị nke ahụ, na-eme ihe ọ bụla ị ma ziri ezi. Na-adị njikere mgbe niile. Mgbe ọ bụla ị na-aga nnọkọ oriri, buru n’uche otú ị ga-esi laa ma ọ bụrụ na ihe agaghị otú ị tụrụ anya ya. Ụfọdụ ndị na-eto eto na ndị mụrụ ha na-ekwekọrịta na ọ bụrụ na ụmụ ha akpọọ ha na fon ozugbo ụdị ihe a mewere, na ha ga-abịa buru ha. (Ọma 26:4, 5) Ụdị ‘atụmatụ a na-eweta uru.’—Ilu 21:5.

‘Ṅụrịa Ọṅụ Mgbe Ị Bụ Okorobịa’

18, 19. (a) Olee ihe na-egosi na Jehova chọrọ ka ị na-enwe obi ụtọ? (b) Olee otú Chineke si ele ndị na-emeri nsogbu ndị ọgbọ ha na-enye ha anya?

18 Jehova kere gị otú ndụ ga na-atọ gị ụtọ, ọ chọkwara ka ị na-enwe obi ụtọ. (Gụọ Ekliziastis 11:9.) Cheta na kama inwe ezigbo obi ụtọ ka gị, ihe ọtụtụ ndị ọgbọ gị na-eme bụ ‘ịnụ ụtọ mmehie ruo nwa oge.’ (Hib. 11:25) Ezi Chineke chọrọ ka ị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị ka ị na-anụ ụtọ mmehie ruo nwa oge. Ya mere, mgbe ọ bụla ime ihe na-adịghị mma n’anya Chineke batara gị n’obi, cheta na ihe ọ bụla Jehova chọrọ ka i mee bụ maka ọdịmma gị.

19 Marakwa na ọ bụrụgodị na ị na-eme ihe dị ndị ọgbọ gị mma ugbu a, ọtụtụ n’ime ha nwere ike ichefu gị, chefuokwa aha gị n’ime afọ ole na ole na-abịa. Ma, Jehova na-ahụ gị mgbe ị jụrụ ime ihe ọjọọ ndị ọgbọ gị chọrọ ka i mee, ọ gaghịkwa echefu gị ma ọ bụkwanụ chefuo otú i si na-erubere ya isi. Ọ ‘ga-emeghe ọnụ ụzọ mmiri nke eluigwe wee wụsa gị ngọzi ruo mgbe ọ na-adịghị ihe ga-akọ gị.’ (Mal. 3:10) Ihe ọzọ bụ na ọ ga-enye gị mmụọ nsọ ka o nyere gị aka imezi ebe ị na-anaghị eme nke ọma. N’eziokwu, Jehova ga-enyere gị aka ka i wee merie nsogbu ndị ọgbọ gị na-enye gị ka i mee ihe na-adịghị mma!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Gụọ chaatị bụ́ “Ihe M Ga-eme Ma Ndị Ọgbọ M Nyewe M Nsogbu,” nke dị n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, peeji nke 132 na 133.

Ì Chetara?

• Olee ihe mere o ji esi ike mmadụ ịjụ ime ihe ọjọọ ndị ọgbọ ya na-agwa ya mee?

• Olee otú mmadụ inwe obi ike na ihe o kweere bụ eziokwu ga-esi nyere ya aka imeri nsogbu ndị ọgbọ ya na-enye ya?

• Olee ihe ị ga-eme ka i wee dị njikere imeri nsogbu ndị ọgbọ gị na-enye gị?

• Olee otú i si mara na obi dị Jehova ụtọ na ị na-erubere ya isi?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 8]

Olee ihe mere Erọn ji kwere ịkpụrụ ụmụ Izrel chi nwa ehi?

[Foto dị na peeji nke 10]

Dị njikere—buru ụzọ mara ihe ị ga-ekwu