Ì Chetara?
Ì Chetara?
Ọ̀ tọrọ gị ụtọ ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Legodị ma ị ga-azali ajụjụ ndị a na-esonụ:
• Okpukpe ndị na-akụzi ozizi akara aka si n’aka onye?
Okpukpe Calvin kụziri ozizi akara aka. Ozizi Onye Ndozigharị bụ́ Jean Cauvin (ma ọ bụ John Calvin) ka na-ewu ewu na chọọchị Reformed, Presbyterian, Congregational, na Puritan.—9/1, peeji nke 18-21.
• Olee ebe ka Ken si nweta nwunye ya?
Nwunye Ken aghaghị ịbụ nwa Iv ma ọ bụ nwa nwa Iv, bụ́ onye mụrụ “ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.” (Jen. 5:4)—9/1, peeji nke 25.
• Olee mmụọ ozi duru ụmụ Izrel mgbe ha si n’Ijipt na-apụta? (Ọpụ. 23:20, 21)
O ziri ezi ikwu na mmụọ ozi a, bụ́ onye ‘aha Jehova dị n’ime ya,’ bụ Ọkpara Chineke, onye mechara ghọọ Jizọs.—9/15, peeji nke 21.
• Olee ihe mere akwụkwọ Ndị Kọrịnt nke Mbụ ji kwuo banyere anụ e ji chụọrọ arụsị àjà?
E ji anụmanụ achụ àjà n’ụlọ arụsị ndị Gris nakwa nke ndị Rom, ma, e nwere ike ire anụ ndị e rifọrọ n’ememme arụsị n’ọdụ anụ. Ndị Kraịst anaghị eso ha ekpere arụsị; ma, ha ekwesịghị ilewe anụ e si ebe ahụ bute n’ahịa anya ka ihe rụrụ arụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Na-erinụ ihe niile a na-ere n’ọdụ anụ, n’ajụghị ase ọ bụla n’ihi akọ na uche unu; n’ihi na ‘ọ bụ Jehova nwe ụwa na ihe jupụtara n’ime ya.’” (1 Kọr. 10:25, 26)—10/1, peeji nke 12.
• A bịa n’ife Chineke, olee ihe ụfọdụ Chineke na-achọghị ka anyị na-akụdo aka?
‘O siri ezigbo ike. Achọghị m ịga. Anaghị m enwe ohere. Erughị m eru. E nwere onye kpasuru m iwe.’ Ihe ndị a abụghị ihe mmadụ kwesịrị ịkụdo aka wee ghara ime ihe Chineke kwuru.—10/15, peeji nke 12-15.
• Olee ụfọdụ n’ime ihe i nwere ike ime ka ọmụmụ ihe wee na-ewuli gị na ndị ọzọ elu?
Kwadebe tupu ị gaa. Na-agachi ya anya. Na-aga n’oge. Jiri akwụkwọ ndị a ga-amụ gaa. Ekwela ka ihe ọ bụla dọpụ uche gị. Na-aza ajụjụ. Mee ka azịza gị dị nkenke. Na-eme ihe omume e nyere gị. Jaa ndị mere ihe omume ma ọ bụ ndị zara ajụjụ mma. Kelee ụmụnna tupu a malite ọmụmụ ihe nakwa mgbe a gbasara.—10/15, peeji nke 22.
• Olee ebe a kọrọ akụkọ n’ime Baịbụl banyere otu nwatakịrị nwaanyị nke nyeere onye na-arịa ọrịa ekpenta, nke gụnyere ihe a na-akpọ ọrịa Hansen taa, aka?
Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ isi ise kwuru banyere otu nwatakịrị nwaanyị onye Izrel, bụ́ onye bi n’ụlọ onyeisi agha ndị Siria aha ya bụ Neaman. Nwatakịrị nwaanyị a tụụrụ Neaman aro ka ọ gaa hụ Ịlaịsha onye amụma ka e wee gwọọ ya ekpenta na-arịa ya.—11/1, peeji nke 22.
• Olee ihe anyị ga-amụta n’anya Erọn sọrọ wee mee ihe na-adịghị mma ndị Izrel ibe ya sị ya mee?
Mgbe Mozis na-anọghị ya, ụmụ Izrel gwara Erọn ka ọ kpụọrọ ha chi. O mere ihe ha gwara ya. Nke a na-egosi na ọ bụghị naanị ndị na-eto eto ka ndị ibe ha nwere ike ime ka ha mee ihe na-adịghị mma. O nwere ike ime ndị torola eto, bụ́ ndị chọrọ ime ihe ziri ezi. Anyị ekwesịghị ikwe ka ndị ọgbọ anyị mee ka anyị mee ihe na-adịghị mma.—11/15, peeji nke 8.
• Olee nke bụ́ eziokwu, oleekwa nke bụ́ ụgha?
Setan bụ onye dị adị: eziokwu. (2 Kọr. 11:14) Mmadụ niile na-aga n’ala mmụọ ma ha nwụọ: ụgha. (Ekli. 9:5) Ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi nwere mmasị n’ebe anyị nọ: eziokwu. (Ọma 34:7) Jizọs na Chineke hà: ụgha. (1 Kọr. 11:3)—12/1, peeji nke 8-9.