Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Naghị Etofe Ife Chineke Etofe

A Naghị Etofe Ife Chineke Etofe

A Naghị Etofe Ife Chineke Etofe

Na Melaga, bụ́ obodo dị n’ebe ndịda Spen, e mere otu nwaanyị aha ya bụ Ana na nwa ya nwaanyị aha ya bụkwa Ana, baptizim na Disemba 19, 2009. Ha so na puku mmadụ abụọ na narị mmadụ atọ na iri ise na abụọ e mere baptizim na Spen n’afọ 2009. Ma, e nwere ihe pụrụ iche banyere nwaanyị a na nwa ya. Ọ bụ afọ ndụ ha. Nwaanyị a dị otu narị afọ na afọ asaa ebe nwa ya nwaanyị dị iri afọ asatọ na atọ!

Olee otú ha si ruo eruo ịbụ ndị e mere baptizim, iji gosi na ha ararala onwe ha nye Jehova? Tupu afọ 1975, otu Onyeàmà bụ́ onye agbata obi ha na-akpọkarị Ana, bụ́ nwa nwaanyị ahụ, ka ọ bịa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ a na-anọ n’ụlọ ya enwe. Ana na-aga mgbe ụfọdụ. Ma, ọrụ ya ekweghị ya nwee ọganihu.

Mgbe ihe dị ka afọ iri gara, ụfọdụ n’ime ụmụ Ana malitere ịmụ Baịbụl, mechaakwa ghọọ Ndịàmà Jehova. Mari Carmen, bụ́ otu onye n’ime ha, mechara mee ka mama ya nweghachi mmasị n’eziokwu Baịbụl, meekwa ka o kweta ka a mụwara ya Baịbụl. Nne nne Mari Carmen, ya bụ, Ana nke okenye, nwewekwara mmasị na Baịbụl. Ka oge na-aga, e mere mmadụ iri n’ime ndị ezinụlọ a baptizim.

N’ụbọchị e mere Ana abụọ ahụ baptizim, ya bụ, nne na nwa, ha abụọ nwere ọṅụ dị ukwu. Ana nke ahụ dị otu narị afọ na afọ asaa kwuru, sị: “Jehova emeerela m ihe ọma dị ukwuu wee kwe ka m mara ya.” Nwa ya nwaanyị kwuru, sị: “Tupu Paradaịs abịa, m chọrọ ijere Jehova ozi, na-eme uche ya, na-ekwusakwa ozi ọma ókè ike hà m.”

Ihe kacha enye mmadụ abụọ a di ha nwụrụla ọṅụ bụ ịga ọmụmụ ihe. Otu n’ime ndị okenye nọ n’ọgbakọ ha kwuru, sị: “Ha na-abịa ọmụmụ ihe niile. Ha na-akwadebekwa mgbe niile ịza ajụjụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche.”

Otú ha si kwesị ntụkwasị obi na-eme ka anyị cheta otu nwaanyị aha ya bụkwa Ana n’oge ochie, bụ́ onye di ya nwụrụ anwụ, “onye na-adịghị akọ ụkọ n’ụlọ nsọ, ọ na-eje ozi dị nsọ abalị na ehihie, na-ebu ọnụ, na-arịọsikwa arịrịọ ike.” Nke a mere ka o nwee ike ịhụ Jizọs mgbe a mụrụ ya. (Luk 2:36-38) Mgbe Ana dị iri afọ asatọ na anọ, ọ ka na-ejere Jehova ozi. Otú ahụ ka ọ dịkwa Ana abụọ a anyị kwuru okwu ha ebe a.

Ì nwere ndị ikwu nwere mmasị ige ntị n’ihe Baịbụl kwuru? Ma ọ bụkwanụ, ò nweela mgbe ị gara ozi ọma hụ onye agadi nwere mmasị ige gị ntị? Ha nwere ike ime ka Ana abụọ a anyị kọrọ banyere ha, n’ihi na a naghị etofe ife ezi Chineke bụ́ Jehova etofe.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 25]

“Jehova emeerela m ihe ọma dị ukwuu”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 25]

‘Tupu Paradaịs abịa, m chọrọ ijere Jehova ozi ókè ike hà m’