Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ahụla M Na Eziokwu Dị Na Baịbụl Na-akpa Ike

Ahụla M Na Eziokwu Dị Na Baịbụl Na-akpa Ike

Ahụla M Na Eziokwu Dị Na Baịbụl Na-akpa Ike

Dị ka Vito Fraese si kọọ

E NWERE ike ị nụtụbeghị banyere Trentinara. Ọ bụ obere obodo dị n’ebe ndịda Nepụls nke dị n’Ịtali. Ọ bụ ebe ahụ ka a mụrụ papa m na mama m nakwa Angelo, bụ́ nwanne m nwoke nke tọrọ m. Mgbe a mụchara Angelo, papa m na mama m kwagara Amerịka wee biri na Rọchesta, Niu Yọk, bụ́ ebe a nọ mụọ m n’afọ 1926. Mgbe mbụ papa m hụrụ Ndị Mmụta Baịbụl, bụ́ ihe a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, bụ n’afọ 1922. Ọ dịghị anya ya na mama m aghọọ Ndị Mmụta Baịbụl.

Papa m dị nwayọọ, na-echebakwara ihe echiche, ma, ikpe na-ezighị ezi na-ewe ya iwe. Ozizi ụgha ndị ụkọchukwu na-ezi ndị mmadụ na-enye ya nsogbu n’obi, n’ihi ya, ọ na-eji ohere ọ bụla ọ hụrụ agwa ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl. Mgbe ọ lara ezumike nká, o malitere ozi oge niile, ọ rụgidekwara ya ruo mgbe ọrịa na oké oyi na-atụ ebe o bi mere ka ọ kwụsị mgbe ọ dị iri afọ asaa na anọ. Mgbe ahụ ọ kwụsịrị, ọ ka na-enye ihe dị ka awa iri anọ ruo awa iri isii kwa ọnwa, ọbụna mgbe ọ karịrịla iri afọ itoolu. Otú papa m si eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma ruru m n’obi. N’agbanyeghị na ọ bụ onye egwuregwu, ọ naghị eji ihe ndị metụtara ofufe Jehova egwu egwu. Ọ na-ekwukarị, sị, “E kwesịghị iji eziokwu dị na Baịbụl egwu egwu.”

Mama anyị na papa anyị gbasiri mbọ ike kụziere anyị bụ́ ụmụ ha dị mmadụ ise Okwu Chineke. E mere m baptizim n’Ọgọst 23, 1943, amalitekwara m ịsụ ụzọ na Jun 1944. Nwanne m nwaanyị bụ́ Carmela na enyi ya nwaanyị bụ́ Fern na-asụ ụzọ na Jeniva dị na Niu Yọk. Ọ dịghị anya mụ achọpụta na ọ bụ Fern bụ nwaanyị mụ na ya ga-ebi ná ndụ m niile. N’ihi ya, anyị gbara akwụkwọ n’Ọgọst 1946.

Ije Ozi Ala Ọzọ

Mgbe anyị lụchara, a gwara anyị ka anyị gaa bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na Jeniva, e mechakwara gwa anyị ka anyị gaa Nọwich. Obodo abụọ a dịcha na Niu Yọk. N’Ọgọst 1948, anyị nwere ihe ùgwù nke ịgụ akwụkwọ na klas nke iri na abụọ nke ụlọ akwụkwọ Gilied. Mgbe anyị gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, e zigara anyị na di na nwunye ọzọ, bụ́kwa ndị ozi ala ọzọ, Nepụls nke dị n’Ịtali. Aha ha bụ Carl na Joanne Ridgeway. A ka lụchara agha n’oge ahụ. Inweta ụlọ anyị ga-ebi siiri anyị ike, n’ihi ya, anyị biri n’obere ọnụ ụlọ abụọ ruo ọnwa ole na ole.

Papa m na mama m na-asụ asụsụ ndị Nepụls, n’ihi ya, ndị mmadụ na-aghọta ihe m na-ekwu mgbe m na-asụ Ịtalian, n’agbanyeghị na m na-eji ire ndị Amerịka asụ ya. Ịsụ asụsụ ahụ siiri nwunye m bụ́ Fern ike. Ma, o mechara na-asụ ya nke ọma karịa m.

Ná mmalite, ọ bụ naanị otu ezinụlọ dị mmadụ anọ nwere mmasị n’ozi ọma anyị na-ezi na Nepụls. Ha na-ere sịga nke bụ́ ahịa iwu n’ebe ahụ. Kwa ụbọchị, ọdịdị Teresa, bụ́ otu onye n’ime ndị ezinụlọ ahụ, na-agbanwe. N’ụtụtụ, sịga ọ fọjuru n’akpa ndị dị na sket ya na-eme ka o buo ibu. Ma, n’uhuruchi, ọ na-adị ka ogwu azụ̀. Eziokwu dị na Baịbụl gbanwere ezinụlọ a kpamkpam. Mmadụ iri na isii n’ime ha mechara ghọọ Ndịàmà Jehova. Ndịàmà Jehova e nwere na Nepụls ugbu a fọrọ obere ka ha ruo puku mmadụ atọ na narị asaa.

A Malite Imegide Anyị

Mgbe anyị nọrọ naanị ọnwa itoolu na Nepụls, ndị ọchịchị chụpụrụ anyị anọ n’obodo ahụ. Anyị gara nọọ ihe dị ka otu ọnwa na Swizaland, ma laghachi Ịtali mgbe e nyere anyị akwụkwọ ikike ka anyị gaa leta ebe ahụ. E zigara mụ na nwunye m Turin. Mgbe anyị rutere, anyị nwetara ụlọ n’ụlọ otu nwaanyị, anyị na-asa ahụ́ n’ụlọ ịsa ahụ́ ya, na-esikwa nri n’usekwu ya. Mgbe Carl na Joanne Ridgeway rutere Turin, anyị na ha gara biri otu ebe. Ka oge na-aga, mmadụ ise bụ́ ndị ozi ala ọzọ na ndị nwunye ha biri n’ebe ahụ.

Tupu afọ 1955, bụ́ mgbe ndị ọchịchị chụpụrụ anyị na Turin, anyị rụrụ ọrụ mere ka e nwee ọgbakọ anọ n’ebe ahụ ka oge na-aga. E nweziri ụmụnna nwoke ruru eru ilekọta ọgbakọ ndị ahụ. Ndị ọchịchị gwara anyị, sị, “Anyị ma na ozugbo unu bụ́ ndị Amerịka lara, ihe niile unu rụrụ n’obodo a ga-efu ọhịa.” Ma, mmụba e nwere n’obodo ahụ gosiri na ọ bụ Chineke na-eme ka ọrụ anyị na-aga nke ọma. Taa, e nwere ihe karịrị puku Ndịàmà Jehova anọ na narị isii, nakwa iri ọgbakọ ise na isii na Turin.

Flọrens Bụ Obodo Mara Mma

Ebe ọzọ e zigara anyị bụ Flọrens. Anyị na-anụkarị banyere obodo a n’ihi na ọ bụ ebe ahụ ka nwanne m nwaanyị bụ́ Carmela na di ya bụ́ Merlin Hartzler jere ozi ala ọzọ. Ma, chegodị ihe ọ dị ka ya ibi ebe ahụ. Ebe ndị dị ka Piaza dela Signorịa, Pọnte Vechio, Pịazale Maịkelanjelo, na Palazo Piti, mere ka obodo ahụ maa mma pụrụ iche! Otú ụfọdụ ndị bi na Flọrens si nabata ozi ọma anyị ziri ha nyere anyị obi ụtọ.

E nwere otu ezinụlọ anyị mụụrụ Baịbụl, e mee papa ha na mama ha baptizim. Papa ha na-aṅụbu sịga. N’afọ 1973, Ụlọ Nche kwuru na ịṅụ sịga adịghị mma, ọ gbakwara ndị na-aṅụ sịga ume ka ha kwụsị ịṅụ ya. Ụmụ ya ndị toro eto gwara ya ka ọ kwụsị. O kwere ha nkwa na ya ga-akwụsị ya, ma ọ kwụsịghị ya. N’otu anyasị, tupu nwunye ya ekpee ekpere ha na-ekpe ma ha chọọ ịlakpu, ọ gwara ụmụ ejima ya, ndị dị afọ itoolu, ka ha lakpuo. Nke a mechara wute ya ya abakwuru ha n’ime ụlọ. Tupu ya erute, ha ekpeela ekpere nke ha. Ọ jụrụ ha sị: “Gịnị ka unu kpere n’ekpere?” Ha zara ya na ha kpere, sị: “Jehova, biko nyere papa anyị aka ka ọ kwụsị ịṅụ sịga.” Nwaanyị ahụ kpọrọ di ya òkù, sị: “Bịa nụrụ ihe ụmụ gị kpere n’ekpere.” Mgbe ọ nụchara ya, ọ malitere ibe ákwá ma kwuo, sị, “Enweghị m ike ịṅụ sịga ọzọ!” O mere ihe a o kwuru, ihe karịrị mmadụ iri na ise n’ezinụlọ ahụ bụ Ndịàmà Jehova ugbu a.

Ije Ozi n’Afrịka

N’afọ 1959, a gwara anyị na ndị ozi ala ọzọ abụọ ọzọ, ya bụ, Arturo Leveris na nwanne m nwoke bụ́ Angelo, ka anyị gaa jewe ozi na Mọgadishu, Sọmalia. Ọchịchị obodo ahụ na-agba aghara mgbe anyị rutere. Òtù Mba Ụwa nyere ndị ọchịchị Ịtali iwu ka ha hapụ ndị Sọmalia ka ha chịwa onwe ha, ma ha achọghị ime otú ahụ. Ụfọdụ ndị Ịtali anyị na-amụrụ Baịbụl siri n’obodo ahụ pụọ, ọ dịghịkwa mfe ihiwe ọgbakọ n’ebe ahụ.

N’oge ahụ, onye nlekọta zoonu tụrụ arọ ka m nyewere ya aka. N’ihi ya, anyị malitere ileta mba ndị dị Sọmalia nso. Ụfọdụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl nwere ọganihu, ma, ha si n’obodo ha gbapụ n’ihi mkpagbu. Ndị ọzọ agbapụghị n’agbanyeghị na ha na-ata ahụhụ dị ukwuu. * Anya mmiri ka na-agba anyị ma anyị cheta otú ha si hụ Jehova n’anya nakwa ahụhụ ha tara iji nọgide na-ejere ya ozi.

Ụdị okpomọkụ e nwere na Sọmalia na Eritria enweghị atụ. Ụfọdụ nri ndị obodo ahụ na-eri, bụ́ ndị na-afụ ose, na-eme ka ahụ́ na-ekpokwu anyị ọkụ. Ụbọchị mbụ anyị riri otu n’ime nri ndị a n’ụlọ onye anyị na-amụrụ Baịbụl, nwunye m ji egwuregwu kwuo na ose dị ná nri ahụ mere ka ntị nwuru ya ọkụ!

Ọ bụ naanị anyị nọzi mgbe e zigara Angelo na Arturo ebe ọzọ. Ọ dịrịghị anyị mfe n’ihi na anyị enweghịzi ndị ga na-agba anyị ume. Ma, nke a mere ka anyị bịarukwuo Jehova nso, meekwa ka anyị tụkwasịkwuo ya obi. Ịga leta mba ndị a machibidoro ọrụ anyị iwu gbara anyị ume n’ezie.

Ihe siiri anyị nnọọ ike na Sọmalia. Anyị enweghị friji, n’ihi ya, anyị na-azụrụ naanị nri ga-ezuru anyị n’ụbọchị, ma azụ̀ ndụ ma mkpụrụ osisi, dị ka mango, ọkwụrụ bekee, grep, akị bekee, ma ọ bụ unere. Anyị na ụmụ ahụhụ ndị na-efe efe na-agbakarị mgba. Mgbe ụfọdụ, ha na-ebekwasị anyị n’olu ma anyị na-amụrụ mmadụ Baịbụl. Ma ọ dị mma na anyị nwere ọgba tum tum, nke a na-eme ka anyị ghara ịga ije ọtụtụ awa n’anwụ ahụ na-afụ ụfụ n’ahụ́.

Anyị Alaghachi Ịtali

Ndị enyi anyị nyeere anyị aka anyị enweta otu ụgbọ mmiri na-ebu unere, bụ́ nke bugara anyị Ịtali, ka anyị wee nwee ike ịga mgbakọ mba niile e nwere na Turin n’afọ 1961. A gwara anyị na a ga-eziga anyị ebe ọzọ. Na Septemba 1962, anyị laghachiri Ịtali, bụ́ ebe m ghọrọ onye nlekọta sekit. Anyị zụtara obere ụgbọala, bụ́ nke anyị ji na-aga eleta ọgbakọ ndị dị na sekit abụọ anyị lekọtara ruo afọ ise.

Mgbe anyị pụrụ n’Afrịka, bụ́ ebe na-ekpo ọkụ, anyị gafere ebe na-ajụ ezigbo oyi. Mgbe anyị gara ileta otu ọgbakọ dị n’akụkụ ugwu, anyị rahụrụ n’elu ahịhịa e busara n’otu ụlọ na-enweghị ihe na-ekpo ụlọ ọkụ. Ezigbo oyi na-atụ ebe ahụ nke mere ka anyị yiri kootu anyị hie ụra. N’abalị ahụ, oyi tụgburu nnekwu ọkụkọ anọ na nkịta abụọ n’ebe ahụ!

M mechakwara ghọọ onye nlekọta distrikti. N’oge ahụ, ọ bụ anyị na-elekọta Ịtali niile. Anyị gara leta ebe ụfọdụ, dị ka Kalebria na Sisili, ọtụtụ ugboro. Anyị na-agba ndị na-eto eto ume ka ha na Jehova dị ná mma, nakwa ka ha rụsie ọrụ ike ka ha wee ruo eruo ịbụ ndị okenye, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ma ọ bụkwanụ jee ozi Betel.

Anyị amụtala ọtụtụ ihe n’aka ndị enyi anyị ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi. Obi na-adị anyị ụtọ ma anyị cheta otú ha si nọgide na-ejere Jehova ozi, otú ha si na-emesapụ aka, otú ha si hụ ụmụnna ha n’anya, nakwa otú ha si ewepụta onwe ha na-eje ozi n’agbanyeghị ihe isi ike ndị ha nwere. Anyị agaala gee okwu agbamakwụkwọ ndị ụmụnna iwu nyere ikike nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kwuo, bụ́ ihe e chere na o nweghị ike ime eme n’afọ ndị gara aga. Ọgbakọ anaghịzi anọ n’usekwu ụmụnna enwe ọmụmụ ihe ma ọ bụ nọrọ ọdụ n’osisi dị ka ha na-emebu na Turin. Kama nke ahụ, ọtụtụ ọgbakọ nweziri ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze, bụ́ ndị na-ewetara Jehova otuto. Kama ịnọ n’ebe na-adịghị mma a na-anọ eme ihe nkiri enwe mgbakọ, anyị na-anọzi ná nnukwu Ụlọ Mgbakọ. Anyị na-enwe obi ụtọ na ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa e nwere n’Ịtali akarịala narị puku abụọ na iri puku anọ na puku atọ. A dị naanị narị ndị nkwusa anọ na iri itoolu mgbe anyị rutere Ịtali.

Anyị Họọrọ Ihe Ndị Ka Mma

E nwegasịrị oge ihe siiri anyị ike, oge agụụ ịla ụlọ gụrụ anyị nakwa oge anyị rịara ọrịa. Agụụ ịla ụlọ na-agụ nwunye m mgbe ọ bụla ọ hụrụ oké osimiri. A wakwaala ya ahụ́ ugboro atọ, bụ́ ndị chọchara ịta isi ya. O nwere oge ọ na-aga ịmụrụ mmadụ Baịbụl, otu onye amaa ya fọk e ji akọ ugbo. Nke a kpọgara ya ụlọ ọgwụ.

N’agbanyeghị na o nwere mgbe ọ na-adị anyị ka ọ̀ bụ anyị kwụsị ọrụ anyị, ‘anyị echerela Jehova,’ dị ka Abụ Ákwá 3:24 kwuru. Ọ bụ Chineke nke nkasi obi. Otu oge obi na-adịghị anyị mma, Nwanna Nathan Knorr detaara nwunye m akwụkwọ ozi gbara ya ume. N’akwụkwọ ozi ahụ, o dere na ya ma na ụmụ nwaanyị ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ Pensụlvenia dị ike ọrụ n’ihi na ebe a mụrụ yanwa dị nso na Betlehem, Pensụlvenịa, bụ́ ebe Fern malitere ịsụ ụzọ. Ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu. Kemgbe ọtụtụ afọ, e nweela ọtụtụ ihe gbara anyị ume nakwa ọtụtụ mmadụ ndị gbara anyị ume.

N’agbanyeghị na anyị na-enwe ọtụtụ ihe isi ike, anyị na-agba mbọ na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma. Nwunye m ji ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere tụnyere otu mmanya ndị Ịtali na-egbuke egbuke ma na-atọ ụtọ. Ọ sịrị: “Anyị agaghị ekwe ka mmụọ anyị kwụsị igbuke egbuke.” Mgbe anyị rụrụ ọrụ nlekọta sekit na ọrụ nlekọta distrikti ruo ihe karịrị iri afọ anọ, a gwara anyị ka anyị na-aga eleta ma na-ahazi ìgwè na ọgbakọ dị iche iche na-asụ asụsụ ndị ọzọ na-abụghị Ịtalian. Ọ bụ ìgwè ndị a na-ekwusara ndị si Bangladesh, Chaịna, Eritria, Itiopia, Gana, India, Naịjirịa, Filipinz, Siri Lanka, na mba ndị ọzọ, ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị akọwa ụzọ niile magburu onwe ha anyị sirila hụ otú Okwu Chineke si kpụgharịa ndụ ndị Jehova gosiri ebere ọ gaghị aba n’akwụkwọ.—Maị. 7:18, 19.

Kwa ụbọchị, anyị na-ekpe ekpere ka Jehova na-enye anyị ume na ike ka anyị wee nọgide na-ejere ya ozi. N’eziokwu, ọṅụ Onyenwe anyị bụ ike anyị. Ọ na-eme ka anya anyị na-egbukepụ egbukepụ, na-emekwa ka obi sie anyị ike na mkpebi anyị mere izisa eziokwu dị na Baịbụl bụ mkpebi kacha mma ná ndụ.—Efe. 3:7; Kọl. 1:29.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 Gụọ akwụkwọ bụ́1992 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 95-184.

[Chaatị/Foto ndị dị na peeji nke 27-29]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Mgbe papa m na mama m nọ na Rọchesta, Niu Yọk

N’afọ 1948

Mgbe anyị gara ịgụ akwụkwọ na klas nke iri na abụọ nke ụlọ akwụkwọ Gilied n’Ebe Ndịda Lansin

N’afọ 1949

Mụ na Fern tupu anyị agawa Ịtali

Kaprị, Ịtali

N’afọ 1952

Ebe anyị na ndị ozi ala ọzọ ibe anyị nọ na Turin nakwa na Nepụls

N’afọ 1963

Fern na ụfọdụ n’ime ndị ọ na-amụrụ Baịbụl

“Anyị agaghị ekwe ka mmụọ anyị kwụsị igbuke egbuke”