Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ejila Alụmdi na Nwunye Egwu Egwu, Ọ Bụ Onyinye Si n’Aka Chineke

Ejila Alụmdi na Nwunye Egwu Egwu, Ọ Bụ Onyinye Si n’Aka Chineke

Ejila Alụmdi na Nwunye Egwu Egwu, Ọ Bụ Onyinye Si n’Aka Chineke

“Ọ bụ ya mere nwoke ga-eji hapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.”—JEN. 2:24.

1. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akwanyere Jehova ùgwù?

ANYỊ kwesịrị ịna-akwanyere Jehova bụ́ Chineke, bụ́ Onye malitere alụmdi na nwunye, ùgwù. Baịbụl kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị na “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè” si n’aka Onye Okike anyị, onye bụ́kwa Ọkaakaa na Nna anyị nke eluigwe. (Jems 1:17; Mkpu. 4:11) Onyinye niile zuru okè o nyere anyị gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. (1 Jọn 4:8) Ihe ọ bụla ọ kụziiri anyị, ihe ọ bụla ọ gwara anyị ka anyị mee, nakwa ihe ọ bụla o nyere anyị bụ naanị maka ọdịmma anyị na abamuru anyị.—Aịza. 48:17.

2. Olee ihe Jehova gwara di na nwunye mbụ?

2 Baịbụl gosiri na alụmdi na nwunye bụ otu n’ime “ezi” onyinye ndị si n’aka Chineke. (Rut 1:9; 2:12) Mgbe Jehova kere Iv wee kpọnye Adam ka ọ bụrụ nwunye ya, ọ gwara ha ihe ha kwesịrị ime ka ha wee na-ebi nke ọma. (Gụọ Matiu 19:4-6.) A sị na ha mere ihe ọ gwara ha, ha gaara enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ha ji iberiibe leghara iwu Chineke nyere ha anya, ha takwara ahụhụ si na ya.—Jen. 3:6-13, 16-19, 23.

3, 4. (a) Olee otú ọtụtụ ndị taa si enupụrụ Jehova bụ́ Chineke isi ma na-egosi na ha ejighị alụmdi na nwunye kpọrọ ihe? (b) Olee ndị anyị ga-atụle banyere ha n’isiokwu a?

3 Dị ka di na nwunye mbụ ahụ mere, ọtụtụ ndị na-eleghara iwu Jehova nyere n’ihe banyere alụmdi na nwunye anya. Ụfọdụ ndị bi n’abụghị di na nwunye, ebe ndị ọzọ na-alụ nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha. (Rom 1:24-32; 2 Tim. 3:1-5) Ha anaghị echeta na alụmdi na nwunye bụ onyinye si n’aka Chineke, ebe ha ji onyinye a egwu egwu, ha na-enupụrụ Onye nyere ya, bụ́ Jehova Chineke, isi.

4 Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ndị ohu Chineke na-elegharakwa iwu Chineke nyere banyere alụmdi na nwunye anya. Ndị Kraịst ụfọdụ bụ́ di na nwunye na-ekewa ma ọ bụkwanụ gbaa alụkwaghịm n’ihi ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Olee otú e nwere ike isi ghara ịna-eme nke a? Olee otú ihe Chineke kwuru na Jenesis 2:24 nwere ike isi nyere Ndị Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye aka ịna-ebi n’udo? Oleekwa otú ndị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ga-esi kwadebe maka ya? Ka anyị tụlee mmadụ atọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, bụ́ ndị ha na nwunye ha biri n’udo, akụkọ ha ga-egosikwa anyị otú irubere Chineke isi si eme ka di na nwunye na-ebi nke ọma.

Ejila Alụmdi na Nwunye Egwu Egwu

5, 6. Olee ihe lere Zekaraya na Elizabet ule, oleekwa ihe e meere ha n’ihi na ha kwesịrị ntụkwasị?

5 Zekaraya na Elizabet mere ihe niile ha kwesịrị ime. Ha abụọ ejighị ife Jehova ofufe egwuri egwu. Zekaraya ji ọrụ ịchụàjà ọ na-arụ kpọrọ ihe, ma ya ma nwunye ya ji ike ha niile na-edebe Iwu Chineke. O nwere ọtụtụ ihe ha ga-eji na-enwe obi ụtọ n’ezie. Ma, ọ bụrụ na ị gara n’ụlọ ha na Juda, ị gaghị anọte aka tupu ị mara na ọ dị ihe kọọrọ ha. Ha amụghị nwa. Elizabet bụ nwaanyị aga, ya na di ya emeekwala agadi.—Luk 1:5-7.

6 E jighị ịmụ ụmụ eti epele n’Izrel oge ochie, ha na-amụkwa ọtụtụ ụmụ. (1 Sam. 1:2, 6, 10; Ọma 128:3, 4) N’oge ahụ, nwoke Izrel nwere ike iji aghụghọ gbaa nwunye ya alụkwaghịm n’ihi na ọ mụtaraghị ya nwa. Ma, Zekaraya emeghị otú ahụ, ọ chụpụghị nwunye ya. Ọ chọrọghị otu ihe kụdo aka wee gbaa nwunye ya alụkwaghịm, nwunye ya emeghịkwa otú ahụ. N’agbanyeghị na nwa ha na-amụghị anaghị eme ha obi ụtọ, ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-efekọ Jehova ọnụ. Ka oge na-aga, Jehova rụụrụ ha ọrụ ebube wee nye ha nwa nwoke mgbe ha merela agadi.—Luk 1:8-14.

7. Olee ihe ọzọ Elizabet mere nke gosiri na o kwesịrị ntụkwasị obi?

7 O nwere ihe ọzọ Elizabet mere nke gosiri na o kwesịrị ntụkwasị obi. Mgbe ọ mụrụ nwa ya bụ́ Jọn, Zekaraya anaghị ekwu okwu n’ihi na mmụọ ozi mere ka ọ kwụsị ikwu okwu mgbe ọ na-ekwetaghị ihe ọ gwara ya. Ma, ọ ghaghị ịbụ na o nwere ka Zekaraya si gwa nwunye ya na mmụọ ozi Jehova gwara ya ka a gụọ nwa ahụ “Jọn.” Ndị agbata obi ya na ndị ikwu ya chọrọ ka a gụọ nwa ahụ Zekaraya. Ma, Elizabet ekweghị n’ihi ihe di ya gwara. Ọ sịrị: “Ee e! kama a ga-agụ ya Jọn.”—Luk 1:59-63.

8, 9. (a) Olee otú ikwesị ntụkwasị obi si eme ka udo dịrị n’etiti di na nwunye? (b) Olee ụfọdụ ụzọ ndị di na nwunye ga-esi gosi na ha kwesịrị ntụkwasị obi?

8 Ihe isi ike na ọnwụnwa na-abịara ndị bụ́ di na nwunye taa dị ka ha bịaara Zekaraya na Elizabet. Di na nwunye na-ekwesịghị ntụkwasị obi agaghị enwe obi ụtọ. Ịgba n’èzí, ikiri ma ọ bụkwanụ ịgụ ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, ịkwa iko, na ihe ndị ọzọ na-akpa alụmdi na nwunye aka ọjọọ nwere ike ime ka di ma ọ bụ nwunye ghara ịtụkwasị ibe ha obi. Ọ bụrụkwa na di na nwunye atụkwasịghịzi ibe ha obi, ịhụnanya ha nwere n’ebe ibe ha nọ ga-amalite ibelata. E nwere ike ikwu na ikwesị ntụkwasị obi yiri ogige nke a gbara gburugburu ụlọ iji mee ka ndị ọjọọ ghara ịbata na ya ka e wee chebe ndị bi na ya. Ya mere, ọ bụrụ na di na nwunye kwesịrị ntụkwasị obi, ha ga na-ebi n’udo wee na-agwa ibe ha otú ọ dị ha n’obi, nke a ga-eme ka ha nọgide na-ahụ ibe ha n’anya. N’eziokwu, ikwesị ntụkwasị obi dị ezigbo mkpa.

9 Jehova gwara Adam, sị: ‘Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya.’ (Jen. 2:24) Gịnị ka nke a pụtara? Mgbe mmadụ lụrụ di ma ọ bụ nwunye, otú ya na ndị enyi ya na ndị ikwu ya si emekọrịta ihe ga-agbanwe. Ebe mbụ o kwesịrị ilekwasị anya bụ n’ebe di ya ma ọ bụ nwunye ya nọ. Ha ekwesịghị ileghara ezinụlọ ha na-adịbeghị anya ọ malitere anya ma tinye oge ha niile n’ebe ndị enyi ha na ndị ikwu ha nọ. Ha ekwesịghịkwa ikwe ka nne na nna ha na-ekpebi otú ihe ga-esi na-aga n’ezinụlọ ha ma ọ bụkwanụ tinyere ha ọnụ ma ha nwee nghọtahie. Ha aghaghị ịrapara n’ahụ́ ibe ha. Otú a ka Chineke si chọọ ya.

10. Gịnị ga-enyere di na nwunye aka ikwesị ntụkwasị obi?

10 Ikwesị ntụkwasị obi na-arụ ezigbo ọrụ n’ezinụlọ e nwere di ma ọ bụ nwunye na-abụghị Onyeàmà Jehova. Otu nwanna nwaanyị nke di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova kwuru, sị: “M na-ekele Jehova maka ịkụziri m otú m ga-esi na-edo onwe m n’okpuru di m ma na-akwanyere ya ùgwù dị ukwuu. Otú mụ na di m si kwesị ntụkwasị obi emeela ka anyị nọgide na-ebi kemgbe iri afọ anọ na asaa, o mekwaala ka anyị hụkwuo ibe anyị n’anya ma na-akwanyere ibe anyị ùgwù.” (1 Kọr. 7:10, 11; 1 Pita 3:1, 2) Ya mere, gbalịa ka ị na-eme ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-eji tụkwasị gị obi. Jiri okwu ọnụ na omume mee ka obi sie di gị ma ọ bụ nwunye gị ike na ọ bụ ya kacha dị gị mkpa n’ime mmadụ niile. Ọ bụrụhaala na ọ dị gị n’aka, ekwela ka onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla mee ka ị ghara ịhụ di gị ma ọ bụ nwunye gị n’anya. (Gụọ Ilu 5:15-20.) Ron na Jeannette, bụ́ di na nwunye na-ebi n’udo, ndị lụrụ kemgbe ihe karịrị iri afọ atọ na ise, kwuru, sị: “Ihe mere anyị ji enwe obi ụtọ n’ezinụlọ anyị bụ na anyị na-erubere Chineke isi.”

Ịdị n’Otu Na-eme Ka Udo Dịrị n’Etiti Di na Nwunye

11, 12. Olee otú Akwịla na Prisila si rụkọọ ọrụ ọnụ (a) n’ụlọ ha, (b) n’ọrụ ha ji akpata ihe ha na-eri, nakwa (c) n’ozi ọma?

11 Pọl onyeozi anaghị ekwu banyere otu onye ghara ibe ya mgbe ọ bụla ọ na-ekwu banyere ezigbo ndị enyi ya bụ́ Akwịla na Prisila. Di na nwunye a dị n’otu bụ ihe atụ na-egosi ihe Chineke bu n’obi mgbe ọ sịrị na di na nwunye kwesịrị ịghọ “otu anụ ahụ́.” (Jen. 2:24) Ha na-arụkọ ọrụ ọnụ mgbe niile n’ụlọ ha, n’ọrụ ha ji akpata ego, nakwa n’ozi ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe mbụ Pọl gara Kọrịnt, Akwịla na Prisila ji obiọma kpọbata ya ka o biri n’ụlọ ha, bụ́ ebe o yiri ka ọ nọtụrụ obere wee si na-aga ebe ndị ọzọ o jere ozi. Mgbe ha bi n’Efesọs, ha wepụtara ụlọ ha ka a nọrọ ya na-amụ ihe. Ha rụkọkwara ọrụ ọnụ n’ebe ahụ wee nyere ndị ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ, ndị dị ka Apọlọs, aka ịghọta Okwu Chineke nke ọma. (Ọrụ 18:2, 18-26) Di na nwunye a ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi mechara gaa biri na Rom, bụ́ ebe ha wepụtakwara ụlọ ha ka a nọrọ ya na-amụ ihe. Ka oge na-agakwa, ha gaghachiri Efesọs na-eme ka okwukwe ụmụnna sie ike.—Rom 16:3-5.

12 O nwere mgbe Akwịla na Prisila na Pọl rụkọrọ ọrụ ọnụ n’ihe ha atọ ji enweta ego, bụ́ ịkpa ákwà ụlọikwuu. N’oge ahụ, di na nwunye a rụkọkwara ọrụ ọnụ n’udo n’enweghị nsogbu. (Ọrụ 18:3) O doro anya na ọ bụ oge ha ji rụkọọ ọrụ ndị metụtara Alaeze Chineke ọnụ nyeere ha aka ịdị n’otu. Ma mgbe ha bi na Kọrịnt, ma mgbe ha bi n’Efesọs, ma ọ bụkwanụ na Rom, onye ọ bụla maara na ha rụkọrọ ọrụ ọnụ “n’ime Kraịst Jizọs.” (Rom 16:3) Ebe ọ bụla ha abụọ jere ozi, ha na-ekwusakọ ozi ọma Alaeze Chineke ọnụ.

13, 14. (a) Olee ihe ndị nwere ike ime ka di na nwunye ghara ịdị n’otu? (b) Olee ihe dị iche iche ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye nwere ike ịna-eme ka ha wee nọgide na-abụ “otu anụ ahụ́”?

13 N’eziokwu, di na nwunye ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha enwee otu olu ma nwee ihe mgbaru ọsọ ndị na-anaghị emegide ibe ha. (Ekli. 4:9, 10) Ọ dị mwute ikwu na ọtụtụ ndị di na nwunye taa anaghị ewepụta oge nọkọọ. Onye nke ọ bụla na-arụ ọrụ nke ya ọtụtụ awa. Ụfọdụ na-emekarị njem n’ihi ọrụ ha, ebe ndị ọzọ nọ na mba ọzọ na-arụ ọrụ ma na-ezilatara di ha ma ọ bụ nwunye ha ego. Ndị ụfọdụ ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha bi n’otu ụlọ na-anọ naanị ha n’ihi na di ha ma ọ bụ nwunye ha anaghị enwe ohere maka na ọ na-ekiri tiivi, na-atụrụ ndụ, na-egwu egwuregwu nkịtị ma ọ bụ egwuregwu vidio ma ọ bụkwanụ na-achọgharị ihe n’Ịntanet. Ụdị ihe a ọ̀ na-eme n’ezinụlọ gị? Ọ bụrụ na ọ na-eme, ì nwere ike ịgbanwe ihe ụfọdụ ka unu wee nwekwuo oge unu ga-eji na-anọkọ? Ùnu nwere ike ịna-emekọ ihe ụfọdụ unu na-eme kwa ụbọchị ọnụ, ndị dị ka isi nri, ịsa efere, ma ọ bụ ịrụ ọrụ n’ugbo? Ùnu nwere ike ịrụkọ ọrụ ọnụ mgbe unu na-elekọta ụmụ unu ma ọ bụkwanụ ndị nne na nna unu merela agadi?

14 Ihe kacha mkpa unu ga na-emekọ ọnụ mgbe niile bụ ihe ndị metụtara ife Jehova. Ịgụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị na inwe ofufe ezinụlọ bụ ihe ndị magburu onwe ha ga-eme ka ezinụlọ unu nwee ezigbo ihe mgbaru ọsọ, meekwa ka ha na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Na-agakọnụ ozi ọma ọnụ. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe unu omume, gbalịanụ ka unu sụkọọ ụzọ ọnụ, ọ bụrụgodị na otú ihe si dịrị unu ga-eme ka unu rụọ ya naanị otu ọnwa ma ọ bụ otu afọ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:58.) Otu nwanna nwaanyị ya na di ya rụkọrọ ọrụ ịsụ ụzọ ọnụ kwuru, sị: “Oge anyị nọ n’ozi ọma bụ otu n’ime oge anyị ji emekọ ihe ọnụ ma na-ekwurịta okwu. Anyị na-arụkọ nnọọ ọrụ ọnụ n’ihi na mkpa anyị abụọ bụ inyere ndị ọzọ aka ka ha fewe Jehova. Nke a mere ka mụ na di m dịkwuo ná mma, bụrụkwuokwa ezigbo enyi.” Ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-emekọ ihe ndị kwesịrị ekwesị ọnụ, ihe ndị na-amasị gị, ihe ndị ị na-ebute ụzọ ná ndụ, nakwa àgwà gị ga-eji nwayọọ nwayọọ na-adaba na ndị nke di gị ma ọ bụ nwunye gị ruo mgbe unu ga-enwe ike ịna-echekwu echiche, na-ele ihe anya ma na-emekọ ihe ọnụ ka ndị bụ “otu anụ ahụ́,” dị ka Akwịla na Prisila mere.

Bute Chineke Ụzọ

15. Olee isi ihe na-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo? Kọwaa.

15 Jizọs ma na ibute Chineke ụzọ n’alụmdi na nwunye dị mkpa. Ọ nọ ya mgbe Jehova kpọọrọ Iv kpọnye Adam ka ọ bụrụ nwunye ya. Ọ hụrụ otú Adam na Iv si na-enwe obi ụtọ mgbe ha na-eme ihe Chineke gwara ha, hụkwa nsogbu ha malitere inwe mgbe ha nupuuru Chineke isi. Ya mere, mgbe Jizọs nọ na-akụziri ndị ọzọ ihe, o kwughachiri ihe Nna ya kwuru, bụ́ nke dị na Jenesis 2:24. O kwukwara, sị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Mat. 19:6) N’ihi ya, isi ihe na-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo bụ irubere Jehova isi. Nne na nna Jizọs, bụ́ Meri na Josef, setịpụrụ ezigbo ihe nlereanya na nke a.

16. Olee otú Josef na Meri si gosi na ha ji ofufe Chineke kpọrọ ihe n’ezinụlọ ha?

16 Josef na-egosi Meri obiọma ma na-akwanyere ya ùgwù. Josef achọghị imesi Meri ike mgbe ọ chọpụtara na ọ dị ime, ọ bụ eziokwu na mmụọ ozi Chineke agwabeghị ya otú o si tụrụ ime ahụ. (Mat. 1:18-20) Ha abụọ rubere isi ma n’iwu Siza ma n’Iwu Mozis. (Luk 2:1-5, 21, 22) N’agbanyeghị na ọ bụ naanị ndị ikom ka a chọrọ ka ha na-aga ememme ndị bụ́ isi e ji efe Chineke, bụ́ ndị a na-anọ na Jeruselem eme, Josef na Meri na ndị ezinụlọ ha na-aga ememme ndị ahụ kwa afọ. (Diut. 16:16; Luk 2:41) N’ihe ndị a na n’ihe ndị ọzọ, di na nwunye a na-atụ egwu Chineke gbalịsiri ike irubere Jehova isi ma jiri ịnụ ọkụ n’obi mee ihe ndị metụtara ofufe ya. Ọ bụ ya mere Jehova ji họrọ ha ka ha lekọta Ọkpara ya mgbe ọ ka bụ nwata n’ụwa.

17, 18. (a) Olee otú di na nwunye nwere ike isi bute Chineke ụzọ n’ezinụlọ ha? (b) Olee otú nke a ga-esi baara ha uru?

17 Ị̀ na-ebute Chineke ụzọ n’ezinụlọ gị, dị ka Josef na Meri mere? Dị ka ihe atụ, mgbe ị chọrọ ime mkpebi ndị dị mkpa, ị̀ na-ebu ụzọ achọpụta ihe Baịbụl kwuru banyere ihe ahụ, kpee ekpere banyere ya, ma ọ bụkwanụ gakwuru ndị ji ọgbakọ kpọrọ ihe ka ha tụọrọ gị aro? Ka ị̀ na-eme uche gị ma ọ bu uche ndị ezinụlọ gị ma ọ bụ nke ndị enyi gị mgbe nsogbu bịaara gị? Ị̀ na-agba mbọ ime ọtụtụ ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi derela banyere alụmdi na nwunye na ndụ ezinụlọ? Ka ị̀ na-eme ihe kwekọrọ n’omenala ebe i bi ma ọ bụ ihe ndị mmadụ na-ekwu? Ùnu na-amụkọ ihe ọnụ mgbe niile, na-ekpekọ ekpere ọnụ, na-ekwu ihe ndị metụtara ife Chineke, bụ́ ndị ga-abụ ihe mgbaru ọsọ unu, ma ọ bụkwanụ na-ekwurịta ihe ndị ezinụlọ unu kwesịrị ịna-ebute ụzọ?

18 Ray kwuru banyere afọ iri ise ha bụrụla di na nwunye na-enwe obi ụtọ, sị: “Anyị esetụbeghị okwu anyị na-edozilighị, n’ihi na Jehova bụ otu n’ime ‘ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ’ ná ndụ anyị.” (Gụọ Ekliziastis 4:12.) Danny na Trina sịrị: “Anyị na-ebi n’udo n’ihi na anyị na-efekọ Chineke ọnụ.” Ha bụ di na nwunye kemgbe ihe karịrị iri afọ atọ na anọ. Ha na-enwekwa obi ụtọ. Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga na-ebi n’udo ma ọ bụrụ na unu na-ebute Jehova ụzọ, ọ ga-agọzikwa unu nke ukwuu.—Ọma 127:1.

Nọgide Na-eji Onyinye Chineke Nyere Kpọrọ Ihe

19. Olee ihe mere Chineke ji mee ka e nwee alụmdi na nwunye, nke bụ́ onyinye?

19 Naanị ihe bụ mkpa ọtụtụ ndị taa bụ otú hanwa ga-esi na-enwe obi ụtọ. Ma, ndị ohu Jehova ekwesịghị isi otú a na-ele ihe anya. Ha ma na Chineke mere ka anyị na-alụ di na nwunye ka anyị wee mezuo nzube ya. (Jen. 1:26-28) A sị na Adam na Iv ji onyinye ahụ kpọrọ ihe, ụwa niile gaara aghọ paradaịs, bụ́ ebe ndị ohu 1Chineke ndị nwere obi ụtọ ga-ejupụta.

20, 21. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eme ihe na-egosi na anyị ma na alụmdi na nwunye dị nsọ? (b) Olee onyinye anyị ga-amụ banyere ya n’izu na-abịa abịa?

20 Ihe kacha mkpa bụ na ndị ohu Chineke kwesịrị ịgbalị ka alụmdi na nwunye ha na-ewetara Jehova otuto. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:31.) Dị ka anyị kwurula, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị n’otu, nakwa di na nwunye ibute Jehova ụzọ ná ndụ ha na-amasị Jehova ma na-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo. Ya mere, ma ànyị na-akwadebe ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ma ànyị na-agba mbọ ka anyị na nwunye anyị ma ọ bụ di anyị dịrị n’udo, ma ọ bụkwanụ na-agbalị ka anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị ghara itisa, anyị kwesịrị ibu ụzọ cheta ihe alụmdi na nwunye bụ. Ọ bụ ihe dị nsọ nke si n’aka Chineke. Ọ bụrụ na mmadụ eburu nke a n’uche, ọ ga-agbalịsi ike kwere ka Okwu Chineke na-eduzi ya mgbe ọ na-ekpebi otú ihe ga-adị n’etiti ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú a, anyị na-egosi na anyị ejighị alụmdi na nwunye, nke bụ́ onyinye Chineke nyere anyị, egwuri egwu, nakwa na anyị na-erubere Onye nyere ya anyị, bụ́ Jehova bụ́ Chineke, isi.

21 Ọ bụghị naanị alụmdi na nwunye bụ onyinye Jehova nyere anyị; ọ bụghịkwa naanị ya na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle onyinye ọzọ dị mkpa nke si n’aka Chineke, ya bụ, mmadụ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee otú Ndị Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị isi na-egosi na ha kwesịrị ntụkwasị obi?

• Olee otú imekọ ihe ọnụ ga-esi mee ka di na nwunye dị n’udo?

• Olee ụfọdụ n’ime ụzọ ndị bụ́ di na nwunye ga-esi gosi na ha na-ebute Chineke ụzọ n’ezinụlọ ha?

• Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-erubere Jehova, bụ́ Onye malitere alụmdi na nwunye, isi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Di na nwunye ga-adị n’otu ma ha na-emekọ ihe ọnụ