Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Gbaba N’aha Jehova’

‘Gbaba N’aha Jehova’

‘Gbaba N’aha Jehova’

“M ga-ahapụkwa ndị dị umeala n’obi na ndị dị nwayọọ . . . , ha ga-agbabakwa n’aha Jehova.”—ZEF. 3:12.

1, 2. Olee oké ifufe ihe atụ nke ga-efekwasị ụmụ mmadụ n’oge na-adịghị anya?

Ọ̀ DỊTỤLA mgbe ị na-aga n’ụzọ obere mmiri amalite izo, ifufe ana-efekwa, ya adị mkpa na ị ga-achọwa nwa ebe ị ga-agbaba? Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ụdị ifufe na mmiri ozuzo ọ ga-abụ ha malite, ya adị mkpa na ị ga-achọ ebe e wusiri ike, ma ọ́ bụghị ya, ifufe eburu gị na ebe ị gbabara.

2 Ma, e nwere ihe na-abịanụ nke na-enweghị oké ifufe a ga-eji tụnyere ya, bụ́ nke nwere ike ikpochapụ mmadụ niile ma á maghị ihe e mere. Ọ bụ “ụbọchị oké ifufe” ihe atụ. “Oké ụbọchị Jehova” a ga-emetụta mmadụ niile. Ma, anyị nwere ike ịchọta ebe anyị ga-agbaba. (Gụọ Zefanaya 1:14-18.) Olee otú anyị ga-esi mee nke a “n’ụbọchị oké iwe Jehova” nke ga-abịa n’oge na-adịghị anya?

Ụbọchị Oké Ifufe E Nwere n’Oge Ochie

3. Olee “égbè eluigwe” bibiri alaeze ebo iri nke Izrel?

3 Mgbe ụbọchị Jehova ga-abịa, ọ ga-ebu ụzọ bibie okpukpe ụgha niile dị n’ụwa. Ihe ndị mere ndị Chineke n’oge ochie ga-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi enweta ebe mgbaba. Aịzaya, bụ́ onye dịrị ndụ na narị afọ nke asatọ T.O.A., ji ikpe Jehova kpere alaeze ebo iri nke Izrel tụnyere “égbè eluigwe” nke ndị mmadụ na-agaghị egbochili. (Gụọ Aịzaya 28:1, 2.) Amụma a mezuru na 740 T.O.A. mgbe ndị Asiria bịara lụsoo ebo iri nke Izrel agha, nke Ifrem na-anọchite anya ha.

4. Olee otú “oké ụbọchị Jehova” si bịakwasị Jeruselem n’afọ 607 T.O.A.?

4 Mgbe e bibichara Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi, “oké ụbọchị Jehova” bịakwasịrị Jeruselem na alaeze Juda n’afọ 607 T.O.A. Ihe mere nke a ji mee ndị Juda bụ maka na ha dapụkwara n’ezi ofufe. Ndị Babịlọn, bụ́ ndị Nebukadneza na-achị, yiri isi obodo Juda bụ́ Jeruselem egwu. Ndị Juda jekwuuru “ebe mgbaba ụgha,” ya bụ, ọchịchị Ijipt ha na ha jikọrọ aka, ka ha nyere ha aka. Ma, ndị Babịlọn lara “ebe mgbaba” ha n’iyi otú ahụ oké ifufe si ala ihe n’iyi.—Aịza. 28:14, 17.

5. Olee otú ihe ga-esi agara ndị Chineke mgbe a ga-ebibi okpukpe ụgha niile?

5 Oké ụbọchị Jehova nke bịakwasịrị Jeruselem na-egosi otú mbibi ga-esi abịakwasị Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ taa. A ga-ebibikwa ndị ọzọ so na “Babịlọn Ukwu ahụ,” bụ́ alaeze okpukpe ụgha nke zuru ụwa ọnụ. Mgbe nke a gachara, a ga-ebibi ihe ndị fọrọ n’ajọ ụwa Setan. Ma, o nweghị ihe ga-eme ndị Chineke n’ihi na ha gbabara n’ime Jehova.—Mkpu. 7:14; 18:2, 8; 19:19-21.

Ebe Mgbaba Ime Mmụọ na nke Nkịtị

6. Olee otú ndị ohu Jehova ga-esi achọta ebe mgbaba?

6 Olee otú ndị Chineke ga-esi achọta ebe mgbaba ugbu a n’oge ọgwụgwụ a? Anyị na-achọta ebe mgbaba ime mmụọ ma anyị na-ekpeku Chineke ekpere ma “na-echebara aha ya echiche,” nakwa ma anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-efe ya ofufe. (Gụọ Malakaị 3:16-18.) Ma, e nwere ihe ọzọ anyị ga-eme ma e wezụga ichebara aha Chineke echiche. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.” (Rom 10:13) E nwere ihe jikọrọ ịkpọku aha Jehova na ịbụ onye ọ ga-azọpụta. Ọtụtụ ndị nwere ezi obi ahụkwala ihe dị iche n’ezigbo Ndị Kraịst, bụ́ ndị ji obi ha dum “na-echebara aha ya echiche” ma bụrụ Ndịàmà ya, na ụmụ mmadụ ndị na-anaghị efe ya.

7, 8. Olee otú e si zọpụta Ndị Kraịst na narị afọ mbụ, oleekwa otú ihe yiri ya ga-esi eme taa?

7 Ma, nzọpụta ebighị naanị n’ịchọta ebe mgbaba ime mmụọ. Chineke kwere ndị ya nkwa na ya ga-echebe ha ka ndị iro ha ghara inweta ha. Ihe mere n’afọ 66 O.A. mgbe ndị agha Rom, ndị Sestiọs Galọs na-edu, nọchibidochara Jeruselem n’agha gosiri na nke a bụ eziokwu. Jizọs buru amụma na a ga-eme ka ụbọchị mkpagbu ahụ “dị mkpirikpi.” (Mat. 24:15, 16, 21, 22) Nke ahụ mere mgbe ndị agha Rom si n’obodo ahụ pụọ ná mberede, bụ́ ihe mere ka ‘a zọpụta anụ ahụ́’ ụfọdụ, ya bụ, ezigbo Ndị Kraịst. Ha gbagara n’obodo ndị gbara Jeruselem gburugburu. Ụfọdụ gafere Osimiri Jọdan gaa biri n’ugwu ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke osimiri ahụ.

8 O nwere otú Ndị Kraịst a na ndị ohu Chineke nke oge a si yie. Ndị Kraịst narị afọ mbụ chọrọ ebe mgbaba, ndị ohu Chineke taa ga-achọkwa ebe mgbaba. Ma, na nke oge a, ha agaghị esi n’ebe ha nọ gbaga ebe ọzọ, n’ihi na ezigbo Ndị Kraịst nọ n’ebe niile n’ụwa. N’agbanyeghị nke a, ọ bụrụ na “ndị a họọrọ” na ezigbo ndị enyi ha agbaba n’ime Jehova nakwa n’ọgbakọ ya nke yiri ugwu, a ga-echebe ha mgbe a ga-ebibi Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ.

9. Olee ndị gbalịrịla ime ka e chefuo aha Jehova? Nye ihe atụ.

9 E kwesịkwara ibibi Krisendọm n’ihi na o so mee ka ọtụtụ ndị chọọchị ghara ịma nke bụ́ eziokwu banyere Chineke nakwa n’ihi asị ọ kpọrọ aha Chineke. Mgbe ụwa na-emepechabeghị anya, ọtụtụ ndị ma aha Chineke na Yurop. Aha Chineke, nke mkpụrụ okwu Hibru anọ a na-akpọ Tetragramatọn na-anọchi anya ya, ndị a na-edekarị YHWH (ma ọ bụ JHVH), na-adị na mkpụrụ ego, n’ihu ụlọ ndị mmadụ, n’ọtụtụ akwụkwọ, na Baịbụl, nakwa n’ụfọdụ ụlọ ụka ndị Katọlik na nke ndị Protestant. Ma, ihe a na-emekarị n’oge a bụ iwepụ aha Chineke na Baịbụl ụfọdụ na n’ebe ndị ọzọ. Otu ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ otu akwụkwọ ozi e dere na June 29, 2008, bụ́ nke Òtù Na-ahụ Maka Okpukpere Chi na Sakrament degaara Òtù Ndị Bishọp banyere ‘Aha Chineke.’ Chọọchị Roman Katọlik kwuru n’akwụkwọ ozi ahụ na e kwesịrị iji “Onyenwe anyị” dochie anya ụdị ọ bụla nke Tetragramatọn ahụ n’ebe ọ bụla ọ pụtara. Ndị Vatikan nyere iwu ka a ghara ịkpọ aha Chineke n’abụ ma ọ bụ n’ekpere ha mgbe a na-edo Mas. Ndị ndú okpukpe ndị ọzọ so na Krisendọm na ndị nke na-esoghị na ya emeekwala ka nde kwuru nde ndị òtù ha ghara ịma nke bụ́ eziokwu banyere ezi Chineke.

Otú A Ga-esi Echebe Ndị Na-edo Aha Chineke Nsọ

10. Olee otú e si na-akwanyere aha Chineke ùgwù taa?

10 Ndịàmà Jehova anaghị eme aha Chineke ihe okpukpe ndị ọzọ na-eme ya, ha na-akwanyere aha Chineke ùgwù ma na-eto ya. Ha na-edo ya nsọ site n’ịkwanyere ya ùgwù. Jehova nwere mmasị n’ebe ndị tụkwasịrị ya obi nọ, ọ na-aghọkwa ihe ọ bụla dị mkpa iji gọzie ndị ya ma chebe ha. “Ọ makwaara ndị na-agbaba n’ime ya.”—Nehọ. 1:7; Ọrụ 15:14.

11, 12. Olee ndị doro aha Jehova nsọ na Juda oge ochie, oleekwa ndị na-eme otú ahụ taa?

11 N’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime ndị bi na Juda n’oge ochie si n’ezi ofufe dapụ, e nwere ụfọdụ ndị ‘gbabara n’aha Jehova.’ (Gụọ Zefanaya 3:12, 13.) Mgbe Chineke tara ndị Juda na-ekwesịghị ntụkwasị obi ahụhụ site n’ikwe ka ndị Babịlọn bibie mba ha ma dọrọ ha n’agha, e nwere ụfọdụ ndị o chebere, dị ka Jeremaya, Barọk, na Ibed-melek. Ha biri “n’etiti” mba dapụrụ n’ezi ofufe. E nwekwara ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi n’ebe ahụ a dọọrọ ha n’agha gaa. N’afọ 539 T.O.A., Saịrọs du ndị Midia na Peshia gaa bibie Babịlọn. Ka obere oge gachara, Saịrọs tiri iwu nke mere ka ndị Juu fọdụrụ laghachi n’obodo ha.

12 Mgbe Zefanaya na-ebu amụma banyere otú ndị Chineke ga-esi maliteghachi ife ya ezi ofufe, o kwuru na Jehova ga-azọpụta ha ma nwee aṅụrị n’ebe ha nọ. (Gụọ Zefanaya 3:14-17.) Nke a emeekwala n’oge anyị a. N’afọ 1919, Jehova si na Babịlọn Ukwu ahụ napụta ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị. Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ebe ha nọ ruo taa.

13. Olee otú e si na-atọhapụ ndị bi ná mba niile?

13 Ndị nwere olileanya ibi n’ụwa esikwala na Babịlọn Ukwu ahụ pụta, a naghịzikwa akụziri ha ozizi okpukpe ụgha. (Mkpu. 18:4) N’ihi ya, Zefanaya 2:3 na-emezu n’ụzọ dị ukwuu taa. Ebe ahụ sịrị: “Chọọnụ Jehova, unu niile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa.” Ndị dị umeala n’obi, bụ́ ndị bi ná mba niile, na-agbaba n’aha Jehova ugbu a, ma hà nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ̀ bụ nke ibi n’ụwa.

Aha Chineke Abụghị Ọtụmọkpọ

14, 15. (a) Olee ihe ụfọdụ ndị jirila mere ọtụmọkpọ? (b) Olee ihe anyị na-ekwesịghị iwere ka ọtụmọkpọ?

14 Ụfọdụ ndị Izrel weere ụlọ nsọ ahụ ka ọtụmọkpọ nke ga-echebe ha ma ndị iro ha bịa. (Jere. 7:1-4) Tupu e wuo ụlọ nsọ, e nwere mgbe ụmụ Izrel weere igbe ọgbụgba ndụ ahụ ka ọtụmọkpọ nke ga-echebe ha ma ha gaa agha. (1 Sam. 4:3, 10, 11) Kọnstantin Onye Ukwu sere mkpụrụ akwụkwọ Grik bụ́ khi na rho, ndị bụ́ mkpụrụ okwu abụọ mbụ dị n’utu aha ahụ bụ́ “Kraịst” n’asụsụ Grik, n’ọta ndị agha ya. O bu n’obi na nke a ga-echebe ndị agha ya. E kwukwara na Eze Gustav Adolph nke Abụọ nke Swidin, bụ́ onye so lụọ Agha Iri Afọ Atọ a lụrụ na Yurop, yiri uwe agha nke e sere na peeji nke 7. Ị ga-ahụ na e dere Iehova n’olu uwe a otú a ga-ahụ ya nke ọma.

15 Jehova echebela ụfọdụ ndị ohu ya ndị mmụọ ọjọọ nyere nsogbu mgbe ha kpọrọ aha ya n’olu dara ụda. Ma, e kwesịghị iwere ihe e dere aha Chineke na ya ka ọ̀ bụ ọtụmọkpọ mmadụ ga-eji na-echebe onwe ya kwa ụbọchị. Nke a abụghị ihe ịgbaba n’aha Jehova pụtara.

Otú Anyị Ga-esi Agbaba n’Aha Jehova Taa

16. Olee otú anyị nwere ike isi gbaba n’ebe nchebe ime mmụọ taa?

16 Taa, anyị na-achọta ebe mgbaba ime mmụọ n’etiti ndị Chineke. (Ọma 91:1) E si n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na ndị okenye eme ka anyị mara ihe ndị nwere ike imebi adịm ná mma anyị na Jehova. (Mat. 24:45-47; Aịza. 32:1, 2) Chegodị ugboro ole a na-adọ anyị aka ná ntị banyere ịhụ ihe onwunwe n’anya, nakwa otú ịdọ aka ná ntị a sirila mee ka anyị zere ihe ndị nwere ike imebi adịm ná mma anyị na Chineke. Oleekwa banyere mmadụ inwe àgwà nke ga-eme ka ọ ghara iji ozi ọ na-ejere Jehova kpọrọ ihe, bụ́ nke nwedịrị ike ime ka ọ kwụsị ijere Jehova ozi? Okwu Chineke sịrị: “Ejighị ihe kpọrọ ihe nke ndị nzuzu ga-ala ha n’iyi. Ma onye na-ege m ntị ga-ebi n’obi iru ala, ụjọ ọdachi agaghịkwa enye ya nsogbu.” (Ilu 1:32, 33) Ọ bụrụkwa na anyị agbaa mbọ na-eme omume dị mma, ọ ga-eme ka anyị na Chineke nọgide na-adị ná mma.

17, 18. Olee ihe na-enyere ọtụtụ nde mmadụ aka ịgbaba n’aha Jehova taa?

17 Cheekwa banyere agbamume ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-enye anyị ka anyị na-eme ihe ahụ Jizọs nyere anyị n’iwu, ya bụ, ka anyị na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ụwa dum ụmụ mmadụ bi. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Zefanaya kwuru na a ga-enwe mgbanwe nke ga-eme ka ndị mmadụ nwee ike ịgbaba n’aha Chineke. Ọ sịrị: “Ọ bụ mgbe ahụ ka m ga-agbanwe asụsụ nke ndị dị iche iche ka ọ bụrụ asụsụ dị ọcha, ka ha niile wee na-akpọku aha Jehova, ka ha wee jiri otu obi na-efe ya ofufe.”—Zef. 3:9.

18 Gịnị bụ asụsụ a dị ọcha? Ọ bụ eziokwu banyere Jehova bụ́ Chineke na nzube ya, bụ́ nke dị n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ. Ị na-asụ asụsụ a mgbe ị na-agwa ndị ọzọ ihe bụ́ eziokwu banyere Alaeze Chineke nakwa otú ọ ga-esi doo aha Chineke nsọ, mgbe ị na-ekwu banyere otú a ga-esi gosi na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị, nakwa mgbe i ji obi ụtọ na-ekwu banyere otú a ga-esi gọzie ụmụ mmadụ ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ ụmụ mmadụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Ọnụ ọgụgụ ndị “na-akpọku aha Jehova” ma “jiri otu obi na-efe ya ofufe” na-amụba n’ike n’ike n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị na-asụ asụsụ a. N’eziokwu, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile na-agbaba n’ime Jehova.—Ọma 1:1, 3.

19, 20. Olee otú “ebe mgbaba ụgha” si mechuo ndị tụkwasịrị ya obi n’oge ochie ihu?

19 E nwere ọtụtụ nsogbu ndị nọ n’ụwa na-enwe, bụ́ ihe ndị yiri ka a gaghị emeri ha emeri. Ụfọdụ ndị na-agakwuru ụmụ mmadụ na-ezughị okè n’ihi na ha chọsiri ike ka nsogbu ha hapụ ha aka. Ma ọ bụkwanụ ha na-atụ anya na ndị ọchịchị ga-enyere ha aka, dị ka ndị Izrel oge ochie mere mgbe ụfọdụ wee gakwuru mba ndị dị ha nso ka ha nyere ha aka, ha na ha ejikọkwaa aka. Ma, ị ma na nke ahụ enyereghị ndị Izrel aka. Ma ọchịchị mba dị iche iche ma Òtù Mba Ụwa adịghị nke ga-eme ka nsogbu ụmụ mmadụ na-enwe hapụchaa ha aka. N’ihi ya, olee ihe mere mmadụ ga-eji gbakwuru ndị ọchịchị ma ọ bụ kwere ka ha na ya jikọọ aka? Baịbụl kpọrọ ha “ebe mgbaba ụgha.” Ọ bụ ihe ha bụ n’eziokwu n’ihi na ha ga-emechu ndị niile na-atụ anya na ha ga-enyere ha aka ihu.—Gụọ Aịzaya 28:15, 17.

20 N’oge na-adịghị anya, oké ifufe ihe atụ nke ụbọchị Jehova ga-efekwasị ụwa. Mbọ niile ụmụ mmadụ na-agba iji ngwá agha nuklia na akụnụba chebe onwe ha ga-akụ afọ n’ala. Aịzaya 28:17 kwuru, sị: “Akụ́ mmiri ígwé ga-ekpochapụ ebe mgbaba ụgha ha, mmiri ga-ebupụkwa ebe ahụ ha zoro.”

21. Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị emee ihe isiokwu dịịrị afọ 2011 gbara anyị ume ka anyị mee?

21 Ma ugbu a ma mgbe ụbọchị Jehova ga-abịa, ndị ohu Chineke ga-agbaba n’ebe a ga-echebe ha n’eziokwu, nke bụ́ n’ime Chineke ha, bụ́ Jehova. Aha bụ́ Zefanaya, nke pụtara “Jehova Ezobewo,” na-egosi n’ezie na Jehova ga-echebe ndị ya. Anyị nwere isiokwu kwesịrị ekwesị maka afọ 2011 nke na-enye anyị ndụmọdụ bara uru, sị: ‘Gbaba n’aha Jehova.’ (Zef. 3:12) Ọbụna ugbu a, anyị nwere ike ịgbaba n’aha Jehova, anyị kwesịkwara ime otú ahụ, na-atụkwasị ya obi kpamkpam. (Ọma 9:10) Kwa ụbọchị, ka anyị na-echeta okwu a na-emesi obi ike, bụ́ nke sịrị: “Aha Jehova bụ ụlọ elu siri ike. N’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, e wee chebe ya.”—Ilu 18:10.

Ì Chetara?

• Olee otú anyị nwere ike isi gbaba n’aha Jehova ugbu a?

• Olee ihe mere na anyị ekwesịghị ịtụkwasị obi “n’ebe mgbaba ụgha”?

• Olee ebe obi siri anyị ike na anyị ga-agbaba n’ọdịnihu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Isiokwu dịịrị afọ 2011 bụ: ‘Gbaba n’aha Jehova.’—Zefanaya 3:12.

[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 7]

Thüringer Landesmuseum Heidecksburg Rudolstadt, Waffensammlung “Schwarzburger Zeughaus”